Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 2/1 p. 15-19
  • Sọpụrụ Ọkpara ahụ, Onye Bụ Isi nke Jehova Doworo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Sọpụrụ Ọkpara ahụ, Onye Bụ Isi nke Jehova Doworo
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Ndị Ọzọ Ụfọdụ Ndị Na-esi Ghara Inye Jisọs Nsọpụrụ
  • Ihe Ndị Mere A Ga-eji Sọpụrụ Ọkpara ahụ
  • Ihe O Mewooro Anyị
  • Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Sọpụrụ Ọkpara ahụ
  • Sọpụrụ Jehova—n’Ihi Gịnị, Ọ̀ Bụkwa n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Sọpụrụ Ụdị Mmadụ Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Na-egosinụ Ndị Ọzọ Nsọpụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Na-asọpụrụ Ndị E Kwesịrị Ịsọpụrụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 2/1 p. 15-19

Sọpụrụ Ọkpara ahụ, Onye Bụ Isi nke Jehova Doworo

“Onye na-adịghị asọpụrụ Ọkpara adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.”—JỌN 5:23.

1. Olee ụzọ o si bụrụ na okwukwe Krisendọm kwere n’Atọ n’Ime Otu bụ enyeghị Jisọs nsọpụrụ?

TAA n’ime Krisendọm, ọtụtụ ndị na-ekwu na ha na-asọpụrụ Jisọs Kraịst, ma ha na-eme kpọmkwem ihe megidere nke ahụ. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ee, ọtụtụ ndị na-ekwu na Jisọs bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, na Chineke, bụ́ Onye Kere ihe nile, bịakwara n’elu ala wee dịa ndụ, nwụọkwa dị ka mmadụ. Nzọrọ nke a dị n’ime ozizi Atọ n’Ime Otu ahụ, nke bụ nkụzi bụ isi nke Krisendọm. Ma ọ bụrụ na Atọ n’Ime Otu bụ ụgha, ọ bụrụ na Jisọs bụ n’ezie onye dị ala karị, dịrịkwa n’okpuru Chineke, ọ̀ ga-abụ na nkọwahie nke a nke mmekọrịta dị n’etiti ya na Chineke adịghị eme ka Jisọs nwee mwute? N’eziokwu, ọ ga-ele nkọwahie dị otú ahụ anya dị ka egosighị nsọpụrụ n’ebe ya onwe ya na ihe nile ọ kụziri dị.

2. Olee ụzọ Akwụkwọ nsọ si mee ka o doo anya na Jisọs dị ala karị Chineke, dịrịkwa n’okpuru ya?

2 Ihe bụ eziokwu bụ na ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs kwuru na ya bụ Chineke, kama ugboro ugboro, o kwuru okwu banyere onwe ya dị ka “Ọkpara Chineke.” Ọbụna na ndị iro ya nakweere nke a. (Jọn 10:36; 19:7) Jisọs na-elezi anya mgbe nile ibuli Nna ahụ elu nakwa ido onwe ya n’okpuru Ya, dị ka o kwupụtara, sị: “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe ya, ma ọ bụghị ihe ọ hụrụ na Nna ya na-eme: n’ihi na ihe ọ bụla Ya onwe ya na-eme, ndị a ka Ọkpara ya na-emekwa otú ahụ. Mụ onwe m apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe m: . . . n’ihi na etughị m ihe mụ onwe m na-achọ, kama ihe onye zitere m na-achọ.” Ọzọkwa, o kwuru, sị: “Esi m n’ebe ọ nọ bịa, Ya onwe ya zitekwara m.” O kwukwara, sị: “Mụ onwe m siri n’ebe Chineke nọ pụta wee bịa.” (Jọn 5:19, 30; 7:28, 29; 8:42) Ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs tụrụ ọbụna aro na ya bụ Chineke ma ọ bụ na ya na ya hà nhata. Ya mere ịkụzi ihe dị otú ahụ adịghị enye Jisọs nsọpụrụ.

Ụzọ Ndị Ọzọ Ụfọdụ Ndị Na-esi Ghara Inye Jisọs Nsọpụrụ

3. (a) Site n’ịgọpụ gịnị banyere Jisọs ka ụfọdụ ndị nọ na Krisendọm ji ghara inye ya nsọpụrụ? (b) Akaebe dị aṅaa ka Jisọs gbara banyere ọdịdị ya tupu ọ ghọọ mmadụ?

3 N’ụzọ dị ịtụnanya, e nwekwara ụfọdụ nọ na Krisendọm taa bụ́ ndị na-adịghị enye Jisọs nsọpụrụ site n’ịgọpụ eziokwu ahụ nke bụ na ọ dịbu adị tupu ọ ghọọ mmadụ. Otú ọ dị, ka anyị wee nwee ike ịmalite ịsọpụrụ ya n’ụzọ ziri ezi, anyị aghaghị ịghọta na Jisọs si n’eluigwe rịdata n’elu ala n’ụzọ nkịtị. Jisọs n’onwe ya kwuru ọtụtụ ugbo na ya dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ. Ọ sịrị, “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rigoworo n’eluigwe, ma ọ bụghị onye siri n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ.” Mgbe e mesịrị, o kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ nri dị ndụ nke siri n’eluigwe rịdata . . . [Gịnịkwa] ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-arịgo n’ebe ọ nọrịị mbụ?” O kwukwara, sị: “Unu onwe unu si n’ebe dị ala pụta; mụ onwe m si n’ebe dị elu pụta: . . . n’ezie, n’ezie, asị m unu, mgbe a kamụghị Abraham mụ onwe m dị.” (Jọn 3:13; 6:51, 62; 8:23, 58) Jisọs zokwara aka n’ọdịdị ya tupu ọ ghọọ mmadụ n’ekpere o kpekuru Nna ya nke eluigwe n’anyasị ahụ a raara ya nye.—Jọn 17:5.

4. (a) N’ụzọ ọzọ dị aṅaa ka ọtụtụ ndị na-esi ghara inye Jisọs nsọpụrụ? (b) Ihe àmà dị aṅaa kwesịrị izu ezu iji guzobe eziokwu ahụ nke bụ na Jisọs dịrị adị n’ezie, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

4 Ọbụna na ụfọdụ ndị nọ na Krisendọm na-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ịgọpụ na Jisọs bụ onye dịrị adị n’akụkọ ihe mere eme, na ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ dịrị ndụ dị ka mmadụ. Ọ bụrụ na ọ dịghị adị n’ezie, ọ gaghị adị mkpa ikwu okwu ọ bụla banyere ihe mere anyị kwesịrị iji nye ya nsọpụrụ na ụzọ a ga-esi mee nke a. Ma ọtụtụ akaebe ndị hụrụ ya n’onwe ha, bụ́ ndị e chebere n’ime Akwụkwọ nsọ kwesịrị ịbụ ihe àmà zuru ezu iji guzobe eziokwu ahụ ruo n’ókè a na-apụghị ịrụ ya ụka na Jisọs dịrị ndụ n’elu ala n’ezie. (Jọn 21:25) Nke a bụ eziokwu karịsịa ebe ọ bụ na ndị Kraịst oge mbụ na-ezikarị ihe banyere Jisọs, bụ́ nke tinyere ndụ na nnwere onwe ha n’ihe ize ndụ. (Ọrụ 12:1-4; Mkpughe 1:9) Otú ọ dị, e wezụgakwa ihe ndị na-eso ụzọ ya dere banyere ya, à pụrụ igosipụta na Jisọs dịrị adị n’ezie?

5, 6. Gịnị ka ihe àmà akụkọ ihe mere eme, e wezụgakwa Akwụkwọ nsọ, na-egosi banyere ịdị adị nke Jisọs Kraịst n’ezie?

5 Akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica (1987) kwuru, sị: “Ihe ndekọ ndị dịịrị onwe ha na-anwapụta na n’oge ochie, ọbụna ndị na-emegide Iso Ụzọ Kraịst adịghị mgbe ọ bụla ha rụrụ ụka banyere eziokwu ahụ nke bụ na Jisọs bụ onye dị adị n’akụkọ ihe mere eme.” Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndekọ ndị a ndị dịịrị onwe ha? Dị ka onye ọkà mmụta bụ́ onye Juu, bụ́ Joseph Klausner si kwuo, e nwere akaebe nke ihe odide Talmud ndị ochie. (Jesus of Nazareth, peji 20) E nwekwara akaebe nke onye ọkọ akụkọ ihe mere eme ndị Juu nke narị afọ mbụ, bụ́ Josephus. Dị ka ihe atụ, ọ kọrọ ihe mere mgbe a tụrụ Jemes nkume, na-akọwa ya dị ka “nwanne Jisọs onye a na-akpọ Kraịst.”—Jewish Antiquities, XX, [ix, 1].

6 Tụkwasị na nke ahụ, e nwekwara akaebe nke ndị Rom oge ochie bụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme, karịsịa nke onye ahụ a na-enye nsọpụrụ dị ukwuu, bụ́ Tacitus. O dere ná mmalite nke narị afọ nke abụọ banyere “otu òtù, bụ́ ndị a kpọrọ asị n’ihi ihe ha na-eme bụ́ ndị na-amasịghị ọha mmadụ, ndị ọha mmadụ na-akpọ ndị Kraịst. Christus [Kraịst], bụ́ onye e si n’aha ya nweta aha ahụ [ndị Kraịst], tara ahụhụ kasị ukwuu n’oge ọchịchị nke Taibiriọs n’aka otu n’ime ndị nnọchianya ọchịchị anyị.” (The Annals, XV, XLIV) N’ile ihe àmà e nwere iji kwadoo eziokwu ahụ nke bụ na Jisọs bụ onye dịrị adị n’akụkọ ihe mere eme anya dị ka ihe hiri nne nke ukwuu, onye France bụ onye ọkà mmụta ụkpụrụ omume na narị afọ nke 18, bụ́ Jean-Jacques Rousseau, gbara akaebe, sị: “Akụkọ ihe mere eme banyere Socrates, bụ́ nke ọ na-adịghị onye yiri ka ọ̀ na-arụ ya ụka, bụ nke na-enweghị ihe nkwado dị mma dị ka nke Jisọs Kraịst.”

Ihe Ndị Mere A Ga-eji Sọpụrụ Ọkpara ahụ

7. (a) Akaebe dị aṅaa nke dị n’Akwụkwọ nsọ na-eme ka anyị nwee ibu ọrụ nke ịsọpụrụ Jisọs Kraịst? (b) Olee ụzọ Jehova siworo sọpụrụ Ọkpara ya karị?

7 Anyị na-abịarute ugbu a n’okwu banyere ịsọpụrụ Jisọs Kraịst. A pụrụ ịhụta na ndị na-eso ụzọ ya nwere ibu ọrụ nke ịsọpụrụ ya site n’okwu ya nke dị na Jọn 5:22, 23: “N’ihi na Nna m adịghị ekpekwa mmadụ ọ bụla ikpe, kama o werewo ikpe nile nye Ọkpara ya; ka mmadụ nile wee sọpụrụ Ọkpara ahụ, dị ka ha na-asọpụrụ Nna ya. Onye na-adịghị asọpụrụ Ọkpara adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.” Kemgbe mbilite n’ọnwụ Kraịst, Jehova asọpụrụwo Ọkpara ya ọbụna n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu karị, ‘na-eji ebube na nsọpụrụ kpube ya okpu n’isi n’ihi ịhụ ahụhụ nke ọnwụ.’ (Ndị Hibru 2:9; 1 Pita 3:22) N’ụzọ bụ isi, anyị nwere ihe ndị mere anyị ga-eji sọpụrụ Jisọs n’ihi onye ọ bụ nakwa n’ihi ihe o meworo.

8. N’ihi eziokwu dịgasị aṅaa ndị pụrụ iche banyere Jisọs Kraịst ka o kwesịrị inweta nsọpụrụ?

8 Jisọs Kraịst kwesịrị inweta nsọpụrụ n’ihi na, dị ka Logos, ma ọ bụ Okwu ahụ, ọ bụ ọnụ kasị mma nke na-ekwuru Jehova. Site n’Akwụkwọ nsọ, ọ pụtara ìhè na utu aha bụ “Okwu ahụ” dịịrị Jisọs tupu ọ bịa n’elu ala nakwa mgbe ọ laghachisịrị n’eluigwe. (Jọn 1:1; Mkpughe 19:13) Ná Mkpughe 3:14 ọ na-ekwu okwu banyere onwe ya dị ka “isi nke ihe nile Chineke kere.” Ọ bụghị nanị na ọ bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke,” ma dị ka “Ọkpara ọ mụrụ nanị ya,” ọ bụ nanị ya bụ onye Jehova Chineke kere n’onwe ya. (Ndị Kọlọsi 1:15; Jọn 3:16) Tụkwasị na nke ahụ, “e kere ihe nile site n’aka ya; e keghịkwa otu ihe ọ bụla nke e keworo ma ọ nọghị ya.” (Jọn 1:3) Ya mere, mgbe anyị na-agụ na Jenesis 1:26 na Chineke sịrị, “Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị, dị ka oyiyi anyị si dị,” “anyị” nke dị n’ebe ahụ gụnyere Logos, ma ọ bụ Okwu ahụ. N’ezie, eziokwu ahụ nke bụ na Jisọs, n’ọnụnọ ya tupu ọ ghọọ mmadụ, nwere ihe ùgwù dị ebube nke iso Jehova Chineke kere òkè n’ike ihe mere ka o ruo eru inweta nsọpụrụ dị ukwuu.

9. N’ihi gịnị ka anyị ji na-ekwubi na Jisọs bụ onye isi mmụọ ozi ahụ bụ Maịkael, oleekwa ụzọ Maịkael si sọpụrụ Jehova n’ihe banyere ahụ Mosis?

9 Jisọs Kraịst rukwara eru inweta nsọpụrụ n’ihi na ọ bụ mmụọ ozi bụ isi nke Jehova, ma ọ bụ onye isi ndị mmụọ ozi. N’ihe ndabere dị aṅaa ka anyị na-eru ná nkwubi okwu ahụ? Ee, okwu mbuụzọ ahụ bụ “isi,” nke pụtara “onye isi” ma ọ bụ “nke bụ isi,” na-egosi na e nwere nanị otu isi mmụọ ozi. Okwu Chineke na-ekwu okwu banyere ya na-ezo aka n’ebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke a kpọliteworo site n’ọnwụ nọ. Anyị na-agụ, sị: “Onyenwe anyị onwe ya ga-ewere oké ịkpọ òkù, were olu isi mmụọ ozi, werekwa opi nke Chineke, si n’eluigwe rịdata: ndị nwụrụ n’ime Kraịst ga-ebukwa ụzọ si n’ọnwụ bilie.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:16) Isi mmụọ ozi nke a nwere aha, dị ka anyị na-agụ na Jud 9: “Maịkael onye isi mmụọ ozi, mgbe ya na Ekwensu na-arụrịta ụka banyere ahụ Mosis, ka ọ na-ekwugide ya, o nweghị anya ike ikpe ya ikpe nkwulu, kama ọ sịrị, Ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] baara gị mba.” N’ịghara ịgbafe Jehova n’ihu site n’ịnwa anwa ịma Ekwensu ikpe, Jisọs sọpụụrụ Nna ya nke eluigwe.

10. (a) Olee ụzọ Maịkael si na-ebute ụzọ n’ịlụrụ Alaeze Chineke ọgụ? (b) Ọrụ di aṅaa ka Maịkael rụrụ n’ihe banyere mba Israel?

10 Onye isi mmụọ ozi ahụ bụ Maịkael na-alụchitere Alaeze Chineke ọgụ, na-ebute ụzọ n’ịkpọchapụ Setan na usuu ndị mmụọ ọjọọ ya site n’eluigwe. (Mkpughe 12:7-10) Daniel onye amụma na-ekwukwa na ‘ọ na-eguzo ọtọ n’akụkụ ndị Chineke.’ (Daniel 12:1) Ya mere, o yiri ka ọ bụ Maịkael bụ “mmụọ ozi nke Chineke, nke na-eje n’ihu ọmụma ụlọ ikwuu nke Israel,” na ọ bụkwa ya ka Chineke jiri mee ihe iwebata ndị ya n’ime Ala Nkwa ahụ. Chineke nyere iwu, sị, “Lezie anya n’ihu ya, geekwa ntị n’olu ya; enupụla isi n’okpuru ya: . . . n’ihi na aha m dị n’ime ya.” (Ọpụpụ 14:19; 23:20, 21) N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, ọ ghaghị ịbụ na onye isi mmụọ ozi nke Jehova ga-enweworị mmasị dị ukwuu ná ndị ahụ a kpọkwasịrị aha Chineke. N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, ọ bịara inyere mmụọ ozi ọzọ aka, bụ́ nke e dujere ịkasi Daniel onye amụma obi, bụ́ onye otu mmụọ ọjọọ dị oké ike nọchikwaara ụzọ. (Daniel 10:13) Ya mere, ọ pụrụ ịbụ ihe ezi uche dị n’ime ya ikwubi na mmụọ ozi ahụ nke bibiri 185,000 ndị agha Senakerib adịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị Maịkael onye isi mmụọ ozi.—Aịsaịa 37:36.

11. N’ihi ịgbaso ụzọ ndụ dị aṅaa n’elu ala ka Jisọs kwesịrị inweta nsọpụrụ anyị?

11 Jisọs Kraịst kwesịrị inweta nsọpụrụ ọ bụghị nanị n’ihi onye ọ bụ kama o kwesịrị inweta nsọpụrụ anyị n’ihi ihe o meworo. Dị ka ihe atụ, ọ bụ nanị ya bụ mmadụ nke dịworo ndụ dị ka onye zuru okè. E kere Adam na Iv dị ka ndị zuru okè, ma izu okè ha anọghị ogologo oge. Otú ọ dị, Jisọs Kraịst nọgidere dị ka ‘onye dị ọcha n’obi, onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụworo n’etiti ndị mmehie’ n’agbanyeghị ihe nile Ekwensu wetara megide ya n’ụzọ nke ọnwụnwa na mkpagbu. N’ime ihe ndị a nile, “ọ dịghị mmehie ọ bụla o mere, a hụghịkwa aghụghọ n’ọnụ ya.” Ọ pụrụ ịma ndị okpukpe na-emegide ya aka n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ònye n’ime unu tụrụ m mmehie n’anya?” Ọ dịghị otu onye n’ime ha pụrụ ime otú ahụ! (Ndị Hibru 7:26; 1 Pita 2:22; Jọn 8:46) N’ihi iguzosi ike n’ezi ihe n’emeghị mmehie ọ bụla, Jisọs wepụkwara Nna ya nke eluigwe n’ụta dị ka onye kwesịrị ekwesị ịbụ Eze eluigwe na ala, gosipụtakwa na Ekwensu bụ ajọ onye ụgha rụrụ arụ.—Ilu 27:11.

12. (a) Ụdị mmadụ dị aṅaa ka Jisọs bụ, gịnịkwa ka o mere, taakwa ahụhụ ya n’ihi ndị ọzọ? (b) N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na Jisọs kwesịrị inweta nsọpụrụ anyị n’ihi ihe o mere na n’ihi ihe ọ tara ahụhụ ya?

12 Jisọs Kraịst kwesịrị inweta nsọpụrụ anyị, ọ bụghị nanị n’ihi na ọ dịrị ndụ dị ka onye zuru okè nke na-emeghị mmehie, kamakwa n’ihi na ọ bụ ezi mmadụ, mmadụ nke na-adịghị achọ ọdịmma nke nanị onwe ya, onye jiri onwe ya chụọ àjà. (Tụlee Ndị Rom 5:7.) N’enweghị ike ọgwụgwụ, o jere ozi ilekọta mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ nke ndị mmadụ. Lee nnọọ ịnụ ọkụ n’obi o gosipụtara maka ụlọ nke Nna ya, leekwa inwe ndidi o gosiri n’imeso ndị na-eso ụzọ ya ihe! Lee nnọọ ahụhụ ọ dị njikere ịnagide n’ime ihe Nna ya na-achọ! N’ihe banyere ahụhụ ọ tara n’ogige Getsemane, Bible na-asị: “Ebe ọ na-egbu ya mgbu n’obi hie nne o kpee ekpere sie ike karị: ọsụsọ ya wee ghọọ ihe dị ka oké ọkpụrụkpụ ọbara na-ada n’ala.” Ee, ‘o jiri ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri kpee ekpere, rịọkwa arịrịọ.’ (Luk 22:44; Ndị Hibru 5:7) Lee nnọọ ka Aịsaịa onye amụma si buo amụma n’ụzọ ziri ezi banyere ahụhụ ya n’Aịsaịa 53:3-7!

13. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụụrụ anyị n’ịsọpụrụ Nna ya nke eluigwe?

13 Jisọs kwesịkwara inweta nsọpụrụ anyị n’ihi ezi ihe nlereanya o setịpụụrụ anyị n’ịsọpụrụ Nna ya nke eluigwe. O nwere nnọọ ike ikwu, sị: “Ana m asọpụrụ Nna m.” (Jọn 8:49) N’oge nile, o wetaara Jehova Chineke nsọpụrụ site n’okwu na omume ya nile. Otú a, mgbe ọ gwọrọ otu nwoke, ihe ndekọ Bible na-asị, ọ bụghị na ndị mmadụ nyere Jisọs otuto, kama na ‘ha toro Chineke.’ (Mak 2:12) N’ihi nke a, n’ọgwụgwụ nke ije ozi elu ala ya, Jisọs pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi n’ekpere gwa Nna ya nke eluigwe, sị: “Mụ onwe m nyere gị otuto n’elu ụwa, ebe m rụzuru ọrụ i nyeworo m ka m rụọ.”—Jọn 17:4.

Ihe O Mewooro Anyị

14. Gịnị ka ọnwụ Jisọs mezuuru anyị, bụ́ nke na-eme ka o kwesị inweta nsọpụrụ?

14 Leekwa nnọọ ụzọ dị ukwuu Jisọs Kraịst si kwesị inweta nsọpụrụ anyị n’ihi ihe nile o mezuwooro anyị! Ọ nwụrụ n’ihi mmehie anyị ka e wee nwee ike ime ka anyị na Jehova Chineke dịghachi ná mma. Jisọs kwuru banyere onwe ya, sị: “Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Otú a, ọnwụ ya mere ka ihe nile Alaeze ahụ ga-arụzuru anyị bụ ụmụ mmadụ kwe omume: ịdị ndụ n’anwụghị anwụ n’eluigwe nye 144,000 ahụ ndị mezuru nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ na ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs nye ọtụtụ nde ụmụ mmadụ ndị ọzọ ndị nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi, na-erubekwa isi n’okpuru ule.—Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 14:1-3; 21:3, 4.

15. Gịnị bụ otu ihe atụ nke mkpughe Jisọs kpugheere anyị ọdịdị Nna ya?

15 Jisọs Kraịst kwesịkwara inweta nsọpụrụ n’ihi na, dị ka Onye Ozizi Ukwu ahụ, o kpughewo uche na ọdịdị nke Nna ya nye anyị n’ụzọ zuru okè. Dị ka ihe atụ, n’Ozizi Elu Ugwu ya, o zoro aka n’omume afọ ofufo nke Nna ya n’inye ma ndị ezi mmadụ ma ndị ajọ mmadụ anyanwụ na mmiri ozuzo, wee kwuo, sị: “Ya mere unu onwe unu ga-ezu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.”—Matiu 5:44-48.

16. Olee ụzọ Pọl onyeozi si chịkọta ụzọ ndụ Jisọs nke mere ka o kwesị inweta nsọpụrụ?

16 Pọl onyeozi chịkọtara ụzọ ndụ Jisọs nke kwesịrị inweta nsọpụrụ n’ụzọ ziri ezi mgbe o dere, sị: “Ọ bụ ezie na ọ dịrị n’ụdị Chineke, [o] leghị ya anya dị ka ihe ọ ga-ewere n’ike, ya bụ, na o kwesịrị ka ya na Chineke hara nhata. Ee e, o mere onwe ya ihe efu wee were ụdị nke ohu, wee dịrị n’ụdịdị nke mmadụ. Karịa nke ahụ, mgbe ọ hụrụ onwe ya n’ụdịdị nke mmadụ o wedara onwe ya ala wee na-erube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ.”—Ndị Filipaị 2:5-8, NW.

Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Sọpụrụ Ọkpara ahụ

17, 18. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi wetara Jisọs Kraịst nsọpụrụ?

17 Ebe ọ bụ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na Jisọs Kraịst kwesịrị inweta nsọpụrụ anyị, anyị na-erute n’ajụjụ ahụ nke bụ: Olee ụzọ anyị pụrụ isi sọpụrụ Ọkpara ahụ? Anyị na-eme nke a site n’itinye okwukwe n’àjà mgbapụta ya, anyị na-egosipụtakwa okwukwe ahụ site n’ime ihe ndị dị mkpa, bụ́ nchegharị, nchigharị, nraranye, na baptism. Site n’ịbịakwute Jehova n’ekpere n’aha Jisọs, anyị na-asọpụrụ Jisọs. Anyị na-asọpụrụkwa ya mgbe anyị na-erube isi n’okwu ya bụ: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa osisi ịta ahụhụ nke ya, na-esokwa m mgbe nile.” (Matiu 16:24, NW) Anyị na-asọpụrụ Jisọs Kraịst mgbe anyị rubere isi na ndụmọdụ ya nke bụ ịnọgide buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya, anyị na-asọpụrụkwa ya mgbe anyị na-edebe iwu ya nke bụ ikere òkè n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Ọzọkwa, anyị na-asọpụrụ Jisọs mgbe anyị na-egosipụta ịhụnanya ụmụnna, bụ́ nke ọ sịrị na a ga-eji mara ezi ndị na-eso ụzọ ya.—Matiu 6:33; 28:19, 20; Jọn 13:34, 35.

18 N’ịga n’ihu, anyị na-ewetara Ọkpara ahụ nsọpụrụ site n’ịkpọkwasị onwe anyị aha ya, na-akpọ onwe anyị ndị Kraịst, sitekwa n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’aha ahụ site n’omume ọma anyị. (Ọrụ 11:26; 1 Pita 2:11, 12) Pita onyeozi kwuru na anyị kwesịrị ịgbasochi nzọụkwụ nile nke Jisọs anya. (1 Pita 2:21) Site n’isi otú a na-eṅomi ya n’akparamagwa anyị nile, anyị na-enyekwa ya nsọpụrụ. O dokwara anya na mgbe anyị na-eme Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst kwa afọ, anyị na-enye ya nsọpụrụ pụrụ iche.—1 Ndị Kọrint 11:23-26.

19, 20. (a) Nkwụghachi ụgwọ dịgasị aṅaa ka Jisọs na-edebere ndị na-eso ụzọ ya maka ịsọpụrụ ya, ugbu a nakwa n’ọdịnihu? (b) Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe n’ihe banyere Ọkpara ahụ?

19 Nkwụghachi ụgwọ dị aṅaa ka Jisọs na-edebere ndị na-eso ụzọ ya maka ịgbaso ụzọ nke na-enye ya nsọpụrụ? Ọ sịrị: “N’ezie asị m unu, Ọ dịghị onye ọ bụla nke hapụrụ ụlọ, ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom, ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ubi, n’ihi m, na n’ihi ozi ọma nke m, ma ọ bụghị na ọ ga-anata [otu narị otu narị] ugbu a n’oge a, ụlọ, na ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne, na ụmụ, na ubi, ha na nsogbu; ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi n’oge nke na-abịa.”—Mak 10:29, 30.

20 Nke a pụtara na ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ụfọdụ chụọ àjà n’ihi Jisọs, ọ ga-ahụ na e nyeghachiri anyị ụgwọ ọrụ. Jisọs na-emesi anyị obi ike, sị: “Onye ọ bụla nke ga-ekwupụta m n’ihu mmadụ, ya ka mụ onwe m ga-ekwupụtakwa n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe.” (Matiu 10:32) Ya mere dị nnọọ ka Nna anyị nke eluigwe na-asọpụrụ ndị ahụ na-asọpụrụ ya, anyị pụrụ inwe obi ike na Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya ga-eṅomikwa Nna ya n’ihe banyere nke a, ọbụna dị ka Ọkpara ahụ na-emekwa n’ihe ndị ọzọ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Olee ụzọ ọtụtụ ndị nọ na Krisendọm na-esi ghara inye Ọkpara ahụ nsọpụrụ?

◻ Akaebe dị aṅaa ka Jisọs gbara banyere ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ?

◻ Gịnị bụ ihe ụfọdụ mere anyị ga-eji sọpụrụ Jisọs?

◻ Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi sọpụrụ Jisọs?

◻ Ịsọpụrụ Jisọs Kraịst na-arụpụta abamuru dị aṅaa?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya