Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Onye dere Ilu 30:19 ò chere n’ezie na ụzọ nwoke na-esi eji aghụghọ enweta nwa agbọghọ “dị ebube nke ukwuu”?
Nke ahụ pụrụ ịbụ nkọwa nke Ilu 30:19, nke anyị kwere na ọ bụghị amaokwu dị mfe nghọta.
N’ịchọ echiche nke dị n’amaokwu nke a, anyị ekwesịghị ileghara ihe e kwuru na gburugburu ya anya. Kpọmkwem tupu akụkụ ihe odide nke a, onye ahụ ji ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ depụtara ihe anọ nke afọ na-adịghị eju n’ụzọ ụfọdụ. (Ilu 30:15, 16) Mgbe ahụ ọ haziri ihe ndepụta nke a: “Ihe atọ dị nke karịrị m ịghọta [“dị ebube nke ukwuu,” NW ], Ee, anọ nke m na-amaghị: ụzọ ugo n’eluigwe; ụzọ agwọ n’elu oké nkume; ụzọ ụgbọ n’etiti oké osimiri; na ụzọ nwoke n’ebe nwa agbọghọ nọ.”—Ilu 30:18, 19.
Gịnị pụrụ ịdịworị “ebube” n’ihe anọ ndị a?
Ma eleghị anya site n’iche na “ebube” aghaghị ịpụta ihe ziri ezi ma ọ bụ ihe dị mma, ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-akọwa na nke ọ bụla n’ime ihe anọ ndị ahụ na-egosipụta amamihe dị n’ihe ndị Chineke kere: ịdị ebube nke ụzọ nnukwu nnunu pụrụ isi na-efegharị, ụzọ agwọ na-enweghị ụkwụ pụrụ isi gafee n’elu nkume, ụzọ nnukwu ụgbọ mmiri pụrụ isi na-ese n’elu osimiri na-ebigbọ ebigbọ, na ụzọ onye ntorobịa ahụ dị mma pụrụ isi nwee ịhụnanya na-egbu ka mmanya ma lụọ nwa agbọghọ dị mma, mgbe ahụ ha wee mụta nwa mara mma bụ́ mmadụ. Otu onye prọfesọ chọpụtara ụzọ ọzọ ihe anọ ndị ahụ si yirịta, na nke ọ bụla na-aga n’ụzọ nke dị ọhụrụ kpam kpam—ije nke ugo, agwọ, na ụgbọ mmiri n’ebe ụzọ na-adịghị, na ịdị ọhụrụ nke ịhụnanya na-etolite n’etiti nwoke na nwanyị.
Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa na ihe anọ ndị ahụ ga-adị “ebube” n’echiche dị mma, dị ka à ga-asị na ihe ha nwekọrọ bụ ihe ziri ezi. Ilu 6:16-19 depụtara ‘ihe Jehova kpọrọ asị.’ Dịkwa ka a rịbara ama, kpọmkwem tupu amaokwu ndị ahụ a na-ekwu okwu ha, Ilu 30:15, 16 depụtara ihe (Sheol, nwanyị àgà, ala kpọrọ nkụ, na ọkụ) nke na-asịghị, ‘O zuwo!’ N’ezie ha adịghị ebube n’ụzọ dị mma.
Okwu Hibru nke a sụgharịrị ịbụ “ebube” n’Ilu 30:18 pụtara “ikewapụ, iwezụga iche, ime ka ọ dị iche, ịdị ịtụnanya, ebube.” Ihe pụrụ ịdị iche, ịtụnanya, bụrụkwa ihe dị ebube n’anya ma ghara ịbụ ihe dị mma. Daniel 8:23, 24 buru amụma banyere eze dị ike, bụ́ onye ga-akpata mbibi “n’ụzọ dị ebube,” “ọ ga-ebibikwa ndị nwere ume,” tinyere ndị nsọ.—Tụlee Deuterọnọmi 17:8; 28:59; Zekaraịa 8:6.
Amaokwu na-esote Ilu 30:18, 19 pụrụ inye aka ịkọwa ihe onye ahụ dere ya chọpụtara dị ka ihe siri ike nghọta. Amaokwu nke 20 hotara otu nwanyị na-akwa iko bụ́ onye ‘riworo ihe ma hichaa ọnụ ya wee sị, Emeghị m ajọ ihe ọ bụla.’ Ma eleghị anya, o mewo mmehie ná nzuzo na n’ụzọ aghụghọ, ma ebe ọ bụ na a chọpụtaghị imempụ ya, ọ pụrụ ịzọrọ na aka ya dị ọcha.
E nwere myirịta dị n’ihe ndepụta ahụ bu ụzọ. Ugo na-efegharị n’eluigwe, agwọ na-agafe n’elu nkume, ụgbọ mmiri na-agabiga ebili mmiri—ọ dịghị nke ọ bụla na-ahapụ akara, ọ ga-esikwa ike ịchọpụta ụzọ nke nke ọ bụla n’ime ha si gafee. Ọ bụrụ na nke a bụ ihe myirịta dị n’etiti ha atọ, gịnị banyere nke anọ, “ụzọ nwoke n’ebe nwa agbọghọ nọ”?
Nke a pụkwara ịbụ nke a na-apụghị ịchọpụta n’otu aka ahụ. Nwa okorobịa pụrụ iji ụzọ nrafu, ụzọ dị nro, na ụzọ aghụghọ nweta ịhụnanya nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. N’ịbụ onye na-enweghị ahụmahụ, o nwere ike ọ gaghị achọpụta aghụghọ ya. Ọbụna mgbe a rafusịrị ya, ọ pụrụ iri ya ọnụ ụzọ o si nweta ya; ọ pụkwara isiri ndị na-ahụ ihe na-emenụ ike ịkọwa otú o si mee. Ma, ọtụtụ ụmụ agbọghọ atụfuwo ùgwù ha n’aka ndị nrafu na-aghọ aghụghọ. O siri ike ịchọpụta ụzọ nke ndị ikom dị otú ahụ na-aghọ aghụghọ, ma ha nwere ihe mgbaru ọsọ, dị ka ugo na-efe efe, agwọ na-arị arị, ma ọ bụ ụgbọ mmiri nọ n’oké osimiri, nwere. N’ebe ndị nrafu nọ, nzube ha bụ isoro ndị ọzọ nwee mmekọahụ n’ụzọ na-ezighị ezi.
Ná nghọta nke a, isi ihe dị n’Ilu 30:18, 19 abụghị banyere nkà mmụta sayensị ma ọ bụ nkanụzụ e nwere n’ihe ndị e kere eke. Kama nke ahụ, akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ na-enye anyị ịdọ aka ná ntị nke omume ọma, dị nnọọ ka Ilu 7:1-27 na-adọ aka ná ntị banyere izere ihe ize ndụ nke nwanyị akwụna na-adọrọ mmasị. Otu ụzọ onye Kraịst pụrụ isi ṅaa ntị nke ọma na ndụmọdụ ahụ dị n’Ilu 30:18, 19 bụ n’ebe ihe banyere ndị ikom na-ekwu na ha nwere mmasị n’ịmụ Bible. Ọ bụrụ na nwoke nke nwere omume enyi, ọbụna onye ọrụ ibe gị, eyie ka ọ na-egosi mmasị, nwanna nwanyị kwesịrị ịgwa ya ka ọ gakwuru nwanna nwoke n’ọgbakọ. Nwanna nwoke ahụ pụrụ imezu mmasị ọ bụla ziri ezi n’enweghị ihe ize ndụ nke “ụzọ nwoke n’ebe nwa agbọghọ nọ.”