Isi nke Asatọ
Onye A Napụtara n’Ọnụ Ọdụm!
1, 2. (a) Olee otú Daraịọs onye Midia si hazie alaeze ukwu ya gbasapụrụ agbasapụ? (b) Kọwaa ọrụ na ikike nke ndị nọchiri anya eze nwere.
BABILỌN adawo! E wepụwo ebube ya dịruworo otu narị afọ dị ka ike ọchịchị ụwa n’ike nanị n’ime hour ole na ole. Ọgbọ ọhụrụ na-amalite—nke ndị Midia na ndị Peasia. Dị ka onye nọchiri n’ocheeze Belshaza, Daraịọs onye Midia na-eche ihe ịma aka nke ịhazi alaeze ukwu ya gbasapụrụ agbasapụ ihu ugbu a.
2 Otu n’ime ọrụ ndị mbụ Daraịọs rụrụ bụ ịhọpụta mmadụ 120 nọchiri anya eze. E kweere na mgbe ụfọdụ na a na-esite n’etiti ndị ikwu eze ahọpụta ndị jere ozi n’ọkwá a. Ka o sina dị, onye nke ọ bụla nọchiri anya eze chịrị ógbè buru ibu ma ọ bụ mpaghara dị nta karị nke alaeze ukwu ahụ. (Daniel 6:1) Ọrụ ya gụnyere ịnakọta ụtụ isi na ịkwụnye ụtụ ahụ n’obí eze. Ọ bụ ezie na onye na-eme nleta nke na-anọchite anya eze na-enyocha ha site n’oge ruo n’oge, onye ahụ nọchiri anya eze nwere ike dị ukwuu. Utu aha ya pụtara “onye na-echebe Alaeze ahụ.” N’ebe ọ na-achị a na-ewere onye ahụ nọchiri anya eze dị ka eze nọ n’okpuru, na-enwe ike nile ma e wepụ nke onye kasị ukwuu.
3, 4. N’ihi gịnị ka Daraịọs ji nwee mmasị n’ebe Daniel nọ karịsịa, oleekwa ọkwá eze ahụ nyere ya?
3 Olee ọnọdụ Daniel ná ndokwa ọhụrụ a? Daraịọs onye Midia ọ̀ ga-asị onye amụma a meworo agadi bụ́ onye Juu bụ́ onye nọ ugbu a n’afọ iri itoolu na ụma ya laa ezumike nká? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Daraịọs ghọtara na Daniel ebuwo amụma banyere ọdịda nke Babilọn n’ụzọ ziri ezi nakwa na ụdị amụma ahụ chọrọ nghọta ka nke mmadụ. Ọzọkwa, ruo ọtụtụ afọ Daniel anọwo na-ahụ maka ìgwè ndị dị iche iche a dọọrọ n’agha bịa na Babilọn. Daraịọs zubesiri ike isoro ndị nile o meriworo ọhụrụ ọ na-achị na-emekọ ihe n’udo. Ya mere, ọ ga-achọrịrị ka onye nwere amamihe na ahụmahụ yiri nke Daniel nọrọ ya nso. N’ọkwá dị aṅaa?
4 Ọ gaara abụ nnọọ ihe ijuanya ma a sị na Daraịọs họpụtara onye Juu ahụ bi n’ala ọzọ bụ́ Daniel ịbụ onye nọchiri anya eze. Ma cheedị nnọọ ọgba aghara e nwere mgbe Daraịọs kwupụtara mkpebi ya ime Daniel otu n’ime ndị isi atọ ga na-elekọta ndị ahụ nọchiri anya eze! Ọ bụghị nanị nke ahụ kama Daniel “ghọrọ ọkaaka,” na-egosipụta na ya karịrị ndị isi ibe ya. N’ezie, “mmụọ nke kachasị” dị n’ime ya. Daraịọs ọbụna zubesiri ike inye ya ọkwá praịm minista.—Daniel 6:2, 3.
5. Olee otú ndị isi ndị ọzọ na ndị nọchiri anya eze na-aghaghị isiworị meghachi omume ná nhọpụta a họpụtara Daniel, n’ihi gịnịkwa?
5 Ọnụma aghaghị ịsụjuworị ndị isi ndị ọzọ na ndị ahụ nọchiri anya eze obi. Leenụ, ha apụghị ịnagide echiche nke Daniel—onye na-abụghị onye Midia ma ọ bụkwanụ onye Peasia ma ọ bụ onye si n’ezinụlọ eze—ịchị ha! Olee otú Daraịọs ga-esi bugoo onye ala ọzọ n’ọkwá ukwu dị otú ahụ, na-eleghara ndị ala ya, ọbụna ezinụlọ ya, anya? Ụdị ihe omume ahụ aghaghị iyiworị ihe na-adịghị mma. Ọzọkwa, ihe àmà na-egosi na ndị ahụ nọchiri anya eze weere iguzosi ike n’ihe Daniel dị ka mgbochi dị njọ megide omume igwu wayo na ịkpa agwa na-ezighị ezi nke ha. Ma, ndị isi ahụ na ndị ahụ nọchiri anya eze agaghị anwa anwa gakwuru Daraịọs banyere okwu ahụ. E kwuwerị, Daraịọs na-akwanyere Daniel ùgwù nke ukwuu.
6. Olee otú ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze si nwaa ịkatọ Daniel, oleekwa ihe mere mgbalị a ji kụọ afọ n’ala?
6 Ya mere ndị ọchịchị a nwere anyaụfụ gbara izu n’etiti onwe ha. Ha nwara “ịchọpụta ihe ebubo iji boo Daniel banyere alaeze.” Ọ̀ dị ihe pụrụ ịdị njọ banyere ụzọ o si na-arụ ọrụ ya? Ọ̀ bụ onye na-adịghị akwụwa aka ọtọ? Ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze ahụghị ejighị ihe akpọrọ ihe ma ọ bụ ịkpa àgwà na-ezighị ezi ọ bụla n’ụzọ Daniel si arụ ọrụ ya. “Anyị agaghị achọpụta ihe ebubo iji boo Daniel nke a,” ka ha tụgharịrị n’uche, “ma a sị na anyị achọpụtaghị ya n’ahụ ya n’iwu nke Chineke ya.” Ọ bụkwa otú a ka ndị ikom ọjọọ a si kpaa nkata ọjọọ. Ha chere na ọ ga-eme ka e gbuo Daniel.—Daniel 6:4, 5.
A MALITE ỊKPA NKATA IGBU ỌCHỤ
7. Olee aro ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze tụụrụ eze, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka ha si mee nke ahụ?
7 Ìgwè ndị isi na ndị nọchiri anya eze “weere oké mkpọtụ” gakwuru Daraịọs. Okwu Aramaic e ji mee ihe n’ebe a na-enye echiche nke oké ọgba aghara. N’ụzọ doro anya, ndị ikom a mere ka o yie ka ha nwere ihe e kwesịrị ilebara anya ozugbo ha ga-agwa Daraịọs. Ha pụrụ icheworị na ọ gaghị enyo aro ha enyo ma ọ bụrụ na ha atụọ ya dị ka ndị ihe ha na-eme doro anya nakwa dị ka ihe chọrọ ka e lebara ya anya ozugbo. N’ihi ya, ha kpọrọ okwu aha, na-asị: “Ndị isi alaeze nile, na ndị isi, na ndị nọchiri anya eze, na ndị ndụmọdụ, na ndị na-achị achị, agbawo izu ime ka otu ụkpụrụ eze guzosie ike, na ime ka otu ịsọ nsọ dị ike, na onye ọ bụla nke ga-arịọ chi ọ bụla ma ọ bụ mmadụ ọ bụla arịrịọ ruo [iri ụbọchị atọ], ma ọ bụghị nanị gị, eze, na a ga-atụba ya n’olulu ọdụm.”a—Daniel 6:6, 7.
8. (a) Olee ihe mere Daraịọs ga-eji hụ iwu ahụ a tụrụ aro ya dị ka ihe na-adọrọ mmasị? (b) Gịnị n’ezie bụ ebumnobi nke ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze?
8 Ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme na-akwado na a na-ewerekarị ma na-efe ndị eze Mesopotemia dị ka chi. Ya mere ihe ịrụ ụka adịghị ya na aro a buru Daraịọs isi. O nwekwara ike ịhụworị uru ya. Cheta, nye ndị bi na Babilọn, Daraịọs bụ onye ala ọzọ na onye ọhụrụ. Iwu ọhụrụ a ga-eme ka o guzosie ike dị ka eze, ọ ga-agbakwa ìgwè mmadụ bi na Babilọn ume igosipụta nrubeisi na nkwado ha nye ọchịchị ọhụrụ ahụ. Otú ọ dị, n’ịtụ aro iwu ahụ, ndị isi ahụ na ndị nọchiri anya eze echetụdịghị echiche banyere ọdịmma eze. Ebumnobi ha n’ezie bụ ịmata Daniel n’ọnyà, n’ihi na ha maara na ọ bụ omume ya ikpegara Chineke ekpere ugboro atọ n’ụbọchị n’ihu windo ghere oghe nke ụlọ elu ya.
9. Gịnị mere iwu ọhụrụ ahụ na-agaghị eji bụrụ nsogbu nye ihe ka ọtụtụ ná ndị na-abụghị ndị Juu?
9 Iwu a a machibidoro ikpe ekpere ọ̀ ga-enye ndị nile ji okpukpe kpọrọ ihe na Babilọn nsogbu? Ọ gaghị enyecha ha nsogbu, karịsịa ebe mmachibido iwu ahụ ga-adịru nanị otu ọnwa. Ọzọkwa, mmadụ ole na ole na-abụghị ndị Juu ga-ewere ife mmadụ ofufe ruo oge ụfọdụ dị ka imebi okwukwe ha. Otu onye ọkà mmụta Bible na-ekwu, sị: “Ife eze ofufe achọghị ihe pụrụ iche n’aka ihe ka ọtụtụ ná mba ndị na-ekpere arụsị; ya mere mgbe a chọrọ ka ndị Babilọn nye onye mmeri ahụ—bụ́ Daraịọs onye Midia—nsọpụrụ dịịrị onye bụ chi, ha mere otú ahụ ozugbo. Ọ bụ nanị ndị Juu jụrụ ime otú ahụ.”
10. Olee otú ndị Midia na ndị Peasia si ewere iwu eze ha tiri?
10 Ka o sina dị, ndị ahụ bịara na nke Daraịọs gbara ya ume ka o ‘mee ka ịsọ nsọ a guzosie ike na ịkanye aha ya n’ihe a e dere n’akwụkwọ, ka e wee ghara ịgbanwe ya, dị ka iwu nke Midia na Peasia si dị, nke na-adịghị agabiga.’ (Daniel 6:8) N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ oge ochie, a na-ewere uche eze dị ka ihe a ga-emerịrị. Nke a mere ka echiche bụ na ọ dịghị agahie agahie dịgide. Ọbụna iwu nke pụrụ ịkpata ọnwụ nke ndị aka ha dị ọcha aghaghị ịnọgide na-adị irè!
11. Olee otú iwu Daraịọs ga-esi emetụta Daniel?
11 N’echeghị banyere Daniel, Daraịọs bịanyere aka n’iwu ahụ. (Daniel 6:9) N’ime nke ahụ, ọ maghị mgbe o ji nye ikike ka e gbuo onye ọrụ ya kasị baara ya uru. Ee, iwu a ga-emetụtarịrị Daniel.
A MANYE DARAỊỌS ỊMA IKPE
12. (a) Gịnị ka Daniel mere ozugbo ọ nụrụ banyere iwu ọhụrụ ahụ? (b) Olee ndị nọ na-ekiri Daniel, n’ihi gịnịkwa?
12 O teghị aka Daniel wee mara banyere iwu ahụ machibidoro ekpere. Ozugbo, ọ bara n’ụlọ ya ma gaa n’ime ụlọ elu ya, ebe windo ya ghere oghe chee ihu na Jerusalem.b N’ebe ahụ Daniel malitere ikpegara Chineke ekpere dị “ka ọ na-emerị site na mgbe gara aga.” Daniel nwere ike icheworị na ọ nọ nanị ya, ma ndị ahụ gbara izu mmegide nọ na-ekiri ya. Na mberede, ha “weere oké mkpọtụ gbakọta,” nke bụrịrị n’otu ụzọ ahụ jupụtara ná mkpali ha siworo gakwuru Daraịọs. Ugbu a ha ji anya ha na-ahụ ya—Daniel nọ “na-arịọ arịrịọ na-arịọkwa arịrịọ amara n’ihu Chineke ya.” (Daniel 6:10, 11) Ndị isi ahụ na ndị ahụ nọchiri anya eze nwere ihe akaebe nile ha chọrọ iji boo Daniel ebubo n’ihu eze.
13. Gịnị ka ndị iro Daniel gara kọọrọ eze?
13 Ndị iro Daniel ji aghụghọ jụọ Daraịọs, sị: “Ọ́ dịghị ịsọ nsọ ị kanyere aha, na onye ọ bụla nke ga-arịọ chi ọ bụla ma ọ bụ mmadụ ọ bụla arịrịọ ruo [iri ụbọchị atọ], ma ọ bụghị nanị gị, eze, na a ga-atụba ya n’olulu ọdụm?” Daraịọs zara, sị: “Ihe nke na-eguzosi ike ka ihe a bụ, dị ka iwu Midia na Peasia si dị, nke na-adịghị agabiga.” Ugbu a ndị a gbara izu mmegide kpọrọ okwu aha n’egbughị oge. “Daniel, onye bụ otu n’ime ụmụ ndị Juda e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, ọ nụghị olu gị, eze, ma ọ bụ ịsọ nsọ ahụ nke ị kanyeworo aha gị, kama ugbo atọ n’ụbọchị ka ọ na-arịọ arịrịọ ya.”—Daniel 6:12, 13.
14. Dị ka ihe àmà na-egosi, n’ihi gịnị ka ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze ji zoo aka n’ebe Daniel nọ dị ka “otu n’ime ụmụ ndị Juda e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ”?
14 Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze zoro aka n’ebe Daniel nọ dị ka “otu n’ime ụmụ ndị Juda e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ.” Dị ka ihe àmà na-egosi, ha chọrọ imesi ya ike na Daniel a Daraịọs bugoworo n’ọkwá ukwu dị otú ahụ bụ n’ezie nanị onye Juu bụ́ ohu. Ha kwenyere na n’ihi nke ahụ, iwu ji ya—n’agbanyeghị ihe eze chere banyere ya!
15. (a) Olee otú Daraịọs si meghachi omume n’ozi nke ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze wetaara ya? (b) Olee otú ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze si gosikwuo nlelị ha lelịrị Daniel?
15 Ikekwe ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze tụrụ anya ka eze kwụghachi ha ụgwọ maka ọrụ nchọpụta ha ji akọ rụọ. Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ga-emenụ ga-eju ha anya. Akụkọ ha wetaara ya nyere ya nsogbu n’obi nke ukwuu. Kama iweso Daniel iwe ma ọ bụ ịtụba ya n’olulu ọdụm ozugbo, Daraịọs ji ụbọchị ahụ dum na-agbalị ịgbapụta ya. Ma mgbalị ya nile kụrụ afọ n’ala. O teghị aka, ndị ahụ gbara izu mmegide lọghachiri, n’omume enweghị ihere ha, ha kwuru ka e gbuo Daniel.—Daniel 6:14, 15.
16. (a) N’ihi gịnị ka Daraịọs ji kwanyere Chineke Daniel ùgwù? (b) Olileanya dị aṅaa ka Daraịọs nwere banyere Daniel?
16 Daraịọs weere ya na ọ dịghị ihe ọ ga-eme n’okwu ahụ. E nweghị ike ịkagbu iwu ahụ, e nweghịkwa ike ịgbaghara Daniel “njehie” ya. Nanị ihe Daraịọs pụrụ ịgwa Daniel bụ “Chineke gị, Onye gị onwe gị na-efe mgbe nile, Ya onwe ya ga-adọpụta gị.” Daraịọs yiri ka ọ na-akwanyere Chineke Daniel ùgwù. Ọ bụ Jehova nyeworo Daniel ikike ibu amụma ọdịda Babilọn. Chineke enyewokwa Daniel “mmụọ nke kachasị,” nke mere ka ọ dị iche ná ndị isi ndị ọzọ. Ikekwe Daraịọs maara na ọtụtụ iri afọ tupu mgbe ahụ otu Chineke a gbapụtara ndị Hibru atọ na-eto eto site n’ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. Ma eleghị anya eze ahụ nwere olileanya na Jehova ga-agbapụta Daniel ugbu a, ebe Daraịọs na-enweghị ike ịgbanwe iwu ahụ ọ bịanyeworo aka na ya. N’ihi ya, a tụbara Daniel n’olulu ọdụm.c Ọzọ, “e wee bute otu nkume, tụkwasị ya n’ọnụ olulu ahụ; eze wee were mgbaaka akara ya na mgbaaka akara ndị isi ya kaa ya; ka e wee ghara ịgbanwe ihe e zubere banyere Daniel.”—Daniel 6:16, 17.
OTÚ IHE SI GBANWEE N’ỤZỌ DỊ ỊRỊBA AMA
17, 18. (a) Gịnị na-egosi na ọnọdụ Daniel wutere Daraịọs? (b) Gịnị mere mgbe eze ahụ laghachiri n’olulu ọdụm ahụ n’ụtụtụ echi ya?
17 Daraịọs bụ́ onye dara mbà n’obi laghachiri n’obí ya. Ọ dịghị ndị egwú a kpọtaara ya, n’ihi na ọ dịghị ya nke ịtụrụ ndụ. Kama nke ahụ, Daraịọs mụ anya abalị ahụ dum, na-ebu ọnụ. “Ụra ya fepụkwara n’anya ya.” Mgbe chi bọrọ, Daraịọs ji ọsọ gaa n’olulu ọdụm ahụ. O ji olu mwute tie mkpu, sị: “Daniel, Daniel, gị ohu nke Chineke dị ndụ, Chineke gị, Onye gị onwe gị na-efe mgbe nile, Ọ̀ pụrụ ịdọpụta gị n’aka ọdụm?” (Daniel 6:18-20) N’ụzọ juru ya anya—nakwa n’ezi ahụ efe—mmadụ zaghachiri!
18 “Eze, dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” Site n’ekele nkwanye ùgwù a, Daniel gosiri na ya ebughị iwe ọ bụla n’obi n’ebe eze ahụ nọ. Ọ ghọtara na ebe mkpagbu ya si bịa n’ezie abụghị n’aka Daraịọs kama ọ bụ n’aka ndị isi na ndị nọchiri anya eze bụ́ ndị na-enwe anyaụfụ. (Tụlee Matiu 5:44; Ọrụ 7:60.) Daniel gara n’ihu, na-asị: “Chineke m ezitewo mmụọ ozi Ya, wee kpuchite ọnụ ọdụm ndị a, ha emerụghịkwa m ahụ: n’ihi na n’ihu Ya ọ bụ emeghị ihe ọjọọ ka a hụrụ n’ime m; ọzọkwa, n’ihu gị, eze, ọ dịghị ihe imerụ ahụ m meworo.”—Daniel 6:21, 22.
19. Olee otú ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze siworo ghọgbuo ma jiri Daraịọs mee ihe?
19 Lee ka okwu ndị ahụ na-aghaghị isiworị metụ Daraịọs n’akọ na uche! Ọ maraworị eri oge na Daniel emeghị ihe ọ bụla mere a ga-eji tụba ya n’olulu ọdụm. Daraịọs maara nke ọma na ndị isi na ndị nọchiri anya eze akpawo nkata ka e gbuo Daniel nakwa na ha ejiriwo eze mezuo ebumnobi ha bụ́ maka ọdịmma onwe ha nanị. Site na ha ịnọgide na-ekwu na ‘ndị isi alaeze nile’ atụwo aro ka e nye iwu ahụ, ha nyere echiche na e sorowo Daniel kparịta ihe ahụ. Daraịọs ga-emesi ndị ikom ọjọọ a ike mgbe e mesịrị. Otú ọ dị, o nyere iwu ka a dọpụta Daniel n’olulu ọdụm ahụ. N’ụzọ ọrụ ebube, ọkọ akọghị Daniel!—Daniel 6:23.
20. Gịnị mere ndị iro obi ọjọọ nke Daniel?
20 Ugbu a Daniel na-anọkwaghị n’ihe ize ndụ, Daraịọs nwere ihe ọzọ ọ ga-elebara anya. “Eze wee kwuo, ha wee mee ka ndị ikom ahụ bịa, bụ́ ndị bororị Daniel ebubo, ọ bụkwa n’olulu ọdụm ka ha tụbara ha na ụmụ ha na ndị bụ nwunye ha; ha aka-eruteghịkwa ala olulu ahụ tutu ọdụm enwee ike n’ahụ ha, tapịa ọkpụkpụ ha nile.”d—Daniel 6:24.
21. N’imeso ndị òtù ezinụlọ nke ndị mere ihe ọjọọ ihe, ọdịiche dị aṅaa dị n’etiti Iwu Mosis na iwu nke ụfọdụ ọdịbendị oge ochie?
21 Igbu ọ bụghị nanị ndị ahụ gbara izu mmegide kamakwa ndị nwunye ha na ụmụ ha pụrụ iyi ihe obi ọjọọ gabigara ókè. N’ụzọ megidere nke ahụ, Iwu Chineke nyere site n’aka Mosis onye amụma kwuru, sị: “A gaghị eme ka ndị bụ nna nwụọ n’ọnọdụ ụmụ ha, a gaghị emekwa ka ụmụ nwụọ n’ọnọdụ ndị bụ nna ha: a ga-eme ka ha nwụọ, onye ọ bụla n’ime mmehie nke aka ya.” (Deuterọnọmi 24:16) Ka o sina dị, n’ụfọdụ ọdịbendị oge ochie, a na-egbukọtakarị onye mere ihe ọjọọ na ndị òtù ezinụlọ ya, n’ihe banyere mpụ dị oké njọ. Ikekwe a na-eme nke a ka ndị òtù ezinụlọ ghara inwe ike ịbọ ọ́bọ̀ ma e mesịa. Otú ọ dị, ihe a e mere ezinụlọ nke ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze esighị Daniel n’aka ma ọlị. Ma eleghị anya, ọdachi ndị ikom ọjọọ a buteere ezinụlọ ha wutere ya nke ukwuu.
22. Olee mkpọsa ọhụrụ Daraịọs mere?
22 Ndị isi na ndị nọchiri anya eze bụ́ ndị kpara nkata ọjọọ anwụchaala. Daraịọs mere mkpọsa, nke kwuru, sị: “A na-esite n’ihu m nye iwu, sị, n’ebe nile ọ bụla a na-achị n’alaeze m, ka mmadụ na-ama jijiji na-atụ egwu n’ihu Chineke nke Daniel: n’ihi na Ya onwe ya bụ Chineke dị ndụ, Ọ na-eguzosikwa ike ruo mgbe nile ebighị ebi, alaeze Ya bụkwa nke a na-agaghị emebi, ọchịchị Ya ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe nile: Ọ bụ Onye ndọpụta, na Onye nnapụta, na Onye na-eme ihe ịrịba ama dị iche iche na ihe ijuanya dị iche iche n’eluigwe na n’ụwa; Onye dọpụtaworo Daniel n’aka ọdụm.”—Daniel 6:25-27.
NA-EFE CHINEKE MGBE NILE
23. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Daniel setịpụrụ banyere ọrụ ego ya, oleekwa otú anyị pụrụ isi yie ya?
23 Daniel setịpụrụ ezi ihe nlereanya nye ndị ohu Chineke nile nke oge a. Àgwà ya bụ mgbe nile nke na-enweghị nkọcha. N’ọrụ ego ya, Daniel ‘bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, ọ dịghịkwa mmehie ma ọ bụ omume bibiri ebibi ọ bụla a chọpụtara n’ahụ ya.’ (Daniel 6:4) N’ụzọ yiri nke ahụ, onye Kraịst kwesịrị ịdị na-arụsị ọrụ ike n’ebe ọrụ ya. Nke a apụtaghị ịbụ onye na-achụ nta ego n’ụzọ obi ọjọọ, bụ́ onye na-achụsosi akụ̀ na ụba nkịtị ike ma ọ bụ onye na-azọ ndị ọzọ ụkwụ n’isi iji nweta ọkwá dị elu. (1 Timoti 6:10) Akwụkwọ Nsọ chọrọ ka onye Kraịst mezuo ibu ọrụ ya nke ịkpata ego n’ịkwụwa aka ọtọ nakwa site n’obi ya nile, ‘dị ka ọ na-arụrụ ya Onyenwe anyị.’—Ndị Kọlọsi 3:22, 23; Taịtọs 2:7, 8; Ndị Hibru 13:18.
24. Olee otú Daniel si gosipụta na ya adịghị emebi okwukwe ya n’ihe metụtara ofufe?
24 N’ofufe ya, Daniel emebighị okwukwe ya. Omume ya nke ikpe ekpere bụ ihe ọha maara. Ọzọkwa, ndị isi na ndị nọchiri anya eze maara nke ọma na Daniel ji ofufe ya kpọrọ ihe. N’ezie, o doro ha anya na ọ ga-anọgide na-eme nke a ọ bụrụgodị na iwu amachibido ya. Lee ezi ihe nlereanya ọ bụụrụ ndị Kraịst oge a! A makwa ha ama maka idebe ofufe Chineke n’ọnọdụ mbụ. (Matiu 6:33) Ndị na-ahụ ha anya kwesịrị ịhụ nke a ozugbo, n’ihi na Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.”—Matiu 5:16.
25, 26. (a) Gịnị ka ụfọdụ pụrụ ikwubi banyere ihe Daniel mere? (b) N’ihi gịnị ka Daniel ji were mgbanwe nke ihe ọ na-eme mgbe dum dị ka imebi okwukwe ya?
25 Ụfọdụ pụrụ ikwu na Daniel gaara ezereworị mkpagbu site n’ikpegara Jehova ekpere na nzuzo n’ime ụbọchị 30 ahụ. E kwuwerị, ọ dịghị ọnọdụ ma ọ bụ ebe pụrụ iche a chọrọ iji bụrụ onye Chineke ga-aṅa ntị. Ọ pụrụ ọbụna ịghọta ihe ndị a na-atụgharị n’ime obi. (Abụ Ọma 19:14) Ka o sina dị, Daniel weere ime mgbanwe ọ bụla n’ihe ndị ọ na-eme mgbe dum dị ka imebi okwukwe ya. N’ihi gịnị?
26 Ebe a maara omume Daniel nke ikpe ekpere nke ọma, olee echiche ọ gaara enye ma ọ bụrụ na ọ kwụsịrị ya na mberede? Ndị na-ahụ ya pụworo nnọọ ikwubi na Daniel na-atụ mmadụ egwu nakwa na iwu eze ahụ karịrị iwu Jehova. (Abụ Ọma 118:6) Ma Daniel gosiri site n’omume ya na ọ bụ Jehova na-enweta ofufe ya a na-ekewaghị ekewa. (Deuterọnọmi 6:14, 15; Aịsaịa 42:8) Otú ọ dị, n’ime nke a Daniel ejighị enweghị nkwanye ùgwù mebie iwu eze. Ma, ọ tụghịkwa egwu wee mebie okwukwe ya. Nanị ihe Daniel mere bụ ịnọgide na-ekpe ekpere n’ụlọ elu ya, dị “ka ọ na-emerị site na mgbe gara aga” tupu eze etie iwu ahụ.
27. Olee otú ndị ohu Chineke taa pụrụ isi yie Daniel (a) n’ido onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi? (b) n’ikwenyere Chineke karịa mmadụ? (ch) n’ịgbalị iso mmadụ nile na-ebi n’udo?
27 Ndị ohu Chineke taa pụrụ ịmụta ihe site n’ihe nlereanya Daniel. Ha na-anọgide ‘na-edo onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi,’ na-erubere iwu nke mba ha bi n’ime ya isi. (Ndị Rom 13:1) Otú ọ dị, mgbe iwu mmadụ megidere nke Chineke, ndị Jehova na-ewere nguzo nke ndị ozi Jisọs weere, bụ́ ndị ji anyaike kwuo, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) N’ime otú ahụ, ndị Kraịst adịghị akwalite nnupụisi. Kama nke ahụ, nzube ha bụ nanị isoro mmadụ nile na-ebi n’udo ka ha “wee biri obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile.”—1 Timoti 2:1, 2; Ndị Rom 12:18.
28. Olee otú Daniel si fee Jehova “mgbe nile”?
28 Ugbo abụọ Daraịọs kwuru na Daniel na-efe Chineke “mgbe nile.” (Daniel 6:16, 20) Okwu Aramaic e si na ya nweta okwu a sụgharịrị “mgbe nile” pụtara “ịgba gburugburu.” Ọ na-enye echiche nke ihe na-eme n’akwụsịghị akwụsị, ma ọ bụ ihe na-eme mgbe nile. Iguzosi ike n’ezi ihe nke Daniel dị otú ahụ. Ọ gbasoro ụkpụrụ a kara aka. Mgbe e lere ya ule, ma ó buru ibu ma ọ́ dị ntakịrị, o doro anya ihe Daniel ga-eme. Ọ ga-anọgide na-eme ihe ọ nọworo na-eme eri ọtụtụ iri afọ gara aga—nke bụ́ iguzosi ike n’ihe na ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova.
29. Olee otú ndị ohu Jehova taa pụrụ isi rite uru site n’ụzọ ikwesị ntụkwasị obi nke Daniel?
29 Ndị ohu Chineke nke oge a kwesịrị ịgbaso ụzọ Daniel. N’ezie, Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst nile ọdụ ịtụle ihe nlereanya nke ndị oge ochie tụrụ egwu Chineke. Site n’okwukwe, ha ‘rụrụ ọrụ ezi omume, nata nkwa dị iche iche,’ nakwa—dị ka ihe àmà na-egosi nke na-ezo aka n’ebe Daniel nọ—“kpuchite ọnụ ọdụm.” Dị ka ndị ohu Jehova taa, ka anyị na-egosipụta okwukwe na ime ihe mgbe nile yiri nke Daniel, “werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.”—Ndị Hibru 11:32, 33; 12:1.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akaebe nke ihe odide ochie na-akwado ịdị adị nke “olulu ọdụm” na Babilọn na-egosi na ndị ọchịchị nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-enwekarị ogige ụmụ anụ ọhịa.
b Ụlọ elu bụ ọnụ ụlọ nke na-abụghị maka ọha mmadụ bụ́ ebe mmadụ pụrụ ịbanye mgbe ọ na-achọghị ka e nye ya nsogbu.
c Ma eleghị anya olulu ọdụm ahụ bụ oghere dị n’ime ala nke nwere ọnụ n’elu ya. Ikekwe o nwekwara ibo ụzọ nke a pụrụ ibuli iji mee ka anụmanụ ndị ahụ banye.
d Okwu ahụ bụ́ ‘boro ebubo’ bụ nsụgharị nke okwu Aramaic nke a pụkwara ịsụgharị ịbụ “kwutọrọ.” Nke a na-egosipụta nzube ọjọọ nke ndị iro Daniel.
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• N’ihi gịnị ka Daraịọs onye Midia ji kpebie iji Daniel mee ihe n’ọkwá dị elu?
• Olee nkata ọjọọ ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze kpara? Olee otú Jehova si napụta Daniel?
• Gịnị ka ị mụtara site n’ịṅa ntị n’ihe nlereanya ikwesị ntụkwasị obi nke Daniel?
[Foto dị na peeji nke nke 114]
[Foto dị na peeji nke nke 121]
[Foto dị na peeji nke 127]
Daniel fere Jehova “mgbe nile.” Ị̀ na-eme otú ahụ?