19 Ọ bụrụkwa na e nwee onye wepụrụ ihe n’okwu amụma ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta a, Chineke agaghị ekwe ka o nweta ihe ọma ndị e dere n’akwụkwọ mpịakọta a, ya bụ, ọ gaghị ekwe ka ọ taa mkpụrụ si n’osisi nke ndụ.+ Ọ gaghịkwa ekwe ka ọ banye n’obodo nsọ ahụ.+