Ihe A Na-amụta Site n’Akụkọ Ihe Mere Eme nke Rom
“Ọ BỤRỤ na, dị ka mmadụ, mụ na anụ ọhịa alụwo ọgụ n’Efesọs.” Ụfọdụ na-eche na okwu ndị ahụ, bụ́ ndị e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 15:32, pụtara na a mara Pọl onyeozi ikpe ịlụ ọgụ n’otu ọgbọ egwuregwu ndị Rom. Ma ò mere otú ahụ ma ọ bụ na o meghị, ịlụgide ọgụ nwụọ n’ọgbọ egwuregwu bụ ihe a na-emekarị n’oge ahụ. Gịnị ka akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị banyere ọgbọ egwuregwu na ihe ndị e mere na ha?
Dị ka Ndị Kraịst, ọchịchọ anyị bụ ịkpụzi akọ na uche anyị ka o kwekọọ n’echiche Jehova, bụ́ nke pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị metụtara ntụrụndụ nke oge a. Dị ka ihe atụ, tụlee echiche Chineke banyere ime ihe ike, bụ́ nke e gosipụtara n’okwu ndị a: “Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo, ahọpụtakwala otu efu n’ụzọ ya nile.” (Ilu 3:31) Ndị Kraịst oge mbụ nwere ndụmọdụ ahụ iduzi ha mgbe ọtụtụ ndị gbara ha gburugburu ghọrọ ndị ọgụ ọnwụ a na-alụ n’ọgbọ egwuregwu ndị Rom riri isi. Ka a na-atụle ihe ndị mere n’ihe omume ndị dị otú ahụ, ka anyị chọpụta ihe doro anya Ndị Kraịst na-aghaghị ịmụta na ha taa.
Mmadụ abụọ na-alụ ọgụ ọnwụ bụ́ ndị ji ngwá ọgụ echee ibe ha ihu n’otu ọgbọ egwuregwu dị na Rom. Na nke mbụ ha gburịtara ọta ibe ha mma, ìgwè mmadụ ahụ ihe omume ahụ na-agba ara etie mkpu nkwado nye onye nke ha ka nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ bụ ọgụ ọnwụ na ndụ. N’oge na-adịghị anya, n’ịbụ onye e merụrụ ahụ́ nke na-apụghịkwa ịlụrụ ọgụ ahụ gaa n’ihu, otu n’ime ha atọgbọ ngwá ọgụ ya ma gbuo ikpere n’ala, si otú a na-ekweta na e meriela ya ma na-arịọ ka e meere ya ebere. Ìgwè mmadụ ahụ etisikwuo mkpu ike. Ụfọdụ n’ime ha ana-eti ka e meere ya ebere, ndị ọzọ ana-eti ka e gbuo ya. Onye ọ bụla ana-ele eze ukwu. N’ịbụ onye na-ege ihe ìgwè mmadụ ahụ na-ekwu, ọ pụrụ ime ka onye agha ahụ e meriri emeri nwere onwe ya ma ọ bụkwanụ, site n’ịtụ mkpịsị aka ukwu ya n’ala, nye iwu ka e gbuo ya.
Ọgụ ọnwụ a na-alụ n’ọgbọ egwuregwu na-eri ndị Rom isi. Ọ pụrụ ịtụ gị n’anya ịmata na ọ bụ n’ememe olili ozu nke ndị a ma ama ka a na-alụ ọgụ dị otú ahụ n’oge mbụ. E kweere na asọmpi ahụ malitere n’iji mmadụ achụ àjà bụ́ nke a hụrụ n’etiti ndị Oscan ma ọ bụ ndị Samnium nke ebe bụzi ebe etiti Ịtali. A chụrụ àjà ndị ahụ iji mee ka obi jụrụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ. A na-akpọ ọgụ dị otú ahụ munus, ma ọ bụ “onyinye” (munera, n’ụdị ụbara ya). Oge e mere egwuregwu a na Rom na nke mbụ ya e dekọrọ edekọ bụ na 264 T.O.A., bụ́ mgbe òtù atọ dị mmadụ abụọ abụọ lụrụ ọgụ ọnwụ a n’ahịa oké ehi. N’ememe olili ozu Marcus Aemilius Lepidus, òtù 22 dị mmadụ abụọ abụọ lụrụ ya. N’ememe olili ozu Publius Licinius, òtù 60 dị mmadụ abụọ abụọ chịpụrụ ya. Na 65 T.O.A., Julius Caesar kpọbara òtù 320 dị mmadụ abụọ abụọ n’ọgbọ egwuregwu.
“E ji ememe olili ozu ndị oké ozu mee ihe dị ka otu ụzọ e si azọta ọkwá ọchịchị,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Keith Hopkins na-akọ, “egwuregwu ndị a na-eme n’olili ozu bụkwa ihe e ji akwalite ndọrọ ndọrọ ọchịchị . . . n’ihi na ha na-amasị ụmụ amaala ruru eru ịtụ vootu. N’ezie, ọ bụ ọkwá ọchịchị nke ndị oké ozu nwere oké ọchịchọ na-azọ kasị mee ka ọgụ ọnwụ a na-alụ n’ọgbọ egwuregwu bụrụ ihe na-ewu ewu.” Ka ọ na-erule n’oge ọchịchị Ọgọstọs (27 T.O.A. ruo 14 O.A.), munera aghọọla nnukwu onyinye—maka ime ndị mmadụ obi ụtọ—nke ndị ọchịchị bara ọgaranya na-enye iji rịgokwuo n’ọkwá ọchịchị.
Ndị Na-eme Ya na Ọzụzụ A Na-enye Ha
Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee ndị na-alụ ọgụ ọnwụ a n’ọgbọ egwuregwu?’ Ha pụrụ ịbụwo ndị ohu, ndị omekome a mara ikpe ọnwụ, ndị a dọọrọ n’agha, ma ọ bụ ndị ikom nweere onwe ha bụ́ ndị oké mkpali ma ọ bụ olileanya nke ịbụ ndị a ma ama na ọgaranya mere ka ha sonye na ya. A na-enye ha nile ọzụzụ n’ogige ndị yiri ụlọ mkpọrọ. Akwụkwọ bụ́ Giochi e spettacoli (Egwuregwu na Ihe Nkiri) na-akọ na ndị a na-enye ọzụzụ dị ka ndị na-alụ ọgụ ọnwụ bụ ndị a “na-eche nche mgbe nile ma na-enye ịdọ aka ná ntị sigburu onwe ya n’ike, iwu tara akpụ, na karịsịa ntaramahụhụ kpụ ọkụ n’ọnụ . . . Otú a e si mesoo ha ihe dugara ha mgbe mgbe n’igbu onwe ha, n’ịgba isi akwara, nakwa ná nnupụisi.” Ogige kasị ukwuu a nọ nye ndị na-alụ ọgụ ọnwụ ọzụzụ na Rom nwere ọnụ ụlọ nga ndị ga-aba ma ọ dịkarịa ala otu puku ndị mkpọrọ. Onye nke ọ bụla nwere ụdị ọgụ nke ọ na-amụ ka e si alụ ya. Ụfọdụ na-eyi uwe ígwè, na-eji ọta na mma agha alụ ọgụ, ndị ọzọ na-eji ụgbụ na ube nwere ọnụ atọ. Ndị ọzọkwa bụ ndị a na-enye ọzụzụ ịlụso anụ ọhịa ọgụ n’ụdị ọgụ ọzọ na-ewu ewu, bụ́ ịchụ nta. Ọ̀ pụrụ ịbụ na Pọl nọ na-ezo aka kpọmkwem n’ihe omume dị otú a?
