Jehova emewo m Ọgaranya
Dị ka Elsie Meynberg si kọọ
“NGỌZI Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” (Ilu 10:22) Ahụtawo m ịbụ eziokwu nke ilu Bible nke a n’onwe m. Chere ka m kọọrọ gị.
Mgbe m gbara nanị afọ isii, ana m ege ntị mgbe nne m na otu onye nkuzi Bible nke na-abịa eleta anyị na-ekwurịta okwu, ahụtakwara m otú ihe nne m na-amụta si emetụta ya n’ahụ nke ukwuu. N’otu anyasị jụrụ oyi nke oge oyi, esi m n’okpukpu ụlọ nke dị n’elu na-agbadata ije kuru mmiri ọṅụṅụ, ahụrụ m ka Mama nọ n’akụkụ ọnụ ụzọ ovun ahụ ghere oghe na-agụ akwụkwọ. Kama ịbara m mba dị ka m tụrụ anya ya, o konyere m aka wee kọwaa na aha Chineke bụ Jehova. Obi ụtọ nke dị n’olu ya mere ka m ghọta na ihe ahụ ọ mụtaworo dị ya mkpa nke ukwuu.
Mgbe ya na onye nkuzi Bible ahụ nwesịrị mkparịta ụka ole na ole ọzọ, Mama jiri ụkwụ pụọ ije gwa ndị agbata obi ozi ọma ahụ nke ọ mụtaworo. Otú ọ dị, ọ bụghị mgbe nile ka a na-anabata ya nke ọma. Anyị bi n’ime ime obodo n’ebe dị nso Beatty, Saskatchewan, Canada, ihe ka ọtụtụ ná ndị agbata obi anyị bụkwa ndị ikwu anyị, bụ́ ndị kwesiri ike n’okpukpe Lutheran ma ọ bụkwanụ ndị Evangelist. N’agbanyeghị nke ahụ, Mama nọgidere na-eje na nke ha.
Ana m esi na windo ndị ikuku oyi meworo ka ha kwụchie akwụchie na-ele ka Mama na-agbalị ịkpụpụtasị ịnyịnya ndị ahụ site n’ụlọ ebe ha na-anọ, ebe m maara na ikezi ha otú ha kwesịrị ịdị edochaghị ya anya. N’oge ndị ọzọ, ọ na-aga nzukọ dị iche iche ma ọ bụ ozi ubi n’agbanyeghị mkpesa nile Papa na-eme. O kwenyeghị n’okpukpe ọhụrụ nke Mama, ma Mama kpebisiri ike ịnọgide na ya. Mgbe nile ọ na-alọghachi, na-enwe obi ụtọ sitere n’ime ime obi nke mmadụ nile na-ahụta. Ọ na-asị, “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya.” N’oge ahụ, ana m eche echiche ihe o bu n’uche wee na-ekwu nke ahụ. Ọ bụ ezie na aka m dị nanị afọ isii, achọkwara m ijere Jehova ozi.
Otu ụbọchị mụ na nna m nọ n’elu ụlọ, bụ́ ebe ọ nọ na-arụzị osisi ndị ahụ a kụrụ n’elu ụlọ. Mama na nwanne m nwanyị bụ Eileen so otu ìgwè ndị mmadụ na-abanye n’otu ụgbọ ala Model T Ford ije sonye n’otu “ngagharị mgbasa ozi.” Ha gaje ịgagharị n’ime obodo ahụ dum, na-ekokwasị obodobo akwụkwọ n’obi ha, bụ́ nke na-akpọsa otu okwu Bible.
Papa jụrụ m, sị, “Ọ dịghị mgbe ị ga-aga ime ụdị nzuzu ahụ, ọ̀ kwa ya?” Ma, ọ bụ ezie na abụ m nwa agbọghọ nta onye ọ na-amasị nnọọ ịrị elu, ọ gaara amasị m karị iso ná ngagharị mgbasa ozi ahụ kama ịnọ n’elu ụlọ ebe a. Otú ọ dị, ha kwuru na ogologo m erughị ihe a chọrọ iji nyara akwụkwọ mgbasa ozi ahụ n’olu.
Imeri Ihe Ịma Aka nke Mmachibido Iwu ahụ
N’ikpeazụ, enwere m ohere mbụ m nke ikwusa ozi Alaeze ahụ na November 1940. Lee nnọọ ihe oké mkpali ọ bụ! Ebe ọ bụ na a machibidoro ọrụ nkwusa Ndịàmà Jehova iwu na Canada n’oge ahụ, anyị pụrụ n’etiti abalị wee debe akwụkwọ nta ahụ bụ End of Nazism n’ọnụ ụzọ nke ụlọ nile.
Mgbe m gbara afọ itoolu, ekpebiri m ịrara ndụ m nye Jehova na ime baptism. N’ihi mkpagbu ahụ, a gwaghị anyị ebe a ga-anọ enwe nzukọ ahụ, kama e duuru anyị jee n’otu ebe dị n’ime oké ọhịa, bụ́ ebe otu ìgwè buru ibu nke Ndịàmà nọ na-enwe “nnọkọ ntụrụndụ.” N’ebe ahụ mụ na nwanne m nwanyị nke tọrọ m, bụ́ Eleanor, so n’ọtụtụ ndị e mere baptism n’ime mmiri jụrụ oyi nke otu ọdọ mmiri dị nso ebe ahụ.
N’oge ahụ, a na-eji klasị ikele ọkọlọtọ na ịbụ abụ e ji eto mba na-amalite akwụkwọ. N’agbanyeghị anya ebubo ụmụ klasị anyị na-ele anyị, anyị na-eji nsọpụrụ jụ ikere òkè n’ihe omume ndị ahụ n’ihi ihe Bible kuziri banyere ikpere arụsị. (Daniel, isi 3) Nwa nwanne nne m bụ́ Elaine Young, onye bụkwa Onyeàmà, na-aga ije maịlụ anọ [6 kilomita] iji bịarute n’ụlọ akwụkwọ, ma kwa ụbọchị, a na-achụpụ ya n’ihi na ọ jụrụ ikele ọkọlọtọ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ na-ejikwa ụkwụ laghachi. O mere nke a ruo ọkara nke afọ ụlọ akwụkwọ ahụ ka e wee ghara ịkanyere ya akara dị ka onye na-abịaghị akwụkwọ bụ́ nke ga-eme ka ọ daa ule ya.
Mgbe m hapụrụ ụlọ akwụkwọ, arụrụ m ọrụ n’ụlọ akụ. Ma otu ule bịara mgbe a na-anakwereghị arịrịọ m rịọrọ ka m jee mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova, nke e mere na New York na 1950. Echebewo m ego ụfọdụ, m wee kpebie ịhapụ ọrụ ahụ ma malite ozi oge nile. Ya mere, mụ na Elaine kwapụrụ jee obodo Regina. Ụfọdụ ndị kwara emo, sị, “Mgbe oge opupu ihe ubi na-erule, ọ ga-alọghachi ebe a ịrịọ arịrịọ.” Otú ọ dị, enwere m ike ilekọta onwe m site n’ịrụ ọrụ nwa oge dị ka onye na-eje ozi n’ụlọ. Ịba ụba nke ngọzi Jehova emewo ka m nọgide n’ozi oge nile eri mgbe ahụ.
Iru Ihe Mgbaru Ọsọ Anyị
Na 1955 mụ na Elaine nwere oké ọṅụ n’ịbụ ndị a kpọrọ òkù ịbịa klasị nke 26 nke Gilead, mesịakwa bụrụ ndị e kenyere ọrụ na Bolivia, South America. N’oge ahụ, e nwere nanị ihe dị ka 160 Ndịàmà n’ime mba ahụ dum. Anyị mesịrị jee Tarija isonyere ndị ozi ala ọzọ abụọ ndị ọzọ nọ n’ebe mbụ ahụ e kenyere anyị ọrụ.
Tarija bụ obodo mara mma. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ ndị inyom ka ha yi uwe ndị obodo ha, na-ebukwa ibu n’isi ha. Ndị obodo ahụ nwere omume enyi, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ha na-agwa anyị na ha enweghị mmasị n’ihe anyị ji bịa. Ihe àmà gosịrị na ha chere na ọ ka mma ịgwa anyị ka anyị bịaghachi ọzọ n’oge mgbe ha maara na ha agaghị anọ n’ụlọ. 0 wetụrụ anyị oge iji mee ka nke a mara anyị ahụ.
Otu ụbọchị, anyị na otu nwoke na-ekwurịta okwu n’ọnụ ụzọ ya mgbe otu ụgbọ ala jeep kwụsịrị, otu onye ụkọchukwu ọnụma juru obi nke ihu ya na-achakwa ọbara ọbara, mapụtara. O tiri mkpu gwa nwoke ahụ, sị, “Ma ị kwụsịghị iso ụmụ agbọghọ ahụ akparịta ụka ugbu a, anyị ga-achụpụ gị na chọọchị!” N’iche anyị ihu, o yiri anyị egwu, sị: “Unu enweghị ikike ọ bụla ime nkwusa n’ebe a. Ma unu akwụsịghị, m ga-eme ihe ndị ọzọ dị mkpa.” Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ndị agbata obi ezukọtawo ikiri ihe na-emenụ. Ya mere, ihe anyị mere bụ nanị iwere ọrụ anyị gaa n’ihu, na-etinye ọtụtụ akwụkwọ na Bible n’aka ndị ahụ bịara ikiri ihe na-emenụ.
Mgbe anyị nọworo afọ abụọ na ndagwurugwu ọma nke a ebe mkpụrụ osisi peach, ahụekere, na mkpụrụ vine na-eme nnọọ nke ọma, ọ bụrụghị anyị ihe obi ụtọ na mbụ ịnata mgbanwe ọrụ ịje Potosí, bụ́ otu obodo jụrụ oyi nke ukwuu ebe a na-egwupụta ihe dị n’ime ala, nke dị n’ebe ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu ya karịrị 13,000 amaụkwụ [4,000 mita]. Oké oyi a na-enwe n’oge oyi na Canada amarawo anyị ahụ, ma ọdịiche dị na ya bụ na n’obodo Potosí, ụlọ ndị ahụ adịghị enwekebe ihe na-ekpo ụlọ ọkụ. Otú ọ dị, na Potosí, e nwere mkpakọrịta na-ekpo ọkụ nke ọgbakọ ndị Kraịst, ebe ọ na-adịbeghị ọgbakọ ọ bụla e guzobere na Tarija.
Imeghe Ókèala Ọhụrụ
Ọzọ, e zijere mụ na Elaine gaa Villamontes ije malite ọrụ nkwusa n’ebe ahụ. Ụgbọ gwongworo anyị banyere na ya bujupụtara suga, bụ́ nke a machibidoro iwu, ya mere, iji zere nsogbu ndị uwe ojii n’ebe ndị ahụ a na-akwụ ụgwọ okporo ụzọ, onye draịva ahụ akwọlighị ruokwa mgbe chi jiri. A sị na anyị maakwara, anyị gaara eweta tọọchị, n’ihi na, na mberede, otu ihe megharịrị ahụ n’akụkụ anyị n’okpuru ákwà mkpuchi ahụ! Ọ bụ onye na-enyere draịva gwongworo ahụ aka.
N’elekere ise nke isi ụtụtụ, anyị kwụsịrị. N’ịbụ ndị anwụrụ ọkụ na-akwụpụ n’ụgbọ ala ahụ kunyesịworo ọrịa n’ahụ, ndị ntụ jupụtakwara n’ahụ, anyị rịpụtara. Otu nzebiri nke ala ekpochiwo ụzọ ahụ. N’ikpeazụ, mgbe awa anọ nke ịrụsi ọrụ ike gasịrị, onyenwe moto ahụ mere ka onye na-enyere ya aka kwọrọ moto ahụ gafee otu ibé ala dị warara nke ha kpochapụtaworo. Onyenwe moto ahụ ekweghị ọbụna ile anya mgbe ụgbọ ala ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-agafe, ụkwụ moto ahụ ndị dị ná mpụta ebe e nwere ụkwụ abụọ abụọ na-agbagharịkwa n’ikuku n’elu olulu ahụ yiri abyss nke na-enweghị nsọtụ nke dị n’akụkụ ụzọ ahụ. Mụ na Elaine ji ụkwụ gafeta. Ka anyị gara n’ihu na-eje Villamontes n’ime ụgbọ ala ahụ, ụzọ ndị ahụ gbagọrọ agbagọ ka agwọ ndị dị n’ụzọ ngabiga ahụ dị n’oké ugwu dị warara nke ukwuu nke na ọtụtụ ụgbọ, ọ dịrị mkpa ka onye draịva ahụ kwụsị, latụ azụ, wee gaakwa n’ihu ọzọ. N’ikpeazụ, mgbe 35 awa nke ike ọgwụgwụ gasịrị, anyị ruru ebe anyị na-eje.
Ọ bụụrụ mụ na Elaine ahụmahụ ọhụrụ ịnọ nanị anyị. Ihe ọzọ bụkwaara anyị ihe ọhụrụ bụ ụmụ ahụhụ ndị ahụ na-adị n’ebe okpomọkụ. Nnukwute ébé na-adakwasị anyị mgbe ha kụsịrị onwe ha n’ọkụ nke dị n’elu ụlọ ahụ. Ụmụ irighiri ijiji na-atakwa anyị ọtịta na-afụ ụfụ, na-agha anyị ọkọ ndị na-agbapụtasị mmiri n’ahụ. N’anyasị mbụ anyị nọrọ n’ebe obibi ọhụrụ anyị, apụrụ m èzí ije n’ụlọ mposi dị n’èzí. Ma mgbe m gbanwuru ọkụ tọọchị m, ala ahụ jupụtara n’ọchịcha. Ọtụtụ ngwere gbapụsịrị, nnukwute awọ ndị nọ n’ebe ahụ sikwa n’akụkụ ụlọ ahụ na-ele m anya. Ekpebiri m ka m cbere ruo ụtụtụ.
Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, anyị nọ n’akụkụ mmiri wee chọọ ka anyị jee zurutụ ike n’otu ogwè osisi anyị hụrụ n’ebe ahụ. Otú ọ dị, anyị kpebiri ka anyị burugodị ụzọ jee otu nletaghachi n’ebe dị nso. Mgbe anyị lọghachiri, ógwè osisi ahụ adịghịzi ya. Ndị na-agafe agafe ji oké mkpali gwa anyị na otu nnukwute’ agwọ nọbu n’ebe ahụ. Obi dị m ụtọ na anyị anwaghị ije nọdụ ala “n’ógwè osisi” ahụ!
Ihe kasị nye anyị ọṅụ na Villamontes bụ ije leta ndị mmadụ n’oge uhuruchi. Anyị na-ahụ ka ha nọ n’oche ndị a kpara akpa n’akụkụ ụzọ, jiri nke nta nke nta na-aṅụ otu ihe ọṅụṅụ e ji mkpọrọgwụ mee, nke a na-akpọ maté. Anyị tinyere ọtụtụ awa obi ụtọ n’ịkọwa nkwa dị iche iche nke Alaeze ahụ na gburugburu ebe ndị dị otú ahụ. Ma oge ihe isi ike bịara mgbe Elaine lụrụ dị, e wee ziga m Vallegrande, mụ na onye ọhụrụ mụ na ya ga-arụkọ ọrụ.
O Yiri Ógbè Wild West
Iji ruo Vallegrande, ọ dị mkpa ịga njem abalị atọ ọzọ na-agwụ ike, na nke ugbu a, ọ bụkwa nanị m so. 0 yiri nnọọ ka ụzọ ndị ahụ dị warara, ndị a na-edozighị edozi, enweghị nkwụsị n’ọzara ahụ. Emesịrị m rute ebe ahụ mgbe anyanwụ na-ada. Ụgbọ ala bọọsụ ahụ mebiri ịdị jụụ nke obodo ahụ ebe a na-ahụ ịnyịnya karịa otú a na-ahụ ụgbọ ala. Ndị mmadụ si n’okpuru mgbemgbe ihu ụlọ na-elepụta anya, bụ́ ndị na-atịpụta ọnụ n’okporo ụzọ ndị dị n’akụkụ ụlọ, ndị e jikwa osisi dụnyesịa. ụfọdụ n’ime ndị ikom ndị na-adabere n’osisi ndị ahụ yicha belt ndị a fanyesịrị égbè revolver na ha. 0 yiri ka mmadụ nile ha yicha uwe ojii. Echere m, sị: ‘Lee, ebe a yiri nnọọ ógbè wild west!’
Ọ dị nnọọ otú ahụ n’eziokwu. a na-eji égbè edozi esemokwu. Ọ bụ ezie na ọ bụ obodo nke nwere nanị puku mmadụ iri bi na ya, igbu ọchụ na ime ihe ike bụ ihe jupụtara ebe nile n’oge ahụ. Otu òtù ndị omekome na-emesi obodo ahụ ike, bụ́ nke weghaara ebe a na-akwụ ụgwọ okporo ụzọ nke dị n’ụzọ mbata nke obodo ahụ. Ndị nọ n’òtù ahụ na-enweta ihe ha na-eri site n’ịkwụsị bọọsụ ndị na-abata ma na-ezu ohi na ha. ha na-ezunarakwa ndị ọrụ ubi ihe mgbe ha na-ebubata ihe ha wetara n’ubi n’obodo ahụ. Ha na-atụgide ụmụ agbọghọ égbè wee dinaa ha n’ike n’ihu ndị mụrụ ha. Ndị bụ nne anaghị ekwe ọbụna ka ụmụ ha ndị nwanyị jee n’akụkụ ụlọ ije zụta ihe nanị ha.
Cheedị echiche ihe ga-adị anyị n’uche mgbe onyeisi òtù ndị omekome ahụ mabatara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ n’otu ụbọchị. Mmanya na-egbu ya. Onye nlekọta sekit, onye nọ na-ekwu okwu, chagharịrị n’ihi egwu. Onyeisi òtù ndị omekome ahụ tiri mkpu, sị, “Ekwerela m!” wee tisie aka ike n’otu benchi dị n’ebe ahụ nke na ọ gbajiri. 0 wee jide onye nlekọta sekit ahụ. ma na mberede, ahụ dajụrụ ya, otu enyi ya nke ya na ya gakọrọ ụlọ akwụkwọ, nke nọ n’ìgwè ndị na-ege ntị wee dupụ ya n’èzí.
Mgbe e mesịrị, otu onye ọchịagha chere ya ihe ịma aka n’ihu ka ọ bịa ka ha lụọ ọgụ. Onye ọchịagha ahụ kwụbara otu nkịta nwụrụ anwụ n’ụlọ ọha na eze dị n’ebe ahụ, wee kokwasị ya ihe odide nke na-asị: “Pụọ n’obodo a, ma ọ bụghị otú ahụ, otu ihe a ga-eme gị.” Onye omekome ahụ gbapụrụ, ọnọdụ wee dịtụ mma na vallegrande.
Mgbe ụfọdụ, anyị na-eji ịnyịnya gaa njem 12 awa iji jee mee nkwusa n’obodo nta ndị dịpụrụ adịpụ. Otu onye nkuzi nọ n’otu n’ime obodo nta ndị ahụ nabatara anyị nke ọma wee mesịa ghọọkwa otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’otu mgbe, agbaziiri m otu ịnyịnya ibu iji jee n’ebe ahụ, ma mgbe ọ bụla ọ gafere n’ihu ụlọ nke otu n’ime ndị nwebu ya, ọ na-abanye n’ebe ahụ, ha na-edurukwa anyị pụtaghachi n’okporo ụzọ.
Ihe Ịma Aka Dị Iche Iche—Ma M Ka Bụkwa Ọgaranya
Dị ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ, achọpụtawo m na ọ pụrụ ịbụ na ihe ịma aka kasị ukwuu abụghị okpomọkụ ma ọ bụ ụmụ ahụhụ ndị ahụ, oyi ma ọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke ala, ma ọ bụ ọbụna ọrịa na ịda ogbenye. Kama nke ahụ, ọ pụrụ ịbụ ndịrịta iche e nwere n’ụdịdị mmadụ. Echere m, sị, ‘N’ihi gịnị ka ihe isi ike ndị dị otú a ji na-ebilite n’ime nzukọ Jehova?’ Ọbụna na amalitere m ịrụ ụka ma Jehova ọ̀ nọkwa na-ezie jiri ngọzi na-eme m ọgaranya. Mgbe ahụ, m wee cheta akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ metụtara ngọzi Jehova, nke dị n’Ilu 10:22. Akụkụ nke abụọ nke amaokwu ahụ na-asị, “Ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” Ya mere, anyị ekwesịghị ịta Jehova ụta maka ihe isi ike ndị a. Aghọtara m na ndị a bụ akụkụ nke ihe Adam bufeere anyị, na ha sokwa n’ihe Pọl kọwara ná Ndị Rom 8:22: “Ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha.”
Mụ na Walter Meynberg onye nọ na Betel nke dị na Canada anọwo na-ederịta akwụkwọ, mgbe m gakwara ezumike na Canada na 1966, anyị lụrụ di na nwunye, e wee nyegharịa anyị ọrụ na La Paz, bụ́ obodo bụ isi nke Bolivia. Lee nnọọ ngọzi ọ bụwooro m ịhụ ọgbakọ ndị dị n’ebe a ka ha mụbara site na nanị otu n’oge m bịarutere na Bolivia ruo 24, n’akụkụ ọ bụla nke obodo ahụ. Otu ụdị ihe ahụ emewokwa n’obodo ndị ọzọ dị ná mba ahụ. N’eziokwu, ìgwè ahụ nke ihe dị ka 160 ndị nkwusa, ndị nọ na-ekwusa ozi ọma na Bolivia mgbe m bịarutere nke mbụ na 1955 etowo ruo ihe dị ka 7,000!
Ezi ihe atụ ahụ nne m kpebisiri ike isetịpụ n’ogologo oge gara aga emewo ka ihe karịrị mmadụ iri n’ime ezinụlọ anyị kpọmkwem nọrọ n’ozi oge nile ahụ. Enwere m obi ụtọ ikwu na nna m mesịrị ghọọ Onyeàmà raara onwe ya nye, ihe karịkwara 30 mmadụ ndị m nwere ihe ùgwù iduziri ọmụmụ Bible emewokwa baptism. Ọ̀ bụ na ihe ndị a abụghị ịba ọgaranya? Ee, ekwenyere m na ha bụ. N’eziokwu, ‘ngọzi Jehova—ọ bụ nke ahụ bụ ihe meworo m ọgaranya.’