Na-asụ Asụsụ ahụ Dị Ọcha Ka I Wee Dịrị Ndụ Ebighị Ebi!
“Chọọnụ Jehova, . . . Chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”—ZEFANAỊA 2:3.
1. (a) Usoro dịgasị aṅaa ka ụmụ akwụkwọ na-eji amụ asụsụ ala ọzọ? (b) N’ihi gịnị ka a ga-eji na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha?
ỤMỤ akwụkwọ pụrụ ịmụta asụsụ ọhụrụ site n’iji usoro nke ụtọ asụsụ ma ọ bụ usoro nke otú e si ekwupụta okwu n’asụsụ ahụ mee ihe. N’usoro nke ụtọ asụsụ, ha na-ejikarị akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche na-eme ihe, na-amụtakwa ụkpụrụ ndị na-achị ụtọ asụsụ. N’usoro nke otú e si ekwupụta okwu n’asụsụ ahụ, ha na-eṅomi ụda olu na usoro ikwu okwu nke onye nkụzi ha. A na-ejicha usoro abụọ ahụ na-eme ihe n’ịmụta ‘asụsụ ahụ dị ọcha.’ Ọ dịkwa mkpa ka anyị na-asụ asụsụ nke a ma ọ bụrụ na anyị nwere olileanya ịbụ ndị ‘e zobere n’ụbọchị iwe Jehova.’—Zefanaịa 2:1-3; 3:8, 9.
2. Olee ụzọ anyị pụrụ isi mụta ihe a pụrụ ịkpọ ụkpụrụ nile nke ụtọ asụsụ maka asụsụ ahụ dị ọcha?
2 Akwụkwọ ọgụgụ bụ isi n’ịmụ asụsụ ahụ dị ọcha bụ Bible. Ịdị uchu n’ịmụ ya na akwụkwọ ndị dabeere na Bible na-akụziri gị ihe a pụrụ ịkpọ ụkpụrụ dị iche iche nke ụtọ asụsụ maka asụsụ ahụ dị ọcha. Ọmụmụ Bible ebe obibi nke otu n’ime Ndịàmà Jehova na-eduzi bụ mmalite dị mma. Nye ndị raraworo onwe ha nye Jehova Chineke, ịdị uchu n’inwe ọmụmụ Akwụkwọ nsọ mgbe nile bụ ihe dị mkpa. Ma, è nwere ụzọ ndị kasị dịrị irè e si amụta asụsụ ahụ dị ọcha? Oleekwa abamuru ndị a na-enweta site n’ịsụ ya?
Ụzọ A Na-esi Amụta Asụsụ ahụ Dị Ọcha
3. Gịnị bụ otu ụzọ a na-esi amụta asụsụ ahụ dị ọcha?
3 Otu ụzọ ị pụrụ isi mụta asụsụ ahụ dị ọcha bụ ijikọ eziokwu ndị ị na-amụta na isi ihe ndị ị mawororịị, dị ka nwata akwụkwọ pụrụ ịnọgide na-ejikọta ụkpụrụ dị iche iche nke ụtọ asụsụ. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, ị pụrụ ịmawo na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke, ma ị maghị ihe dị ukwuu banyere ọrụ ya nile. Kemgbe ahụ, ọmụmụ Bible pụrụ ịkụziworo gị na Kraịst na-achị achị ugbu a dị ka Eze n’eluigwe, na n’ime Ọchịchị Puku Afọ ya, a gaje ibuli ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi gaa n’izu okè. (Mkpughe 20:5, 6) Ee, ijikọ echiche ọhụrụ na ndị ị mabu ama na-emeziwanye nghọta i nwere n’asụsụ ahụ dị ọcha.
4. (a) Gịnị bụ ụzọ ọzọ a na-esi amụta ‘ụkpụrụ ụtọ asụsụ’ nke asụsụ ahụ dị ọcha, oleekwa ihe ndekọ Bible e jiri mee ihe atụ nke a? (b) Gịnị mere mgbe Gideọn na narị ndị ikom atọ ya malitere ime ihe? (ch) Gịnị ka ihe ndekọ banyere Gideọn na-akụziri anyị?
4 Ụzọ ọzọ e si amụta ‘ụkpụrụ dị iche iche nke ụtọ asụsụ’ nke asụsụ ahụ dị ọcha bụ iji anya nke uche hụ ihe omume ndị e dekọrọ na Bible. Iji maa atụ: Gbalịa ‘ịhụ ma nụ’ ihe ndekọ ahụ dị ná Ndị Ikpe 7:15-23. Lee! Onye Ikpe Israel bụ Gideọn ekewawo usuu ndị agha ya gaa n’òtù atọ nke nke ọ bụla n’ime ha nwere otu narị ndị ikom. N’ime ọchịchịrị ahụ, n’emeghịkwa ụzụ, ha si n’Ugwu Gilboa rịdata ma gbaa ọmụma ụlọ ikwuu nke ndị Midian ahụ na-ehi ụra gburugburu. Narị mmadụ atọ ndị a hà ji ezigbo ngwá agha? Ha ejighị, n’ụzọ ndị agha si ele ihe anya. Ee, ndị mpako bụ ọkà n’ihe banyere agha ga-achị ha ọchị n’ịkwa emo! Nke ọ bụla n’ime ha nwere nanị otu opi ike, otu ite mmiri buru ibu, na ọwá ọkụ n’ime ite ahụ. Ma gee ntị! N’oge e nyere otu ihe àmà, otu narị ndị ikom ahụ ha na Gideọn nọ fụrụ opi ike ha ma tiwasịa ite mmiri ha. Otú ahụkwa ka narị abụọ ndị ọzọ ahụ mere. Mgbe ha nile weliri ọwá ọkụ na-enwu enwu elu, ị na-anụ ka ha tiri mkpu, sị: “Mma agha dịịrị Jehova dịkwara Gideọn!” Lee nnọọ ka nke a si bụrụ oké ihe iyi egwu nye ndị Midian ahụ! Ha ji anya ụra mapụtasịa n’ụlọ ukwuu ha, saghesịa anya n’ụjọ n’ihi ire ọkụ ndị ahụ jupụtara ebe nile ndị na-egosi onyinyo ndị dị inyoghi inyoghi nke ndị mmadụ ma kpalie ụjọ na-enweghị isi n’ihi nkwenkwe ụgha ha. Ka ndị Midian ahụ malitere ịgbalaga, ndị ikom Gideọn nọgidere na-afụ opi ike ha, Chineke mekwara ka ndị iro ha malite imegiderịta onwe ha. Lee nnọọ ihe mmụta gbara ọkpụrụkpụ nke a bụ n’asụsụ ahụ dị ọcha! Chineke pụrụ ịnapụta ndị ohu ya n’ejighị usuu ndị agha bụ mmadụ mee ihe. Ọzọkwa, “Jehova agaghị ahapụ ndị ya n’ihi aha ukwu ya.”—1 Samuel 12:22.
5. Olee ụzọ nzụkọ ndị Kraịst pụrụ isi nye aka ịnụcha okwu ọnụ anyị?
5 Mgbe a na-akụziri ụmụ akwụkwọ asụsụ ndị mba ọzọ site n’usoro nke otú e si ekwupụta okwu n’asụsụ ahụ, ha na-agbalị ikwughachi ihe onye nkụzi ha kwuru, gbasookwa ụkpụrụ okwu ya n’ụzọ ziri ezi. Lee nnọọ ezi ohere ndị e nwere ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha ná nzukọ dị iche iche nke ndị Kraịst! N’ebe ahụ, anyị na-anụ ka ndị ọzọ na-ekwupụta okwu n’asụsụ ahụ nke eziokwu Akwụkwọ nsọ, anyị pụkwara inwe ihe ùgwù nke ikwu okwu n’onwe anyị. Ànyị na-atụ egwu na anyị pụrụ ikwu ihe na-ezighị ezi? Ka nke ahụ ghara ịbụ isi ihe na-echegbu anyị, n’ihi na ihe a na-ekwuzighị ekwuzi nke onye okenye na-eduzi nzukọ dị otú ahụ ji obi ọma kwuzie, dị ka n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche a na-enwe kwa izu, pụrụ ịnụcha okwu ọnụ anyị. Ya mere, soro jee, na-ekerekwa òkè ná nzukọ ndị Kraịst na-enwe mgbe mgbe.—Ndị Hibru 10:24, 25.
Mmịbata nke Ihe Ndị Na-adịghị Ọcha
6. N’ihi gịnị ka e ji nwee ọdịiche dị otú a n’etiti Ndịàmà Jehova na òtù okpukpe dị iche iche nke Krisendọm?
6 Ndị ahụ na-akpọsa nzube Jehova, na-amakwa ọkwa banyere Alaeze eluigwe ya, na-asụkwa asụsụ ahụ dị ọcha dị ka Ndịàmà ya. Ha na-eme ka a mara aha ya, na-ejekwara ya ozi “n’otu ubu,” ma ọ bụ n’otu nkwekọrịta. (Zefanaịa 3:9) Ọ bụ ezie na òtù okpukpe dị iche iche nke Krisendọm nwere Bible, ha adịghị asụ asụsụ ahụ dị ọcha ma ọ bụ jiri okwukwe na-akpọku aha Chineke. (Joel 2:32) Ha enweghị ozi nke nwere nkwekọ nke dabeere n’Akwụkwọ nsọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha na-edebe omenala nile nke okpukpe, nkà ihe ọmụma ụwa, na inye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nkwado siri ike n’ọnọdụ dị elu karịa Okwu Chineke. Nzube ha nile, olileanya ha nile, na usoro ihe omume ha nile, bụcha nke ajọ ụwa nke a.
7. Ọdịiche dịgasị aṅaa n’etiti Ndịàmà Jehova na okpukpe ụgha dị iche iche ka a na-egosipụta na 1 Jọn 4:4-6?
7 Krisendọm—n’ezie, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha dum—adịghị asụ otu asụsụ ahụ Ndịàmà Jehova na-asụ. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na Jọn onyeozi degaara ndị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha akwụkwọ, sị: “Unu onwe unu bụ ndị siri na Chineke pụta, unu emeriwokwa ha: n’ihi na onye ahụ nke nọ n’ime unu ka onye ahụ nke nọ n’ụwa ukwuu. Ndị ahụ bụ ndị nke ụwa: n’ihi nke a ha na-ekwu okwu nke si n’ụwa pụta, ụwa na-anụkwa olu ha. Anyị onwe anyị bụ ndị siri na Chineke pụta: onye maara Chineke na-anụ olu anyị; onye na-esighị na Chineke pụta adịghị anụ olu anyị.” (1 Jọn 4:4-6) Ndị ohu Jehova emeriwo ndị ozizi ụgha n’ihi na Chineke, bụ́ onye na-anọnyere ndị ya, “ka [Ekwensu, bụ́] onye ahụ nke nọ n’ụwa ukwuu,” bụ́ òtù ụmụ mmadụ ndị ajọ omume. Ebe ọ bụ na ndị dapụrụ n’ezi ofufe “si n’ụwa pụta,” nweekwa ajọ mmụọ ya, “ha na-ekwu okwu nke si n’ụwa pụta, ụwa na-anụkwa olu ha.” Ma mmadụ ndị yiri atụrụ na-ege ndị ahụ sitere n’ebe Chineke nọ ntị, na-aghọta na ndị Jehova na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha nke eziokwu Bible nke sitere ná nzukọ ya na-abịa.
8. Gịnị bụ ihe e ji amara onye ahụ na-emebi iwu?
8 E buru amụma banyere oké ndapụ n’ezi ofufe, ‘ihe omimi nke mmebi iwu’ anọwokwarị n’ọrụ n’ime narị afọ mbụ O.A. Mgbe oge na-aga, ndị ikom bụ ndị nakweere—ma ọ bụ jiri ike weghara—ọnọdụ izi ihe n’ime ọgbakọ kụziri ọtụtụ ozizi ụgha. Asụsụ ha adịghị ọcha ma ọlị. N’ihi ya, ‘onye na-emebi iwu’ nke ọtụtụ ndị mejupụtara bilitere, bụ́ ndị ndú okpukpe nke Krisendọm, ndị rapagidesiri ike n’omenala okpukpe dị iche iche, nkà ihe ọmụma ụwa, na ozizi ndị akwụkwọ nsọ na-akwadoghị.—2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 7.
