Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwfq isiokwu 34
  • Ndịàmà Jehova Hà Nwere Baịbụl nke Ha?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndịàmà Jehova Hà Nwere Baịbụl nke Ha?
  • Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Ị Ga-esi Mata Baịbụl A Sụgharịrị Nke Ọma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Otu Ihe Dị Ịrịba Ama Nye Ndị Hụrụ Okwu Chineke n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • New World Translation Ihe Ọtụtụ Nde Mmadụ Ji Kpọrọ Ihe n’Ụwa Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Nsụgharị “New World Translation”—E Dere Ya nke Ọma na n’Ụzọ Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
ijwfq isiokwu 34
Ebe otu nwoke na-agụ Baịbụl

Ndịàmà Jehova Hà Nwere Baịbụl nke Ha?

Ndịàmà Jehova agụọla Baịbụl dị iche iche. Ma, Baịbụl nke ha kacha enwe mmasị ịgụ bụ Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụrụ na ọ dị n’asụsụ ha. Ihe kpatara ya bụ na e dere aha Chineke na ya n’ebe niile o kwesịrị ịdị, ihe e dere na ya bụkwa eziokwu ma doo anya.

  • Ide Aha Chineke. Ụfọdụ ndị sụgharịrị Baịbụl enyeghị onye e kwesịrị inye nsọpụrụ nsọpụrụ. Dị ka ihe atụ, ndị sụgharịrị otu Baịbụl dere aha mmadụ iri asaa só nye aka n’iwepụta Baịbụl ahụ. Ma, ha edeghị aha onye e dere okwu ya na Baịbụl ahụ, ya bụ, Jehova Chineke.

    Ma, e meghị ụdị ihe a na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ. E dere aha Chineke ọtụtụ puku ugboro na ya. E dere ya n’ebe niile ọ dị na Baịbụl mbụ e nwere. Ma, e deghị aha ndị sụgharịrị ya.

  • Ikwu Ihe Bụ́ Eziokwu. Ọ bụghị Baịbụl niile e nwere taa kwuru ihe niile otú e si kwuo ya na Baịbụl mbụ e nwere. Dị ka ihe atụ, lee otú otu Baịbụl si kwuo ihe dị na Matiu 7:​13. Ọ sịrị: “Sinu n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye, n’ihi na ọnụ ụzọ ámá na-eduga na hel dị obosara, okporo ụzọ ya dịkwa mfe ọgịga.” Ma, ihe e dere na Baịbụl mbụ bụ “mbibi” ọ bụghị “hel.” O nwere ike ịbụ na ihe mere ndị sụgharịrị ya ji dee ya “hel” bụ maka na ha kweere na a ga-ata ndị mmehie ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Ma, ihe a abụghị ihe Baịbụl na-akụzi. Ọ bụ ya mere Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ ji dee ya otú e kwesịrị isi dee ya. Ọ sịrị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye; n’ihi na okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara.”

  • Ikwu Ihe Doro Anya. Ọ bụghị naanị na Baịbụl a sụgharịrị nke ọma kwesịrị ịna-ekwu eziokwu, kama ihe ọ na-ekwu kwesịkwara ido anya, dịkwa mfe nghọta. Dị ka ihe atụ, o nwere ihe Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Rom 12:11. A sụgharịa mkpụrụ okwu nke ọ bụla dị n’ihe ahụ o kwuru, ihe ọ pụtara bụ “nye mmụọ nke na-agbọ agbọ.” Ebe ọ bụ na ihe a enweghị ezigbo ihe ọ pụtara n’asụsụ Igbo, lee otú e si dee ya na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ ka o nwee ike ido onye ọ bụla anya. Ọ sịrị: “Ka mmụọ Chineke mee ka unu na-anụ ọkụ n’obi.”

E wezụga itinye aha Chineke n’ebe niile o kwesịrị ịdị, ikwu eziokwu, na ikwu ihe doro anya, o nwekwara ihe ọzọ mere Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ ji pụọ iche. Ihe ahụ bụ na a na-enye ya ndị mmadụ n’efu. O meela ka ọtụtụ nde mmadụ, ma ndị nke na-agaghị azụtali Baịbụl, nwee ike inweta Baịbụl ma gụọ ya n’asụsụ ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya