Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 2/1 p. 4-6
  • Ezi Ihe Ndabere Maka Inwe Nchekwube Taa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Ihe Ndabere Maka Inwe Nchekwube Taa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inwe Nchekwube Abraham Enweta Ụgwọ Ọrụ
  • Ndị Nledo Abụọ Nwere Nchekwube
  • Inwe Obi Abụọ Jona
  • Inwe Nchekwube n’Ime Ahụhụ
  • Ezi Nchekwube Emerie!
  • Ọ Mụtara Ime Ebere
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Jona Amụta Banyere Ebere Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Mụtara Ime Ebere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 2/1 p. 4-6

Ezi Ihe Ndabere Maka Inwe Nchekwube Taa

ỌKỌ akụkọ ihe mere eme na ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ H. G. Wells, onye a mụrụ na 1866, nwere mmetụta dị ike n’echiche narị afọ nke 20. Site n’ihe odide ya, ọ kọwara obi ike ya na oge oké obi ụtọ ga-adabakọ n’ọganihu nke sayensị. Ya mere, Collier’s Encyclopedia na-echetaghachi “nchekwube dị ukwuu” Wells nwere ka ọ rụrụ ọrụ n’esepụghị aka iji kwalite ebumnuche ya. Ma ọ rịbakwara ama na nchekwube ya kụrụ afọ n’ala mgbe Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ.

Mgbe Wells ghọtara na “sayensị pụrụ ịrụpụta ma ihe ọjọọ ma ihe ọma, okwukwe ya funyụrụ anya, o wee daba n’enweghị nchekwube,” ka Chambers’s Biographical Dictionary na-ekwu. N’ihi gịnị ka nke a ji mee?

Okwukwe na nchekwube Wells dabeere nanị n’ihe mmadụ pụrụ ịrụzu. Mgbe ọ ghọtara na ihe a kpọrọ mmadụ enweghị ike iru Ọnọdụ Izu Okè ya, ọ dịghị ebe ọzọ o nwere ichigharịkwuru. Amaghị ihe a ga-eme eme ji ngwa ngwa ghọọ enweghị nchekwube.

Taa, ọtụtụ mmadụ na-enwe otu ahụmahụ ahụ n’ihi otu ihe ahụ. Ha na-enwe nnọọ nchekwube mgbe ha na-eto eto ma daba n’enweghị nchekwube dị mwute ka ha na-eme okenye karị. E nwere ọbụna ndị na-eto eto ndị na-agbahapụ ihe a sị na ọ bụ ụzọ ịdị ndụ kwesịrị ekwesị ma mikpuo n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ, inwe mmekọahụ aghara aghara, na ụzọ ndụ ndị ọzọ na-akpata mbibi. Gịnị bụ ihe ngwọta ya? Tụlee ihe atụ ndị na-esonụ sitere n’oge Bible ma hụ ihe ndabere e nwere maka inwe nchekwube—n’oge gara aga, ugbu a, na n’ọdịnihu.

Inwe Nchekwube Abraham Enweta Ụgwọ Ọrụ

N’afọ 1943 T.O.A., Abraham siri na Heran pụọ, gafee Osimiri Yufretis, ma baa n’ala Kenean. A kọwawo Abraham dị ka “nna nke ndị nile kwere,” leekwa ezi ihe nlereanya o setịpụrụ!—Ndị Rom 4:11.

Lọt, nwa nwanne Abraham nke ndị mụrụ ya nwụworo anwụ na ezinụlọ ya sonyeere Abraham. E mesịa, mgbe ụnwụ dakwasịrị ala ahụ, ezinụlọ abụọ ahụ kwagara Ijipt, mgbe oge ya rukwara ha laghachikọrọ ọnụ. Ka ọ na-erula oge a ma Abraham ma Lọt akpakọbawo nnukwu akụ̀, tinyekwara ìgwè atụrụ na ìgwè ehi. Mgbe esemokwu dapụtara n’etiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ ha, Abraham butere ụzọ wee sị: “Biko, ka iseokwu ghara ịdị n’etiti mụ na gị, na n’etiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ nke m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ nke gị; n’ihi na nwanne ka anyị bụ. Ala nke a nile, ọ̀ dịghị n’ihu gị? Biko, kewapụ onwe gị n’ahụ m: ọ bụrụ aka ekpe, m ga-ejekwa n’aka nri: ma ọ bụrụ aka nri, m ga-ejekwa n’aka ekpe.”—Jenesis 13:8, 9.

