Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 9/15 p. 15-20
  • Were Dị Ka Ihe Ilereanya Ndị Amụma Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Were Dị Ka Ihe Ilereanya Ndị Amụma Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Hụjuru Anya
  • Ha Nwere Ndidi
  • “Otú A Ka Ha Mere”
  • Ha Nwere Àgwà Ziri Ezi
  • Isi Iyi Dị Iche Iche nke Agbamume
  • Ịnụ Ọkụ n’Obi na Àgwà Nchere
  • Inwe Ndidi Taa
  • Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • “Kpọsaanụ n’Etiti Mba Dị Iche Iche”
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Ṅomie Ndidi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Emọs Onye Amụma
    Ozi Alaeze Anyi—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 9/15 p. 15-20

Were Dị Ka Ihe Ilereanya Ndị Amụma Chineke

“Ụmụnna m, natanụ ndị amụma ahụ, bụ́ ndị kwuru okwu n’aha Onyenwe anyị, dị ka ihe ilereanya nke ịhụju anya na nke ogologo ntachi obi.”​—⁠JEMES 5:10.

1. Gịnị na-enyere ndị ohu Jehova aka inwe ọṅụ ọbụna mgbe a na-akpagbu ha?

NDỊ ohu Jehova na-egbukepụ n’ọṅụ n’agbanyeghị enweghị olileanya zuru ụwa nile na mgbe ikpeazụ ndị a. Ọ dị otú a n’ihi na ha maara na ha na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ. Ndịàmà nke Jehova na-atachikwa obi n’okpuru mkpagbu na mmegide nye ozi ihu ọha ha n’ihi na ha ghọtara na ha na-ata ahụhụ n’ihi ezi omume. Jisọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ngọzi na-adịrị unu mgbe ọ bụla ha na-ata unu ụta, na-esogbukwa unu, na-ekwukwa ajọ ihe nile dị iche iche megide unu n’okwu ụgha, n’ihi m. Ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọọkwa unu ụtọ nke ukwuu: n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe: n’ihi na otú a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.” (Matiu 5:​10-⁠12) N’ezie, mgbe ọ bụla ndị ohu Chineke na-eche ule dị iche iche nke okwukwe ihu, ha na-agụ ndị a dị ka ihe ọṅụ.​—⁠Jemes 1:​2, 3.

2. Dị ka Jemes 5:10 si kwuo, gịnị pụrụ inyere anyị aka inwe ndidi?

2 Jemes onye na-eso ụzọ dere, sị: “Ụmụnna m, natanụ ndị amụma ahụ, bụ́ ndị kwuru okwu n’aha Onyenwe anyị, dị ka ihe ilereanya nke ịhụju anya na nke ogologo ntachi obi.” (Jemes 5:10) W. F. Arndt na F. W. Gingrich na-akọwa okwu Grik ahụ a sụgharịrị ebe a ịbụ “ihe ilereanya” (hy·poʹdeig·ma) dị ka “ihe atụ, ihe a ga-eṅomi, ihe ilereanya, n’echiche dị mma dị ka ih[e] nke na-akpali ma ọ bụ kwesịrị ịkpali mmadụ iṅomi ya.” Dị ka e gosiri na Jọn 13:35, “nke a abụghị nanị ihe atụ. Ọ bụ kpọmkwem ihe a ga-esi na ya lere anya.” (Theological Dictionary of the New Testament) Ya mere, ndị ohu Jehova nke oge a pụrụ iwere ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi dị ka ihe ilereanya n’ihe banyere “ịhụju anya” na ‘inwe ogologo ntachi obi.’ Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ iji uche ghọta mgbe anyị na-amụ banyere ndụ ha? Oleekwa ụzọ nke a pụrụ isi nyere anyị aka n’ọrụ ime nkwusa anyị?

Ha Hụjuru Anya

3, 4. Olee otú Emọs onye amụma si meghachi omume ná mmegide sitere n’aka Amazaịa?

3 Ndị amụma Jehova hụjuru anya ma ọ bụ nweta mmeso ọjọọ ọtụtụ mgbe. Dị ka ihe atụ, na narị afọ nke itoolu T.O.A., onye nchụàjà ahụ nke na-efe nwa ehi bụ́ Amazaịa ji obi ọjọọ megide Emọs onye amụma. Amazaịa zọọrọ n’ụzọ na-abụghị eziokwu na Emọs gbara izu megide Jeroboam nke Abụọ site n’ibu amụma na eze ahụ ga-anwụ site ná mma agha nakwa na Israel ga-eje biri n’ala ọzọ. N’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù Amazaịa gwara Emọs, sị: “Gị onye ọhụ ụzọ, jee, gbalaga n’ala Juda, rie nri n’ebe ahụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ị ga-ebu amụma: ma ebukwala amụma ọzọ n’ime Betel: n’ihi na ebe nsọ nke eze ka ọ bụ; ọzọ, ụlọ alaeze ka ọ bụ.” N’abụghị onye a kụdara aka site ná mwakwasị okwu ọnụ nke a, Emọs zara, sị: “Ọ dịghị onye amụma m bụ, ọ dịghịkwa nwa onye amụma m bụ; kama onye nche ehi ka m bụ, ya na onye na-edozi mkpụrụ osisi sycomore: Jehova wee wepụ m n’iso ìgwè ewu na atụrụ, O wee sị m, bụ́ Jehova, Jee, buoro ndị m, bụ́ Israel, amụma.”​—⁠Emọs 7:​10-⁠15.

4 Mmụọ Jehova nyere Emọs ike iji obi ike buo amụma. Cheedị ihe bụ mmeghachi omume nke Amazaịa ka Emọs sịrị: “Nụrụ okwu Jehova: Gị onwe gị na-asị, Ebula amụma megide Israel, abụsakwala okwu gị dị ka mmiri ozuzo megide ụlọ Aịsak: n’ihi nke a ka Jehova sịrị otú a: Nwunye gị ga na-akwa iko n’obodo, ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom ga-adakwa site ná mma agha, a ga-ejikwa eriri kesaa ala gị; gị onwe gị ga-anwụkwa n’ala rụrụ arụ, a ghaghị imekwa ka Israel si n’ala ya jee biri n’ala ọzọ.” Amụma ahụ mezuru. (Emọs 7:​16, 17) Lee ka ọ na-aghaghị isiworị mee ka Amazaịa si n’ezi ofufe dapụ maa jijiji!

5. Myirịta dị aṅaa ka a pụrụ ịhụ n’ọnọdụ ndị ohu Jehova nke oge a na nke Emọs onye amụma?

5 Nke a yiri ọnọdụ ndị Jehova taa. Anyị na-ahụju anya dị ka ndị na-ekwupụta ozi dị iche iche nke Chineke, ọtụtụ ndị na-ekwukwa okwu n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù banyere ọrụ nkwusa anyị. N’eziokwu, ikike anyị nwere ime nkwusa esiteghị n’ụlọ akwụkwọ ọkà mmụta okpukpe. Kama, mmụọ nsọ Jehova na-akpali anyị ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Anyị adịghị agbanwe ma ọ bụ agwagbu ozi Chineke. Kama nke ahụ, dị ka Emọs, anyị ji nrubeisi na-ekwusa ya n’agbanyeghị mmeghachi omume nke ndị na-ege anyị ntị.​—⁠2 Ndị Kọrint 2:​15-⁠17.

Ha Nwere Ndidi

6, 7. (a) Gịnị ka e ji mara ibu amụma nke Aịsaịa? (b) Olee otú ndị ohu Jehova nke oge a si eme omume dị ka Aịsaịa?

6 Ndị amụma Chineke nwere ndidi. Dị ka ihe atụ, Aịsaịa, onye jere ozi dị ka onye amụma Jehova na narị afọ nke asatọ T.O.A., gosipụtara ndidi, Chineke gwara ya, sị: “Jee, sị ndị nke a, Na-anụnụ, ma unu aghọtala; na-ahụnụ, ma unu amatala. Mee ka obi ndị nke a maa abụba, meekwa ka ntị ha dị arọ, techiekwa anya ha; ka ha ghara iwere anya ha hụ ụzọ, gharakwa iwere ntị ha nụ ihe, gharakwa iwere obi ha ghọta, gharakwa ichigharị, ka a gharakwa ime ka ahụ dị ha ike.” (Aịsaịa 6:​9, 10) Ndị ahụ meghachiri omume otú ahụ n’ezie. Ma nke a ò mere ka Aịsaịa kwụsị? Ee e. Kama nke ahụ, o ji ndidi na ịnụ ọkụ n’obi kwupụta ozi ịdọ aka ná ntị nke Jehova. Ọdịdị asụsụ Hibru nke okwu ndị ahụ Chineke kwuru ndị a ka hotasịrị na-akwado echiche nke “nnọgide ruo ogologo oge” nke nkwusa nke onye amụma ahụ, nke ndị mmadụ nụrụ “ugboro ugboro.”​—⁠Gesenius’ Hebrew Grammar.

7 Taa, ọtụtụ na-emeghachi omume n’ebe ozi ọma ahụ dị, dị nnọọ ka ndị mmadụ si meghachi omume n’okwu Jehova ndị Aịsaịa kwuru. Otú ọ dị, dị ka onye amụma ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, anyị na-ekwughachi ozi Alaeze ahụ “ugboro ugboro.” Anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi na nnọgide nke ndidi eme otú ahụ n’ihi na nke a bụ uche Jehova.

“Otú A Ka Ha Mere”

8, 9. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka onye amụma Jehova bụ́ Mosis si bụrụ ihe nlereanya ọma?

8 Mosis onye amụma bụ ihe nlereanya n’inwe ndidi na nrubeisi. Ọ họọrọ iso ụmụ Israel nọ n’ohu guzokọọ, ma ọ ghaghị iji ndidi chere ruo oge mgbapụta ha. O biri ruo 40 afọ na Midian ruo mgbe Chineke ji ya mee ihe idupụta ndị Israel n’ịbụ ohu. Mgbe Mosis na nwanne ya nwoke bụ Erọn nọ n’ihu onye ọchịchị Ijipt, ha ji nrubeisi kwuo ma mee ihe Chineke nyere n’iwu. N’ezie, “otú a ka ha mere.”​—⁠Ọpụpụ 7:​1-⁠6; Ndị Hibru 11:​24-⁠29.

9 Mosis ji ndidi tachie obi na 40 afọ siri ike nke Israel nọrọ n’ime ọzara. O jikwa nrubeisi gbasoo nduzi Chineke n’owuwu nke ụlọ ntu Israel na ime ihe ndị ọzọ e ji mee ihe n’ofufe Jehova. Onye amụma ahụ gbasochiri ntụziaka Chineke anya nke na anyị na-agụ: “Mosis wee mee ya: dị ka ihe nile si dị nke Jehova nyere ya n’iwu, otú a ka o mere.” (Ọpụpụ 40:16) N’iso nzukọ Jehova na-eje ozi anyị, ka anyị cheta nrubeisi Mosis ma jiri ndụmọdụ Pọl onyeozi mee ihe ‘ikwenyere ndị isi anyị.’​—⁠Ndị Hibru 13:17.

Ha Nwere Àgwà Ziri Ezi

10, 11. (a) Gịnị na-egosi na Hosea onye amụma nwere echiche ziri ezi? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe echiche ziri ezi mgbe anyị na-ejekwuru ndị mmadụ n’ókèala anyị?

10 Ọ dị ndị amụma mkpa inwe àgwà ziri ezi ka ha na-ezi ozi ikpe dị iche iche tinyere amụma ndị na-egosipụta nchegbu ịhụnanya nke Chineke maka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi gbasasịrị agbasasị n’Israel. Nke a bụ eziokwu banyere Hosea, onye bụ́ onye amụma ruo ihe na-adịghị ala karịa 59 afọ. N’ụzọ doro anya, ọ nọgidere na-ezi ozi Jehova, jirikwa okwu ndị a mechie akwụkwọ amụma ya: “Ònye bụ onye amamihe? ọ ga-aghọtakwa ihe ndị a; ònye bụ onye nghọta? ọ ga-amakwa ha. N’ihi na ụzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndị ezi omume ga-ejekwa ije n’ime ha; ma ndị njehie ga-asụ ngọngọ n’ime ha.” (Hosea 14:9) Ruo ogologo oge Jehova kwere ka anyị na-agba àmà, ka anyị nwee àgwà ziri ezi ma nọgide na-achọ ndị ga-eji amamihe nakwere obi ọma Chineke nke na-erughịrị ha.

11 Iji ‘chọpụta ndị kwesịrị ekwesị,’ ọ dị anyị mkpa ịnọgidesi ike ma na-ele ihe anya n’ụzọ ziri ezi. (Matiu 10:11) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na igodi anyị efunahụ anyị, anyị pụrụ ịchọrọ ha gaghachi n’ụzọ anyị si gaa ma chọọ n’ebe ndị anyị jegasịrị. Anyị pụrụ ịchọta ha nanị mgbe anyị mesịworo nke a ugboro ugboro. N’otu aka ahụ ka anyị nọgide n’ịchọpụta ndị yiri atụrụ. Lee ọṅụ anyị na-enwe mgbe ha zaghachiri n’ozi ọma ahụ n’ókèala a na-arụchi ọrụ anya na ya! Leekwa ka anyị si aṅụrị ọṅụ na Chineke na-agọzi ọrụ anyị n’ala ebe mmachibido iwu kpabuuru ozi ihu ọha anyị ókè!​—⁠Ndị Galetia 6:10.

Isi Iyi Dị Iche Iche nke Agbamume

12. Amụma dị aṅaa nke Joel na-enwe mmezu nke narị afọ nke 20, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

12 Okwu nke ndị amụma Jehova pụrụ ịbụrụ anyị oké agbamume n’ozi anyị. Dị ka ihe atụ, tụlee amụma Joel. O nwere ozi ikpe nke a gwara ndị Israel si n’ezi ofufe dapụ na ndị ọzọ na narị afọ nke itoolu T.O.A. Ma, a kpaliri Joel ibu amụma, sị: “Ọ ga-erukwa ma e mesịa, na M [Jehova] ga-awụsa Mmụọ m n’ahụ anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ; ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma, ndị okenye unu ga-arọ nrọ, ụmụ okorobịa unu ga-ahụ ọhụụ: ee, ọbụna n’ahụ ndị ohu ndị ikom na n’ahụ ndị inyom na-eje ozi ka M ga-awụsa Mmụọ m na mgbe ahụ.” (Joel 2:​28, 29) Nke a bụ eziokwu banyere ndị na-eso ụzọ Jisọs malite na Pentikọst 33 O.A. gaa n’ihu. Leekwa aha mmezu dị ebube nke amụma nke a nke anyị na-ahụ na narị afọ nke 20 nke a bụ! Taa anyị nwere ọtụtụ nde ndị ‘na-ebu amụma,’ ma ọ bụ na-ekwusa ozi Jehova​—⁠e nwere ihe karịrị nnọọ 600,000 ndị nọ n’ozi ọsụ ụzọ oge nile n’etiti ha.

13, 14. Gịnị pụrụ inyere ndị Kraịst na-eto eto aka ịchọta ọṅụ n’ozi ubi?

13 Ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze bụ ndị na-eto eto. Ọ naghị adịrị ha mfe mgbe nile ịgwa ndị ka ha mee okenye banyere Bible. Mgbe ụfọdụ a na-agwa ndị ohu Jehova bụ ndị ntorobịa, sị: ‘Ị na-etufu oge gị na-eme nkwusa,’ na ‘i kwesịrị ịdị na-eme ihe ọzọ dị iche.’ N’ụzọ akọ Ndịàmà na-eto eto nke Jehova pụrụ ịzaghachi na o wutere ha na onye ahụ na-eche otú ahụ. Otu onye na-ekwusa ozi ọma nke bụ́ onye ntorobịa na-ahụ ya dị ka ihe na-enye aka ịgbakwụnye, sị: “Ana m eche na m na-erite uru site n’ịgwa ndị ka m mee okenye, dị ka gị, okwu, ọ na-amasị m.” Otú ọ dị, ikwusa ozi ọma abụghị n’ezie ịtụfu oge. Ndụ nọ n’ihe ize ndụ. Site n’ọnụ Joel, Chineke gara n’ihu kwuo, sị: “Ọ ga-erukwa, na onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.”​—⁠Joel 2:32.

14 Ụmụaka ndị na-esonyere ndị mụrụ ha n’ọrụ ime nkwusa Alaeze na-anabata enyemaka ndị mụrụ ha n’isetịpụ ihe mgbaru ọsọ onwe onye dị iche iche. Nke nta nke nta ndị ntorobịa dị otú ahụ na-aga n’ihu site n’ịgụ akwụkwọ nsọ ruo n’ịkọwa olileanya ha dabeere na Bible na inyefe ndị nwere mmasị akwụkwọ ndị kwesịrị ekwesị. Ka ha na-ahụ ọganihu nke onwe ha na ngọzi Jehova, ndị nkwusa Alaeze bụ́ ndị na-eto eto na-achọta oké ọṅụ n’ikwusa ozi ọma ahụ.​—⁠Abụ Ọma 110:3; 148:12, 13.

Ịnụ Ọkụ n’Obi na Àgwà Nchere

15. Olee otú ihe nlereanya nke Ezikiel pụrụ isi nye aka ịkpalighachi ịnụ ọkụ n’obi anyị maka ọrụ nkwusa Alaeze?

15 Ndị amụma Chineke bụkwa ihe nlereanya n’igosipụta ma ịnụ ọkụ n’obi ma àgwà nchere​—⁠àgwà ndị dị anyị mkpa taa n’ozi anyị. Mgbe mbụ anyị mụtara eziokwu sitere n’Okwu Chineke, o yiri ka obi anyị jupụtara n’ịnụ ọkụ n’obi nke kwaliri anyị iji obi ike kwuwapụ okwu. Ma ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ afọ agafewo kemgbe ahụ, ọ pụkwara ịbụ na anyị arụzuwo ókèala anyị na-agba àmà ọtụtụ ugboro. Ọ pụrụ ịbụ ndị mmadụ dị ala karị na-anakwere ozi Alaeze ahụ ugbu a. Nke a ò belatawo ịnụ ọkụ n’obi anyị? Ya bụrụ otú ahụ, tụlee banyere Ezikiel onye amụma, onye aha ya pụtara “Chineke Na-enye Ume.” Ọ bụ ezie na Ezikiel chere ndị obi kpọrọ nkụ́ ihu n’Israel oge ochie, Chineke nyere ya ume ma mee ka egedege ihu ya sie ike karị nkume adamant n’ụzọ ihe atụ. Otú a, Ezikiel nwere ike ije ozi ya ruo ọtụtụ afọ ma ndị ahụ hà gere ntị ma ọ bụ na ha egeghị. Ihe nlereanya ya na-egosi na anyị pụrụ ime otu ihe ahụ, ọ pụkwara inyere anyị aka ịkpalighachi ịnụ ọkụ n’obi anyị maka ọrụ ime nkwusa.​—⁠Ezikiel 3:8, 9; 2 Timoti 4:5.

16. Àgwà dị aṅaa nke Maịka ka anyị kwesịrị ịzụlite?

16 Onye e kwesịrị ịrịba ama n’ihi inwe ndidi ya bụ Maịka, bụ́ onye buru amụma na narị afọ nke asatọ T.O.A. “Mụ onwe m,” ka o dere, “n’ime Jehova ka m ga-eche nche nke ọma; M ga-echere Chineke nke nzọpụta m: Chineke m ga-anụ olu m.” (Maịka 7:7) Obi ike Maịka gbanyere mkpọrọgwụ n’okwukwe ya siri ike. Dị ka onye amụma bụ́ Aịsaịa, Maịka maara na Jehova ga-emerịrị ihe O zubere. Anyị makwaara nke a. (Aịsaịa 55:11) Ya mere ka anyị zụlite àgwà inwe nchere n’ebe mmezu nke nkwa dị iche iche nke Chineke dị. Ka anyị jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ, ọbụna n’ógbè ndị mmadụ na-egosi ntakịrị mmasị n’ozi Alaeze ahụ.​—⁠Taịtọs 2:14; Jemes 5:​7-⁠10.

Inwe Ndidi Taa

17, 18. Ihe atụ oge ochie na nke ọgbara ọhụrụ dịgasị aṅaa pụrụ inyere anyị aka inwe ndidi?

17 Ụfọdụ n’ime ndị amụma Jehova ji ndidi nọgide n’ọrụ ha ruo ọtụtụ afọ ma ha ahụghị mmezu nke amụma ndị ha buru. Ma, ha iji ndidi nọgidesie ike, ọtụtụ mgbe ka ha nọ na-ahụju anya, na-enyere anyị aka ịmata na anyị pụrụ ijezu ozi anyị. Anyị pụkwara irite uru site n’ihe nlereanya nke ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi n’afọ iri ndị mbụ nke narị afọ nke 20. Ọ bụ ezie na ha enwetaghị olileanya eluigwe ha ngwa ngwa dị ka ha tụrụ anya ya, ha ekweghị ka ndakpọ olileanya n’ihi ihe yiri igbu oge mee ka ịnụ ọkụ n’obi ha nwere maka ime uche Chineke dị ka o kpughere ya nye ha belata.

18 Ruo ọtụtụ afọ, ọtụtụ n’ime ndị Kraịst ndị a kesara Ụlọ Nche na akwụkwọ ya na ya na-agakọ, bụ́ Teta!, (nke a na-akpọbu The Golden Age e mesịakwa Consolation) n’ụzọ chiri anya. Ha ji ịnụ ọkụ n’obi mee ka akwụkwọ ndị a bara uru ruo ndị mmadụ aka n’okporo amá nakwa n’ebe obibi ha n’ihe anyị na-akpọ taa ndị a na-enyezu magazin. Ngwa ngwa, ndị na-agafe n’ụzọ bụ́ ndị ọ mawooro ahụ ịdị na-ahụ otu nwanna nwanyị meworo agadi nke jesịworo ozi elu ala ya ka ọ na-agba àmà n’okporo amá apụkwaghị ịhụ ya ọzọ. Lee àmà ọ gbara n’ime ọtụtụ afọ nke ije ozi ikwesị ntụkwasị obi ya dị ka okwu ọma nke ndị hụworo ozi ihu ọha ya na-egosi! Dị ka onye nkwusa Alaeze, ị̀ na-etinyechi Ụlọ Nche na Teta! anya n’aka ndị ị na-ezute n’ozi gị?

19. Agbamume dị aṅaa ka Ndị Hibru 6:​10-⁠12 na-enye anyị?

19 Tụleekwa banyere ndidi na ozi ikwesị ntụkwasị obi nke ụmụnna ndị na-eje ozi dị ka ndị òtù nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ n’ime ha nọ ugbu a n’iri afọ itoolu ma ọ bụ otu narị nke ndụ ha ma ha ka bụ ndị nkwusa Alaeze ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-elekọta ọrụ e kenyere ha. (Ndị Hibru 13:7) Gịnịkwa banyere ndị agadi ndị ọzọ nwere olileanya eluigwe na ọbụna ụfọdụ n’etiti “atụrụ ọzọ” ahụ ndị na-eme agadi? (Jọn 10:16) Ha pụrụ ijide n’aka na Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ ha na ịhụnanya ha gosiri n’ebe aha ya dị. Tinyere ndị kwere ekwe ibe ha ndị ọzọ ndị na-akatabeghị ahụ, ka Ndịàmà nile meworo agadi nke Jehova nọgide n’ime ihe ha nwere ike ime, na-enwe okwukwe ma na-egosipụta ndidi n’ozi Chineke. (Ndị Hibru 6:​10-⁠12) Mgbe ahụ, ma ọ bụ site ná mbilite n’ọnwụ, dị ka ọ dị banyere ndị amụma oge ochie ma ọ bụ nlanarị gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịanụ, ha ga-enweta nkwụghachi ụgwọ dị ebube nke ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.​—⁠Matiu 24:21.

20. (a) Gịnị ka ị mụtaworo site n’ihe “ilereanya” nke ndị amụma? (b) Olee otú ndidi yiri nke onye amụma pụrụ isi nyere anyị aka?

20 Lee aha ihe ilereanya ọma nke ndị amụma Chineke hapụwooro anyị! N’ihi na ha tachiri obi ná nhụjuanya, nwee ndidi, gosipụtakwa àgwà Chineke ndị ọzọ, e nyere ha ihe ùgwù nke ikwu okwu n’aha Jehova. Dị ka Ndịàmà ya nke oge a, ka anyị yie ha ma kpebisie ike dị ka Habakuk onye amụma kpebisiri ike, bụ́ onye kwupụtara, sị: “N’elu ebe m na-eche ka m ga-eguzo, guzookwa onwe m n’elu ebe e wusiri ike, m ga-echekwa ihu ihe [Chineke] ga-ekwu [site n’ọnụ, NW] m.” (Habakuk 2:1) Ka anyị nwee mkpebisi ike yiri nke ahụ ka anyị na-enwe ndidi ma jiri ọṅụ nọgide na-eme nkwupụta ihu ọha nye aha dị ebube nke Onye Okike Ukwu anyị, bụ́ Jehova!​—⁠Nehemaịa 8:10; Ndị Rom 10:10.

Ị̀ Ghọtara Isi Ihe Ndị A?

◻ Olee ihe nlereanya obi ike nke Emọs setịpụrụ?

◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Mosis onye amụma si bụrụ ihe nlereanya?

◻ Olee otú Ndịàmà Jehova nke oge a pụrụ isi mee dị ka Emọs na Aịsaịa?

◻ Gịnị ka ndị ozi bụ́ ndị Kraịst pụrụ ịmụta site n’àgwà Hosea na Joel?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe nlereanya nke Ezikiel na Maịka?

[Foto dị na peeji nke 16]

N’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ nke Amazaịa, mmụọ Jehova nyere Emọs ike iji obi ike buo amụma

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndị e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi esetịpụwo ezi ihe nlereanya site n’inwe ndidi n’ozi Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya