Ime Ka Obi Ike Anyị n’Ezi Omume Chineke Sikwuo Ike
“Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị wee dị na Jehova ka m meworo ka ị mara ha.”—ILU 22:19.
1, 2. (a) N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji enwe obi ike n’ebe Jehova nọ? (Ilu 22:19) (b) Gịnị na-egosi na ọ dị ndị ụfọdụ mkpa ime ka obi ike ha n’ebe Jehova nọ sikwuo ike?
E JI ezi ihe ọmụma banyere Jehova na nzube ya nile gọzie ezi ndị Kraịst. ‘Ohu nke kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche’ ji ịhụnanya na-enye ha “ihe e ji azụ ha” n’ụzọ ime mmụọ “n’oge ya.” (Matiu 24:45) Ihe ọmụma ha na-enweta na-enye ha ntọala siri ike ebe ha ga-ewukwasị obi ike ha n’ebe Chineke nọ. N’ihi ya, dị ka otu ìgwè, Ndịàmà Jehova na-egosipụta obi ike dị ịrịba ama n’ebe Jehova nọ na n’ezi omume ya.
2 Otú ọ dị, o yiri ka n’otu n’otu, ọ pụrụ ịdị ụfọdụ Ndịàmà mkpa ime ka obi ike dị otú ahụ sikwuo ike. Mgbe ụfọdụ Society na-anata akwụkwọ ozi ndị na-ekwupụta obi abụọ banyere nkọwa ndị e nyere ná mbipụta ya dị iche iche. Obi abụọ ndị a pụrụ ịbụ mmeghachi omume nye mgbanwe ndị e mere ná nghọta, ma ọ bụ ha pụrụ ịbụ banyere ihe ndị metụrụ onye ahụ na-ajụ ajụjụ ahụ n’ahụ, karịsịa n’ụzọ mmetụta uche.—Tụlee Jọn 6:60, 61.
3. Gịnị pụrụ ime ọbụna ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, n’ihi gịnịkwa?
3 Ọbụna ezi ndị ohu Jehova na-ahụ ịbụ eziokwu nke Eklisiastis 9:11: “M laghachiri, hụ n’okpuru anyanwụ, na ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ ka ịwụ ọsọ dịịrị, ọ bụghịkwa ndị dị ike ka agha dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nghọta ka akụ̀ dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nkà ka amara dịịrị; kama mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.” Olee otú nke a pụrụ isi bụrụ eziokwu n’echiche gbasapụrụ agbasapụ, ma ọ bụ ná nke ime mmụọ? Anyị pụrụ ịmaworị ndị Kraịst dịrị ngwa n’itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ, dịrị ike n’ịkwado eziokwu, mara ihe n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, nụọkwa ọkụ n’obi n’ịchụsọ ezi ihe ọmụma. Ma, n’ihi “mgbe na ihe ndapụta,” ụfọdụ pụrụ ịchọpụta ugbu a na ha bụ ndị a kpaara ókè n’ihi ihe ọghọm ma ọ bụ ịka nká. Ha pụrụ ịdị na-eche ma hà ga-aba n’ụwa ọhụrụ Chineke n’anwụghị anwụ ma ọlị.
4, 5. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-ejighị nwee ihe ọ bụla mere ha ga-eji gharazie inwe obi ike n’ezi omume Jehova?
4 Mgbe di ma ọ bụ nwunye onye Kraịst nwụnahụrụ ya, ihe mgbu na mmetụta nke ịbụ onye ihe funahụrụ na-adị ukwuu. Ha abụọ, dị ka dị na nwunye, pụrụ ijekọworo Jehova ozi ọnụ ruo ọtụtụ afọ ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ iri afọ. Di ma ọ bụ nwunye nke dị ndụ maara na ọnwụ na-atọsa nkekọ alụmdi na nwunye.a (1 Ndị Kọrint 7:39) Ugbu a, ka obi ike ya ghara ịdalata, ọ ghaghị ịchịkwa mmetụta uche ya.—Tụlee Mak 16:8.
5 Lee otú o si bụrụ ihe amamihe dị na ya ile ọnwụ di ma ọ bụ nwunye, nne ma ọ bụ nna, nwa, ma ọ bụ onye Kraịst bụ́ ezi enyi anya dị ka ohere iji gosipụta obi ike n’ezi omume Jehova! Ọbụna n’agbanyeghị mfu onwe onye, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova abụghị onye ajọ omume. Anyị pụrụ inwe obi ike na onye ọ bụla nke ga-enweta ndụ ebighị ebi—ma ọ̀ bụ site ná nlanarị ma ọ̀ bụ site ná mbilite n’ọnwụ—ga-enwe obi ụtọ. Banyere Chineke, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya. Onye ezi omume ka Jehova bụ n’ụzọ Ya nile, Ọ dịkwa ebere n’ọrụ Ya nile. Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya, bụ́ ndị nile na-akpọku Ya n’eziokwu. Ihe dị ndị na-atụ egwu Ya ụtọ ka Ọ ga-eme; ọ bụkwa ntiku ha ka Ọ ga-anụ, wee zọpụta ha.”—Abụ Ọma 145:16-19.
Mmetụta nke Ịbụ Ndị Tara Ahụhụ n’Ụzọ Na-adịghị Mkpa
6, 7. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ Ndịàmà bụ́ ndị tara ahụhụ n’oge gara aga pụrụ iji enwe nghọta dị iche ugbu a? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji lee Jehova anya dị ka onye ajọ omume maka ikwe ka a taa ahụhụ dị otú ahụ n’oge gara aga?
6 N’oge gara aga, Ndịàmà ụfọdụ atawo ahụhụ n’ihi ịjụ ikere òkè n’otu ihe omume nke akọ na uche ha ugbu a nwere ike ịnabata. Dị ka ihe atụ, nke a nwere ike ịbụwo nhọrọ ha n’afọ ndị gara aga n’ebe ụdị ụfọdụ nke ije ozi ndị nkịtị dị. Nwanna pụrụ iche ugbu a na ya pụrụ ije ozi dị otú ahụ n’ụzọ kwekọrọ n’akọ na uche ya n’emebighị nnọpụiche onye Kraịst ya n’ihe metụtara usoro ihe nke a.
7 Ọ̀ bụ ajọ omume n’akụkụ Jehova ịhapụ ya ka ọ taa ahụhụ maka ịjụ ihe ọ pụrụ ime ugbu a n’enweghị ihe ndị ga-esi na ya pụta? Ihe ka ọtụtụ ná ndị nweworo ahụmahụ ahụ agaghị eche otú ahụ. Kama nke ahụ, ha na-aṅụrị ọṅụ na ha nwere ohere nke igosipụta n’ihu ọha nakwa n’ụzọ doro anya na ha kpebisiri ike ịkwụrụ chịm n’ebe ihe iseokwu ọbụbụeze eluigwe na ala ahụ dị. (Tụlee Job 27:5.) Gịnị ga-eme ka onye ọ bụla kwaa ụta mgbe ọ gbasoworo akọ na uche ya n’iwere nguzo siri ike n’akụkụ Jehova? Site n’iji nnọgidesi ike n’ihe na-akwado ụkpụrụ ndị Kraịst dị ka ha si ghọta ha ma ọ bụ site n’imeghachi omume ná mkpali nke akọ na uche, ha gosiri na ha kwesịrị ịbụ enyi Jehova. N’ezie, ọ bụ ihe amamihe dị na ya izere ime ihe ga-ama akọ na uche mmadụ ikpe ma ọ bụ ma e leghị anya nke ga-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. Anyị pụrụ iche echiche n’akụkụ a banyere ihe nlereanya nke Pọl onyeozi setịpụrụ.—1 Ndị Kọrint 8:12, 13; 10:31-33.
8. N’ihi gịnị ka ndị Juu bụ́ ndị Kraịst, bụ́ ndị rapagidesiburu ike n’Iwu ahụ, na-ejighị nwee ihe mere ha ga-eji rụọ ụka banyere ezi omume Jehova?
8 Iji mee ihe ga-atọ Jehova ụtọ, a chọrọ n’aka ndị Juu irubere Iwu Iri ahụ nakwa ọtụtụ ndị ọzọ nke ihe dị ka iwu 600, isi. E mesịa, n’okpuru ndokwa ndị Kraịst, irubere iwu ndị a isi otú ahụ abụghịzi ihe a chọrọ maka ijere Jehova ozi, ọ bụghịdị nye ndị Juu anụ ahụ. Iwu ndị na-adịkwaghị irè gụnyere ndị kwuru banyere obibi úgwù, idebe Ụbọchị Izu Ike, ịchụ àjà ụmụ anụmanụ, na irubere ụfọdụ ihe mgbochi banyere ihe oriri isi. (1 Ndị Kọrint 7:19; 10:25; Ndị Kọlọsi 2:16, 17; Ndị Hibru 10:1, 11-14) A tọhapụrụ ndị Juu—gụnyere ndị ozi—bụ́ ndị ghọrọ ndị Kraịst n’ibu ọrụ nke idebe iwu ndị a chọrọ ka ha rubere isi mgbe ha nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Hà mere mkpesa na ndokwa Chineke bụ nke ajọ omume n’ịchọwo na mbụ ka ha mee ihe na-adịghịzi mkpa? Ee e, ha ṅụrịrị ọṅụ ná nghọta nke nzube Jehova e mere ka ọ sakwuo mbara.—Ọrụ 16:4, 5.
9. Gịnị bụworo eziokwu banyere ụfọdụ Ndịàmà, ma n’ihi gịnị ka ha na-ejighị nwee ihe mere ha ga-eji kwaa ụta?
9 N’oge a, e nwewo ụfọdụ Ndịàmà rapagidesiworo ike n’echiche ha nke ihe ha ga-eme ma ọ bụ ihe ha na-agaghị eme. N’ihi nke ahụ ha tara ahụhụ karịa ndị ọzọ. Ka oge na-aga, mmụba nke ihe ọmụma nyeere ha aka ịgbasapụ echiche ha banyere okwu ndị ahụ. Ma ọ dịghị ihe mere ha ga-eji kwaa ụta ịbụ ndị meworo ihe kwekọrọ n’akọ na uche ha, ọbụna mgbe nke a wetakwuru ahụhụ ma e leghị anya. Ọ bụ ihe kwesịrị ịja mma n’ezie na ha gosipụtara ọchịchọ ịta ahụhụ n’ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova, ‘ime ihe nile n’ihi ozi ọma.’ Jehova na-agọzi ụdị nsọpụrụ Chineke ahụ. (1 Ndị Kọrint 9:23; Ndị Hibru 6:10) Pita onyeozi ji nghọta dee, sị: “Ọ bụrụ na, mgbe unu na-eme ezi ihe, hụkwaa ahụhụ, unu atachie obi na ya, nke a bụ ihe ekele n’ebe Chineke nọ.”—1 Pita 2:20.
Ịmụta Ihe Site n’Aka Jona
10, 11. Olee otú Jona si gosi enweghị obi ike n’ebe Jehova nọ (a) mgbe e nyere ya ọrụ ije Nineve? (b) mgbe Chineke na-ebibighị ndị Nineve?
10 Mgbe a gwara ya ka o jee Nineve, Jona gosiri enweghị ekele maka obi ike Jehova nwere n’ebe ọ nọ. Mgbe ịla azụ ya n’irube isi wetasịịrị ya ahụmahụ na-atụ ụjọ, anya doro Jona, ya aghọta ihie ụzọ ya, nakwere ọrụ e kenyere ya n’ala ọzọ, ma dọọ ndị Nineve aka ná ntị banyere mbibi nke na-abịa. Ihe a na-atụghị anya ya emezie: N’ihi omume nchegharị nke ndị Nineve, Jehova kpebiri ịhapụ ibibi ha.—Jona 1:1–3:10.
11 Gịnị bụ mmeghachi omume Jona? N’iwe, o meere Chineke mkpesa n’ekpere. Isi ihe dị ná mkpesa ya bụ: ‘O metụrụ m n’uche na ihe ga-adị otú a. Ọ bụ n’ihi nke ahụ mere na achọbughị m ịbịa Nineve. Ugbu a, n’agbanyeghị ihe nile m gabigaworo, gụnyere oké ụjọ na mmechuihu nke ịbụ onye azụ ukwu loro, n’agbanyeghịkwa ọrụ ike m rụrụ n’ịdọ ndị Nineve aka ná ntị banyere mbibi na-abịa, lee ihe si na ya pụta! Ọrụ na ịta ahụhụ m nile bụ ná nkịtị! Ọ ga-akara m mma na m nwụrụ!’—Jona 4:1-3.
12. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ Jona?
12 Jona ò nwere ezi ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa? Jehova ọ̀ bụ onye ajọ omume n’imere ndị mere ihe ọjọọ bụ́ ndị chegharịrịnụ ebere? N’eziokwu, Jona kwesịrị ịṅụrịworị ọṅụ; a gaje ịghara igbu ọtụtụ iri puku mmadụ! (Jona 4:11) Ma àgwà enweghị nsọpụrụ, na nke ime mkpesa ya gosiri na o nweghị obi ike miri emi n’ezi omume Jehova. Ọ nọ na-eche banyere onwe ya gabiga ókè ma na-eche banyere ndị ọzọ n’ụzọ dị nnọọ nta. Ka anyị mụta ihe n’aka Jona site n’ịghara idebe onwe anyị na mmetụta onwe onye anyị n’ọnọdụ mbụ. Ka anyị kwenyesie ike na irubere Jehova isi, ịgbaso nduzi e nyere site ná nzukọ ya na ịnakwere mkpebi ya nile, bụ ihe ziri ezi ime. Anyị kwenyesiri ike na “ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma.”—Eklisiastis 8:12.
Ugbu A Bụ Oge Ime Ka Obi Ike Anyị Sikwuo Ike!
13. Olee otú anyị nile pụrụ isi mee ka obi ike anyị n’ebe Jehova nọ sikwuo ike?
13 Ime ka obi ike anyị sikwuo ike n’ebe Jehova nọ bụ ihe amamihe dị na ya. (Ilu 3:5-8) N’ezie, anyị aghaghị ime ihe karịrị nanị ikpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka inwekwu obi ike. Obi ike na-etolite ná ndabere nke ezi ihe ọmụma, ya mere anyị aghaghị ime ọmụmụ Bible onwe onye, ịgụ ma Bible ma akwụkwọ ndị na-akọwa Bible, akụkụ nke ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị. Ijechi nzukọ ndị Kraịst anya dị oké mkpa, dịkwa ka ime nkwadebe dị mma na ikere òkè ruo ókè o kwere mee dị. Ime ka ọ bụrụ àgwà anyị isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible, jiri akọ na-emeri okwu mgbochi, na-emekwa ka obi ike anyị n’ebe Jehova nọ na n’Okwu ya mikwuo emi. Anyị na-esi otú ahụ na-abụ ndị ha na ya na-emekọrịta ihe kwa ụbọchị karị.
14. N’ihi gịnị ka a ga-eji kpọkuo ndị Chineke n’isi nso igosipụta obi ike ha n’ebe Jehova nọ dị ka ha na-emetụbeghị na mbụ?
14 N’ọdịnihu dị nso, oge mkpagbu kasị ukwuu dakwasịtụworo agbụrụ mmadụ ga-etiwapụ ná mberede. (Matiu 24:21) Mgbe o tiwapụrụ, ọ ga-adị ndị ohu Chineke mkpa karịa oge ọ bụla ọzọ igosi obi ike n’ezi omume Jehova nakwa ná ntụzi nzukọ ya na-enye. N’ụzọ ihe atụ, mgbe ahụ ha ga-eji obi ike rube isi ná ndụmọdụ Chineke bụ́: “Bịa, ndị m, bata n’ime ụlọ gị nile, mechibido ụzọ gị nile n’azụ gị: zobe onwe gị nanị otu ntabi anya nta, ruo mgbe oké iwe ga-agabiga.” (Aịsaịa 26:20) Ha abanyeworị n’ebe nchebe n’ihe karịrị ọgbakọ 85,000 dị n’ala 232. Ihe ọ bụla a ga-agụnyekwu ná ndụmọdụ ahụ bụ́ “bata n’ime ụlọ gị nile,” anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-enyere anyị aka imezu ya.
15. Olee otú e siworo mesie okwu ike banyere inwe obi ike n’afọ 1998, n’ihi gịnịkwa ka o ji zie ezi ime otú ahụ?
15 Ọ dị mkpa ka anyị mee ka obi ike anyị sikwuo ike ugbu a. Ọ bụrụ na anyị enweghị obi ike n’ebe ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst nọ, n’ebe nzukọ Jehova dị nakwa, karịsịa, n’ebe Jehova n’onwe ya nọ, nlanarị agaghị ekwe omume. Ya mere lee otú o si kwesị ekwesị na n’afọ 1998, Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa abụrụwo ndị e chetaghachiiri ugboro ugboro, site n’isiokwu ha dịịrị afọ, na “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya”! (Ndị Rom 10:13) Anyị ga-anọgide na-enwe obi ike banyere nke ahụ. Ọ bụrụ na anyị ahụta ọbụna ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke obi abụọ n’ebe obi ike a dị, anyị kwesịrị ịrụ ọrụ iji dozie ya ugbu a, ee, taa.
Ikpe Jehova Ga-abụ nke Ezi Omume
16. Gịnị pụrụ ime obi ike ma ọ bụrụ na a zụliteghị ya, oleekwa otú anyị pụrụ isi gbochie nke a ime?
16 Ná Ndị Hibru 3:14, a dọrọ ndị Kraịst e tere mmanụ aka ná ntị, sị: “Anyị aghọwo ndị nketa nke Kraịst, ma ọ bụrụ na ọ bụ ezie na anyị jidesiri mmalite nke ndabere anyị ike ruo ọgwụgwụ ihe nile.” N’ụkpụrụ, okwu ndị a metụtakwara ndị Kraịst nwere olileanya elu ala. Obi ike e nwere na mbụ pụrụ iji nwayọọ nwayọọ mebie ma ọ bụrụ na a zụliteghị ya. Lee otú o si dị oké mkpa na anyị nọgidere na-achụso ezi ihe ọmụma, si otú ahụ na-eme ka ntọala ebe e wukwasịrị obi ike anyị sikwuo ike!
17. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee obi ike na n’ihe metụtara nlanarị, Jisọs ga-ekpe ikpe n’ụzọ ziri ezi?
17 N’isi nso Kraịst ga-enyocha mba nile ka o wee nwee ike ‘ikewapụta ndị mmadụ, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu.’ (Matiu 25:31-33) Anyị pụrụ inwe obi ike na Kraịst ga-eme ezi omume n’ikpebi onye kwesịrị ịlanarị. Jehova enyewo ya amamihe, nghọta, na àgwà ndị ọzọ dị mkpa iji ‘kpee elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume.’ (Ọrụ 17:30, 31) Ka nkweta anyị dị ka nke Abraham, bụ́ onye sịrị: “Ya bụrụ Gị [Jehova] ihe arụ ime dị ka ihe a si dị, ime ka onye ezi omume so onye na-emebi iwu nwụọ, o wee bụrụ na dị ka ndị ezi omume si dị, otú a ka ndị na-emebi iwu dị; ya bụrụ Gị ihe arụ: Onyeikpe ụwa nile, Ọ́ gaghị eme ihe e kpere n’ikpe?”—Jenesis 18:25.
18. N’ihi gịnị ka anyị na-ejighị kwesị ichegbubiga onwe anyị ókè banyere ihe ọ pụrụ ịbụ na anyị amaghị ugbu a?
18 N’inwe obi ike zuru ezu n’ezi omume Jehova, ọ dịghị anyị mkpa ichegbu onwe anyị banyere ịchọta azịza nye ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee otú a ga-esi ekpe ụmụ ọhụrụ na ụmụntakịrị ikpe? Ò nwere ike bụrụ na a ka-agaghị ejiworị ozi ọma ahụ rute ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị mmadụ tupu Amagedọn abịa? Gịnị banyere ndị isi mgbaka? Gịnị banyere . . . ?’ N’ezie, ka ọ dị ugbu a, anyị nwere ike ghara ịma otú Jehova ga-esi dozie okwu ndị a. Otú ọ dị, ọ ga-eme otú ahụ n’ụzọ ezi omume na obi ebere. Anyị ekwesịghị inwe obi abụọ banyere nke ahụ ma ọlị. N’ezie, ọ pụrụ iju anyị anya ma mee anyị obi ụtọ ịhụ ya ka ọ na-edozi ha n’ụzọ anyị na-atụletụbeghịdị ma ọlị.—Tụlee Job 42:3; Abụ Ọma 78:11-16; 136:4-9; Matiu 15:31; Luk 2:47.
19, 20. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị dị njọ ịjụ ajụjụ ndị ezi uche dị na ha? (b) Olee mgbe Jehova ga-enye azịza ndị dị mkpa?
19 Nzukọ Jehova adịghị emegide ajụjụ ndị bịara n’oge ha, ndị a jụrụ n’ezi obi, dị ka ndị mmegide na-ekwuhie. (1 Pita 1:10-12) Otú ọ dị, Bible na-adụ ọdụ ka anyị zere ajụjụ nzuzu, ndị na-akọ nkọ. (Taịtọs 3:9) Ịjụ ajụjụ ndị ezi uche dị na ha na inyocha Okwu Chineke na mbipụta dị iche iche nke ndị Kraịst iji chọta azịza Akwụkwọ Nsọ pụrụ ịmụba ezi ihe ọmụma anyị, ọ pụkwara isi otú ahụ mee ka obi ike anyị n’ebe Jehova nọ sikwuo ike. Nzukọ a na-agbaso ihe nlereanya Jisọs. O zeere ikwu okwu n’ajụjụ ndị oge kwesịrị ekwesị maka ịza ha na-erubeghị. Ọ kọwara, sị: “Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ ịgwa unu, ma unu apụghị iburu ha ugbu a.” (Jọn 16:12) O kwetakwara na e nwere ihe ndị ya onwe ya na-amaghị n’oge ahụ.—Matiu 24:36.
20 Jehova ka nwere ihe dị ukwuu ikpughe. Lee ihe amamihe ọ bụ ichere ya, na-enwe obi ike na oge ya maka igosipụta nzube ya nile ga-ekwesị ekwesị maka imezu mkpa ndị e nwere n’oge ahụ. Anyị pụrụ inwe obi ike na ozugbo oge Jehova ruru, anyị ga-enwe ọṅụ nke ịghọtakwu ụzọ ya nile. Ee, a ga-enye anyị ụgwọ ọrụ, ma ọ bụrụhaala na anyị enwee obi ike zuru ezu n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe nzukọ o ji eme ihe dị. Ilu 14:26 na-emesi anyị obi ike, sị: “N’egwu Jehova ka ntụkwasị obi siri ike dị: ụmụ Ya ga-enwekwa ebe mgbaba.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Ụlọ Nche (Bekee), October 15, 1967, peji nke 638; June 1, 1987, peji nke 30.
Gịnị Ka I Chere?
◻ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya ikwe ka mmetụta uche bibie obi ike anyị n’ebe Jehova nọ?
◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ Jona?
◻ N’ihi gịnị ka ọmụmụ Bible na ije nzukọ ji dị oké mkpa?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ọbụna n’agbanyeghị mfu onwe onye, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova bụ onye ezi omume
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ì ji n’aka na obi ike gị dị n’ebe Jehova nọ?