Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w16 Disemba p. 29-31
  • Ịdị Nwayọọ n’Obi Ga-egosi na Ị Ma Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịdị Nwayọọ n’Obi Ga-egosi na Ị Ma Ihe
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE GOSIRI NA ONYE DỊ NWAYỌỌ N’OBI MA IHE
  • Lee Ka Ha Si Bụrụ Ndị Obi Ụtọ, Bụ́ Ndị Dị Nwayọọ n’Obi!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ịdị Nwayọọ—Olee Uru Ọ Na-abara Anyị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Olee Otú M Ga-esi Akwụsị Iwe Iwe Ọkụ?
    Teta!—2009
  • Yikwasịnụ Ịdị Nwayọọ Dị Ka Uwe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
w16 Disemba p. 29-31
Ebe onye ọrụ ya bụ ilekọta ndị agadi na-agwa otu nwaanyị iwe ji okwu

Ịdị Nwayọọ n’Obi Ga-egosi na Ị Ma Ihe

E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Antonia. Ọrụ ya bụ ilekọta ndị agadi. Otu ụbọchị, ọ kụrụ aka n’ụzọ, otu nwaanyị dị́ ihe dị ka afọ iri ise apụta bawara ya mba, na-akparị ya maka na o chere na ọ bịaghị n’oge ilekọta mama ya merela agadi. Nke bụ́ eziokwu bụ na Antonia bịara mgbe o kwesịrị ịbịa. Ma, o weturu obi rịọ nwaanyị ahụ mgbaghara maka na ọ ghọtaghị ihe merenụ.

MGBE Antonia bịara n’ụbọchị ọzọ, nwaanyị ahụ baara ya mba ọzọ. Gịnị ka Antonia mere? Ọ sịrị: “Ọ dịghịrị m mfe. O kwesịghị ịgwawa m okwu ọjọọ.” Ma, Antonia rịọkwara ya mgbaghara, gwa ya na ya ghọtara ahụhụ ọ na-ata.

A sị na ị bụ Antonia, gịnị ka ị gaara eme? Ị̀ gaara egosi na ị dị nwayọọ? Ọ̀ gaara esiri gị ike ijide onwe gị? Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ọ gaghị adịrị mmadụ mfe ijide onwe ya ma ụdị ihe a mee. Anyị chegbuwe onwe anyi ma ọ bụ a kpasuo anyị iwe, ọ naghị adị mfe ijide onwe anyị.

Ma, Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha na-adị nwayọọ n’obi. N’eziokwu, Okwu Chineke kwuru na onye dị nwayọọ n’obi nwere amamihe. Jems jụrụ, sị: “Ònye maara ihe ma nwee nghọta n’etiti unu? Ya jiri ịdị nwayọọ nke e ji mara amamihe gosi ọrụ ya site n’ime omume ọma.” (Jems 3:13) Olee otú onye dị nwayọọ n’obi si egosi na o nwere amamihe sí n’elu? Oleekwa ihe ga-enyere anyị aka ịmụta àgwà a dị́ Chineke mma?

IHE GOSIRI NA ONYE DỊ NWAYỌỌ N’OBI MA IHE

Ịdị nwayọọ n’obi nwere ike ime ka iwe dajụọ. Ilu 15:1 kwuru, sị: “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.”

Iwe nwere ike ime ka nsogbu ka njọ n’ihi na ọ ga-adị ka ịwụnye mmanụ n’ọkụ. (Ilu 26:21) Ma, ịdị nwayọọ n’obi na-emekarị ka iwe dajụọ. O nwedịrị ike ime ka obi jụrụ onye chọrọ ịlụso anyị ọgụ.

Antonia hụrụ ka ụdị ihe ahụ mere. Mgbe nwaanyị ahụ hụrụ otú Antonia si wetuo obi gwa ya okwu, ọ malitere ibe ákwá, kwuo na nsogbu zuru ya ahụ́, ma nsogbu nke ya ma nke ezinụlọ ya. Antonia ziri ya ozi ọma, malite ịmụrụ ya Baịbụl n’ihi na Antonia weturu obi ma gosi na ya bụ onye udo.

Ịdị nwayọọ n’obi nwere ike ime anyị obi ụtọ. Matiu 5:5 kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.”

Gịnị mere obi ji adị ndị dị nwayọọ n’obi ụtọ? E nwere ọtụtụ ndị na-ewebu iwe ọkụ, ma obi dịzi ha ụtọ n’ihi na ha adịla nwayọọ n’obi. Ndụ ha akala mma. Ha makwa na ha ga-enweta oge magburu onwe ya n’ọdịnihu. (Kọl. 3:12) Otu onye nlekọta sekit na Spen aha ya bụ Adolfo kọrọ otú ndụ ya dị tupu ya abata n’ọgbakọ.

Adolfo kwuru, sị: “Ndụ m enweghị isi na ọdụ. M na-ewekarị iwe ọkụ, nke mere ka ụfọdụ ndị enyi m na-atụ m ụjọ maka na m dị mpako, na-alụkwa ọgụ. Otu ihe mere ka ndụ m gbanwee. N’otu ọgụ anyị lụrụ, a mara m ọnụ mma isii, ya afọ obere ka ọbara gbagbuo m.”

Ma, ugbu a, Adolfo ji okwu ọnụ na omume ya na-akụziri ndị ọzọ ka ha na-adị nwayọọ n’obi. Àgwà ọma ya na-eme ka ọtụtụ ndị na-abịazi ya nso. Adolfo kwuru na obi dị ya ụtọ maka otú o si gbanwee. Ọ na-ekelekwa Jehova maka otú o si nyere ya aka ịna-adị nwayọọ n’obi.

Ịdị nwayọọ n’obi na-eme Jehova obi ụtọ. Ilu 27:11 kwuru, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.”

Ekwensu, bụ́ onyeisi ndị iro Jehova, na-akwa Jehova emo. Ụdị mkparị ahụ kwesịrị ime ka iwe na-ewe Chineke, ma Baịbụl gwara anyị na Jehova ‘adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.’ (Ọpụ. 34:6) Ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ iṅomi Chineke ma ghara ịna-ewe iwe ọsọ ọsọ, dịkwa nwayọọ n’obi, ọ pụtara na anyị na-eme ihe gosiri na anyị ma ihe, obi ga-adịkwa Jehova ezigbo ụtọ.—Efe. 5:1.

Ọtụtụ ndị kpọrọ ibe ha asị n’ụwa taa. Anyị nwere ike ịna-ahụ “ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, . . . ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike.” (2 Tim. 3:2, 3) Ma, ihe ndị a ekwesịghị ime ka Onye Kraịst ghara ịdị nwayọọ n’obi. Baịbụl gwara anyị na ‘amamihe nke si n’elu na-eme udo, nweekwa ezi uche.’ (Jems 3:17) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị udo, nweekwa ezi uche, anyị ga-eme ka ndị mmadụ ghọta na Chineke enyela anyị amamihe. Ụdị amamihe ahụ ga-eme ka anyị dịrị nwayọọ n’obi ma a kpasuo anyị iwe. Ọ ga-emekwa ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma. Ọ bụ ya na-enye amamihe kachanụ.

Otú Anyị Ga-esi Mụta Ịdị Nwayọọ n’Obi

Mmadụ mee gị ihe ọjọọ, gịnị ga-enyere gị aka ijide onwe gị ma kpaa àgwà ga-eme Jehova obi ụtọ? Ọ ga-adị mma ka i chebara ihe ndị a Baịbụl kwuru echiche.

  1. 1 ZERE “MMỤỌ NKE ỤWA.”—1 Kọr. 2:12. Ọtụtụ ndị chere na onye dị nwayọọ n’obi adịghị ike. Ha na-ekwu na onye dị ike bụ onye nwere olu ike na onye dị njikere ịlụ ọgụ. Onye na-eche otú ahụ nwere mmụọ nke ụwa, ọ bụghị amamihe sí n’elu. N’eziokwu, Baịbụl mere ka o doo anya na onye dị nwayọọ n’obi dị ezigbo ike. Ilu 25:15 kwuru, sị: “Ndidi ka a na-eji akpali ọchịagha ime ihe, ire dị nro pụkwara ịgbaji ọkpụkpụ.”

    Ajụjụ ndị ị ga-echebara echiche:

    M̀ weere onye dị nwayọọ n’obi ka onye dị ike ka ọ̀ bụ onye na-adịghị ike?

    M̀ na-agbalị ka m zere “ọrụ nke anụ ahụ́,” dị ka iwe ọkụ na esemokwu?—Gal. 5:19, 20.

  2. 2 WEPỤTA OGE NA-ATỤGHARỊ UCHE. Ilu 15:28 kwuru, sị: “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu, ma ọnụ ndị ajọ omume na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ.” Anyị kwuo okwu mgbe ezigbo iwe ji anyị, anyị nwere ike ikwu ihe anyị ga-emecha kwaa mmakwaara. Ma, ọ bụrụ na anyị echee echiche tupu anyị ekwuo ihe ọ bụla, anyị ga-enwe ike ijide onwe anyị, wetuo obi kwuo okwu, meekwa ka iwe onye nke ọzọ dajụọ.

    Ajụjụ ndị ị ga-echebara echiche:

    Olee nsogbu iwe iwe ọkụ ga-akpatara m?

    M̀ nwere ike ileghara ihe ọjọọ e mere m anya ka udo dị?—Ilu 19:11.

  3. 3 NA-EKPE EKPERE MGBE NIILE.

    Na-ekpe ekpere ka Chineke nye gị mmụọ nsọ, nke bụ́ ike kachanụ n’eluigwe na n’ụwa. (Luk 11:13) Cheta na ịdị nwayọọ na njide onwe onye so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Adolfo kwuru, sị: “Ikpere Jehova ekpere mgbe niile na-enyere m ezigbo aka, nke ka nke, ma ọ gbajuo dọrọ. Jehova ga-azakwa ekpere anyị ji obi anyị niile na-ekpe ka o nye anyị mmụọ nsọ ma ọ bụrụ na anyị ‘anọgidesie ike n’ekpere.’—Rom 12:12.

    Ajụjụ ndị ị ga-echebara echiche:

    M̀ na-ekpe ekpere mgbe niile ka Jehova nyochaa obi m na ihe m bu n’obi?

    M̀ na-arịọ ya ka o nye m mmụọ nsọ ya nakwa amamihe ga-enyere m aka ime ihe ga-adị ya mma?—Ọma 139:23, 24; Jems 1:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya