-
Joel 2:20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 M ga-achụpụ ndị si n’ebe ugwu ka ha nọrọ n’ebe dị anya n’ebe ị nọ;
M ga-achụsasị ha, chụga ha n’ala kpọrọ nkụ ọ na-enweghị ihe dị na ya,
Chụga ndị nọ n’ihu* n’oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ*
Ma chụga ndị nọ n’azụ n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.*
Ísì ọjọọ ha ga-esi n’ala ahụ.
Ísì ha nke jọgburu onwe ya ga na-esi n’ala ahụ,+
N’ihi na Chineke ga-eme oké ihe.’
-