A Na-anụ Asụsụ ahụ Dị Ọcha n’Ụwa Dum
9. Ihe dịgasị aṅaa banyere okpukpe mere n’ime narị afọ nke 19?
9 Nanị ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị na-atụ egwu Chineke ‘gbasiri mgba ike n’ihi okwukwe ahụ e nyere ndị nsọ n’aka idebe.’ (Jud 3) Olee ebe a pụrụ ịhụ ndị kwere ekwe dị otú ahụ? Ruo ọtụtụ narị afọ, okpukpe ụgha debere ìgwè ụmụ mmadụ n’ọchịchịrị ime mmụọ, ma Chineke maara mmadụ ole na ole ahụ ndị nwere nkwado ya. (2 Timoti 2:19) Mgbe ahụkwa, n’etiti mgbanwe ndị e nwere n’azụmahịa, usoro mmepụta ihe, na òtù ụmụ mmadụ n’ime narị afọ nke 19, e nwere olu ndị na-ekwu ihe dị iche ná mgbagwoju anya zuru ebe nile nke okpukpe ụgha. Ìgwè nta dị iche iche nwara ịgụ ihe àmà nke oge ndị ahụ ma buo amụma banyere mgbe ọbịbịa nke abụọ nke Jisọs ga-abụ, ma ọ bụghị ha nile sụrụ asụsụ ahụ dị ọcha.
10. Olee òtù “ọbịbịa nke abụọ” nke Chineke họọrọ ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji pụta ìhè na aka Jehova adịnyeworo ha?
10 Otú ọ dị, na 1879, olu “ọbịbịa nke abụọ” nke Jehova họọrọ ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha dị ka Ndịàmà ya pụtara ìhè. Mgbe ahụ, otu òtù ọmụmụ Bible dị nta nke Charles Taze Russell na-eduzi na-enwe nzukọ na Pittsburgh, Pennsylvania, U.S.A. O dowo ha anya na ọbịbịa nke abụọ nke Jisọs bụ ihe ga-amalite ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya, na oge nke nsogbu ụwa na-abịa, na Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst nke ga-eweghachi Paradaịs n’elu ala ga-esochikwa nke a, bụ́ nke ga-enye ụmụ mmadụ na-erube isi ndụ ebighị ebi. Na July 1879, Ndị Mmụta Bible ndị a malitere ibipụta magazin ahụ a maara ugbu a dị ka Ụlọ Nche. E kesara nanị 6,000 nke mbipụta mbụ ya. Ma ‘aka Jehova’ dịnyeere Ndịàmà ahụ, n’ihi na a na-ebipụta magazin nke a ugbu a na 111 asụsụ dị iche iche, na-ebipụta ya ná nkezi nke ihe karịrị 15,000,000 ná mbipụta nke ọ bụla.—Tụlee Ọrụ Ndị Ọzi 11:19-21.
11, 12. Olee eziokwu Akwụkwọ nsọ ụfọdụ ndị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha ghọtaworo?
11 Site na Bible na akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova na-ebipụta, karịsịakwa site ná mkpọsa ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi na-akpọsa ozi ọma ahụ, a marawo asụsụ ahụ dị ọcha n’ụwa nile. Leekwa oké uru ọ na-abara ndị ahụ na-asụ ya! Kama ịdị na-ekwu na ‘Chineke bụ Chineke, Kraịst bụ Chineke, na Mmụọ Nsọ bụkwa Chineke’ n’asụsụ ahụ a na-apụghị ịghọta aghọta nke Atọ n’Ime Otu, ha kwenyere n’ihe Bible kwuru na Jehova bụ Onye Kasị Ihe Nile Elu, Jisọs, bụ́ onye dị ala karị, bụ Ọkpara Ya, na mmụọ nsọ bụkwa ike ọrụ dị ịtụnanya nke Chineke. (Jenesis 1:2; Abụ Ọma 83:18; Matiu 3:16, 17) Ndị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha maara na mmadụ esiteghị n’ihe ndị dị ndụ dị ala karị pụta, kama na ọ bụ Chineke nke na-ahụ n’anya kere ha. (Jenesis 1:27; 2:7) Ha na-aghọta na mkpụrụ obi na-akwụsị ịdị adị mgbe mmadụ nwụrụ—bụ́ eziokwu nke na-ewepụ ịtụ egwu ndị nwụrụ anwụ. (Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4) A ghọtara hell dị ka ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọ bụghị ebe na-ere ọkụ maka ịta ahụhụ nke chi obi tara mmiri guzobere. (Job 14:13) ha matakwara na mbilite n’ọnwụ bụ olileanya Chineke na-enye maka ndị nwụrụ anwụ.—Jọn 5:28, 29; 11:25; Ọrụ 24:15.
12 Ndị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha na-egosi nsọpụrụ maka ọbara na ndụ. (Jenesis 9:3, 4; Ọrụ 15:28, 29) Ha ghọtara na ndụ Kraịst biri n’elu ala bụ ọnụ ahịa mgbapụta a kwụrụ maka ụmụ mmadụ ndị na-erube isi. (Matiu 20:28; 1 Jọn 2:1, 2) Ọ dịghị mgbe ọ bụla ha na-ekpegara “ndị senti” ekpere, na-amara na ekpere ha aghaghị ịbụ nke e kpegaara Jehova Chineke site na Jisọs Kraịst. (Jọn 14:6, 13, 14) Ebe ọ bụ na Okwu Chineke katọrọ ikpere arụsị, ha adịghị eji ihe oyiyi dị iche iche eme ihe n’ofufe ha. (Ọpụpụ 20:4-6; 1 Ndị Kọrint 10:14) Ha na-ezerekwa nsogbu nile nke ofufe ndị mmụọ ọjọọ n’ihi na ha na-ajụ mgbaasị, bụ́kwa nke a mara ikpe n’ime Bible.—Deuterọnọmi 18:10-12; Ndị Galetia 5:19-21.
13. N’ihi gịnị ka ndị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha na-ejighị nwee ihe mgbagwoju anya?
13 Ndị ohu Jehova, bụ́ ndị na-asụ asụsụ ahụ di ọcha, adịghị enwe mgbagwoju anya banyere ebe anyị nọ ná ngabiga nke oge. Jehova akụziworo ha na ha na-ebi n’ime “mgbe ọgwụgwụ,” mgbe Jisọs nọkwa anọ dị ka mmụọ dị ebube nke a na-adịghị ahụ anya. (Daniel 12:4; Matiu 24:3-14; 2 Timoti 3:1-5; 1 Pita 3:18) Ebe o nwere usuu ndị agha eluigwe dị oké ike na-eso ya n’azụ, Kraịst dị njikere ịmalite ibu agha iji mezuo ihe Chineke kpere n’ikpe megide usoro ihe nke a. (Daniel 2:44; Mkpughe 16:14, 16; 18:1-8; 19:11-21) Ee, ndị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha jikwa ọrụ n’aka ịkpọsa ozi ọma nke bụ na Alaeze Chineke nke dị n’aka Kraịst ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi ukwu dị iche iche n’ime paradaịs elu ala n’oge na-adịghị anya. (Aịsaịa 9:6, 7; Daniel 7:13, 14; Matiu 6:9, 10; 24:14; Luk 23:43) N’agbanyeghị ihe a nile, ọ bụ nanị aka ka anyị bitụworo n’elu elu ya! N’eziokwu, asụsụ ahụ dị ọcha bụ asụsụ kasị mma, nke kasịkwa dịrị oké ọnụ ahịa n’elu ala!
14. Uru ndị ọzọ dị aṅaa ka ndị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha na-erite?
14 Uru ndị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha na-erite gụnyere “udo nke Chineke” nke na-eche obi na echiche uche nche. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ha na-erubere iwu nile nke Bible isi, bụ́ ndị na-akwalite ahụ ike, obi ụtọ, na afọ ojuju nke na-esite n’ime ihe na-atọ Jehova ụtọ. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ee, ndị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha nwere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa.—2 Pita 3:13.
Ma I Jighị Ya Mee Ihe Ọ Ga-efunarị Gị
15. Olee ụzọ ị pụrụ isi rite uru site n’ịghọta asụsụ ahụ dị ọcha nke ọma?
15 Ọ bụrụ na ị ga-asụ asụsụ ahụ dị ọcha n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, ị ghaghị ịmụta ya nke ọma nke na ọ ga-abụ asụsụ nke ị na-eche echiche na ya. Mgbe mmadụ na-amụ asụsụ ọhụrụ, na mbụ, ọ ghaghị iburu ụzọ na-eche echiche n’asụsụ nke ala ya ma na-asụgharị ihe ọ na-eche n’echiche gaa n’asụsụ ọhụrụ ahụ. Ma, ka asụsụ ọhụrụ ahụ na-edo ya anya karị, ọ na-amalite iche echiche na ya n’enweghị mkpa nke ịgbaso usoro nsụgharị ahụ. N’otu aka ahụ, site n’ịdị uchu n’ịmụ ihe, ị pụrụ ịghọta asụsụ ahụ dị ọcha nke ọma nke na ị ga-ama otú ị ga na-esi etinye iwu na ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ iji dozie nsogbu dị iche iche, nọgidekwa ‘n’ụzọ nke ndụ.’—Abụ Ọma 16:11.
16. Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na i jighị asụsụ ahụ dị ọcha na-eme ihe mgbe nile?
16 Ị ghaghị iji asụsụ ahụ dị ọcha na-eme ihe mgbe nile, ma ọ bụghị otú ahụ, ike ịsụ ya nke ọma ga-efunarị gị. Iji mee ihe atụ: N’ọtụtụ afọ gara aga, ụfọdụ n’ime anyị mụrụ otu asụsụ ọhụrụ. Anyị pụrụ icheta mkpụrụ okwu ole na ole n’asụsụ ahụ, ma o yikarịrị ka ikike ịsụ ya nke ọma efunarịwo anyị n’ihi na anyị ejighị ya na-eme ihe mgbe mgbe. Otu ihe ahụ pụrụ ime n’ihe banyere asụsụ ahụ dị ọcha. Ọ bụrụ na anyị ejighị ya na-eme ihe mgbe mgbe, anyị pụrụ ịtụfu ikike anyị ịsụ ya nke ọma, nke ahụ ga-arụpụtakwa ọdachi ime mmụọ. Ya mere, ka anyị na-asụ ya mgbe nile ná nzukọ dị iche iche nakwa n’ije ozi ndị Kraịst. Ihe omume ndị a, tinyere ọmụmụ ihe onwe onye, ga-eme ka anyị nwee ike ikwupụta okwu nke ọma n’asụsụ ahụ dị ọcha. Leekwa nnọọ ka nke ahụ si dị oké mkpa!
17. Gịnị na-eme ihe atụ nke eziokwu ahụ bụ na okwu ọnụ pụrụ ịbụ ihe na-eweta ndụ ma ọ bụ ọnwu?
17 Ikwu okwu pụrụ ịbụ ihe na-eweta ndụ ma ọ bụ ọnwụ. E gosiri nke a n’oge e nwere esemokwu n’etiti ebo Israel nke Efraim na Onye Ikpe bụ Jefta onye Gilead. Iji mata ndị Efraim, bụ́ ndị na-anwa ịgbafe Osimiri Jọdan, ndị Gilead jiri okwu ngafere ahụ bụ “Shibolet” mee ihe, bụ́ nke nwere ụda “sh” ná mmalite. Ndị Efraim ranyere onwe ha n’aka ndị Gilead ahụ bụ ndị nche ndị nọ ná ngabiga mmiri nile nke Jọdan site n’ịsị “Sibolet” kama ịsị “Shibolet,” na-akpọhie ụda mmalite nke okwu ahụ. N’ihi nke a, e gburu 42,000 ndị Efraim! (Ndị Ikpe 12:5, 6) N’ụzọ yiri nke ahụ, ihe ndị ndú okpukpe Krisendọm na-ezi pụrụ inwe ụda yiri nnọọ nke asụsụ ahụ dị ọcha nye ndị na-amaghị eziokwu Bible nke ọma. Ma ikwu okwu n’ụzọ nke okpukpe ụgha ga-abụ ihe na-anapụ ndụ n’ụbọchị iwe Jehova.
Anyị Na-anọgide n’Ịdị n’Otu
18, 19. Gịnị ka Zefanaịa 3:1-5 pụtara?
18 N’izo aka n’ebe Jerusalem oge ochie nke na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi na ihe yiri ya nke oge a, bụ́ Krisendọm, dị, e kwuru na Zefanaịa 3:1-5, sị: “Ahụhụ dịrị obodo nke na-enupụ isi, nke rụwokwara arụ, obodo ahụ nke na-eme ihe ike! O geghị ntị olu Chineke; ọ naraghị ịdọ aka ná ntị; Jehova ka ọ na-atụkwasịghị obi; Chineke ya ka ọ na-abịakwuteghị nso. Ndị isi ya n’etiti ya bụ ọdụm na-agbọ ụja; ndị ikpe ya bụ anụ ọhịa wolf nke anyasị; ha ekpechaghị ọkpụkpụ n’ụtụtụ. Ndị amụma ya bụ ndị obi ha na-adịghị n’otu ebe, ndị nghọgbu: ndị nchụaja ya emewo ka ihe nsọ ghara ịdị nsọ, ha emewo iwu ihe ike. Jehova bụ onye ezi omume n’etiti ya; ọ dịghị eme ajọ omume; kwa ụtụtụ ka ọ na-eme ka ikpe ya pụta ìhè, ọ dịghị mgbe ọ na-adịghị; ma onye ajọ omume adịghị ama ihere.” Gịnị ka okwu ndị ahụ pụtara?
19 Ma Jerusalem oge ochie ma Krisendọm nke oge a nupụchara isi megide Jehova ma jiri ofufe ụgha merụọ onwe ha. Omume ọjọọ nke ndị ndú ha kpatara mmegbu. N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị Chineke nyere ugboro ugboro, ha egeghị ntị ma bịa ya nso. Ndị isi ha adịwo ka ọdụm ndị na-adọgbu adọgbu, jiri mpako na-elefuru ezi omume anya. Dị ka anụ ọhịa wolf, ndị ikpe ha adọkasịwo ikpe ziri ezi. Ndị nchụaja ha ‘emerụwokwa ihe dị nsọ ma mesoo iwu Chineke ihe ike.’ N’ihi ya, Jehova dị njikere ‘izukọta mba nile na ịchịkọta alaeze nile iji wee wụkwasị ha oké iwe ya, bụ́ ọnụma nile nke iwe ya.’—Zefanaịa 3:8.
20. (a) Gịnị ka a na-aghaghị ime iji lanarị ụbọchị iwe Jehova? (b) Olee ụzọ ị pụrụ isi nwee olileanya inweta ngọzi ebighị ebi ndị sitere n’aka Chineke?
20 Ụbọchị iwe Jehova ji oké ọsọ na-abịa. Ya mere, iji wee lanarị baa n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke, mụta ma na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha n’atụfughị oge. Ọ bụ nanị site n’ime otú ahụ ka ị pụrụ inweta nchebe site ná mbibi ime mmụọ nke dị ugbu a, sitekwa ná mbibi ahụ na-abịa ọsọ ọsọ nke ga-ezu ụwa ọnụ. Ndịàmà Jehova na-akpọsa ụbọchị iwe Chineke na ozi nkasi obi ahụ banyere Alaeze ya. Lee ka ha na-esi enwe obi ụtọ ikwu okwu banyere ebube nke ọbụbụeze ya! (Abụ Ọma 145:10-13) Soro ha dịrị n’otu, ị pụkwara inwe olileanya inweta ndụ ebighị ebi na ngọzi ndị ọzọ site n’aka Onye malitere asụsụ ahụ dị ọcha, Eze Onyenwe anyị, bụ́ Jehova.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Olee ụzọ ụfọdụ a na-esi amụta asụsụ ahụ dị ọcha?
◻ N’ihi gịnị ka o ji baa uru ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha?
◻ Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na i jighị asụsụ ahụ dị ọcha na-eme ihe mgbe nile?
◻ Olee ụzọ mmadụ pụrụ isi lanarị ụbọchị iwe Jehova ma nweta ngọzi ebighị ebi?
[Foto dị na peeji nke 16]
Gideọn na ndị ikom ya afụọ opi ike ha ma welie ọwa ọkụ ha elu
[Foto dị na peeji nke 18]
Site na 1879 gaa n’ihu, e mere ka o doo anya na Chineke ji Charles Taze Russell na ndị òtù ya na-eme ihe ịkwalite asụsụ ahụ dị ọcha
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
Ì so Ndịàmà Jehova dịrị n’otu n’ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha?