Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Nigeria
NIGERIA fabanyere afabanye n’akụkụ dị elu nke ebe ọdịda anyanwụ Africa. A na-achọta ya n’ebe Gulf of Guinea, ọ dị nnọọ n’ebe ugwu nke ebe ụwa kewara abụọ ma nwee ihe karịrị 88 nde ndị bi na ya.a
N’ime afọ ije ozi abụọ gara aga, alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society na Nigeria enyewo ndị na-eto eto nlekọta pụrụ iche. Nchọpụta e mere n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova gosiri na 80 pasent nke ndị malitere ikwusa ozi ọma na Nigeria na 1992 nọ n’agbata afọ ndụ 10 na 20. N’ime ndị e mere baptism n’ime afọ ahụ, 63 pasent bụ ndị nọ n’afọ ndụ ahụ.
Ndị Ntorobịa Eruo Eru Ịsụ Ụzọ
Ọtụtụ ndị na-eto eto na-abanye n’ọrụ nkwusa oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ. Otu onye ọsụ ụzọ aha ya bụ Hannah na-asị: “Mgbe m na-achọ ịgụsị akwụkwọ, m gara ileta ndị bịara Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ, ebe m zutere ụmụnna nwanyị abụọ ndị meworo agadi. M chere n’ime onwe m, ‘Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ndị a pụrụ ịsụ ụzọ, n’ihi gịnị ka m na-apụghị?’
“Ya mere mgbe m gụsịrị akwụkwọ, mụ onwe m ghọrọ onye ọsụ ụzọ. Ọnwa atọ mgbe nke ahụ gasịrị, m zutere Josephine dị 26 afọ, onye na-efe arụsị. Ọ sịrị: ‘Unu bụ́ Ndịàmà Jehova bụ ndị ọjọọ. Unu adịghị agba Krismas ma ọ bụ jiri ọgwụ okike eme ihe.’ M gwara ya na ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ka mụ na ya mụọ Bible, ọ ga-amụta ihe mere na anyị adịghị eme ihe ndị ahụ. O kwuru ka m bịaghachi. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ịbịa ọmụmụ ihe, ma mee ọtụtụ mgbanwe ná ndụ ya. Na December 1990 e mere ya baptism. Kemgbe August 1991, Josephine abụwo onye ọsụ ụzọ. Mgbe o jere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ n’afọ gara aga, ọ kọwara m nye ndị klasị ya dị ka nne ime mmụọ ya!”
Vidio na Ụlọ Nzukọ Alaeze
Otu n’ime vidio Society nyeere otu ọgbakọ dị nta aka inweta ala maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ịchọ ịzụta ala, ụmụnna anọ gakwuuru Onojie, eze ọdịnala nke ógbè ahụ. O nyere ha otu ibe ala n’ọnụ ego 20,000 naira. Ọgbakọ ahụ apụghị ịkwụ nke ahụ, ebe ha dị nanị ndị nkwusa 17 ịkwado ihe owuwu ahụ n’ụzọ ego. Onojie ahụ kwuru na ya ga-eche echiche maka ebe ọzọ.
Ọnwa ụfọdụ n’ihu, otu n’ime ndị okenye ọgbakọ ahụ mere nleta n’ebe obibi Onojie. Onojie ahụ na-ekiri vidio mgbe e chiri ya echichi. Onye okenye ahụ sịrị: “M nwere otu vidio m ga-achọ ka i lee. A na-akpọ ya Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name.”
E mesịa, onye okenye ahụ jụrụ Onojie ahụ ihe o chere banyere vidio ahụ. “Ekiriri m ihe nkiri ahụ ugbo ise,” ka Onojie ahụ kwuru. Onye okenye ahụ chetaghachiiri Onojie ahụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọ hụrụ na vidio ahụ ma kọwaara ya na ọgbakọ ha chọrọ iwu nke yiri ha. Mgbe ahụ ọ jụrụ ya ma ọgbakọ ha ọ̀ pụrụ ịzụrụ ibe ala dị nta dị n’akụkụ ebe ha nwebu enwe. Onojie ahụ zaghachiri, sị: “N’abalị gara aga mgbe m kirisịrị vidio ahụ, m chekwara otu ihe ahụ.” N’ikwu nke ahụ, o wepụtara ala dị mita isii nke dị nso n’ala ọgbakọ ahụ nwere. “Unu pụrụ iwere nke a,” ka o kwuru. “N’ogologo, unu pụrụ iwere ókè unu chọrọ. Kwadebenụ akwụkwọ nile, m ga-abịanyekwa aka na ha.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee 1994 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
[Igbe dị na peeji nke 9]
IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ
Afọ Ije Ozi 1993
ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NA-AGBA ÀMÀ: 174,582
NKEZI: 1 Onyeàmà maka 507
NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 473,245
NKEZI NDỊ NKWUSA BỤ ỌSỤ ỤZỌ: 19,777
NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 242,028
ỌNỤ ỌGỤGỤ E MERE BAPTISM: 8,888
ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 3,289
ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: BENIN CITY, EDO STATE