Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 1/8 p. 22-24
  • Ọrụ Gị Ọ̀ Na-agwụ Gị Ike?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrụ Gị Ọ̀ Na-agwụ Gị Ike?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Mee Ihe
  • Mee Ike Gị Nile
  • ‘Chọọ Ọrụ Gị Mma’
  • Nọgide Na-amụ Ihe
  • Aro Ikpeazụ Ụfọdụ
  • “Nwee Olileanya n’Ebe Jehova Nọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Nwoke Kwesịrị Nṅomi nke Nakweere Mgbazi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Job Toro Aha Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Job
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 1/8 p. 22-24

Ọrụ Gị Ọ̀ Na-agwụ Gị Ike?

O YIRI ka ị na-arụ ọrụ ihe dị ka hour asatọ kwa ụbọchị. Nke ahụ bụ oge na ndụ buru oké ibu ịchụ n’àjà nye ike ọgwụgwụ! Ma, ọtụtụ ọrụ na narị afọ nke 20 bụ ndị a na-arụ n’otu ụzọ ma na-enye onye na-arụ ọrụ obere ihe ọ ga-enwe afọ ojuju onwe onye na ya.

Ya mere ị ga-erite ọtụtụ uru site n’ime ka ọrụ gị na-akpali mmasị. Ị ga-enweta ọṅụ ka ukwuu n’ịrụ ọrụ, ị ga-amụtakwa isi ihe ị ga-eme ka ọrụ ọ bụla ị ga-arụ n’ọdịnihu ka mma. Mgbe ahụ, ka anyị chọpụta ụzọ ụfọdụ e si emezu nke a.

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Mee Ihe

Ụfọdụ ndị ọkachamara na-atụ aro ka ị rụọ ọrụ gị ka a ga-asị na ọ na-atọ gị ụtọ. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, àgwà ahụ pụrụ nnọọ isochi.

‘Ma apụghị m inwe ịnụ ọkụ n’obi n’ọrụ m ma ọlị!’ ka ị pụrụ ịzaghachi. Ọrụ gị pụrụ ịgụnye otu usoro ime ihe mgbe nile, dị ka ọrụ usoro mmepụta ihe. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ị rụwo ọrụ gị ruo nnọọ ọtụtụ afọ nke na i chere na ọ gaghị ekwe omume ime ka mmasị gị na ya dịghachi ọhụrụ. Otú ọ dị, usoro ndị dị mfe ndị dị ka ịmụmụ ọnụ ọchị na iguzo kwem pụrụ inyere gị aka inwekwu ịnụ ọkụ n’obi n’ọrụ gị.

Ọ pụkwara inye aka ma ọ bụrụ na i lekwasị anya kpam kpam n’ihe ị na-eme. Abụla onye ọrụ ya na-adịghị esi n’uche, arụkwala ọrụ gị ka ị na-eche maka oge nri ehihie, ngwụsị izu, ma ọ bụ ọbụna ọrụ ọzọ a ga-arụ. Ọ na-abụkarị ihe amamihe itinye uche kpam kpam n’ọrụ e ji n’aka. Gịnị ga-esi na ya pụta? Ị pụrụ ịbịa nwee ọṅụ n’ọrụ ahụ, mgbe ahụkwa oge ga-eyi ka ọ na-aga ngwa ngwa.

Nke a bụ ihe na-emekarị mgbe i mikpuru onwe gị n’ihe omume ị hụrụ n’anya n’ezie. Ị pụrụ inweta otu mmetụta ahụ site n’ịmanye onwe gị itinye uche zuru ezu n’ọrụ ị na-adịghị enwekarị ọṅụ na ya.

Mee Ike Gị Nile

Ime ike gị nile pụrụ inyere gị aka inweta afọ ojuju n’ọrụ gị. Otú ọ dị, echiche dị otú ahụ na-emegide echiche zuru ebe nile bụ na mgbe ị hụrụ na ọrụ ahụ adịghị akpali mmasị, i kwesịrị iji mgbalị dịkarịsịrị nta mee ihe. Ma nlelị anya, iyigharị ihe, na mgbalị dị ala yiri ka ha ga-ebelata ume gị ma gbakwụnyere gị nchegbu na ike ọgwụgwụ. N’ọnọdụ ụfọdụ onye na-enwe nrụgide, nchegbu, na ike ọgwụgwụ ka o si ọrụ lọta yiri ka ọ na-ata ahụhụ n’ihi ejighị ịdị uchu rụọ ọrụ.

Dị ka Bible si kwuo, ịrụsi ọrụ ike na-emedị ka oge ntụrụndụ dịkwuo ụtọ. “Ọ dịghị ezi ihe dị n’ime mmadụ nke na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-emekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ezi ihe n’ime ndọgbu nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ.” (Eklisiastis 2:24) Nye ụfọdụ, nke a pụrụ ịda ka ụkpụrụ nduzi oge ya gafeworo, ma ndị ọzọ na-etinye ụkpụrụ a oge ya na-adịghị agafe agafe n’ọrụ. Ha kwetara, n’ezie, na “ọ dịghị ezi ihe” karịrị na ha kwesịrị ịnụ ụtọ nke ihe si ná ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ pụta. Akwụkwọ bụ́ The Joy of Working na-ekweta, sị: “Ọrụ a rụrụ nke ọma na-akpata mmetụta siri ike nke afọ ojuju ime obi.”

Ya mere, rụọ ọrụ kasịnụ ị pụrụ ịrụ, ma eleghị anya ị ga-enweta ume. Mee ihe karịrị nanị ihe kasị nnọọ nta, ị pụkwara nnọọ inwekwu obi ụtọ. Buru ụzọ rụọ ọrụ ndị dị mkpa, ị ga-anụkwa ụtọ nke oge nkwụsịtụ maka nri ehihie na ngwụsị izu karịa onye na-emenye onwe ya ike ọgwụgwụ site n’iyigharị ihe.—Tụlee Esta 10:2; Ndị Rom 12:11; 2 Timoti 2:15.

Kama iso ndị ọzọ na-asọrịta mpi, gbalịa mee karịa otú ị tụrụ anya ya n’onwe gị. (Ndị Galetia 6:4) Setịpụ ụkpụrụ ndị ọhụrụ, ihe mgbaru ọsọ ndị ọhụrụ. Gbaa mbọ ime nke ọma karị. Otu nwanyị, onye ọrụ ya gụnyere ịkwa otu ụdị ákwà ugboro ugboro nke ụfọdụ ga-ele anya dị ka nke na-agwụ ike nke olileanya na-adịghị na ya, mere ka ọ ghọọ ihe egwuregwu site n’ịdị na-enye onwe ya oge. Ọ na-agụ ihe ndị ọ na-arụpụta site na hour ruo na hour, mgbe ahụkwa ọ gbalịrị ịmụba ha. Ọ na-enwe ọṅụ n’ezie n’ọrụ ya n’ihi na ọ na-agba mbọ ịrụ ọrụ ike ya nile.—Ilu 31:31.

‘Chọọ Ọrụ Gị Mma’

Ndị dọkịta bụ́ Dennis T. Jaffe na Cynthia D. Scott na-atụ aro, sị: “Lee ọrụ gị anya dị ka ụlọ na-enweghị ihe dị n’ime ya. I wee kwaba ma lee ọdịdị na otú e si wuo ya anya. Mgbe ahụ a kpalie nkà nchepụta ihe gị. I dokwaa otú ebe ahụ ga-adị, otú ị ga-esi chọọ ụlọ ahụ mma ma mee ka ụlọ ahụ ghọọ ebe obibi gị. I mee ya nke gị site n’idozi ya otú i si chọọ.”

Ihe ka n’ọtụtụ ọrụ ndị a na-enye gị na-enwe ndepụta nke ụkpụrụ nduzi. Ime nanị ihe a tụrụ anya ya yiri ibichi ụlọ tọgbọ chakoo. E nweghị ihe ọ bụla ga-egosi ụdị onye ị bụ. Ma ọ bụrụ na ị gbakwụnye ụdị ịrụ ọrụ nke onwe gị, ọrụ gị pụrụ ịghọ nke na-akpalikwu mmasị nke ukwuu. Ọ dịghị mmadụ abụọ ọ bụla ‘ga-achọ otu ọrụ mma’ n’otu ụzọ ahụ. Otu onye na-eke nri ga-ebu nri ndị ọ na-eresị nri mgbe nile na-achọ n’isi. Onye ọzọ ga-enwe nnọọ obiọma na àgwà ọma. Ha abụọ na-enwe ọṅụ n’ọrụ ha n’ihi na ha na-etinye onwe ha n’ihe ha na-eme.

Nọgide Na-amụ Ihe

Ụzọ ọzọ e si achọta ọṅụ n’ọrụ bụ site n’ịmụta ihe. Akwụkwọ bụ́ Tension Turnaround na-akọwa na ka anyị na-eto, ụbụrụ anyị na-amụba ikike ya iwepụta ihe ọmụma. Nke a na-akọwa ihe mere na ihe ndị mere anyị obi ụtọ n’oge gara aga na-agwụ anyị ike ugbu a. Ngwọta ya bụ imeju agụụ ụbụrụ maka ihe ọmụma ọhụrụ site n’ịmụta ihe ọhụrụ.

Ịmụtakwu banyere ọrụ gị ka oge na-aga pụrụ ime ka e nye gị ọrụ na-adọrọwanye mmasị. Ma ọ bụrụgodị na nke ahụ emeghị, usoro ịmụ ihe n’onwe ya ga-eme ka ọrụ gị na-akpali mmasị ma na-eju afọ karị. Ndị na-ede akwụkwọ bụ́ Charles Cameron na Suzanne Elusorr na-eme ka ọ pụta ìhè, sị: “Ọ bụghị nanị na ịmụ ihe na-amụba obi ike gị site n’ịmụba ikike gị, ọ na-emetụkwa àgwà gị n’ebe ndụ dị n’ozuzu ya: na a pụrụ idozi nsogbu, a pụrụ imeri ihe isi ike, a pụrụ ibelata ụjọ, nakwa na ihe ka ukwuu pụrụ ikwe omume karịa ka i chere.”

‘Ma,’ ka ị pụrụ ịgbagha, ‘amụtara m ihe nile m kwesịrị ịmụta banyere ọrụ m ogologo oge gara aga!’ Ọ bụrụ otú ahụ, ị̀ pụrụ ịmụ ihe ndị na-emetụtachaghị ọrụ gị? Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ikpebi ịmụtakwu banyere mmekọrịta ụmụ mmadụ ma ọ bụ banyere ngwá ọrụ gị. Ikekwe ị pụrụ ịmụ otú e si ede akwụkwọ nzirịta ozi n’ọfịs n’ụzọ ka mma ma ọ bụ otú e si eduzi nzukọ n’ụzọ ka mma. Ị pụrụ ịmụ ụzọ kasị irè isi mesoo ndị nlekọta ọrụ.

Olee otú ị ga-esi mụta ihe ndị a? Ọ pụrụ ịbụ na ụlọ ọrụ gị na-enye ihe ọmụmụ nke ị nọ n’ọnọdụ irite uru na ya. Ma ọ bụ ọ́bá akwụkwọ pụrụ nnọọ inwe akwụkwọ ndị dị gị mkpa. Ma elegharala ebe ndị e si enweta ihe ọmụma na-apụtachaghị ìhè anya. Ikiri ndị mmadụ nọ n’ọrụ ma na-arịba ama ume na adịghị ike ha pụrụ ịbụ ihe mmụta. Ị pụrụ ịmụta ihe site n’ihie ụzọ gị, ma ị pụkwara ịmụta ihe site n’ihe ịga nke ọma gị, site n’ịtụle ihe i mere nke ọma. Ihe ị mụtara site n’ahụmahụ nke gị na site n’ikiri ndị ọzọ pụrụ ịkụziri gị ihe ọ na-adịghị mgbe ị ga-agụta ya n’akwụkwọ ma ọ bụ nụta na klas.

Aro Ikpeazụ Ụfọdụ

E nwere ụzọ ọzọ ị pụrụ isi lee ọrụ gị anya. Ị pụrụ ikpebi na i kwesịrị inweta ihe ndị ka mma—na ndị ọzọ na-enweta ohere nile dị mma dapụtara nakwa na e nyetụbeghị gị ohere ịrụ ọrụ nke ị chọrọ ịrụ n’ezie. Gị na ndị ọzọ kwenyeere gị pụrụ ịkparịta ụka n’akwụsịghị akwụsị, ị pụrụ ikwenyesi ike na ihe a nile bụ eziokwu.

Ma e nwere ike ọ bụghị eziokwu. Ọtụtụ ndị na-enwe ọṅụ n’ọrụ ha amụtawo ime otú ahụ. Onye na-enwe ọṅụ n’ise ụkpụrụ ụlọ pụrụ inwekwa ọṅụ n’ịnya bọs. N’ihi gịnị? N’ihi na iji nkà nchepụta ya mee ihe n’ọrụ ahụ na-enye ya ọṅụ na afọ ojuju.

Ya mere wepụ n’ime onwe gị echiche na-adịghị mma nke na-eme ka ụbọchị ọrụ n’ime izu gbaa ọchịchịrị n’ụzọ dị iche ná ngwụsị izu. Egbula oge ịtụleghachiwe ọdịda gị ndị gara aga, ichewe ihe ọzọ ga-emebinụ, ma na-echegbu onwe gị banyere ihe ndị ọzọ na-eche maka gị. Lee ọrụ dị gị n’ihu anya. Nye ya uche gị zuru ezu. Gbalịa ka i mikpuo onwe gị na ya dị ka ị ga-eme n’ihe omume ntụrụndụ kasị amasị gị. Gbalịa ike gị nile, ma nweta ọṅụ n’ọrụ a rụrụ nke ọma.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]

Elelịla Ọrụ Gị

Bible n’Ilu 27:23, 24 na-ekwu, sị: “Mara ihu ìgwè ewu na atụrụ gị nke ọma, tụkwasị obi gị n’ìgwè anụ ụlọ gị nile: n’ihi na ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka akụ̀ dị; okpueze kwa, ọ̀ na-adịru ọgbọ nile?” Gịnị ka nke ahụ pụtara?

Ọ pụtara na akụ̀ na ụba (akụ̀ dị oké ọnụ ahịa) na ọkwá ịbụ onye a ma ama (okpueze), ma ọ bụrụ na e nwetadị ha enweta, na-adịrukarị nwa oge. N’ihi ya, onye ọzụzụ atụrụ n’oge Bible na-egosi amamihe ma ọ bụrụ na o jiri ịdị uchu lekọta atụrụ ya anya, ya bụ, ‘tụkwasị obi ya n’ìgwè anụ ụlọ ya nile.’ Dị ka amaokwu atọ ndị na-esochi na-egosi, ihe ga-esi na ya pụta bụ nchebe n’ụzọ ihe onwunwe maka onye ọrụ ahụ na ezinụlọ ya.—Ilu 27:25-27.

Gịnị banyere taa? Ndị mmadụ na-atụkwasịkarị obi ha n’inweta akụ̀ ma ọ bụ ọkwá na-ewu ewu, bụ́ nke ha nwere olileanya na ọ ga-eme ka ha kwụsị ọrụ ndị ha na-arụ ugbu a. Ụfọdụ nwere atụmatụ a pụrụ imezu; ndị ọzọ na-arọ nanị nrọ. N’ọnọdụ nke ọ bụla, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya ileda ma ọ bụ ilelị ọrụ mmadụ na-arụ ugbu a anya. Ọ bụ, ọ pụkwara ịnọgide na-abụ, ebe kasịnụ a pụrụ ịdabere maka inweta ego. Ọ bụ nnọọ ihe amamihe karị mmadụ ịtụkwasị obi ya ‘n’ìgwè anụ ụlọ ya nile,’ na-elekwasị anya n’ụzọ zuru ezu n’ebe ọrụ ya a pụrụ ịdabere na ya dị. Ya ime otú ahụ yiri ka ọ ga-arụpụta nchebe n’ụzọ ihe onwunwe ugbu a na n’ọdịnihu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya