Wenezdee, Julaị 16
Jehova ma na ihe ndị ma ihe na-atụgharị n’uche bụ ihe efu. —1 Kọr. 3:20.
Anyị kwesịrị izere echiche mmadụ. Ọ bụrụ na anyị ana-ele ihe anya otú ndị mmadụ si ele ya, anyị nwere ike ịna-eleghara Jehova na iwu ya anya. (1 Kọr. 3:19) “Amamihe ụwa a” na-emekarị ka ndị mmadụ na-enupụrụ Jehova isi. Ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Pagamọm na Tayataịra malitere iwere ikpere arụsị na omume rụrụ arụ otú ndị obodo ha si were ya. Jizọs baara ọgbakọ abụọ ahụ ezigbo mba maka otú ha si na-agbachi ndị na-eme omume rụrụ arụ nkịtị. (Mkpu. 2:14, 20) Taa, a na-enye anyị nsogbu ka anyị lewe ihe anya otú na-ekwesịghị ekwesị. Ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị nwere ike ịna-agwa anyị na anyị na-eme oké ezi omume ma ọ bụkwanụ na anyị kwesịrị imebi iwu Jehova. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịna-ekwu na ime omume rụrụ arụ adịghị njọ, nakwa na ihe Baịbụl kwuru gbasara mmekọahụ enweghịzi isi taa. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ichewe na Jehova anaghị enye anyị iwu ndị doro anya. Anyị nwere ike chọwa ịna-eme ihe karịrị “ihe e dere ede.”—1 Kọr. 4:6. w23.07 16 ¶10-11
Tọzdee, Julaị 17
Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.—Ilu 17:17.
Ọ dị mkpa ka Meri nne Jizọs nweta ike ọ ga-eji mee uche Jehova. Ọ lụbeghị di, ma a gwara ya na ọ ga-adị ime. Ọ zụtụbeghị nwa, ma a gwara ya na ọ ga-elekọta nwa ga-aghọ Mezaya. Ebe ọ bụ na ya na nwoke ọ bụla enwebeghị mmekọahụ, olee otú ọ ga-esi agwa Josef bụ́ onye chọrọ ịlụ ya na ọ dị ime? (Luk 1:26-33) Olee otú Meri si nweta ike? O kwere ka ndị ọzọ nyere ya aka. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Gebriel ka ọ gwakwuo ya ihe ndị ọzọ gbasara ọrụ ahụ e nyere ya. (Luk 1:34) Obere oge nke ahụ mechara, ọ gara “n’ala bụ́ ugwu ugwu,” n’otu obodo dị na Juda gaa leta onye ikwu ya aha ya bụ Elizabet. Elizabet jara Meri mma. Jehova mekwara ka Elizabet kọọrọ Meri otu amụma gbasara nwa ọ ga-amụ. (Luk 1:39-45) Meri kwuru na Jehova “ji aka ya dị ike mee ihe a niile.” (Luk 1:46-51) Jehova si n’aka Gebriel na Elizabet mee ka Meri dị ike. w23.10 14-15 ¶10-12
Fraịdee, Julaị 18
O mekwara ka anyị bụrụ otu alaeze na ndị nchụàjà nke Chineke ya, bụ́ Nna ya.—Mkpu. 1:6.
E ji mmụọ nsọ tee ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs mmanụ, nke mere ka adịm ná mma ha na Jehova pụọ iche. Ha dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000). Ha na Jizọs ga-abụ ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpu. 14:1) Ihe Ebe Nsọ dị n’ụlọikwuu ahụ nọchiri anya ya bụ na Chineke mere ka Ndị Kraịst e tere mmanụ bụrụ ụmụ ya mgbe ha ka nọ n’ụwa. (Rom 8:15-17) Ebe Kacha Nsọ n’ụlọikwuu ahụ nọchiri anya eluigwe, ebe Jehova bi. “Ákwà mgbochi” nke kewara Ebe Nsọ na Ebe Kacha Nsọ nọchiri anya ahụ́ mmadụ Jizọs nwere nke gbochiri ya ịbanye n’eluigwe ma bụrụ Nnukwu Onye Nchụàjà Kachanụ nke ụlọ nsọ ihe atụ ahụ. Mgbe Jizọs nwụrụ, jiri ahụ́ ya chụọ àjà maka ụmụ mmadụ, o mepere ụzọ ka Ndị Kraịst niile e tere mmanụ nwee ike ịdị ndụ n’eluigwe. Hanwa ga-ahapụkwa ahụ́ mmadụ ha ka ha nwee ike inweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe.—Hib. 10:19, 20; 1 Kọr. 15:50. w23.10 28 ¶13