Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 3/1 p. 8-13
  • Ikpe Jehova Megide Ndị Ozizi Ụgha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikpe Jehova Megide Ndị Ozizi Ụgha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-ejegharịkwa n’Okwu Ụgha”
  • Ikpughe Ịta Ụta Ha
  • Ikpe nke Ndị Ozizi Ụgha
  • Ịkpọsa “Ibu Jehova”
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jeremaịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ebe Mgbaba Ha—Okwu Ụgha!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • “Jehova Emewo Ihe O bu n’Obi”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 3/1 p. 8-13

Ikpe Jehova Megide Ndị Ozizi Ụgha

“N’ahụ ndị amụma Jerusalem ka M hụworo ihe jọgburu onwe ya; ha na-akwa iko, na-ejegharịkwa n’okwu ụgha . . . ha nile aghọworo m ihe dị ka Sọdọm, ndị bi n’ime ya aghọwokwara m ihe dị ka Gọmọra.”​—⁠JEREMAỊA 23:14.

1. N’ihi gịnị ka onye tinyere aka n’izi ihe Chineke ji anakwere nnukwute ibu ọrụ?

ONYE ọ bụla na-etinye aka n’izi ihe Chineke na-eburu ibu dị nnọọ arọ. Jemes 3:1 na-adọ aka ná ntị, sị: “Unu aghọla ọtụtụ ndị ozizi, ụmụnna m, ebe unu matara na anyị ga-anata ikpe ka ukwuu.” Ee, ndị ozizi nke Okwu Chineke nwere ibu ọrụ siri ike inye akụkọ ihe ha mere karịa ndị Kraịst n’ozuzu ha. Gịnị ka nke a ga-apụtara ndị ghọrọ ndị ozizi ụgha? Ọ dị mma, ka anyị lee anya n’ọnọdụ dị n’ụbọchị Jeremaịa. Anyị ga-ahụ otú o si see onyinyo nke ihe na-eme taa.

2, 3. Ikpe dị aṅaa ka Jehova kpere site na Jeremaịa n’ihe banyere ndị nkụzi ụgha nke Jerusalem?

2 Na 647 T.O.A., afọ nke 13 nke ọchịchị Eze Josaịa, e nyere Jeremaịa ọrụ dị ka onye amụma Jehova. Jehova nwere ihe mkpesa megide Juda, ya mere o zigara Jeremaịa ịkpọsa ya. Ndị amụma ụgha, ma ọ bụ ndị ozizi nke Jerusalem na-eme “ihe jọgburu onwe ya” n’anya Chineke. Ịdị njọ ha buru ibu nke ukwuu nke na Chineke jiri Jerusalem na Juda tụnyere Sọdọm na Gọmọra. Jeremaịa isi 23 na-agwa anyị banyere nke a. Amaokwu nke 14 na-asị:

3 “N’ahụ ndị amụma Jerusalem ka M hụworo ihe jọgburu onwe ya; ha na-akwa iko, na-ejegharịkwa n’okwu ụgha, ha emewokwa ka aka ndị na-eme ihe ọjọọ dị ike, ha wee ghara isi, onye ọ bụla n’ihe ọjọọ ya, lata: ha nile aghọworo m ihe dị ka Sọdọm, ndị bi n’ime ya aghọwokwara m ihe dị ka Gọmọra.”

4. Olee otú ihe nlereanya ọjọọ nke omume nke ndị nkụzi Jerusalem si nwee ihe yiri ya na Krisendọm taa?

4 Ee, ndị amụma, ma ọ bụ ndị ozizi ndị a, setịpụrụ ajọ ihe nlereanya nke omume n’onwe ha wee sikwa otú a gbaa ndị ahụ ume ime otu ihe ahụ. Lee ọnọdụ ndị dị na Krisendọm taa! Ọ̀ bụ na ha adịghị nnọọ ka ndị ahụ e nwere n’ụbọchị Jeremaịa? Taa ndị ụkọchukwu na-ekwe ka ndị na-akwa iko bụ́ ndị lụrụ di na nwunye na ndị na-edina ụdị onwe ha nọgide na-abụ ndị ụkọchukwu, ọbụna na-ekwekwa ka ha na-eduzi ofufe nke chọọchị ha. Ọ̀ bụ ihe ijuanya na ọtụtụ ndị òtù chọọchị aha ha dị n’akwụkwọ bụkwa ndị omume ha rụrụ arụ?

5. N’ihi gịnị ka ọnọdụ ịrụ arụ nke Krisendọm ji gabiga nke Sọdọm na Gọmọra?

5 Jehova jiri ndị bi na Jerusalem tụnyere ndị ahụ bi na Sọdọm na Gọmọra. Ma ọnọdụ omume rụrụ arụ nke Krisendọm dị njọ karịa nke Sọdọm na Gọmọra. Ee, n’anya Jehova ụta dịịrị ya ọbụna karị. Ndị ozizi ya na-emebi ụkpụrụ iwu omume ọma nke ndị Kraịst. Nke a kwa na-akpata ọnọdụ nke ndakpọ omume ọma nke ọ bụ n’ime ya ka e nwere ajọ ihe ndọrọ nke ụdị nile maka ime ihe ọjọọ. Ọnọdụ omume nke a dị ebe nile nke na taa a na-ele ihe ọjọọ anya dị ka ihe na-adịghị njọ.

“Na-ejegharịkwa n’Okwu Ụgha”

6. Gịnị ka Jeremaịa kwuru banyere ịjọ njọ nke ndị amụma Jerusalem?

6 Ugbu a rịba ama ihe amaokwu nke 14 na-ekwu banyere ndị amụma Jerusalem. Ha “na-ejegharịkwa n’okwu ụgha.” Akụkụ ikpeazụ nke amaokwu nke 15 na-ekwukwa, sị: “Site ná ndị amụma nke Jerusalem ka mmerụ pụworo jee ruo ala nke a nile.” Mgbe ahụ, amaokwu nke 16 na-atụkwasị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, Unu egela ntị n’okwu nile nke ndị amụma ahụ ndị na-eburu unu amụma; ndị na-eme unu ihe efu ka ha bụ: ọhụụ nke obi ha ka ha na-ekwu, ha adịghị ekwu site n’ọnụ Jehova.”

7, 8. N’ihi gịnị ka ndị ụkọchukwu Krisendọm ji dị ka ndị amụma ụgha Jerusalem, oleekwa otú nke a siworo metụta ndị na-aga chọọchị?

7 Dị ka ndị amụma ụgha nke Jerusalem, ndị ụkọchukwu Krisendọm na-ejegharịkwa n’okwu ụgha, na-agbasa ozizi ndị dapụrụ n’ezi ofufe, ozizi ndị a na-adịghị achọta n’Okwu Chineke. Olee ụfọdụ n’ime ozizi ụgha ndị a? Anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, Atọ n’Ime Otu, pọgatrị, na ọkụ ala mmụọ maka ịta ndị mmadụ ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. Ha na-emekwa ka ntị kọọ ndị na-ege ha ntị ọkọ site n’ikwu ihe ndị mmadụ chọrọ ịnụ. Ha na-ekwu, na-ekwukwasịkwa na ọ dịghị mbibi na-eche Krisendọm ihu n’ihi na o nwere udo nke Chineke. Ma ndị ụkọchukwu na-ekwu “ọhụụ nke obi ha.” Ọ bụ ụgha. Ndị ahụ na-ekwenye ụgha ndị dị otú ahụ bụ ndị a na-eme nsí n’ụzọ ime mmụọ. A na-eduhie ha gaa ná mbibi ha!

8 Tụlee ihe Jehova na-ekwu banyere ndị ozizi ụgha ndị a n’amaokwu nke 21: “Eziteghị m ndị amụma ahụ, ma ha onwe ha gbara ọsọ: agwaghị m ha okwu, ma ha onwe ha buru amụma.” Ya mere taa, ọ bụghị Chineke zitere ndị ụkọchukwu, ọ bụghịkwa eziokwu ya ka ha na-ezi. Gịnị si na ya pụta? Ajọ amaghị Bible dị n’etiti ndị na-aga chọọchị n’ihi na ndị ozi ha na-enye ha nkà ihe ọmụma dị iche iche nke ụwa.

9, 10. (a) Ụdị nrọ ndị dị aṅaa ka ndị ozizi ụgha nke Jerusalem rọrọ? (b) Olee otú ndị ụkọchukwu Krisendọm siworo n’otu aka ahụ kụzie “nrọ ụgha”?

9 Ọzọkwa, ndị ụkọchukwu taa na-agbasa olileanya ụgha. Rịba ama amaokwu nke 25: “Anụwo m ihe ahụ nke ndị amụma sịrị, bụ́ ndị na-ebu amụma ụgha n’aha m, sị, Arọwo m nrọ, arọwo m nrọ.” Ụdị nrọ dị aṅaa ka ha bụ? Amaokwu nke 32 na-agwa anyị, sị: “Lee, Mụ na-emegide ndị na-ebu amụma nrọ ụgha, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), ha wee zee ha, mee ka ndị m kpafuo site n’okwu ụgha nile ha na n’obi ha na-adịghị n’otu ebe: ma Mụ onwe m eziteghị ha, enyeghịkwa m ha iwu; ọ dịghịkwa uru ha ga-abara ndị nke a ma ọlị; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”

10 Olee nrọ, ma ọ bụ olileanya ụgha ndị ụkọchukwu kụziworo? Ee, na nanị olileanya dịịrị mmadụ maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi taa bụ òtù United Nations. N’afọ ndị na-adịchabeghị anya gara aga, ha akpọwo òtù UN “olileanya ikpeazụ e nwere maka nkwekọrịta na udo,” “ebe kasị elu a pụrụ isi nweta udo na ikpe ziri ezi,” “olileanya nkịtị bụ isi maka udo nke ụwa.” Lee nduhie nke ahụ bụ! Nanị olileanya dịnụ maka ihe a kpọrọ mmadụ bụ Alaeze Chineke. Ma ndị ụkọchukwu adịghị ekwusa ma na-akụzi eziokwu banyere ọchịchị eluigwe ahụ, nke bụ isiokwu bụ isi nke nkwusa Jisọs.

11. (a) Ndị ozizi ụgha nke Jerusalem nwere mmetụta ọjọọ dị aṅaa n’aha Chineke nwere n’onwe ya? (b) N’ụzọ megidere nke òtù Jeremaịa ahụ, gịnị ka ndị ozizi okpukpe ụgha nke oge a meworo n’ihe banyere aha Chineke?

11 Amaokwu nke 27 na-agwa anyị ihe ndị ọzọ. “Ndị na-eche echiche ime ka ndị m chezọọ aha m site ná nrọ nile ha nke ha na-ezerịtara ibe ha n’otu n’otu, dị ka ndị bụ nna ha chezọrọ aha m site na Beal.” Ndị amụma ụgha nke Jerusalem mere ka ndị ahụ chezọọ aha Chineke. Ọ̀ bụ na ndị ozizi ụgha nke okpukpe taa emebeghị otu ihe ahụ? Nke ka njọ, ha na-ekpuchi aha Chineke, bụ́ Jehova. Ha na-akụzi na ọ dịghị mkpa iji ya na-eme ihe, ha na-ewepụkwa ya site ná nsụgharị Bible ha. Ha na-emegidekwa onye ọ bụla na-ezi ndị mmadụ na aha Chineke bụ Jehova n’ụzọ siri ike. Ma òtù Jeremaịa ahụ, ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst ahụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ha na ndị na-esonyere ha, emewo nnọọ dị ka Jisọs mere. Ha akụziworo ọtụtụ nde mmadụ banyere aha Chineke.​—⁠Jọn 17:6.

Ikpughe Ịta Ụta Ha

12. (a) N’ihi gịnị ka e ji nwee oké ikpe ọmụma ọbara n’akụkụ nke ndị ozizi ụgha nke okpukpe? (b) Gịnị bụworo òkè ndị ụkọchukwu keere n’agha ụwa abụọ?

12 Òtù Jeremaịa ahụ ekpughewo ndị ụkọchukwu ọtụtụ mgbe dị ka ndị ozizi ụgha, ndị na-eduru ìgwè atụrụ ha na-aga n’ụzọ ahụ dị obosara nke ịla n’iyi. Ee, ihe fọdụrụ ahụ emewo ka o doo anya ihe mere ndị ahụ na-arọ nrọ ji kwesị ikpe ọmụma nke Jehova. Dị ka ihe atụ, ndị ohu Jehova ezowo aka ọtụtụ ugbo ná Mkpughe 18:24, bụ́ nke na-asị na a chọtara n’ime Babilọn Ukwu ahụ ọbara nke “ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.” Chee echiche banyere agha nile a lụworo n’ihi esemokwu dị iche iche nke okpukpe. Lee ịdị ukwuu nke ikpe ọmụma ọbara nke na-adịkwasị ndị ozizi ụgha nke okpukpe! Ozizi ha akpatawo nkewa ma mekwuo ka e nwee ịkpọasị nke ndị nọ n’okpukpe na mba dị iche iche. Banyere Agha Ụwa Mbụ, akwụkwọ bụ́ Preachers Present Arms na-ekwu, sị: “Ndị ụkọchukwu [ndị ndú okpukpe] nyere agha ahụ mkpali ime mmụọ dị mkpa na nkwali. . . . Chọọchị si otú a bụrụ akụkụ siri ike nke usoro agha ahụ.” Otu ihe ahụ bụ eziokwu n’Agha Ụwa nke Abụọ. Ndị ụkọchukwu kwadoro mba ndị ahụ na-alụ agha n’ụzọ zuru ezu ma gọzie ndị agha ha. Agha ụwa abụọ malitere na Krisendọm nke ọ bụ n’ime ya ka ndị nọ n’otu okpukpe gburịtara ibe ha. Ọnọdụ ndị na-emetụtaghị okpukpe na ndị metụtara okpukpe n’ime Krisendọm anọgidewo na-akpata nkwafu ọbara ruo n’oge dị ugbu a. Lee mmetụta ọjọọ nke ozizi ụgha ha nweworo! 

13. Olee otú Jeremaịa 23:22 si nwapụta na ndị ụkọchukwu Krisendọm esoghị Jehova enwe mmekọrịta ọ bụla?

13 Biko rịba ama Jeremaịa isi 23, amaokwu nke 22: “Ma ọ bụrụ na ha guzorị n’ìzù nzuzo nke m, ha ga-emeworị ka ndị m nụrụ okwu m nile, ha ga-emeworịkwa ka ha si n’ụzọ ọjọọ ha na n’ihe ọjọọ nke omume nile ha, lata.” Ọ bụrụ na ndị amụma nke okpukpe Krisendọm na-eguzo n’ìzù nzuzo nke Jehova, ná mmekọrịta chiri anya nke ha na ya dị ka hà bụ ohu kwesịrị ntụkwasị obi na nke nwekwara uche, mgbe ahụ ha onwe ha ga na-ebi n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke. Ha onwe ha gakwa na-emeworị ka ndị Krisendọm na-anụ okwu Chineke n’onwe ya. Kama nke ahụ, ndị ozizi ụgha nke oge a emewo ka ndị na-eso ụzọ ha bụrụ ndị ohu kpụrụ ìsì nke Onye Na-ebuso Chineke Iro, bụ́ Setan Ekwensu.

14. Mkpughe dị ike dị aṅaa e kpughere ndị ụkọchukwu Krisendọm ka e mere na 1958?

14 Mkpughe a na-ekpughe ndị ụkọchukwu site n’aka òtù Jeremaịa ahụ abụrụwo nke siri ike. Dị ka ihe atụ, ná Mgbakọ Mba Nile nke Uche Chineke nke Ndịàmà Jehova e mere na 1958 na New York City, osote onye isi oche nke Watch Tower Society kwuru okwu nke kwuru n’akụkụ, sị: “N’ekwughị okwu na-edoghị anya ma ọ bụ enweghị ihe ịla azụ anyị na-akpọsa okpukpe na-ezighị ezi, okpukpe ụgha, dị ka ihe bụ isi na-akpata mpụ, isi ike, ịkpọasị, esemokwu, ibu iro, . . . na ajọ ọgba aghara; nke onye nọ n’azụ ya bụ onye iro mmadụ ahụ a na-adịghị ahụ anya, bụ́ Setan Ekwensu. Ndị ikom aka ha kasị dịrị n’ọnọdụ dị n’ụwa bụ ndị ndú na ndị nkụzi nke okpukpe; ndị kasị bụrụ ndị ụta dịịrị ná ndị a bụ ndị ụkọchukwu okpukpe nke Krisendọm. . . . Mgbe afọ ndị a dum gasịrị kemgbe Agha Ụwa Mbụ, mmekọrịta dị n’etiti Chineke na Krisendọm yiri nke Israel n’ụbọchị Jeremaịa. Ee, Krisendọm na-eche mbibi na-atụ egwu ihu na nke na-ebibi ihe karịa nke ahụ Jeremaịa hụrụ ka o mere Jerusalem.”

Ikpe nke Ndị Ozizi Ụgha

15. Amụma ndị dị aṅaa nke udo ka ndị ụkọchukwu buworo? À ga-emezu ha?

15 N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị nke a, olee otú ndị ụkọchukwu siworo mee omume kemgbe ahụ? Dị nnọọ ka amaokwu nke 17 na-akọ: “Ha nọ na-asị ndị na-elelị m, Jehova ekwuwo okwu, sị, Udo ga-adịrị unu; ọ bụkwa onye ọ bụla nke na-ejegharị n’isi ike nke obi ya ka ha sịworo, Ihe ọjọọ agaghị abịakwasị unu.” Nke a ọ̀ bụ eziokwu? Ee e! Jehova ga-ekpughe okwu ụgha nke amụma ndị a nke ndị ụkọchukwu. Ọ gaghị emezu ihe ha na-ekwu n’aha ya. Otú ọ dị, mmesi obi ike ụgha nke ndị ụkọchukwu na e nwere udo n’ebe Chineke nọ bụ nke na-eduhie eduhie nke ukwuu!

16. (a) Olee ọnọdụ omume e nwere n’ụwa a, ònye sokwa na-ekere ụta maka ya? (b) Gịnị ka òtù Jeremaịa ahụ na-eme banyere echiche ndị rụrụ arụ banyere omume n’ụwa a?

16 Ị̀ na-eche sị, ‘Gịnị, na ozizi ụgha nke ndị ụkọchukwu pụrụ iduhie m? Ọ pụghị ime ma ọlị!’ Chere o, obi esila gị oké ike! Cheta na ozizi ụgha nke ndị ụkọchukwu akwalitewo ajọ ọnọdụ omume nke na-atụ egwu. Ozizi ha nke na-anakwere ihe nile na-akwado ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile, n’agbanyeghị otú ọ jọruru ná njọ n’ụzọ omume rụrụ arụ. Ọnọdụ omume nke a dakpọrọ adakpọ ejupụtawo n’akụkụ nile nke ntụrụndụ, sịnịma, TV, magazin, na egwú. Mgbe ahụ anyị aghaghị ịkpachapụ anya n’ụzọ dị ukwuu, ma ọ́ bụghị ya anyị ga-ada n’okpuru mmetụta nke ọnọdụ omume nke a dakpọrọ adakpọ ma bụrụ nke ji ụzọ aghụghọ na-adọrọ adọrọ. Vidio na egwú na-emerụ emerụ pụrụ ịmata ndị na-eto eto n’ọnyà. Cheta na àgwà nke a nke bụ na ọ dịghị ihe dị njọ n’ihe ọ bụla, bụ́ nke ndị mmadụ nwere taa, bụ ihe si kpọmkwem n’ozizi ụgha dị iche iche nke ndị ụkọchukwu na ọdịda ha dara ịkwado ụkpụrụ ezi omume nke Chineke pụta. Òtù Jeremaịa na-alụ ọgụ megide echiche ndị a rụrụ arụ, ọ na-enyekwara ndị na-ejere Jehova ozi aka ịjụ ihe ọjọọ nke na-erikpu Krisendọm.

17. (a) Dị ka Jeremaịa kwuru, ikpe dị aṅaa gaje ịbịakwasị Jerusalem na-eme ihe ọjọọ? (b) Gịnị ga-eme Krisendọm n’isi nso?

17 Ikpe dị aṅaa ka ndị ozizi ụgha nke Krisendọm ga-anata n’aka Jehova, Onyeikpe ukwu ahụ? Amaokwu nke 19, 20, 39, na 40 na-aza: “Lee, oké ifufe Jehova, bụ́ ọnụma Ya, apụwo, ọbụna oké ifufe na-efesi ike gburugburu: n’isi ndị na-emebi iwu ka ọ ga-efekwasị sie ike. Iwe Jehova agaghị alaghachi azụ, ruo mgbe O mere ya, ruokwa mgbe O mere ka ihe nzube nile nke obi Ya guzosie ike: . . . M ga-echezọsịkwa unu, chụpụ unu na obodo ahụ nke M nyere unu, nyekwa nna unu hà, n’ihu m; M ga-etinyekwasịkwa unu ịta ụta dị mgbe ebighị ebi, ya na itinye n’ọnọdụ ihere dị mgbe ebighị ebi, nke agaghị echezọ echezọ.” Ihe ahụ nile mere Jerusalem ahụ na-emebi iwu na ụlọ nsọ ya, ugbu a kwa, mbibi yiri nke ahụ ga-adakwasị Krisendọm ahụ na-emebi iwu n’isi nso!

Ịkpọsa “Ibu Jehova”

18, 19. “Ibu Jehova” dị aṅaa ka Jeremaịa maara Juda ọkwa ya, oleekwa ihe ndị o metụtara?

18 Ya mere, gịnị bụ ibu ọrụ nke òtù Jeremaịa na ndị na-esonyere ha? Amaokwu nke 33 na-agwa anyị, sị: “Ma mgbe ndị nke a, ma ọ bụ onye nchụàjà, ga-ajụ gị, sị, Gịnị bụ ibu Jehova na-ebo? Ị ga-asịkwa ha, Gịnị bụ ibu? ọ bụ na a hapụwo m unu; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”

19 Okwu Hibru maka “ibu” nwere ihe abụọ ọ pụtara. Ọ pụrụ izo aka ná nkwupụta dị arọ nke Chineke ma ọ bụ ihe na-anyịda mmadụ ma na-eme ka ike gwụ mmadụ. N’ebe a okwu ahụ bụ́ “ibu Jehova na-ebo” na-ezo aka n’amụma dị arọ​—⁠nkwupụta na a gaje ibibi Jerusalem. Ndị mmadụ hà nwere mmasị ịnụ okwu amụma ndị dị otú ahụ dị arọ nke sitere n’aka Jehova, bụ́ nke Jeremaịa gwara ha ugboro ugboro? Ee e, ndị ahụ chịrị Jeremaịa ọchị: ‘Olee amụma (ibu) i nwere ugbu a? Anyị ji n’aka na amụma gị ga-abụ ibu ọzọ na-agwụ ike!’ Ma gịnị ka Jehova gwara ha? Ọ bụ nke a: “Gịnị bụ ibu? Ọ bụ na a hapụwo m unu.” Ee, ndị a bụ ibu nye Jehova, ọ gajekwa iwepụ ha ka ha ghara ịbụkwara ya ibu arọ.

20. Gịnị bụ “ibu Jehova” taa?

20 Gịnị bụ “ibu Jehova na-ebo” taa? Ọ bụ ozi amụma dị arọ sitere n’Okwu Chineke. O jupụtara ná mbibi, na-ama ọkwá mbibi dị nso nke Krisendọm. Nye ndị Jehova, anyị nwere ibu ọrụ dị arọ ikwusa ‘ibu nke a Jehova na-ebo.’ Ka ọgwụgwụ ahụ na-abịa nso, anyị aghaghị ịgwa mmadụ nile na ndị Krisendọm na-akpa àgwà ọjọọ bụ “ibu,” ee, ‘oké ibu!’ nye Jehova Chineke, nakwa na n’oge na-adịghị anya ọ ga-anapụ onwe ya “ibu” nke a site n’ịhapụ Krisendọm ka ọdachi bịara ya.

21. (a) Gịnị mere e ji bibie Jerusalem na 607 T.O.A.? (b) Mgbe mbibi Jerusalem gasịrị, gịnị mere ndị amụma ụgha na ezi onye amụma nke Jehova, na-enye anyị ihe imesi obi ike dị aṅaa?

21 E mezuru ihe Jehova kpere n’ikpe n’ụbọchị Jeremaịa mgbe ndị Babilọn bibiri Jerusalem na 607 T.O.A. Dị ka e buru n’amụma, nke ahụ bụ ‘ịta ụta na ihere’ nye ndị Israel isi ike ahụ na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi. (Jeremaịa 23:​39, 40) O gosiri ha na Jehova, onye ha kparịworo ọtụtụ ugbo, agbahapụwo ha n’ikpeazụ nye ụgwọ ọrụ nke ịdị njọ ha. N’ikpeazụ e mere ka ọnụ nke ndị amụma ụgha ha dị mpako mechie. Ma ọnụ Jeremaịa nọgidere na-ebu amụma. Jehova agbahapụghị ya. N’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ nke a, Jehova agaghị agbahapụ òtù Jeremaịa mgbe mkpebi ya dị arọ dugara n’igwepịa ndụ nke ndị ụkọchukwu Krisendọm na ndị na-ekwenye n’ụgha ha.

22. Gaa n’ọnọdụ dị aṅaa ka ikpe Jehova ga-eweta Krisendọm?

22 Ee, ọnọdụ ịtọgbọrọ nkịtị, nke enweghị ndị obibi nke Jerusalem mgbe 607 T.O.A. gasịrị bụ kpọmkwem ihe Krisendọm na-ekpe okpukpe ga-adị ka ya mgbe a napụsịrị ya akụ na ụba ya ma kpughee ya n’ụzọ na-eme ihere. Nke a bụ ikpe kwesịrị ekwesị Jehova kpebiworo megide ndị ozizi ụgha. Ikpe ahụ agaghị ada. Dị nnọọ ka ozi nile nke ịdọ aka ná ntị Jeremaịa nke sitere n’ike mmụọ nsọ mezuru n’oge gara aga, otú a ka ha ga-emezu ná mmezu ha nke oge a. Ya mere, ka anyị dị ka Jeremaịa. Ka anyị kwusaara ndị mmadụ ibu amụma nke Jehova na-ebo n’atụghị egwu, ka wee mara ihe mere na ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu nke ikpe ezi omume ya ga-eji bịakwasị ndị ozizi ụgha nile nke okpukpe!

Ajụjụ Ntụleghachi

◻ Ruo ókè hà aṅaa ka Jerusalem oge ochie dịruru njọ n’anya Jehova?

◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Krisendọm ‘jegharịworo n’ụgha’?

◻ Olee otú e siworo kpughee ikwesị ịta ụta nke ndị ụkọchukwu nke taa?

◻ “Ibu Jehova” dị aṅaa ka a na-akpọsa ugbu a?

[Foto dị na peeji nke 8]

Ndị amụma Jerusalem mere “ihe jọgburu onwe ya”

[Foto dị na peeji nke 9]

“Ọhụụ nke obi ha ka ha na-ekwu”

[Foto dị na peeji nke 10]

Jerusalem mgbe mbibi ya gasịrị mere ihe atụ nke ihe ga-emesịa dabara Krisendọm

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya