Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 13 p. 157-171
  • Nzọpụta na Ịṅụrị Ọṅụ n’Oge Ọchịchị Mesaịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzọpụta na Ịṅụrị Ọṅụ n’Oge Ọchịchị Mesaịa
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mesaịa—Onye Ndú Ruru Eru
  • Onyeikpe Bụ́ Onye Ezi Omume na Onye Na-eme Ebere
  • Ọnọdụ Ndị Gbanwere Agbanwe n’Elu Ụwa
  • E Weghachi Ofufe Dị Ọcha Site n’Aka Mesaịa
  • Ndị Dị n’Otu Na-ejere Jehova Ozi
  • A Ga-emeri Ihe Mgbochi
  • Ịṅụrị Ọṅụ Na-enweghị Ọgwụgwụ Nye Ndị Mesaịa ahụ Ga-achị!
  • Jiri Obi Ike Na-elepụ Anya n’Ọdịnihu!
  • “Mgbe Ihe Mmadụ Na-atọ M Ụtọ”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Amụma Ndị E Buru Banyere Mesaya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ha Nọ Na-atụ Anya Mesaya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 13 p. 157-171

Isi nke Iri na Atọ

Nzọpụta na Ịṅụrị Ọṅụ n’Oge Ọchịchị Mesaịa

Aịsaịa 11:1–12:6

1. Kọwaa ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ n’oge Aịsaịa.

N’OGE Aịsaịa, ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ dị njọ. Ọbụna n’oge ọchịchị nke ndị eze kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Ụzaịa na Jotam, ọtụtụ n’ime ndị ahụ fere ofufe n’ebe ndị dị elu. (2 Ndị Eze 15:1-4, 34, 35; 2 Ihe E Mere 26:1, 4) Mgbe Hezekaịa ghọrọ eze, o wepụrụ ihe nile metụtara ofufe Beal n’ala ahụ. (2 Ihe E Mere 31:1) Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji gbaa ndị ya ume ka ha laghachikwute ya ma dọọ aka ná ntị banyere ahụhụ ga-abịanụ!

2, 3. Agbamume dị aṅaa ka Jehova na-enye ndị chọrọ ijere ya ozi n’agbanyeghị ekwesịghị ntụkwasị obi zuru ebe nile?

2 Ma, ọ bụghị mmadụ nile bụ nnọọ ndị nnupụisi. Jehova nwere ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi, ma eleghị anya e nwekwara ụfọdụ ndị Juu ṅara ha ntị. Jehova ga-agwa ndị a okwu nkasi obi. Mgbe ọ kọwasịrị ajọ mbibi a ga-ebibi Juda mgbe Asiria ga-awakpo ya, e nyere Aịsaịa onye amụma ike mmụọ nsọ idetu otu n’ime akụkụ ndị kasị maa mma n’ime Bible dum, bụ́ nkọwa nke ngọzi ndị ga-abịanụ n’oge ọchịchị Mesaịa.a Akụkụ ụfọdụ nke ngọzi ndị a mesịrị mezuo n’ụzọ dị nta mgbe ndị Juu si ná ndọrọ n’agha na Babilọn lọta. Ma amụma ahụ n’ozuzu ya na-enwe mmezu bụ́ isi taa. N’eziokwu, Aịsaịa na ndị Juu ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ya anọghị ndụ hụ ngọzi ndị a. Ma ha jiri okwukwe tụọ anya ha, ha ga-ahụkwa mmezu nke ihe ndị Aịsaịa kwuru mgbe ha bilitesịrị n’ọnwụ.—Ndị Hibru 11:35.

3 Agbamume dịkwa ndị Jehova nke oge a mkpa. Ụkpụrụ omume nke na-ajọwanye njọ n’ụwa n’ike n’ike, ajọ mmegide a na-emegide ozi Alaeze ahụ, na adịghị ike onwe onye dị iche iche bụ ihe ịma aka nye ha nile. Ihe ndị magburu onwe ha Aịsaịa kwuru banyere Mesaịa ahụ na ọchịchị ya pụrụ iwusi ndị Chineke ike ma nyere ha aka imeri ihe ịma aka ndị a.

Mesaịa—Onye Ndú Ruru Eru

4, 5. Gịnị ka Aịsaịa buru n’amụma banyere ọbịbịa Mesaịa, oleekwa otú o si yie ka Matiu o ji ihe Aịsaịa kwuru mee ihe?

4 Ọtụtụ narị afọ tupu oge Aịsaịa, ndị Hibru ndị ọzọ so dee Bible zoro aka n’ọbịbịa nke Mesaịa, bụ́ ezi Onye Ndú ahụ, onye Jehova ga-ezigara Israel. (Jenesis 49:10; Deuterọnọmi 18:18; Abụ Ọma 118:22, 26) Ugbu a site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova na-enyekwu nkọwa sara mbara. Aịsaịa na-ede, sị: “Ome ga-esikwa n’ogwe osisi Jesi pụta, otu alaka nke sitere na mkpọrọgwụ ya ga-amịkwa mkpụrụ.” (Aịsaịa 11:1; tụlee Abụ Ọma 132:11.) “Ome” na “alaka” na-egosicha na Mesaịa ahụ ga-abụ nwa Jesi site na nwa ya nwoke bụ́ Devid, bụ́ onye e tere mmanụ dị ka eze Israel. (1 Samuel 16:13; Jeremaịa 23:5; Mkpughe 22:16) Mgbe ezigbo Mesaịa ahụ bịara, “ome” a, nke sitere n’ụlọ Devid, ga-amị ezi mkpụrụ.

5 Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa bụ Jisọs. Matiu, bụ́ onye so dee oziọma, zoro aka n’ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa 11:1 mgbe ọ sịrị na ọkpụkpọ a kpọrọ Jisọs “onye Nazaret” mezuru ihe ndị amụma kwuru. N’ihi na a zụlitere ya n’obodo Nazaret, a kpọrọ Jisọs onye Nazaret, aha nke yiri ka o nwere ihe jikọrọ ya na okwu Hibru e ji mee ihe n’Aịsaịa 11:1 maka “ome.”b—Matiu 2:23, nkọwa ala ala peji nke NW; Luk 2:39, 40.

6. Ụdị onye ọchịchị dị aṅaa ka e buru n’amụma na Mesaịa ahụ ga-abụ?

6 Ụdị onye ọchịchị dị aṅaa ka Mesaịa ahụ ga-abụ? Ọ̀ ga-adị ka Asiria ahụ nwere obi ọjọọ, nke na-eme nanị uche ya, onye bibiri alaeze ebo iri dị n’ebe ugwu nke Israel? Ọ dịghị ma ọlị. Banyere Mesaịa ahụ, Aịsaịa na-ekwu, sị: “Mmụọ nke Jehova ga-enwekwa ọnọdụ Ya n’ahụ ya, bụ́ Mmụọ nke amamihe na nghọta, Mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike, Mmụọ nke ihe ọmụma na egwu Jehova; ọzọ, ihe na-atọ ya ụtọ bụ egwu Jehova.” (Aịsaịa 11:2, 3a) E ji mmụọ nsọ Chineke tee Mesaịa ahụ mmanụ, ọ bụghị mmanụ nkịtị. Nke a mere n’oge e mere Jisọs baptism, mgbe Jọn Onye Na-eme Baptism hụrụ mmụọ nsọ Chineke ka ọ na-efedakwasị Jisọs n’ụdị nduru. (Luk 3:22) Mmụọ Jehova ‘weere ọnọdụ n’ahụ’ Jisọs, o nyekwara ihe àmà na-egosi nke a mgbe o ji amamihe, nghọta, ndụmọdụ, ịdị ike, na ihe ọmụma mee ihe. Lee àgwà mara nnọọ mma ha bụ nye onye ọchịchị!

7. Olee nkwa Jisọs kwere ụmụazụ ya na-ekwesị ntụkwasị obi?

7 Ụmụazụ Jisọs pụkwara inweta mmụọ nsọ. N’otu n’ime okwu ya, Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu jọrọ njọ, ma unu na-amata inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu nke eluigwe ga-esi aṅaa ghara iwere karị Mmụọ nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ Ya?” (Luk 11:13) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịla azụ n’ịrịọ Chineke maka mmụọ nsọ, anyị ekwesịghịkwa ịkwụsị ịzụlite mkpụrụ ya ndị dị mma—“ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, okwukwe, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Jehova kwere nkwa imezu arịrịọ nke ụmụazụ Jisọs na-arịọ maka “amamihe ahụ nke si n’elu bịa” iji nyere ha aka imeri ihe ịma aka dị iche iche nke ndụ.—Jemes 1:5; 3:17.

8. Olee otú Jisọs si nweta ọṅụ n’ịtụ egwu Jehova?

8 Gịnị bụ egwu Jehova nke Mesaịa ahụ na-egosipụta? N’ezie Jisọs adịghị atụ Chineke ụjọ, na-atụ ụjọ na ọ ga-ama ya ikpe. Kama nke ahụ, Mesaịa ahụ na-atụ Chineke egwu nsọpụrụ, na-asọpụrụ ya n’ịhụnanya. Onye na-atụ egwu Chineke na-achọ mgbe nile ‘ime ihe na-atọ Ya ụtọ’ dị ka Jisọs na-eme. (Jọn 8:29) Site n’okwu na n’omume, Jisọs na-akụzi na ọ dịghị ọṅụ karịrị ịdị na-ebi ndụ kwa ụbọchị n’egwu ziri ezi nke Jehova.

Onyeikpe Bụ́ Onye Ezi Omume na Onye Na-eme Ebere

9. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs na-enye ndị a na-akpọ ka ha kpee ikpe n’ọgbakọ ndị Kraịst?

9 Aịsaịa bukwuru amụma banyere àgwà Mesaịa ahụ: “Ọ bụghịkwa dị ka anya ya abụọ si ahụ ka ọ ga-ekpe ikpe, ọ bụghịkwa dị ka ntị ya abụọ si anụ ka ọ ga-aba mba.” (Aịsaịa 11:3b) Ka e were ya na ị ga-apụta zara ọnụ gị n’ụlọikpe, ị́ gaghị enwe ekele inwe onyeikpe dị otú ahụ? N’ọkwá ya dị ka Onyeikpe nke ihe nile a kpọrọ mmadụ, arụmụka na-ezighị ezi, aghụghọ ụlọikpe, asịrị, ma ọ bụ ihe ndị a na-ahụ anya, dị ka akụ̀ na ụba adịghị emegharị Mesaịa ahụ anya. Ọ na-achọpụta aghụghọ nile ma na-ele anya gabiga ọdịdị elu ahụ na-adịghị mma, na-achọpụta “mmadụ zoro ezo nke obi,” “nwoke ahụ zoro ezo.” (1 Pita 3:4, nkọwa ala ala peji nke NW) Ihe nlereanya magburu onwe ya nke Jisọs bụ ihe kwesịrị nṅomi nye ndị nile a na-akpọ ka ha kpee ikpe n’ọgbakọ ndị Kraịst.—1 Ndị Kọrint 6:1-4.

10, 11. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si agbazi ụmụazụ ya? (b) Ikpe dị aṅaa ka Jisọs ga-ama ndị ajọ omume?

10 Olee otú àgwà ndị magburu onwe ha nke Mesaịa ahụ ga-esi emetụta mkpebi ikpe ya? Aịsaịa na-akọwa, sị: “Ọ ga-eji ezi omume kpee ndị na-enweghị ike ikpe, ọ ga-ejikwa izi ezi baa mba banyere ndị dị umeala n’obi n’ụwa: ọ ga-ejikwa ndele nke ọnụ Ya tigbuo ụwa, ọ ga-ejikwa iku ume nke egbugbere ọnụ ya abụọ mee ka ndị na-emebi iwu nwụọ. Ezi omume ga-abụkwa ihe okike ume Ya, ikwesị ntụkwasị obi ga-abụkwa ihe okike úkwù Ya.”—Aịsaịa 11:4, 5.

11 Mgbe ọ dị mkpa inye ụmụazụ ya mgbazi, Jisọs na-enye ya n’ụzọ na-akasị abara ha uru—ihe nlereanya magburu onwe ya nye ndị Kraịst bụ́ okenye. N’aka nke ọzọ, ndị na-emebi iwu pụrụ ịtụ anya inweta amamikpe dị njọ. Mgbe Chineke ga-ajụ usoro ihe a ajụjụ, Mesaịa ahụ ga-eji olu ya dị ike “tigbuo ụwa,” na-ekwupụta amamikpe mbibi nye ndị ajọ omume nile. (Abụ Ọma 2:9; tụlee Mkpughe 19:15.) N’ikpeazụ, a gaghị enwe ndị mmebi iwu ga-afọdụ imebi udo nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Abụ Ọma 37:10, 11) Jisọs, ebe o kere ezi omume na ikwesị ntụkwasị obi n’úkwù ya na n’ume ya, o nwere ike imezu nke a.—Abụ Ọma 45:3-7.

Ọnọdụ Ndị Gbanwere Agbanwe n’Elu Ụwa

12. Olee ihe ndị pụrụ ịdị na-echegbu onye Juu mgbe ọ na-eche echiche isi na Babilọn laghachi n’Ala Nkwa ahụ?

12 Jiri anya nke uche hụ onye Israel nke ka nụsịrị banyere iwu Saịrọs nyere ka ndị Juu laghachi Jerusalem ma wughachi ụlọukwu ahụ. Ọ̀ ga-ahapụ ịnọ ná nchebe nke Babilọn mewe ogologo njem ịla? N’afọ 70 ahụ Israel na-anọghị ya, ahịhịa etochiwo ubi ndị ha hapụrụ. Anụ ọhịa wolf, agụ owuru, ọdụm, na anụ ọhịa bear na-awagharịrị onwe ha ugbu a n’ubi ndị ahụ. Ubí emewokwa ebe ahụ ebe obibi ha. Ndị Juu ahụ na-alaghachinụ ga-adabere n’anụ ụlọ iji dịrị ndụ—ha ga-enweta mmiri ara ehi, ajị anụ, na anụ, site n’ìgwè anụ ha, oké ehi ga na-adọkpụkwa ọgụ e ji akọ ihe. Anụ ndị na-eri ibe ha hà ga na-egbu ndị a? Agwọ ọ̀ ga na-ata ụmụaka? Olee banyere ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e chechiri n’ụzọ mgbe ha nọ na-eme njem ahụ?

13. (a) Nkọwa dị aṅaa na-enye obi ụtọ ka Aịsaịa nyere? (b) Olee otú anyị si mara na udo ahụ Aịsaịa na-akọwa gụnyere ihe karịrị ịnọ ná nchebe pụọ n’aka anụ ọhịa?

13 Ugbu a, Aịsaịa na-enye nkọwa na-enye obi ụtọ banyere ọnọdụ ndị Chineke ga-eme ka e nwee n’ala ahụ. Ọ na-ekwu, sị: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha. Nne ehi na anụ ọhịa bear ga-atakọkwa nri; ụmụ ha ga-amakpukọ: ọdụm ga-atakwa okporo ọka dị ka ehi. Nwa na-aṅụ ara ga-egwurikwa egwu n’elu ọnụ ajụala nọ, ọ bụkwa anya ubí ka nwa e mere ka Ọ hapụ ara ga-atụkwasị aka ya. Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:6-9) Ọ̀ bụ na okwu ndị a adịghị emetụ n’obi? Rịba ama na udo a kọwara n’ebe a na-abịa site n’ihe ọmụma Jehova. Ya mere, ọ gụnyere ihe karịrị nanị ịnọ ná nchebe pụọ n’aka anụ ọhịa. Ihe ọmụma Jehova agaghị agbanwe anụmanụ, kama ọ ga-enwe mmetụta n’ahụ ụmụ mmadụ. Ọ gaghị adị mkpa ka ụmụ Israel tụọ ụjọ maka anụ ọhịa ma ọ bụ ndị mmadụ yiri anụ ọhịa ma mgbe ha nọ na-ala ma ọ bụkwanụ n’ala ahụ e weghachiri eweghachi.—Ezra 8:21, 22; Aịsaịa 35:8-10; 65:25.

14. Gịnị bụ mmezu ka ukwuu nke Aịsaịa 11:6-9?

14 Otú ọ dị, amụma a nwere mmezu ka ukwuu. Na 1914, e mere ka Jisọs, bụ́ Mesaịa ahụ, nọkwasị n’ocheeze n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe. Na 1919, a tọhapụrụ ihe fọdụrụ ‘n’Israel nke Chineke’ site n’ojiji e ji ha na Babilọn, ha kerekwaara òkè ná mweghachi nke ezi ofufe. (Ndị Galetia 6:16) N’ihi ya, e mepere ụzọ maka mmezu nke oge a nke amụma Aịsaịa banyere Paradaịs. “Mmazu,” bụ́ inwe ihe ọmụma banyere Jehova, agbanwewo àgwà ndị mmadụ. (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Ndị na-emebu ihe ike aghọwo ndị na-eme udo. (Ndị Rom 12:2; Ndị Efesọs 4:17-24) Ihe ndị a merenụ emetụtawo ọtụtụ nde mmadụ ugbu a n’ihi na amụma Aịsaịa abịawo gụnye ọnụ ọgụgụ na-amụba n’ike n’ike nke ndị Kraịst nwere olileanya elu ala. (Abụ Ọma 37:29; Aịsaịa 60:22) Ndị a amụtawo ịtụ anya mgbe a ga-eme ka ụwa nile ghọghachi paradaịs dị nchebe, nke udo dị na ya, dị ka nzube mbụ nke Chineke si dị.—Matiu 6:9, 10; 2 Pita 3:13.

15. Ànyị pụrụ ịtụ anya n’ụzọ ezi uche dị na ya na ihe ndị Aịsaịa kwuru ga-emezu n’ụzọ nkịtị n’ụwa ọhụrụ ahụ? Kọwaa.

15 Na Paradaịs ahụ e weghachiri eweghachi, amụma Aịsaịa ọ̀ ga-enwe mmezu ọzọ, ma eleghị anya n’ụzọ nkịtị karị? O yiri ihe ezi uche dị na ya iche otú ahụ. Amụma ahụ na-enye ndị nile ga-ebi ndụ n’oge ọchịchị Mesaịa ahụ otu mmesi obi ike ahụ o nyere ndị Israel na-alaghachinụ; ha na ụmụ ha agaghị enwe mmetụta nke ịbụ ndị ihe ọ bụla na-eyi egwu—ma ọ bụ ụmụ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ. N’oge ọchịchị Alaeze Mesaịa ahụ, ndị nile bi n’ụwa ga-ebi n’ebe dị jụụ dị ka nke Adam na Iv biri na ya n’Iden. N’ezie, Akwụkwọ Nsọ akọwaghị ihe nile banyere otú ndụ dị n’Iden—ma ọ bụ otú ọ ga-adị na Paradaịs. Otú ọ dị, anyị pụrụ inwe obi ike na n’oge ịchịisi nke Eze Jisọs Kraịst ga-eji amamihe na ịhụnanya chịa, ihe nile ga-adị otú ha kwesịrị ịdị.

E Weghachi Ofufe Dị Ọcha Site n’Aka Mesaịa

16. Olee ihe nọ dị ka ọkọlọtọ nye ndị Chineke na 537 T.O.A.?

16 E busoro ofufe dị ọcha agha nke mbụ ya n’Iden mgbe Setan mere ka Adam na Iv nupụrụ Jehova isi. Ruo taa, ike agwụbeghị Setan n’ebumnobi ya nke bụ́ ime ka ọtụtụ mmadụ, ole o kwere ya mee, si n’ebe Chineke nọ pụọ. Ma ọ dịghị mgbe Jehova ga-ekwe ka ofufe dị ọcha kwụsị ịdị n’ụwa. O metụtara aha ya, ọ na-echekwa banyere ndị na-ejere ya ozi. N’ihi ya, o kwere nkwa dị ịrịba ama site n’ọnụ Aịsaịa, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na mkpọrọgwụ Jesi, nke na-eguzo ịbụ ọkọlọtọ ndị nile dị iche iche, ya ka mba nile ga-ajụ ase; ebe izu ike ya ga-abụkwa ebube.” (Aịsaịa 11:10) Laa azụ na 537 T.O.A., Jerusalem, bụ́ obodo Devid mere ka ọ bụrụ isi obodo mba ahụ, bụ ọkọlọtọ, na-akpọku ndị fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi ná ndị Juu gbasasịrịnụ ka ha laghachi ma wughachi ụlọukwu ahụ.

17. Olee otú Jisọs si ‘bilie ịbụ onyeisi mba nile’ na narị afọ mbụ na n’oge anyị?

17 Otú ọ dị, amụma ahụ na-ezo aka n’ihe karịrị nke ahụ. Dị ka anyị hụwororịị, ọ na-ezo aka n’ịchịisi Mesaịa ahụ, onye nanị ya bụ ezi Onye Ndú nke mba nile. Pọl onyeozi hotara ihe e kwuru n’Aịsaịa 11:10 iji gosi na a ga-anabata ndị mba ọzọ n’ọgbakọ ndị Kraịst n’oge ya. N’ihota ihe e kwuru n’amaokwu a dị ka e si sụgharịa ya na Septuagint, o dere, sị: “Aịsaịa sị, Mkpọrọgwụ ahụ nke Jesi ga-adị, na Onye ahụ Nke na-ebili ịbụ onyeisi mba nile; Onye ahụ ka ndị mba ọzọ ga-ele anya Ya.” (Ndị Rom 15:12) Ọzọkwa, amụma ahụ gakwuru ọbụna n’ihu—ruo n’oge anyị mgbe ndị mba ọzọ na-egosi ịhụnanya ha n’ebe Jehova nọ site n’ịkwado ụmụnna Mesaịa ahụ bụ́ ndị e tere mmanụ.—Aịsaịa 61:5-9; Matiu 25:31-40.

18. N’oge anyị, olee otú Jisọs siworo bụrụ ebe a ga-ezukọta?

18 Ná mmezu ya nke oge a, ‘ụbọchị ahụ’ nke Aịsaịa zoro aka na ya malitere mgbe e mere ka Mesaịa ahụ nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze eluigwe Chineke na 1914. (Luk 21:10; 2 Timoti 3:1-5; Mkpughe 12:10) Kemgbe ahụ, Jisọs Kraịst anọwo na-abụ ọkọlọtọ a na-ahụ anya nke ọma, ebe a ga-ezukọta, nye Israel ime mmụọ na ndị si ná mba nile bụ́ ndị agụụ ọchịchị ezi omume na-agụsi ike. Ná nduzi nke Mesaịa ahụ, e kwusawo ozi ọma nke Alaeze ahụ ná mba nile, dị ka Jisọs buru n’amụma. (Matiu 24:14; Mak 13:10) Ozi ọma a na-enwe mmetụta dị ike. “Oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile” na-edo onwe ha n’okpuru Mesaịa ahụ site n’isonyere ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ n’ofufe dị ọcha. (Mkpughe 7:9) Ka ọtụtụ ndị ọhụrụ nọgidere na-esonyere ihe ahụ fọdụrụnụ “n’ụlọ ekpere” ime mmụọ nke Jehova, ha na-atụkwasị ihe n’ebube nke “ebe izu ike” Mesaịa ahụ, bụ́ oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke.—Aịsaịa 56:7; Hagaị 2:7.

Ndị Dị n’Otu Na-ejere Jehova Ozi

19. Olee ugboro abụọ Jehova weghachiri ihe fọdụrụ ná ndị ya gbasasịrị n’ụwa nile?

19 Aịsaịa chetaziiri ụmụ Israel na Jehova zọpụtara ha n’otu oge mgbe onye iro dị ike na-emegbu mba ahụ. Ndị Juu nile kwesịrị ntụkwasị obi ji akụkụ ahụ nke akụkọ ihe mere eme nke Israel—ntọhapụ Jehova tọhapụrụ mba ahụ n’ịbụ ndị e ji eji n’Ijipt—kpọrọ oké ihe. Aịsaịa na-ede, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na Onyenwe anyị ga-esetịkwa aka Ya ọzọ nke ugboro abụọ inweta ndị Ya fọdụrụ, bụ́ ndị ga-afọdụ, site n’Asiria, sitekwa n’Ijipt, sitekwa na Patrọs, sitekwa na Kush, sitekwa n’Ilam, sitekwa na Shaịna, sitekwa na Hemat, sitekwa n’àgwàetiti nile nke oké osimiri. Ọ ga-ebulikwara mba nile ọkọlọtọ, wee chịkọta ndị Israel a chụpụrụ achụpụ, ndị Juda gbasara agbasa ka Ọ ga-esi na nkuku anọ nke ụwa kpọkọpụtakwa.” (Aịsaịa 11:11, 12) Dị ka a ga-asị na o sekpụ ha n’aka, Jehova ga-esi ná mba dị iche iche ebe ha gbasaworo dupụta ndị kwesịrị ntụkwasị obi fọdụrụ ma n’Israel ma na Juda ma kpọlata ha n’enweghị nsogbu ọ bụla. N’ụzọ dị nta, nke a mere na 537 T.O.A. Otú ọ dị, lee nnọọ ka mmezu ya ka ukwuu ga-esi dị ebube karị! Na 1914, Jehova mere ka Jisọs Kraịst ahụ e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze bilie dị ka ‘ọkọlọtọ nye mba nile.’ Malite na 1919, ihe fọdụrụ ‘n’Israel nke Chineke’ malitere inute n’ọkọlọtọ a, na-enwe ịnụ ọkụ n’obi ikere òkè n’ofufe dị ọcha n’okpuru Alaeze Chineke. Mba ime mmụọ a nke pụrụ iche si “n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla, pụta.”—Mkpughe 5:9.

20. Ịdị n’otu dị aṅaa ka ndị Chineke ga-enwe mgbe ha si Babilọn lọta?

20 Aịsaịa na-akọwa ugbu a ịdị n’otu nke mba ahụ e weghachiri eweghachi. N’izo aka n’alaeze ebe ugwu ahụ dị ka Efraim na n’alaeze ebe ndịda dị ka Juda, o kwuru, sị: “Ekworo nke Efraim ga-ewezụgakwa onwe ya, a ga-ebipụkwa ndị na-akpagbu Juda: Efraim agaghị ekwoso Juda ekworo, Juda agaghị akpagbukwa Efraim. Ha ga-efedakwasị n’ubu ndị Filistia n’Ọdịda anyanwụ; ha abụọ ga-adị n’otu lụta ihe ụmụ Ihu anyanwụ n’agha: n’ahụ Edọm na Moab ka ha ga na-esetị aka ha; ụmụ Amọn ga na-anụkwa olu ha.” (Aịsaịa 11:13, 14) Mgbe ndị Juu si Babilọn lọta, a gakwaghị ekewa ha ịbụ mba abụọ. Ndị si n’ebo nile nke Israel ga-alaghachi n’ala ha n’ịdị n’otu. (Ezra 6:17) Ha agakwaghị na-eweso ibe ha iwe ma na-alụsorịta ibe ha ọgụ. Dị ka ndị dị n’otu, ha ga-emeri ndị iro ha nọ ná mba ndị gbara ha gburugburu.

21. N’ụzọ dị aṅaa ka ịdị n’otu nke ndị Chineke taa si pụọ iche n’ezie?

21 Ịdị n’otu nke “Israel nke Chineke” na-akpali akpali ọbụna karị. Ebo 12 ihe atụ ahụ nke Israel ime mmụọ anọwo eri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 na-enwe ịdị n’otu nke dabeere n’ịhụnanya maka Chineke na maka ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Kọlọsi 3:14; Mkpughe 7:4-8) Taa, ndị Jehova—ma Israel ime mmụọ ma ndị nke nwere olileanya elu ala—nwere udo na ịdị n’otu zuru ụwa ọnụ n’okpuru ịchịisi Mesaịa ahụ, ọnọdụ ndị na-adịghị na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm. Ndịàmà Jehova na-ejikọ aka ọnụ n’ịlụso mgbalị Setan na-eme ịkpaghasị ofufe ha ọgụ n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka otu ndị, ha na-arụ ọrụ Jisọs nyere nke bụ́ ikwusa na ịkụzi ozi ọma Alaeze Mesaịa ahụ ná mba nile.—Matiu 28:19, 20.

A Ga-emeri Ihe Mgbochi

22. Olee otú Jehova ga-esi ‘wezụga ire oké osimiri nke Ijipt’ ma “fegharịa aka Ya n’elu Osimiri”?

22 E nwere ọtụtụ ihe, ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ihe atụ, ga-egbochi ụmụ Israel isi n’ala ọzọ lọta. Olee otú ha ga-esi merie ha? Aịsaịa na-ekwu, sị: “Jehova ga-ewezụga ire oké osimiri nke Ijipt ka e bibie ya; Ọ ga-ejikwa okpomọkụ nke ifufe Ya fegharịa aka Ya n’elu Osimiri, tipụta ya iyi asaa, mee ka mmadụ zọọ ya ụkwụ n’akpụkpọ ụkwụ.” (Aịsaịa 11:15) Ọ bụ Jehova ga-ewepụ ihe nile ga-egbochi ndị ya ịlaghachi. A ga-eme ka ọbụna ihe mgbochi siri ike dị ka ire Osimiri Uhie (dị ka Ọwara Oké Osimiri Suez) ma ọ bụ nke a na-apụghị ịgafe agafe dị ka oké Osimiri Yufretis takọrọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ka mmadụ wee nwee ike ịgafe ya n’eyipụghị akpụkpọ ụkwụ ya!

23. N’ụzọ dị aṅaa ka a ga-esi nwee ‘ụzọ a tụliri atụli site n’Asiria’?

23 N’oge Mosis, Jehova doziere Israel ụzọ isi n’Ijipt gbapụ ma zọrọ ije gaa n’Ala Nkwa ahụ. Ọ ga-eme ihe yiri ya ugbu a: “Ụzọ a tụliri atụli ga-adịkwara ndị Ya fọdụrụ, bụ́ ndị ga-afọdụ, site n’Asiria; dị ka o si dịrị Israel n’ụbọchị o siri n’ala Ijipt rịgopụta.” (Aịsaịa 11:16) Jehova ga-eduru ndị si ala ọzọ na-alọtanụ dị ka a ga-asị na ha na-aga ije n’ụzọ a tụliri atụli site n’ala ọzọ ha si ruo n’ala nna ha. Ndị mmegide ga-agbalị ịkwụsị ha, ma Chineke ha, bụ́ Jehova, ga-anọnyere ha. A na-awakpo ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị òtù ha ajọ mwakpo taa n’otu aka ahụ, ma ha ji obi ike na-aga n’ihu! Ha esiwo n’Asiria nke oge a, bụ́ ụwa Setan, pụta, ha na-enyekwara ndị ọzọ aka ime otú ahụ. Ha maara na ofufe dị ọcha ga-enwe ihe ịga nke ọma ma gbasaa. Ọ bụghị ọrụ aka mmadụ, kama nke Chineke.

Ịṅụrị Ọṅụ Na-enweghị Ọgwụgwụ Nye Ndị Mesaịa ahụ Ga-achị!

24, 25. Mkpu otuto na ekele dịgasị aṅaa ka ndị Jehova ga-eti?

24 N’okwu na-enye ọṅụ, Aịsaịa kọwara ugbu a ọṅụ nke ndị Jehova ga-aṅụrị n’ihi mmezu nke okwu Ya: “Ị ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ, M ga-ekele Gị, Jehova; N’ihi na ọ bụ ezie na I wesara m iwe, ma iwe Gị alaghachiwo azụ, I wee kasie m obi.” (Aịsaịa 12:1) Ahụhụ Jehova nyere ndị ya na-enupụ isi siri ike. Ma o mezuru nzube ya nke bụ́ idozi mmekọrịta ya na mba ahụ na iweghachi ofufe dị ọcha. Jehova mesiri ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-efe ya ofufe obi ike na ya ga-azọpụta ha n’ikpeazụ. Ka a sịkwa ihe mere ha ji na-ekwupụta ekele ha!

25 E wusiri ntụkwasị obi nke ndị Israel ahụ e weghachiri eweghachi nwere n’ebe Jehova nọ ike n’ụzọ zuru ezu, ha tikwara, sị: “Lee, Chineke bụ nzọpụta m; m ga-atụkwasị Ya obi, ghara ịtụ egwu: n’ihi na ike m na abụ ọma m ka Ja Jehova bụ; O wee ghọọrọ m nzọpụta. Unu ga-ejikwa obi ụtọ sepụta mmiri n’isi iyi nile nke nzọpụta.” (Aịsaịa 12:2, 3) Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ike” n’amaokwu nke 2 pụtara dị ka “otuto” ná nsụgharị Septuagint. Ndị na-efe ofufe malitere ịbụ abụ otuto n’ihi nzọpụta sitere n’aka “Ja Jehova.” Dị ka mkpọbiri nke aha ahụ bụ́ Jehova, e ji “Ja” mee ihe n’ime Bible iji gosi mmetụta ka ukwuu nke otuto na ekele. Iji okwu bụ́ “Ja Jehova” eme ihe—ịkpọ aha Chineke ugboro abụọ—na-ebulikwu otuto a na-eto Chineke elu ọbụna karị.

26. Olee ndị taa na-eme ka a mara ọrụ nile nke Chineke n’etiti mba dị iche iche?

26 Ezi ndị na-efe Jehova ofufe apụghị izochi ọṅụ ha. Aịsaịa na-ebu amụma, sị: “Unu ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ, Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha Ya, meenụ ka a mara omume Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche, hotanụ na e mewo ka aha Ya dị elu. Bụkuonụ Jehova abụ ọma; n’ihi na ihe ọkaaka ka O meworo: e mewo ka a mara nke a n’ụwa nile.” (Aịsaịa 12:4, 5) Kemgbe 1919, ndị Kraịst e tere mmanụ—ka oge na-aga site n’enyemaka nke ndị ibe ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ—‘ekwusawo ịdị mma nile nke Onye ahụ kpọpụtara ha n’ọchịchịrị baa n’ìhè Ya dị ebube.’ Ha bụ “ọgbọ ndị a họpụtaworo, . . . mba dị nsọ” ndị e doro iche maka nzube a. (Jọn 10:16; 1 Pita 2:9) Ndị e tere mmanụ na-ekwusa na e mewo ka aha Jehova nke dị nsọ dị elu ma na-ekere òkè n’ime ka a mara ya n’ụwa nile. Ha na-edu ndị nile na-efe Jehova ofufe n’ịṅụrị ọṅụ ná ndokwa ya maka nzọpụta ha. Ọ bụ nnọọ dị ka Aịsaịa tiri ná mkpu: “Tisie mkpu ike, kpọọ mkpu ọṅụ, gị nwanyị bi na Zaịọn n’ihi na onye ukwu n’etiti gị ka Onye Nsọ nke Israel bụ”! (Aịsaịa 12:6) Onye Nsọ nke Israel bụ Jehova Chineke n’onwe ya.

Jiri Obi Ike Na-elepụ Anya n’Ọdịnihu!

27. Ka ha nọ na-echere mmezu nke olileanya ha, gịnị ka ndị Kraịst nwere obi ike na ya?

27 Taa ọtụtụ nde mmadụ enukọtawo ‘n’ọkọlọtọ ndị nile dị iche iche’—Jisọs Kraịst e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze n’Alaeze Chineke. Ha na-aṅụrị ọṅụ ịbụ ndị Alaeze ahụ na-achị, obi dịkwa ha ụtọ ịmata Jehova Chineke na Ọkpara ya. (Jọn 17:3) Ha na-enweta obi ụtọ dị ukwuu site ná mkpakọrịta ndị Kraịst ha na-enwe n’ịdị n’otu ma na-agbalịsi ike ichebe udo ahụ nke bụ́ ihe e ji amata ezi ndị ohu Jehova. (Aịsaịa 54:13) N’ịbụ ndị kwenyesiri ike na Ja Jehova bụ Chineke na-emezu nkwa ya, ha nwere obi ike n’olileanya ha ma na-enweta ọṅụ dị ukwuu n’iso ndị ọzọ ekerịta ya. Ka onye ọ bụla na-efe Jehova ofufe nọgide na-eji ike ya nile na-ejere Chineke ozi ma na-enyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ. Ka mmadụ nile buru ihe Aịsaịa kwuru n’obi ma na-aṅụrị ọṅụ ná nzọpụta nke sitere n’aka Mesaịa Jehova!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a E si n’okwu Hibru bụ́ ma·shiʹach, nke pụtara “Onye E Tere Mmanụ” nweta okwu bụ́ “Mesaịa.” Okwu Grik ya na ya bụ otu bụ Khri·stosʹ, ma ọ bụ “Kraịst.”—Matiu 2:4, nkọwa ala ala peji nke NW.

b Okwu Hibru maka “ome” bụ neʹtser, maka “onye Nazaret” bụkwa Nots·riʹ.

[Foto ndị dị na peeji nke 158]

Mesaịa ahụ bụ “ome” nke si na Jesi pụta, site n’Eze Devid

[Foto dị na peeji nke 162]

[Foto dị na peeji nke 170]

Aịsaịa 12:4, 5, dị ka ọ dị n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ (E gosipụtara ebe ndị aha Chineke pụtara)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya