Isi nke Iri Abụọ na Abụọ
Ezi Omume Epuo na Zaịọn
1, 2. Mgbanwe dị aṅaa na-aga ịbịakwasị Israel, ònyekwa ga-eme ka o were ọnọdụ?
KA A kpọsaa nnwere onwe! Jehova ekpebiwo ịtọhapụ ndị ya na iweghachi ha n’ala nna ha. Dị ka mkpụrụ nke na-epu ome mgbe ntakịrị mmiri zoro, ezi ofufe ga-apụtakwa ọzọ. Mgbe oge ahụ ruru, otuto obi aṅụrị ga-anọchi obi nkoropụ, a ga-ekpukwasịkwa okpu nke ihu ọma Chineke n’isi ndị a wụkwasịburu ntụ nke iru újú.
2 Ònye ga-eme ka e nwee mgbanwe a dị ebube? Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ime ụdị ihe ahụ. (Abụ Ọma 9:19, 20; Aịsaịa 40:25) Zefanaịa onye amụma nyere iwu n’ụzọ amụma, sị: “Tie mkpu ọṅụ, gị ada Zaịọn; tie mkpu, gị Israel; ṅụrịa, were obi nile ṅụrịa ọṅụ agha, gị ada Jerusalem. Jehova ewezụgawo ikpe gị nile.” (Zefanaịa 3:14, 15) Lee oge ịṅụrị ọṅụ nke ahụ ga-abụ! Mgbe Jehova ga-achịkọta ihe fọdụrụnụ e weghachiri eweghachi site na Babilọn na 537 T.O.A., ọ ga-adị ka ọ bụ nro nke mezurunụ.—Abụ Ọma 126:1.
3. Mmezu dịgasị aṅaa ka okwu amụma ndị dị n’Aịsaịa isi 61 nwere?
3 E buru mweghachi a n’amụma n’Aịsaịa isi 61. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na amụma ahụ mezuru n’ụzọ doro anya na 537 T.O.A., ọ ga-emezu n’ụzọ ka saa mbara n’ọdịnihu. Mmezu ahụ nke sara mbara karị metụtara Jisọs na ụmụazụ ya na narị afọ mbụ nakwa ndị Jehova n’oge a. Mgbe ahụ, lee ka okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ si dị oké mkpa!
‘Afọ Mgbe Ihe Mmadụ Na-atọ Ya Ụtọ’
4. Ònye ka e nyere ọrụ izisa ozi ọma ná mmezu mbụ nke Aịsaịa 61:1, ọ̀ bụkwa onye ná mmezu nke abụọ ya?
4 Aịsaịa dere, sị: “Mmụọ nke Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, dị n’ahụ m; n’ihi na Jehova etewo m mmanụ izi ndị e wedara n’ala ozi ọma; O zitewo m ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, ịkpọsa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha, na ịkpọsa mmeghepụ ụlọ mkpọrọ gwa ndị e kere agbụ.” (Aịsaịa 61:1) Ònye bụ onye ahụ e nyere ọrụ izisa ozi ọma? Ma eleghị anya, n’oge mbụ, ọ bụ Aịsaịa bụ́ onye Chineke nyere mmụọ nsọ idetu ozi ọma maka ndị ahụ a dọọrọ n’agha nọ na Babilọn. Otú ọ dị, Jisọs zoro aka ná mmezu ya nke kasị mkpa mgbe o ji ihe Aịsaịa kwuru mee ihe n’ebe onwe ya nọ. (Luk 4:16-21) Ee, e zipụrụ Jisọs ịga zie ndị dị nwayọọ n’obi ozi ọma, ijikwa mezuo nke a, e ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ n’oge e mere ya baptism.—Matiu 3:16, 17.
5. Olee ndị nọworo na-ekwusa ozi ọma ahụ eri ihe dị ka afọ 2,000?
5 Ọzọkwa, Jisọs kụziiri ụmụazụ ya ịbụ ndị na-ezisa ozi ọma, ma ọ bụ ndị na-ekwusa ozi ọma. Na Pentikọst 33 O.A., e ji mmụọ nsọ tee ihe dị ka mmadụ 120 n’ime ndị a mmanụ, ha wee ghọọ ụmụ ime mmụọ nke Chineke. (Ọrụ 2:1-4, 14-42; Ndị Rom 8:14-16) E nyekwara ha onwe ha ọrụ izisara ndị dị nwayọọ n’obi na ndị obi ha tiwara etiwa ozi ọma. Mmadụ 120 ahụ bụ ndị mbụ n’ime mmadụ 144,000 a gaje isi otú a tee mmanụ. Ndị ikpeazụ so n’ìgwè a ka na-arụsi ọrụ ike n’ụwa taa. N’ihi ya, ruo ihe dị ka afọ 2,000, ụmụazụ Jisọs e tere mmanụ anọwo na-agba àmà banyere “nchegharị n’ebe Chineke nọ, na okwukwe n’ebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.”—Ọrụ 20:21.
6. Olee ndị nwetara obi iru ala site n’ịnụ ozi ọma ahụ e kwusara n’oge ochie, oleekwa banyere taa?
6 Ozi Aịsaịa nke sitere n’ike mmụọ nsọ wetaara ndị Juu nwere nchegharị, ndị nọ na Babilọn obi iru ala. N’oge nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya, o wetaara ndị Juu obi iru ala, bụ́ ndị obi ha tiwara etiwa n’ihi ajọ omume dị n’Israel, ndị nwekwara nkụda mmụọ n’ihi ịbụ ndị e ji eji n’ọdịnala okpukpe ụgha nke okpukpe ndị Juu nke narị afọ mbụ. (Matiu 15:3-6) Taa ọtụtụ nde mmadụ, bụ́ ndị omenala nke ndị ọgọ mmụọ na ọdịnala ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke nke Krisendọm matara n’ọnyà, ‘na-eze ume, na-asụkwa ude’ n’ihi ihe arụ dị iche iche a na-eme n’ime usoro okpukpe ahụ. (Ezikiel 9:4) A na-atọhapụ ndị gere ntị n’ozi ọma ahụ n’ọnọdụ ahụ dị imere ebere. (Matiu 9:35-38) A na-emepe nnọọ anya nke nghọta ha mgbe ha mụtara ife Jehova ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:24.
7, 8. (a) Olee afọ abụọ bụ́ ‘mgbe ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ’? (b) Olee mgbe bụgasị “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀” Jehova?
7 E nwere oge e kewapụtara maka ikwusa ozi ọma ahụ. E nyere Jisọs na ụmụazụ ya ọrụ: “Ịkpọsa afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ, na ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere; ịkasi ndị nile na-eru újú obi.” (Aịsaịa 61:2) Otu afọ bụ ogologo oge, ma o nwere mmalite na njedebe. “Afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ” bụ oge mgbe ọ na-enye ndị dị nwayọọ n’obi ohere ịṅa ntị ná mkpọsa ọ na-eme banyere nnwere onwe.
8 Na narị afọ mbụ, afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ nke ndị Juu, malitere na 29 O.A. mgbe Jisọs malitere ozi elu ala ya. Ọ sịrị ndị Juu: “Chegharịanụ; n’ihi na alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 4:17) Afọ ahụ mgbe ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ dịgidere ruo “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀” nke Jehova, bụ́ nke bịara ná njedebe na 70 O.A. mgbe Jehova kwere ka ndị agha Rom bibie Jerusalem na ụlọukwu ya. (Matiu 24:3-22) Anyị onwe anyị taa, na-ebi n’afọ ọzọ mgbe ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ, nke malitere mgbe e guzobere Alaeze Chineke n’eluigwe na 1914. Ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ ọzọ nke ga-ebu ibu karị, mgbe Jehova ga-ebibi usoro ihe dum nke ụwa a ná “mkpagbu ukwu” ahụ, ga-eweta afọ a bụ́ mgbe ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ ná njedebe.—Matiu 24:21.
9. Olee ndị taa na-erite uru site n’afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ?
9 Olee ndị taa na-erite uru site n’afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Chineke ụtọ? Ọ bụ ndị na-anabata ozi ahụ, gosi ịdị nwayọọ n’obi, ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akwado mkpọsa nke Alaeze Chineke ná “mba nile.” (Mak 13:10) Ndị dị otú ahụ na-achọpụta na ozi ọma ahụ na-enye ezi nkasi obi. Otú ọ dị, ndị na-ajụ ozi ahụ, bụ́ ndị na-ajụ iji afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ eme ihe, ga-ahụ n’isi nso ihe ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ ya ga-apụtara ha.—2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9.
Mkpụrụ Ime Mmụọ nke Na-ewetara Chineke Otuto
10. Mmetụta dị aṅaa ka oké ọrụ Jehova rụrụ n’ihi ha ga-enwe n’ahụ ndị Juu ahụ si Babilọn na-alọta?
10 Ndị Juu, bụ́ ndị si na Babilọn lọta ghọtara na Jehova arụwo oké ọrụ n’ihi ha. Iru újú ha dị ka ndị a dọọrọ n’agha ghọrọ ịṅụrị ọṅụ na otuto n’ihi na ha emesịwo nwere onwe ha. N’ụzọ dị otú a, Aịsaịa rụzuru ọrụ amụma ya, nke bụ́, “idoro ndị Zaịọn na-eru újú, inye ha ihe ọma ike n’isi n’ọnọdụ ntụ, mmanụ obi ụtọ n’ọnọdụ iru újú, ákwà mgbokwasị otuto n’ọnọdụ mmụọ nke inyoghị inyoghị; ka e wee kpọọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe ọkụkụ nke Jehova, ime ka Ọ maa mma.”—Aịsaịa 61:3.
11. Na narị afọ mbụ olee ndị nwere ezi ihe mere ha ga-eji too Jehova maka oké ọrụ ya?
11 Na narị afọ mbụ, ndị Juu, bụ́ ndị kwetara ka a tọhapụ ha n’agbụ okpukpe ụgha tokwara Chineke maka oké ọrụ ọ rụrụ n’ihi ha. Mgbe a napụtara ha ná mba nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ, e ji “ákwà mgbokwasị otuto” dochie nkụda mmụọ ha. Ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ ndị mbụ nwetara mgbanwe dị otú ahụ mgbe újú ha na-eru n’ihi ọnwụ ya ghọrọ ịṅụrị ọṅụ n’ihi otite Onyenwe ha e mere ka o si n’ọnwụ bilie ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ. Ngwa ngwa mgbe e mesịrị, mmadụ 3,000 dị nwayọọ n’obi, bụ́ ndị gere ntị ná nkwusa nke ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ ọhụrụ ma bụrụ ndị e mere baptism na Pentikọst 33 O.A., nwetara mgbanwe yiri ya. (Ọrụ 2:41) Lee ka o si dị mma inwe obi ike banyere inwe ngọzi Jehova! Kama ịdị ‘na-eruru Zaịọn újú,’ ha natara mmụọ nsọ ma bụrụ ndị e mere ka ha nweta ume ọhụrụ site na “mmanụ obi ụtọ,” nke na-anọchite anya ịnụrị ọṅụ nke ndị Jehova gọziworo n’ụba.—Ndị Hibru 1:9.
12, 13. (a) N’ime ndị Juu ahụ si esi na-alọta na 537 T.O.A, olee ndị bụ “osisi oak nke ezi omume”? (b) Olee ndị nọworo na-abụ “osisi oak nke ezi omume” kemgbe Pentikọst 33 O.A.?
12 Jehova ji “osisi oak nke ezi omume” gọzie ndị ya. Olee ndị bụ osisi oak ndị a? N’afọ ndị na-esonụ mgbe 537 T.O.A. gasịrị, ha bụ mmadụ ndị mụrụ Okwu Chineke ma tụgharịa uche na ya ma zụlite ụkpụrụ ezi omume nke Jehova. (Abụ Ọma 1:1-3; Aịsaịa 44:2-4; Jeremaịa 17:7, 8) Ndị ikom dị ka Ezra, Hagaị, Zekaraịa, na Onyeisi Nchụàjà bụ́ Joshua ghọrọ “osisi oak”—idé nke eziokwu megide mmetọ ime mmụọ ná mba ahụ.
13 Malite na Pentikọst 33 O.A. gaa n’ihu, Chineke kụrụ “osisi oak nke ezi omume” yiri ha—ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị nwere obi ike—n’ógbè ime mmụọ nke mba ọhụrụ ya, bụ́ “Israel nke Chineke.” (Ndị Galetia 6:16) N’ime ọtụtụ narị afọ gafeworonụ, “osisi” ndị a abịawo dị 144,000, na-amịpụta mkpụrụ ezi omume ịbụrụ Jehova Chineke ihe ịma mma, ma ọ bụ iwetara ya otuto. (Mkpughe 14:3) Ndị ikpeazụ so n’oké “osisi” ndị a anọwo na-eto nke ọma eri ọtụtụ afọ kemgbe 1919, bụ́ mgbe Jehova tụtere ihe fọdụrụ n’Israel nke Chineke n’ọnọdụ arụghị ọrụ ha nke dịruru nwa oge. Site n’inye ha mmiri ime mmụọ n’ụba, Jehova emewo ka e nwee ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ oké ọhịa nke jupụtara n’osisi ezi omume, ndị na-amị mkpụrụ.—Aịsaịa 27:6.
14, 15. Ọrụ dịgasị aṅaa ka ndị na-efe Jehova ofufe a tọhapụrụ atọhapụ malitere ịrụ na (a) 537 T.O.A.? (b) 33 O.A.? (ch) 1919?
14 N’imesi ọrụ nke “osisi” ndị a ike, Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Ha ga-ewukwa ebe nile nke bụ́ mkpọmkpọ ebe site na mgbe ebighị ebi gara aga; ebe nile nke tọgbọrọ n’efu nke ndị mbụ ka ha ga-ewuli, meekwa ka mkpọmkpọ obodo nile dị ọhụrụ, bụ́ ebe tọgbọrọ n’efu nke ọtụtụ ọgbọ gara aga.” (Aịsaịa 61:4) N’oge iwu Eze Saịrọs nke Peasia dị irè, ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị si Babilọn lọta wughachiri Jerusalem na ụlọukwu ya, bụ́ nke a hapụworo ka ọ bụrụ mkpọmkpọ ebe ruo ogologo oge. Ọrụ mwughachi ga-ewerekwa ọnọdụ n’afọ ndị na-esonụ mgbe 33 O.A. na 1919 gasịrị.
15 Na 33 O.A., njide e jidere Jisọs, ikpe e kpere ya na ọnwụ ya wutere ndị na-eso ụzọ ya nke ukwuu. (Matiu 26:31) Otú ọ dị, otú ha si ele ihe anya gbanwere mgbe o mere ka ha hụ ya anya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ. Ozugbo a wụkwasịkwara ha mmụọ nsọ, ha malitere ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ, “n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) Ha si otú a malite iweghachi ofufe dị ọcha. N’ụzọ yiri ya, malite na 1919 gaa n’ihu, Jisọs Kraịst mere ka ihe fọdụrụ n’ime ụmụnna ya e tere mmanụ wughachi “ebe tọgbọrọ n’efu nke ọtụtụ ọgbọ gara aga.” Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị ụkọchukwu nke Krisendọm enyebeghị ihe ọmụma banyere Jehova, ha ji ọdịnala mmadụ mepụtara na ozizi ndị na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ dochie ya. Ndị Kraịst e tere mmanụ wepụsịrị n’ọgbakọ ha omume ndị okpukpe ụgha metọworo ka mweghachi nke ezi ofufe wee nwee ike ịga n’ihu. Ha malitekwara ihe ga-emesịa bụrụ ọrụ ịgba àmà kasịnụ ụwa hụtụworo.—Mak 13:10.
16. Olee ndị nọworo na-enyere ndị Kraịst e tere mmanụ aka n’ọrụ mweghachi ha, ọrụ dịgasịkwa aṅaa ka e nyefeworo ha?
16 Nke a bụ oké ọrụ. Olee otú ihe ahụ fọdụrụ n’Israel nke Chineke, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha na-ebuchaghị ibu pụrụ isi rụzuo ọrụ dị otú a? Jehova kpaliri Aịsaịa ikwu, sị: “Ndị ala ọzọ ga-eguzo na-azụ ìgwè ewu na atụrụ unu, ụmụ ala ọzọ ga-abụkwa ndị ọrụ ubi unu na ndị ọrụ ubi vine unu.” (Aịsaịa 61:5) Ndị ala ọzọ ihe atụ ahụ abụrụwo “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” nke Jisọs.a (Mkpughe 7:9; Jọn 10:11, 16) E jighị mmụọ nsọ tee ha mmanụ n’olileanya nke inwe ihe nketa n’eluigwe. Kama nke ahụ, ha nwere olileanya ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Mkpughe 21:3, 4) N’agbanyeghị nke ahụ, ha hụrụ Jehova n’anya, e nyefewokwa ha ọrụ ịzụ atụrụ, ịkọ ubi, na ilekọka ubi vine n’ụzọ ime mmụọ. Ọrụ ndị dị otú ahụ abụghị ọrụ dị ala. Ná nduzi nke ihe fọdụrụ n’Israel nke Chineke, ndị ọrụ a na-enye aka n’ịzụ atụrụ, ilekọta, na iweta ndị mmadụ dị ka ihe ubi.—Luk 10:2; Ọrụ 20:28; 1 Pita 5:2; Mkpughe 14:15, 16.
17. (a) Gịnị ka a ga-akpọ ndị so n’Israel nke Chineke? (b) Olee nanị àjà a chọrọ maka mgbaghara nke mmehie?
17 Olee banyere Israel nke Chineke? Jehova na-agwa ha site n’ọnụ Aịsaịa, sị: “A ga-akpọ unu onwe unu ndị nchụàjà nke Jehova: ndị na-ejere Chineke anyị ozi ka a ga-asị na unu bụ: akụ̀ nke mba dị iche iche ka unu ga-eri, ọ bụkwa ná nsọpụrụ ha ka unu ga-anya isi.” (Aịsaịa 61:6) N’Israel oge ochie, Jehova mere ka e nwee ndị nchụàjà sitere n’ebo Livaị ịchụ àjà maka ndị Israel ibe ha nakwa ndị nchụàjà ahụ n’onwe ha. Otú ọ dị, na 33 O.A., Jehova kwụsịrị iji ndị nchụàjà sitere n’ebo Livaị eme ihe ma guzobe ndokwa ka mma. Ọ nakweere ndụ zuru okè nke Jisọs dị ka àjà maka mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ. Kemgbe ahụ, ọ dịghị àjà ọzọ a chọrọ. Àjà Jisọs dị irè ruo oge nile.—Jọn 14:6; Ndị Kọlọsi 2:13, 14; Ndị Hibru 9:11-14, 24.
18. Ụdị ndị nchụàjà dị aṅaa ka Israel nke Chineke ghọrọ, gịnịkwa bụ ọrụ e nyere ha?
18 Mgbe ahụ, olee otú ndị so n’Israel nke Chineke si bụrụ “ndị nchụàjà nke Jehova”? Ka ọ na-edegara ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ akwụkwọ, Pita onyeozi sịrị: “Unu onwe unu bụ ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara, ka unu wee kwusaa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) Ya mere, dị ka otu ìgwè, ndị Kraịst e tere mmanụ bụ òtù ndị nchụàjà, ndị nwere ọrụ a kapịrị ọnụ: ịgwa mba nile banyere ebube Jehova. Ha gaje ịbụ ndị àmà ya. (Aịsaịa 43:10-12) Eri mgbe ikpeazụ a, ndị Kraịst e tere mmanụ ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ a dị oké mkpa. N’ihi ya, ọtụtụ nde mmadụ so ha ugbu a na-arụ ọrụ ịgba àmà banyere Alaeze Jehova.
19. Ozi dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ ga-enwe ihe ùgwù ije?
19 Ọzọkwa, ndị so n’Israel nke Chineke nwere atụmanya nke ije ozi dị ka ndị nchụàjà n’ụzọ ọzọ. Mgbe ha nwụrụ, a na-akpọlite ha n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ nke ndị bụ́ mmụọ n’eluigwe. Ha ga-eje ozi n’ebe ahụ, ọ bụghị nanị dị ka ndị ha na Jisọs ga-eso chịa n’Alaeze ya, kamakwa dị ka ndị nchụàjà nke Chineke. (Mkpughe 5:10; 20:6) N’ihi ya, ha ga-enwe ihe ùgwù nke iji abamuru ndị sitere n’àjà mgbapụta Jisọs mee ihe maka ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’ụwa. N’ọhụụ Jọn onyeozi, nke e dekọrọ ná Mkpughe isi 22, a kọwara ha ọzọ dị ka “osisi.” A hụrụ “osisi” 144,000 ahụ dum n’eluigwe, ha na-amị “ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa: akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.” (Mkpughe 22:1, 2) Lee ije ozi nchụàjà magburu onwe ya nke ahụ bụ!
Ihere na Mweda n’Ala, Mgbe ahụ Ịṅụrị Ọṅụ
20. N’agbanyeghị mmegide, ndị nchụàjà ahụ bụ́ ndị eze na-echere ngọzi dị aṅaa?
20 Kemgbe 1914, mgbe afọ ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ malitere, ndị nchuàjà ahụ bụ́ eze anọgidewo na-enweta mmegide site n’aka ndị ụkọchukwu Krisendọm. (Mkpughe 12:17) Ka o sina dị, mgbalị nile e mere ịkwụsị nkwusa nke ozi ọma ahụ akụwo nnọọ afọ n’ala. Amụma Aịsaịa kwuru ya, na-asị: “N’ọnọdụ ihere unu unu ga-enwe okpukpu: n’ọnọdụ itinye n’ọnọdụ ihere ha ga-eti mkpu ọṅụ n’òkè ha: n’ihi ya n’ala ha okpukpu ka ha ga-enweta: ọṅụ ebighị ebi ga-adịrị ha.”—Aịsaịa 61:7.
21. Olee otú ndị Kraịst e tere mmanụ si bịa nwee ngọzi dị okpukpu abụọ?
21 N’oge Agha Ụwa Mbụ, Krisendọm nke na-akwalite ịhụ mba n’anya menyere ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ ihere, wedaakwa ha ala. Ndị ụkọchukwu so ná ndị boro ụmụnna asatọ na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn ebubo ụgha nke ịgba ọchịchị mgba okpuru. A tụrụ ụmụnna ndị a mkpọrọ ọnwa itoolu n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ikpeazụ, n’oge opupu ihe ubi nke 1919, a tọhapụrụ ha, ka e mesịkwara, a kagburu ebubo nile e boro ha. Atụmatụ ịkwụsị ọrụ nkwusa ahụ si otú a rụpụta ihe dị iche. Kama ikwe ka ndị na-efe ya ofufe bụrụ ndị e menyere ihere ruo ogologo oge, Jehova tọhapụrụ ha ma weghachi ha n’ógbè ime mmụọ ha, “n’ala ha.” Ha nwetara ngọzi dị okpukpu abụọ n’ebe ahụ. Inwe ngọzi Jehova bụ nnọọ ụgwọ zuru ezu maka ahụhụ nile ha tara. N’eziokwu, ha nwere ihe mere ha ga-eji tie mkpu ọṅụ!
22, 23. Olee otú ndị Kraịst e tere mmanụ siworo ṅomie Jehova, oleekwa otú o siworo nye ha ụgwọ ọrụ?
22 Ihe Jehova kwuziri na-egosipụta ihe ọzọ mere ndị Kraịst taa ga-eji ṅụrịa ọṅụ: “Mụ onwe m, Jehova, na-ahụ ikpe ziri ezi n’anya, ana m akpọ nnapụ n’ihe ike n’ajọ omume asị; M ga-enyekwa ha ụgwọ ọrụ ha n’eziokwu, ọ bụkwa ọgbụgba ndụ ebighị ebi ka Mụ na ha ga-agba.” (Aịsaịa 61:8) Site n’ọmụmụ ha na-amụ Bible, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ mụtara ịhụ ikpe ziri ezi n’anya na ịkpọ ajọ omume asị. (Ilu 6:12-19; 11:20) Ha mụtara ‘ịkpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè,’ na-anọpụ iche n’agha na n’ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Aịsaịa 2:4) Ha hapụkwara omume asọpụrụghị Chineke, dị ka nkwutọ, ịkwa iko, izu ohi, na ịṅụbiga mmanya ókè.—Ndị Galetia 5:19-21.
23 N’ihi na ndị Kraịst e tere mmanụ hụrụ ikpe ziri ezi n’anya dị ka Onye Okike ha hụrụ ya n’anya, Jehova enyewo ha “ụgwọ ọrụ ha n’eziokwu.” Otu n’ime “ụgwọ ọrụ” dị otú ahụ bụ ọgbụgba ndụ ebighị ebi—ọgbụgba ndụ ọhụrụ—nke Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya maka ya n’abalị ahụ tupu ọnwụ ya. Ọ bụ dabere n’ọgbụgba ndụ a ka ha ji ghọọ mba ime mmụọ, ndị pụrụ iche nye Chineke. (Jeremaịa 31:31-34; Luk 22:20) N’okpuru ya, Jehova ga-eji abamuru nile nke àjà mgbapụta Jisọs mee ihe, gụnyere mgbaghara mmehie nye ma ndị e tere mmanụ ma ndị ọzọ nile na-ekwesị ntụkwasị obi n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ.
Ịnụrị Ọṅụ n’Ihi Ngọzi Jehova
24. Olee ndị n’etiti mba dị iche iche bụ “mkpụrụ” ahụ a bịara gọzie, oleekwa otú ha siworo ghọọ “mkpụrụ”?
24 Ụfọdụ n’ime ndị so ná mba dị iche iche ahụwo ngọzi Jehova n’ahụ ndị ya. E buru nke a n’amụma site ná nkwa Jehova, sị: “A ga-amakwa mkpụrụ ha n’etiti mba nile, na ụmụ nke pụtara n’ahụ ha n’etiti ndị nile dị iche iche: ndị nile ndị na-ahụ ha anya ga-amata ha, na ha onwe ha bụ mkpụrụ nke Jehova gọziworo.” (Aịsaịa 61:9) Ndị so n’Israel nke Chineke, bụ́ ndị Kraịst e tere mmanụ, anọwo na-arụsi ọrụ ike ná mba dị iche iche n’afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ. Taa, ọnụ ọgụgụ ndị ṅaworo ntị n’ozi ha eruwo ọtụtụ nde. Site n’iso Israel nke Chineke na-arụkọ ọrụ n’ụzọ chiri anya, ndị si ná mba dị iche iche nwere ihe ùgwù nke ịghọ “mkpụrụ nke Jehova gọziworo.” Ihe nile a kpọrọ mmadụ na-ahụ ọnọdụ obi ụtọ ha.
25, 26. Olee otú ndị Kraịst nile si ekwupụtaghachi ihe ndị ahụ e kwuru n’Aịsaịa 61:10?
25 Ndị Kraịst nile, ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ, na-atụ anya ito Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Ha ji obi ha nile na-ekwenyere Aịsaịa onye amụma, bụ́ onye kwuru site ná nduzi nke mmụọ nsọ, sị: “Obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu n’ime Jehova, mkpụrụ obi m ga-etegharị egwú ọṅụ n’ime Chineke m; n’ihi na Ọ chịrịwo uwe nzọpụta yikwasị m, O werewo uwe mwụda ezi omume kpuchie m, dị ka onye na-alụ nwunye ọhụrụ si ewere ihe ọma ike n’isi kee onwe ya dị ka onye nchụàjà, na dị ka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si ewere ihe ejiji ya nile chọọ onwe ya mma.”—Aịsaịa 61:10.
26 N’ịbụ ndị yi “uwe mwụda ezi omume,” ndị Kraịst e tere mmanụ ekpebisiwo ike ịnọgide na-adị ọcha n’anya Jehova. (2 Ndị Kọrint 11:1, 2) N’ịbụ ndị Jehova gụrụ ná ndị ezi omume n’ebumnobi nke iketa ndụ eluigwe, ọ dịghị mgbe ha ga-agaghachi n’ógbè tọgbọrọ chakoo nke Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ ebe e siworo tọhapụ ha. (Ndị Rom 5:9; 8:30) Uwe nzọpụta ahụ dị oké ọnụ ahịa nye ha. Atụrụ ọzọ ahụ bụ́ ndị ibe ha ekpebisiwokwa ike n’otu aka ahụ idebe ụkpụrụ ndị dị elu nke ofufe dị ọcha nke Jehova Chineke. Ebe ha “sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ,” a na-agụ ha ná ndị ezi omume, ha ga-alanarịkwa ‘oké mkpagbu ahụ.’ (Mkpughe 7:14; Jemes 2:23, 25) Ruo mgbe ahụ, ha na-eṅomi ndị ibe ha e tere mmanụ n’izere mmetọ ọ bụla site n’aka Babilọn Ukwu ahụ.
27. (a) N’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ, “ihe opupu” dị aṅaa dị ịrịba ama ka a ga-enwe? (b) Olee otú ezi omume siworo puwelarị n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ?
27 Taa, obi dị ndị na-efe Jehova ofufe ụtọ nke ukwuu ịnọ na paradaịs ime mmụọ. N’isi nso, ha ga-enwetakwa Paradaịs n’ụzọ nkịtị. Anyị ji obi anyị nile na-atụ anya oge ahụ, bụ́ nke a kọwara n’ụzọ doro anya n’okwu mmechi nke Aịsaịa isi 61: “Dị ka ala si eme ka ihe opupu ya pụta, na dị ka ubi a gbara ogige si eme ka ihe a ghaworo n’ime ya puo; otú a ka Onyenwe anyị Jehova ga-eme ka [ihe opupu, NW] ezi omume na otuto pute n’ihu mba nile.” (Aịsaịa 61:11) N’oge ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst, “ihe opupu ezi omume” ga-epu n’ụwa. Ụmụ mmadụ ga-eti mkpu mmeri, ezi omume ga-agbasakwa ruo ebe ụwa sọtụrụ. (Aịsaịa 26:9) Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa na anyị ga-echere ruo oge ahụ dị ebube iji nye otuto n’ihu mba nile. Ezi omume epuwelarị n’etiti ọtụtụ nde mmadụ ndị na-enye Chineke nke eluigwe otuto ma na-ekwusa ozi ọma banyere Alaeze ya. Ọbụna ugbu a, okwukwe anyị na olileanya anyị bụ ihe ndị mere anyị ga-eji na-eti mkpu ọṅụ n’ihi ngọzi nile nke Chineke anyị.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Aịsaịa 61:5 pụrụ inweworị mmezu n’oge ochie, ebe ọ bụ na ndị na-abụghị ndị Juu sonyeere ndị Juu n’anụ ahụ mgbe ha na-alaghachi Jerusalem, ma eleghịkwa anya, nye aka n’iweghachi ala ahụ n’ọnọdụ ya. (Ezra 2:43-58) Otú ọ dị, malite n’amaokwu nke 6 amụma ahụ yiri ka ọ na-emetụta nanị Israel nke Chineke.
[Foto dị na peeji nke 323]
Aịsaịa nwere ozi ọma ikwusara ndị Juu a dọọrọ n’agha
[Foto dị na peeji nke 331]
Malite na 33 O.A., Jehova akụwo “osisi oak ezi omume” dị 144,000
[Foto dị na peeji nke 334]
Ụwa ga-epupụta ezi omume