9 N’ihi na anyị bụ ndị ohu;+ Chineke anyị ahapụghịkwa anyị n’agbụ anyị nọ na ya,+ kama o gosiri anyị obiọma n’ihu ndị eze Peshia,+ mee ka anyị nweta ume ka anyị wee wuo ụlọ Chineke anyị,+ wughachikwa ebe+ ya ndị tọgbọrọ n’efu, nyekwa anyị mgbidi e ji nkume wuo+ na Juda nakwa na Jeruselem.