14 Ha aghaghịkwa ịkọrọ ya ndị bi n’ala a. Ha anụwo na gị onwe gị, Jehova, nọ n’etiti ndị a,+ gị onye pụtara ìhè n’etiti ha ihu na ihu.+ Ha anụwo na ị bụ Jehova, ígwé ojii gị dịkwa n’elu isi ha, ị na-eji ogidi ígwé ojii ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị.+