Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 12/15 p. 30
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Werenụ Amara Na-agbaghara Onwe Unu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ị Pụrụ Irite Nwanna Gị n’Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Chineke nke “Dị Njikere Ịgbaghara Mmehie”
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 12/15 p. 30

Ị̀ Na-echeta?

Ì jiriwo nlezianya chebara mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche echiche? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-ahụ ya dị ka ihe na-adọrọ mmasị icheta ihe ndị na-esonụ:

◻ Olee ụfọdụ ajụjụ ndị Kraịst abụọ pụrụ ịjụ onwe ha tupu ha amalite iche echiche ikwe nkwa ọlụlụ?

‘Èji m ọnọdụ ime mmụọ nke onye nke ọzọ na nrubeisi ya nye Chineke n’aka n’ezie? Àpụrụ m iche echiche mụ na onye ahụ ijekọrọ Chineke ozi ọnụ ná ndụ m nile? Ànyị amatawo àgwà ibe anyị nke ọma? Obi ò siri m ike na anyị ga na-ekwekọ n’ụzọ na-adịgide adịgide? Ànyị maara omume ndị gara aga nke ibe anyị na ọnọdụ ndị anyị nọ na ha ugbu a nke ọma?’—8/15, peji nke 31.

◻ Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ gwara ụmụazụ ya, sị: “Unu onwe unu bụ nnu nke ụwa”? (Matiu 5:13)

Jisọs na-enye echiche na ụmụazụ ya ikwusara ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke ga-enwe mmetụta na-echekwa echekwa, ma ọ bụ nke na-echebe ndụ, n’ahụ ndị na-ege ha ntị. N’ezie, a ga-echebe ndị tinyere okwu Jisọs n’ọrụ pụọ ná nretọ nke omume na nke ime mmụọ e nwere n’ụwa.—8/15, peji nke 32.

◻ Olee otú mmadụ abụọ na-eme mbedo pụrụ isi zere ọnyà nke mmekọahụ rụrụ arụ?

Ọ bụrụ na unu na-eme mkpapụ, ị ga-abụ onye nwere amamihe izere ime ka nanị gị na onye ị na-achọ ịlụ nọrọ n’ọnọdụ ndị na-ekwesịghị ekwesị. Ọ kasị mma inwe mkpakọrịta unu abụọ n’ebe ìgwè mmadụ nọ ma ọ bụ n’ebe ndị na-ezoghị ezo. Kpaaranụ ngosipụta nke mmetụta ịhụnanya ókè, onye nke ọ bụla ana-akwanyere mmetụta na akọ na uche nke onye nke ọzọ ùgwù.—9/1, peji nke 17, 18.

◻ Gịnị bụ nghọta?

Nghọta bụ ikike nke ileba anya n’okwu ma ghọta ihe ndị mejupụtara ya site n’ịghọta njikọ ndị e nwere n’akụkụ ya nile na okwu ahụ n’ozuzu ya, si otú a na-aghọta ya nke ọma. (Ilu 4:1)—9/15, peji nke 13.

◻ Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka anyị taa?

N’ụzọ bụ́ isi, ihe Jehova na-achọ n’aka anyị bụ ige Ọkpara Ya ntị ma gbasoo ihe nlereanya na ozizi ya. (Matiu 16:24; 1 Pita 2:21)—9/15, peji nke 22.

◻ Nanị ole ndị pụrụ inwe udo?

Ebe Jehova bụ “Chineke nke udo,” ọ bụ nanị ndị hụrụ Chineke n’anya ma nwee nkwanye ùgwù miri emi n’ebe ụkpụrụ ezi omume ya dị pụrụ inwe udo. (Ndị Rom 15:33)—10/1, peji nke 11.

◻ Olee otú Josef si nweta ikike nke ime omume ọma iji sị nwunye Pọtịfa ee e kwa ụbọchị?

Josef ji mmekọrịta ya na Jehova kpọrọ nnọọ ihe karịa ka o ji ihe ụtọ na-adịru nwa oge kpọrọ. Ọzọkwa, ọ bụ ezie na ọ nọghị n’okpuru usoro iwu sitere n’aka Chineke, Josef ghọtara ụkpụrụ omume ọma n’ụzọ doro anya. (Jenesis 39:9)—10/1, peji nke 29.

◻ Olee otú anyị ịdị njikere ịgbaghara ụmụnna anyị dịruru ná mkpa?

Atụmanya anyị ịnọgide na-enweta mgbaghara Chineke dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’anyị ịdị njikere ịgbaghara ndị ọzọ. (Matiu 6:12, 14; Luk 11:4)—10/15, peji nke 17.

◻ Ụdị mmehie ndị dị aṅaa ka Matiu 18:15-17 na-ekwu banyere ha, oleekwa ihe na-egosi nke ahụ?

Mmehie ndị Jisọs bu n’uche jọgburu nnọọ onwe ha nke na ha pụrụ iduga n’ile onye mmehie ahụ anya dị “ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ.” Ndị Juu agaghị esoro ndị Jentaịl mekọọ ihe, ha zekwaara ndị ọna ụtụ. Ya mere, Matiu 18:15-17 na-ezo aka ná mmehie ndị dị oké njọ, ọ bụghị mmejọ ma ọ bụ ihe mwute nkịtị mmadụ mere gị bụ́ ndị ị pụrụ nnọọ ịgbaghara ma chefuo. (Matiu 18:21, 22)—10/15, peji nke 19.

◻ Gịnị ka ịhụ Okwu Chineke n’anya n’ezie gụnyere?

Ịhụ Okwu Chineke n’anya na-eduga mmadụ n’ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ndị ọ chọrọ n’aka ya. (Abụ Ọma 119:97, 101, 105) Nke a na-achọ mmadụ ime mgbanwe mgbe nile n’echiche na n’ụzọ ndụ ya.—11/1, peji nke 14.

◻ N’ịbụ ndị nwetaworo ihe dị nnọọ ukwuu n’aka Jehova, gịnị ka anyị pụrụ inyeghachi Eze kasị ukwuu na Onye kasị enye ihe?

Bible na-ekpughe na onyinye kasị mma anyị pụrụ inye Jehova bụ “àjà, bụ́ otuto.” (Ndị Hibru 13:15) N’ihi gịnị? N’ihi na àjà a metụtara nzọpụta ndụ kpọmkwem, bụ́ isi ihe Jehova nwere mmasị na ya na mgbe ọgwụgwụ a. (Ezikiel 18:23)—11/1, peji nke 21.

◻ Gịnị ka Solomọn bu n’uche mgbe o dere, sị: “Okwu nile nke ndị ha maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi”? (Eklisiastis 12:11)

Okwu nke ndị nwere amamihe Chineke na-akpali ndị na-agụ ma ọ bụ na-ege ha inwe ọganihu n’ụzọ kwekọrọ n’okwu amamihe ahụ ha gụrụ ma ọ bụ nụ.—11/15, peji nke 21.

◻ Gịnị bụ mmata nke kwekọrọ n’ụzọ nke Chineke?

Ọ bụ ikike nke ịma ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ na ịhọrọzi ụzọ ziri ezi. Ịmụ na itinye Okwu Chineke n’ọrụ na-enye mmata.—11/15, peji nke 25.

◻ Gịnị ka e kwesịrị ime ka ya na ịdị njikere ịnakwere ibu ọrụ na-agakọ? (2 Timoti 3:1)

E kwesịrị ime ka nke a na ezi uche na-agakọ. Ọ dịghị onye kwesịrị iweghara ọrụ dị nnọọ ọtụtụ nke na ọ dịghị enwezi ọṅụ n’ozi Jehova. Mmụọ afọ ofufo dị mma, ma ịdị njikere ime ihe aghaghị igosipụtakwa imeru ihe n’ókè na “uche zuru okè.” (Taịtọs 2:12; Mkpughe 3:15, 16)—12/1, peji nke 28.

◻ Olee otú a pụrụ isi merie ihe ịma aka nke ịzụ ụmụ?

Chineke na-enye ndị mụrụ ụmụ ndụmọdụ ịbụ ndị nlereanya, ndị ibe, ndị na-enwe nkwurịta okwu, na ndị nkụzi. (Deuterọnọmi 6:6, 7)—12/1, peji nke 32.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya