Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 10/8 p. 7-10
  • Ndụ Nwere Nchebe Na-adịgide Adịgide

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ Nwere Nchebe Na-adịgide Adịgide
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Bibiri Mmalite Nwere Nchebe
  • Debe Ihe Ime Mmụọ n’Ọnọdụ Mbụ
  • “Kpọkuo Chineke Unu, Bụ́ Jehova”
  • Ezi Omume, Ịnọ Jụụ, na Nchebe
  • Ezi Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Ugbu A na Mgbe Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịchọ Ndụ Nwere Nchebe
    Teta!—1998
  • Ihe Anyị Ga-eme Ka Obi Na-eru Anyị Ala
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Dị Nso!
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 10/8 p. 7-10

Ndụ Nwere Nchebe Na-adịgide Adịgide

Ọ BỤRỤ na ahụ ọkụ ji gị, ikekwe ị ga-aṅụ ọgwụ iji kwụsị isi ọwụwa ahụ na ikekwe akpa ice iji mee ka ahụ jụọ gị oyi. Ma ọ bụ ezie na ọgwụ na akpa ice na-eme ka e nwee ike idi mgbaàmà ahụ, ha adịghị agwọ ihe kpatara ahụ ọkụ gị. Ọ bụrụkwa na ọrịa gị siri ike, ọgwụgwọ sitere n’aka dibịa ma ọrụ dị gị mkpa.

Ahụ ọkụ na-adịghị akwụsị akwụsị nke enweghị nchebe ji ihe a kpọrọ mmadụ. N’ụzọ ziri ezi anyị na-ewere nzọụkwụ ndị na-adịru nwa oge iji belata ihe mgbaàmà ndị na-adịghị enye obi ụtọ, ma ọgwụgwọ ya pụrụ ịbịa nanị site n’aka onye pụrụ ịchọpụtasị ihe kpatara nsogbu anyị. Ọ dịghịkwa onye maara ihe a kpọrọ mmadụ nke ọma karịa Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke. Ọ maara na ndụ enweghị nchebe n’ihi nsogbu ndị e wetaara anyị.

E Bibiri Mmalite Nwere Nchebe

Okwu Chineke na-akọwa na Jehova kere mmadụ abụọ mbụ ahụ dị ka ndị zuru okè ma tinye ha na gburugburu ebe obibi nwere nchebe. Ha enweghị nchegbu. Nzube Chineke bụ ka mmadụ dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi na paradaịs, na-enwe nchebe zuru ezu. Gburugburu ebe obibi mbụ nke ihe a kpọrọ mmadụ nwere ‘osisi nile ọ bụla bụ́ nke a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri.’ Rịba ama na e gboro mkpa anụ ahụ ha; otú ahụ ka ọ dịkwa mkpa mmetụta uche ha, ebe a kọwara gburugburu ebe obibi ahụ dị ka “nke a na-achọsi ike n’ile anya.” Obi abụọ adịghị ya na nke a pụtara na e tinyere mmadụ abụọ mbụ ahụ na gburugburu ebe obibi nke mesiri ha obi ike banyere ndụ e ji n’aka, nke na-enweghị nsogbu.—Jenesis 2:9.

Adam na Iv jụrụ ịchịisi ịhụnanya eluigwe na ala nke Chineke, si otú a webata mmetụta nke inwe obi abụọ, egwu, mmechuihu, obi amamikpe, na enweghị nchebe ná ndụ ha. Mgbe ọ jụsịrị Chineke, Adam kwetara na ya ‘tụrụ egwu.’ Mmadụ abụọ mbụ ahụ kpuchiri onwe ha ma zopụ n’ebe Onye Okike ha na-ahụ n’anya nọ, bụ́ onye ha na ya nọworo na-enwe mmekọrịta chiri anya na nke bara uru ruo mgbe ahụ.—Jenesis 3:1-5, 8-10.

Nzube mbụ nke Jehova agbanwebeghị. Bible na-ekwu na Onye Okike anyị bụ Chineke na-ahụ n’anya, onye ga-eme n’isi nso ka ihe a kpọrọ mmadụ nwee ike iweghachi ụwa n’ọnọdụ paradaịs na ibi ná nchebe ruo mgbe ebighị ebi. E kwere nkwa site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma, sị: “M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: . . . ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 65:17, 18) Banyere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị a, Pita onyeozi na-ekwu, sị: “Nke ezi omume bi n’ime ha.”—2 Pita 3:13.

Olee otú a ga-esi mezuo nke a? Site n’otu ọchịchị nke Jehova guzobere. Nke a bụ Alaeze ahụ nke Jisọs Kraịst gwara ụmụazụ ya ka ha na-ekpe ekpere maka ya, sị: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ. Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:9, 10.

Alaeze Chineke ga-anọchi anya ọchịchị ụmụ mmadụ ma jiri ịhụnanya mezuo nzube Chineke n’ụwa nile. (Daniel 2:44) Obi abụọ, egwu, mmechuihu, na enweghị nchebe nke tiworo ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti kemgbe ụbọchị Adam ga-apụ n’anya. Dị ka Bible si kwuo, Alaeze ahụ dị nso. Ọbụna ugbu a, n’ụwa anyị nke a na-ejighị n’aka, ndị agụụ Alaeze Chineke na-agụsi ike nwetụrụ nchebe.

Debe Ihe Ime Mmụọ n’Ọnọdụ Mbụ

Devid bụ ohu Chineke nke maara ihe ịnọ n’egwu na ná nsogbu pụtara. N’agbanyeghị nke ahụ Devid dere, dị ka e dekọrọ ya n’Abụ Ọma 4:8, sị: “N’udo ka m ga-eji otu mgbe ahụ dinaa ala, rahụ ụra: n’ihi na Gị onwe gị, Jehova, nanị Gị, na-eme ka m biri ná ntụkwasị obi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Jehova nyere Devid mmetụta nke inwe nchebe, ọ bụ ezie na nsogbu gbara Devid gburugburu mgbe ụfọdụ. Ànyị pụrụ ịmụta ihe site na nke a? Olee otú anyị pụrụ isi nwetụ nchebe ọbụna n’ụwa nke na-enweghị nchebe?

Tụlee ihe ndekọ Jenesis banyere Adam na Iv. Olee mgbe ha tụfuru mmetụta ha nke inwe nchebe? N’oge ahụ ha kwụsịrị mmekọrịta ha na Onye Okike ma jụ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube ya maka ihe a kpọrọ mmadụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị emegharịa usoro a site n’ịmalite iso Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya ma na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya, ọbụna ugbu a anyị pụrụ inwe ndụ nwere nchebe karịa nnọọ ka ọ gaara ekwe omume ma anyị emeghị otú ahụ.

Ịbịa mara Jehova site n’ịmụ Bible na-enyere anyị aka ịghọta nzube nke ndụ. Nanị mgbe ahụ ka anyị ga-aghọta ndị anyị bụ na ihe mere anyị ji nọrọ n’ebe a. Ndụ nwere nchebe pụrụ ikwe mee mgbe anyị hụrụ Chineke n’anya, mata nzube ya maka ihe a kpọrọ mmadụ, ghọtakwa ebe anyị kwekọrọ. Otu nwoke aha ya bụ Paul chọpụtara nke ahụ ọtụtụ afọ gara aga.

A mụrụ ma zụlite Paul n’otu n’ime àgwàetiti ndị dị kpọmkwem ná mpụga ụsọ oké osimiri Germany. N’ihi ahụmahụ ndị mụrụ ya nwere n’Agha Ụwa nke Abụọ, ezinụlọ ya enweghị mmasị n’okpukpe. Paul kwuru banyere onwe ya mgbe ọ bụ nwa okorobịa, sị: “Ọ dịghị ihe m kwere na ya, ọ dịghịkwa onye m na-akwanyere ùgwù. Ana m aṅụ mmanya na-aba n’anya iji chezọọ iru újú m, na-aṅụbiga mmanya ókè ugboro abụọ ma ọ bụ atọ n’izu. Ndụ m enweghị nchebe.”

Mgbe ahụ Paul sooro otu n’ime Ndịàmà Jehova kwurịta okwu. Paul rụrụ ụka nke ukwuu, ma otu ihe Onyeàmà ahụ kwuru mere ka o chee echiche. “Ọ dịghị ihe na-eme na nkịtị.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ihe nile e kere eke anyị na-ahụ gburugburu anyị aghaghị inwe Onye Okike.

“Echere m echiche banyere nke ahụ ugboro ugboro, aghaghịkwa m ikweta.” Ya mere Paul sooro Ndịàmà Jehova mụọ Bible ma bịa mara Jehova. Ọ na-ekweta, sị: “E wezụga ndị mụrụ m, Jehova bụ onye mbụ ná ndụ m nke metụwooro m ihe ọ bụla.” E mere Paul baptism dị ka Onyeàmà na 1977, ọ na-ekwukwa, sị: “Ugbu a ama m ihe bụ nzube nke ndụ n’ezie. Ana m anụ ụtọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Jehova. Ana m enwe mmetụta nke inwe nchebe, ebe ọ bụ na ọ dịghị ihe pụrụ ime mụ ma ọ bụ ezinụlọ m nke Jehova na-apụghị imezi n’ọdịnihu.”

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ a? Paul meriri enweghị nchebe ya—nsogbu mmetụta uche—site n’itinye uche ọ bụghị n’akụ̀ na ụba nkịtị kama n’ihe ime mmụọ. Ọ zụlitere mmekọrịta chiri anya nke ya na Onye Okike. Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova na-anụ ụtọ mmekọrịta dị otú ahụ. Nke a na-enye ha ume dị n’ime nke na-enyere ha aka ịchụ onwe ha n’àjà ná mmekọrịta nke ha na ndị ọzọ. N’ịkpọtụrụ ndị mmadụ n’ebe obibi ha, Ndịàmà Jehova na-eji oge ha enyere ndị ọzọ aka ime ka ndụ ha nwee nchebe karị site n’itinye uche n’ihe ime mmụọ. Ma Ndịàmà na-eme ihe karịrị ime nkwusa.

“Kpọkuo Chineke Unu, Bụ́ Jehova”

Na July 1997 mgbe Osimiri Oder sọrọ idei wee kpuchie ebe ndị buru ibu n’ebe ugwu Europe, Ndịàmà Jehova nọ na Germany nụrụ banyere ọnọdụ ọjọọ nke ndị nọ na Poland ha na ha gbara agbata obi. Gịnị ka ha pụrụ ime? Onyeàmà nke ọ bụla nọ n’ime na gburugburu Berlin gosiri mmesapụ aka dị ịtụnanya site n’inye ihe karịrị $116,000 n’afọ ofufo n’ime ụbọchị ole na ole.

Ndịàmà nwere ahụmahụ n’ọrụ ihe owuwu jiri ụgbọala mee njem were hour isii—n’ego aka ha—site na Berlin ruo n’ógbè ahụ dị nso na Wrocław, Poland. N’otu obodo nta, ọtụtụ ụlọ mebiri nnọọ nke ọjọọ ya. Ụlọ nke otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà kwụ n’ime mmiri karịrị mita 6. Nwa ha nwanyị na-eme atụmatụ ịlụ di n’ọnwa na-eso ya nakwa ka ya na di ya biri n’ụlọ ahụ. Gịnị ka a pụrụ ime iji rụzie ụlọ ahụ na iji nyere ezinụlọ ahụ aka, bụ́ ndị ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe nile ha nwere funahụrụ ha?

Ozugbo idei mmiri ahụ tara, otu onye agbata obi ha jụrụ n’ụzọ ịkwa emo, sị: “Gịnị ma unu kpọkuo Chineke unu, bụ́ Jehova, lee ma ọ̀ ga-enyere unu aka?” Lee ka o si ju onye agbata obi ha ahụ anya mgbe ọtụtụ ụgbọala si Germany gbarutere n’ụlọ ezinụlọ ahụ bụ́ Ndịàmà echi ya! Ìgwè ndị ọbịa si n’ụgbọala ndị ahụ rịtuo ma malite ịrụzi ụlọ ahụ. “Olee ndị ha bụ? Ònye ga-akwụ ụgwọ ihe ọrụ ndị a?” ka onye agbata obi ha ahụ jụrụ. Ezinụlọ ahụ bụ́ Ndịàmà kọwara na ndị a bụ ụmụnna ime mmụọ ha nakwa na ndị ọbịa ndị a ga-akwụ ụgwọ ihe ọrụ ndị ahụ. Ndị bi n’obodo nta ahụ ji ijuanya na-ele ka a na-arụgharị ụlọ ahụ. Ọ dabara na e mere agbamakwụkwọ ahụ n’ụbọchị e mere atụmatụ ime ya.

Ezinụlọ a chọpụtara na iso n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova na-eweta ọ bụghị nanị abamuru ime mmụọ kamakwa ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe n’ụwa na-enweghị nchebe. Ọ bụghị nanị ha nwetara ahụmahụ a. N’ebe ahụ nile o metụtara, a rụziri ọtụtụ ụlọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. E chezọghịkwa ndị agbata obi na-abụghị Ndịàmà. A rụkwara ọrụ dị ukwuu n’ụlọ ha, bụ́ nke ha nwere ekele dị ukwuu maka ya.

Ezi Omume, Ịnọ Jụụ, na Nchebe

Mgbe oké ahụ ọkụ mesịrị kwụsị, e nweghachikwa ahụ ike, lee ka anyị si enwe obi ekele maka dibịa ahụ nke nyeere anyị aka! Mgbe e wepụrụ ahụ ọkụ nke enweghị nchebe nke rikpuru ihe a kpọrọ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi—site n’Alaeze Chineke—lee ka anyị ga-esi nwee obi ekele nye Onye Okike anyị! Ee, ọ bụ ya na-ekwe anyị nkwa ndụ n’ime “ezi omume . . . ịnọ jụụ na [nchebe, NW] ruo mgbe ebighị ebi.” Lee atụmanya dị ebube ọ bụ!—Aịsaịa 32:17.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

Anyị pụrụ ibelata nsogbu mmetụta uche site n’itinye uche ọ bụghị n’akụ̀ n’ụba nkịtị kama n’ihe ime mmụọ

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Chineke na-ekwe nkwa ụwa ọhụrụ ebe mmadụ nile ga-ebi ná nchebe na-adịgide adịgide

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya