21 E nwere ihe mụnwa bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru gbasara Ehab nwa Kolaya na Zedekaya nwa Measaya, bụ́ ndị na-eburu unu amụma ụgha n’aha m.+ M sịrị, ‘M ga-enyefe ha n’aka Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn. Ọ ga-egbukwa ha n’ihu unu.