Abraham, n’ịbụ onye nke ka okenye, gaara atụzi okwu n’ụzọ ga-adị ya mma, Lọt kwa, n’ịkwanyere nwanne nna ya ùgwù, gaara ekwenyere Abraham ná nhọrọ ahụ. Kama nke ahụ, “Lọt wee welie anya ya abụọ, hụ Gburugburu ala nile nke Jọdan, na ala ahụ nile bụ ala mmiri na-ede nke ọma, tutu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dị ka ubi Jehova a gbara ogige, dị ka ala Ijipt, mgbe ị na-eje Zoa. Lọt wee họpụtara onwe ya Gburugburu ala nile nke Jọdan.” Site ná nhọrọ dị otú ahụ, Lọt nwere nnọọ ihe mere ọ ga-eji nwee nchekwube. Ma gịnị banyere Abraham?—Jenesis 13:10, 11.

Abraham ọ̀ na-ezuzu ezuzu, na-etinye ọdịmma nke ezinụlọ ya n’ihe ize ndụ? Ee e. Àgwà ziri ezi na mmụọ afọ ọma nke Abraham wetara ụgwọ ọrụ bara ụba. Jehova gwara Abraham, sị: “Biko, welie anya gị abụọ, si n’ọnọdụ a, ebe gị onwe gị nọ, lee anya n’Ugwu na ná Ndịda na n’Ihu anyanwụ na n’Ọdịda anyanwụ: n’ihi na ala nke a nile nke gị onwe gị na-ahụ anya, gị ka M ga-enye ya, nyekwa mkpụrụ gị ruo mgbe ebighị ebi.”—Jenesis 13:14, 15.

Nchekwube Abraham nwere ezi ihe ndabere. E hiwere ya ná nkwa Chineke bụ́ na ọ ga-eme ka Abraham ghọọ mba ukwu ka e wee “[gọzie] agbụrụ nile nke ụwa n’ime [Abraham].” (Jenesis 12:2-4, 7) Anyị nwekwara ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike, n’ịmara na “ihe nile na-arụkọ ọrụ iwetara ndị hụrụ Chineke n’anya ezi ihe.”—Ndị Rom 8:28.

Ndị Nledo Abụọ Nwere Nchekwube

Ihe karịrị afọ 400 ka e mesịrị, mba Israel dịrị njikere ịbanye Kenean, “ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Ọpụpụ 3:8; Deuterọnọmi 6:3) Mosis nyere ndị isi 12 ọrụ ‘ilepụta ala ahụ, weghachikwa okwu banyere ụzọ nke ha ga-esi rịgoo, na obodo nke ha ga-aba n’ime ha.’ (Deuterọnọmi 1:22; Ọnụ Ọgụgụ 13:2) Ndị nledo 12 nile ahụ kwekọrịtara ná nkọwa ha banyere ịba ụba nke ala ahụ, ma 10 n’ime ha kọrọ akụkọ na-adịghị enye nchekwube nke kụnyere egwu n’obi ndị ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 13:31-33.

N’aka nke ọzọ, Joshua na Keleb nyere ndị ahụ ozi na-enye nchekwube ma mee ihe nile ha nwere ike ime iji kụjụọ egwu ha. Àgwà na akụkọ ha gosipụtara obi ike zuru ezu n’ikike Jehova imezu okwu ya ịkpọghachi ha n’Ala Nkwa ahụ—ma o nweghị isi. Kama nke ahụ, “nzukọ Israel nile wee sị ka e were nkume tụgbuo ha.”—Ọnụ Ọgụgụ 13:30; 14:6-10.

Mosis gbara ndị ahụ ume ịtụkwasị Jehova obi, ma ha jụrụ ịṅa ntị. N’ihi na ha nọgidere n’àgwà enweghị nchekwube ha, mba ahụ nile aghaghị ịwagharị afọ 40 n’ọzara. N’ime ndị nledo 12 ahụ, nanị Joshua na Keleb nwetara ụgwọ ọrụ nke inwe nchekwube. Gịnị bụ nsogbu bụ isi? Ọ bụ enweghị okwukwe, ebe ndị ahụ lekwasịrị anya n’amamihe nke aka ha.—Ọnụ Ọgụgụ 14:26-30; Ndị Hibru 3:7-12.

Inwe Obi Abụọ Jona

Jona biri ndụ na narị afọ nke itoolu T.O.A. Bible na-egosi na ọ bụ onye amụma Jehova kwesịrị ntụkwasị obi nye alaeze ebo iri nke Israel, n’otu oge mgbe Jeroboam nke Abụọ na-achị. Ma ọ jụrụ ịnakwere ọrụ ịga Nineve iji dọọ ndị ahụ aka ná ntị. Ọkọ akụkụ ihe mere eme bụ́ Josephus na-asị na kama nke ahụ na Jona “chere na ọ ka mma ịgba ọsọ” wee gaa Jọpa. N’ebe ahụ ọ banyere ụgbọ ịga Tashish, ma eleghị anya Spain nke oge a. (Jona 1:1-3) A kọwara ihe mere Jona ji ghara iji nchekwube lee ọrụ a anya na Jona 4:2.

Jona mesịrị kweta ịrụzu ọrụ ya, ma o were iwe mgbe ndị Nineve chegharịrị. Ya mere Jehova kụziiri ya ezi ihe mmụta nke ọmịiko site n’ime ka osisi ogiri ụgba nke na-enye Jona ndo kpọnwụọ. (Jona 4:1-8) Mmetụta obi ebere nke Jona nwere mgbe ihe ọkụkụ ahụ nwụrụ kwesịrị ịbụ nke e gosịrị ndị ikom 120,000 nọ na Nineve n’ụzọ ziri ezi karị bụ́ ndị “na-amaghị nke bụ aka nri ha na aka ekpe ha.”—Jona 4:11.

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ Jona? Ije ozi dị nsọ adịghị enye ohere maka enweghị nchekwube. Ọ bụrụ na anyị aghọta ntụzi Jehova ma jiri obi ike gbasoo ya, anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma.—Ilu 3:5, 6.

Inwe Nchekwube n’Ime Ahụhụ

“Emela ka iwe gị dị ọkụ n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ,” ka Eze Devid kwupụtara. “Ekwosola ndị na-eme ajọ omume ekworo.” (Abụ Ọma 37:1) N’ezie, nke ahụ bụ ndụmọdụ amamihe, n’ihi na ikpe na-ezighị ezi na emeghị ihe n’eziokwu gbazuru anyị gburugburu.—Eklisiastis 8:11.

Otú ọ dị, ọ bụrụgodị na anyị adịghị ekwoso ndị na-eme ajọ omume ekworo, ọ dị mfe inwe nkụda mmụọ mgbe anyị hụrụ ka ndị aka ha dị ọcha na-ata ahụhụ n’aka ndị ajọ omume ma ọ bụ mgbe a na-emeso anyị onwe anyị omume n’ụzọ na-ezighị ezi. Ahụmahụ ndị dị otú ahụ pụrụ ọbụna ime ka anyị zụlite àgwà enweghị olileanya ma ọ bụ enweghị nchekwube. Mgbe anyị nwere mmetụta dị otú ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Mbụ, anyị pụrụ iburu n’uche na onye ajọ omume apụghị iji ahụ iru ala chee na ọ dịghị mgbe nkwụghachi ụgwọ ga-abịa. Abụ Ọma 37 na-aga n’ihu imesi anyị obi ike n’amaokwu nke 2: “Dị ka ahịhịa ka a ga-ebipụ ha [ndị ajọ omume] ngwa ngwa, dị ka akwụkwọ ahịhịa ndụ ka ha ga-akpọnwụ.”

Tụkwasị na nke a, anyị pụrụ ịnọgide na-eme ezi ihe, nọgide na-enwe nchekwube, ma na-echere Jehova. “Si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị, mee ezi ihe; birikwa ruo mgbe ebighị ebi,” ka ọbụ abụ ahụ gara n’ihu kwuo. “N’ihi na Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, Ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere Ya.”—Abụ Ọma 37:27, 28.

Ezi Nchekwube Emerie!

Gịnịzi banyere ọdịnihu anyị? Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-agwa anyị banyere “ihe na-aghaghị ịpụta n’isi nso.” N’ime ha, e kpughere ịnyịnya na-acha ọkụ ọkụ, na-egosipụta agha, “ịnapụ udo n’ụwa.”—Mkpughe 1:1; 6:4.

Otu echiche na-ewu ewu—nakwa nke inwe nchekwube—e nwere na Britain n’oge Agha Ụwa nke Mbụ bụ na ọ ga-abụ nnukwu agha ikpeazụ. Na 1916, onye Britain ọnụ na-eru n’okwu ọchịchị bụ́ David Lloyd George kwuru ihe ezi uche dị na ya karị. Ọ sịrị: “Agha a, dị ka agha nke ga-esochi, bụ agha ga-akwụsị agha.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) O kwuru eziokwu. Ihe Agha Ụwa nke Abụọ mere bụ nanị ịmụba mmepụta nke ajọ usoro nke mbibi n’ìgwè. Ihe karịrị afọ 50 ka e mesịrị, olileanya aka-adịbeghị maka njedebe nke agha.

N’otu akwụkwọ Mkpughe ahụ, anyị na-agụ banyere ndị ịnyịnya ọzọ—ndị na-anọchi anya ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, na ọnwụ. (Mkpughe 6:5-8) Ha bụkwu akụkụ ndị ọzọ nke ihe ịrịba ama nke oge ndị a.—Matiu 24:3-8.

Ihe ndị a hà bụ ihe na-akpata enweghị nchekwube? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na ọhụụ ahụ na-akọwakwa “ịnyịnya ọcha, Onye na-anọkwasị ya nwekwara ụta; e wee nye Ya okpueze: O wee pụta na-emeri, ya na ka O wee merie.” (Mkpughe 6:2) N’ebe a anyị na-ahụ Jisọs Kraịst dị ka Eze eluigwe ka ọ na-ewepụ ajọ omume nile, na-agba iji guzobe udo na ịdị n’otu gburugburu ụwa.a

Dị ka Onye A Họpụtara Ịbụ Eze, mgbe ọ nọ n’ụwa, Jisọs Kraịst kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere maka Alaeze ahụ. Ikekwe a kụziwokwara gị ikpe “Nna anyị nke bi n’eluigwe,” ma ọ bụ Ekpere Onyenwe anyị. N’ime ya anyị na-ekpe ka Alaeze Chineke bịa, ka e mezuo uche ya n’ebe a n’ụwa dị ka n’eluigwe.—Matiu 6:9-13.

Kama ịnwa imekwata usoro ihe ndị dị ugbu a, Jehova, n’ime ihe site n’aka Eze Mesaịa ya, bụ́ Kraịst Jisọs, ga-ewepụ ya kpam kpam. N’ọnọdụ ya, ka Jehova na-asị, “M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi.” N’okpuru ọchịchị Alaeze eluigwe ahụ, ụwa ga-aghọ ebe obibi obi ụtọ, nke udo nye ihe a kpọrọ mmadụ, ebe ndụ na ọrụ ga-abụ ọṅụ na-adị mgbe nile. “Tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke,” ka Jehova na-asị. “Ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.” (Aịsaịa 65:17-22) Ọ bụrụ na ị tụkwasị olileanya gị maka ọdịnihu ná nkwa ahụ na-adịghị ada ada, ị ga-enwe nnọọ ihe mere ị ga-eji enwe nchekwube—ugbu a na n’ọdịnihu!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka ntụle sara mbara nke ọhụụ a, biko lee isi 16 nke akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 4]

H. G. Wells

[Ebe E Si Nweta Foto]

Corbis-Bettmann

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya