Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ha “Wee Na-ejupụta na Mmụọ Nsọ, Obi Ana-abụkwa Ha Sọ Aṅụrị”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • ISI NKE 11

      Ha “Wee Na-ejupụta na Mmụọ Nsọ, Obi Ana-abụkwa Ha Sọ Aṅụrị”

      Ihe anyị ga-amụta n’aka Pọl mgbe o zutere ndị mmegide na-achọghị ịnụ ozi ọma

      O Si n’Ọrụ Ndịozi 13:1-52

      1, 2. Olee ihe mere njem Banabas na Sọl na-aga ime ji pụọ iche, oleekwa otú ọrụ ha na-aga ịrụ ga-esi eme ka Ọrụ Ndịozi 1:8 mezuo?

      IHE mere otu ụbọchị tọrọ ọgbakọ dị n’Antiọk ụtọ. N’ime ndị amụma niile na ndị niile na-akụzi ihe n’ọgbakọ ahụ, mmụọ nsọ họpụtara Banabas na Sọl ka ha gaa kwusaa ozi ọma n’ebe ndị dị anya.a (Ọrụ 13:1, 2) N’eziokwu, e nweela mgbe e zipụrụ ụmụ nwoke ruru eru ka ha gaa kwusaa ozi ọma. Ma ebe ndị e zigara ha bụ ebe e nwerela ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Ọrụ 8:14; 11:22) Na nke ugbu a, a ga-eziga Banabas, Sọl, na Jọn Mak, bụ́ onye ga na-ejere ha ozi, ka ha gaa kwusaa ozi ọma n’ebe ọtụtụ mmadụ na-anụbeghị ozi ọma.

      2 Ihe dị ka afọ iri na anọ tupu mgbe ahụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria, ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Nhọpụta a họpụtara Banabas na Sọl ka ha gaa kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ ga-eso mee ka amụma ahụ Jizọs buru mezuo.b

      “Kpọpụtaranụ M Banabas na Sọl Maka . . . Ọrụ” (Ọrụ 13:1-12)

      3. Gịnị mere ịga ebe ndị dị anya ji esi ike n’oge ndịozi?

      3 Taa, ndị mmadụ nwere ike iji naanị otu awa ma ọ bụ abụọ gaa ebe dị ezigbo anya n’ihi na e nweela ihe ndị dị ka ụgbọala na ụgbọelu. Ma, ọ dịghị otú ahụ n’oge ndịozi. N’oge ahụ, ọ bụ ụkwụ ka ndị mmadụ na-ejikarị aga n’okporo ụzọ, ụzọ na-ajọkarịkwa njọ. Ihe ndị mmadụ na-ejili ụkwụ aga n’otu ụbọchị bụ naanị ihe dị ka kilomita iri atọ. Ịga ya na-agwụkwa ezigbo ike.c N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na ọ na-agụsi Banabas na Sọl agụụ ike ịmalite ozi ha, o doro anya na ha ghọtara na ime njem a agaghị adị mfe. E nwere ihe ndị ọ ga-efu ha.​—Mat. 16:24.

      N’OKPORO ỤZỌ

      N’oge ochie, njem okporo ụzọ na-egbu oge, na-agwụkwa ike. Ọ ga-abụkwa na ọ na-adị oké ọnụ karịa iji ụgbọ mmiri eme njem. Ma, ọ bụ naanị ụkwụ ka e nwere ike iji gaa ọtụtụ ebe.

      Onye ji ụkwụ nwere ike ịga naanị ihe dị ka kilomita iri atọ n’ụbọchị. Anwụ, mmiri ozuzo, okpomọkụ, na oyi ga-emekwa ka njem ya ghara ịdịchara ya mfe. O nwekwara ike ịdaba n’aka ndị ohi. Pọl onyeozi kwuru gbasara ebe dị iche iche ọ gara, sị: “Ka m na-aga, e nwere oge ndị m hụsiri anya ma n’osimiri, ma n’aka ndị ohi.”​—2 Kọr. 11:26.

      E nwere ọtụtụ okporo ụzọ a rụrụ nke ọma n’Alaeze Ukwu Rom. N’okporo ụzọ ndị ahụ, e nwere ụlọ ndị njem a rụrụ n’ebe dị iche iche. Ọ ga-ewe onye njem otu ụbọchị iji ụkwụ si n’otu garuo n’ọzọ. N’agbata ụlọ ndị ahụ, e nwere ebe onye njem nwere ike ịzụrụ ihe ndị dị ya mkpa. Ndị na-ede akwụkwọ n’oge ahụ kwuru na ụlọ ndị njem na ebe ndị ahụ a na-azụrụ ihe anaghị adị ọcha, ndị mmadụ na-akarị akarị na ha, àkpịrị́ na-ejukwa na ha. A na-ele ebe ndị ahụ anya ọjọọ n’ihi na ndị ọjọọ na-anọkarị na ha. Ndị nwe ụlọ ndị ijem na-ezukarị ndị njem ohi, ha na-akpọnyekwa ha ndị akwụna, narakwa ha ego maka ya.

      O doro anya na Ndị Kraịst na-agbalị ike ha niile izere ụdị ebe ndị ahụ. Ma ọ bụrụ na ha na-aga n’ebe ha na-enweghị ikwu na ibe, o yiri ka hà na-abanye n’ebe ndị ahụ.

      4. (a) Olee otú e si họpụta Banabas na Sọl, oleekwa ihe Ndị Kraịst ibe ha mere mgbe a họpụtachara ha? (b) Olee otú anyị ga-esi na-akwado ndị e nyere ọrụ n’ọgbakọ?

      4 Ma gịnị mere mmụọ nsọ ji sị ka ‘a kpọpụta Banabas na Sọl iche maka na e nwere ọrụ’ ha ga-arụ? (Ọrụ 13:2) Baịbụl ekwughị ihe kpatara ya. Ihe anyị ma bụ na ọ bụ mmụọ nsọ mere ka a họpụta ha. E nweghị ihe gosiri na ndị amụma na ndị na-akụzi ihe n’ọgbakọ dị n’Antiọk gbara mkpebi ahụ ụkwụ. Kama, ha kwadosiri ya ike. Ha emereghị Banabas na Sọl anyaụfụ. Chegodị otú obi dị Banabas na Sọl mgbe ụmụnna ha buru ọnụ, kpee ekpere ma ‘bikwasị ha aka n’isi wee sị ha gaa nke ọma.’ (Ọrụ 13:3) Anyị kwesịkwara ịna-akwado ndị e nyere ọrụ n’ọgbakọ, ma ndị a họpụtara ka ha bụrụ ndị okenye n’ọgbakọ. Kama imere ha anyaụfụ, anyị kwesịrị ‘iji ha kpọrọ ihe ma na-ahụ ha n’anya nke ukwuu n’ihi ọrụ ha.’​—1 Tesa. 5:13.

      5. Kọwaa otú Banabas na Sọl si kwusaa ozi ọma na Saịprọs.

      5 Mgbe Banabas na Sọl ji ụkwụ ruo Seliushia, bụ́ ebe e nwere ọdụ ụgbọ mmiri nke dị nso n’Antiọk, ha banyere n’ụgbọ mmiri gawa agwaetiti Saịprọs. Njem a dị ihe dị ka narị kilomita abụọ.d Ebe ọ bụ na Banabas bụ nwa amaala Saịprọs, ọ ga-abụ na ọ gụsiri ya agụụ ike izi ndị obodo ya ozi ọma. Mgbe ha ruru Salamis, bụ́ obodo dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Saịprọs, ha egbughị oge ọ bụla. Ozugbo ahụ, “ha malitere ikwusa okwu Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu.”e (Ọrụ 13:5) Banabas na Sọl gazuru Saịprọs niile. Ọ ga-abụ na ha kwusara ozi ọma ná nnukwu obodo ndị e nwere n’ebe ahụ. O nwere ike ịbụ na ha gara ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri abụọ, dabere n’ụzọ ha si.

      N’ỤLỌ NZUKỌ NDỊ JUU

      A sụgharịa okwu bụ́ “ụlọ nzukọ” otú e si ede ya n’asụsụ Grik, ọ pụtara “ịkpọkọta ọnụ.” Ihe a na-aghọta ma e kwuo ya bụ ndị Juu zukọrọ ọnụ ma ọ bụ ọgbakọ ndị Juu. Ma, o mechaziri bụrụ ihe a na-akpọ ebe ndị Juu na-ezukọ.

      Ọ ga-abụ na ndị Juu malitere inwe ụlọ nzukọ mgbe ndị Babịlọn dọọrọ ha n’agha ma ọ bụkwanụ ozugbo ha nọchara afọ iri asaa na Babịlọn lọta. A na-anọ n’ụlọ nzukọ ndị ahụ akụzi ihe, efe Chineke, agụ Akwụkwọ Nsọ ma na-agba ndị mmadụ ume. N’oge ndịozi, obodo ọ bụla dị na Palestaịn nwere ụlọ nzukọ nke ya. A na-enwe ihe karịrị otu ụlọ nzukọ n’obodo ndị ka buo ibu. Na Jeruselem, e nwere ọtụtụ ụlọ nzukọ.

      Ma, mgbe ndị Juu si na Babịlọn lọta, ọ bụghị ha niile laghachiri Palestaịn. Ọtụtụ n’ime ha gara ịchụ ego ná mba ndị ọzọ. N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ isii gara aga, ndị Juu bicha n’otu narị ógbè na iri abụọ na asaa (127) Alaeze Ukwu Peshia chịrị. (Esta 1:1; 3:8) Ka oge na-aga, e nwere ndị Juu bi n’obodo niile dị gburugburu Oké Osimiri Mediterenian. Ndị Juu ndị bi n’ebe dị iche iche rụkwara ụlọ nzukọ ha na-ezukọta na ha n’obodo ọ bụla ha bi.

      N’ụlọ nzukọ ndị Juu, a na-agụpụta Iwu Mosis n’Ụbọchị Izu Ike niile ma kọwaa ya. A na-anọ n’elu ikpo okwu dị elu agụpụta Iwu Chineke. A na-edowekwa oche n’ihu ya nakwa n’akụkụ ya abụọ. Nwoke ọ bụla bụ́ onye Juu nke ji ife Chineke kpọrọ ihe nwere ike ịgụpụta Iwu Mosis, kụzie ihe, ma gbaa ndị mmadụ ume.

      6, 7. (a) Ònye bụ Sajiọs Pọlọs, gịnịkwa mere Baa-Jizọs ji chọọ igbochi ya ịnabata ozi ọma? (b) Gịnị ka Sọl mere iji kụghasịa atụmatụ Baa-Jizọs?

      6 N’oge ndịozi, e ji ife arụsị mara ndị bi na Saịprọs. Mgbe Banabas na Sọl ruru na Pefọs, ha chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. Pefọs dị n’ebe ọdịda anyanwụ Saịprọs. N’ebe ahụ, ha hụrụ “otu nwoke onye Juu, bụ́ dibịa afa. Aha ya bụ Baa-Jizọs. Ọ bụkwa onye amụma ụgha. Ya na onye na-achị ebe ahụ nọ. Aha onye a bụ Sajiọs Pọlọs. Ọ bụ nwoke ma ihe.”f N’oge ahụ, ọtụtụ ndị Rom a ma ama na-agakwuru onye na-agba afa ma ọ bụ onye na-agụ kpakpando ka o nyere ha aka ime mkpebi ndị dị mkpa. Sajiọs Pọlọs, bụ́ “nwoke ma ihe,” medịrị otú ahụ. Ma, ozi Alaeze Chineke masịrị Sajiọs Pọlọs, ya ‘achọọ ịnụ okwu Chineke.’ Ma, obi adịghị Baa-Jizọs, onye a na-etu Elimas, mma. A na-etu ya aha a n’ihi ọrụ ọ na-arụ. Elimas pụtara “dibịa afa.”​—Ọrụ 13:6-8.

      7 Baa-Jizọs ejighị ntị anụ ozi Alaeze Chineke. E mere ya onye ndụmọdụ Sajiọs Pọlọs. N’eziokwu, naanị otú ọ ga-esi eme ka a ghara ịnapụ ya nnukwu ọrụ a e nyere ya bụ “ime ka onye ahụ na-achị ebe ahụ ghara ikwere n’Onyenwe anyị.” (Ọrụ 13:8) Ma Sọl agaghị ekwe ka nwoke a na-eme anwansi n’obí eze megharịa Sajiọs Pọlọs anya. Gịnịzi ka Sọl mere? Baịbụl kwuru, sị: “Sọl, onye a na-akpọkwa Pọl, jupụtara na mmụọ nsọ, wee legidesie ya [ya bụ, Baa-Jizọs] anya ike, sị ya: ‘Gị onye ụdị aghụghọ ọ bụla na ụdị arụrụala ọ bụla juru n’obi, nwa Ekwensu, onye iro nke ihe niile dị mma, gịnị mere i ji akpọdo eziokwu Jehova isi n’ala? Ugbu a, Jehova ga-ata gị ahụhụ. Ị ga-ekpu ìsì, ị gaghịkwa ahụ ìhè anyanwụ ruo nwa oge.’ N’otu ntabi anya ahụ, alụlụụ na ọchịchịrị kpuchiri ya anya, ya ana-asọ ìsì na-achọ onye ga-ejide ya n’aka na-edu ya.”g Gịnị meziri mgbe Pọl rụchara ọrụ ebube ahụ? “Mgbe onye ahụ na-achị ebe ahụ hụrụ ihe merenụ, ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs, n’ihi na ihe ndị ọ nụrụ gbasara Jehova tụrụ ya n’anya.”​—Ọrụ 13:9-12.

      Ebe otu nwanna nwoke ji Baịbụl o mepere emepe n’aka na-agbachitere eziokwu dị na Baịbụl n’ihu ọkàikpe.

      Anyị na-eme ka Pọl, na-agbachitere eziokwu dị na Baịbụl n’atụghị egwu mgbe a na-akpagbu anyị

      8. Olee otú anyị ga-esi na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu ka Pọl?

      8 Pọl atụghị Baa-Jizọs ụjọ. Anyịnwa ekwesịghịkwa ịtụ ndị mmegide ụjọ mgbe ha na-agbalị ime ka okwukwe ndị nwere mmasị n’ozi Alaeze Chineke nyụọ ka ọkụ. Ma, anyị kwesịrị ime ka okwu anyị “na-atọ ụtọ mgbe niile ka ihe e tinyere nnu.” (Kọl. 4:6) Ọ pụtaghị na anyị ga-akwụsị ịkụziri ndị nwere mmasị okwu Chineke maka na anyị chọrọ ịgbara nsogbu ọsọ. Ụjọ ekwesịghịkwa ime ka anyị ghara ịna-agba okpukpe ụgha n’anwụ ebe ọ bụ na ha na-eme ka Baa-Jizọs, ‘na-akpọdo eziokwu Jehova isi n’ala.’ (Ọrụ 13:10) Ka anyị gbalịa na-eme ka Pọl, na-akụziri ndị nwere ezi obi eziokwu dị na Baịbụl n’atụghị egwu. E nwere ike Chineke agaghị enye anyị ikike ịrụ ọrụ ebube otú o nyere Pọl, ma obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya na-adọta ndị kwesịrị ekwesị ka ha mụta eziokwu.​—Jọn 6:44.

      “Okwu Ga-agba Anyị Ume” (Ọrụ 13:13-43)

      9. Gịnị ka Pọl na Banabas mere nke ndị na-eduzi ọgbakọ taa kwesịrị ịna-eme?

      9 Ọ ga-abụ na ihe gbanwere mgbe ha hapụrụ Pefọs banye ụgbọ mmiri gaa ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri ise ruo Paga. Paga dị n’akụkụ oké osimiri dị n’Eshia Maịnọ. N’Ọrụ Ndịozi 13:13, a kpọrọ ha “Pọl na ndị ya na ha so.” Ihe a gosiri na ọ ga-abụzi Pọl na-edu ndị ya na ha so. Mana, e nweghị ihe gosiri na Banabas meere Pọl anyaụfụ. Kama ime otú ahụ, ha abụọ nọgidere na-arụkọ ọrụ iji mezuo uche Chineke. Ndị na-eduzi ọgbakọ Jehova taa kwesịrị ịmụta ihe n’ihe Pọl na Banabas mere. Kama ịzọwa onye ka ibe ya n’ọgbakọ, Ndị Kraịst na-echeta na Jizọs sịrị: “Unu niile bụ ụmụnna.” Ọ sịkwara: “Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala. Onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”​—Mat. 23:8, 12.

      10. Kọwaa otú isi Paga gaa Antiọk dị na Pisidia dịịrị Pọl na Banabas.

      10 Mgbe ha rutere Paga, Jọn Mak hapụrụ Pọl na Banabas laghachi Jeruselem. Baịbụl ekwughị ihe mere o ji laa na mberede. Ma Pọl na Banabas akwụsịghị ozi ha, ha si Paga gaa Antiọk dị na Pisidia, n’ógbè Galeshia. Iji ụkwụ aga ebe a adịghị mfe n’ihi na Antiọk a dị n’elu ugwu. Ụzọ ndị e si aga ya jọrọ njọ, ndị ohi na-anọkarịkwa na ha. Nsogbu ọzọ bụ na ọ dị ka Pọl ọ̀ na-arịa ọrịa mgbe ahụ.h

      11, 12. Olee otú Pọl si mee ka ndị ọ gwara okwu n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị n’Antiọk nwee mmasị n’ihe ọ na-ekwu?

      11 Mgbe Pọl na Banabas rutere n’Antiọk dị na Pisidia, ha banyere n’ụlọ nzukọ ndị Juu n’Ụbọchị Izu Ike. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe a gụpụtachaara ndị mmadụ Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma, ndị isi oche ụlọ nzukọ ahụ sịrị ha: ‘Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ga-agba anyị ume, kwuwenụ ya.’” (Ọrụ 13:15) Pọl biliri ọtọ ikwu okwu.

      12 Otú Pọl si malite okwu ya bụ na ọ kpọrọ ndị na-ege ya ntị “ndị Izrel na ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke.” (Ọrụ 13:16) Ndị Pọl na-agwa okwu bụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu. Olee otú Pọl si mee ka ha nwee mmasị n’ihe ọ na-ekwu, ebe ọ bụ na ha amaghị ọrụ Jizọs na-arụ n’imezu nzube Chineke? Ihe mbụ Pọl mere bụ ịkọtụrụ ha ihe ndị Jehova meere mba Izrel. Ọ kọwara otú Jehova si ‘mee ka ha bụrụ mba dị ike mgbe ha bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt’ nakwa otú o si ‘die omume ọjọọ ha nọ na-eme n’ala ịkpa’ ruo afọ iri anọ mgbe ọ napụtachara ha. Pọl kọkwara otú ndị Izrel si nweta Ala Nkwa ahụ nakwa otú Jehova si ‘nye ndị nna nna ha ala ha.’ (Ọrụ 13:17-19) Ụfọdụ ndị ekwuola na ọ ga-abụ ihe ndị a gụpụtara n’Akwụkwọ Nsọ n’ụbọchị ahụ, otú a na-eme n’Ụbọchị Izu Ike, ka Pọl nọ na-ekwu gbasara ha. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ na-egosi na Pọl ma otú e si ‘eme ihe niile iji nyere ụdị mmadụ niile aka.’​—1 Kọr. 9:22.

      13. Olee otú anyị ga na-esi eme ka ihe anyị na-ekwu ruo ndị anyị na-ezi ozi ọma n’obi?

      13 Anyị kwesịkwara ịna-ekwu ihe ndị ga-eme ka ndị anyị na-ezi ozi ọma nwee mmasị n’ihe anyị na-agwa ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị amata ụdị okpukpe mmadụ na-ekpe, ọ ga-enyere anyị aka ịma isiokwu ga-amasị ya. Anyị nwekwara ike ịgwa ya ihe ndị dị n’amaokwu Baịbụl ndị ọ ma ama. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịka mma ka o si na Baịbụl nke ya gụpụta amaokwu unu na-ekwu gbasara ya. Anyị kwesịrị ịna-achọta ụzọ ndị anyị ga-esi eme ka ihe anyị na-ekwu ruo ndị anyị na-ezi ozi ọma n’obi.

      14. (a) Olee otú Pọl si ziwezie ndị ọ na-agwa okwu ozi ọma banyere Jizọs, oleekwa aka ná ntị ọ dọrọ ha? (b) Gịnị ka ha mere mgbe Pọl gwachara ha okwu?

      14 Ihe ọzọ Pọl kwuru bụ otú e si si n’agbụrụ ndị eze Izrel nweta “onye nzọpụta bụ́ Jizọs” nakwa otú Jọn Onye Na-eme Baptizim si kwadebe ndị Izrel ka ha nabata Jizọs. Pọl kọwaziri otú e si gbuo Jizọs na otú e si kpọlite ya n’ọnwụ. (Ọrụ 13:20-37) Pọl kwuru, sị: “N’ihi ya, ụmụnna m, ya doo unu anya na ọ bụ naanị Jizọs ka Chineke na-esi n’aka ya agbaghara anyị mmehie. Ọ bụ ihe a ka a na-ekwusara unu. . . . Chineke ga-agụ onye ọ bụla kweere na ya n’onye ezi omume.” Onyeozi a dọziri ndị ahụ ọ na-agwa okwu aka ná ntị, sị: “Kpacharanụ anya ka ihe e kwuru n’Akwụkwọ Ndị Amụma ghara ime unu. E kwuru, sị: ‘Unu ndị ọ na-amasị ilelị ihe anya, hụnụ ọrụ m na-arụ n’oge unu. Ọ bụ ọrụ unu na-agaghị ekweta na m rụrụ ọ bụrụgodị na mmadụ akọọrọ unu ya nke ọma. Ma, ọ ga-eju unu anya, unu ga-alakwa n’iyi.’” Mgbe Pọl kwuchara, ihe ndị ọ gwara okwu mere tụrụ ya n’anya. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị Juu rịọrọ ha ka ha gwakwuo ha ihe ndị a n’Ụbọchị Izu Ike na-abịanụ.” Ihe ọzọ bụ na mgbe ndị ahụ zukọrọ n’ụlọ nzukọ ahụ gbasara, “ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu sooro Pọl na Banabas.”​—Ọrụ 13:38-43.

      “Anyị Na-agakwuru Ndị Mba Ọzọ” (Ọrụ 13:44-52)

      15. Olee ihe mere n’Ụbọchị Izu Ike mgbe Pọl kwuchara okwu?

      15 N’Ụbọchị Izu Ike ọzọ, “ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ obodo ahụ niile zukọrọ” ka ha gee Pọl ntị. Ihe a were ụfọdụ ndị Juu iwe, ha ‘amalite ịgbagha ihe Pọl na-ekwu, si otú ahụ kwuluo Chineke.’ Ya na Banabas gwara ha hoo haa, sị: “Ọ dị mma na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke. Ma, ebe ọ bụ na unu jụrụ ya, meekwa onwe unu ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi, anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ. N’ihi na Jehova gwara anyị, sị: ‘Ahọpụtala m gị ka ị bụụrụ mba dị iche iche ìhè, ka i wee gaa n’ebe niile n’ụwa kwusaa otú m ga-esi azọpụta ndị mmadụ.’”​—Ọrụ 13:44-47; Aịza. 49:6.

      Ebe ndị mmegide iwe ji na-achụpụ Pọl na Banabas n’Antịọk dị na Pisidia.

      “Ndị Juu mere ka [e] megidewe Pọl na Banabas. . . . Ndị na-eso ụzọ Jizọs wee na-ejupụta na mmụọ nsọ, obi ana-abụkwa ha sọ aṅụrị.”​—Ọrụ Ndịozi 13:50-52

      16. Gịnị ka ndị Juu mere mgbe Pọl na Banabas gwachara ha okwu n’atụghị egwu, oleekwa ihe ndịozi ahụ mere mgbe a kpagbuwere ha?

      16 Ndị Jentaịl ha gwara okwu ṅụrịrị ọṅụ, “ndị niile na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi wee ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.” (Ọrụ 13:48) N’oge na-adịghị anya, e kwusara okwu Jehova n’ebe niile ná mba ahụ. Ma, ihe ndị Juu mere dị nnọọ iche. Ihe ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ na-ekwu bụ na ndị Juu jụrụ Mezaya n’agbanyeghị na ọ bụ ha ka e bu ụzọ gwa Okwu Chineke. N’ihi ya, Chineke ga-ama ha ikpe. Ndị Juu mere ka ụmụ nwaanyị a ma ama na ụmụ nwoke nwere agba n’obodo ahụ “megidewe Pọl na Banabas. Ha wee mesie ha ike ma chụpụ ha n’obodo ha.” Gịnị ka Pọl na Banabas mere? Ha ‘tichapụụrụ ha ájá dị ha n’ụkwụ ma gawa Aịkoniọm.’ Ihe a ò mere ka a gharazie inwe ndị na-eso ụzọ Kraịst n’Antiọk dị na Pisidia? Mbanụ! Ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị ha hapụrụ ebe ahụ, nọ “na-ejupụta na mmụọ nsọ, obi ana-abụkwa ha sọ aṅụrị.”​—Ọrụ 13:50-52.

      17-19. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Pọl na Banabas, oleekwa otú ime ka ha ga-esi eme ka anyị na-aṅụrị ọṅụ?

      17 Anyị na-amụta ezigbo ihe n’ihe ndịozi ahụ mere mgbe a na-akpagbu ha. Anyị anaghị akwụsị ikwusa ozi ọma, ọ bụrụgodị na ndị a ma ama n’ụwa agbalịa ime ka anyị kwụsị. Ị̀ hụrụ na Pọl na Banabas ‘tichapụụrụ ndị Antiọk ájá dị ha n’ụkwụ’ mgbe ha jụrụ ozi ọma? Ihe a ha mere apụtaghị na ha na-ewe iwe, kama ọ pụtara na ọbara ndị obodo ahụ agaghị adị ha n’isi. Pọl na Banabas ghọtara na ha agaghị amanye ndị mmadụ amanye inwe okwukwe na Jizọs. Kama ihe ha ga-emeli bụ ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. Ha nọgidekwara na-ekwusa ya mgbe ha gara Aịkoniọm.

      18 Oleekwanụ maka ndị na-eso ụzọ Jizọs ha hapụrụ n’Antiọk? N’eziokwu, ha bi n’ebe a na-akpagbu ha. Ma, ọ bụghị ọtụtụ ndị ịnabata ozi ọma ha na-ekwusa ga-eme ka ha nwee obi ụtọ. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụ ndị na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya na-enwe obi ụtọ.” (Luk 11:28) Ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ n’Antiọk dị na Pisidia kpebisiri ike ime ihe a.

      19 Anyị kwesịrị icheta mgbe niile na ọrụ anyị bụ ikwusa ozi ọma otú ahụ Pọl na Banabas mere. Ọ bụ ndị anyị na-ezi ozi ọma ga-ekpebi ma hà ga-anabata ozi anyị na-ezi ha ma hà ga-ajụ ya. Ọ bụrụ na o yie ka ndị anyị na-ezi ozi ọma enweghị mmasị, anyị kwesịrị ịmụta ihe n’aka ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ndịozi. Ọ bụrụ na anyị ejiri eziokwu a kpọrọ ihe ma kwe ka mmụọ nsọ na-eduzi anyị, anyị ga na-aṅụrịkwa ọṅụ, ma mgbe a na-akpagbu anyị.​—Gal. 5:18, 22.

      BANABAS​—“NWA NKASI OBI”

      Josef bụ otu n’ime ndị a ma ama n’ọgbakọ mbụ e nwere na Jeruselem. Ọ bụ onye Livaị, bụrụkwa nwa amaala Saịprọs. Ndịozi gụrụ ya Banabas, nke pụtara “Nwa Nkasi Obi,” n’ihi ụdị mmadụ ọ bụ. (Ọrụ 4:36) Mgbe Banabas chọpụtara na ihe siiri ụmụnna ya ike, o nyeere ha aka ozugbo.

      Ebe Banabas na-enye ndịozi akpa abụọ ego dị na ha n’onyinye.

      Na Pentikọst nke afọ 33 O.N.K., e mere puku mmadụ atọ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs baptizim. Ọ ga-abụ na ọtụtụ n’ime ha gara Jeruselem maka ememme, ha ebughịkwa n’obi ịnọ ebe ahụ otú ha nọruru. Ọgbakọ ahụ chọrọ ego ha ga-eji elekọta ìgwè mmadụ ahụ. N’ihi ya, Banabas rere ala ya ma nye ndịozi ego o retara.​—Ọrụ 4:32-37.

      Banabas bụ onye nlekọta ma nke a na-akọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ihi ya, ọ na-agụ ya agụụ inyere ndị ọzọ aka. N’oge Sọl onye Tasọs chegharịrị ọhụrụ, ọ bụ Banabas nyeere ya aka mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ nọ na-atụ ya ụjọ maka na a ma ya ama na ọ na-emegide ha. (Ọrụ 9:26, 27) Banabas medara obi nabata ndụmọdụ Pọl nyere ya na Pita banyere otú ndị Juu na ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị isi na-akpaso ibe ha àgwà. (Gal. 2:9, 11-14) Ihe atụ ole na ole a gosiri na Banabas bụ “Nwa Nkasi Obi” n’eziokwu.

      a Gụọ igbe bụ́ “Banabas​—‘Nwa Nkasi Obi.’”

      b N’oge ahụ, e nweela ọgbakọ n’ebe dị iche iche ruodị n’Antiọk nke Siria, nke dị ihe dị ka narị kilomita ise na iri ise ma e si n’ebe ugwu Jeruselem gawa ya.

      c Gụọ igbe bụ́ “N’Okporo Ụzọ.”

      d N’oge ndịozi, ọ bụrụ na ifufe enyeghị nsogbu, e nwere ike iji ụgbọ mmiri gaa ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise n’otu ụbọchị. Ma, ọ bụrụ na ihu igwe adịghị mma, njem ahụ nwere ike ịkarị otu ụbọchị.

      e Gụọ igbe bụ́ “N’Ụlọ Nzukọ Ndị Juu.”

      f Ọ bụ Ndị Omeiwu n’Ụlọ Nzụkọ Ndị Rom na-achị Saịprọs. Ha họpụtara gọvanọ na-achị àgwàetiti a ka ọ nọchite anya ha.

      g Malite n’ebe a gawa, a kpọwara Sọl Pọl. Ụfọdụ ndị kwuru na ihe mere o ji zawa aha Rom bụ́ Pọl bụ iji kwanyere Sajiọs Pọlọs ùgwù. Ma, ebe ọ bụ na ọ ka nọ na-aza Pọl mgbe ọ hapụchara Saịprọs, ọ pụtara na e nwere ihe ọzọ kpatara ya. Ihe mere o ji kpebie ịzawa aha Rom ya bụ́ Pọl bụ na ọ bụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ.” O nwere ike ịbụ na ihe ọzọ kpatara ya bụ na aha Hibru ya bụ́ Sọl na-ada ka otu okwu Grik nwere ihe na-adịghị mma ọ pụtara.​—Rom 11:13.

      h Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Pọl degaara Ndị Galeshia akwụkwọ ozi. O dere n’akwụkwọ ozi ahụ, sị: “Ọ bụ ọrịa m rịara mere m ji nweta ohere mbụ m ji zie unu ozi ọma.”​—Gal. 4:13.

  • ‘Jehova Na-enye Ha Ike, Ha Ana-ekwu Okwu Ya n’Atụghị Egwu’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • ISI NKE 12

      ‘Jehova Na-enye Ha Ike, Ha Ana-ekwu Okwu Ya n’Atụghị Egwu’

      Pọl na Banabas dị umeala n’obi, ha tachiri obi, ha atụghịkwa egwu

      O Si n’Ọrụ Ndịozi 14:1-28

      1, 2. Olee ihe ndị mere mgbe Pọl na Banabas nọ na Listra?

      EBE niile nọ na-agba ghara ghara na Listra. Otu nwoke bụ́ onye ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya nọ na-awụli elu, na-aṅụrị ọṅụ mgbe mmadụ abụọ ọ na-amaghị ndị ha bụ gwọrọ ya. Ihe a riri ìgwè mmadụ gbakọtara ebe ahụ ọnụ, ha echee na mmadụ abụọ ahụ bụ chi. Onye nchụàjà Zus wetara okooko osisi ọ ga-ekpuwe ha n’isi, kpụtakwa oké ehi ndị ọ na-ejikere igbu. Ma, Pọl na Banabas tisiri mkpu ike ka ìgwè mmadụ ahụ ghara ime ihe ahụ ha chọrọ ime. Ha dọwakwara uwe ha, maba n’etiti ìgwè mmadụ ahụ, jisie ike rịọta ha ka ha ghara ife ha ofufe.

      2 E nweziri ndị Juu na-emegide Ndị Kraịst ndị si n’Antiọk dị na Pisidia nakwa n’Aịkoniọm bịa. Ha kwutọrọ Pọl na Banabas, mebiekwa obi ndị Listra. Ìgwè mmadụ ndị chọburu ife Pọl gbaziri ya gburugburu, na-atụ ya nkume ruo mgbe ọ tụbọrọ. Ha mechara dọkpụrụ ya gaa n’azụ obodo ma hapụ ya ebe ahụ, chee na ọ nwụọla.

      3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

      3 Gịnị kpatara ihe a merenụ? Gịnị ka ndị na-ekwusa ozi ọma n’oge anyị a ga-amụta n’ihe mere Banabas, Pọl, na ndị bi na Listra, bụ́ ndị gbanwere obi ha ọsọ ọsọ? Oleekwa otú ndị okenye ga-esi na-eme ka Banabas na Pọl, bụ́ ndị tachiri obi n’ozi ha, ‘ndị Jehova nyekwara ike, ha ana-ekwu okwu ya n’atụghị egwu’?​—Ọrụ 14:3.

      ‘Ọtụtụ Ndị Ghọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs’ (Ọrụ 14:1-7)

      4, 5. Gịnị mere Pọl na Banabas ji gaa Aịkoniọm, gịnịkwa mere n’ebe ahụ?

      4 Abalị ole na ole tupu ihe a emee, a chụpụrụ Pọl na Banabas n’obodo ndị Rom a na-akpọ Antiọk dị na Pisidia mgbe ndị Juu bụ́ ndị na-emegide ha kpataara ha nsogbu. Ma kama ikwe ka ike gwụ ha, ha abụọ ‘tichapụụrụ ndị obodo ahụ obi kpọrọ nkụ ájá dị ha n’ụkwụ.’ (Ọrụ 13:50-52; Mat. 10:14) Pọl na Banabas si ebe ahụ pụọrọ onwe ha, hapụ ndị ahụ na-emegide ha ka ha chee aka ghọrọ ihe Chineke ga-eme ha. (Ọrụ 18:5, 6; 20:26) Pọl na Banabas ekweghị ka ihe ahụ merenụ mebie ha obi. Ha kwusaara ozi ọma na-aga. Ha ji ụkwụ gaa ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise (150) n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ. Ha rutere n’otu ala dị larịị nke dị n’agbata ugwu Tọrọs na ugwu Sọltan.

      5 Pọl na Banabas bu ụzọ kwụsịtụ n’Aịkoniọm, bụ́ ebe a ka na-eme omenala ndị Grik n’oge ahụ, bụrụkwa otu n’ime obodo ndị a ma ama na Galeshia, bụ́ ógbè ndị Rom.a Ndị Juu a ma ama na ọtụtụ ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu bi n’Aịkoniọm. Pọl na Banabas banyere n’ụlọ nzukọ malite ikwusa ozi ọma, otú ha na-emekarị. (Ọrụ 13:5, 14) Ha kwuru “okwu otú mere ka ọtụtụ ndị, ma ndị Juu ma ndị Grik, ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.”​—Ọrụ 14:1.

      AỊKONIỌM BỤ OBODO NDỊ FRIJIA

      Aịkoniọm dị na mbara ala dị larịị n’elu ugwu, nke na-eme nri, mmiri na-edekwa nke ọma. Ọtụtụ ụzọ ndị e si aga ahịa n’ebe dị iche iche n’oge ochie si n’Aịkoniọm gafere, dị ka ụzọ jikọrọ Siria, Rom, Gris, na Eshia bụ́ ógbè ndị Rom chịrị.

      Ọ bụ chi nwaanyị a na-akpọ Sibili ka ndị Aịkoniọm na-efe. Ha kweere na ọ bụ chi ọmụmụ. Ụfọdụ ihe ha na-eme n’okpukpe ha bụ ihe ha mụtara n’oge ndị Gris na-achị ha. Ndị Rom malitere ịchị Aịkoniọm n’afọ 65 T.O.N.K. N’oge ndịozi Jizọs, ọ bụ obodo ukwu e ji azụmahịa na ọrụ ubi mara. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị Juu a ma ama biri n’Aịkoniọm, o yiri ka ndị obodo ahụ ka nọ na-eme omenala ndị Grik. N’eziokwu, akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru na ndị Juu na “ndị Grik” bi n’obodo ahụ.​—Ọrụ 14:1.

      Aịkoniọm dị n’agbata Likeonia na Frijia. Obodo abụọ a dị na Galeshia. N’oge ochie, ụfọdụ ndị edemede, dị ka Sisero na Strabo, kpọrọ Aịkoniọm obodo ndị Likeonia. Ọ bụrụkwa na e lee ebe ọ dị, a ga-asị na ọ bụ obodo ndị Likeonia n’eziokwu. Ma, akwụkwọ Ọrụ Ndịozi gosiri na Aịkoniọm dị iche na Likeonia, bụ́ ebe a na-asụ ‘asụsụ ndị Likeonia.’ (Ọrụ 14:1-6, 11) N’ihi ihe a, ndị na-akatọ Baịbụl kwuru na ihe akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru abụghị eziokwu. Ma n’afọ 1910, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ ihe ndị e dere n’obodo ahụ, bụ́ ndị gosiri n’eziokwu na ọ bụ asụsụ Frijia ka a sụrụ n’Aịkoniọm ruo narị afọ abụọ Pọl na Banabas gachara obodo ahụ. N’ihi ya, onye dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwutere ya mgbe o kwuru ihe gosiri na Aịkoniọm dị iche na Likeonia.

      6. Gịnị mere Pọl na Banabas ji bụrụ ezigbo ndị nkụzi, oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ha?

      6 Gịnị mere ihe Pọl na Banabas kwuru ji ruo ndị mmadụ n’obi? Pọl ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ọ kọrọ akụkọ ndị dị na Baịbụl, kwuo ihe ndị e buru n’amụma, nakwa ihe ndị dị n’Iwu Mosis. O ji ha niile mee ka o doo anya na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. (Ọrụ 13:15-31; 26:22, 23) Otú Banabas si kwuo okwu gosiri na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ ya n’obi. (Ọrụ 4:36, 37; 9:27; 11:23, 24) E nweghị onye n’ime ha ji amamihe nke ya kwuo okwu, kama ọ bụ ‘Jehova nyere ha ike ha ji kwuo okwu.’ Olee otú ị ga-esi na-eme ka Pọl na Banabas mgbe ị na-ekwusa ozi ọma? Lekwa ihe ndị i kwesịrị ịna-eme: Mata Okwu Chineke nke ọma. Họrọ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị i chere ga-akacha amasị ndị ị na-agwa okwu. Chọta ụzọ ndị bara uru ị ga-esi na-akasi ndị ị na-ezi ozi ọma obi. Na-akụzi ihe si n’Okwu Jehova, ọ bụghị ihe i chepụtara n’onwe gị.

      7. (a) Olee ihe ndị mmadụ na-eme ma ha nụ ozi ọma? (b) Ọ bụrụ na ezinụlọ unu kewara ekewa maka na ị na-eme ihe e ziri gị n’ozi ọma, gịnị ka i kwesịrị icheta?

      7 Ma, ọ bụghị mmadụ niile nọ n’Aịkoniọm ka obi dị ụtọ mgbe ha nụrụ ihe Pọl na Banabas kwuru. Luk kọrọ, sị: “Ndị Juu na-anabataghị ihe ụmụnna ndị a kwuru mere ka ndị mba ọzọ megidewe ha.” Pọl na Banabas chọpụtara na ha kwesịrị ịnọtụkwu ebe ahụ ma gbachitere ozi ọma. ‘Ha wee nọtụkwuo izu ole na ole ebe ahụ, na-ekwu okwu Jehova n’atụghị egwu.’ N’ihi ya, “ndị obodo ahụ kewara abụọ. Ụfọdụ nọ na-akwado ndị Juu, ndị ọzọ ana-akwado Pọl na Banabas.” (Ọrụ 14:2-4) Ụdị ihe a na-emekwa n’oge a ma e zie ndị mmadụ ozi ọma. Ozi ọma na-eme ka ụfọdụ ndị dịrị n’otu, ma ọ na-emekwa ka ndị ọzọ kewaa. (Mat. 10:34-36) Ọ bụrụ na ezinụlọ unu kewara ekewa maka na ị na-eme ihe e ziri gị n’ozi ọma, cheta na ihe na-akpatakarị mmegide bụ na ndị mmadụ kweere asịrị a kọrọ gbasara anyị ma ọ bụ ụgha a ghagidere anyị. Omume ọma gị nwere ike ime ka a mata na asịrị ahụ niile abụghị eziokwu. O nwekwara ike ime ka obi jụrụ ndị na-emegide gị.​—1 Pita 2:12; 3:1, 2.

      8. Gịnị mere Pọl na Banabas ji hapụ Aịkoniọm, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ha mere?

      8 Mgbe obere oge gafere, ndị mmegide nọ n’Aịkoniọm kpara nkata ịtụ Pọl na Banabas nkume. Mgbe Pọl na Banabas matara, ha gawara ikwusa ozi ọma n’ebe ọzọ. (Ọrụ 14:5-7) Ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze na-emekwa ụdị ihe a n’oge a. Ndị mmadụ katọwa anyị, anyị na-ekwu okwu n’atụghị egwu. (Fil. 1:7; 1 Pita 3:13-15) Ma, ha chọwa imemila anyị, anyị anaghị eme ka ànyị bụ anwụ anwụ n’ihi na ime otú ahụ nwere ike ịta isi anyị ma ọ bụ nke ụmụnna anyị.​—Ilu 22:3.

      “Bịa Fewe Chineke Dị Ndụ” (Ọrụ 14:8-19)

      9, 10. Olee ebe Listra dị, oleekwa ihe anyị ma banyere ndị bi na ya?

      9 Pọl na Banabas gawara Listra, bụ́ obodo ndị Rom na-achị. Ọ dị ihe dị ka kilomita iri atọ ma e si n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Aịkoniọm gawa ya. E nwere ọtụtụ ihe jikọrọ Listra na Antiọk dị na Pisidia, ma ọtụtụ ndị Juu ebighị na Listra otú ha bi n’Antiọk. N’agbanyeghị na ọ ga-abụ na ndị bi na Listra na-asụ Grik, asụsụ obodo ha bụ Likeonia. Pọl na Banabas malitere ikwusa ozi ọma n’ebe ọhaneze na-anọ maka na ọ ga-abụ na e nweghị ụlọ nzukọ ndị Juu n’obodo ahụ. Mgbe Pita nọ na Jeruselem, ọ gwọrọ otu nwoke nwere nkwarụ kemgbe a mụrụ ya. Na Listra, Pọl gwọrọ otu nwoke dara ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya. (Ọrụ 14:8-10) Ọrụ ebube ahụ Pita rụrụ mere ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 3:1-10) Ma, ihe ndị mmadụ mere mgbe Pọl rụrụ ọrụ ebube nke ya dị nnọọ iche.

      10 Dị ka e kwuru ná mmalite isiokwu a, mgbe onye ngwọrọ ahụ maliri elu gawa ije, ìgwè mmadụ ndị na-ekpere arụsị na Listra chere na Pọl na Banabas bụ chi. Ha kpọrọ Banabas Zus, kpọọkwa Pọl Hemis. Zus bụ chi ha kachanụ, Hemis abụrụ nwa Zus na ọnụ na-ekwuchitere chi ha ndị ọzọ. (Gụọ igbe bụ́ “Ndị Listra Na-efe Zus na Hemis.”) Ma, Banabas na Pọl kpebisiri ike na ha ga-eme ka ìgwè mmadụ ahụ ghọta na ọ bụghị arụsị nyere ha ike ha ji kwuo okwu ma rụọ ọrụ ebube ahụ, kama na ọ bụ Jehova, Onye naanị ya bụ ezi Chineke nyere ha ike.​—Ọrụ 14:11-14.

      NDỊ LISTRA NA-EFE ZUS NA HEMIS

      Listra dị n’otu ndagwurugwu nke dị nso n’okporo ụzọ. Siza Ọgọstọs mere ka Listra bụrụ obodo ndị Rom na-achị. Ọ gụkwara ya Julia Felix Gemina Lustra. Ọrụ e nyere ndị agha na-eche nche na Listra bụ ichebe ógbè Galeshia ka ndị bi n’ugwu dị n’ebe ahụ ghara ịbata. N’ihi ya, a chịrị Listra otú ndị Rom si achị obodo. Ndị chịrị ya zakwara aha ndị Rom (ya bụ, aha Latịn). N’agbanyeghị ya, ndị Listra ka nọ na-eme ọtụtụ omenala obodo ha. Ha mere omenala ndị Likeonia karịa nke ndị Rom. Ọ bụ ya mere ndị Listra a kpọrọ aha n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ji na-asụ asụsụ Likeonia.

      Ụfọdụ n’ime ihe ndị mgbe ochie a hụrụ n’ebe obodo Listra oge ochie dịbu bụ ihe ndị e dere gbasara “ndị nchụàjà Zus” nakwa chi Hemis a kpụrụ akpụ. Ihe ọzọ a hụrụ n’ebe ahụ bụ ebe ịchụàjà a rụụrụ Zus na Hemis.

      Otu akụkọ mgbe ochie onye edemede Rom, aha ya bụ Ovid, (afọ 43 T.O.N.K. ruo 17 O.N.K.) dere ga-enyere anyị aka ịghọta ihe a kọrọ gbasara ndị Listra n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. Ovid kwuru na chi ndị Rom aha ha bụ Jupita na Mekuri, nke ndị Grik na-akpọ Zus na Hemis, pụtara n’ụdị mmadụ gaa obodo Frijia nke dị n’ugwu. Ha gara n’otu puku ụlọ ndị mmadụ n’obodo ahụ ma rịọ ha ka ha nọtụ na nke ha, ma e nweghị onye nabatara ha. Naanị otu di na nwunye merela agadi, aha ha bụ Faịlimọn na Bọsis, kpọbatara ha n’obere ụlọ ha. N’ihi ya, Zus na Hemis mere ka ụlọ ahụ ghọọ ụlọ nsọ e ji nkume mabụl na ọlaedo rụọ, meekwa di na nwunye ahụ ndị nchụàjà n’ụlọ nsọ ahụ. Ha bibiziri ụlọ ndị ahụ na-ekweghị akpọbata ha. Otu akwụkwọ aha ya bụ The Book of Acts in Its Graeco-Roman Setting kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ndị Listra chetara akụkọ mgbe ochie ahụ mgbe ha hụrụ ka Pọl na Banabas gwọrọ onye ngwọrọ ahụ, o kwesịghị iju anyị anya na ha chọrọ ịnabata ha ma chụọrọ ha ájá.”

      Ebe Pọl na Banabas na-agbalị ime ka ìgwè mmadụ nọ na Listra ghara ife ha ofufe. Ìgwè mmadụ ahụ na-akụ egwú, na-akwadebe àjà ndị ha ga-achụrụ Pọl na Banabas ma na-akpọrọ ha isiala.

      “Unu kwụsị ife ihe efu ndị a ma bịa fewe Chineke dị ndụ, onye kere eluigwe na ụwa.”​—Ọrụ 14:15

      11-13. (a) Gịnị ka Pọl na Banabas gwara ndị bi na Listra? (b) Olee otu ihe anyị na-amụta n’ihe Pọl na Banabas kwuru?

      11 N’agbanyeghị ihe ìgwè mmadụ ahụ mere, Pọl na Banabas gbalịsiri ike ịchọta otú ha ga-esi kwuo ihe ga-eru ndị ha na-agwa okwu n’obi. Ihe a Luk kọrọ nyeere anyị aka ịmata otú dị mma anyị ga-esi na-ezi ndị na-ekpere arụsị ozi ọma. Ị̀ hụrụ na Pọl na Banabas kwuru ihe mere ka ndị ha na-agwa okwu chee echiche? Ha sịrị ha: “Gịnị mere unu ji eme ihe ndị a? Anyị bụ mmadụ nkịtị otú unu bụ. Anyị na-ezisara unu ozi ọma, ka unu kwụsị ife ihe efu ndị a ma bịa fewe Chineke dị ndụ, onye kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha. N’oge ochie, ọ hapụrụ ndị mba ọzọ niile ka ha na-eme otú masịrị ha. Ma, ihe ọma ndị ọ na-eme na-egosi unu ụdị onye ọ bụ. Ọ na-eme ka mmiri si n’eluigwe zooro unu, na-eme ka mkpụrụ unu kụrụ na-amị n’oge ya n’uju, na-enye unu nri hiri nne, na-emekwa ka unu na-enwe obi ụtọ.”​—Ọrụ 14:15-17.

      12 Olee ihe ndị anyị ga-amụta n’ihe Pọl na Banabas gwara ndị ahụ? Nke mbụ bụ na Pọl na Banabas ewereghị ya na ha ka ndị ha na-agwa okwu. Ha emeghị ka hà bụ ihe ha na-abụghị. Kama nke ahụ, ha ji obi umeala kwuo na ha bụ mmadụ nkịtị na-ezughị okè otú ndị ahụ na-ekpere arụsị ha na-agwa okwu bụ. N’eziokwu, e nyere Pọl na Banabas mmụọ nsọ, meekwa ka ha nwere onwe ha n’ozizi ụgha. E mere ka ha nwee olileanya iso Kraịst chịa n’eluigwe. Ma, ha ghọtara na ọ bụrụ na ndị bi na Listra erubere Kraịst isi, e nwekwara ike inye ha onyinye ndị ahụ.

      13 Olee otú anyịnwa si ele ndị anyị na-ezi ozi ọma anya? Ànyị na-ele ha anya ka ndị anyị na ha hà? Mgbe anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka ha mụta eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke, ànyị na-eme ka Pọl na Banabas, ghara ịchọ ka ndị mmadụ towe anyị? E nwere ezigbo ihe anyị ga-amụta n’aka Nwanna Charles Taze Russell n’okwu a. Ọ bụ onye na-akụzi ihe nke ọma, o butekwara ụzọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma malite n’ihe dị ka afọ 1870 ruo afọ 1916. O dere, sị: “Anyị achọghị ka a na-eto anyị ma ọ bụ na-asọpụrụ anyị n’ihi ihe ndị anyị na-ede. Anyị achọghịkwa ka a na-akpọ anyị Ụkọchukwu ma ọ bụ Rabaị.” Nwanna Russell dị umeala n’obi ka Pọl na Banabas. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ihe mere anyị ji ekwusa ozi ọma abụghị ka ndị mmadụ na-eto anyị, kama ọ bụ ka anyị nyere ha aka ịbịa fewe “Chineke dị ndụ.”

      14-16. Olee ihe nke abụọ na nke atọ anyị ga-amụta n’ihe Pọl na Banabas gwara ndị Listra?

      14 Ka anyị leba anya n’ihe nke abụọ anyị ga-amụta n’ihe Pọl na Banabas gwara ndị ahụ. Pọl na Banabas na-agbanwe otú ha si ezi ozi ọma mgbe ọ dị mkpa ka ha mee otú ahụ. Ndị bi na Listra adịghị ka ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu nọ n’Aịkoniọm. E nweghị ezigbo ihe ndị Listra ma banyere Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ banyere otú ndị Izrel na Chineke si mekọrịta ihe. Ma, ndị ahụ Pọl na Banabas gwara okwu bụ ndị ọrụ ubi. Mmiri na-ezo nke ọma na Listra, ala ha na-emekwa nri nke ọma. Ha na-esi n’ihe ọma dị iche iche ala ha na-emepụta ahụ ọmarịcha àgwà ndị Onye kere ihe niile nwere. Pọl na Banabas ji ihe a ndị Listra ma nke ọma zie ha ozi ọma.​—Rom 1:19, 20.

      15 Ànyị nwere ike ịna-eme ka Pọl na Banabas? Onye ọrụ ubi nwere ike ịkụ otu ụdị mkpụrụ n’ala ya dị iche iche, ma ọ bụghị otu ụzọ ka ọ na-esi akwadebe ala ndị ahụ. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ala ya esighị ike. Naanị ihe ọ ga-emezi bụ ịkụ ihe na ha. Ma, o nwere ike ịdị mkpa ka a kọọ ala ndị ọzọ akọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ịkụ mkpụrụ Alaeze. Ọ bụ otu mkpụrụ ka anyị na-akụ, ya bụ, ozi Alaeze nke dị n’Okwu Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị na-eme ka Pọl na Banabas, anyị ga na-agbalị ịghọta otú ihe si dịrị ndị anyị na-ezi ozi ọma nakwa ihe ndị ha kweere. Anyị ejirizie ihe ndị anyị ghọtara mata otú anyị ga-esi ezi ha ozi Alaeze Chineke.​—Luk 8:11, 15.

      16 E nwere ihe nke atọ anyị ga-amụta n’ihe a kọrọ banyere Pọl, Banabas, na ndị Listra. N’agbanyeghị otú anyị si gbalịsie ike, mgbe ụfọdụ, ajọ onye ahụ na-abịa pụnara ndị mmadụ mkpụrụ anyị ghara n’obi ha ma ọ bụkwanụ mkpụrụ ahụ adaa n’ala nkume. (Mat. 13:18-21) Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee gị, adala mbà. Dị ka Pọl mechara chetara ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Rom, “onye ọ bụla n’ime anyị [ma onye ọ bụla anyị ziri ozi ọma] ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”​—Rom 14:12.

      ‘Ha Nyefere Ha n’Aka Jehova’ (Ọrụ 14:20-28)

      17. Mgbe Pọl na Banabas hapụrụ Dabe, olee ebe ndị ha gara? Hà gakwaranụ ime gịnị?

      17 Mgbe ìgwè mmadụ kpụụrụ Pọl gaa kpụsa n’azụ obodo Listra, chee na ọ nwụọla, ndị na-eso ụzọ Jizọs gbara ya gburugburu, ya ebilie. Ha gosikwara ya ebe ọ ga-ehi n’abalị ahụ. N’echi ya, Pọl na Banabas gawara Dabe. Isi Listra gaa Dabe dị otu narị (100) kilomita. Chegodị otú ahụ́ si na-egbu Pọl mgbu mgbe ha na-aga Dabe, ebe ọ bụ na a ka tụchara ya nkume awa ole na ole gara aga. N’agbanyeghị nke ahụ, ya na Banabas jisiri ike na-aga. Mgbe ha rutere Dabe, ha mere ka “ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.” Mgbe ha mechara, kama isi n’ụzọ ka nso laghachi n’ebe ha bi n’Antiọk nke Siria, “ha laghachiri Listra, Aịkoniọm, na Antiọk [dị na Pisidia].” Hà gara ime gịnị? Ọ bụ ‘ịgba ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ n’ebe ndị ahụ ume ka ha sie ike n’okwukwe.’ (Ọrụ 14:20-22) Ụmụ nwoke abụọ ahụ mere ihe anyị kwesịrị iṅomi. Ihe ka ha mkpa bụ ihe ga-abara ọgbakọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara hanwa uru. N’oge anyị a, ndị nlekọta sekit na ndị ozi ala ọzọ na-emekwa ka Pọl na Banabas.

      18. Olee otú e si ahọpụta ndị okenye?

      18 Ihe Pọl na Banabas mere abụghị naanị ikwu na ime ihe gbara ndị na-eso ụzọ Jizọs ume, kama ha “họpụtakwara ndị okenye n’ọgbakọ nke ọ bụla.” N’agbanyeghị na ọ bụ “Chineke ji mmụọ nsọ ya zipụ” Pọl na Banabas mgbe ha na-aga mba ọzọ ikwusa ozi ọma, ha ka kpekwara ekpere ma buo ọnụ mgbe ‘ha nyefere ndị okenye ahụ n’aka Jehova.’ (Ọrụ 13:1-4; 14:23) Otú ahụ ka a na-eme n’ọgbakọ taa. Tupu ndị okenye ọgbakọ atụọ aro ka a họpụta nwanna, ha na-ekpe ekpere tụlee ma nwanna ahụ ò nwere àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru nwanna ga-enwe tupu a họpụta ya. (1 Tim. 3:1-10, 12, 13; Taị. 1:5-9; Jems 3:17, 18; 1 Pita 5:2, 3) Ihe kacha mkpa abụghị afọ ole nwanna ahụ bụrụla Onye Kraịst. Kama, ọ bụ ma okwu nwanna ahụ, omume ya, na otú e si ele ya anya hà na-egosi na ọ na-ekwe ka mmụọ nsọ na-eduzi ya n’ihe niile ọ na-eme? Ọ bụ inwe àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru na ndị nlekọta kwesịrị inwe ga-eme ka nwanna ruo eruo ịbụ onye ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ. (Gal. 5:22, 23) Ọ bụ onye nlekọta sekit ka ọ dị n’aka ịhọpụta okenye.​—I nwere ike ịtụle 1 Timoti 5:22.

      19. Ònye ka ndị okenye ma na ha ga-aza ajụjụ, oleekwa otú ha si eme ka Pọl na Banabas?

      19 Ndị okenye ma na ha ga-aza Chineke ajụjụ maka otú ha si emeso ọgbakọ. (Hib. 13:17) Ndị okenye na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma otú ahụ Pọl na Banabas mere. Ha na-ekwu okwu na-agba Ndị Kraịst ibe ha ume. Ihe ka ha mkpa bụ ihe ga-abara ọgbakọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara hanwa uru.​—Fil. 2:3, 4.

      20. Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-agụ banyere ọrụ ụmụnna anyị ji obi ha niile na-arụ?

      20 Mgbe Pọl na Banabas mechara laghachi Antiọk nke Siria, bụ́ ebe ha si gawa mba ọzọ ikwusa ozi ọma, ha kọrọ “ọtụtụ ihe Chineke si n’aka ha mee, kọọkwa na o megheerela ndị mba ọzọ ụzọ ha ga-esi kwere na ya.” (Ọrụ 14:27) Mgbe ọ bụla anyị na-agụ banyere ọrụ ụmụnna anyị ji obi ha niile na-arụ ma hụ otú Jehova si gọzie mgbalị ha, ‘Jehova na-enye anyị ike, anyị anọgide na-ekwu okwu ya n’atụghị egwu.’

      a Gụọ igbe bụ́ “Aịkoniọm Bụ Obodo Ndị Frijia.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya