Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2024 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
JULAỊ 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 57-59
Jehova Na-akụghasị Mbọ Ndị Na-emegide Ndị Na-efe Ya Na-agba
‘Ruo n’Ebe Kasị Anya n’Ụwa’
14 Stivin ji obi ike kwusaa ozi ọma tupu ndị iro ya egbuo ya. (Ọrụ 6:5; 7:54-60) Mgbe a malitere “ịkpagbu” Ndị Kraịst n’oge ahụ, a chụsasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs niile gburugburu Judia na Sameria, ma e wezụga ndịozi. Ma nke ahụ emeghị ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma. Filip gawara Sameria ‘na-ekwusa Kraịst,’ ma rụpụta ihe dị mma. (Ọrụ 8:1-8, 14, 15, 25) A gwakwara anyị, sị: “Ndị a chụsasịrị n’ihi mkpagbu nke malitere n’ihe banyere Stivin garuru Finishia na Saịprọs na Antiọk, ma ha agwaghị onye ọ bụla okwu Chineke ma e wezụga naanị ndị Juu. Otú ọ dị, e nwere ụfọdụ n’ime ha bụ́ ndị Saịprọs na ndị Saịrini bụ́ ndị bịara Antiọk ma malite ịgwa ndị na-asụ Grik okwu, na-ezisa ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.” (Ọrụ 11:19, 20) N’oge ahụ, mkpagbu mere ka ozi ọma Alaeze ruo n’ebe ndị ọzọ.
15 N’oge anyị a, ihe yiri ya mere n’ebe bụ́bu Soviet Union. Karịchaa, n’agbata afọ 1951 na 1959, a chụgara ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova na Siberia. Ebe ọ bụ na ha bi n’ebe dị iche iche, ozi ọma nọgidere na-agbasa ná nnukwu obodo ahụ. E nweghị otú ọtụtụ Ndịàmà ahụ gaara esi nweta ego ha ga-eji gaa puku kilomita iri ikwusa ozi ọma! Ma, ndị ọchịchị ji aka ha kpọga ha n’obodo ahụ. Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “Ihe ọ rụpụtara bụ na ndị ọchịchị mere ka ọtụtụ puku ndị Siberia nwere mmasị n’eziokwu mụta ya.”
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
“Guzosienụ Ike, Kwụrụnụ Chịm”
16 Mee ka obi sie gị ike. Eze Devid kwuru na ọ gaghị akwụsị ịhụ Jehova n’anya. Ọ sịrị: “Obi siri m ike, Chineke.” (Ọma 57:7) Anyị nwekwara ike ime ka obi sie anyị ike, anyị ejiri obi anyị niile tụkwasị Jehova obi. (Gụọ Abụ Ọma 112:7.) Legodị otú ihe a si nyere Nwanna Bob anyị kwuburu okwu ya aka. Mgbe a gwara ya na a ga-edosa ọbara, a dịghị ama ama ya adị mkpa mgbe a na-awa ya ahụ́, o kwuru ozugbo na e nwehaala ihe ọ bụla mere ka ha chọọ ịmịnye ya ọbara, na ya ga-ahapụ ụlọ ọgwụ ahụ ozugbo. Nwanna Bob mechara sị: “O nweghịdị mgbe ihe m ga-eme mere m obi abụọ. Anọghịkwanụ m na-echegbu onwe m gbasara ihe nwere ike ime.”
17 Obi siri Nwanna Bob ike n’ihi na o kpebiela ịkwụsi ike n’ebe Jehova nọ tupudị ya agawa ụlọ ọgwụ. Ihe mbụ nyeere ya aka bụ na ọ chọsiri ike ime Jehova obi ụtọ. Nke abụọ bụ na o wepụtara oge mụọ ihe Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl kwuru gbasara otú ndụ na ọbara si dị nsọ. Nke atọ abụrụ na obi siri ya ike na ime ihe Jehova kwuru ga-abara ya ezigbo uru. Obi nwekwara ike isi anyị ike n’agbanyeghị ụdị nsogbu bịaara anyị.
JULAỊ 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 60-62
Jehova Na-eme Ka Obi Na-eru Anyị Ala, Na-echebe Anyị, Na-emekwa Ka Anyị Kwụrụ Chịm
it-2 1118 ¶7
Ụlọ Elu
Nke E Ji Maa Atụ. E nwere ezigbo ihe mere obi ga-eji eru ndị nwere okwukwe na Jehova ma na-erubere ya isi ala n’ihi na Devid bụrụ abụ, sị: “Ị [Jehova] bụụrụ m ebe mgbaba, bụrụkwa ụlọ elu siri ike nke na-echebe m ka onye iro ghara ịkpara m aka.” (Ọma 61:3) Ndị ghọtara ihe aha Jehova pụtara, tụkwasị Onye nwe aha ahụ obi ma na-anọchite anya ya, ekwesịghị ịtụ ụjọ, n’ihi na “aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike. Onye ezi omume na-agbaba na ya, e chebe ya.”—Ilu 18:10; i nwere ike ịtụle 1 Sam. 17:45-47.
it-2 1084 ¶8
Ụlọikwuu
E nwekwara ihe ọzọ ụlọikwuu nọchiri anya ya n’amaokwu ụfọdụ na Baịbụl. Ụlọikwuu mmadụ bụ ebe onye ahụ na-anọ ezuru ike, anwụ aghara ịcha ya, mmiri agharakwa ịma ya. (Jen. 18:1) Ebe ọ bụ na a na-ele ndị mmadụ ọbịa nke ọma n’oge ochie, obi na-esi ndị ọbịa ike na onye nabatara ha n’ụlọikwuu ya ga-elekọta ha ma kwanyere ha ùgwù. N’ihi ya, mgbe e kwuru ná Mkpughe 7:15 (na ihe e dere n’ala ala peeji ya) na Chineke “ga-agbasakwa ụlọikwuu ya n’isi” oké ìgwè mmadụ, ọ pụtara na ọ ga-echebe ha, lekọta ha ma mee ka obi ruo ha ala. (Ọma 61:3, 4) Aịzaya kwuru banyere otú nwunye Chineke, bụ́ Zayọn, ga-esi kwadebe maka ụmụ ọ ga-amụ. A gwara ya, sị: “Mee ka ụlọikwuu gị bukwuo ibu.” (Aịza. 54:2) N’ihi ya, o mere ka ebe ụmụ ya ga-anọ ihe ọ bụla a ghara ime ha bukwuo ibu.
Iwu Chineke Bụ Maka Abamuru Anyị
14 N’ụzọ na-emesi obi ike, iwu Chineke adịghị agbanwe agbanwe. N’oge a jupụtara n’ọgba aghara anyị bi n’ime ya, Jehova bụ oké nkume kwụsiri ike, na-adị site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 90:2) O kwuru banyere onwe ya, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, agbanweghị.” (Malakaị 3:6) Ụkpụrụ Chineke, dị ka e si dekọọ ha na Bible, bụ ndị a pụrụ ịdabere na ha kpam kpam—n’adịghị ka echiche ụmụ mmadụ bụ́ ndị a na-agbanwe n’esepụghị aka. (Jems 1:17) Dị ka ihe atụ, ruo ọtụtụ afọ, ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ kwalitere ịhapụ ụmụaka ka ha mere ihe masịrị ha, ma mgbe e mesịrị, ụfọdụ n’ime ha gbanwere obi ha ma kweta na ndụmọdụ ha hiere ụzọ. Ụkpụrụ na nduzi ndị ụwa na-enye n’okwu a na-aga ihu na azụ dị ka a ga-asị na ifufe na-ebugharị ha. Otú ọ dị, Okwu Jehova adịghị agha agha. Ruo ọtụtụ narị afọ, Bible enyewo ndụmọdụ banyere otú e si eji ịhụnanya azụ ụmụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Lee ihe na-emesi obi ike ọ bụ ịmara na anyị pụrụ ịdabere n’ụkpụrụ Jehova; ha agaghị agbanwe!
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Abụọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma
62:11. Ọ dịghị Chineke mkpa ịdabere n’ihe ọ bụla ọzọ maka ike. Ike nile sitere n’aka ya. ‘Ike nile bụ nke ya.’
JULAỊ 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 63-65
“Ịhụnanya Gị Dị Mma Karịa Ndụ”
Ònye Ga-ekewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke?
17 Ókè hà aṅaa ka ịhụnanya Chineke dịruru gị mkpa? Ị̀ na-enwe mmetụta yiri nke Devid, bụ́ onye dere, sị: “N’ihi na ebere Gị dị mma karịa ndụ; egbugbere ọnụ m abụọ ga-aja Gị. Otú a ka m ga-agọzi Gị mgbe m na-adị ndụ: n’aha Gị ka m ga-achịli aka m elu”? (Abụ Ọma 63:3, 4) N’ezie, ọ̀ dị ihe ọ bụla a na-enweta ná ndụ a na-adị n’ụwa a nke dị mma karịa inweta ịhụnanya na ezi ọbụbụenyi Chineke? Dị ka ihe atụ, ịchụso ọrụ na-enye ego dị ukwuu ọ̀ dị mma karịa inwe ahụ iru ala na obi ụtọ ndị a na-enweta site n’iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya? (Luk 12:15) Ụfọdụ ndị Kraịst abanyewo n’ọnọdụ ịhọrọ ịgọnahụ Jehova ma ọ bụ ịnwụ anwụ. Nke ahụ mere ọtụtụ Ndịàmà Jehova n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. E wezụga nnọọ mmadụ ole na ole, ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst họọrọ ịnọgide n’ịhụnanya Chineke, dị njikere ịnwụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Ndị ji iguzosi ike n’ihe nọgide n’ịhụnanya Chineke pụrụ ijide n’aka na ọ ga-enye ha ọdịnihu ebighị ebi, bụ́ ihe ụwa na-apụghị inye anyị. (Mak 8:34-36) Ma ọ na-agụnye ọbụna ihe karịrị ndụ ebighị ebi.
18 Ọ bụ ezie na ọ gaghị ekwe omume ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma e wezụga Jehova, gbalịa iche echiche ihe ibi ndụ ruo oge dị nnọọ ogologo ga-adị ka ya ma Onye Okike anyị anọghị ya. Ọ ga-atọgbọ chakoo, n’enweghị ezi nzube. Jehova enyewo ndị ya ọrụ na-enye afọ ojuju ịrụ na mgbe ikpeazụ ndị a. Ya mere, anyị pụrụ inwe ntụkwasị obi na mgbe Jehova, bụ́ Onye Nzube Ukwu, ga-eweta ndụ ebighị ebi, ihe ndị na-akpali akpali ma dị mma bụ́ ndị anyị ga-amụta ma na-eme, ga-ejupụta na ya. (Eklisiastis 3:11) N’agbanyeghị ókè anyị pụrụ ịmụtaru ihe na puku afọ ndị na-abịanụ, anyị agaghị ma ọlị aghọtazu “omimi nke akụ̀ nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke.”—Ndị Rom 11:33.
“Na-ekele Onye Ọ Bụla Meere Gị Ihe”
Onye anyị ga-akacha na-ekele bụ Chineke. O doro anya na i cheela mgbe ụfọdụ gbasara ọtụtụ ihe o nyerela gị ma ka na-enye gị, ma ndị nke na-eme ka okwukwe gị sie ike. (Diut. 8:17, 18; Ọrụ 14:17) Kama ile ihe ọma Chineke meere anyị ma wepụ obi na ya ozugbo, anyị kwesịrị iwepụta oge chebara ihe ọma niile ọ na-emere anyị na ndị enyi anyị echiche. Anyị chebara ihe ọ na-emere anyị echiche, anyị ga-ahụkwu ya n’anya, matakwa otú ọ hụruru anyị n’anya ma jiri anyị kpọrọ ihe.—1 Jọn 4:9.
Na-atụgharị Uche n’Okwu Chineke Nakwa n’Ihe Ndị O Kere
7 Anyị chọọ ịtụgharị uche, chọọkwa ka uche anyị dịrị n’ihe anyị na-amụ, anyị ga-agbasi mbọ ike. Ọ bụ ya mere uche anyị ji agakarị n’ihe ndị na-ataghị akpụ. N’ihi ya, oge kacha mma anyị ga-eji tụgharịa uche bụ mgbe anyị zuchara ike, nọrọkwa n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị adọpụ uche anyị. Devid tụgharịrị uche n’elu ihe ndina ya mgbe ọ mụ anya n’abalị. (Ọma 63:6) N’agbanyeghị na Jizọs zuru okè, ọ ma na ịga ebe mkpọtụ na-adịghị tụgharịa uche ma kpee ekpere na-aba uru.—Luk 6:12.
Jiri Ịhụnanya Na-akụzi Ihe Ka Jizọs
6 Ọ na-atọ anyị ụtọ ịkọrọ ndị ọzọ banyere ihe ndị masịrị anyị. Mgbe anyị na-ekwu okwu banyere ihe ndị masịrị anyị, ihu anyị na-egosi otú obi dị anyị, ndị mmadụ na-ahụkwa na obi dị anyị ụtọ. Nke a na-emekarị mgbe anyị na-ekwu okwu banyere onye anyị hụrụ n’anya. Ọ na-anụkarị anyị ọkụ n’obi ịgwa ndị ọzọ ihe anyị ma banyere onye ahụ. Anyị na-eto onye ahụ, na-asọpụrụ ya, ma na-agbachitere ya. Ihe mere anyị ji eme nke a bụ ka ndị ọzọ soro anyị hụ onye ahụ n’anya ma nwee mmasị n’àgwà ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị̀ Na-eme Ka Ahụ́ Ruo Ndị Ọzọ Ala?
Ọ dị nnọọ mfe ịkwada ụlọ karịa ịrụ nke ọhụrụ. Otu ụkpụrụ ahụ dị n’ịkwada na ịrụ ụlọ metụtakwara okwu anyị. Dị ka ndị na-ezughị okè, anyị nile nwechara ebe ndị anyị na-emejọ. Eze Solomọn kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ezi omume n’ụwa, nke na-eme ezi ihe, na-adịghị emehiekwa.” (Eklisiastis 7:20) Ọ na-adị mfe ịhụta ebe onye ọzọ mejọrọ ihe na iji okwu ọjọọ katọọ ya. (Abụ Ọma 64:2-4) N’aka nke ọzọ, ịnọgide na-ekwu okwu ndị na-ewuli elu chọrọ anyị inwe nkà.
JULAỊ 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 66-68
Jehova Na-eburu Anyị Ibu Anyị Kwa Ụbọchị
Otú Jehova Si Aza Ekpere Anyị
15 Ọ bụghị mgbe niile ka otú Jehova si aza ekpere anyị na-apụ iche. Ma, otú Nna anyị nke eluigwe si aza ya na-eme ka anyị ghara ịkwụsị ife ya. N’ihi ya, ka anya na-eru gị ala ịchọpụta otú Jehova si aza ekpere gị. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Yoko chere na Jehova anaghị aza ekpere ya. Ma, ọ malitere ide ihe ndị ọ rịọrọ Jehova n’akwụkwọ. Mgbe obere oge gachara, ọ gara lee anya n’akwụkwọ ahụ ma chọpụta na Jehova azala ọtụtụ n’ime ekpere ndị ahụ o kpere, ma ndị nke o chefurula. Anyị kwesịrị ịna-eme, anyị gụrụ gụrụ, anyị akwụsị ma chebara otú Jehova si aza ekpere anyị echiche.—Ọma 66:19, 20.
Na-echebara Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Naanị Ha Na-azụ Ụmụ Echiche
Jehova mere ka e jiri ike mmụọ nsọ ya dee abụ ndị dị nsọ, ma ọ bụ abụ ọma, bụ́ ndị ụmụ Izrel ga na-agụ mgbe ha na-efe ofufe. Chegodị echiche agbamume ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ na ụmụ na-enweghị nna bụ́ ndị Izrel ga na-enweta mgbe ha na-abụ abụ ndị ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee bụ́ ndị chetaara ha na Jehova bụụrụ ha “nna” na “onyeikpe,” nakwa na ọ ga-enyere ha aka. (Abụ Ọma 68:5; 146:9) Anyị nwekwara ike ịgwa nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ okwu ga-agba ya ume bụ́ nke ọ na-agaghị echefu ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụ ezie na afọ iri abụọ agafeela kemgbe otu nna zụtoro ụmụ gwara Ruth, bụ́ nwaanyị naanị ya na-azụ ụmụ, sị: “Ị na-agbalị n’otú i si na-azụ ụmụ gị nwoke abụọ. Jide nke i ji,” Ruth ka na-echeta ya. Ruth kọrọ, sị: “Okwu ndị ahụ ọ gwara m metụrụ m nnọọ n’ahụ́.” N’ezie, “okwu ọma bụ ezigbo ọgwụ,” o nwekwara ike ịgba nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ ume karịa otú anyị nwere ike iche. (Ilu 15:4, Contemporary English Version) Ì nwere ike iche echiche banyere otu ihe nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ na-eme nke ị ga-aja ya mma maka ya?
Nna nke Ụmụ Na-enweghị Nna
“NNA nke ụmụ na-enweghị nna . . . ka Chineke bụ n’ebe obibi ya dị nsọ.” (Abụ Ọma 68:5) Okwu ndị a e si n’ike mmụọ nsọ dee na-akụziri anyị ihe na-emetụ n’ahụ́ banyere Jehova Chineke, nke bụ́ na ọ na-echebara mkpa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha echiche. Iwu o nyere mba Izrel mere ka o doo anya na ọ na-echebara ụmụaka ndị nna ha nwụrụ anwụ echiche. Ka anyị leba anya n’Ọpụpụ 22:22-24, bụ́ ebe mbụ e kwuru banyere “nwa na-enweghị nna” n’ime Baịbụl.
Jehova Na-eme Ka Ihe Anyị Na-eme Na-aga Nke Ọma
17 Gụọ Abụ Ọma 40:5. Ọ bụrụ na mmadụ na-aga obodo dị anya, o nwere ike ịkwụsị n’ụzọ ọtụtụ ugboro ka o zurutụ ike tupu ya eruo ebe ọ na-aga. Anyịnwa kwesịkwara anyị nọtụ, anyị akwụsịtụ chee gbasara ihe ndị Jehova meerela anyị iji mee ka ihe anyị na-eme na-aga nke ọma, ma n’oge anyị nọ ná nsogbu. Ná ngwụcha ụbọchị ọ bụla, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ụzọ Jehova si gọzie m taa? N’agbanyeghị na nsogbu m akwụsịbeghị, olee otú Jehova si enyere m aka idi ya?’ Lee ma ị̀ ga-achọpụta, ọ dịkarịa ala, otu ụzọ Jehova si mee ka ihe ị na-eme na-aga nke ọma.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Abụọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma
68:18—Ole ndị bụ “onyinye dị iche iche n’etiti mmadụ”? Ha so ná ndị ahụ a dọọrọ n’agha mgbe e meriri Ala Nkwa ahụ. Ha mechara na-enyere ndị Livaị aka n’ọrụ ha.—Ezra 8:20.
JULAỊ 29–ỌGỌST 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 69
Ihe Ndị E Buru n’Amụma n’Abụ Ọma 69 Mezuru ná Ndụ Jizọs
Ha Nọ Na-atụ Anya Mesaya
17 A ga-akpọ Mesaya ahụ asị na nkịtị. (Ọma 69:4) Jọn onyeozi kwuru na Jizọs sịrị: “A sị na mụ arụghị ọrụ ndị ahụ n’etiti ha, bụ́ nke onye ọ bụla ọzọ na-arụghị, ha agaraghị enwe mmehie; ma ugbu a, ha ahụwo m, kpọọkwa mụ na Nna m asị. Kama ọ bụ ka e wee mezuo okwu ahụ e dere n’Iwu ha, nke sịrị, ‘Ha kpọrọ m asị na nkịtị.’” (Jọn 15:24, 25) “Iwu” a na-ekwu okwu ya ebe a bụ Akwụkwọ Nsọ e nwere n’oge ahụ. (Jọn 10:34; 12:34) Ihe Matiu, Mak, Luk, na Jọn dere gosiri na ndị mmadụ kpọrọ Jizọs asị, karịchaa ndị ndú okpukpe ndị Juu. Kraịst kwukwara, sị: “Ụwa enweghị ihe mere ọ ga-eji kpọọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị, n’ihi na m na-agba àmà banyere ya na ọrụ ya dị njọ.”—Jọn 7:7.
Ka Ofufe Chineke Na-anụ Gị Ọkụ n’Obi
7 E nwere otu ihe mere mgbe Jizọs nọ n’ụwa nke gosiri nnọọ na ọ na-anụ ọkụ n’obi. Ọ bụ ná mmalite nke ozi ya n’ụwa, n’oge Ememme Ngabiga nke afọ 30 O.A. Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya bịara Jeruselem ma hụ “ndị nọ n’ụlọ nsọ na-ere ehi na atụrụ na nduru, na ndị na-agbanwe ego, ka ha nọ n’oche ha.” Gịnị ka Jizọs mere, oleekwa otú nke a dị ndị na-eso ụzọ ya?—Gụọ Jọn 2:13-17.
8 Ihe Jizọs mere na ihe o kwuru n’oge ahụ chetaara ndị na-eso ụzọ ya ihe Devid buru n’amụma mgbe ọ bụrụ abụ, sị: “Ekworo [ma ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi] maka ụlọ gị eripịawo m.” (Ọma 69:9) Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ahụ Jizọs mere nwere ike ịkpatara ya ezigbo nsogbu. A sị kwuwe, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ, ya bụ, ndị nchụàjà, ndị odeakwụkwọ, na ndị ọzọ, na-akwado ahịa a nọ ebe ahụ na-azụ, bụ́ nke e ji na-erigbu ndị mmadụ. Ọgbụgba Jizọs gbara arụrụala ha na-arụ n’anwụ mere ka ọ bụrụ ezigbo onye iro ha. Ndị na-eso ụzọ ya chọpụtara n’eziokwu na o nwere ‘ịnụ ọkụ n’obi maka ụlọ Chineke,’ ma ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi maka ofufe ya. Ma, gịnị bụ ịnụ ọkụ n’obi? Ọ̀ dị iche n’ime ihe ngwa ngwa?
g95 10/22 31 ¶4
Obi Mgbawa Ò Nwere Ike Ịkpatara Gị Ọnwụ?
Ụfọdụ ndị na-ekwu na obi mgbawa so n’ihe mere Jizọs Kraịst ji nwụọ. E buru amụma banyere Jizọs, sị: “Obi agbawaala m n’ihi mkparị a na-akparị m, ọnyá ya enweghịkwa ngwọta.” (Abụ Ọma 69:20) Amaokwu a ọ̀ na-ekwu na obi Jizọs gbawara agbawa n’eziokwu? O nwere ike ịbụ ihe ọ na-ekwu n’ihi na Jizọs tara ahụhụ ọtụtụ awa tupu ya anwụọ, ahụhụ ọ tara mekwara ka obi ghara iru ya ala. (Matiu 27:46; Luk 22:44; Ndị Hibru 5:7) Ihe ọzọ bụ na ọ ga-abụ obi mgbawa a mere ka “ọbara na mmiri” si Jizọs n’ahụ́ gbapụta mgbe a mara ya ube obere oge ọ nwụchara. Ọ bụrụ na obi mmadụ agbawaa ma ọ bụkwanụ na nnukwute akwara na-ebu ọbara ya agbawaa, ọbara na-asọpụta n’elu obi ya ma ọ bụkwanụ sọba n’ihe dị ka akpa na-ekpuchi obi ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na e jiri ihe dụpuo elu obi onye ahụ ma ọ bụ dụpuo ihe ahụ na-ekpuchi obi, ihe yiri “ọbara na mmiri” nwere ike ịgbapụta.—Jọn 19:34.
it-2 650
Ahịhịa Na-egbu Mmadụ
E buru amụma gbasara Mezaya na a ga-enye ya “nsí” ma ọ bụ “ahịhịa na-egbu mmadụ” kama inye ya nri. (Ọma 69:21) Amụma a mezuru mgbe e nyere Jizọs Kraịst mmanya a gwara ihe na-elu ilu tupu a kpọgide ya n’osisi. Ma mgbe o detụrụ ya ọnụ, o kweghị aṅụ ya. Ọ ga-abụ na ihe mere e ji nye ya mmanya ahụ na-egbu egbu bụ ka o mee ka ahụhụ ọ na-ata belata. Mgbe Matiu (27:34) na-ede otú amụma a si mezuo, o dere okwu Grik bụ́ kho·leʹ (ihe na-elu ilu). Ọ bụ otu okwu ahụ ka e dere n’Abụ Ọma 69:21 na Baịbụl Septuagint Grik. Mana, ihe e dere n’Ozi Ọma Mak bụ mea (Mak 15:23). Ọ bụ ya mere ụfọdụ ndị ji kwuo na ‘ahịhịa ahụ na-egbu mmadụ’ ma ọ bụ ‘ihe ahụ na-elu ilu’ bụ “mea.” O nwekwara ike ịbụ na ihe e tinyere na mmanya ahụ bụ ihe na-elu ilu nakwa mea.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Chịlie Aka nke Iguzosi Ike n’Ihe Elu n’Ekpere
11 Ọtụtụ mmadụ na-ekpe ekpere nanị iji rịọ ihe, ma ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova Chineke nọ kwesịrị ịkpali anyị inye ya ekele na otuto ma n’ekpere onwe onye ma na nke ihu ọha. “Unu echegbula onwe n’ihe ọ bụla,” ka Pọl dere, “kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ee, tụkwasị n’arịrịọ, anyị kwesịrị ikele Jehova maka ngọzi ime mmụọ na nke anụ ahụ. (Ilu 10:22) Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Chụọrọ Chineke ekele dị ka àjà; kwụghachikwa Onye kachasị ihe nile elu nkwa nile i kwere.” (Abụ Ọma 50:14) Ekpere Devid ji gụọ uri olu ụtọ gụnyekwara okwu ndị a na-emetụ n’ahụ: “M ga-eji abụ too aha Chineke, m ga-ejikwa ekele mee ka Ọ dị ukwuu.” (Abụ Ọma 69:30) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ime otu ihe ahụ n’ekpere ihu ọha na nke onwe anyị?
ỌGỌST 5-11
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 70-72
“Kọọrọ Ọgbọ Na-abịa Abịa” Banyere Ike Chineke
Ndị Ntorobịa—Zụọnụ Ike Nghọta Unu!
17 Izere ọnyà Setan ga-achọ n’aka unu ịnọ na nche mgbe nile—mgbe ụfọdụkwa, obi ike dị ukwuu. Ọbụna mgbe ụfọdụ unu pụrụ ịhụta onwe unu dị ka ndị na-ekwekọghị, ọ bụghị nanị n’ebe ndị ọgbọ unu nọ, kamakwa n’ebe ụwa nile nọ. Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kpere ekpere, sị: “Gị onwe gị bụ olileanya m, Onyenwe anyị Jehova: Gị bụ ntụkwasị obi m site na nwata. Chineke, I ziwo m ihe site na nwata; ọ bụkwa ruo ugbu a ka m na-egosi oké ọrụ Gị nile.” (Abụ Ọma 71:5, 17) A maara Devid maka obi ike ya. Ma olee mgbe ọ zụlitere ya? Ọ bụ n’oge ọ bụ onye ntorobịa! Ọbụna tupu mburịta agha ahụ wuru ewu nke ya na Golaịat, Devid egosipụtawo obi ike dị ịrịba ama n’ichebe ìgwè atụrụ nna ya—na-egbu ma ọdụm ma anụ ọhịa bear. (1 Samuel 17:34-37) Otú ọ dị, Devid nyere Jehova otuto nile maka obi ike ọ bụla o gosipụtara, na-akpọ ya “ntụkwasị obi m site na nwata.” Ikike Devid nwere ịdabere n’ebe Jehova nọ mere ka ọnwụnwa ọ bụla o chere ihu ghara ịkarị ya. Unu onwe unu ga-achọpụtakwa na ọ bụrụ na unu adabere n’ebe Jehova nọ, ọ ga-enye unu obi ike na ume iji ‘merie ụwa.’—1 Jọn 5:4.
Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-emeso Ndị Agadi?
Ọbụ abụ ahụ kpere ekpere, sị: “Atụfula m na mgbe agadi; mgbe ike m gwụsịrị ahapụla m.” (Abụ Ọma 71:9) Chineke adịghị ‘atụfu’ ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi, ọbụna mgbe ha onwe ha pụrụ iche na ha abaghịzi uru ọ bụla. Ọbụ abụ ahụ echeghị na Jehova agbahapụwo ya; kama, ọ ghọtara mkpa ọ dị ya ịdabere n’ebe Onye Okike ya nọ ọbụna karị n’oge ọ na-emewanye agadi. Jehova na-eme ihe banyere iguzosi ike n’ihe dị otú ahụ site n’ịkwado onye ahụ n’oge nile ọ nọ ndụ. (Abụ Ọma 18:25) Enyemaka dị otú ahụ na-abịakarị site n’aka Ndị Kraịst ibe ha.
Ijere Jehova Ozi Tupu Oge Ọdachi Erute
4 Ọ bụrụ na ị gbaala ọtụtụ afọ, ajụjụ dị mkpa i kwesịrị ịjụ onwe gị bụ, ‘Gịnị ka m ga-eji ndụ m mee ugbu a m ka gbasitụrụ ike?’ Ebe ị bụ Onye Kraịst kemgbe ọtụtụ afọ, e nwere ihe ndị i nwere ike ime ndị ọzọ na-agaghị emeli. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịkụziri ndị ị tọrọ ihe Jehova kụziiri gị. I nwekwara ike ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị magburu onwe ha merela n’ozi gị. Eze Devid kpere ekpere ka ya nwee ike ime otú ahụ. O dere, sị: “Chineke, ị nọwo na-ezi m ihe malite n’oge m bụ nwata . . . Chineke, biko, ahapụla m ruo ọbụna mgbe m mere agadi na mgbe isi chara m awọ́, ruo mgbe m kọọrọ ọgbọ ọzọ banyere ogwe aka gị, kọọkwara ndị niile a ka ga-amụ banyere ịdị ike gị.”—Ọma 71:17, 18.
5 Gịnị ka ị ga-eme ka ihe ndị ị mụtara kemgbe ọtụtụ afọ baara ndị ọzọ uru? I nwere ike ịgwa ndị na-eto eto ka ha bịa na nke gị ka gị na ha nọrịa. I nwekwara ike ịgwa ha ka gị na ha rụọ n’ozi ọma ka ha hụ otú ijere Jehova ozi si atọ gị ụtọ. Elaịhu kwuru, sị: “Ka ọtụtụ ụbọchị kwuo okwu, ọ bụkwa ọtụtụ afọ ndụ kwesịrị ime ka a mara ihe bụ́ amamihe.” (Job 32:7) Pọl onyeozi gwara ụmụnna nwaanyị bụ́ ndị agadi ka ha jiri ma okwu ọnụ ha ma omume ha na-akụziri ndị ọzọ ihe. O kwuru, sị: “Ka ndị agadi nwaanyị bụrụ ndị . . . na-akụzi ihe dị mma.”—Taị. 2:3.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 768
Osimiri Yufretis
Ebe Ala E Kenyere Ndị Izrel Jedebere. Mgbe Ebreham na Chineke gbara ndụ, Chineke kwere Ebreham nkwa na ọ ga-enye ụmụ ya ala “malite n’osimiri Ijipt ruo ná nnukwu osimiri, bụ́ osimiri Yufretis.” (Jen. 15:18) Chineke mechara kwekwa mba Izrel nkwa a. (Ọpụ. 23:31; Diut. 1:7, 8; 11:24; Josh. 1:4) Ihe E Mere nke Mbụ 5:9 kwuru na tupu Devid achịwa ndị Izrel, ebe ụfọdụ ụmụ Ruben biri ruru “ebe e si abanye n’ala ịkpa, n’akụkụ Osimiri Yufretis.” Ma, ebe ọ bụ na Osimiri Yufretis dị ihe dị ka narị kilomita asatọ (800) ma e si ‘n’ebe ọwụwa anyanwụ Gilied’ gawa ya (1 Ihe 5:10), o nwere ike ịpụta na ebe ụmụ Ruben bi si n’ebe ọwụwa anyanwụ Gilied ruo ná njedebe Ọzara Siria, ọzara a rukwara n’Osimiri Yufretis. (Nsụgharị Revised Standard kwuru, sị: “ruo n’ebe e si abanye n’ọzara n’ofe nke a nke Osimiri Yufretis.” Nsụgharị Jerusalem Bible kwuru, sị: “ruo ná mbido ọzara nke kwụsịrị n’osimiri Yufretis.”) N’ihi ya, ọ ga-abụ na mgbe mbụ nkwa ahụ Jehova kwere mezuchara bụ n’oge Devid na Solomọn na-achị. N’oge ahụ, ebe ndị Izrel na-achị sakwuru mbara ruo Zoba bụ́ alaeze ndị Eram, ruokwa n’ụsọ Osimiri Yufretis, o nwekwara ike ịbụ ná mpaghara ebe e si aga n’ebe ugwu Siria. (2 Sam. 8:3; 1 Eze 4:21; 1 Ihe 18:3-8; 2 Ihe 9:26) N’ihi otú e si mara Osimiri Yufretis amara, ihe a na-akpọkarị ya bụ naanị ‘Osimiri.’—Josh. 24:2, 15; Ọma 72:8.
ỌGỌST 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 73-74
Gịnị Ka Anyị Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Anyị Na-emere Ndị Na-anaghị Efe Chineke Anyaụfụ?
Jehova Na-azọpụta Ndị Dara Mbà n’Obi
14 Ọ bụ onye Livaị dere Abụ Ọma nke 73. O nwere ihe ùgwù pụrụ iche ijere Jehova ozi n’ụlọ nsọ ya. Ma, o nwere mgbe ọ dara mbà n’obi. N’ihi gịnị? O bidoro imere ndị na-etu ọnụ na ndị ọjọọ anyaụfụ. Anyaụfụ ọ na-emere ha abụghị n’ihi ihe ọjọọ ha na-eme. Kama, ọ bụ n’ihi na o chere na ihe na-agaziri ha. (Ọma 73:2-9, 11-14) Ọ dị nnọọ ka ihe niile ò zuuru ha. Ha bara ọgaranya, na-ekpori ndụ. Ha anaghịkwa echegbu onwe ha. Otú a o si dị ka ihe ọ̀ na-agaziri ha mere ka ọbụ abụ a daa mbà n’obi nke na ọ sịrị: “N’ezie, ọ bụ n’efu ka m meworo ka obi m dị ọcha, kwọọkwa aka m iji gosi na aka m dị ọcha.” O doro anya na ihe a nwere ike ime ka ọ kwụsị ife Jehova.
Jehova Na-azọpụta Ndị Dara Mbà n’Obi
15 Gụọ Abụ Ọma 73:16-19, 22-25. Onye Livaị ahụ banyere “ná nnukwu ebe nsọ Chineke.” Ọ ga-abụ na ya na ndị ọzọ na-efe Chineke nọ n’ebe ahụ, ya enwee ike iwetu obi chebara ọnọdụ ya echiche ma kpee ekpere banyere ya. Ọ bịaziri chọpụta na ya na-eche echiche ka onye na-amaghị ihe, nakwa na ihe a nwere ike ime ka ya na Jehova kwụsị ịdị ná mma. Ọ bịakwara ghọta na ndị ọjọọ ahụ nọ “n’ala na-amị amị” nakwa na a ga-emecha ‘laa ha n’iyi.’ Ihe ga-enyere onye Livaị a aka ịkwụsị inwere ndị ọjọọ anyaụfụ na ịda mbà n’obi bụ ile ihe anya otú Jehova si ele ya. Mgbe o mere otú ahụ, ọ kwụsịrị ichegbu onwe ya, obi ana-atọkwa ya ụtọ. O kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ na-enye m obi ụtọ n’ụwa ma e wezụga [Jehova].”
16 Ihe ọ na-akụziri anyị. Ya adịla mgbe anyị ga-emewere ndị ajọ omume ọ dị ka ihe ọ̀ na-agaziri anyaụfụ. Obi ụtọ ha abụghị nke ezigbo ya. Ọ gaghịkwa adịte aka n’ihi na ha agaghị adị ndụ ebighị ebi. (Ekli. 8:12, 13) Anyị mewere ha anyaụfụ, anyị ga-ada mbà n’obi, lawakwa azụ n’ofufe Chineke. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ọ dịwara gị otú ahụ ọ dị onye Livaị ahụ, mee ihe ahụ o mere. Mee ihe Chineke na-agwa gị. Gị na ndị na-efe Chineke na-akpakwa. Ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova n’anya karịa ihe ọ bụla ọzọ, ị ga na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ị ga-anọgidekwa n’ụzọ nke na-eduba ná “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Tim. 6:19.
Ṅomie Okwukwe Mozis
5 Gịnị ka ị ga-eme ka a ghara iji “ụtọ mmehie” rata gị? Echefula na ụtọ mmehie anaghị adịte aka. Okwukwe ga-eme ka ị ghọta na ‘ụwa na ọchịchọ ya na-agabiga.’ (1 Jọn 2:15-17) Cheta ihe ga-eme ndị mmehie na-ekweghị echegharị. Ha nọ “n’ala na-amị amị,” a ga-ebibikwa ha. (Ọma 73:18, 19) Ọ bụrụ na a nwaa gị ọnwụnwa, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú m chọrọ ka ihe dịrị m?’
Ekwela Ka Ihe Ọ bụla Mee Ka Ị Ghara Inweta Otuto
3 Ihe ọbụ abụ kwuru gosiri na obi siri ya ike na Jehova ga-ejide aka nri ya, na-edu ya ka o nweta ezigbo ùgwù. (Gụọ Abụ Ọma 73:23, 24.) Olee otú Jehova si eme ya? Jehova na-edu ndị ohu ya dị umeala n’obi ka ha nweta otuto. Otú o si eme ya bụ isi n’ụzọ dị iche iche na-eme ka ha nweta ùgwù. Ọ na-agọzi ha, na-eme ka ha ghọta ihe bụ́ uche ya. (1 Kọr. 2:7) Ọ na-akwanyere ndị na-ege ya ntị na ndị na-erubere ya isi ùgwù. Ihe ọ pụtara bụ na ha na ya dị ná mma.—Jems 4:8.
4 Jehova nyekwara ndị ohu ya akụ̀ bara ezigbo uru, ya bụ, ozi ọma ha na-ekwusa. (2 Kọr. 4:1, 7) Ozi ọma ahụ na-eme ka anyị nweta otuto. Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma ma na-eto Jehova, ọ na-akwanyere anyị ùgwù, ndị ọzọ na-eritekwa uru. N’ihi ya, Jehova kwere anyị nkwa, sị: “Ndị na-asọpụrụ m ka m ga-akwanyere ùgwù.” (1 Sam. 2:30) Otú Jehova si akwanyere ndị na-ekwusa ozi ọma ùgwù bụ na ọ na-ele ha anya ọma. Ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga na-ekwukwa okwu ọma banyere ha.—Ilu 11:16; 22:1.
5 Gịnị ka Jehova ga-emere ndị na-erubere ya isi n’ọdịnihu? Baịbụl kwere ha nkwa na Jehova ga-ebuli ha elu inweta ụwa nakwa na mgbe a ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ, ha ga-ahụ ya. (Ọma 37:34) Ha na-atụsi anya ike ịhụ mgbe Jehova ga-akwanyere ha ùgwù na-enweghị atụ, nke bụ́ ịdị ndụ ebighị ebi.—Ọma 37:29.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 240
Levayatan
Abụ Ọma 74 kọrọ otú Chineke si zọpụta ndị ya. N’amaokwu nke 13 na nke 14, a mara atụ otú Chineke si napụta ndị Izrel n’Ijipt. Mgbe e dechara okwu bụ́ “nnukwu anụ mmiri dị iche iche” [Hib., than·ni·nimʹ, tan·ninʹ ma ọ bụrụ otu]” n’amaokwu bu ụzọ, a kpọziri okwu ahụ “Levayatan” n’ihe e dere n’ala ala peeji amaokwu na-eso ya. Ọ ga-abụ na ngwepịa e gwepịara isi Levayatan pụtara mbibi e bibiri Fero na ndị agha ya n’oge ndị Izrel si n’Ijipt na-apụ. Ihe e dere na Tagọm nke Arameik n’amaokwu ahụ e dere “isi Levayatan” bụ “ndị siri ike nke Fero.” (I nwere ike ịtụle Ezik. 29:3-5, bụ́ ebe e ji Fero tụnyere “nnukwu anụ mmiri” nke nọ n’iyi niile na-asọnye n’Osimiri Naịl; nakwa Ezik. 32:2.) Ọ ga-abụ na Levayatan (Septuagint nke Grik kpọrọ ya “dragọn”) e dere n’ala ala peeji Aịzaya 27:1 nọchiri anya alaeze ma ọ bụ òtù zuru ụwa ọnụ nke onye na-achị ya bụ onye a kpọrọ “agwọ” na “dragọn.” (Mkpu. 12:9) Amụma a so n’amụma ndị kwuru otú ndị Izrel ga-esi maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe. N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na mgbe Jehova ‘ga-elebara’ Levayatan anya, ọ ga-elebakwara Babịlọn anya. Ma, amaokwu nke 12 na 13 kwukwara gbasara Asiria na Ijipt. N’ihi ya, ọ ga-abụ na Levayatan pụtara òtù zuru ụwa ọnụ ma ọ bụ alaeze na-emegide Jehova na ndị na-efe ya.
ỌGỌST 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 75-77
Gịnị Mere Anyị Ekwesịghị Ịna-etu Ọnụ?
Ihe Dị Iche ná Ndị Na-efe Chineke na Ndị Na-anaghị Efe Ya
4 Mgbe Pọl kwuchara na ọtụtụ ndị ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya na ndị hụrụ ego n’anya, o kwukwara na ha ga-abụ ndị na-anya isi, ndị mpako na ndị nganga fụliri elu. Ndị na-akpa àgwà ndị a na-echekarị na ha ka ndị ọzọ n’ihi otú ha dị n’anya, ihe ndị ha nwere ike ime, ihe ndị ha nwere ma ọ bụkwanụ ọkwá ha nọ na ya. Ha na-achọkarịkwa ka ndị ọzọ na-eto ha ma ọ bụ na-akwanyere ha ùgwù pụrụ iche. Otu onye ọkà mmụta kwuru na mpako bụ otu ụzọ mmadụ si efe onwe ya kama ife Chineke. Ụfọdụ ekwuola na mpako bụ àgwà jọgburu onwe ya n’ihi na ndị dị mpako anaghị achọ iji anya ahụ ndị ọzọ dị mpako.
5 Jehova kpọrọ mpako asị. Ọ kpọkwara “anya dị elu” asị. (Ilu 6:16, 17) Mpako na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma. (Ọma 10:4) Ọ bụ àgwà e ji mara Ekwensu. (1 Timoti 3:6) Ma ọ dị mwute na ụfọdụ ndị fere Jehova n’oge ochie ghọrọ ndị mpako. Dị ka ihe atụ, Ọzaya bụ́ eze Juda, jeere Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ. Ma Baịbụl kwuru, sị: “Otú ọ dị, ozugbo o siri ike, obi ya wee dị mpako nke na ọ kpataara onwe ya mbibi, o wee meso Jehova bụ́ Chineke ya omume ekwesịghị ntụkwasị obi wee bata n’ụlọ nsọ Jehova isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.” Eze Hezekaya mechakwara dịrị mpako, ruo oge ụfọdụ.—2 Ihe 26:16; 32:25, 26.
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Atọ na nke Anọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma
75:4, 5, 10—Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mpi” pụtara? Mpi anụmanụ bụ ngwá ọgụ siri ike. N’ihi ya, okwu ahụ bụ́ “mpi” na-apụta n’ụzọ ihe atụ, ike, ma ọ bụ ume. Jehova na-ebuli mpi nile nke ndị ya elu, na-eme ka ha dị elu, ebe ọ ‘na-ebipụ mpi nile nke ndị na-emebi iwu.’ A dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ‘ibuli mpi elu,’ nke pụtara na anyị ekwesịghị ịdị mpako. Ebe ọ bụ Jehova bụ onye na-ebuli anyị elu, e kwesịrị ile ihe ùgwù ndị a na-enwe n’ọgbakọ anya dị ka ihe ndị sitere n’aka ya.—Abụ Ọma 75:7.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Atọ na nke Anọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma
76:10—Olee otú “ọnụma mmadụ” pụrụ isi kelee Jehova? Mgbe Chineke nyere ndị mmadụ ohere iweso anyị iwe n’ihi na anyị bụ ndị ohu ya, ihe dị mma pụrụ isi na ya pụta. Ihe isi ike ọ bụla anyị pụrụ inweta pụrụ ịzụ anyị n’ụzọ ụfọdụ. Jehova na-ekwe ka anyị taa ahụhụ ruo nanị n’ókè nke iji ya nye anyị ụdị ọzụzụ ahụ. (1 Pita 5:10) ‘Chineke na-eke ọnụma mmadụ nke fọdụrụ n’úkwù.’ Gịnị ma ọ bụrụ na anyị atagide ahụhụ nwụọ? Nke a pụkwara iwetara Jehova ekele, n’ihi na ndị hụrụ anyị ka anyị ji ndidi kwesị ntụkwasị obi pụrụ ịmalite inye Chineke otuto.
ỌGỌST 26–SEPTEMBA 1
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 78
Nnupụisi Mba Izrel Bụụrụ Anyị Ihe Ịdọ Aka ná Ntị
“Cheta Ụbọchị Ndị Gaworo Aga”—N’ihi Gịnị?
N’ụzọ dị mwute, ndị Israel dabara mgbe mgbe ná mmehie nke ichefu ihe. Gịnị ka ọ rụpụtara? “Ha wee chigharịa, wee nwaa Chineke, ọ bụkwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe. Ha echetaghị aka Ya, ụbọchị mgbe Ọ gbapụtara ha n’aka onye mkpagbu.” (Abụ Ọma 78:41, 42) N’ikpeazụ, nchefu ha chefuru iwu Jehova mere ka ha bụrụ ndị ọ jụrụ.—Matiu 21:42, 43.
Ọbụ abụ ahụ setịpụrụ ihe nlereanya mara mma, bụ́ onye dere, sị: “M ga-ehota omume nile nke Ja; n’ihi na m ga-echeta oké ọrụ Gị nile site na mgbe ochie. M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.” (Abụ Ọma 77:11, 12) Ụdị ncheta ahụ e ji ntụgharị uche cheta ozi gara aga nke iguzosi ike n’ihe na omume ịhụnanya nke Jehova ga-enye anyị mkpali, agbamume, na ekele dị mkpa. Ọzọ, ‘icheta ụbọchị mbụ ahụ’ pụrụ iwepụ ike ọgwụgwụ ma kpasuo anyị ime ihe nile anyị pụrụ ime na iji tachie obi n’ikwesị ntụkwasị obi.
‘Nọgidenụ Na-eme Ihe n’Enweghị Ntamu’
16 Ịtamu ntamu na-eme ka anyị na-eche banyere nanị onwe anyị na nsogbu anyị, na-emekwa ka anyị leghara ngọzi ndị anyị na-enweta dị ka Ndịàmà Jehova, anya. Ọ bụrụ na anyị achọọ ịkwụsị ime mkpesa, ọ dị anyị mkpa iburu ngọzi ndị a n’obi mgbe nile. Dị ka ihe atụ, onye nke ọ bụla n’ime anyị nwere ihe ùgwù magburu onwe ya nke ịbụ ndị a kpọkwasịrị aha Jehova. (Aịsaịa 43:10) Anyị na Jehova pụrụ inwe mmekọrịta chiri anya, anyị pụrụ ịgwa ya okwu mgbe ọ bụla dị ka “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2; Jems 4:8) Anyị na-ebi ndụ nwere nnọọ nzube ugbu a n’ihi na anyị ghọtara ihe iseokwu ọbụbụeze eluigwe na ala ma na-echeta na anyị nwere ihe ùgwù nke ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. (Ilu 27:11) Anyị pụrụ ikerechi òkè anya n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Matiu 24:14) Okwukwe anyị nwere n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst na-eme ka anyị nwee akọnuche dị ọcha. (Jọn 3:16) Ihe ndị a bụ ngọzi ndị anyị na-enweta n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla anyị pụrụ ịnọ na ya.
Jehova Ò Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ Ma Ọ Bụ Mwute?
Abụ ọma ahụ sịrị: “Lee ugboro ole ha nupụụrụ ya isi n’ala ịkpa!” (Amaokwu nke 40) Amaokwu nke na-eso ya ekwuo, sị: “Ha nwara Chineke ọnwụnwa ugboro ugboro.” (Amaokwu nke 41) Ị̀ hụrụ na onye dere abụ ọma a kwuru na ha nupụrụ isi ugboro ugboro? Nnupụisi ha malitere obere oge ha pụtachara n’Ijipt. Ha malitere ịtamu ntamu megide Chineke. O yiri ka hà na-ekwu na Chineke agaghị elekọtali ha. (Ọnụ Ọgụgụ 14:1-4) Otu akwụkwọ nke na-enyere ndị na-asụgharị Baịbụl aka kwuru na otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa okwu bụ́ “ha nupụụrụ ya isi” bụ ‘ha kpọchiiri Chineke obi ha’ ma ọ bụ na ‘ha sịrị Chineke “Mba.”’ N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova meere ndị ya ebere ma gbaghara ha mgbe ha gosiri na ha echegharịala. Ma e mechaakwa, ha alaghachi n’ụzọ ọjọọ ha. Otú ahụ ka ha mere ugboro ugboro.—Abụ Ọma 78:10-19, 38.
Olee otú obi na-adị Jehova mgbe ọ bụla ndị ya nupụụrụ ya isi? Amaokwu nke 40 sịrị na ‘ha kpasuru ya iwe.’ Otú Baịbụl ọzọ si sụgharịa ya bụ na ha “na-eme ya ihe mwute.” Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru, sị: “Ihe nke a pụtara bụ na otú ndị Hibru ahụ si mee omume wutere nnọọ Chineke otú ahụ omume nwa nnupụisi ma ọ bụ nwa isi ike si ewute ndị mụrụ ya.” Otú ahụ nwata isi ike si akpatara ndị mụrụ ya obi mgbawa, otú ahụkwa ka ụmụ Izrel, bụ́ ndị nnupụisi, si ‘mee ihe wutere Onye Nsọ Izrel.’—Amaokwu nke 41.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi nke Atọ na nke Anọ nke Akwụkwọ Abụ Ọma
78:24, 25—N’ihi gịnị ka e ji kpọọ mana “ọka nke eluigwe” na “nri nke ndị dị ike [ma ọ bụ “ndị mmụọ ozi”]”? Ọ dịghị nke ọ bụla n’okwu abụọ ahụ pụtara na mana bụ nri ndị mmụọ ozi. Ọ bụ “nri nke eluigwe” n’ihi na o sitere n’eluigwe. (Abụ Ọma 105:40) Ebe ọ bụ na ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ “ndị dị ike,” bi n’eluigwe, okwu ahụ bụ́ “Nri nke ndị dị ike” pụtara na ọ bụ Chineke, onye bi n’eluigwe zitere ya. (Abụ Ọma 11:4) Ọ pụkwara ịbụ na Jehova ziteere ụmụ Izrel mana ahụ site n’aka ndị mmụọ ozi.