Isi 14
Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ ahụ Gasịa—Alaeze Narị Afọ Iri Ahụ
1, 2. (a) Olee ndị ka a pụrụ iji tụnyere ọtụtụ nde ndị na-erite uru ịrụ ọrụ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ taa? (b) Gịnị bụ ọdịdị nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
ỌTỤTỤ nde mmadụ taa gburugburu ụwa anataworị ngọzi ndị dị ukwuu n’ihi ịrụ ọrụ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ọ bụ ezie na ha anọghị n’ime ya. Ha dị ka ndị ọbịa na-abụghị ndị Israel bụ́ ndị biri n’Israel n’ụbọchị ndị ahụ mgbe ọgbụgba ndụ Iwu Mosis ka nọ n’ọrụ. (Ọpụpụ 20:10) Olee otú nke a siworo bụrụ otú ọ dị n’ihe banyere ọtụtụ nde dị otú a na-aba ụba, ndị na-enweta abamuru, bụ́ ndị ahụ e jikọtara ha na ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ nke ndị Israel ime mmụọ taa?
2 N’amụma nke Jeremaịa 31:31-34, Onye ahụ nke na-ekwupụta otú a ga-esi mee ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ kwuru, sị: “M ga-etinye iwu M n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka M ga-edekwasị ya dị ka n’akwụkwọ; M ga-abụkwara ha Chineke, ha onwe ha ga-abụkwara M otu ndị.”
3. (a) N’ụdị dị aṅaa ka e nyere Israel iwu ọgbụgba ndụ ochie ahụ nke Mosis? (b) Tupu a malite ide Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, olee ebe Chineke mere ka e dee iwu dị iche iche nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
3 N’ihe banyere ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, site n’onye amụma bụ Mosis dị ka onye ogbugbo, Jehova Chineke nyere mba Israel anụ ahụ ‘ihe e ji aka dee n’akwụkwọ, bụ́ ihe e dere n’iwu.’ (Ndị Kọlọsi 2:14) Otú ọ dị, gịnị banyere iwu nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? Onye Ogbugbo ya agajeghị idekwasị ya n’elu nkume, ma ọ bụ dee ya n’elu ihe odide ochie. Onye Ogbugbo ya ahapụghị ihe odide ọ bụla nke onwe ya. Anyị na-amata ihe bụ iwu nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ site n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst bụ́ nke e dere n’ike mmụọ nsọ. (2 Timoti 3:16) Ma ọbụna tupu amalite ide Akwụkwọ Nsọ Grik ndị ahụ, site n’ihe dị ka 41 O.A., Jehova Chineke malitere ide iwu ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Olee mgbe ọ bụ? N’ụbọchị Pentikọst, 33 O.A. N’olee ebe? Kpọmkwem n’ebe ahụ o buworo ụzọ n’ogologo oge gara aga kwee nkwa ide ya: “M ga-etinye iwu m n’uche ha, ọ bụkwa n’obi ha ka m ga-edekwasị ha dị ka n’akwụkwọ.”—Ndị Hibru 8:10.
4. Chineke ide iwu ya n’obi na itinye ya n’uche nke ndị ohu ya ga-enwe mmetụta ọma ndị dị aṅaa?
4 N’ịbụ nke e dekwasịrị n’obi, o yichaghị ka ndị na-erubere iwu ndị ahụ isi hà ga-akwụsị ịhụ ha n’anya. Ọ bụrụ na e tinyere iwu ndị ahụ “n’uche ha,” o yichaghị ka ha ga-echefu ha. N’ihi ya, ndị na-edebe iwu ndị ahụ na-ekwu n’okwu ndị ahụ nke Abụ Ọma 119:97, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.” Site n’ebe kasị dịrị omimi n’ime onwe ha, ha na-atụkwasị ịhụnanya ha n’iwu Jehova dị ka e nyere ya site n’aka n’Onye Ogbugbo ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Otú a, site ná nkwali ziri ezi, ha na-ekpebisi ike idebe iwu ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa. Nke a metụtara ma “ìgwè atụrụ nta” ahụ dị n’ime n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ma “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke “atụrụ ọzọ” ahụ bụ́ ndị na-anọghị n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, kama n’okpuru ya.—Tụlee 1 Jọn 5:3; Jọn 14:15.
Idote Ihe Iseokwu Banyere Alaeze ahụ n’Ihu!
5. Gịnị ka Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ buru amụma ya na Matiu 24:12-14?
5 Ndị na-edebe iwu dị iche iche nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ adịghị anwa anwa ịdaba n’ihe ahụ Onye Ogbugbo ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, buru n’amụma dị ka akụkụ nke “ihe ịrịba ama . . . nke ọgwụgwụ oge a”: “N’ihi na ihe na-emebi iwu ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi. Ma onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta. A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.”—Matiu 24:3, 12-14.
6. (a) Matiu 24:14 ọ̀ bụ amụma nkịtị? (b) Olee ndị werewooro ya dị ka ihe karịrị amụma, gịnịkwa ka a pụrụ ikwu banyere ntachi obi ha?
6 Okwu ikpeazụ nke a banyere ịgba àmà zuru ụwa ọnụ nye Alaeze ahụ abụghị okwu amụma nkịtị. Ọ bụ okwu ntụzi maka ndị na-eso ụzọ ya na-ebi n’oge “ọgwụgwụ oge a.” Ọ bụ ihe nduzi maka ụzọ ime ihe ha nke ziri ezi ruo ọgwụgwụ zuru ezu nke usoro ihe nke a nke na-adịghị ahụ n’anya na nke jupụtara ná mmebi iwu n’ozuzu ya, ọ bụghị nanị akwanyereghị iwu Chineke ùgwù. Olee ndị taa gosiworo onwe ha ịbụ ezi ndị Kraịst, na-ewere okwu ndị ahụ nke Jisọs Kraịst dị ka okwu ntụzi dịịrị ha? Eziokwu ndị nke akụkọ ihe mere eme nke mụbaworo kemgbe 1919 na-aza n’ụzọ eziokwu, sị, “Ndịàmà Jehova”! Mkpọsa ihu ọha ha nke nkụzi Bible banyere Alaeze ahụ bụ nke kasịnụ n’ihe ndekọ e nwere, ha egosiwokwa ntachi obi n’ime ya n’ime 76 afọ ndị gafeworonụ. Kwa afọ ugbu a, ọ na-eto n’ibu na n’ike.
7, 8. (a) N’oge Agha Ụwa Mbụ, gịnị ka Setan nwara ime ndị nọ n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (b) N’oge ahụ dị mgbe agha gasịrị, olee otú ihe iseokwu banyere Alaeze ahụ si pụta n’ihu?
7 Setan bụ Ekwensu nwara igbochi mkpọsa nkụzi Bible nke a pụrụ iche site n’ime ka e kpochapụ ihe fọdụrụ ahụ dị nta nke ndị Israel ime mmụọ n’oge Agha Ụwa Mbụ. Ọ dara! Ngwa ngwa, mgbe a tụteghachiri ha site n’ọnọdụ yiri nke ọnwụ n’oge ọkọchị nke 1919, ha nwere mgbakọ mbụ ha mgbe agha gasịrị na Cedar Point, Ohio, na September nke afọ ahụ. Ná mgbakọ nke abụọ na Cedar Point na September 1922, ihe iseokwu banyere Alaeze ahụ pụtara n’ihu ihu. N’ụbọchị nke anọ nke mgbakọ ahụ, bụ́ nke isiokwu ya bụ “Ụbọchị Ahụ,” onye isi oche nke Watch Tower Society wetara isiokwu nke a na-akpali akpali ná njedebe nke dị ebube site n’iti mkpu sị:
8 “Ya mere laghachinụ n’ubi, unu ụmụ nke Chineke Onye Kasị Ihe Nile Elu! Yikwasịnụ ihe agha unu! Nweenụ anya udo, mụrụnụ anya, na-arụsinụ ọrụ ike, nweenụ anya ike. Bụrụnụ ezi ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Onyenwe anyị. Gaanụ n’ihu n’agha ahụ ruo mgbe akụkụ nile nke Babilọn ghọrọ ihe tọgbọrọ n’efu. Zisaanụ ozi ahụ n’ebe nile. Ụwa aghaghị ịmara na Jehova bụ Chineke, na Jisọs Kraịst bụkwa Eze kasị ndị eze nile na Onyenwenụ kasị ndị nwenụ nile. Nke a bụ ụbọchị kasị ụbọchị nile. Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị mgbasa ozi ya. Ya mere, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na Alaeze ya.”
Iji Nghọta Ka Ukwuu Na-amata Jehova
9. (a) N’ihi ihe àmà na-aba ụba banyere ọchịchị ezi omume ahụ, olee ebe ndị mmadụ na-aghaghị iguzo? (b) Ihe ọmụma dị aṅaa ka a na-enye ndị ahụ na-ewere nguzo dị mma?
9 Ọ karịwo ugbu a ihe dị ka 80 afọ kemgbe e mere ka Kraịst nọkwasị n’ocheeze n’ike Alaeze na 1914. Kemgbe ahụ, ihe àmà e nwere banyere ọchịchị ezi omume nke Chineke abawo ụba n’ụzọ dị ukwuu. Ndị nke ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ aghaghị inwe ebe ha guzo n’ihe banyere ihe iseokwu Alaeze ahụ, ịdịnyere Alaeze ahụ ma ọ bụ imegide ya. Ndị na-eguzokwa n’akụkụ nke ọchịchị Chineke ahụ ka a na-emezu n’ebe ha nọ okwu ndị a dị mkpa nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ: “Ha agaghị emekwa onwe ha ka ha mụta ọzọ, onye ọ bụla o mee ka onye agbata obi ya mụta, onye ọ bụla o meekwa ka nwanne ya mụta, sị, Maranụ Jehova: n’ihi na ha nile ga-amara mụ onwe m, site n’onye dịkarịsịrị nta n’ime ha wee ruo onye dịkarịsịrị ukwuu n’ime ha.”—Jeremaịa 31:34.
10. (a) Ya mere n’aha dị aṅaa ka ihe fọdụrụ nke ndị Israel ime mmụọ malitere ịnabata “atụrụ ọzọ” ahụ? (b) Ihe ọmụma dị aṅaa ka “atụrụ ọzọ” ahụ nwetara?
10 Na 1935 ihe fọdụrụ ahụ nke ndị Israel ime mmụọ malitere ịnabata “atụrụ ọzọ” nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ n’ime mmekọrịta siri ike nke ha na ha n’ime “otu ìgwè atụrụ” ahụ dị n’okpuru Jisọs Kraịst, ha nile wee bụrụ Ndịàmà Jehova. Mgbe ahụ “atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị malitere ibu ibu ịghọ “oké ìgwè mmadụ” nke na-enweghị ọnụ ọgụgụ e bu ụzọ kaa aka, malitere ịdị “na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu,” “na-enwekwa àmà nke Jisọs,” ha na ihe fọdụrụ ahụ e ji mmụọ nsọ mụọ. (Mkpughe 7:9-17; 12:17) Otú a site ná mmalite na 1935, “atụrụ ọzọ” ndị a matakwara Jehova “site n’onye dịkarịsịrị nta n’ime ha wee ruo onye dịkarịsịrị ukwuu n’ime ha.”
11. Olee otú ihe ọmụma Jehova nke ndị Kraịst si dị iche, dịkwa mma karịa nke ndị Juu ahụ nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ?
11 Otú ọ dị, n’ụzọ dị aṅaa ka ihe ọmụma ndị Kraịst nwere banyere Jehova si dị iche ma dịrị mma karịa ihe ọmụma nke ndị Juu nwere n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu Mosis nke meworo ochie? Onye ahụ dị n’eluigwe nke mere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ gara n’ihu ịgwa anyị sị: “N’ihi na m ga-agbaghara ajọ omume ha, m gaghị echetakwa mmehie ha ọzọ.” (Jeremaịa 31:34; Ndị Hibru 8:12) Nke a dị otú a n’ihi eziokwu ahụ nke bụ na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ nke e wukwasịrị n’àjà ka mma site n’Onye Ogbugbo ka mma. (Ndị Hibru 8:6; 9:11, 12, 22, 23) Àjà ka mma nke Onye Ogbugbo ka mma adịghị mkpa ka a na-achụghachi ya, dị ka n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie a na-eme kwa afọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu Mosis nke meworo ochie. (Ndị Hibru 10:15-18) N’ihi ihe ndị a nile, ihe ọmụma Jehova nke ndị ahụ nọ n’ime na n’okpuru ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nwere ka mma n’ezie, baa uru karị, na-enye ihe ọmụma karị, zuo ezuo karịa ihe ọmụma Chineke nke ndị Juu nwere n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ.
12. Karịsịa ihe nile, ọkwá dị aṅaa ka Jehova ji n’ebe ndị a kpọbatara n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na ndị nọ n’okpuru ya nọ?
12 Karịsịa ihe nile, Jehova Chineke, Onye Mere Ọgbụgba Ndụ ahụ, bụ Eze n’elu ndị ahụ ọ na-akpọbata n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na n’elu ndị ahụ ọ na-edote n’okpuru ya. (Matiu 5:34, 35; Jeremaịa 10:7) Pọl onyeozi, 1,850 afọ tupu e mee ka Jisọs nọkwasị n’ocheeze n’eluigwe na 1914 dị ka Eze, zoro aka n’ịbụ eze nke Jehova n’elu ndị ahụ na-erubere iwu dị iche iche nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ isi, na-asị: “Ma Eze nke mgbe nile, nke a na-apụghị imebi emebi, nke a na-apụghị ịhụ anya, onye nanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto dịrị ya ruo mgbe nile ebighị ebi. Amen.”—1 Timoti 1:17.
Alaeze Narị Afọ Iri ahụ Mgbe “Oké Mkpagbu ahụ” Gasịrị
13. (a) Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa ka “oké ìgwè mmadụ” ahụ ga-aba ná ngọzi dị iche iche nke na-erupụta site n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’ụzọ zuru ezu? (b) Nzube ukwu dị aṅaa ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-emezuworị?
13 “Oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ, ndị na-anọghị n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ kama bụrụ ndị nọ n’okpuru ya, na-enwe olileanya isi n’ime “oké mkpagbu ahụ” pụta ná ndụ. Mgbe e bibisịrị usoro ihe nke a mbibi na-eche ihu ruo otu puku afọ, ha ga-enwe ọṅụ n’ịchịisi nke Jisọs Kraịst na ndị nketa ibe ya n’elu ụwa ahụ nke e mere ka ọ dị ọcha. (Mkpughe 7:9-14) Mgbe ahụ a ga-emezuworị nzube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nke iwepụta ‘ndị bụ ihe onwunwe pụrụ iche’ ịbụ ndị nketa nke Alaeze eluigwe nke Chineke. (1 Pita 2:9; Ọrụ 15:14) Site n’Alaeze Chineke, ngọzi dị iche iche ga-eruru “oké ìgwè mmadụ” ahụ lanarịrị alanarị nke “atụrụ ọzọ” n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu. Setan bụ Ekwensu na nzukọ ndị mmụọ ọjọọ ya nke anya na-adịghị ahụ ga-abụ ndị a tụbawororịị n’ime abyss, ha agaghịkwa enwe ike inye nsogbu.—Mkpughe 21:1-4; 20:1-3.
14. Nkwadebe ọma dị aṅaa ka “oké ìgwè mmadụ” ahụ lanarịrị alanarị ga-emeworị?
14 “Oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ lanarịrị alanarị ga-emeworị ezi nkwadebe maka ịmalite ịdị ndụ n’ime usoro ihe ọhụrụ ahụ. Dị ka ihe fọdụrụ ahụ nke ndị Israel ime mmụọ, ha ga-abịaworị ịmara Chineke “site n’onye dịkarịsịrị nta n’ime ha ruo onye dịkarịsịrị ukwuu n’ime ha.” (Jeremaịa 31:34) N’ekpere nye Chineke, Eze ahụ na-achị achị sịrị n’otu mgbe: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ya mere ihe ọmụma nke a zuru ụwa ọnụ nke Jehova Chineke ga-arụpụta nzọpụta ebighị ebi. Nke a ga-abụ eziokwu ọ bụghị nanị maka “anụ ahụ” a ga-azọpụta ná ndụ ‘n’oké mkpagbu’ ahụ kamakwa maka ọtụtụ nde ụmụ mmadụ nwụrụ anwụ, ndị ga-anụ olu Eze ahụ wee pụta site n’ili ncheta ha. A ga-enye ndị dị otú a e si n’ọnwụ kpọlite ihe ọmụma nile dị mkpa nke Jehova.—Matiu 24:21, 22; Jọn 5:28, 29; Mkpughe 20:11-15.
15. N’ihi gịnị ka mmezu nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-agaghị arụpụta ihe mfu ọ bụla nye “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ?
15 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, imezu ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke Chineke ruo n’ihe ịga nke ọma dị ebube agaghị arụpụtara “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke ahụ yiri atụrụ mfu, bụ́ ndị ga-alanarị mbibi nke usoro ihe nke a ọnwụ na-eche ihu. Kama nke ahụ, ọ ga-emepe ụzọ maka ọbụna ngọzi ndị ka ukwuu n’ebe a n’elu ala nke e mere ka ọ dị ọcha nke ga-abụ nke ha iketa, nke ha ga-enwekwa òkè mbụ n’ịgbanwe ya ịghọ paradaịs zuru ụwa ọnụ. (Matiu 25:34; Luk 23:43) N’oge na-adịghị anya ugbu a, ndị na-emebi ụwa ga-apụ n’anya, “ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala. . . . Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:9-11) Ka mmadụ nile nabata Alaeze Narị Afọ Iri nke Jehova Chineke site n’aka “Onyeisi Udo” ahụ nke na-esochi mmezu nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ!
[Foto dị na peeji nke 119]
A ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’elu ụwa nile tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a