Ihe Jisọs Bụ Ugbu A
Ọ BỤ ezie na otú Jisọs dị n’ile anya na-akpali mmasị, ọ dị mkpa karị ịmata ihe ọ bụ ugbu a na ebe ọ nọ. Olee òkè ọ na-ekere ná nzube Chineke banyere ezinụlọ ụmụ mmadụ?
Akụkọ ihe mere eme ụwa apụghị inye anyị azịza ha. A pụrụ ịchọta ha nanị n’ihe odide Chineke dere maka abamuru nke ndị na-achọ eziokwu. Nke ahụ bụkwa Bible Nsọ, ma ọ bụ Akwụkwọ Nsọ, bụ́ mpịakọta a kasị kesaa n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa.
Bible abụghị nnọọ akwụkwọ ọzọ ụmụ mmadụ dere. Ọ bụ ezie na o ji ụmụ mmadụ dee ya, ọ bụ Chineke bụ onye dere ya n’ezie: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.
Pọl onyeozi matara ihe Akwụkwọ Nsọ bụ, n’ihi na o dere, sị: “Mgbe unu natara okwu nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, bụ́ okwu nke Chineke, ọ bụghị okwu mmadụ ka unu naara nke ọma, kama, otú ọ dị n’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.
Chineke bụ Onye Okike kasị ike nke kere eluigwe na ụwa, ya na ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando ya na ọtụtụ ijeri kpakpando dị n’ime ụyọkọ kpakpando nke ọ bụla. Lee ike dị egwu o nwere iji nwee ike kee ihe a nile! N’ezie Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, onye mere eluigwe na ụwa dị ịtụnanya, pụrụ ide akwụkwọ nke ga-abụrụ onye ọ bụla na-achọ eziokwu ihe nduzi a pụrụ ịdabere na ya.
Ihe Bible Na-ekwu
Okwu Chineke na-ekpughe ọtụtụ nchepụta na ịkọ nkọ banyere Jisọs. Rịba ama ụfọdụ n’ime nkọwa sara mbara ọ na-enye anyị banyere ya:
• Jisọs bụ onye mbụ na nanị onye Chineke kere n’onwe ya n’eluigwe ọtụtụ narị afọ gara aga, tupu e kee ndị mmụọ ozi na eluigwe na ụwa nkịtị. Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ ya “Ọkpara [Chineke] mụrụ nanị Ya.” E kere ihe ndị ọzọ nile site n’aka Ọkpara a, bụ́ “onye ọkà” nke Chineke, tupu ọ ghọọ mmadụ.—Jọn 3:16; 6:38; 8:58; Ilu 8:30; Ndị Kọlọsi 1:16.
• Ihe dị ka afọ 2,000 gara aga, Chineke bufere ndụ Jisọs n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ onye Juu, ka a mụọ ya dị ka mmadụ. Ọbụna ugbu a, site n’usoro nke iji ụzọ aka mere etinye mwụsị ahụ n’ime akpa nwa, ụmụ mmadụ pụrụ ime ihe yitetụwara ya.—Matiu 1:18; Jọn 1:14.
• Jisọs abụghị nanị ezi mmadụ efu. Mgbe o toruru ogo mmadụ o gosipụtara n’ụzọ zuru okè àgwà ịhụnanya, ọmịiko, ezi omume nke Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke.—Jọn 14:9, 10; Ndị Hibru 1:3; 1 Jọn 4:7-11, 20, 21.
• Dị ka onye nnọchiteanya Chineke n’elu ala, Jisọs gboro mkpa ndị ogbenye na nke ndị a na-emegbu emegbu, ma ọ kpaghị ókè megide ndị aka ji akụ̀. Site ná nkwado nke mmụọ nsọ dị ike nke Chineke, Jisọs gwọrọ ndị ọrịa, ọbụnakwa kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ n’ụzọ ọrụ ebube. Site n’ịrụ ụdị ọrụ ndị ahụ magburu onwe ha, o gosiri n’ụzọ dị ntakịrị ihe ọ ga-eme n’ụwa nile mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe, ọ ghọọkwa Eze nke Alaeze eluigwe nke Chineke.—Matiu 11:4-6; Luk 7:11-17; Jọn 11:5-45.
• Alaeze eluigwe ahụ nke Chineke bụ ihe Jisọs kụziere ụmụazụ ya ka ha na-ekpe ekpere maka ya na ibute ya ụzọ ná ndụ ha. Mgbe e guzobesịrị ya n’ụzọ zuru ezu, “ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [ndị dị taa] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” Mgbe ahụ, Alaeze ahụ ga-abụ nanị ọchịchị ga na-achị ụwa. Ọ bụ nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ahụhụ.—Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10.
• Chineke bụ Nna Jisọs, Jisọs kwesịkwara ntụkwasị obi nye Chineke. N’ihi ya, mgbe e gburu Jisọs, ọ bụ nwoke zuru okè. O ji obi ya nye Chineke ndụ ya zuru okè ka ọ bụrụ àjà mgbapụta iji gbataghachi ihe Adam tụfuru mgbe o nupụụrụ Chineke isi. Site n’ime otú ahụ, Jisọs megheere ndị nile ga-enwe okwukwe n’ebe ọ nọ ụzọ ịdị ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16; Ndị Rom 3:23, 24; 1 Jọn 2:2.
• Dị ka Eze eluigwe Chineke họpụtara, Jisọs ga-emezu nzube Chineke bụ́ iwepụ ajọ omume n’ụwa na ime ka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi zuo okè n’uche na n’anụ ahụ. Mgbe ahụ ihe a kpọrọ mmadụ ga-ebi n’udo na n’obi ụtọ n’ime ụwa paradaịs, na-enwe ezigbo ụlọ na ụbara ihe oriri maka mmadụ nile. A ga-ewepụ ọrịa, iru újú, na ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. A ga-akpọlite ọbụna ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ha enweekwa ohere nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala.—Jenesis 1:26-28; 2:8; Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Ilu 2:21, 22; Aịsaịa 25:6; 65:21-23; Luk 23:43; Ọrụ 24:15; Mkpughe 21:3, 4.
Ya mere, Bible na-agwa anyị n’ụzọ doro anya na Jisọs bụ onye bụ́ isi ná nzube Chineke iguzobe ụwa ọhụrụ nke ezi omume n’elu ala ebe a. N’ihi òkè dị mkpa ọ na-ekere, Jisọs pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ: ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na Mụ.”—Jọn 14:6; 2 Pita 3:13.
Onye Ọchịchị Nwere Ọmịiko
Ndị dị umeala n’obi chọrọ ka Jisọs bụrụ onye ọchịchị ha n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, leekwa ụdị onye ọchịchị dị iche, nke na-enye obi ụtọ ọ ga-abụ! Otu ụzọ o si gosipụta nke a bụ site n’ọrụ dị ịtụnanya nke ịgwọ ọrịa bụ́ ndị ọ rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa. (Matiu 15:30, 31) Ma, rịbakwa ama ụdị onye ọchịchị ọ ga-abụ.
Buru ụzọ tụlee ihe ndekọ e nwere banyere ndị ọchịchị ụwa a. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na kemgbe ọtụtụ afọ, ọtụtụ mgbe ha abụwo ndị afọ tara mmiri na ndị obi kpọrọ nkụ, na-eduba ndị obodo ha n’ọtụtụ agha, arụrụala, njụta okpukpe, na mgbuchapụ. E gbuwo ihe karịrị nnọọ 100 nde mmadụ n’agha na narị afọ nke 20 a nanị.
Jiri àgwà na ihe ndekọ e nwere banyere ndị ọchịchị ụwa a tụnyere àgwà na ihe ndekọ e nwere banyere Jisọs n’otú o si mesoo ndị ogbenye, ndị e wedara n’ala, ndị na-enweghị ike: “Mgbe Ọ hụrụ ìgwè mmadụ nile, O nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” Ya mere ọ sịrị ha: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 9:36; 11:28-30.
Lee ka Jisọs si nwee ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ! O ṅomiri Nna ya nke eluigwe na nke a. Jisọs bụ ịhụnanya n’onwe ya, ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha nwee ezi ịhụnanya nke dabeere n’ụkpụrụ n’ebe ibe ha nọ. N’ụzọ dị otú a ha agaghị ekwe ka agbụrụ, mba, ọnọdụ akụ̀ na ụba, okpukpe mbụ, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ gbochie ịdị n’otu ha zuru ụwa ọnụ. (Jọn 13:34, 35; Ọrụ 10:34, 35) N’ezie, Jisọs hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu nke na o nyere ndụ ya n’ihi ha. (Ndị Efesọs 5:25) Ọ bụ ụdị onye ọchịchị dị ụwa a mkpa, nke ọ ga-enwetakwa.
Jisọs Bụ Eze ‘Mara Mma’ Ugbu A
Okwu amụma Chineke na-enyere anyị aka ịghọta na Jisọs bụ Eze eluigwe dị ike ugbu a. Onye ọbụ abụ buru amụma banyere ya, sị: “E mewo gị ka ị maa mma karịa ụmụ mmadụ. . . . N’ịma mma gị nọkwasị n’elu ịnyịnya gaa nke ọma, n’ihi eziokwu na umeala n’obi na ezi omume . . . Ị hụwo ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị: n’ihi nke a Chineke, bụ́ Chineke gị, tere gị mmanụ obi ụtọ n’isi.”—Abụ Ọma 45:2, 4, 7.
Dị ka Eze eluigwe nke Chineke tere mmanụ, e nyere Jisọs ikike ịmalite ọrụ iji gosipụta ịhụnanya ya maka ezi omume na ịkpọasị ya maka mmebi iwu. N’ihi ya, a kọwara ya n’ime Bible dị ka onye mmeri na-adịghị anwụ anwụ, “Eze kachasị ndị eze nile,” onye ga-egbuchapụ ndị iro Chineke nile n’isi nso. Ọzọkwa, ọ ga-eme ka ụwa nweghachi ọnọdụ paradaịs ma mee ka ihe a kpọrọ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta zuo okè.—Mkpughe 19:11-16.
Ọrụ ọhụrụ Jisọs agaghị abụ nke ‘Mesaịa na-ata ahụhụ,’ onye a na-akwa emo, na-eti ihe, onye ndị na-emegide ya gbukwara. Kama nke ahụ, ọrụ ọhụrụ ya bụ nke “Chineke Nke bụ Dike,” onye ọchịchị ụwa. (Aịsaịa 9:6) Nke a abụghị akụkọ obi ụtọ nye ihe ka ukwuu ná ndị ọchịchị bụ́ mmadụ, n’ihi a ga-etipịa alaeze ha kpam kpam n’oge na-adịghị anya dị ka Daniel 2:44 na-ebu n’amụma. N’iji Kraịst mere onye na-emezu ihe ọ chọrọ, Chineke ‘ga-amapu ndị eze n’ụbọchị iwe Ya. Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti mba nile.’—Abụ Ọma 110:5, 6.
Aịsaịa buru amụma na n’ime nke a, Kraịst “[ga-emekwa ka ọtụtụ mba kụja, NW]; n’ihi ya ka ndị eze ga-ekpuchi ọnụ ha.” N’ihi gịnị? “N’ihi na ihe nke [ndị okpukpe ha na-akọrọ izu nzuzo ha] na-akọghị nye ha ka ha hụworo; ọ bụkwa ihe nke ha na-ahụghị ka ha ghọtaworo.”—Aịsaịa 52:14.
‘Iwere Oké Ifufe Dị Ka Ihe Ubi’
Aịsaịa na-ebu amụma banyere mgbahapụ nke ndị ndú okpukpe ga-amara ụma gbahapụ ọrụ ha. Dị ka ihe atụ, ha adịghị akụzi eziokwu Bible kama ha na-akụziri ìgwè atụrụ ha ozizi ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị banyere mmekpa ahụ ebighị ebi n’ime hel na-ere ọkụ, atọ n’ime otu, na anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi—ndị sitechara n’aka ndị na-ekpere arụsị. Ndị ụkọchukwu akwadowokwa agha nile nke mba ha, ọbụna mgbe ọ pụtara igbu ndị so n’okpukpe ha. Nke a bụ imebi iwu Chineke kpọmkwem.—1 Jọn 2:3, 4; 3:10-12; 4:8, 20, 21.
Ọzọkwa, ndị ụkọchukwu na-enye ìgwè atụrụ ha ihe ndị na-adọrọ anya, ma bụrụ ihe ndị na-abaghị uru n’anya Chineke, dị ka ihe oyiyi okpukpe, uwe ndị ụkọchukwu, katidral ndị furu oké ego, na ihe osise ndị jupụtara n’echiche nke ndị na-ekpere arụsị, gụnyere ìhè dị gburugburu n’isi chi anyanwụ. Nke a bụ n’agbanyeghị iwu Chineke nyere ndị ohu ya: “Wezụganụ onwe unu, wezụganụ onwe unu, sinụ n’ebe ahụ pụọ, unu emetụla ihe rụrụ arụ . . . , unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke Jehova.”—Aịsaịa 52:11; 2 Ndị Kọrint 6:14-18.
Ndị na-azọrọ na ha na-anọchite anya Chineke ma na-emebi iwu ya, na-akụzikwara ndị ọzọ ime otú ahụ, ga-aghọta mkpụrụ ha kụrụ. A ga-ama ha ikpe, ha ga-atakwa ahụhụ ya mgbe e bibiri usoro ihe a. Dị ka Hosea onye amụma si kwuo, “ha aghawo ifufe, ha ga-ewetakwa oké ifufe dị ka ihe ubi.”—Hosea 8:7, King James Version; leekwa Mkpughe 17:1-3, 15, 16.
Ndị Nwere Obi Eziokwu Na-amụta Eziokwu
Echiche na-ezighị ezi ndị ụkọchukwu na-enye banyere Chineke na Jisọs agaghị egbochi ndị nwere obi eziokwu ịmụta ihe bụ́ eziokwu banyere Jisọs. Na narị afọ mbụ, o gbochighị ha, n’ihi na dị ka Paul Barnett na-ede n’akwụkwọ bụ́ The Two Faces of Jesus, “Kraịst abụghị onye a na-amaghị ọkwa ya nke si nnọọ n’eluigwe danye n’akụkọ ihe mere eme.” Ee, laa azụ n’oge ahụ, amụma Bible ‘mara ọkwa’ banyere Mesaịa ahụ n’ụzọ ziri ezi, na-enye ndị na-eso ụzọ ya na-eguzosi ike n’ihe ihe nnwapụta banyere ọbịbịa ya. Taa e nwere ihe àmà dị nnọọ ukwuu karị nke na-ama ọkwa eziokwu ahụ bụ́ na Chineke enyewo Jisọs ike ịchị dị ka “Eze kachasị ndị eze nile,” onye dị ebube n’eluigwe.—Matiu 24:3-13; 2 Timoti 3:1-5, 13.
N’ezie, “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe [nke Chineke, na-enwe Kraịst dị ka onye ọchịchị ya] n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị karịrị nnọọ nde ise n’ọnụ ọgụgụ n’ụwa nile, na-eme nke ahụ. Ya mere ndị chọrọ ịmata ezigbo Jisọs ahụ pụrụ ime otú ahụ n’ezie. (Jọn 10:14; 1 Jọn 5:20) Ịmatakwa na irubere ya isi dị mkpa iji dịrị ndụ gafere ‘oké mkpagbu’ ahụ ga-ezu ụwa nile n’isi nso.—Mkpughe 7:9-14; Jọn 17:3; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10.
Ya mere, Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka inyocha nkọwa na-adọrọ adọrọ nke Bible banyere Ọkpara Chineke.
[Foto dị na peeji nke 9]
Kraịst n’ike Alaeze ga-ekpochapụ mmebi iwu
[Foto dị na peeji nke 10]
N’okpuru ọchịchị ịhụnanya Kraịst, ụwa a ga-aghọ paradaịs