Isi nke Iri na Anọ
Ndị Eze Abụọ ahụ Agbanwee
1, 2. (a) Gịnị dugara n’Antiochus nke Anọ ime ihe Rom chọrọ? (b) Olee mgbe Siria ghọrọ ógbè Rom na-achị?
EZE ukwu Siria bụ́ Antiochus nke Anọ awakpoo Ijipt ma mee onwe ya eze na-achị ya. Rom ezije Onye Nnọchianya Caius Popilius Laenas ka ọ gaa Ijipt mgbe Eze Ptolemy nke Isii nke Ijipt rịọrọ nke ahụ. O ji ọtụtụ ụgbọ mmiri gawa ya na iwu sitere n’aka Kansụl Kasị Ukwuu nke Rom bụ́ nke na-ekwu ka Antiochus nke Anọ sepụ aka n’ọchịchị ọ na-achị Ijipt ma si ná mba ahụ pụọ. N’Eleusis, bụ́ ógbè dịpụrụ adịpụ n’Alexandria, eze Siria na onye nnọchianya Rom ezute onwe ha ihu na ihu. Antiochus nke Anọ arịọọ ka e nye ya oge maka iso ndị ndụmọdụ ya kparịta ụka, ma Laenas kara ihe gburugburu eze ahụ ma gwa ya ka ọ zaghachi tupu ọ gafee akara ahụ. N’ịbụ onye e mechuru ihu, Antiochus nke Anọ emee ihe Rom chọrọ wee laghachi Siria na 168 T.O.A. Mburịta agha nke dị n’etiti eze Siria bụ́ eze ugwu na eze Ijipt bụ́ eze ndịda esi otú a bịa ná njedebe.
2 N’ikere òkè bụ́ isi n’ihe na-eme n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, Rom agaa n’ihu na-atụrụ Siria ụka. N’ihi ya, ọ bụ ezie na ndị eze ndị ọzọ so n’usoro ndị eze Seleucid chịrị Siria mgbe Antiochus nke Anọ nwụsịrị na 163 T.O.A., ha ewereghị ọkwá nke “eze Ugwu.” (Daniel 11:15) N’ikpeazụ Siria ghọrọ ógbè Rom na 64 T.O.A.
3. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Rom si merie Ijipt?
3 Usoro ndị eze Ptolemy nke Ijipt nọgidere na-anọ n’ọkwá nke “eze Ndịda” ruo ihe ji ntakịrị gafee afọ 130 mgbe Antiochus nke Anọ nwụsịrị. (Daniel 11:14) Mgbe a na-alụ agha nke Actium, na 31 T.O.A., onye na-achị Rom bụ́ Octavian meriri ndị agha jikọrọ aka ọnụ nke eze nwanyị ikpeazụ n’usoro ọchịchị Ptolemy—Cleopatra nke Asaa—na iko ya bụ́ onye Rom, bụ́ Mark Antony. Mgbe Cleopatra gbusịrị onwe ya n’afọ na-esonụ, Ijipt ghọkwara ógbè Rom na-achị, ọ nọkwaghị n’ọkwá eze ndịda. Ka ọ na-erule afọ 30 T.O.A., Rom meriri ma Siria ma Ijipt. Ànyị kwesịrị ịtụ anya ugbu a ka ọchịchị ndị ọzọ weghara ọkwá eze ugwu na eze ndịda?
EZE ỌHỤRỤ EZIPỤ “ONYE NKE NA-ACHỊ N’IHE IKE”
4. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji atụ anya ọchịchị ọzọ ịghọ eze ugwu?
4 N’oge opupu ihe ubi nke 33 O.A., Jisọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, nke e kwuru site n’ọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ unu . . . , mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu.” (Matiu 24:15, 16) N’ihota Daniel 11:31, Jisọs dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị banyere “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu” nke ga-abịa n’ọdịnihu. E buru amụma a metụtara eze ugwu ihe dị ka afọ 195 mgbe Antiochus nke Anọ, bụ́ eze Siria ikpeazụ nọ n’ọkwá ahụ, nwụsịrị. N’ezie, onye ọchịchị ọzọ ga-aghọ eze ugwu. Ònye ka ọ ga-abụ?
5. Ònye guzoro ọtọ dị ka eze ugwu, na-ewere ọkwá nke Antiochus nke Anọ nọbu?
5 Mmụọ ozi Jehova Chineke buru amụma, sị: “Otu onye nke na-eme ka onye nke na-achị n’ihe ike gabiga n’ịma mma alaeze ahụ ga-eguzo ọtọ n’ọnọdụ ya [nke Antiochus nke Anọ]: ma n’ụbọchị ole na ole ka a ga-etipịa ya, ma ọ bụghị n’iwe, ọ bụghịkwa n’agha.” (Daniel 11:20) Onye si otú a ‘guzoro ọtọ’ mesịrị bụrụ eze ukwu mbụ nke Rom, bụ́ Octavian, onye a maara dị ka Siza Ọgọstọs.—Lee “A Sọpụrụ Otu, Ledaa nke Ọzọ Anya,” na peji nke 248.
6. (a) Olee mgbe e mere ka “onye nke na-achị n’ihe ike” gabiga “n’ịma mma alaeze” ahụ, oleekwa mkpa nke a dị? (b) Gịnị mere a pụrụ iji kwuo na Ọgọstọs nwụrụ “ọ bụghị n’iwe, ọ bụghịkwa n’agha”? (ch) Olee mgbanwe weere ọnọdụ n’onye eze ugwu bụ?
6 ‘Alaeze ahụ mara mma’ nke Ọgọstọs gụnyere ‘ala ahụ mara mma’—ógbè Rom na-achị bụ́ Judia. (Daniel 11:16) N’afọ 2 T.O.A., Ọgọstọs zipụrụ “onye nke na-achị n’ihe ike” site n’inye iwu ka e debanye aha n’akwụkwọ, ma ọ bụ ịgụ ọnụ, ikekwe ka o nwee ike ịmara ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ n’ihi ịtụ ụtụ isi na ideba aha n’òtù ndị agha. N’ihi iwu a, Josef na Meri gara Betlehem maka idebanye aha n’akwụkwọ, na-eme ka a mụọ Jisọs n’ebe ahụ e buru amụma na ọ ga-abụ. (Maịka 5:2; Matiu 2:1-12) N’August 14 O.A.—“n’ụbọchị ole na ole,” ma ọ bụ n’oge na-adịghị anya mgbe o nyesịrị iwu ndebanye aha n’akwụkwọ ahụ—Ọgọstọs nwụrụ mgbe ọ dị afọ 76, n’abụghị “n’iwe” n’aka onye na-egbu mmadụ ma ọ bụ “n’agha,” kama n’ihi ọrịa. N’ezie eze ugwu agbanwewo! Ka ọ na-erule ugbu a eze a aghọwo Alaeze Ukwu Rom site na ndị eze ukwu ya.
‘ONYE E LEDARA ANYA EGUZORO ỌTỌ’
7, 8. (a) Ònye guzoro ọtọ n’ọnọdụ Ọgọstọs dị ka eze ugwu? (b) N’ihi gịnị ka e ji ghara iji mmasị tụkwasị “ebube nke alaeze” n’ubu onye nọchiri Ọgọstọs Siza?
7 N’ịga n’ihu n’amụma ahụ, mmụọ ozi ahụ sịrị: “Otu onye e ledara anya ga-eguzo ọtọ n’ọnọdụ ya [nke Ọgọstọs], onye ha na-atụkwasịghị ebube nke alaeze: ma ọ ga-abata n’ime na mgbe udo, were ire ụtọ nile nata alaeze ahụ. Ma ogwe aka nile nke nrubiga ókè ahụ ka a ga-eji ruchapụ ha n’ihu ya, tipịa ha; ee, onye ndú nke ọgbụgba ndụ kwa.”—Daniel 11:21, 22.
8 “Onye e ledara anya” bụ Taịbiriọs Siza, nwa Livia, bụ́ nwunye nke atọ nke Ọgọstọs. (Lee “A Sọpụrụ Otu, Ledaa nke Ọzọ Anya,” dị na peji 248.) Ọgọstọs kpọrọ nwa a o kuchiri ekuchi asị n’ihi àgwà ọjọọ ya, ọ chọghịkwa ka ọ bụrụ Siza ga-anọchi ya. E ji enweghị mmasị tụkwasị “ebube nke alaeze” n’isi ya nanị mgbe ndị ọzọ nile gaara anọchi eze nwụchara. Ọgọstọs kuchiri Taịbiriọs dị ka nwa ya na 4 O.A., meekwa ya onye ga-eketa ocheeze ahụ. Mgbe Ọgọstọs nwụrụ, Taịbiriọs dị afọ 54—onye ahụ e ledara anya—‘guzoro ọtọ,’ weghara ike dị ka eze ukwu nke Rom na eze ugwu.
9. Olee otú Taịbiriọs si “were ire ụtọ nile nata alaeze ahụ”?
9 “Taịbiriọs,” ka The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, “ghọgburu Kansụl Kasị Ukwuu ahụ wee ghara ikwe ka ha kpọọ ya eze ukwu ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ọnwa [mgbe Ọgọstọs nwụsịrị].” Ọ gwara Kansụl Kasị Ukwuu ahụ na nanị Ọgọstọs bụ onye nwere ike iburu ibu arọ nke ịchị Alaeze Ukwu Rom ma gwa ndị òtù kansụl ahụ ka ha weghachi ọchịchị ripọblik site n’inye ìgwè ndị ikom ikike dị otú ahụ karịa inye ya otu onye. “N’anwaghị anwa ikwere ihe o kwuru,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant dere, “ya na Kansụl ahụ Kasị Ukwuu kwanyerịtaara ibe ha ùgwù ruo mgbe o mesịrị n’ikpeazụ nakwere ike ọchịchị.” Durant gbakwụnyere, sị: “Òtù abụọ ahụ kpara nkata ha nke ọma. Taịbiriọs chọrọ ka e nwee ọchịchị ndị eze ukwu nke nwetụrụ ụdị ọchịchị ripọblik, ma ọ bụ ọ gaara achọta ụzọ ụfọdụ isi zere ya; Kansụl ahụ Kasị Ukwuu tụrụ ya egwu ma kpọọ ya asị, ma ha lara azụ n’iguzobeghachi ọchịchị ripọblik nke dabeere, dị ka nke ochie ahụ, n’òtù ndị omeiwu na-achị achị n’ọnụ.” N’ụzọ dị otú a Taịbiriọs ‘weere ire ụtọ nile nata alaeze ahụ.’
10. Olee otú e si ‘tipịa ogwe aka nile nke nrubiga ókè’ ahụ?
10 N’ihe banyere “ogwe aka nile nke nrubiga ókè”—usuu ndị agha nke alaeze ndị gbara ha gburugburu—mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: ‘A ga-eruchapụ ha ma tipịa ha.’ Mgbe Taịbiriọs ghọrọ eze ugwu, nwa nwanne ya bụ́ Germanicus bụ ọchịagha nke usuu ndị agha Rom nọ n’Osimiri Rhine. Na 15 O.A., Germanicus Caesar duuru ndị agha ya gaa ịlụso dike Germany bụ́ Arminius ọgụ, ma nwetụ ihe ịga nke ọma. Otú ọ dị, ntakịrị mmeri ndị ha nwere furu oké ihe, mgbe nke ahụ gasịkwara Taịbiriọs kwụsịrị ịlụ agha na Germany. Kama nke ahụ, site n’ịkwalite agha obodo, ọ gbalịrị igbochi ebo Germany nile ịdị n’otu. N’ozuzu ya, Taịbiriọs nwere mmasị n’ụkpụrụ ichebe mmekọrịta ya na mba ọzọ ma lekwasị anya n’iwusi ókèala ya ike. Ụkpụrụ a gatụrụ nke ọma. N’ụzọ dị otú a a chịkwara “ogwe aka nile nke nrubiga ókè” ma “tipịa ha.”
11. Olee otú e si ‘tipịa onye ndú nke ọgbụgha ndụ’ ahụ?
11 ‘E tipịakwara’ “onye ndú nke ọgbụgba ndụ” ahụ nke Jehova Chineke na Abraham gbara maka ịgọzi ezinụlọ nile nke ụwa. Jisọs Kraịst bụ Mkpụrụ Abraham e kwere ná nkwa n’ọgbụgba ndụ ahụ. (Jenesis 22:18; Ndị Galetia 3:16) Na Nisan 14, 33 O.A., Jisọs guzoro n’ihu Pọntiọs Paịlet n’obí nke onye ọchịchị Rom ahụ dị na Jerusalem. Ndị nchụàjà bụ́ ndị Juu ebowo Jisọs ebubo ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị eze ukwu. Ma Jisọs gwara Paịlet, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a. . . . Alaeze m esighị n’ebe a pụta.” Ka onye ọchịchị Rom ahụ ghara ịtọhapụ Jisọs ahụ aka ya dị ọcha, ndị Juu tiri mkpu, sị: “Ọ bụrụ na ị hapụ Onye a, ị bụghị enyi Siza: onye ọ bụla nke na-eme onwe ya eze na-ekwu okwu imegide Siza.” Mgbe ha kwusịrị ka e gbuo Jisọs, ha sịrị: “Anyị enweghị eze ma ọ bụghị Siza.” Dị ka iwu nke “eze a kpasuru iwe” si kwuo, bụ́ nke Taịbiriọs gbasapụworo ịgụnye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mkparị ọ bụla a kparịrị Siza, Paịlet nyefere Jisọs ka e “tipịa” ya, ma ọ bụ kpọgide ya n’elu osisi ịta ahụhụ.—Jọn 18:36; 19:12-16; Mak 15:14-20.
ONYE ỌCHỊCHỊ AKA IKE ‘ECHEE ECHICHE YA NILE’
12. (a) Olee ndị kekọtara onwe ha n’ebe Taịbiriọs nọ? (b) Olee otú Taịbiriọs si ‘jiri otu mba dị nta nwee ume’?
12 Ka ọ ka na-ebu amụma banyere Taịbiriọs, mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Site na mgbe mmadụ kekọtara onwe ha n’ebe ọ nọ ọ ga-arụ ọrụ aghụghọ: ọ ga-ejikwa otu mba dị nta rịgoo n’elu, nwee ume.” (Daniel 11:23) Ndị òtù Kansụl Kasị Ukwuu nke Rom ‘ekekọtawo onwe ha’ n’ebe Taịbiriọs nọ n’ụzọ iwu kwadoro, ọ dabekwaara n’ebe ha nọ n’ụzọ ịgbaso iwu. Ma ọ dị aghụghọ, na-aghọ n’ezie onye ‘ji otu mba dị nta nwee ume.’ Mba ahụ dị nta bụ Ndị Nche Eze Rom, nọ nso ná mgbidi Rom. Ịnọ nso ha menyere Kansụl Kasị Ukwuu ahụ egwu ma nyere Taịbiriọs aka ịchịkwa omume nnupụisi ọ bụla megide ọchịchị ya n’etiti ndị obodo. Ya mere, site n’aka ihe dị ka ndị nche dị 10,000, Taịbiriọs nọgidere na-adị ike.
13. N’ụzọ dị aṅaa ka Taịbiriọs si karịa ndị nna nna ya hà?
13 Mmụọ ozi ahụ gbakwụnyere n’ụzọ amụma, sị: “Na mgbe udo na imegide ebe nile dị uru nke ala a na-achị achị ka ọ ga-abịa; ọ ga-emekwa ihe nke nna ya hà na ndị bụ nna nna ya hà na-emeghị; ihe nlụta n’agha na ihe nkwata na akụ̀ ka ọ ga-ekesara ha: ọ bụkwa imegide ebe dị iche iche e wusiri ike ka ọ ga-eche echiche ya nile, ọbụna ruo mgbe a kara aka.” (Daniel 11:24) Taịbiriọs na-enyo mmadụ enyo gabiga ókè, ọchịchị ya jupụtakwara n’inye iwu ka e gbuo ndị mmadụ. N’ụzọ bụ́ isi n’ihi mmetụta nke Sejanus, bụ́ ọchịagha nke Ndị Nche Eze, oké ụjọ jupụtara n’akụkụ ikpeazụ nke ọchịchị ya. N’ikpeazụ, e nyowakwara Sejanus n’onwe ya enyo ma gbuo ya. N’ịchị ndị mmadụ ọchịchị aka ike, Taịbiriọs mekarịrị ndị nna nna ya hà.
14. (a) Olee otú Taịbiriọs si kesaa “ihe nlụta n’agha na ihe nkwata na akụ̀” n’ógbè nile Rom na-achị? (b) Olee otú e si were Taịbiriọs mgbe ọ nwụrụ?
14 Otú ọ dị, Taịbiriọs kesara “ihe nlụta n’agha na ihe nkwata na akụ̀” n’ógbè nile Rom na-achị. Ka ọ na-erule ọnwụ ya, ndị nile ọ na-achị nọ na-enwe ọganihu. Ụtụ isi dị ntakịrị, ọ na-emesapụkwa aka nye ndị nọ ná mpaghara ihe na-esiri ike. Ọ bụrụ na ndị soja ma ọ bụ ndị ọrụ ya emegbuo onye ọ bụla ma ọ bụ mee omume ọjọọ n’idozi okwu, ha pụrụ ịtụ anya ntaramahụhụ eze. Ijigidesi ọchịchị ike mere ka ọha na eze nọgide na-enwe nchebe, usoro nzirịta ozi ka mma kwalitekwara azụmahịa. Taịbiriọs hụrụ na e mere ihe nile n’ụzọ eleghị mmadụ anya n’ihu na n’esepụghị aka n’ime Rom na ebe na-abụghị Rom. E meziwanyere iwu nile, e meziwanyekwara ụkpụrụ na-achịkwa mmadụ na ibe ya na nke omume site n’iwere mgbanwe ndị Ọgọstọs Siza guzobere gaa n’ihu. Ma, Taịbiriọs ‘chere echiche ya nile,’ nke na onye Rom na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Tacitus kọwara ya dị ka nwoke nwere omume ihu abụọ, nke na-eji nkà egosipụta onwe ya ịbụ ihe ọ na-abụghị. Mgbe ọ nwụrụ na March 37 O.A., e weere Taịbiriọs dị ka onye ọchịchị aka ike.
15. Olee otú ihe si gaara Rom ná ngwụsị narị afọ mbụ na ná mmalite narị afọ nke abụọ O.A.?
15 Ndị nọchiri Taịbiriọs bụ́ ndị weere ọkwá nke eze ugwu gụnyere Gaius Caesar (Caligula), Klọdiọs nke Mbụ, Nero, Vespasian, Titus, Domitian, Nerva, Trajan, na Hadrian. “N’akụkụ ka ukwuu,” ka The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, “ndị nọchiri Ọgọstọs weere ụkpụrụ ọchịchị ya na usoro owuwu ihe ya gaa n’ihu, ọ bụ ezie na ha webatara ihe ọhụrụ dị nta ma bie ndụ okomoko karị.” Otu akwụkwọ ntụaka ahụ gara n’ihu na-akọwapụta, sị: “Ná ngwụsị nke narị afọ 1 na nke 2 Rom nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu nke ebube na ụba mmadụ ya.” Ọ bụ ezie na Rom nwere ụfọdụ nsogbu n’alaeze ndị ya na ya gbara agbata obi n’oge ahụ, mburịta agha mbụ e buru n’amụma na ya na eze ndịda ga-enwe ewereghị ọnọdụ ruo na narị afọ nke atọ O.A.
ONYE A KPALIRI MEGIDE EZE NDỊDA
16, 17. (a) Ònye weere ọkwá eze ugwu nke e zoro aka na ya na Daniel 11:25? (b) Ònye bịara were ọkwá nke eze ndịda, oleekwa otú nke a si mee?
16 Mmụọ ozi Chineke gara n’ihu n’amụma ahụ, na-asị: “Ọ [eze ugwu] ga-akpọtekwa ike ya na obi ya imegide eze Ndịda chịrị oké usuu ndị agha; eze Ndịda ga-akpalikwa onwe ya ibu agha chịrị oké usuu ndị agha nke dị ike nke ukwuu: ma ọ [eze ugwu] gaghị eguzo, n’ihi na ha ga-eche echiche dị iche iche imegide ya. Ọzọ, ndị na-eri ihe oriri ọma ya ga-etipịa ya, usuu ndị agha ya ga-erubiga ókè dị ka mmiri: ọtụtụ mmadụ ga-adakwa n’ala bụrụ ndị e gburu egbu.”—Daniel 11:25, 26.
17 Ihe dị ka afọ 300 mgbe Octavian mesịrị ka Ijipt bụrụ ógbè Rom na-achị, Eze Ukwu Aurelian nke Rom weere ọkwá nke eze ugwu. Ka ọ dị mgbe ahụ, Eze Nwanyị Septimia Zenobia nke ógbè Rom na-achị bụ́ Palmyra weere ọkwá nke eze ndịda.a (Lee “Zenobia—Eze Nwanyị Bụ́ Dike nke Palmyra,” na peji nke 252.) Ndị agha Palmyra weghaara Ijipt na 269 O.A. n’aha ichebere ya Rom. Zenobia chọrọ ime Palmyra obodo bụ́ isi n’ebe ọwụwa anyanwụ, chọọkwa ịchị ógbè ọwụwa anyanwụ nke Rom na-achị. N’ịbụ onye ọchịchọ Zenobia menyere ụjọ, Aurelian kpọtere “ike ya na obi ya” imegide Zenobia.
18. Gịnị si n’ọgụ nke Eze Ukwu Aurelian, bụ́ eze ugwu, na Eze Nwanyị Zenobia, bụ́ eze ndịda lụrụ, pụta?
18 Dị ka ọchịchị nke Zenobia nọ n’isi ya, eze ndịda ‘kpaliri onwe ya’ ibu agha megide eze ugwu “chịrị oké usuu ndị agha nke dị ike nke ukwuu” n’okpuru ndị ọchịagha abụọ, Zabdas na Zabbai. Ma Aurelian meriri Ijipt ma werezie mwakpo ya banye n’Asia Minor na Siria. E meriri Zenobia n’Emesa (bụ Homs ugbu a), bụ́ ebe o si gbaghachi Palmyra. Mgbe Aurelian nọchibidoro obodo ahụ, Zenobia lụsiri ọgụ ike iji chebe ya ma o nweghị ihe ịga nke ọma. Ya na nwa ya nwoke gbalagara Peasia, nanị ịbụ ndị ndị Rom jidere n’Osimiri Yufretis. Ndị Palmyra gbahapụrụ obodo ha na 272 O.A. Aurelian debere Zenobia ndụ, na-eme ya onye anya nile wụkwasịrị na njem mmeri ya n’okporo ámá Rom na 274 O.A. O biri ndụ ya fọdụrụnụ dị ka nwanyị onye Rom na-alụ.
19. Olee otú Aurelian si daa ‘n’ihi echiche dị iche iche megide ya’?
19 Aurelian n’onwe ya ‘eguzoghị n’ihi echiche dị iche iche megide ya.’ Na 275 O.A., ọ gawara ịlụso ndị Peasia agha. Ka ọ nọ na Thrace na-echere ka o nweta ohere ịgafere ụzọ ahụ dị warara nke banyere n’Asia Minor, ndị ‘riri nri’ ya mere atụmatụ megide ya ma weta ‘ntipịa’ ya. Ọ chọrọ inye odeakwụkwọ ya bụ́ Eros ntaramahụhụ maka ịkpa àgwà ọjọọ. Otú ọ dị, Eros depụtara aha nke ụfọdụ ndị ọfịsa a ga-egbu egbu. Ịhụ aha ndị a kpaliri ndị ọfịsa ahụ ịkpa nkata igbu Aurelian, ha gbukwara ya.
20. Olee otú “usuu ndị agha” nke eze ugwu si ‘ruchapụ’?
20 Ọrụ nke eze ugwu ejedebeghị mgbe Eze Ukwu Aurelian nwụrụ. Ndị ọchịchị ndị ọzọ nke Rom sochiri. Ruo oge ụfọdụ, e nwere otu eze ukwu n’ebe ọdịda anyanwụ na otu n’ebe ọwụwa anyanwụ. N’okpuru ndị ikom a, e ‘ruchapụrụ usuu ndị agha’ nke eze ugwu ma ọ bụ “tisaa” ha,b ọtụtụ ‘dakwara n’ala bụrụ ndị e gburu egbu’ n’ihi mwakpo nke ebo Germany sitere n’ebe ugwu. Ndị Goth meriri ọtụtụ ókèala nke ndị Rom na narị afọ nke anọ O.A. A nọgidere na-eme mwakpo dị iche iche. Na 476 O.A., onye ndú Germany bụ́ Odoacer wepụrụ eze ukwu ikpeazụ nọ na Rom na-achị. Ka ọ na-erule mmalite nke narị afọ nke isii, e tisawo Alaeze Ukwu Rom nke ebe ọdịda anyanwụ, ndị eze Germany chịkwara Great Britain, Gaul, Itali, Ebe Ugwu Africa, na Spain. Akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke alaeze ukwu ahụ dịgidere ruo na narị afọ nke 15.
E KEWAA OTU ALAEZE UKWU
21, 22. Olee mgbanwe ndị Constantine mere na narị afọ nke anọ O.A.?
21 N’enyeghị nkọwa ndị na-adịghị mkpa banyere ndakpọ nke Alaeze Ukwu Rom, bụ́ nke dịruru ọtụtụ narị afọ, mmụọ ozi Jehova gara n’ihu ibu amụma ihe omume ndị ọzọ nke eze ugwu na eze ndịda. Otú ọ dị, ntụle dị mkpirikpi nke ihe ụfọdụ merenụ n’Alaeze Ukwu Rom ga-enyere anyị aka ịmata eze abụọ ahụ na-amarịta aka ka oge na-aga.
22 Na narị afọ nke anọ, Eze Ukwu Constantine nke Rom mere ka Ọchịchị nabata Iso Ụzọ Kraịst dapụrụ n’ezi ofufe. Ọbụna ọ kpọrọ ma bụrụ onyeisi oche na nzukọ chọọchị e nwere na Nicaea, n’Asia Minor, na 325 O.A. Ka oge na-aga, Constantine bugharịrị ebe obibi eze site na Rom gaa Byzantium, ma ọ bụ Constantinople, na-eme obodo ahụ isi obodo ọhụrụ ya. Alaeze Ukwu Rom nọgidere n’okpuru ọchịchị otu eze ukwu ruo mgbe Eze Ukwu Theodosius nke Mbụ nwụrụ, na January 17, 395 O.A.
23. (a) Nkewa dị aṅaa nke Alaeze Ukwu Rom weere ọnọdụ mgbe Theodosius nwụsịrị? (b) Olee mgbe Alaeze Ukwu Ebe Ọwụwa Anyanwụ bịara ná njedebe? (ch) Ònye chịrị Ijipt ka ọ na-erule 1517?
23 Mgbe Theodosius nwụsịrị, e kewara Alaeze Ukwu Rom n’etiti ụmụ ya. Honorius nwetara akụkụ ebe ọdịda anyanwụ, Arcadius nwetakwara ebe ọwụwa anyanwụ, na-enwe Constantinople dị ka isi obodo ya. Great Britain, Gaul, Itali, Spain, na Ebe Ugwu Africa socha n’ógbè ndị dị n’okpuru akụkụ ọdịda anyanwụ. Masedonia, Thrace, Asia Minor, Siria, na Ijipt bụcha ógbè nke ebe ọwụwa anyanwụ na-achị. Na 642 O.A., ndị Saracen (ndị Arab) weghaara isi obodo Ijipt, bụ́ Alexandria, Ijipt ghọkwara otu ógbè nke ndị isi alakụba na-achị. Na January 1449, Constantine nke Iri na Otu ghọrọ eze ukwu ikpeazụ nke ebe ọwụwa anyanwụ. Ndị Turk nọ n’alaeze Ottoman n’okpuru Sultan Mehmed nke Abụọ meriri Constantinople na May 29, 1453, na-eweta Alaeze Ukwu Rom nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ ná njedebe. N’afọ 1517 Ijipt ghọrọ ógbè ndị Turk na-achị. Otú ọ dị, ka oge na-aga mba a nke eze ndịda oge ochie ga-abanye n’okpuru nchịkwa nke alaeze ukwu ọzọ nke sitere ná mpaghara ebe ọdịda anyanwụ.
24, 25. (a) Dị ka ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, gịnị kara mmalite nke Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ akara? (b) Gịnị mesịrị mee utu aha bụ́ “eze ukwu” nke Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ?
24 Bishọp Katọlik nke Rom bilitere n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke Alaeze Ukwu Rom, nke bụ́ n’ụzọ pụtara ìhè Popu Leo nke Mbụ, onye a maara maka iji ikike popu mee ihe na narị afọ nke ise O.A. Ka oge na-aga, popu ahụ ji aka ya guzobe eze ukwu nke mpaghara ọdịda anyanwụ. Nke a weere ọnọdụ na Rom n’ụbọchị Krismas nke 800 O.A., mgbe Popu Leo nke Atọ chiri Eze Charles (Charlemagne) bụ́ onye Frank eze ukwu nke Alaeze Ukwu Rom nke Ebe Ọdịda Anyanwụ ọhụrụ. Ichi eze a maliteghachiri ịbụ eze ukwu na Rom nakwa, dị ka ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, bụrụ mmalite nke Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ. Malite mgbe ahụ, e nwere Alaeze Ukwu Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ n’ebe ọdịda anyanwụ, ha abụọ ana-azọrọ ịbụ nke ndị Kraịst.
25 Ka oge na-agafe, ndị nọchiri Charlemagne bụ ndị ọchịchị na-amaghị ọrụ ha. Ọkwá nke eze ukwu ọbụna bụ nke mmadụ na-anọghị ruo oge ụfọdụ. Ka ọ dị mgbe ahụ, Eze Otto nke Mbụ nke Germany emeriwo akụkụ buru ibu nke ebe ugwu na etiti Itali. O mere onwe ya eze Itali. Na February 2, 962 O.A., Popu John nke Iri na Abụọ chiri Otto nke Mbụ eze ukwu nke Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ. Isi obodo ya dị na Germany, ndị eze ya bụkwa ndị Germany, dịkwa ka ihe ka n’ọtụtụ ná ndị ha na-achị bụ. Narị afọ ise n’ihu, ezinụlọ Hapsburg nke Austria nwetara utu aha bụ́ “eze ukwu” ma jigide ya ruo ihe ka ọtụtụ n’ihe fọdụrụnụ n’ime afọ nile nke Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ dịruru.
A MATA EZE ABỤỌ AHỤ NKE ỌMA ỌZỌ
26. (a) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere njedebe nke Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ? (b) Ònye pụtara dị ka eze ugwu?
26 Napoléon nke Mbụ tiri Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ ihe otiti na-eweta ọnwụ mgbe ọ jụrụ ịnabata ịdị adị ya mgbe o merisịrị Germany n’afọ 1805. N’enweghị ike ichedo ọbụbụeze ya, Eze Ukwu Francis nke Abụọ sepụrụ aka n’ịbụ eze nke Rom n’August 6, 1806, ma laghachi na gọọmenti ala ya dị ka eze ukwu nke Austria. Mgbe afọ 1,006 gasịrị, Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ—nke Leo nke Atọ, bụ́ popu Roman Katọlik, na Charlemagne, eze bụ́ onye Frank guzobere—bịara ná njedebe. Na 1870, Rom ghọrọ isi obodo alaeze Itali na-anọkwaghị n’okpuru Vatican. N’afọ na-esonụ, alaeze Germany malitere, na-enwe Wilhelm nke Mbụ dị ka siza, ma ọ bụ kaiser. N’ụzọ dị otú a, eze ugwu nke oge a—Germany—pụtara n’ọgbọ ụwa.
27. (a) Olee otú Ijipt si ghọọ ebe Britain na-echebe? (b) Ònye weere ọkwá nke eze ndịda?
27 Ma, ònye bụ eze ndịda nke oge a? Akụkọ ihe mere eme na-egosi na Britain malitere ịchị na narị afọ nke 17. N’ịchọ ịkpaghasị ụzọ azụmahịa nke Britain, Napoléon nke Mbụ meriri Ijipt na 1798. Agha dara, njikọ aka nke Britain na alaeze Ottoman manyekwara ndị France isite n’Ijipt pụọ, bụ́ nke a maara dị ka eze ndịda mgbe ọgụ ahụ malitere. Na narị afọ na-esonụ, ike Britain nwere n’Ijipt mụbara. Mgbe 1882 gasịrị, Ijipt bụ n’ezie nke dabeere na Britain. Mgbe Agha Ụwa Mbụ dara na 1914, Ijipt dị n’okpuru Turkey ma bụrụ nke khedive, ma ọ bụ onye nnọchianya ya chịrị. Otú ọ dị, mgbe Turkey dụnyeere Germany úkwù n’agha ahụ, Britain wepụrụ khedive ahụ n’ọkwá ma mee Ijipt akụkụ Britain na-echebe. N’ịbụ ndị jiri nwayọọ na-enwe mmekọrịta chiri anya, Britain na United States of America ghọrọ Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America. Ha abụọ jikọrọ aka were ọkwá eze ndịda.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ebe okwu bụ́ “eze Ugwu” na “eze Ndịda” bụcha utu aha, ha pụrụ izo aka n’onye ọ bụla na-achị achị, gụnyere eze, eze nwanyị, ma ọ bụ njikọ mba dị iche iche.
b Lee nkọwa ala ala peji banyere Daniel 11:26 na New World Translation of the Holy Scriptures—With References, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Gịnị Ka Ị Ghọtara?
• Olee eze ukwu Rom bu ụzọ bilie dị ka eze ugwu, oleekwa mgbe o ji zipụ “onye nke na-achị n’ihe ike”?
• Ònye bịara nọrọ n’ọkwá eze ugwu mgbe Ọgọstọs nwụsịrị, oleekwa otú e si ‘tipịa onye ndú nke ọgbụgba ndụ ahụ’?
• Gịnị bụ ihe si n’ọgụ Aurelian dị ka eze ugwu na Zenobia dị ka eze ndịda lụrụ, pụta?
• Gịnị mere Alaeze Ukwu Rom, oleekwa ike ọchịchị ndị weere ọkwá nke eze abụọ ahụ ka ọ na-erule ná ngwụsị nke narị afọ nke 19?
Igbe/Foto dị na peeji nke 248-251]
A Sọpụrụ Otu, Ledaa nke Ọzọ Anya
OTU onye gbanwere otu ripọblik jupụtara n’ọgba aghara ka ọ bụrụ otu alaeze ụwa. Onye nke ọzọ mụbara akụ̀ na ụba ya okpukpu iri abụọ n’ime afọ 23. A sọpụụrụ otu mgbe ọ nwụrụ, ma e ledara nke ọzọ anya. Ọchịchị nke ndị eze ukwu abụọ a nke Rom dịịrị gafee oge ndụ na ozi Jisọs. Olee ndị ha bụ? N’ihi gịnịkwa ka e ji sọpụrụ otu, ma ghara ime nke ọzọ otú ahụ?
Ọ “BỊARA NA ROM NKE E JI BRIK WUO MA JIRI MARBLE WUO YA”
Na 44 T.O.A. mgbe e gburu Julius Caesar, nwa nwa nwanne ya nwanyị bụ́ Gaius Octavian dị nanị afọ 18. N’ịbụ onye Julius Caesar ji mere nwa na onye nketa ya bụ́ isi, Octavian ka na-eto eto gawara Rom ozugbo ije were ihe nketa ya. N’ebe ahụ o zutere onye iro dị ike—ọchịagha nke Caesar, bụ́ Mark Antony, onye tụrụ anya ịbụ onye nketa bụ́ isi. Ịkpa nkata ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ịzọ ọchịchị nke sochirinụ dịgidere ruo afọ 13.
Ọ bụ nanị mgbe o merisịrị ndị agha Eze Nwanyị Cleopatra nke Ijipt na iko ya bụ́ Mark Antony (na 31 T.O.A.) ka Octavian ghọrọ onye ọchịchị a na-apụghị ịgbagha agbagha nke Alaeze Ukwu Rom. N’afọ sochirinụ Antony na Cleopatra gburu onwe ha, Octavian weghakwaara Ijipt. E si otú ahụ wepụ akụkụ ikpeazụ fọdụrụnụ nke Alaeze Ukwu Gris, Rom ewee ghọọ ike ọchịchị ụwa.
N’icheta na aka ike Julius Caesar ji chịa edujewo n’ogbugbu e gburu ya, Octavian kpachapụrụ anya ka ọ ghara ịdaba n’otu ihie ụzọ ahụ. Iji ghara imejọ ndị Rom bụ́ ndị nwere mmasị n’ọchịchị ripọblik karịsịa, o mere ka ọchịchị ya yie ka ọ bụ nke ripọblik. O kweghị ana utu aha bụ́ “eze” ma ọ bụ “onye ọchịchị aka ike.” Ọzọkwa, o kwupụtara nzube ya inyefe ógbè nile ọ na-achị n’aka Kansụl Kasị Ukwuu nke Rom ma kwee nkwa ịhapụ ọkwá o ji. Atụmatụ a gara nke ọma. Kansụl Kasị Ukwuu ahụ nwere obi ekele gbara Octavian ume ijigide ọkwá ya ma nọgide na-achịkwa ụfọdụ ógbè ndị ahụ ọ na-achị.
Ọzọkwa, na January 16, 27 T.O.A., Kansụl Kasị Ukwuu ahụ nyere Octavian utu aha bụ́ “Ọgọstọs,” nke pụtara “Onye E Weliri Elu, Onye Dị Nsọ.” Ọ bụghị nanị na Octavian nakweere utu aha ahụ kamakwa ọ gụgharịrị otu ọnwa aha ya ma wepụ otu ụbọchị na February ka August wee nwee ụbọchị ole July nwere, bụ́ ọnwa a kpọrọ aha Julius Caesar. Octavian si otú a ghọọ eze ukwu mbụ nke Rom, a makwaara ya site na mgbe ahụ gaa n’ihu dị ka Siza Ọgọstọs ma ọ bụ “August Mbụ.” Ka oge na-aga o werekwaara utu aha bụ́ “pontifex maximus” (onyeisi nchụàjà), n’afọ 2 T.O.A. kwa—n’afọ a mụrụ Jisọs—Kansụl Kasị Ukwuu ahụ nyere ya utu aha bụ́ Pater Patriae, “Nna nke Mba Ya.”
N’otu afọ ahụ, “iwu si n’ebe Siza Ọgọstọs nọ pụta na a ga-ede aha mmadụ nile bi n’elu ụwa dum mmadụ bi n’akwụkwọ. . . . Mmadụ nile wee gaa ka e dee aha ha n’akwụkwọ, onye ọ bụla ọ gaa obodo nke aka ya.” (Luk 2:1-3) N’ihi iwu a, a mụrụ Jisọs na Betlehem iji mezuo amụma Bible.—Daniel 11:20; Maịka 5:2.
E ji ịkwụwatụ aka ọtọ na ego ọnụ ahịa ya na-adịghị ada ada mara ọchịchị Ọgọstọs. Ọgọstọs guzobekwara usoro nzipụ akwụkwọ ozi dị irè ma rụọ ụzọ na àkwà mmiri. Ọ hazigharịrị òtù ndị agha, guzobe ndị agha mmiri dị njikere mgbe nile, ma guzobe òtù ndị na-eche ya nche a maara dị ka Ndị Nche Eze. (Ndị Filipaị 1:13) N’okpuru nkwado ya, ndị edemede dị ka Virgil na Horace nwere ihe ịga nke ọma, ndị na-akpụ ihe kpụkwara ihe ndị mara mma n’ihe a kpọrọ ugbu a ụdị bụ́ ọkpọka. Ọgọstọs wutọpụrụ ihe owuwu ndị Julius Caesar na-ewuchaghị ma dozigharịa ọtụtụ ụlọ nsọ. Pax Romana (“Udo Rom”) nke ọ malitere dịruru ihe karịrị afọ 200. N’August 19, 14 O.A., mgbe ọ dị afọ 76, Ọgọstọs nwụrụ e wee mee ya chi mgbe nke ahụ gasịrị.
Ọgọstọs turu ọnụ na ya “bịara na Rom nke e ji brik wuo ma jiri marble wuo ya.” N’achọghị ka Rom gaghachi n’ụbọchị ndị ahụ jupụtara n’esemokwu n’oge ọchịchị ripọblik e nweburu, o zubere ịzụ eze ukwu ọzọ. Ma o nwekebeghị ihe ọ pụrụ ime banyere onye ga-anọchi ya. Nwa nwanne ya, ụmụ ụmụ nke ya abụọ, ọgọ ya nwoke, na otu nwa o kuchiri anwụchaala, ọ fọzie nanị nwa ọzọ o kuchiri bụ́ Taibiriọs iweghara ọchịchị.
“ONYE E LEDARA ANYA”
Ihe na-erughhị otu ọnwa mgbe Ọgọstọs nwụsịrị, Kansụl Kasị Ukwuu nke Rom mere Taịbiriọs dị afọ 54 eze ukwu. Taịbiriọs dịrị ndụ ma chịa ruo March 37 O.A. N’ihi ya, ọ bụ eze ukwu nke Rom n’oge ozi ihu ọha Jisọs.
Dị ka eze ukwu, Taịbiriọs nwere ma àgwà ọma ma àgwà ọjọọ. Otu n’ime àgwà ọma ya bụ enweghị mmasị imefu ego n’ihe okomoko. N’ihi ya, alaeze ukwu ahụ nwere ọganihu, o nwekwara ego iji nye aka n’idozi ihe mgbe e nwere ọdachi nakwa n’oge ihe isi ike. N’ịbụrụ ya ihe otuto, Taịbiriọs weere onwe ya dị ka nanị mmadụ, jụ ọtụtụ utu aha nkwanye ùgwù, ma mee ka ndị mmadụ fewa Ọgọstọs ofufe kama ife ya. Ọ gụghị ọnwa kalenda ọ bụla aha ya dị ka Ọgọstọs na Julius Caesar meere onwe ha, o kweghịkwa ka ndị ọzọ sọpụrụ ya n’ụzọ dị otú ahụ.
Otú ọ dị, ihe ọjọọ Taịbiriọs mere karịrị ihe ọma ya. Ọ na-enyo ndị ọzọ enyo gabiga ókè ma nwee omume ihu abụọ ná mmeso ọ na-emeso ndị ọzọ, ọchịchị ya jupụtakwara n’inye iwu ka e gbuo ndị mmadụ—na-egbu ọtụtụ ndị bụbu ndị enyi ya. O mere ka iwu lèse-majesté (eze a kpasuru iwe) gbasawanye ma gụnye nanị ikwu okwu dị njọ megide eze n’onwe ya, tụkwasị n’ịgba ọchịchị mgba okpuru. A na-eche na dabere n’ike nke iwu a, ndị Juu manyere Gọvanọ Pọntiọs Paịlet nke Rom ka o mee ka e gbuo Jisọs.—Jọn 19:12-16.
Taịbiriọs mere ka Ndị Nche Eze ahụ nọrọ nanị gburugburu Rom site n’iwu ogige ndị agha siri ike n’akụkụ ebe ugwu nke mgbidi obodo ahụ. Ọnụnọ Ndị Nche ahụ nọ n’ebe ahụ menyere Kansụl Kasị Ukwuu nke Rom, bụ́ nke na-eyi ikike ya egwu, ụjọ, o gbochikwara ndị obodo ịkpa aghara. Taịbiriọs kwalitekwara ịgba ndị ọzọ àmà, mmekpọ ọnụ jupụtakwara n’akụkụ ikpeazụ nke ọchịchị ya.
Mgbe ọ nwụrụ, e weere Taịbiriọs dị ka onye ọchịchị aka ike. Mgbe ọ nwụrụ, ndị Rom ṅụrịrị ọṅụ, Kansụl Kasị Ukwuu ahụ jụkwara ime ya chi. N’ihi ihe ndị a na ihe ndị ọzọ, anyị na-ahụ n’ebe Taịbiriọs nọ mmezu nke amụma na-ekwu na “otu onye e ledara anya” ga-ebili dị ka “eze Ugwu.”—Daniel 11:15, 21.
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• Olee otú Octavian si ghọọ eze ukwu mbụ nke Rom?
• Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ihe ndị ọchịchị Ọgọstọs rụzuru?
• Gịnị bụgasị ihe ọma na ihe ọjọọ nke Taịbiriọs mere?
• Olee otú amụma banyere “onye e ledara anya” si mezuo n’isi Taịbiriọs?
[Ndise]
Taịbiriọs
Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 252-255]
Zenobia—Eze Nwanyị Bụ́ Dike nke Palmyra
“Ọ NA-EJI oji . . . Ezé ya dị ọcha dị ka pearl, anya ya buru ibu dịkwa oji na-egbuke egbuke, ọ makwara nnọọ mma. Olu ya dị ike ma dị ụtọ. E mere ka otú o si aghọta ihe dị ka nwoke sie ike ma bụrụ nke e ji ọmụmụ ihe ya chọọ mma. Ọ maara asụsụ Latin, ọ makwaara asụsụ Grik, Syriac, na Egyptian nke ọma.” Ndị a bụ otuto nke ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Edward Gibbon toro Zenobia—eze nwanyị bụ́ dike nke obodo Siria bụ́ Palmyra.
Di Zenobia bụ onye Palmyra a ma ama bụ́ Odaenathus, bụ́ onye e nyere ọkwá onye nnọchianya nke Rom na 258 O.A. n’ihi na ọ lụsowo Peasia ọgụ ma merie ha n’aha Alaeze Ukwu Rom. Afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, Odaenathus natara n’aka Eze Ukwu Gallienus nke Rom utu aha bụ́ corrector totius Orientis (gọvanọ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ nile). Nke a bụ iji jaa ya mma maka mmeri o meriri Eze Shāpūr nke Mbụ nke Peasia. Odaenathus mesịrị nye onwe ya utu aha bụ́ “eze kachasị ndị eze nile.” Ihe ịga nke ọma ndị a Odaenathus nwere pụrụ ịbụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu n’ihi obi ike na amamihe nke Zenobia.
ZENOBIA ACHỌỌ IKEPỤTA OTU ALAEZE UKWU
Na 267 O.A., mgbe ọ nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ọchịchị ya, e gburu Odaenathus na onye nketa ya. Zenobia weghaara ọkwá di ya, ebe ọ bụ na nwa ya nwoke dị nnọọ obere ime nke ahụ. N’ịbụ onye mara mma, onye nwere oké ọchịchọ, onye ruru eru dị ka onye ọchịchị, onye iso di ya achụ nta nkwado maara ahụ, nakwa onye ọtụtụ asụsụ na-aga were were n’ọnụ, o jisiri ike nweta nkwanye ùgwù na nkwado nke ndị ọ na-achị. Zenobia nwere mmasị n’ịmụ ihe, o jikwa ndị nwere ọgụgụ isi gbaa onwe ya gburugburu. Otu n’ime ndị ndụmọdụ ya bụ onye ọkà ihe ọmụma na ọkà n’ikwu okwu bụ́ Cassius Longinus—onye a sịrị na ọ bụ “ọbá akwụkwọ dị ndụ na ụlọ ndebe ihe ochie nke na-aga ije.” N’akwụkwọ bụ́ Palmyra and Its Empire—Zenobia’s Revolt Against Rome, onye na-ede akwụkwọ bụ́ Richard Stoneman na-ekwu, sị: “N’ime afọ ise sochirinụ mgbe Odenathus nwụsịrị . . . , Zenobia agbanyewo mkpọrọgwụ n’uche ndị ya dị ka dike nwanyị nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ.”
Peasia dị n’otu akụkụ nke ebe Zenobia na-achị, bụ́ nke ya na di ya meworo ka ọ gharakwa ịdị ike, Rom na-ada ada dịkwa n’akụkụ nke ọzọ. Banyere ọnọdụ ndị dị n’Alaeze Ukwu Rom n’oge ahụ, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ J. M. Roberts na-ekwu, sị: “Narị afọ nke atọ bụ . . . oge dị oké njọ nye Rom n’ókèala ya ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ, ebe oge ọhụrụ nke agha obodo na nnọchi ndị a na-esere okwu amaliteworị n’ụlọ. Ndị eze ukwu 22 (ma e wezụga ndị na-azọrọ ihe ha na-abụghị) chịrị.” N’aka nke ọzọ, nwanyị Siria ahụ bụ́ dike bụ onye ọchịchị kwụsiri nnọọ ike n’ógbè ya. “N’ịchịkwa alaeze ukwu abụọ [Peasia na Rom] ka ha kwụsie ike,” ka Stoneman na-ekwu, “ọ pụrụ ịchọ ikepụta nke atọ nke ga-achị ha abụọ.”
Ohere bịara Zenobia ịgbasapụ ike ọchịchị ya na 269 O.A., mgbe onye na-azọrọ ihe ọ na-abụghị nke na-agbagha ịchịisi Rom chịwara n’Ijipt. Usuu ndị agha Zenobia zọọrọ ije ngwa ngwa baa n’Ijipt, merie onye ahụ na-enupụ isi, ma weghara mba ahụ. N’ịkpọ onwe ya eze nwanyị Ijipt, ọ kpụrụ ego n’aha ya. Alaeze ya gbasapụrụ ugbu a site n’Osimiri Naịl ruo Osimiri Yufretis. Ọ bụ n’oge a ná ndụ ya ka Zenobia bịara nọrọ n’ọkwá “eze Ndịda.”—Daniel 11:25, 26.
ISI OBODO ZENOBIA
Zenobia mere ka isi obodo ya bụ́ Palmyra, sikwuo ike ma maa mma ruo n’ókè nke na ya na obodo ukwu ndị buru ibu karị nke ógbè ndị Rom hatawara. E mere atụmatụ na ndị bi na ya ruru ihe karịrị 150,000. Ihe owuwu ọha na eze, ụlọ nsọ, ubi, idé, na ihe ncheta magburu onwe ha jupụtara Palmyra, bụ́ obodo e ji mgbidi ndị a sịrị na ha dị kilomita 21 n’ogologo gbaa gburugburu. Ị̀bà ndị e ji idé ndị Kọrint e doro n’usoro, ndị karịrị mita 15 n’ịdị elu, rụọ—ihe dị ka 1,500—kwụrụ n’usoro n’okporo ámá ya bụ́ isi. Ihe oyiyi a kpụrụ akpụ na obi na isi a kpụrụ akpụ nke ndị dike na ndị ọgaranya e ritere ihe n’aka ha jupụtara n’obodo ahụ. Na 271 O.A., Zenobia guzobere ihe oyiyi abụọ a kpụrụ akpụ nke ya onwe ya na di ya nwụrụ anwụ.
Ụlọ Nsọ nke Anyanwụ bụ otu n’ime ihe owuwu ndị kasị mma dị na Palmyra, obi abụọ adịghịkwa ya na o nwere mmetụta dị ukwuu n’ihe omume okpukpe n’obodo ahụ. Ma eleghị anya, Zenobia fere chi e jikọrọ ya na chi anyanwụ. Otú ọ dị, Siria nke narị afọ nke atọ bụ obodo nwere ọtụtụ okpukpe. N’ebe Zenobia na-achị, e nwere ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst, ndị Juu, na ndị na-efe anyanwụ na ọnwa. Gịnị bụ omume ya n’ebe ụdị ofufe ndị a dị n’ógbè ya dị? Onye edemede bụ́ Stoneman na-ekwu, sị: “Onye ọchịchị maara ihe agaghị eleghara omenala ọ bụla nke yiri ka ọ dị ndị ọ na-achị mma, anya. . . . E nwere olileanya . . . na e wekọtawo chi dị iche iche ịkwado Palmyra.” Ihe àmà na-egosi na Zenobia kwere ka okpukpe ọ bụla dịrị.
N’ihi àgwà ya na-adọrọ mmasị, Zenobia dọọrọ mmasị ọtụtụ ndị. Nke kasị dị ịrịba ama bụ òkè o keere n’ịnọchite anya usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị e buru ụzọ kwuo banyere ya n’amụma Daniel. Otú ọ dị, ọchịchị ya akarịghị afọ ise. Eze Ukwu Aurelian nke Rom meriri Zenobia na 272 O.A. wee bibie Palmyra n’ụzọ a na-apụghịkwa ịrụzigharị arụzigharị. E meere Zenobia ebere. A sịrị na ọ lụrụ onye òtù kansụl kasị ukwuu nke Rom, a na-ewekwa ya na ọ dịrị ndụ ya fọdụrụ dị ka onye lara ezumike.
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• Olee otú e siworo kọwaa ụdị onye Zenobia bụ?
• Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ike ndị Zenobia kpara?
• Gịnị bụ omume Zenobia n’ebe okpukpe dị?
[Ndise]
Eze nwanyị Zenobia ka ọ na-agwa ndị soja ya okwu
[Chaati/Foto ndị dị na peeji nke 246]
Eze Ndị Dị na Daniel 11:20-26
Eze Ugwu Eze Ndịda
Daniel 11:20 Ọgọstọs
Daniel 11:21-24 Taịbiriọs
Daniel 11:25, 26 Aurelian Eze Nwanyị Zenobia
Ndakpọ ahụ Alaeze Ukwu Britain, e mesịa
e buru amụma ya Germany Ike Ọchịchị Ụwa
nke Alaeze Ukwu Anglo-America
Rom eduga
ná nguzobe nke
[Foto]
Taịbiriọs
[Foto]
Aurelian
[Foto]
Obere ihe oyiyi nke Charlemagne
[Foto]
Ọgọstọs
[Foto]
Ụgbọ mmiri agha narị afọ nke 17 nke Britain
[Foto dị na peeji nke nke 230]
[Foto dị na peeji nke 233]
Ọgọstọs
[Foto dị na peeji nke 234]
Taịbiriọs
[Foto dị na peeji nke 235]
N’ihi iwu Ọgọstọs, Josef na Meri gara Betlehem
[Foto dị na peeji nke 237]
Dị ka e buru n’amụma, e ‘tipịara’ Jisọs n’ọnwụ
[Foto ndị dị na peeji nke 245]
1. Charlemagne 2. Napoléon nke Mbụ 3. Wilhelm nke Mbụ 4. Ndị agha Germany, Agha Ụwa Mbụ