Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 12/15 p. 11-16
  • Ịlanarị ‘Ụbọchị Jehova’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịlanarị ‘Ụbọchị Jehova’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Emee Ihe n’Ụbọchị Noa
  • Ntaramahụhụ Ikpe Jehova n’Isi Sọdọm na Gọmọra
  • Israel Aghọrọ “Oké Ifufe”
  • Ime Mpịazi nke Jehova So Juda Dapụrụ n’Ezi Ofufe Mee
  • “Oké Mkpagbu” nke Narị Afọ Mbụ
  • Ndị E Chebere Ndụ Gabiga Mkpagbu Ukwu Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Mee Nkwupụta Ihu Ọha Maka Nzọpụta
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ịnọ Na Nche Anyị Adịkwuo Ngwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ì Jikerewo Maka Ụbọchị Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 12/15 p. 11-16

Ịlanarị ‘Ụbọchị Jehova’

“Ụbọchị Jehova dị ukwuu dịkwa egwu nke ukwuu; ònye kwa ga-anagide ya?”—JOEL 2:11.

1. N’ihi gịnị ka ‘ụbọchị Jehova dị egwu’ kwesịrị iji bụrụ oge ọṅụ?

‘DỊ EGWU nke ukwuu’! Otú ahụ ka onye amụma Chineke bụ́ Joel si na-akọwa oké “ụbọchị Jehova.” Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa ka anyị ndị hụrụ Jehova n’anya ma bịakwute ya ná nraranye ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs na-enwe ahụ erughị ala n’egwu ka ụbọchị Jehova na-abịa. Ọ ga-abụ ụbọchị dị oké egwu n’ezie, ma bụrụ ụbọchị oké nzọpụta, ụbọchị ntọhapụ site n’ajọ usoro ihe nke tiworo ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti kemgbe ọtụtụ narị afọ iri. N’atụmanya nke ụbọchị ahụ, Joel na-akpọ ndị Chineke òkù ka ha “tee egwú ọṅụ, ṅụrịakwa; n’ihi na Jehova emewo Onwe ya ukwu n’ime ihe,” ọ na-agbakwụnyekwa mmesi obi ike bụ́: “Ọ ga-erukwa, na onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.” Mgbe ahụ ná ndokwa Alaeze Chineke, “ụfọdụ ndị gbapụrụ agbapụ ga-adị, dị ka Jehova sịworo, na n’etiti ndị fọdụrụ afọdụ ka ndị Jehova na-akpọ ga-adị.”—Joel 2:11, 21, 22, 32.

2. Ná mmezu nke nzube Chineke, gịnị na-ewere ọnọdụ (a) “n’ụbọchị Onyenwe anyị”? (b) ‘n’ụbọchị Jehova’?

2 A gaghị ewere ụbọchị Jehova dị egwu dị ka ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ nke Mkpughe 1:10. Ụbọchị nke ikpeazụ a na-agụnye mmezu nke ọhụụ 16 a kọwara ná Mkpughe isi nke 1 ruo 22. Ọ na-agụnye oge mmezu nke ihe omume nile nke Jisọs buru amụma ha ná nzaghachi nye ajụjụ nke ndị na-eso ụzọ ya: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (NW) ‘Agha, ụnwụ nri, ịkpọasị, ọrịa na-efe efe, na mmebi iwu’ na-emenye ụjọ akawo ọnụnọ eluigwe nke Jisọs akara n’ụwa. Ka ihe ọjọọ ndị a mụbaworo, Jisọs enyewo nkasi obi maka ndị na-atụ egwu Chineke site n’izipụ ndị na-eso ụzọ ya nke oge a ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze . . . n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” Mgbe ahụ, dị ka oge kasị dị ịrịba ama nke ụbọchị Onyenwe anyị, “ọgwụgwụ” nke usoro ihe dị ugbu a, ụbọchị Jehova nke dị egwu, ga-etiwapụ. (Matiu 24:3-14; Luk 21:11) Nke ahụ ga-abụ ụbọchị Jehova maka imezu ihe e kpere n’ikpe ngwa ngwa n’isi ụwa rụrụ arụ nke Setan. “Eluigwe na ụwa ga-emekwa mkpatụ: ma Jehova ga-abụrụ ndị Ya ebe mgbaba.”—Joel 3:16.

Jehova Emee Ihe n’Ụbọchị Noa

3. Olee otú ọnọdụ ndị dị taa si yie ndị nke ụbọchị Noa?

3 Ọnọdụ ụwa taa yiri ndị dị “n’ụbọchị Noa” ihe karịrị afọ 4,000 gara aga. (Luk 17:26, 27) Na Jenesis 6:5, anyị na-agụ, sị: “Jehova wee hụ na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, Ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.” Lee ka o si yie ụwa taa! Ajọ omume, anyaukwu, na enweghị ịhụnanya jupụtara n’akụkụ ọ bụla. Mgbe ụfọdụ anyị pụrụ iche na ịrụ arụ nke ihe a kpọrọ mmadụ eruwo nsọtụ ya. Ma amụma Pọl onyeozi banyere “mgbe ikpeazụ” ka na-agakwa nnọọ n’ihu na-emezu: “Ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ, na-eduhie ndị ọzọ, a na-eduhiekwa ha.”—2 Timoti 3:1, 13.

4. Mmetụta dị aṅaa ka ofufe ụgha nwere n’oge ochie?

4 Okpukpe ọ̀ pụrụ iwetawo ahụ efe maka ihe a kpọrọ mmadụ n’oge Noa? N’ụzọ dị iche, okpukpe si n’ezi ofufe dapụ dị ka nke dịrị n’oge ahụ gaara atụnyeworị ụtụ dị ukwuu n’ọnọdụ ndị na-ebibi ihe. Nne na nna anyị mbụ adabawo n’ozizi ụgha nke “agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.” N’ọgbọ nke abụọ site n’Adam, “a malitere ịkpọku aha Jehova,” ikekwe n’ụzọ nkwulu. (Mkpughe 12:9; Jenesis 3:3-6; 4:26) E mesịa, ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, bụ́ ndị hapụrụ ofufe a na-ekewaghị ekewa nye Chineke, nwoghaara ahụ mmadụ iji soro ụmụ ndị inyom mara mma nke mmadụ nwee mmekọahụ rụrụ arụ. Ndị inyom a mụtara ndị dimkpa gwara ọgwa, a kpọrọ Nefilim, bụ́ ndị kpagburu ma mesoo ihe a kpọrọ mmadụ omume ọjọọ. N’okpuru mmetụta ndị mmụọ ọjọọ, “anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, bibiri ụzọ ya n’elu ụwa.”—Jenesis 6:1-12.

5. N’izo aka n’ihe ndị mere n’ụbọchị Noa, agbamume ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jisọs na-enye anyị?

5 Otú ọ dị, otu ezinụlọ guzosiri ike n’ezi ihe nye Jehova. Ya mere, Chineke ‘chebere Noa, onye mere ha asatọ, bụ́ onye na-ekwusa ezi omume, mgbe O mere ka iju mmiri bịakwasị ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.’ (2 Pita 2:5) Iju Mmiri ahụ sere onyinyo ụbọchị Jehova nke dị egwu, nke na-aka ọgwụgwụ nke usoro ihe a akara nakwa nke Jisọs buru n’amụma, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara. Ọ bụkwa dị ka ụbọchị Noa dịrị, otú a ka [ọnụnọ, NW] Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ na mgbe ahụ nke bu oké iju mmiri ahụ ụzọ na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-alụ nwunye, na-enyekwa n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa batara n’ụgbọ ya, ha amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile; otú a ka [ọnụnọ, NW] Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Matiu 24:36-39) Anyị nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ taa, ya mere Jisọs na-agba anyị ume ‘[ilezi onwe anyị anya, NW], mụrụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka anyị wee ka n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime.’—Luk 21:34-36.

Ntaramahụhụ Ikpe Jehova n’Isi Sọdọm na Gọmọra

6, 7. (a) Gịnị ka ihe ndị mere n’oge Lọt sere onyinyo ya? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa doro anya ka nke a na-enye anyị?

6 Ihe dị ka ọtụtụ narị afọ mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, mgbe ụmụ Noa mụbaworo n’ụwa, Abraham kwesịrị ntụkwasị obi na nwa nwanne ya bụ́ Lọt ji anya ha hụ ụbọchị Jehova ọzọ nke dị egwu. Lọt na ezinụlọ ya biri n’obodo Sọdọm. Tinyere Gọmọra ya na ya gbara agbata obi, obodo a aghọwo nke omume mmekọahụ rụrụ arụ nke ukwuu rikpuru. Ihe onwunwe kwa bụ ihe a kasị elekwasị anya, n’ikpeazụ na-emetụta ọbụna nwunye Lọt. Jehova agwawo Abraham: “Iti mkpu Sọdọm na Gọmọra, o hiri nne n’ezie, mmehie ha kwa, ọ dị arọ nke ukwuu n’ezie.” (Jenesis 18:20) Abraham rịọrọ Jehova ka ọ ghara ibibi obodo abụọ ahụ n’ihi ndị ezi omume nọ n’ime ha, ma Jehova kwupụtara na ya apụghị ịchọta ọbụna ndị ezi omume iri n’ebe ahụ. Ndị mmụọ ozi sitere n’ebe Chineke nọ nyeere Lọt na ụmụ ya nwanyị abụọ aka ịgbaga n’obodo dị nso bụ́ Zoa.

7 Gịnị sochiri? N’ịtụnyere “mgbe ikpeazụ” anyị n’oge Lọt, Luk 17:28-30 na-akọ, sị: “Otú ahụ dị ka e mere n’ụbọchị Lọt; ha na-eri ihe, ha na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ha na-azụ, ha na-ere, ha na-akụ ihe n’ubi, ha na-ewu ụlọ; ma n’ụbọchị Lọt siri na Sọdọm pụta ọkụ na brimstone si n’eluigwe zoo, wee laa ha nile n’iyi: n’otu aka ahụ ka ọ ga-adị n’ụbọchị a ga-ekpughe Nwa nke mmadụ.” Ihe mere Sọdọm na Gọmọra n’ụbọchị Jehova nke dị oké egwu na-enye anyị ịdọ aka ná ntị doro anya n’oge a nke ọnụnọ Jisọs. Ọgbọ oge a nke ihe a kpọrọ mmadụ ‘akwawokwa iko wee pụọ soo anụ ahụ dị iche.’ (Jud 7) Ọzọkwa, omume mmekọahụ rụrụ arụ nke oge anyị abụrụwo ihe kpatara ọtụtụ “ọrịa na-efe efe” nke Jisọs buru amụma ya maka oge a.—Luk 21:11.

Israel Aghọrọ “Oké Ifufe”

8. Ruo n’ókè hà aṅaa ka Israel debere ọgbụgba ndụ ha na Jehova?

8 Ka oge na-aga, Jehova họọrọ Israel ịbụ ‘ihe nke aka ya karịa ndị nile, alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ.’ Ma nke a dabeere na ha ‘ige ntị n’olu ya n’ezie ma debe ọgbụgba ndụ ya.’ (Ọpụpụ 19:5, 6) Hà ji oké ihe ùgwù a kpọrọ ihe? Ọ dịghị ma ọlị! N’ezie, ndị kwesịrị ntụkwasị obi nke mba ahụ ji iguzosi ike n’ihe jeere ya ozi—Mosis, Samuel, Devid, Jehoshafat, Hezekaịa, Josaịa, nakwa ndị nwoke na nwanyị bụ́ ndị amụma raara onwe ha nye. Ma mba ahụ n’ozuzu ya ekwesịghị ntụkwasị obi. Ka oge na-aga, alaeze ahụ kewara abụọ—Israel na Juda. N’ozuzu ya, mba abụọ ahụ mikpuru n’ofufe ikpere arụsị na omenala ndị ọzọ na-adịghị asọpụrụ Chineke nke mba ndị gbara ha agbata obi.—Ezikiel 23:49.

9. Olee otú Jehova si kpee alaeze ebo iri ahụ nupụrụ isi ikpe?

9 Olee otú Jehova si kpebie okwu? Dị ka mgbe nile, ọ dọrọ aka ná ntị, n’ikwekọ n’ụkpụrụ Emọs kwupụtara: “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma Ya.” Emọs n’onwe ya kpọsara ahụhụ maka alaeze ebe ugwu nke Israel, sị: “Uru gịnị ka ụbọchị Jehova ga-abara unu? ụbọchị ahụ bụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè.” (Emọs 3:7; 5:18) Ọzọkwa, onye amụma ibe Emọs bụ́ Hosea kwupụtara: “Ifufe ka ha na-agha dị ka mkpụrụ ọghịgha, ọ bụkwa oké ifufe ka ha ga-ewe dị ka ihe ubi.” (Hosea 8:7) Na 740 T.O.A., Jehova jiri usuu ndị agha Asiria bibie alaeze ebe ugwu nke Israel ruo ebighị ebi.

Ime Mpịazi nke Jehova So Juda Dapụrụ n’Ezi Ofufe Mee

10, 11. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji ghara ikwe ịgbaghara Juda? (b) Ihe arụ ndị dị aṅaa merụworo mba ahụ?

10 Jehova zijekwara ndị amụma ya n’alaeze ndịda nke Juda. Ma, eze Juda ndị dị ka Manase na onye nọchiri ya, Amọn, gara n’ihu na-eme ihe na-adịghị mma n’anya Ya, na-awụfu ‘ọbara na-emeghị ihe ọjọọ nke ukwuu hie nne ma na-efe arụsị ofufe, na-akpọkwa isiala nye ha.’ Ọ bụ ezie na nwa Amọn bụ́ Josaịa mere ihe ziri ezi n’anya Jehova, eze ndị sochiri, nakwa ndị ala ahụ, mikpukwara ọzọ n’ajọ omume, nke mere na “Jehova ekweghịkwa ịgbaghara.”—2 Ndị Eze 21:16-21; 24:3, 4.

11 Jehova kwupụtara site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Jeremaịa: “Ihe ijuanya na ihe jọgburu onwe ya emewo n’ala; ndị amụma ebuwo amụma ụgha, ndị nchụàjà na-azọdakwa ndị m site n’aka ha; ndị m ahụwokwa ihe dị otú a n’anya: ma gịnị ka unu ga-eme n’ikpeazụ ya?” Mba Juda abụrụwo nke ikpe ọbara mara ruo ná nsọtụ, e merụwokwa ndị ya site n’izu ohi, igbu mmadụ, ịkwa iko, ịṅụ iyi ụgha, iso chi ndị ọzọ, na ihe ọjọọ ndị ọzọ. Ụlọ nsọ Chineke aghọwo “ọgbà ndị na-eme ihe ike.”—Jeremaịa 2:34; 5:30, 31; 7:8-12.

12. Olee otú Jehova si gaa n’ihu inye Jerusalem na-adaghachi azụ ntaramahụhụ?

12 Jehova kwupụtara, sị: “Ihe ọjọọ ka Mụ onwe m na-eme ka o si n’Ugwu [Kaldea] bịa, ya na ntipịa ukwu.” (Jeremaịa 4:6) N’ihi ya, ọ kpọbatara Ike Ụwa Babilọn, bụ́ mgbe ahụ “òtùtù nke ụwa nile,” ịkụjasị Jerusalem dapụrụ n’okwukwe na ụlọ nsọ ya. (Jeremaịa 50:23) Na 607 T.O.A., mgbe mwakpo dị ilu gasịrị, obodo ahụ dara n’ihu usuu ndị agha dị ike nke Nebukadneza. “Eze Babilọn wee gbuo ụmụ ndị ikom [Eze] Zedekaịa n’ime Ribla n’anya ya: ọ bụkwa ndị nile nke Juda a maara aha ha ka eze Babilọn gburu. O mekwara ka Zedekaịa kpuo ìsì n’anya ya abụọ, o werekwa ihe ọla e ji kee ụkwụ kee ya agbụ, ime ka ọ baa na Babilọn. Ọ bụkwa ụlọ eze na ụlọ nile nke ndị Israel ka ndị Kaldea surere n’ọkụ, ha kwatukwara mgbidi nile nke Jerusalem. Ma ndị Israel nke fọdụrụ, bụ́ ndị fọdụrụ n’obodo ahụ, na ndị dapụrụ adapụ, bụ́ ndị dapụrụ jekwuru ya, na ndị Israel fọdụrụ, bụ́ ndị fọdụrụ n’ebe ahụ, ndị a ka Nebuzaradan, bụ́ onye isi ndị ogbu, mere ka ha jee biri na Babilọn.”—Jeremaịa 39:6-9.

13. Olee ndị a zọpụtara n’ụbọchị Jehova na 607 T.O.A., n’ihi gịnịkwa?

13 Ụbọchị dị egwu n’ezie! Ma, mkpụrụ obi ole na ole ndị rubeere Jehova isi so n’ime ndị a gbapụtara n’ikpe ahụ siri ike. Ndị a gụnyere ndị Rikab na-abụghị ndị Israel, bụ́ ndị n’ụzọ dị iche n’ebe ndị Juda nọ gosiri mmụọ obi umeala na nrubeisi. Ndị ọzọ a zọpụtakwara bụ ọnaozi kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ebed-melek, onye napụtaworo Jeremaịa n’ọnwụ n’olulu apịtị, nakwa odeakwụkwọ na-eguzosi ike n’ihe nke Jeremaịa, bụ́ Beruk. (Jeremaịa 35:18, 19; 38:7-13; 39:15-18; 45:1-5) Ọ bụ nye ndị dị otú ahụ ka Jehova kwupụtara, sị: “Mụ onwe m maara echiche nile nke Mụ onwe m na-eche banyere unu, . . . echiche nke udo, ọ bụghị nke ihe ọjọọ, inye unu ọdịnihu na ntụkwasị obi.” Nkwa ahụ nwere mmezu dị nta na 539 T.O.A., mgbe onye meriri Babilọn, bụ́ Eze Saịrọs, tọhapụrụ ndị Juu na-atụ egwu Chineke, ha wee laghachi iwughachi obodo Jerusalem na ụlọ nsọ ya. Ndị si n’okpukpe Babilọn pụta taa, e weghachikwa ha n’ofufe dị ọcha nke Jehova pụrụ n’otu aka ahụ ilepụ anya n’ọdịnihu dị ebube nke udo ebighị ebi n’ime Paradaịs e weghachiri nke Jehova.—Jeremaịa 29:11; Abụ Ọma 37:34; Mkpughe 18:2, 4.

“Oké Mkpagbu” nke Narị Afọ Mbụ

14. N’ihi gịnị ka Jehova ji jụ Israel n’ụzọ na-adịgide adịgide?

14 Ka anyị gaa na narị afọ mbụ O.A. Ka ọ na-erule oge ahụ ndị Juu e weghachiri adapụwokwa ọzọ n’ezi ofufe. Jehova zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ụwa ịbụrụ ya Onye E Tere Mmanụ, ma ọ bụ Mesaịa. N’oge afọ 29 ruo 33 O.A., Jisọs mere nkwusa n’ala Israel nile, na-asị: “Chegharịanụ; n’ihi na alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 4:17) Ọzọkwa, ọ kpọkọtara ma nye ndị na-eso ụzọ ọzụzụ isoro ya kere òkè n’ịkpọsa ozi ọma Alaeze ahụ. Olee otú ndị na-achị ndị Juu si meghachi omume? Ha kwutọrọ Jisọs ma n’ikpeazụ mee mpụ jọgburu onwe ya nke igbu ya ogbugbu dị njọ n’elu osisi ịta ahụhụ. Jehova jụrụ ndị Juu dị ka ndị ya. Ugbu a ọjụjụ a jụrụ mba ahụ na-adịgide adịgide.

15. Olee ihe ndị Juu chegharịrịnụ nwere ihe ùgwù ịrụzu?

15 N’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., Jisọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ wụpụrụ mmụọ nsọ, nke a nyekwara ndị na-eso ụzọ ya ike ikwu okwu n’ọtụtụ asụsụ nye ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ́ ndị zukọworo ngwa ngwa. N’ịgwa ìgwè mmadụ ahụ okwu, Pita onyeozi kwupụtara: “Jisọs nke a ka Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie, nke anyị onwe anyị nile bụ ndị àmà ya. . . . Ya mere ka ụlọ Israel nile mazuo, na Chineke mere Ya ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst anyị, bụ́ Jisọs ahụ Onye unu onwe unu [kpọgburu, NW].” Olee otú ndị Juu nwere ezi obi si meghachi omume? “E wee dụọ ha n’ime obi ha,” ha echegharịa site ná mmehie ha, e meekwa ha baptism. (Ọrụ 2:32-41) Nkwusa Alaeze ahụ gara ngwa ngwa, n’ime afọ 30 kwa a gbasawo ya gaa “n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.”—Ndị Kọlọsi 1:23.

16. Olee otú Jehova si weta ihe omume ndị dujere na ya imezu ikpe n’isi Israel anụ ahụ?

16 Oge eruola ugbu a ka Jehova mee ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ndị ya a jụrụ ajụ, bụ́ Israel anụ ahụ. Ọtụtụ puku, si ná mba nile nke ụwa a maara mgbe ahụ pụta, enubawo n’ọgbakọ ndị Kraịst, e tewokwa ha mmanụ dị ka ‘Israel ime mmụọ nke Chineke.’ (Ndị Galetia 6:16) Otú ọ dị, ndị Juu nke oge ahụ emibanyewo n’ụzọ nke ịkpọasị na ime ihe ike nke iro òtù. N’ụzọ megidere ihe Pọl deworo banyere ‘ido onwe onye n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya,’ ha nupụrụ isi n’ụzọ pụtara ìhè megide ike Rom chịrị ha. (Ndị Rom 13:1) O doro anya na Jehova wetara ihe omume ndị ahụ nke sochirinụ. N’afọ 66 O.A., usuu ndị agha Rom nọ n’okpuru Ọchịagha Gallus gawara ịgba Jerusalem gburugburu. Ndị Rom ahụ na-eme mwakpo banyere n’obodo ahụ ruo n’ókè nke igwu ala n’okpuru mgbidi ụlọ nsọ ahụ. Dị ka akụkọ ihe mere eme nke Josephus na-akọ, e nwere n’ezie mkpagbu nye obodo ahụ na nye ndị ya.a Ma na mberede ndị agha ahụ na-eme mwakpo gbara ọsọ. Nke a nyere ndị na-eso ụzọ Jisọs ohere ‘ịgbalaga n’ugwu,’ dị ka e nyere ndụmọdụ ya n’amụma ya e dekọrọ na Matiu 24:15, 16.

17, 18. (a) Site ná mkpagbu dị aṅaa ka Jehova mezuru ikpe n’isi ndị Juu? (b) Anụ ahụ dị aṅaa ‘wepụgara onwe ha,’ gịnịkwa ka nke a sere onyinyo ya?

17 Otú ọ dị, izu ezu nke ime ihe e kpere n’ikpe Jehova ná njedebe nke mkpagbu ahụ abịabeghị. Na 70 O.A., usuu ndị agha Rom, ugbu a n’okpuru Ọchịagha Titus, lọghachiri ime mwakpo. Nke ugbu a ọgụ ahụ kpebiri ihe nile! Ndị Juu, bụ́ ndị nọworo na-alụ agha ọbụna n’etiti onwe ha, erughị ndị Rom ihe ọ bụla. E tidaruru obodo ahụ na ụlọ nsọ ya ala. Ihe karịrị otu nde ndị Juu tachara ahụ tara ahụhụ ma nwụọ, e bufuo ihe dị ka ozu 600,000 n’èzí ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ. Mgbe obodo ahụ dasịrị, a dọọrọ ndị Juu 97,000 n’agha, ọtụtụ gaje ịnwụ mgbe e mesịrị n’egwuregwu ime ihe ike. N’ezie, nanị anụ ahụ a zọpụtara n’afọ ndị ahụ nke mkpagbu ahụ bụ nke ndị Kraịst ahụ rubere isi gbalagaworo n’ugwu gafee Jọdan.—Matiu 24:21, 22; Luk 21:20-22.

18 Otú a, amụma ukwu Jisọs banyere “ọgwụgwụ nke usoro ihe a” nwere mmezu ya mbụ, na-ejedebe n’ụbọchị Jehova maka imezu ikpe n’isi mba ndị Juu nupụrụ isi na 66-70 O.A. (Matiu 24:3-22) Ma, nke ahụ bụ nanị ihe atụ nke ‘ọbịbịa nke ụbọchị Jehova dị ukwuu dịkwa egwu,’ mkpagbu ikpeazụ nke na-akwado irikpu ụwa dum. (Joel 2:31) Olee otú ị pụrụ isi “wepụga onwe” gị? Isiokwu na-esonụ ga-ekwu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Josephus na-akọ na ndị Rom ahụ na-eme mwakpo gbara obodo ahụ gburugburu, gwuo ala n’okpuru akụkụ mgbidi ya, na-achọkwa ịgba ọnụ ụzọ ámá nke ụlọ nsọ Jehova ọkụ. Nke a kpatara oké ụjọ n’etiti ọtụtụ ndị Juu tọrọ n’ime, n’ihi na ha pụrụ ịhụ ka ọnwụ na-abịa.—Wars of the Jews, Akwụkwọ nke Abụọ, isi nke 19.

Ajụjụ Maka Ntụleghachi

◻ Olee otú ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ na “ụbọchị Jehova” si nwee njikọ?

◻ N’ịtụleghachi ụbọchị Noa, ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịṅa ntị?

◻ Olee otú Sọdọm na Gọmọra si nye ihe mmụta siri ike?

◻ Olee ndị a zọpụtara ‘n’oké mkpagbu’ nke narị afọ mbụ?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Jehova meere ezinụlọ Noa na Lọt ụzọ mgbapụ, nakwa na 607 T.O.A. na 70 O.A.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya