Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 9/15 p. 14-15
  • Ihe ‘Jukal Ji Aka Akwụkwọ Ozi Akara’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe ‘Jukal Ji Aka Akwụkwọ Ozi Akara’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ha Agaghị Enwe Ike Imegide Gị”
  • Ihe Na-adọrọ Mmasị A Chọtara Ọhụrụ
  • Olee Ụdị Ndị Ị Ga-emeta Enyi?
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Ije Ozi “n’Oge Ikpeazụ”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Jehova Zigara Jeremaya Ka O Kwusaa Okwu Ya
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jeremaịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 9/15 p. 14-15

Ihe ‘Jukal Ji Aka Akwụkwọ Ozi Akara’

NA NARỊ AFỌ NKE ASAA T.O.A., eze ndị Kaldia bụ́ Nebukadneza meriri Jeruselem, gbaa obodo ahụ ọkụ, kwatuokwa mgbidi ya. O jidere Zedekaịa, bụ́ eze Juda, ma rụkpọọ ya anya. Ọzọkwa, “ndị nile nke Juda a maara aha ha ka eze Babilọn gburu.”—Jeremaịa 39:1-8.

Jukal, nwa Shelemaịa yiri ka ò so ná ndị Juda a maara aha ha, ma ọ bụ ndị isi, bụ́ ndị ndị Babilọn gburu. E nwere ihe a chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya banyere Jukal. Ma tupu anyị atụlee ya, ka anyị hụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere Jukal na oge ya.

“Ha Agaghị Enwe Ike Imegide Gị”

Jehova nyere onye amụma bụ́ Jeremaịa ọrụ nke izi Juda na Jeruselem ozi ikpe Ọ mara ha. Chineke gwara Jeremaịa na ndị eze Juda, ndị isi, ndị nchụàjà, na ndị nkịtị ‘ga-ebuso ya agha.’ Ma Jehova gwara ya, sị: “Ha agaghị enwe ike imegide gị: n’ihi na gị ka M nọnyeere.”—Jeremaịa 1:17-19.

N’oge ndị Babilọn nọchibidoro isi obodo Juda, bụ́ Jeruselem, Eze Zedekaịa zigaara Jeremaịa ndị ozi ugboro abụọ iji jụta ya ma Nebukadneza ọ̀ ga-ahapụ obodo ahụ nakwa iji gwa Jeremaịa ka o kpee ekpere ka Jehova mee ka Nebukadneza hapụ obodo ahụ. Otu n’ime ndị ahụ eze zigara bụ Jukal, bụ́ onye a na-akpọkwa Jehukal. Ozi Chineke ziri Jeremaịa bụ na ndị Babilọn, ma ọ bụ ndị Kaldia, ga-ebibi obodo ahụ. Ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, na mma agha ga-egbu onye ọ bụla nọgidere na Jeruselem. Ma ọ dịghị ihe ga-eme ndị pụkwuuru ndị Kaldia. Ndị isi Juda were iwe dị egwu mgbe ha nụrụ okwu Jeremaịa!—Jeremaịa 21:1-10; 37:3-10; 38:1-3.

Jukal so ná ndị isi dụrụ Zedekaịa ọdụ, sị: “Biko, ka e mee ka nwoke a [bụ́ Jeremaịa] nwụọ; n’ihi na ya onwe ya na-eme ka aka ndị agha kụda.” Ajọ nwoke ahụ bụ́ Jukal sokwa ná ndị tụbara Jeremaịa n’olulu apịtị, bụ́ ebe e mesịrị si dọpụta ya. (Jeremaịa 37:15; 38:4-6) Jeremaịa lanahụrụ mbibi Jeruselem n’ihi na o rubeere Jehova isi, ma ọ dị ka Jukal ọ̀ nwụrụ mgbe e bibiri obodo ahụ ọ tụkwasịrị obi.

Ihe Na-adọrọ Mmasị A Chọtara Ọhụrụ

A chọtara ihe ọhụrụ metụtara Jukal na Jeruselem n’afọ 2005. Ndị ọkà mmụta ihe ochie nọ na-egwu ala ebe ha chere na ha ga-achọta obí Eze Devid. Ihe ha hụrụ bụ otu nnukwu ụlọ e ji okwute rụọ nke ha chere na e bibiri ya mgbe ndị Babilọn bibiri Jeruselem n’oge Jeremaịa.

Ọ dịbeghị onye maara ma ihe a ọ̀ bụ obí eze Devid ma ọ bụ na ọ bụghị ya. Ma, ndị ọkà mmụta ihe ochie matara ihe otu n’ime ihe ndị ha chọpụtara bụ—ihe ahụ e ji ụrọ kpụọ nke a na-eji aka akwụkwọ ozi akara nke dị otu sentimita n’obosara bụ́ nke foto ya dị na peeji nke 14. Akwụkwọ ozi e ji ya kaa akara erekasịala kemgbe. E dekwasịrị n’elu ya: “Nke Yehuchal nwa Shelemiyahu nwa Shovi.” O yiri ka è ji ihe onye iro Jeremaịa bụ́ Yehuchal, ma ọ bụ Jukal, nwa Shelemaịa, ji aka akwụkwọ ozi akara dee ihe ahụ.

Ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Eilat Mazar, bụ́ onye kọwara ihe ahụ e dere n’elu ya, kwuru na Jehukal bụ “onye ọchịchị na-esote” nnọọ Gemaraịa, nwa Shefan, bụ́ onye aha ya dị n’otu ihe odide a chọtara n’Obodo Devid.a

Okwukwe anyị nwere n’Okwu Chineke adabereghị n’ihe ochie a chọtara achọta; kama mmezu nke amụma ya ndị sitere n’ike mmụọ nsọ bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ mere mmadụ ga-eji ekwere na Bible. Akụkọ ihe mere eme gosiri na amụma Jeremaịa buru banyere mbibi Jeruselem mezuru. Ọnwụ ihere ndị iro Jeremaịa nwụrụ kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi dị ka Jeremaịa, ndị iro anyị ‘agaghị enwe ike imegide anyị n’ihi na Jehova nọnyeere anyị.’

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Iji gụọ akụkọ Gemaraịa na Shefan, lee isiokwu bụ́ “Ị̀ Maara Shefan na Ezinụlọ Ya?” n’Ụlọ Nche nke December 15, 2002, peeji nke 19-22.

[Foto dị na peeji nke 15]

Jeremaịa ekweghị ka a manye ya ịgwagbu ozi Chineke

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 14]

Gabi Laron/Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ochie/ Mahadum Hibru ©Eilat Mazar

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya