Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jl ihe ọmụmụ 11
  • Gịnị Mere Anyị Ji Aga Mgbakọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Anyị Ji Aga Mgbakọ?
  • Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzukọ Ndị ‘Na-akpali Anyị Inwe Ịhụnanya na Ịrụ Ezi Ọrụ’
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
jl ihe ọmụmụ 11

ISI NKE 11

Gịnị Mere Anyị Ji Aga Mgbakọ?

Mgbakọ ukwu Ndịàmà Jehova nwere na Meksiko

Meksiko

Mgbe a na-ewepụta akwụkwọ ọhụrụ na mgbakọ ukwu e nwere na Jamanị

Jamanị

Ndịàmà Jehova gara mgbakọ ukwu na Bọtswana

Bọtswana

Nwa okorobịa a na-eme baptizim na Nikaragua

Nikaragua

Ebe a na-eme ihe nkiri na mgbakọ ukwu n’Ịtali

Ịtali

Olee ihe mere ihu ji bụrụ ndị e sere na peeji a ọchị ọchị? Ha nọ mgbakọ Ndịàmà Jehova. Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ka ha na-aga mgbakọ ugboro atọ n’afọ. Obi na-adị ha ụtọ ịga mgbakọ ndị ahụ. Taa, ọ na-adịkwa anyị ka oge anyị ga-aga mgbakọ mee ruwe eru. (Diuterọnọmi 16:16) Anyị na-enwe mgbakọ atọ n’afọ. Otu bụ mgbakọ ukwu. Ọ na-ewe abalị atọ. Mgbakọ abụọ ndị ọzọ bụ mgbakọ sekit. Ọ na-ewe otu ụbọchị, ma a na-enwe ya ugboro abụọ n’afọ. Olee uru ịga mgbakọ ndị a na-abara anyị?

Ha na-eme ka anyị matakwuo ụmụnna anyị. Aṅụrị na-eju ụmụ Izrel obi ma ha nọrọ “n’etiti ìgwè ndị zukọrọ ọnụ” na-eto Jehova. Anyịnwa na-enwekwa obi ụtọ ma anyị na ụmụnna anyị zukọta ná mgbakọ na-efe Jehova. (Abụ Ọma 26:12; 111:⁠1) Anyị bịa mgbakọ ndị a, anyị na ụmụnna anyị ndị si ọgbakọ dị iche iche ma ọ bụ ndị si mba ndị ọzọ na-akpakọrịta. Ihe ọzọ na-eme anyị obi ụtọ bụ na anyị na ụmụnna anyị na-erikọ nri ma a gbasaa nnọkọ nke ụtụtụ. (Ọrụ Ndịozi 2:42) Ná mgbakọ ọ bụla anyị gara, anyị na-ahụ ihe na-eme ka obi sikwuo anyị ike na anyị hụrụ ‘ụmụnna anyị dum n’anya.’​—⁠1 Pita 2:⁠17.

Ha na-enyere anyị aka ime uche Chineke. Uru ọzọ ụmụ Izrel na-erite ma ha gaa mgbakọ bụ na a na-akọwara ha Okwu Chineke nke ọma, ha aghọta ya. (Nehemaya 8:​8, 12) Anyịnwa na-ejikwa ihe ndị a na-akụziri anyị ma anyị gaa mgbakọ akpọrọ ihe. Ihe a na-atụle ná mgbakọ nke ọ bụla na-abụ ihe si na Baịbụl. A na-ekwu okwu dị iche iche, ndị mmadụ na-apụtakwa kọọ otú ha si merie nsogbu ha nwere, mgbe ụfọdụkwa ha egosi ndị bịaranụ otú ihe ahụ si mee. Ihe a niile na-enyere anyị aka ịna-eme uche Chineke. A na-akọkwara anyị otú ụmụnna anyị si na-agba mbọ ife Chineke n’oge a ihe siri ezigbo ike. Nke a na-emekwa ka anyị kpebisikwuo ike ịna-eme uche Chineke. Anyị gaa mgbakọ ukwu, a na-enwe ndị na-apụta mee ihe anyị na-akpọ Ihe Nkiri. Ọ na-abụkarị akụkọ si na Baịbụl. Ihe nkiri ahụ na-enyere ndị bịara mgbakọ ahụ aka ịghọtakwu otú ihe ahụ a kọrọ na Baịbụl si mee na ihe anyị kwesịrị ịmụta na ya. Ná mgbakọ ọ bụla anyị gara, a na-eme ndị nyeferela Chineke onwe ha baptizim.

  • Gịnị mere aṅụrị ji eju anyị obi ma anyị gaa mgbakọ?

  • Olee uru ị ga-erite ma ị bịa mgbakọ anyị?

IHE ỌZỌ Ị GA-EME

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ụmụnna anyị si akpa àgwà, gbalịa bịa mgbakọ ọzọ anyị ga-enwe. Gwa onye gị na ya na-amụ ihe ka o gosi gị usoro ihe omume nke mgbakọ anyị ga-aga, ka ị hụ ụdị ihe anyị ga-amụ. Jụọ ya ụbọchị anyị ga-aga mgbakọ ọzọ, kaakwa ụbọchị ahụ ihe na kalenda gị. Jụta ya ebe a ga-enwe mgbakọ ahụ, jisiekwa ike gaa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya