Echiche Bible Banyere Udo na Ntụkwasị Obi
Ọtụtụ ndị na-ewere ya otú ahụ ọ dị n’ile anya, bụ́ ihe ahụ yiri njem a na-azọ gaa n’ịdị n’otu ụwa dum na udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke a pụrụ iweta. Ha na-enwe olileanya na mgbalị dị otú ahụ ga-eduje n’ụwa nke ka mma. Ma Bible na-egosi na ọ dị ọtụtụ ihe nke a metụtara karịa ihe a na-ahụ anya.
OKWU metụtara udo na ịnọ ná ntụkwasị obi bụ ihe na-akpali mmasị n’ụzọ pụrụ iche nye ndị Kraịst n’ihi ihe Pọl degaara otu ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ n’okpuru nduzi mmụọ nsọ. E dekọrọ okwu ya n’ime Bible ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:3, sị: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime; ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.” Akụkụ akwụkwọ nsọ nke a na-ewelite ajụjụ ndị dị mkpa.
Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi —Ihe Na-eduje na Gịnị?
Ọ bụrụ na ị gụọ amaokwu dị gburugburu okwu Pọl ndị ahụ e hotara n’elu, ị ga-ahụ na ndị ahụ na-asị “udo na ntụkwasị obi” abụghị ndị Kraịst mụ anya nke ọma, kama nke ahụ, ha bụ mmadụ ndị na-amataghị ihe na-eme na gburugburu ha n’ezie. Ha nọ n’ọnọdụ dị ize ndụ ma ha amaghị banyere ya n’ihi na ha chere na ihe na-adịwanya mma. Ma n’ihe banyere ndị Kraịst, Pọl sịrị: “Ọ dịghị unu mkpa, ụmụnna anyị, ka e degara unu akwụkwọ banyere oge ahụ nile na ụbọchị ahụ nile.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:1) Ee, anyị kwesịrị ịmara banyere nhazi oge ihe omume nke Chineke. N’ihi gịnị? N’ihi na Pọl kwuru na oge mbibi mberede, nke a kpọrọ ‘ụbọchị Jehova,’ gaje ịbịa “dị ka onye ohi na-abịa n’abalị.”—1 Ndị Tesalonaịka 5:2.
Gịnị ka okwu udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ahụ e buru n’amụma ga-emetụta? N’ụzọ doro anya, ọ ghaghị ịbụ ihe karịrị okwu nkịtị. Ụmụ mmadụ anọwo na-ekwu okwu banyere udo ruo ihe fọdụrụ nke nta ka ọ bụrụ ogologo oge ha nọworo na-ebu agha. Okwu Pọl aghaghị izo aka n’oge mgbe mba dị iche iche ga-eyi ka ha na-enweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi n’ụzọ pụtara ìhè. Ma nke a ga-abụ nanị ọdịdị elu ahụ. O doro nnọọ anya na ihe yiri udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke na-eduje ná mbibi mberede abụghị ezi udo ma ọ bụkwanụ ezi ịnọ ná ntụkwasị obi.
Jisọs kwukwara okwu banyere mbibi mberede nke a. Ọ kpọrọ ya ‘mkpagbu ukwu nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.’ Ọtụtụ narị afọ tupu Jisọs, Daniel onye amụma kwukwara okwu banyere ya, ọ kọwakwara ya dị ka ‘mgbe ahụhụ nke mgbe dị otú ahụ na-adịghị site na mgbe mba ọ bụla malitere ịdị ruo mgbe ahụ.’—Matiu 24:21; Daniel 12:1.
Ma à kpọrọ ya mkpagbu ukwu, ma à kpọrọ ya oge ahụhụ—n’ọnọdụ nke ọ bụla, dị ka amụma ndị ahụ si kwuo, ọ ga-ekpochapụ akụkụ nile nke usoro ihe elu ala Setan. Kama ịbụ nke na-egosi na o nwere nkwado Chineke, okwu udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ahụ e buru n’amụma na-eduje kpọmkwem n’ihe megidere nke ahụ!—Tụlee Zefanaịa 3:8.
E Kpughere Ihe Ndị Ga-ekpebi Ihe Ga-emenụ
Ihe ndị a na-eme n’oge na-adịbeghị anya iji nweta ịdị n’otu ụwa ka ukwuu na olileanya ndị si na ya pụta banyere udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, hà bụ mmezu nke ịdọ aka ná ntị amụma nke Pọl? Dị nnọọ ka magazin nke a meworo ka ọ pụta ìhè ugboro ugboro, kemgbe 1914, anyị ahụwo mmezu nke ọtụtụ amụma Bible ndị e jikọrọ ha na ọnụnọ eluigwe nke Jisọs n’ike Alaeze. (Matiu, isi 24, 25; 2 Timoti 3:1-5; Mkpughe 6:1-8) Jisọs gosiri na ụbọchị Jehova, bụ́ mgbe mbibi mberede ga-abịakwasị ndị na-emebi iwu, ga-abịa mgbe ndị so n’ọgbọ nke ndị hụrụ mmalite nke oge a ka dị ndụ.—Luk 21:29-33.
Pọl onyeozi webatakwara ihe metụtara oge n’okwu ya. Ọ sịrị: “Mgbe ha ka na-ekwu okwu banyere udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, ozugbo, mbibi ga-abịakwasị ha.” Nsụgharị nke a nke okwu Pọl nke dị na The New English Bible gosiri n’ụzọ doro anya na mkpagbu ukwu ahụ ga-abịa “mgbe ha ka na-ekwu okwu.” Dị ka onye ohi na-abịa n’abalị—bụ́ nke a na-amaghị ama—mbibi ga-abịa mgbe a na-atụghị anya ya ma ọlị, mgbe echiche ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ ga-adịkwasị n’udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke ha nwere olileanya ya. N’ihi ya, ọ bụ ezie na anyị apụghị ikwu ugbu a ma ọnọdụ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi e nwere ugbu a ò mezuru okwu Pọl—ma ọ bụ ruo n’ókè hà aṅaa okwu udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ga-amụba—eziokwu ahụ nke bụ na a na-anụ okwu dị otú ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-anụtụbeghị na mbụ na-eme ka ndị Kraịst mụrụ anya n’oge nile.
‘Ịsọ Mpi’ n’Etiti Ọchịchị Ụwa Dị Iche iche
Mgbe o kwuru okwu banyere mgbe ahụhụ, Daniel onye amụma webatakwara okwu metụtara oge. O gosiri na mgbe ahụhụ ahụ ga-abịa n’ọgwụgwụ nke nsọrịta mpi nọworo ogologo oge n’etiti òtù ọchịchị abụọ, nke a kpọrọ otu n’ime ha “eze ugwu” kpọọkwa nke ọzọ, “eze nke ndịda.” (Daniel 11:5-43) Kemgbe ọgwụgwụ Agha Ụwa nke Abụọ, “eze nke ndịda” nke dị n’aka ndị aka ji akụ na “eze ugwu” nke ndị sosialist anọchitewo òtù ọchịchị abụọ ndị a.
Daniel buru amụma na mmarịta aka dị ilu n’etiti òtù abụọ ndị a, dị ka a hụtaworo ya n’ime 45 afọ gaworo aga, ga-adị ka ‘ịsọ mpi,’ dị ka mmadụ abụọ na-agba mgba, ndị na-azọ onye ga-emeri. N’oge na-adịbeghị anya, o yiri ka nsọrịta mpi ahụ ò belatawo. Otú a, na May afọ gara aga, onye minista mba Soviet na-ahụ maka okwu metụtara mba ndị ọzọ kwuru na Agha Nzuzo ahụ ebiwo. Na June, magazin Time zoro aka n’otu nzukọ e nwere n’etiti mba United States na Soviet Union wee sị: “Nkwekọrịta ụfọdụ e nwere banyere ibelata ngwá agha na nnwale ngwá agha nuklia gaara eyiworị imezu ihe dị ịtụnanya nke ukwuu n’afọ ole na ole gara aga. Ugbu a, ọbụna ma a tụlee ha n’ozuzu ha, ha yiri nnọọ ihe ndị na-adịchaghị oké mkpa.”
Ọ bụ nanị mgbe oge gasịrị ka a ga-amata ma ihe nke a yiri mmekọrịta enyi na enyi n’etiti mba abụọ ahụ bụ dike ọ̀ na-adị nwa mgbe ma ọ̀ bụ nke na-adịgide adịgide. Ma, otu ihe pụtara ìhè. Oge ahụ nke Jisọs hotara agamiwo. Ihe ndị na-eme n’ụwa na-egosikwa na anyị nọ nso ihe omume ndị ahụ nke Pọl onyeozi na Daniel onye amụma buru amụmụ ha. Ọbụna ma a sị na ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị na-eme n’oge na-adịbeghị anya bụ, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ, n’ihi mmetụta nke chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, ha agaghị eduje n’udo na-adịgide adịgide. Ihe àmà na-egosi na ha ga-eduje kpọmkwem n’ihe megidere nke ahụ nye mba nile nke ụwa nke a.
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
Ọ bụ nanị mgbe oge gasịrị ka a ga-amata ma ihe yiri mmekọrịta enyi na enyi nke dị n’etiti mba abụọ ndị ahụ bụ dike ọ̀ ga-adịgide
[Ebe E Si Nweta Foto]
USSR Mission to the UN