Ndị na-ahazi egwuregwu ọgụ a pụrụ ịchọ enyemaka n’aka ndị aka ji akụ̀ bụ́ ndị na-akpọrọ ndị dị afọ 17 ma ọ bụ 18 ma nye ha ọzụzụ ịghọ ndị na-alụ ọgụ ọnwụ. Iji mmadụ agba mgbere bụ oké azụmahịa. Mmadụ 10,000 na-alụ ọgụ ọnwụ lụsoro anụmanụ 11,000 ọgụ n’otu egwuregwu pụrụ iche nke Trajan haziri iji mee ememe maka mmeri o meriri n’agha.
Otu Ụbọchị n’Ọgbọ Egwuregwu
Ihe a na-eme n’ọgbọ egwuregwu n’ụtụtụ bụ nanị ịchụ nta. A pụrụ ịkpụba ụdị anụmanụ dịgasị iche iche n’ọgbọ egwuregwu. Ndị nkiri na-enwe mmasị karịsịa n’ọgụ dị n’etiti oké ehi na anụ ọhịa bear. Mgbe mgbe, a na-eliwe ha abụọ n’otu ebe ka ha lụgide ọgụ ruo mgbe otu n’ime ha nwụrụ, e mesịa, dinta na-egbu nke ahụ ka dị ndụ. Ọgụ ndị ọzọ na-ewu ewu bụ nke ọdụm na agụ, ma ọ bụ nke enyí na anụ ọhịa bear. Ndị dinta na-egosipụta nkà ha n’igbu anụmanụ ndị e si ná mba ndị ọzọ dị n’alaeze ukwu ahụ kpụta, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ha—agụ owuru, anụ rhino, enyí mmiri, anịgọ, hyena, camel, anụ wolf, boar, na ele.
Otú ebe a na-eme egwuregwu ịchụ nta ahụ na-adị na-eme ka a ghara ichefu ya echefu. A na-eji oké nkume, iyiala, na osisi eme ka ebe ahụ yie oké ọhịa. N’ọgbọ egwuregwu ụfọdụ, anụ ọhịa na-apụta dị ka a ga-asị na ọ bụ site na majik, a na-eji ígwè mbugo na ibo ụzọ mbugo ndị si n’okpuru ala akpụpụta ha. Akparamàgwà a na-atụghị anya ya anụmanụ ndị ahụ na-egosipụta sokwa eme ka ọ na-akpali mmasị, ma ihe yiri ka ọ bụ ya mere egwuregwu ịchụ nta ji akpali akpali karịsịa bụ mmekpọ ọnụ.
Ihe ọzọ a na-eme n’usoro ihe omume ahụ bụ ogbugbu. A na-agbalị igosi ha otú ha dị kpọmkwem. A na-eme ihe nkiri nke akụkọ ifo ndị ndị mere ha nwụrụ n’ezie.
N’oge ehihie, ndị na-alụ ụdị ọgụ ọnwụ dị iche iche bụ́ ndị jiri ejiji ọgụ n’ụzọ dịgasị iche iche, bụrụkwa ndị e nyere ọzụzụ dịgasị iche iche na-alụso ibe ha ọgụ. A na-eji ụfọdụ n’ime ndị na-ebupụ ozu ha ejiji dị ka ndị chi okpuru ala.
Mmetụta Ọ Na-enwe n’Ahụ́ Ndị Nkiri
Oké ọchịchọ ìgwè mmadụ ahụ na-enwe ka a lụwa ọgụ adịghị ekwe mmeju, n’ihi ya, a na-apịa ndị jụrụ ịlụ ọgụ ụdọ na ígwè. Ìgwè mmadụ ahụ na-eji oké olu kwuo, sị: “Gịnị mere o ji jiri ụjọ bịa ọgụ? Gịnị mere o ji egbu mma ya ka onye ike gwụrụ? Gịnị mere na [ọ chọghị iji obi ya nwụọ]? Pịa ya ihe ka ahụ́ gbagaa ya! Ha gburịta onwe ha mma, ha eyikwasịla ihe n’obi ha ka mma wee nwee ike iru ha!” Otu onye ọnụ na-eru n’okwu na Rom bụ́ Seneca na-ede na mgbe e nwere nkwụsịtụ, a na-ama ọkwa, sị: “A ga-egbupụ ụfọdụ ndị olu ugbu a, ka e wee nwee ihe ga na-aga n’ihu!”
Ọ bụghị ihe ijuanya na Seneca kwetara na ya lọtara n’ebe obibi ya nwee “obi ọjọọ na afọ ịta mmiri karị.” Ihe ahụ onye nkiri ahụ kwetara n’ezoghị ọnụ kwesịrị ka anyị chebasiere ya echiche ike. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ụfọdụ n’ime egwuregwu ndị a na-eme taa na-emetụta ndị na-ekiri ha n’ụzọ yiri nke ahụ, na-eme ka ha na-aghọ ndị nwere “obi ọjọọ na afọ ịta mmiri karị”?
Ụfọdụ pụrụ iwere ya na ọ dabaara ha nke ọma na ha lọtadịrị alọta. Mgbe otu onye nkiri kwuru okwu na-atọ ọchị banyere Domitian, eze ukwu ahụ mere ka e si n’oche ya dọkpụpụta ya ma tụbara ya nkịta. N’ihi enweghị ndị omekome a ga-egbu egbu, Caligula nyere iwu ka e jide ìgwè ndị nọ n’otu akụkụ nke ọgbọ egwuregwu ma tụbara ha anụmanụ. Mgbe ngwá ọrụ ndị e ji eme ihe n’ọgbọ egwuregwu na-arụghịkwa ọrụ otú Klọdịọs si chọọ, o nyere iwu ka ndị ọrụ ahụ dị n’aka pụta n’ọgbọ egwuregwu lụrịta ọgụ.
Ndị nkiri ịnụbiga ọkụ n’obi ókè kpatakwara ọdachi na ọgba aghara. Otu ọgbọ egwuregwu nke dị kpọmkwem n’ebe ugwu Rom dara, a kọkwara na ọtụtụ puku mmadụ nwụrụ na ya. Ọgba aghara tiwapụrụ n’oge a na-eme egwuregwu na Pompeii na 59 O.A. Tacitus na-akọ na ọgụ nke ndị a nọ n’obodo ha na-eme egwuregwu na ndị si n’obodo dị ha nso bịa lụrụ na-amalite site n’ịkpọ iyi, e mesịa ha atụwa nkume, n’ikpeazụ ha ejiri mma agha chịpụ ya. E gbupụrụ ọtụtụ ndị aka na ụkwụ ma ọ bụ merụọ ha ahụ́, e gbukwara ọtụtụ ndị egbu.
Ihe Mmụta Doro Anya
Otu ihe ngosi (Sangue e arena, “Ọbara na Ájá”) e mere n’ọgbọ egwuregwu bụ́ Colosseum nke dị na Rom na-egosi ụdị nke oge a nke munera. N’ụzọ dị ịrịba ama, e gosiri ihe nkiri vidio banyere ịlụso oké ehi ọgụ, ịkụ ọkpọ, mkpọka ụgbọala na ọgba tum tum ndị e ji eme egwuregwu ọsọ kpọkara n’ụzọ na-eyi egwu, ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ ndị na-eme egwuregwu lụrụ, na ọgụ aghara ndị nkiri lụrụ. Ihe ikpeazụ e gosiri na vidio ahụ bụ foto a nọ n’elu see ọgbọ egwuregwu Colosseum. Gịnị ka i chere na ndị nleta ga-ekwubi? Mmadụ ole ga-amụta ihe a kụziri na ya?
Ọgụ nkịta, ọgụ ọkụkọ, ịlụso oké ehi ọgụ, na egwuregwu ihe ike bụ ihe na-ewu ewu n’ala ụfọdụ taa. A na-eyi ndụ egwu n’egwuregwu ụgbọala iji mee ka obi dị ìgwè mmadụ ụtọ. Cheekwa banyere ihe ndị a na-egosi na telivishọn kwa ụbọchị. Nchọpụta e mere n’otu ala dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ụwa gosiri na mgbe nwatakịrị na-ekiri TV otú o kwesịrị na-erule afọ iri, ọ pụrụ ikiri ihe omume 10,000 e gburu mmadụ na ha na 100,000 ihe omume ime ihe ike.
Ihe ụtọ a na-enweta n’ihe nkiri ndị ahụ “ekwekọghị n’ezi okpukpe nakwa n’ezi nrubeisi nye ezi Chineke,” ka onye edemede nke narị afọ nke atọ bụ́ Tertullian kwuru. O weere ndị na-aga ekiri ha dị ka ndị so ndị ahụ lụrụ ọgụ gbuo mmadụ. Gịnị banyere oge a? Mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Ihe omume ndị a kwafuru ọbara, gbuo mmadụ, ma ọ bụ mee ihe ike na ha bụ́ ndị a na-egosi na telivishọn ma ọ bụ n’Intanet hà na-atọ m ụtọ?’ Ọ bụ ihe kwesịrị ncheta na Abụ Ọma 11:5 na-ekwu, sị: “Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.”
[Igbe dị na peeji nke 28]
Ọgụ Ndị A Lụrụ Iji “Mee Ka Obi Jụrụ Ndị Nwụrụ Anwụ”
Banyere otú ọgụ ọnwụ ndị a lụrụ n’ọgbọ egwuregwu si malite, onye edemede narị afọ nke atọ bụ́ Tertullian na-ekwu, sị: “Ndị mgbe ochie chere na site n’ime ụdị egwuregwu a, ha na-ejere ndị nwụrụ anwụ ozi, mgbe ha jisịrị ụdị mmekpọ ọnụ ọgbara ọhụrụ mee ka ọ bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ. N’ihi na n’oge ochie, n’ihi ikwere na a na-eji ọbara mmadụ eme ka mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ jụrụ, ha na-adị eji ndị a dọọrọ n’agha ma ọ bụ ndị ohu na-abachaghị uru bụ́ ndị ha zụtara achụ àjà n’ememe olili ozu. Mgbe e mesịrị, ọ bịara yie ha ihe dị mma ikpuchi enweghị nsọpụrụ ha site n’ime ka ọ bụrụ ihe na-atọ ụtọ. Ya mere, mgbe ha nyesịrị ndị ahụ ha zụtara ọzụzụ ruo otú ike kwere ha banyere ụzọ e si eji ngwá ọgụ ndị ha nwere n’oge ahụ alụ ọgụ—ọzụzụ a na-enye ha bụ ịmụta ịbụ ndị a ga-egbu!—ha na-egbuzi ha n’ili n’ụbọchị olili ozu a kara aka. Ya mere, ha ji igbu ọchụ akasi onwe ha obi ma mmadụ nwụọ. Otú a ka munus si malite. Ma ka oge na-aga, ọganihu ha nwere n’ụzọ ọdịnala na obi ọjọọ a na-egosipụta na ha bịara hara nhata; n’ihi na ụbọchị ezumike adịghị atọ ụtọ, ọ gwụla ma ajọ anụ ọhịa n’onwe ha hà dọrisiri anụ mmadụ. A na-ewere ihe a chụrụ n’àjà iji mee ka obi jụrụ ndị nwụrụ anwụ dị ka ihe e ji kwaa ozu.”
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Okpu na ihe ndị na-alụ ọgụ ọnwụ ji echebe ihu ụkwụ ha
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
Ndị Kraịst oge ochie lere ntụrụndụ ihe ike anya dị ka ihe na-adịghị atọ ụtọ. Ị̀ na-ele ya anya otú ahụ?
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Ịkụ ọkpọ: Dave Kingdon/Index Stock Photography; ụgbọala kpọkara akpọka: AP Photo/Martin Seppala
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]
Phoenix Art Museum, Arizona/Bridgeman Art Library