Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 12/15 p. 14-19
  • Ndị E Ziri Ime Ihe Dị Jehova Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị E Ziri Ime Ihe Dị Jehova Ụtọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Imesikwu Ime Ihe Dị Chineke Ụtọ Ike
  • Ndị E Ziri Ihe Dị Jehova Ụtọ ná Nzukọ Anyị Nile
  • Ndị Ndị Nne na Nna Na-atụ Egwu Chineke Ziri Ihe Dị Jehova Ụtọ
  • Ndị E Ziri Ịhụ n’Anya na Ịlụ Ọgụ
  • Ịkụziri Anyị Ime Ihe Na-abara Anyị Uru
  • Ndị Jehova Na-akụziri Ihe Ruo Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Jehova—Chineke nke Na-akụzi Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • “M Na-esetịpụrụ Unu Ụkpụrụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
    Ozi Alaeze Anyi—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 12/15 p. 14-19

Ndị E Ziri Ime Ihe Dị Jehova Ụtọ

“Zi m ime ihe dị Gị ụtọ; n’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke m.”—ABỤ ỌMA 143:10.

1, 2. (a) Olee mgbe e kwesịrị izi anyị ihe, sitekwa n’echiche dị aṅaa ezi uche dị na ya? (b) N’ihi gịnị ka ịbụ ndị Jehova ziri ihe ji dị oké mkpa?

ỤBỌCHỊ ọ bụla mmadụ dị ndụ ma na-arụ ọrụ, a pụrụ izi ya ihe bara uru. Nke ahụ bụ eziokwu n’ọnọdụ gị, ọ bụkwa eziokwu n’ọnọdụ ndị ọzọ. Ma gịnị na-eme n’ọnwụ? O kweghị omume ịbụ onye e ziri ihe ọ bụla ma ọ bụ ịmụta ihe n’ọnọdụ ahụ. Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” E nweghị ihe ọmụma na Sheol, ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Eklisiastis 9:5, 10) Nke a ọ̀ pụtara na anyị ịbụ ndị e ziri ihe, ịkwakọba ihe ọmụma, bụ n’efu? Nke ahụ dabeere n’ihe e ziri anyị na ụzọ anyị si eji ihe ọmụma ahụ eme ihe.

2 Ọ bụrụ na e ziri anyị nanị ihe ụwa, anyị enweghị ọdịnihu ọ bụla na-adịgide adịgide. Ma, ọ bụ ihe obi ụtọ na a na-ezi ọtụtụ nde mmadụ ná mba nile ihe dị Chineke ụtọ iji nweta ndụ ebighị ebi. Ihe ndabere nke olileanya a dị n’ịbụ ndị Jehova, Isi Iyi nke ihe ọmụma na-enye ndụ, ziri ihe.—Abụ Ọma 94:9-12.

3. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jisọs bụ nwa akwụkwọ mbụ nke Chineke? (b) Mmesi obi ike dị aṅaa ka anyị nwere na Jehova ga-ezi ụmụ mmadụ ihe, na-arụpụtakwa ihe dị aṅaa?

3 E ziri Ọkpara Chineke, dị ka nwa akwụkwọ Ya mbụ, ime ihe dị Nna ya ụtọ. (Ilu 8:22-30; Jọn 8:28) N’akụkụ nke ya, Jisọs gosiri na Nna ya ga-ezi ọtụtụ miriad mmadụ ihe. Gịnị bụ olileanya anyị bụ́ ndị mụtara ihe n’ọnụ Chineke? Jisọs sịrị: “E dewo ya n’akwụkwọ ndị amụma, sị, Ha nile ga-abụkwa ndị Chineke ziworo ihe. Onye ọ bụla nke nụworo site n’ọnụ Nna m, nke mụtaworo ihe, ọ na-abịakwute m. . . . N’ezie, n’ezie, asị m unu, Onye na-ekwere na-enwe ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:45-47.

4. Olee otú izi ihe Chineke si emetụta ọtụtụ nde mmadụ, olileanya dịkwa aṅaa ka ha nwere?

4 Jisọs na-ehota site n’Aịsaịa 54:13, nke a gwara nwanyị ihe atụ Chineke, Zaịọn eluigwe. Amụma ahụ dịịrị ụmụ ya karịsịa, bụ́ 144,000 ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta. Ihe fọdụrụ n’ụmụ ime mmụọ ahụ na-arụ ọrụ taa, na-ebute ụzọ n’usoro nkụzi zuru ụwa ọnụ. N’ihi ya, ọtụtụ nde ndị ọzọ mejupụtara “oké ìgwè mmadụ” na-eritekwa uru site n’ịbụ ndị Jehova ziri ihe. Ha nwere olileanya pụrụ iche nke ịmụta ihe n’anwụghị anwụ. N’ụzọ dị aṅaa? Ee, ha nọ n’usoro ịlanarị “oké mkpagbu” ahụ ji ọsọ abịaru nso na ịnụ ụtọ ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ụwa.—Mkpughe 7:9, 10, 13-17.

Imesikwu Ime Ihe Dị Chineke Ụtọ Ike

5. (a) Gịnị bụ isiokwu dịịrị afọ 1997? (b) Olee ihe kwesịrị ịbụ mmetụta anyị banyere ịga nzukọ ndị Kraịst?

5 N’afọ 1997, n’ihe karịrị ọgbakọ 80,000 gburugburu ụwa, Ndịàmà Jehova ga-eburu nnọọ n’uche okwu mmepe nke Abụ Ọma 143:10: “Zi m ime ihe dị Gị ụtọ.” Nke ahụ ga-abụ isiokwu dịịrị afọ 1997. Okwu ndị ahụ, ndị e gosiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nile n’ụzọ pụtara ìhè, ga-eje ozi dị ka ihe ncheta nke na ebe pụtara ìhè maka ịnata izi ihe Chineke bụ ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ, ebe anyị pụrụ ikere òkè n’usoro ihe omume nkụzi na-aga n’ihu. Mgbe anyị na-esonyere ụmụnna anyị ná nzukọ iji bụrụ ndị Onye Nkụzi Ukwu anyị ziri ihe, anyị pụrụ inwe mmetụta dị ka nke ọbụ abụ ahụ, onye dere, sị: “Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha na-asị m, Ka anyị jee n’ụlọ Jehova.”—Abụ Ọma 122:1; Aịsaịa 30:20.

6. N’okwu Devid, gịnị ka anyị na-anakwere?

6 Ee, ọ na-agụ anyị agụụ ịbụ ndị e ziri ime ihe dị Chineke ụtọ kama ime ihe dị onye iro anyị bụ Ekwensu ụtọ ma ọ bụ ihe dị ụmụ mmadụ na-ezughị okè ụtọ. Ya mere, dị ka Devid, anyị na-anakwere Chineke anyị na-efe ma na-ejere ozi: “N’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke m: mmụọ Gị dị mma; duru m n’ala dị larịị.” (Abụ Ọma 143:10) Kama ịchọ iso ụmụ mmadụ efu na-akpakọrịta, Devid họọrọ ịnọ n’ebe ofufe Jehova na-aga n’ihu. (Abụ Ọma 26:4-6) N’inwe mmụọ Chineke iduzi ijeụkwụ ya, Devid pụrụ ịzọ ije n’ụzọ nke ezi omume.—Abụ Ọma 17:5; 23:3.

7. Olee otú mmụọ Chineke siworo rụọ ọrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst?

7 Devid Ka Ukwuu, Jisọs Kraịst, mesiri ndị ozi ya obi ike na mmụọ nsọ ga-akụziri ha ihe nile ma chetara ha ihe nile ọ gwaworo ha. (Jọn 14:26) Site na Pentikọst gaa n’ihu, Jehova anọwo na-ekpughe n’ụzọ na-aga n’ihu “ihe nile dị omimi nke Chineke” dị n’Okwu ya e dere ede. (1 Ndị Kọrint 2:10-13) Nke a ka o meworo site n’ụzọ a na-ahụ anya nke Jisọs kpọrọ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” Ọ na-enye nri ime mmụọ nke a na-atụle n’usoro nkụzi maka ọgbakọ nile nke ndị Chineke gburugburu ụwa.—Matiu 24:45-47.

Ndị E Ziri Ihe Dị Jehova Ụtọ ná Nzukọ Anyị Nile

8. N’ihi gịnị ka ikere òkè n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ji baa oké uru?

8 Ihe na-adị n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke ọgbakọ a na-enwe kwa izu na-atụle mgbe mgbe itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Nke a na-enyere anyị nnọọ aka ịnagide nchekasị nile nke ndụ. N’ọmụmụ ihe ndị ọzọ, a na-atụle eziokwu ime mmụọ ma ọ bụ amụma Bible ndị gbara ọkpụrụkpụ. Lee ọtụtụ ihe a na-ezi anyị n’ọmụmụ ihe dịgasị otú ahụ! N’ọtụtụ ala,Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eju n’ọnụ maka nzukọ ndị a. Ma n’ime mba ụfọdụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ adalatawo. Gịnị ka ị na-eche kpatara ya? Ọ̀ pụrụ ịbụ na ụfọdụ na-ekwe ka ọrụ ego na-egbochi ha izukọ ọnụ mgbe nile “ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche”? Ka ọ̀ pụrụ ịbụ na a na-etinye ọtụtụ hour n’ihe omume ọha na eze ma ọ bụ n’ikiri telivishọn, na-eme ka usoro ihe omume yie ka ò jubigara ókè ịga nzukọ nile? Cheta iwu si n’ike mmụọ nsọ nke dị ná Ndị Hibru 10:23-25. Ọ̀ bụ na izukọ ọnụ maka ntụziaka Chineke adịghị mkpa ọbụna karị ugbu a ka anyị “na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso”?

9. (a) Olee otú Nzukọ Ije Ozi pụrụ isi kwadebe anyị maka ozi? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị banyere ịgba àmà?

9 Otu n’ime ibu ọrụ anyị ndị kasị mkpa bụ nke ije ozi dị ka ndị ozi Chineke. A haziri Nzukọ Ije Ozi ịkụziri anyị ụzọ anyị pụrụ isi mezuo nke a n’ụzọ dị irè. Anyị na-amụ ụzọ isi na-ejekwu ndị mmadụ, ihe a ga-ekwu, ụzọ isi meghachi omume mgbe e nwere nzaghachi dị mma, na ọbụna ihe a ga-eme mgbe ndị mmadụ jụrụ ozi anyị. (Luk 10:1-11) Ka a na-atụle ma na-eme ngosi ụzọ ndị dị irè ná nzukọ kwa izu a, a na-akwadebe anyị nke ọma karị irute ndị mmadụ ọ bụghị nanị mgbe a na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ kamakwa mgbe a na-eme nkwusa n’okporo ámá, n’ebe ndọba ụgbọala, n’usoro njem ọha na eze, n’ọdụ ụgbọelu, n’ebe achụmnta ego, ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. N’ikwekọ n’arịrịọ anyị, “Zi m ime ihe dị Gị ụtọ,” anyị ga-achọ iji ohere ọ bụla mee dị ka Onyenwe anyị gbara ume: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha . . . wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.”—Matiu 5:16.

10. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ‘ndị kwesịrị’ aka n’ezie?

10 Ná nzukọ ọgbakọ dịgasị otú ahụ, a na-ezikwa anyị ime ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ. Ozugbo a chọtara mmasị ma ọ bụ tinye akwụkwọ, nzube anyị mgbe a na-eme nletaghachi bụ ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. N’otu echiche, nke a yiri ndị na-eso ụzọ ‘iso ndị kwesịrị nọgide’ iji kụziere ha ihe nile Jisọs nyere n’iwu. (Matiu 10:11; 28:19, 20) Site n’inwe ihe enyemaka magburu onwe ha, dị ka akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, a kwadebere anyị nke ọma n’ezie ịrụzu ọrụ anyị nke ọma. (2 Timoti 4:5) Kwa izu ka ị na-eje Nzukọ Ije Ozi na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, gbalịa ịghọta na imesịa jiri isi ihe ndị na-enye aka bụ́ ndị ga-egosipụta gị dị ka otu n’ime ndị ozi ruru eru nke ọma nke Chineke, ndị na-eme ihe dị ya ụtọ mee ihe.—2 Ndị Kọrint 3:3, 5; 4:1, 2.

11. Olee otú ụfọdụ siworo gosipụta okwukwe n’okwu ndị a na-achọta na Matiu 6:33?

11 Ọ dị Chineke ụtọ ka anyị ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya.’ (Matiu 6:33) Jụọ onwe gị, ‘Olee otú m ga-esi tinye ụkpụrụ a n’ọrụ ma ọ bụrụ na ihe a chọrọ n’ọrụ ego m [ma ọ bụ nke nwunye ma ọ bụ di m] egbochie ije nzukọ?’ Ọtụtụ ndị tozuru okè n’ime mmụọ ga-eme ihe iji gwa ndị were ha n’ọrụ okwu banyere okwu a. Otu onye ozi oge nile mere ka onye were ya n’ọrụ mara na ọ dị ya mkpa iwere oge kwa izu iji jee nzukọ ọgbakọ. Ọ nabatara arịrịọ ya. Ma n’ihi ọchịchọ ịmata ihe na-ewere ọnọdụ ná nzukọ ndị ahụ, ọ sịrị na ya ga-abịa. N’ebe ahụ ọ nụrụ ọkwa banyere mgbakọ distrikti na-abịanụ. N’ihi ya, onye ahụ were ya n’ọrụ mere ndokwa ịnọ otu ụbọchị dum ná mgbakọ ahụ. Olee ihe ị mụtara site n’ihe atụ a?

Ndị Ndị Nne na Nna Na-atụ Egwu Chineke Ziri Ihe Dị Jehova Ụtọ

12. Ka ụmụ wee bụrụ ndị e ziri ihe dị Jehova ụtọ, gịnị ka nne na nna bụ́ ndị Kraịst kwesịrị iji ndidi na nkwụrụsi ike mee?

12 Ma ọ bụghị nanị nzukọ ọgbakọ na mgbakọ bụ ndokwa e nwere maka ịbụ ndị e ziri ime ihe dị Chineke ụtọ. E nyere ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke iwu ịzụ, ịdọ aka ná ntị, na ịzụlite ụmụ ha ito Jehova na ime ihe dị ya ụtọ. (Abụ Ọma 148:12, 13; Ilu 22:6, 15) Ime otú ahụ na-achọ ka anyị kpọrọ “ụmụntakịrị” anyị gaa nzukọ nile ebe ha pụrụ ‘ịnụ ma mụta ihe,’ ma gịnị banyere ịkụziri ha ihe site n’ihe odide nile dị nsọ n’ụlọ? (Deuterọnọmi 31:12; 2 Timoti 3:15) Ọtụtụ ezinụlọ ejiwo ịdị uchu malite usoro ọmụmụ Bible ezinụlọ mgbe nile, ma mesịa kwere ka nke a nyụọ ka ọkụ ma ọ bụ bụrụ nke e leghaara anya n’oge na-adịghị anya. Ì nwewo ahụmahụ dị otú ahụ? Ị̀ ga-ekwubi na aro inwe ọmụmụ ihe mgbe nile dị otú ahụ ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ na ezinụlọ gị dị nnọọ iche nke na ọ gaghị nnọọ adaba n’ọnọdụ gị? N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ, unu nne na nna biko tụleghachinụ isiokwu ọma ndị ahụ bụ “Ihe Nketa Ime Mmụọ Anyị Bara Ụba” na “Ụgwọ Ọrụ nke Nnọgidesi Ike” n’Ụlọ Nche nke August 1, 1995.

13. Olee otú ezinụlọ pụrụ isi rite uru site n’ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị?

13 A na-agba ezinụlọ nile ume inwe àgwà ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị site n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Nanị ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ na okwu nkọwa dị mma, ma ịtụle ihe mmụta ahụ na itinye ya n’ọrụ bara uru karị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a na-atụle Ndị Efesọs 5:15-17, ndị òtù ezinụlọ pụrụ ịtụgharị uche n’ụzọ isi ‘zụchapụta oge’ maka ọmụmụ ihe onwe onye, ikere òkè n’otu ụdị nke ozi oge nile, na ilekọta ọrụ ndị ọzọ nke ọchịchị Chineke. Ee, ntụle ezinụlọ nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị pụrụ iduba n’otu onye ma ọ bụ ọtụtụ ndị ịdị ‘na-aghọtakwu karị ihe bụ ihe Onyenwe anyị na-achọ.’

14. Ụdị ndị nkụzi dị aṅaa ka Deuterọnọmi 6:6, 7 na-egosi na nne na nna kwesịrị ịbụ, na-achọ ka e mee gịnị?

14 Nne na nna kwesịrị ịbụ ndị nkụzi dị uchu nke ụmụ ha. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ma ọ bụghị nanị okwu nke ịgwagbu ụmụ ha n’okwu ma ọ bụ inye ha iwu. Ọ dịkwa nne na nna mkpa ige ntị, si n’ụzọ dị otú ahụ nwekwuo ike ịma ihe dị mkpa ka a kọwaa, mee ka o doo anya, mee ihe atụ ya, ma ọ bụ kwughachi. N’otu ezinụlọ ndị Kraịst, nne na nna na-akpali nkwurịta okwu maka onye ọ bụla site n’ịgba ụmụ ha ume ịjụ ajụjụ banyere ihe ndị ha na-aghọtaghị ma ọ bụ na-akpata nchegbu. Ha si otú a mata na otu nwa ha nwoke nọ n’afọ iri na ụma nwere nsogbu ịghọta na Jehova enweghị mmalite. Nne na nna ahụ nwere ike iji ihe ọmụma sitere ná mbipụta Watch Tower Society na-egosi na oge na mbara igwe bụ ihe ndị a nakweere dị ka ndị na-enweghị ọgwụgwụ. Nke ahụ mere ka isi ihe ahụ doo anya, o jukwara nwa ha afọ. Ya mere wepụta oge ịza ajụjụ ụmụ gị n’ụzọ doro anya na site n’Akwụkwọ Nsọ, na-enyere ha aka ịmụta na ime ihe dị Chineke ụtọ pụrụ nnọọ inye afọ ojuju. Gịnị ọzọ ka a na-akụziri ndị Chineke taa—ndị na-eto eto na ndị agadi?

Ndị E Ziri Ịhụ n’Anya na Ịlụ Ọgụ

15. Olee mgbe a pụrụ ịnwale ma ịhụnanya ụmụnna anyị ọ̀ bụ nke ezigbo ya?

15 N’ikwekọ n’iwu ọhụrụ Jisọs nyere, ‘Chineke eziwo anyị ịhụrịta ibe anyị n’anya.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 4:9) Mgbe ọnọdụ dị jụụ, ihe ana-aga nke ọma, anyị nwere ike iche na anyị hụrụ ụmụnna anyị nile n’anya. Ma gịnị na-eme mgbe esemokwu onwe onye bilitere ma ọ bụ e mejọọ anyị n’ihi ihe onye Kraịst ọzọ kwuru ma ọ bụ mee? N’oge a a pụrụ ịnwale ma ịhụnanya anyị ọ̀ bụ nke ezigbo ya. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 8:8.) Gịnị ka Bible na-akụziri anyị ime n’ọnọdụ dịgasị otú ahụ? Otu ihe bụ ịgbalị igosipụta ịhụnanya n’echiche kasị zuo ezu. (1 Pita 4:8) Kama ịdị na-achọ ọdịmma nke onwe anyị, na-ewe iwe maka ụmụ irighiri mmejọ, ma ọ bụ na-agụ ihe ọjọọ e mere anyị, anyị kwesịrị ịrụ ọrụ n’ikwere ka ịhụnanya kpuchie ọtụtụ mmehie. (1 Ndị Kọrint 13:5) Anyị maara na nke a bụ ihe dị Chineke ụtọ, n’ihi na ọ bụ ihe Okwu ya na-akụzi.

16. (a) N’ụdị obubuagha dị aṅaa ka a na-akụziri ndị Kraịst itinye aka? (b) Olee otú e si ejikere anyị?

16 Ọ bụ ezie na ọtụtụ agaghị ejikọ ịhụnanya na obubuagha, nke ikpeazụ bụ ihe ọzọ a na-akụziri anyị, kama ọ bụ ụdị obubuagha dịwagara iche. Devid ghọtara ndabere ọ dabeere na Jehova ịkụziri ya ụzọ isi buo agha, ọ bụ ezie na n’oge ya nke ahụ gụnyere ịlụ ọgụ nkịtị megide ndị iro Israel. (1 Samuel 17:45-51; 19:8; 1 Ndị Eze 5:3; Abụ Ọma 144:1) Gịnị banyere ọgụ anyị taa? Ihe agha anyị abụghị nke anụ ahụ. (2 Ndị Kọrint 10:4) Nke anyị bụ ọgụ ime mmụọ, nke ọ dị anyị mkpa iji ekike agha ime mmụọ jikere maka ya. (Ndị Efesọs 6:10-13) Site n’Okwu ya na ndị ya gbakọrọ agbakọ, Jehova na-akụziri anyị ịlụ ọgụ ime mmụọ na-aga nke ọma.

17. (a) Atụmatụ dị aṅaa ka Ekwensu ji adọpụ uche anyị? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị iji amamihe zere?

17 N’ụzọ aghụghọ, ndị dị nzuzo, Ekwensu na-ejikarị ihe ndị dị n’ụwa, ndị dapụrụ n’ezi ofufe, na ndị ọzọ na-emegide eziokwu eme ihe ná mgbalị ịdọpụ uche anyị gaa n’ihe ndị ọzọ. (1 Timoti 6:3-5, 11; Taịtọs 3:9-11) Ọ bụ dị ka ọ na-ahụ na o nwere ohere dị nta nke imeri anyị site ná mwakpo ihu na ihu, ya mere ọ na-anwa ịsụ anyị ngọngọ site n’ime ka anyị kwupụta ụmụ mkpesa na ajụjụ nzuzu anyị dịgasị iche iche, bụ́ ndị na-enweghị uru ime mmụọ ọ bụla. Dị ka ndị agha mụ anya, anyị kwesịrị ịmụrụ nnọọ anya dị ka anyị ga-amụ n’ebe mwakpo ihu na ihu dị.—1 Timoti 1:3, 4.

18. Gịnị ka adịkwaghịrị onwe anyị ndụ gụnyere n’ezie?

18 Anyị adịghị akwalite ọchịchọ ụmụ mmadụ ma ọ bụ ihe mba dị iche iche na-achọ. Jehova eziwo anyị site n’ihe nlereanya Jisọs na anyị aghaghị ịkwụsị ibiri onwe anyị ndụ; kama nke ahụ, anyị kwesịrị inwe otu izu ahụ Kraịst Jisọs nwere ma dịrị ndụ maka ihe dị Chineke ụtọ. (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) N’oge gara aga, anyị pụrụ ibiwo ndụ enweghị ịkpa ókè ma ọlị, nke achọrọ mụ ịma, na-emefusị oge dị oké ọnụ ahịa. E ji oriri oké mkpọtụ, mmanya ogbugbu, na omume rụrụ arụ mara ajọ ụwa a. Ugbu a a na-ezi anyị ime ihe dị Chineke ụtọ, ọ̀ bụ na anyị enweghị ekele ịbụ ndị e setịpụrụ iche pụọ n’ụwa a rụrụ arụ? Ya mere ka anyị lụsie ọgụ ime mmụọ ike iji zere itinye aka n’ihe omume ndị na-emerụ emerụ nke ụwa.—1 Pita 4:1-3.

Ịkụziri Anyị Ime Ihe Na-abara Anyị Uru

19. Ịbụ ndị e ziri ihe dị Jehova ụtọ na imezi ya ga-eduba n’uru dịgasị aṅaa?

19 Ọ dị mkpa ịghọta na ịbụ ndị e ziri ime ihe dị Jehova ụtọ ga-abara anyị uru nke ukwuu. N’ụzọ kwere nghọta, anyị aghaghị ime òkè anyị site n’ileru nnọọ anya ka anyị wee mụta ihe wee gbasoo ntụziaka ndị na-abịara anyị site n’Ọkpara ya nakwa site n’Okwu ya na ndị ya gbakọrọ agbakọ. (Aịsaịa 48:17, 18; Ndị Hibru 2:1) Site n’anyị ime otú ahụ, a ga-ewusi anyị ike iguzosi ike n’oge ọdachi ndị a ma lanarị oké ihe isi ike na-abịanụ. (Matiu 7:24-27) Ọbụna ugbu a, anyị ga na-eme ihe na-amasị Chineke site n’ime ihe dị ya ụtọ, anyị ga na-ejidekwa n’aka na a na-aza ekpere anyị. (Jọn 9:31; 1 Jọn 3:22) Anyị ga-enwetakwa ezigbote obi ụtọ.—Jọn 13:17.

20. Na gịnị ka ọ ga-adị mma ịtụgharị uche ka ị na-ahụ isiokwu ahụ dịịrị afọ na 1997 nile?

20 N’ime afọ 1997, anyị ga-enwe ọtụtụ ohere ịgụ na ịtụle isiokwu ahụ dịịrị afọ, Abụ Ọma 143:10: “Zi m ime ihe dị Gị ụtọ.” Ka anyị na-eme nke a, ka anyị jiri ụfọdụ n’ime oge ahụ tụgharịa uche ná ndokwa Chineke meworo iji zie anyị ihe, dị ka e setịpụrụ n’elu. Ka anyị jirikwa ntụgharị uche dị otú ahụ n’okwu ndị ahụ mee ihe dị ka ihe mkpali iji mee ihe kwekọrọ n’arịrịọ ahụ, na-amara na “onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Ole ndị taa ka a na-ezi ime ihe dị Jehova ụtọ?

◻ Olee otú Abụ Ọma 143:10 kwesịrị isi metụta anyị na 1997?

◻ Olee otú e si na-ezi anyị ime ihe dị Jehova ụtọ?

◻ Gịnị ka a chọrọ n’aka nne na nna bụ́ ndị Kraịst n’ịkụziri ụmụ ha ihe?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya