Isi nke Asaa
Ihe Anyị Na-amụta Site ná Nkwere Chineke Kwere Ka Ajọ Omume Dịrị
1, 2. (a) A sị na Jehova gburu ndị nnupụisi ahụ ozugbo ahụ n’Iden, olee otú nke ahụ gaara esiworị metụta anyị? (b) Ndokwa ịhụnanya dịgasị aṅaa ka Jehova mewooro anyị?
“HA DỊ ole na ole, jọọkwa njọ, bụ́ ụbọchị afọ ndụ m,” ka nna ochie bụ́ Jekọb kwuru. (Jenesis 47:9) N’otu aka ahụ, Job kwuru na ụbọchị ndụ mmadụ “dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.” (Job 14:1) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị enwetawo ihe isi ike, ikpe na-ezighị ezi, ọbụna ọdachi, dị ka ha nwetaworo. N’agbanyeghị nke ahụ, ọmụmụ a mụrụ anyị abụghị ikpe na-ezighị ezi n’akụkụ nke Chineke. N’eziokwu, anyị enweghị uche na ahụ́ zuru okè nakwa ebe obibi bụ́ Paradaịs, nke Adam na Iv nwere na mbụ. Ma, gịnị ma a sị na Jehova gburu ha ozugbo ahụ ha nupụrụ isi? Ọ bụ ezie na ọrịa, iru újú, ma ọ bụ ọnwụ agaraghị adị, a garaghịkwa enwe agbụrụ ụmụ mmadụ. A garaghị amụ anyị. N’obi ebere, Chineke nyere Adam na Iv oge ka ha mụọ ụmụ, ọ bụ ezie na ụmụ ndị a ketara ezughị okè. Sitekwa na Kraịst, Jehova mere ndokwa ka anyị wee nwetaghachi ihe Adam tụfuru—ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs.—Jọn 10:10; Ndị Rom 5:12.
2 Lee ihe na-enye agbamume ọ bụụrụ anyị inwe ike ịtụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, na gburugburu ebe ga-abụ Paradaịs, ebe anyị ga-enwere onwe anyị pụọ n’ọrịa, iru újú, ihe mgbu, na ọnwụ, nakwa pụọ n’aka ndị ajọ mmadụ! (Ilu 2:21, 22; Mkpughe 21:4, 5) Ma site n’ihe ndekọ Bible, anyị na-amụta na ọ bụ ezie na nzọpụta nke anyị dị anyị na Jehova oké mkpa, o metụtara ọbụna ihe ka mkpa.
N’ihi Aha Ukwu Ya
3. Gịnị ka mmezu nke nzube Jehova maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ gụnyere?
3 Mmezu nke nzube Chineke banyere ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ metụtara aha ya. Aha ahụ, bụ́ Jehova, pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Ya mere, aha ya na-agụnye ọmụma a maara ya dị ka Eze Eluigwe na Ala, Onye Na-ezube Ihe, na Chineke nke eziokwu. N’ihi ọkwá Jehova, udo na ọdịmma nke ndị nile nọ n’eluigwe na ala chọrọ ka a kwanyere aha ya na ihe ndị ọ gụnyere ùgwù zuru ezu, bụ́ nke kwesịrị ya, nakwa ka mmadụ nile na-erubere ya isi.
4. Gịnị ka nzube Jehova maka ụwa gụnyere?
4 Mgbe o kesịrị Adam na Iv, Jehova nyere ha ọrụ ha ga-arụzu. O mere ka o doo anya na nzube ya abụghị nanị ka ha budaa ụwa nile n’okpuru ha—si otú ahụ mee ka ókèala Paradaịs sakwuo mbara—kama ka o jupụta n’ụmụ ha ga-amụ. (Jenesis 1:28) Nzube a ọ̀ gaje ịkụ afọ n’ala n’ihi mmehie ha? Lee nkọcha ọ ga-ewetara aha Jehova nke pụrụ ime ihe nile ma ọ bụrụ na ọ pụghị imezu ihe o zubere banyere ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ!
5. (a) Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ mbụ ahụ erie mkpụrụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ ahụ, olee mgbe ha ga-anwụ? (b) Olee otú Jehova si mezuo okwu ya nke dị na Jenesis 2:17 n’emebighị nzube ya maka ụwa?
5 Jehova adọwo Adam na Iv aka ná ntị na ọ bụrụ na ha enupụ isi ma rie mkpụrụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ ahụ, na ha ga-anwụ “n’ụbọchị” ha riri ya. (Jenesis 2:17) Dị ka o si kwuo, Jehova mere ka ha zaa ajụjụ kpọmkwem n’ụbọchị ahụ ha mehiere, maakwa ha ikpe ọnwụ. Dị ka Chineke si ele ihe anya, Adam na Iv nwụrụ n’ụbọchị ahụ. Otú ọ dị, iji mezuo nzube ya banyere ụwa, Jehova kwere ka ha nwee ezinụlọ tupu ha anwụọ n’anụ ahụ́. Ka o sina dị, ebe Chineke pụrụ ile 1,000 afọ anya dị ka otu ụbọchị, mgbe Adam nwụrụ n’oge ọ gbara afọ 930, ọ bụ n’ime otu “ụbọchị.” (2 Pita 3:8; Jenesis 5:3-5) N’ụzọ dị otú a, a kwadoro ịbụ eziokwu nke ihe Jehova kwuru n’ihe banyere mgbe ọ gaje inye ntaramahụhụ, ọnwụ ha agbanweghịkwa nzube ya maka ụwa. Ma ruo oge ụfọdụ, e kwewo ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, gụnyere ndị ajọ omume, dịrị ndụ.
6, 7. (a) Dị ka Ọpụpụ 9:15, 16 na-egosi, n’ihi gịnị ka Jehova ji ekwe ka ajọ omume dịgide ruo oge ụfọdụ? (b) N’ihe banyere Fero, olee otú e si gosi ike Jehova, oleekwa otú e si mee ka a mara aha Ya? (ch) Gịnị ga-eme mgbe ajọ usoro ihe dị ugbu a bịara ná njedebe?
6 Ihe Jehova gwara onye na-achị Ijipt n’oge Mozis na-egosi ihe ọzọ mere Chineke jiworo kwe ka ndị ajọ omume nọgide na-adị ndụ. Mgbe Fero gbochiri ụmụ Izrel isi n’Ijipt pụọ, Jehova egbughị ya ozugbo. E mere ka Ihe Otiti Iri bịakwasị ala ya, na-egosipụta ike Jehova n’ụzọ dịgasị egwu. Mgbe ọ na-adọ aka ná ntị banyere ihe otiti nke asaa, Jehova gwara Fero na ya gaara ekpochapụworị Fero na ndị obodo ya n’elu ala n’enweghị nsogbu ọ bụla. “Ma otú ọ dị,” ka Jehova kwuru, “n’ihi nke a ka M guzoworo gị, ka M wee mee ka ị hụ ike m, ka e wee kọọkwa akụkọ aha m n’ụwa nile.”—Ọpụpụ 9:15, 16.
7 Mgbe Jehova napụtara ụmụ Izrel, n’ezie a bịara mara aha ya n’ebe nile. (Joshua 2:1, 9-11) Taa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 3,500 mgbe nke ahụ gasịrị, e chefubeghị ihe o mere laa azụ n’oge ahụ. Ọ bụghị nanị na a kọsara aha aka ahụ bụ́ Jehova kama, otú a ka a kọsakwara ihe bụ́ eziokwu banyere Onye na-aza aha ahụ. Nke a mere ka a mara Jehova dị ka Chineke nke na-emezu nkwa ya, nke na-emekwa ihe n’ihi ndị ohu ya. (Joshua 23:14) O gosiri na n’ihi ike o nwere ime ihe nile, ọ dịghị ihe pụrụ igbochi nzube ya imezu. (Aịsaịa 14:24, 27) N’ihi ya, anyị pụrụ inwe obi ike na ọ ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya n’ihi ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi site n’ibibi ajọ usoro ihe Setan dum. A gaghị echefu ngosipụta ahụ ọ ga-egosipụta ike o nwere ime ihe nile nakwa nsọpụrụ nke a ga-ewetara aha Jehova echefu. Abamuru ya agaghị agwụ agwụ.—Ezikiel 38:23; Mkpughe 19:1, 2.
‘Lee Ịdị Omimi nke Amamihe Chineke!’
8. Olee ihe ndị Pọl na-agba anyị ume ịtụle?
8 N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, Pọl onyeozi welitere ajụjụ bụ́: “Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?” Ọ zasiri ike, sị: “Tụfịakwa!” O mesiziri ebere Chineke ike ma zoo aka n’ihe Jehova kwuru banyere ikwe ka Fero dịtụkwuo ndụ. Pọl gosikwara na anyị bụ́ mmadụ yiri ụrọ nke dị n’aka ọkpụite. O kwuziri, sị: “Ma ọ bụrụ na Chineke, ọ bụ ezie na o nwere ọchịchọ igosipụta ọnụma ya na ime ka a mara ike ya, ji ogologo ntachi obi dị ukwuu hapụ arịa ndị dịịrị ọnụma, bụ́ ndị e mere ka ha kwesị mbibi, ka o wee mee ka a mara akụ̀ nke ebube ya n’ebe arịa ndị dịịrị ebere dị, bụ́ ndị ọ kwadebere maka ebube tupu oge eruo, ya bụ, anyị, bụ́ ndị ọ kpọrọ ọ bụghị nanị site n’etiti ndị Juu kamakwa site n’etiti ndị mba ọzọ, ọ̀ dị ihe o mere?”—Ndị Rom 9:14-24.
9. (a) Olee ndị bụ “arịa ndị dịịrị ọnụma, bụ́ ndị e mere ka ha kwesị mbibi”? (b) N’ihi gịnị ka Jehova jiworo gosipụta ogologo ntachi obi n’agbanyeghị ndị na-emegide ya, oleekwa otú ihe ga-esi na ya pụta n’ikpeazụ ga-esi bụrụ maka ọdịmma nke ndị hụrụ ya n’anya?
9 Kemgbe nnupụisi ahụ e nupụrụ n’Iden weresịịrị ọnọdụ, ndị nile megideworo Jehova na iwu ya aghọwo “arịa ndị dịịrị ọnụma, bụ́ ndị e mere ka ha kwesị mbibi.” Kemgbe ahụ, Jehova enwewo ogologo ntachi obi. Ndị ajọ omume akwawo ihe ndị o mere emo, kpagbuo ndị ohu ya, ọbụna gbuo Ọkpara ya. N’igosipụta njide onwe onye dị ukwuu, Jehova enyewo oge zuru ezu ka ihe nile e kere eke wee hụ n’ụzọ zuru ezu ajọ ihe ndị si n’inupụrụ Chineke isi nakwa n’ịchịisi nke ụmụ mmadụ n’adabereghị n’ebe ọ nọ pụta. N’otu oge ahụ, ọnwụ Jizọs mere ka e nwee ụzọ nke isi napụta ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi nakwa ụzọ isi “tipịasịa ọrụ Ekwensu.”—1 Jọn 3:8; Ndị Hibru 2:14, 15.
10. N’ihi gịnị ka Jehova jiworo kwere ka ndị ajọ omume nọgide eri afọ 1,900 gara aga?
10 N’ime ihe karịrị afọ 1,900 kemgbe Jizọs bilitesịrị n’ọnwụ, Jehova ekwewo ka “arịa ndị dịịrị ọnụma” dịgidekwuo, hapụgodị ibibi ha. N’ihi gịnị? Otu ihe bụ n’ihi na ọ nọwo na-akwadebe ndị ga-esonyere Jizọs Kraịst n’Alaeze eluigwe ya. Ndị a dị 144,000 n’ọnụ ọgụgụ, ha bụkwa “arịa ndị dịịrị ebere” ndị Pọl onyeozi kwuru okwu maka ha. E bu ụzọ kpọọ ndị sitere n’etiti ndị Juu imejupụta òtù a ga-aga eluigwe. Ka e mesịrị, Chineke kpọrọ ndị si ná mba ndị Jentaịl. Jehova amanyeghị onye ọ bụla n’ime ndị a ijere ya ozi. Ma o nyere ụfọdụ ndị n’etiti ndị ahụ ji obi ekele zaghachi ná ndokwa ịhụnanya ndị o mere ihe ùgwù nke ịbụ ndị ha na Ọkpara ya ga-eso chịa n’Alaeze eluigwe ahụ. Ịkwadebe òtù ahụ ga-aga eluigwe fọrọ ntakịrị ugbu a ka ọ bịa ná njedebe.—Luk 22:29; Mkpughe 14:1-4.
11. (a) Ìgwè dị aṅaa na-erite uru ugbu a n’ogologo ntachi obi Jehova? (b) Olee otú ndị nwụrụ anwụ ga-esi rite uru?
11 Ma olee banyere ndị ga-ebi n’ụwa? Ogologo ntachi obi Jehova emewokwa ka o kwe omume ịchịkọta “oké ìgwè mmadụ” site ná mba nile. Ha eruwo ọtụtụ nde ugbu a. Jehova ekwewo nkwa na òtù a ga-ebi n’ụwa ga-alanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe a ma nwee ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Mkpughe 7:9, 10; Abụ Ọma 37:29; Jọn 10:16) Mgbe oge nke Chineke ruru, a ga-eme ka ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie, nyekwa ha ohere nke ịbụ ndị Alaeze eluigwe ahụ ga na-achị n’ụwa. Okwu Chineke na-ebu amụma n’Ọrụ 24:15, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Jọn 5:28, 29.
12. (a) Gịnị ka anyị mụtaworo banyere Jehova site ná nkwere o kwere ka ajọ omume dịrị? (b) Olee ihe i chere banyere ụzọ Jehova si hụ maka okwu ndị a?
12 Ọ̀ dị ikpe na-ezighị ezi dị n’ihe a nile? Ee e, n’ihi na site n’ịhapụgodị ibibi ndị ajọ omume, ma ọ bụ “arịa ndị dịịrị ọnụma,” Chineke na-egosi ndị ọzọ ọmịiko, n’ikwekọ ná nzube ya. Nke a na-egosi otú o nweruru obi ebere na ịhụnanya. Ọzọ, ebe anyị nweworo ohere nke ịhụ mmezu nke nzube ya, anyị na-amụta ihe dị ukwuu banyere Jehova n’onwe ya. Akụkụ dị iche iche nke àgwà ya ndị pụtara ìhè na-atụ anyị n’anya—ikpe ya ziri ezi, ebere ya, ogologo ntachi obi ya, na amamihe ya dịgasị iche iche. Ụzọ Jehova si jiri amamihe mee ihe maka ihe iseokwu banyere ọbụbụeze eluigwe na ala ahụ—oruru o ruuru ya ịchị achị—ga-abụ ruo mgbe ebighị ebi, ihe akaebe na-akwado eziokwu ahụ bụ́ na ụzọ o si achị kasị mma. Anyị so Pọl onyeozi na-ekwu, sị: “Lee ịdị omimi nke akụ̀ na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke! Lee otú ikpe ya si bụrụ ndị a na-apụghị inyochapụta enyochapụta na otú ụzọ ya si bụrụ ndị a na-apụghị ịchọpụta achọpụta!”—Ndị Rom 11:33.
Ohere Iji Gosi Nraranye Anyị
13. Mgbe anyị na-ahụjụ anya, ohere dị aṅaa ka anyị nwere, gịnịkwa ga-enyere anyị aka imeghachi omume n’ụzọ amamihe dị na ya?
13 Ọtụtụ n’ime ndị ohu Chineke nọ n’ọnọdụ ndị na-akpatara ha nhụjuanya. Ha ka na-ahụju anya n’ihi na Chineke ebibibeghị ndị ajọ omume ma mee ka mweghachi ahụ e buru n’amụma a ga-eweghachi ihe a kpọrọ mmadụ were ọnọdụ. Nke a ò kwesịrị ime ka obi jọọ anyị njọ? Ka ànyị pụrụ ile ọnọdụ ndị dị otú ahụ anya dị ka ohere iji kere òkè n’igosi na Ekwensu bụ onye ụgha? A pụrụ iwusikwu anyị ike ime otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị eburu n’uche arịrịọ bụ́: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) Setan, bụ́ onye ahụ na-ata Jehova ụta, sịrị na ndị mmadụ ga-ata Chineke ụta, ọbụna kọchaa ya ma ọ bụrụ na ihe onwunwe ha efunahụ ha ma ọ bụ ọ bụrụ na ha arịa ọrịa. (Job 1:9-11; 2:4, 5) Anyị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa mgbe anyị na-egosi site n’iguzosi ike n’ihe anyị nye ya, n’agbanyeghị ihe isi ike, na nke ahụ abụghị eziokwu n’ebe anyị nọ.
14. Ọ bụrụ na anyị adabere n’ebe Jehova nọ mgbe anyị nọ n’ule, olee uru ndị anyị pụrụ irite?
14 Ọ bụrụ na anyị adabere n’ebe Jehova nọ mgbe anyị nọ n’ule, anyị pụrụ ịzụlite àgwà ndị dị oké ọnụ ahịa. Dị ka ihe atụ, n’ihi ahụhụ ndị Jizọs tara, ọ “mụtara nrubeisi” n’ụzọ ọ na-amabughị. Anyị onwe anyị kwa pụrụ ịmụta ihe site n’ule ndị anyị na-enwe n’ihi na anyị pụrụ ịzụlite ogologo ntachi obi, ndidi, na ekele miri emi maka ụzọ ezi omume nke Jehova.—Ndị Hibru 5:8, 9; 12:11; Jems 1:2-4.
15. Ka anyị ji ndidi na-atachi obi n’ihe isi ike, olee otú ndị ọzọ pụrụ isi rite uru?
15 Ndị ọzọ ga-ahụ ihe anyị na-eme. N’ihi ihe ndị anyị na-agabiga n’ihi ịhụnanya anyị nwere maka ezi omume, ka oge na-aga, ụfọdụ n’ime ha pụrụ ịbịa ghọta ndị bụ́ ezi Ndị Kraịst taa. Sitekwa n’isonyere anyị n’ife ofufe, ha pụrụ ịbụ ndị ga-enweta ngọzi nke ndụ ebighị ebi. (Matiu 25:34-36, 40, 46) Jehova na Ọkpara ya chọrọ ka ndị mmadụ nwee ohere ahụ.
16. Olee otú ụzọ anyị si ele ihe isi ike anyị na-enwe anya si emetụta okwu banyere ịdị n’otu?
16 Lee ihe ọma ọ bụ mgbe anyị na-ele ọbụna ọnọdụ ndị siri ike anya dị ka ohere nke iji gosi nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova nakwa nke iji kere òkè n’imezu uche ya! Anyị ime otú ahụ pụrụ ịbụ ihe àmà na-egosi na anyị na-enwe ọganihu n’ezie n’isoro Chineke na Kraịst dị n’otu. Jizọs kpegaara Jehova ekpere maka ezi Ndị Kraịst nile, na-asị: “M na-arịọ arịrịọ, ọ bụghị banyere ndị a nanị [ndị na-eso ụzọ ya ha na ya na-anọkọ], kamakwa banyere ndị na-etinye okwukwe na mụ site n’okwu ha; ka ha nile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ dị n’otu, mụ onwe m na gị adịrịkwa n’otu, ka ha na anyị wee dị n’otu.”—Jọn 17:20, 21.
17. Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe ma ọ bụrụ na anyị na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova?
17 Ọ bụrụ na anyị na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova, ọ ga-akwụ anyị ụgwọ ọrụ n’ụba. Okwu ya na-asị: “Bụrụnụ ndị na-eguzosi ike, ndị a na-apụghị ịkwapụ akwapụ, ndị nwere ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị, ebe unu maara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị n’efu n’ihe metụtara Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:58) O kwukwara, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” (Ndị Hibru 6:10) Jems 5:11 na-ekwu, sị: “Lee! Anyị na-akpọ ndị tachiworo obi ndị obi ụtọ. Unu anụwo banyere ntachi obi Job, unu ahụwokwa ihe Jehova mesịrị mee, na Jehova nwere mmetụta dị nnọọ nro, na-emekwa ebere.” Gịnị ka ọ rụpụtaara Job? “Jehova gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya.” (Job 42:10-16) Ee, Jehova bụ “onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Leekwa ụdị ụgwọ ọrụ anyị ga-atụ anya ya—ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs!
18. Gịnị ga-emesịa mee ihe ọ bụla na-adịghị enye obi ụtọ anyị pụrụ icheta?
18 Ịchịisi Alaeze Chineke ga-edozi ihe ọjọọ nile e meworo ezinụlọ ụmụ mmadụ kemgbe ọtụtụ puku afọ gara aga. Ọṅụ a ga-enwe mgbe ahụ ga-akarị ahụhụ ọ bụla anyị na-ata ugbu a. Icheta ahụhụ ndị anyị tara na mbụ agaghị ewetara anyị obi ilu. Echiche na ihe omume ndị na-ewuli elu bụ́ ndị ndị mmadụ ga na-enwe kwa ụbọchị n’ụwa ọhụrụ ahụ ga-eji nwayọọ nwayọọ hichapụ ihe ndị ahụ dị mwute a na-echeta. Jehova na-ekwu, sị: “Lee, M gaje ike eluigwe ọhụrụ [ọchịchị Alaeze eluigwe nke ga na-achị ihe a kpọrọ mmadụ] na ụwa ọhụrụ [ọha mmadụ bụ́ ndị ezi omume]: a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma otú ọ dị, ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke.” Ee, n’ime ụwa ọhụrụ Jehova, ndị ezi omume ga-enwe ike ikwu, sị: “Ụwa nile ezuwo ike, dị jụụ: ha etiwawo mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 14:7; 65:17, 18.
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• Ọ bụ ezie na o kwere ka ihe ọjọọ dịrị, olee otú Jehova siworo gosi oké nkwanye ùgwù maka aha ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?
• Olee otú nkwere Chineke kweworo ka “arịa ndị dịịrị ọnụma” dịrị siworo mee ka ebere ya nwee ike irute anyị?
• Gịnị ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịhụ n’ọnọdụ ndị na-akpatara anyị nhụjuanya?
[Foto ndị dị na peeji nke 67]
Jehova “gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya”