Tuzdee, Julaị 15
Na-azụ ụmụ atụrụ m.—Jọn 21:16.
Pita onyeozi gwara ndị okenye ibe ya, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke.” (1 Pita 5:1-4) Ọ bụrụ na ị bụ okenye, anyị ma na ị hụrụ ụmụnna gị n’anya nakwa na ị chọrọ ịna-elekọta ha. Ma mgbe ụfọdụ, i nwere ike iche na ị gaghị arụli ọrụ ahụ n’ihi na i nweghị ohere ma ọ bụ na ike gwụchara gị. Gịnị ka i nwere ike ime? Kọọrọ Jehova otú ọ dị gị n’obi. Pita dere, sị: “Onye na-ejere ndị ọzọ ozi, ya jiri ike Chineke na-eje ya.” (1 Pita 4:11) Ụfọdụ nsogbu nwere ike ịbịara ụmụnna gị agaghị enwe ngwọta n’ụwa ochie a. Ma cheta na Jizọs Kraịst, bụ́ “onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ,” nwere ike inyere ha aka karịa gịnwa. O nwere ike inyere ha aka ma ugbu a ma n’ụwa ọhụrụ. Ihe Jehova chọrọ ka ndị okenye mee bụ ka ha hụ ụmụnna ha n’anya, na-azụ ha, ‘na-akpakwa àgwà ìgwè atụrụ Chineke ga na-eṅomi.’ w23.09 29-30 ¶13-14
Wenezdee, Julaị 16
Jehova ma na ihe ndị ma ihe na-atụgharị n’uche bụ ihe efu. —1 Kọr. 3:20.
Anyị kwesịrị izere echiche mmadụ. Ọ bụrụ na anyị ana-ele ihe anya otú ndị mmadụ si ele ya, anyị nwere ike ịna-eleghara Jehova na iwu ya anya. (1 Kọr. 3:19) “Amamihe ụwa a” na-emekarị ka ndị mmadụ na-enupụrụ Jehova isi. Ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Pagamọm na Tayataịra malitere iwere ikpere arụsị na omume rụrụ arụ otú ndị obodo ha si were ya. Jizọs baara ọgbakọ abụọ ahụ ezigbo mba maka otú ha si na-agbachi ndị na-eme omume rụrụ arụ nkịtị. (Mkpu. 2:14, 20) Taa, a na-enye anyị nsogbu ka anyị lewe ihe anya otú na-ekwesịghị ekwesị. Ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị nwere ike ịna-agwa anyị na anyị na-eme oké ezi omume ma ọ bụkwanụ na anyị kwesịrị imebi iwu Jehova. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịna-ekwu na ime omume rụrụ arụ adịghị njọ, nakwa na ihe Baịbụl kwuru gbasara mmekọahụ enweghịzi isi taa. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ichewe na Jehova anaghị enye anyị iwu ndị doro anya. Anyị nwere ike chọwa ịna-eme ihe karịrị “ihe e dere ede.”—1 Kọr. 4:6. w23.07 16 ¶10-11
Tọzdee, Julaị 17
Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.—Ilu 17:17.
Ọ dị mkpa ka Meri nne Jizọs nweta ike ọ ga-eji mee uche Jehova. Ọ lụbeghị di, ma a gwara ya na ọ ga-adị ime. Ọ zụtụbeghị nwa, ma a gwara ya na ọ ga-elekọta nwa ga-aghọ Mezaya. Ebe ọ bụ na ya na nwoke ọ bụla enwebeghị mmekọahụ, olee otú ọ ga-esi agwa Josef bụ́ onye chọrọ ịlụ ya na ọ dị ime? (Luk 1:26-33) Olee otú Meri si nweta ike? O kwere ka ndị ọzọ nyere ya aka. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Gebriel ka ọ gwakwuo ya ihe ndị ọzọ gbasara ọrụ ahụ e nyere ya. (Luk 1:34) Obere oge nke ahụ mechara, ọ gara “n’ala bụ́ ugwu ugwu,” n’otu obodo dị na Juda gaa leta onye ikwu ya aha ya bụ Elizabet. Elizabet jara Meri mma. Jehova mekwara ka Elizabet kọọrọ Meri otu amụma gbasara nwa ọ ga-amụ. (Luk 1:39-45) Meri kwuru na Jehova “ji aka ya dị ike mee ihe a niile.” (Luk 1:46-51) Jehova si n’aka Gebriel na Elizabet mee ka Meri dị ike. w23.10 14-15 ¶10-12