ISI NKE ANỌ
Jehova—Chineke nke Na-ekwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu ma Mezuo Ya
1, 2. (a) Gịnị mere ụfọdụ ndị pụrụ iji chee na ọ dịghị onye na-achịkwa ihe na-emenụ? (b) Olee otú ndị amụma iri na abụọ ahụ si kọwaa ụdị onye Jehova bụ?
ỌTỤTỤ ndị na-eche na ha amaghị ebe ndụ ha chere ihu. N’ihi ihe ndị ha na-agụta n’akwụkwọ akụkọ, ha na-ekwubi na ụmụ mmadụ enweghị olileanya. Mgbalị a na-eme ịgwọ nsogbu ndị dị n’ụwa yiri ka ọ̀ na-eme naanị ka ọnọdụ ahụ a na-enweghị olileanya na ọ ga-aka mma ka njọ. Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ụfọdụ n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ anyị na-atụle ihe banyere ha nwere ụdị nchegbu ahụ. Ha zikwara ozi na-enye olileanya, bụ́ ndị anyị onwe anyị pụrụ irite uru na ha, ndị anyị pụkwara iji kasie ndị ọzọ obi.—Maịka 3:1-3; Habakọk 1:1-4.
2 Isi ihe dị mkpa ị ga-ahụ n’akwụkwọ amụma ndị a bụ na ihe niile ụmụ mmadụ na-eme dị Jehova, bụ́ Ọkaakaa eluigwe na ụwa, n’aka. O nwekwara mmasị dị ukwuu n’ọdịmma anyị. N’ezie, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ikwu, sị, “O nwere mmasị n’ọdịmma m.” Ndị amụma iri na abụọ a kọwara “Jehova nke ụsụụ ndị agha” n’ụzọ magburu onwe ya. Chineke pụrụ ‘ịkpa ala aka, ya agbazee.’ N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-emesi ndị ya obi ike, sị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ mkpụrụ anya m aka.” (Zekaraya 2:8; Emọs 4:13; 9:5) Ọ̀ bụ na ọ dịghị enye gị obi ụtọ mgbe ị na-agụ akụkụ Baịbụl ndị na-egosi otú ịhụnanya si achịkwa ihe niile Chineke na-eme nakwa otú o si eme ebere ma na-agbaghara mmehie? (Hosia 6:1-3; Joel 2:12-14) N’ezie, akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ a dere atụleghị ihe niile banyere ụdị onye Chineke bụ; ọ dị mkpa ka anyị gụọ akwụkwọ iri isii na isii dị na Baịbụl iji mata ya. Ma, akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ a dere ga-eme ka anyị ghọta n’ụzọ magburu onwe ya ụdị onye Chineke bụ na otú o si eme ihe.
3. Olee otú ndị amụma iri na abụọ ahụ si mee ka o doo anya na Jehova bụ Chineke nwere nzube?
3 Akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere pụrụ ime ka anyị nwekwuo obi ike na a pụrụ ịtụkwasị Jehova obi dị ka Onye na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu nakwa Onye na-emezu nzube ya. Ha na-emekwu ka o doo anya na n’ikpeazụ, Chineke ga-eme ka e nwee ụwa nke ga-abụ paradaịs, nke ọ ga na-achị. (Maịka 4:1-4) Ụfọdụ n’ime ndị amụma ahụ kọwara otú Jehova si dozie ụzọ maka ọbịbịa nke Mesaya nakwa maka ihe mgbapụta ahụ nke ga-agbapụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. (Malakaị 3:1; 4:5) Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka anyị mata ihe a niile?
ỌKAAKAA NWERE ỊHỤNANYA, ONYE IHE NIILE DỊ N’AKA
4, 5. (a) Olee eziokwu bụ́ isi banyere Chineke nke ndị amụma iri na abụọ ahụ kwusiri okwu ike banyere ya? (b) Olee otú ịdị ukwuu Jehova si emetụta gị?
4 Cheta ebubo ahụ e boro Chineke banyere oruru o ruuru ya ịchị, dị ka a tụlere n’Isi nke Atọ. Imegide ịchịisi Jehova—na inyo ebumnobi ya enyo—mere ka ụfọdụ ndị nọ n’eluigwe nupụrụ Chineke isi ma kpata ọgba aghara n’ụwa. Ya mere, o doro anya na ikweta na ọ bụ Jehova ka o ruuru ịchị nakwa ido onwe anyị n’okpuru ya dị nnọọ mkpa ka ihe wee na-aga n’usoro n’ụzọ zuru ezu ma n’eluigwe ma n’ụwa, nakwa ka udo wee dị n’etiti ụmụ mmadụ. N’ihi ya, Jehova ekpebiela n’ụzọ kwesịrị ekwesị igosi na o ruuru ya ịbụ ọkaakaa. Ka anyị tụlee otú akwụkwọ amụma iri na abụọ ahụ pụrụ isi nyere anyị aka ịghọta nke a nke ọma karị.
5 Dị ka ndị ozi Jehova, ndị amụma ahụ kwusiri okwu ike banyere ịdị elu ya. Dị ka ihe atụ, iji gosi otú ọ dịruru mkpa ito aha nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nakwa ọbụbụ ọ bụ eze, Emọs kwuru okwu bụ́ “Ọkaakaa Onyenwe anyị” ugboro iri abụọ na otu. Nke a na-egosi na ezi Chineke dị nnọọ ukwuu nakwa na ọ dịghị ihe karịrị ya. (Emọs 9:2-5; lee igbe bụ́ “Jehova, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”) Ọ bụ naanị Jehova ka o ruuru ịbụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa. A pụghị iji arụsị na-adịghị ndụ tụnyere ya. (Maịka 1:7; Habakọk 2:18-20; Zefanaya 2:11) N’ihi na ọ bụ Jehova bụ Onye kere ihe niile, o ruuru ya ịbụ ọkaakaa nke ihe niile. (Emọs 4:13; 5:8, 9; 9:6) N’ihi gịnị ka o ji dị gị mkpa?
6. Olee otú mmezu nke nzube Chineke si gbasa mmadụ niile?
6 Ọ bụrụ na ọ dịtụwo mgbe a kpapụrụ gị iche, kpee gị ikpe na-ezighị ezi, ma ọ bụ kpọọ gị asị n’ihi ọnọdụ gị, nwee nkasi obi na ihe banyere mmadụ niile na-emetụ Ọkaakaa nke nwere ịhụnanya n’obi. Jehova na otu mba oge ochie nwere mmekọrịta pụrụ iche. N’agbanyeghị nke ahụ, o kwupụtara mkpebi o kpebisiri ike ime ihe ga-abara ndị si ná mba niile na ndị na-asụ asụsụ niile uru. Ọ bụ ya bụ “Onyenwe ụwa dum.” (Maịka 4:13) Chineke kwere nkwa na aha ya “ga-adị ukwuu n’etiti mba niile.” (Malakaị 1:11) Ebe ọ bụ na Nna anyị nke eluigwe adịghị ahọ ndị ọ ga-eme ka ha mara ya ahọ, ‘ndị si n’asụsụ niile nke mba dị iche iche’ ji ịnụ ọkụ n’obi na-aza òkù ọ na-akpọ ka ha fee ya.—Zekaraya 8:23.
7. N’ihi gịnị ka ihe aha Jehova pụtara ji dị oké mkpa?
7 Ịmata ụdị onye Chineke bụ na ihe ọ ga-eme na ịghọta ihe aha ya pụtara na-agakọ ụkwụ na ụkwụ. (Abụ Ọma 9:10) N’oge Maịka, e metọrọ aha Jehova n’ihi na ọtụtụ ndị a kpọkwasịrị aha Ya nọ na-enupụ nnọọ isi. A kpaliri onye amụma ahụ ikwusi okwu ike banyere “ịdị ukwuu nke aha Jehova” nakwa ikwu na “onye nwere ezi amamihe ga-atụkwa egwu aha [Chineke].” (Maịka 5:4; 6:9) N’ihi gịnị? Olileanya ọ bụla ị na-enwe maka inweta ọdịnihu na-adịte aka dabeere n’ihe dị mkpa aha ahụ pụtara, nke bụ́ “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Gụọ Joel 2:26 ma chee echiche ụdị obi ụtọ ị ga-enwe ịbụ onye a kpọkwasịrị aha ahụ na ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke ahụ nke pụrụ ịghọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịghọ maka abamuru nke ihe niile o kere eke. Chineke egosiwo na ya nwere ikike a na-akparaghị ókè ime ihe ọ bụla. Ị ga-ahụ ihe àmà na-egosi ya n’ọtụtụ amụma ndị mezuworo bụ́ ndị ndị amụma iri na abụọ ahụ buru.
8. Mmetụta dịgasị aṅaa ka aha Jehova nweworo n’ebe ị nọ?
8 Ịmata na Jehova pụrụ ime ka ihe ọ bụla ọ chọrọ mezuo enwewo mmetụta dị mma n’ahụ́ ọtụtụ nde mmadụ. Joel mere ka nke ahụ pụta ìhè n’okwu ahụ a ma ama nke Ndị Kraịst so dee Baịbụl kwughachiri: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova ga-alanahụ.” (Joel 2:32; Ọrụ 2:21; Ndị Rom 10:13) Ànyị so Maịka kwuo ihe a o kwuru na “anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi”? (Maịka 4:5) Ee, n’oge mkpagbu ma ọ bụ n’oge anyị nwere nsogbu, anyị kwesịrị iji obi ike ‘gbaba n’aha Jehova.’—Zefanaya 3:9, 12; Nehọm 1:7.
9. Ruo n’ókè há aṅaa ka Chineke nwere ike n’ebe ndị ọchịchị bụ́ mmadụ nọ?
9 Ka ị na-agụ akwụkwọ amụma ndị a, ị pụrụ ime ka obi ike i nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike na o nwere ike zuru ezu ọbụna n’ebe ndị ọchịchị bụ́ mmadụ na ndị ọnụ na-eru n’okwu nọ. O nwere ike ịkpali ha ime ihe kwekọrọ n’uche ya. (Ilu 21:1) Tụlee ihe banyere Darayọs Onye Ukwu nke Peshia. Ndị na-emegide ezi ofufe chọrọ ka o nyere ha aka kwụsị ọrụ iwughachi ụlọ nsọ Jehova nke dị na Jeruselem. Kama nke ahụ, ihe dị iche mere! N’ihe dị ka n’afọ 520 T.O.A., Darayọs mere ka iwu Saịrọs tiri dịghachi irè, ọ kwadokwara ọrụ iwu ihe nke ndị Juu na-arụ. Mgbe ha nwere ihe mgbochi ndị ọzọ, Chineke gwara Gọvanọ Zerọbabel nke na-achị ndị Juu, sị: “‘Ọ bụghị site n’ụsụụ ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site na mmụọ m,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. Ònye ka ị bụ, gị oké ugwu? Ị ga-aghọ ala dị larịị n’ihu Zerọbabel.” (Zekaraya 4:6, 7) Ọ dịghị ihe ga-egbochi Jehova ibibi ajọ usoro ihe a. Ọ dịghịkwa ihe ga-egbochi ya iwetara ndị na-efe ya ofufe paradaịs.—Aịzaya 65:21-23.
10. Ruo n’ókè há aṅaa ka Chineke nwere ikike, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji bụrụ ihe e kwesịrị ichebara echiche?
10 Chetakwa na Jehova nwere ike n’ebe ihe ndị dị ike dị ka oké ifufe, na mmiri ozuzo dị, bụ́ ndị ọ pụrụ iji bibie ndị iro ya ma ọ chọọ. (Nehọm 1:3-6) Zekaraya ji okwu ihe atụ gosi otú Jehova pụrụ isi chebe ndị ya: “Jehova ga-eme ka a mara na ya nọnyeere ha, ọ ga-agbapụkwa ụta ya dị ka àmụ̀mà. Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-afụ opi, ọ ga-esoro ifufe nke ebe ndịda gaa.” (Zekaraya 9:14) Ya bụrụ otú ahụ, ọ̀ ga-esiri Chineke ike igosi na ya karịrị mba ndị na-adịghị asọpụrụ ya n’oge anyị a? Ọ dịghị ma ọlị!—Emọs 1:3-5; 2:1-3.
ONYE A PỤRỤ ỊTỤKWASỊ OBI NKE NA-EMEZU NKWA YA
11, 12. (a) N’ihi gịnị ka e ji were Ninive dị ka obodo a na-apụghị imeri emeri? (b) Oleezi ihe mere Ninive n’ikwekọ n’ihe Chineke buru n’amụma?
11 Ka e were ya na ị dịrị ndụ na narị afọ nke itoolu T.O.A. n’ebe a maara ugbu a dị ka ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu. Olee obodo ukwu ị gaara anụ maka ya ma eleghị anya? Ọ bụ Ninive. Ọ bụ obodo ukwu nke dị n’Asiria, n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke ụsọ Osimiri Taịgris. Ọ dị ihe dị ka narị kilomita itoolu site na Jeruselem ma a gawa n’ebe ugwu, n’akụkụ ọwụwa anyanwụ. Ma eleghị anya, ị nụla banyere otú ọ hà—ihe dị ka otu narị kilomita gbaa gburugburu! Ndị gatụworo Ninive kwuru na ọ fọrọ nke nta ka ya na Babịlọn hara n’ịma mma. O nwegasịrị obí eze, ụlọ nsọ, okporo ámá ndị sara mbara, ebe ọhaneze na-anọ atụrụ ndụ, nakwa otu nnukwu ọ́bá akwụkwọ. Ndị ọkà n’ịlụ agha kwukwara banyere nnukwu mgbidi ndị o nwere ma n’ime ma ná mpụta, bụ́ ndị a na-apụghị ịgafe agafe.
12 “A pụghị imeri ya emeri!” O nwere ike ịbụ na ọtụtụ ndị esiwo otú a kọwaa Ninive. Ma ụfọdụ ndị amụma ndị si n’obere obodo ahụ bụ́ Juda kwusiri ike na Jehova ekwuwo na a ga-ebibi ‘obodo ahụ na-awụfu ọbara.’ Ebe ọ bụ na ndị obodo ahụ gere ntị n’ozi Jona, a hapụrụ imezu ikpe Chineke mara obodo ahụ ruo oge ụfọdụ. Otú ọ dị, ndị Ninive mesịrị laghachi n’omume ọjọọ ha. Nehọm buru amụma, sị: “Ninive . . . , mma agha ga-ebipụ gị . . . Oké ọdachi nke dakwasịrị gị enweghị ngwọta.” (Nehọm 3:1, 7, 15, 19; Jona 3:5-10) Ihe dị ka n’oge ahụ, Chineke si n’ọnụ Zefanaya kwuo na Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ n’efu. (Zefanaya 2:13) À ga-emeri mba a a na-apụghị imeri emeri nke na-achị ụwa n’oge ahụ iji mezuo ihe Jehova kwuru? A zara ajụjụ a n’ihe dị ka n’afọ 632 T.O.A. mgbe ndị Babịlọn, ndị Sitia, na ndị Midia nọchibidoro Ninive. Na mberede, idei mmiri kwaturu mgbidi ya, ndị ahụ na-ebuso obodo ahụ agha banyekwara n’ime ya. (Nehọm 2:6-8) N’egbughị oge, obodo ahụ siburu ike ghọrọ mkpọmkpọ ebe. Ninive bụ ebe tọgbọrọ n’efu ruo taa.a “Obodo ahụ na-enwe aṅụrị” apụghị ime ka okwu Chineke ghara imezu!—Zefanaya 2:15.
13. Olee amụma ndị e buru mezurunụ bụ́ ndị ị pụrụ ịhụ n’akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere?
13 Ihe mere Ninive bụ naanị otu ihe atụ nke na-egosi amụma ndị mezuru emezu. Legodị anya na map e nwere n’oge a nke na-egosi ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu. Ị̀ hụrụ Amọn, Asiria, Babịlọn, Idọm, ma ọ bụ Moab? Ọ dịghị ma ọlị! N’agbanyeghị na ọ dị mgbe a ma mba ndị ahụ ama, ndị amụma iri na abụọ ahụ buru amụma na a ga-ebibi ha. (Emọs 2:1-3; Obedaya 1, 8; Nehọm 3:18; Zefanaya 2:8-11; Zekaraya 2:7-9) N’otu n’otu, mba ndị ahụ kwụsịrị ịdị. Jehova kwuru na mba ndị a agaghị adịkwa, ha kwụsịkwara ịdị! Ihe ndị amụma ndị a buru n’amụma banyere ndị Juu fọdụrụ isi na Babịlọn bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha laa lọta mezuru—ha lọtara!
14. N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji jiri obi ike mee ka ndụ gị hiwe isi ná nkwa Jehova?
14 Olee otú ihe àmà nke na-egosi ikike Jehova nwere ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu si emetụta obi ike gị? Ị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-emezu nkwa ya; ọ bụ Chineke, “onye na-apụghị ịgha ụgha.” (Taịtọs 1:2) Sitekwa n’Okwu ya, Chineke na-eme ka anyị mara ihe ndị anyị kwesịrị ịmara. Ị pụrụ ịdị na-ebi ndụ gị n’ụzọ na-egosi na ndụ gị hiwere isi n’ime uche Jehova nakwa na i kwere na okwu amụma ya bụ ihe e ji n’aka na ọ ga-emezu. Amụma ndị dị n’akwụkwọ iri na abụọ ahụ abụghị naanị ihe atụ nke na-egosi amụma ndị mezuru n’oge gara aga. Ọtụtụ n’ime amụma ndị ahụ na-emezu ugbu a, ma ọ bụkwanụ, ha ga-emezu n’oge na-adịghị anya. Ya mere, ihe e dere n’akwụkwọ iri na abụọ a pụrụ ime ka i nwekwuo obi ike na amụma ndị e buru banyere oge anyị nakwa ndị e buru banyere ọdịnihu ga-emezu. Jiri amụma ndị a kpọrọ ihe.
Ninive yiri ebe a na-apụghị imeri emeri. N’agbanyeghị nke ahụ, olee otú amụma Jehova si mezuo?
NNA NKE NWERE ỊHỤNANYA
15. Mgbe ị na-enwe nsogbu ụfọdụ, olee otú ahụmahụ Maịka pụrụ isi nyere gị aka?
15 A pụrụ ịtụkwasị Jehova obi, ọ bụghị naanị n’ihi ihe ga-eme mba dị iche iche ma ọ bụ ihe ga-eme n’ụwa dum. Jehova na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu ma na-emezu ha n’ụzọ pụrụ imetụta gị. N’ụzọ dị aṅaa? Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isiri gị ike imeri nsogbu ụfọdụ i nwere. Ị na-achọpụta na okwu agwụghị n’inwe onye ga-aghọta nsogbu gị—ọ dị gị mkpa inwe onye ị pụrụ ịtụkwasị obi nke ga-enyere gị aka. Na narị afọ nke asatọ T.O.A., ọ ghaghị ịbụ na Maịka chere na ọ bụ naanị ya fọrọ mgbe ọ na-ezi ndị Juda dị mpako ozi. Ọ pụrụ iyi ka ọ̀ bụ ya bụ onye ikpeazụ kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’ụwa, na ọ pụghị ịtụkwasị ọbụna ndị ezinụlọ ya obi. Ebe ọ bụla o lere anya, ihe ọ na-ahụ bụ ndị ịwụfu ọbara na-agụ agụụ, ndị aghụghọ, na ndị omume ha retọrọ eretọ. Ka o sina dị, nkwa Chineke kwere ilekọta ndị Ya kwesịrị ntụkwasị obi, n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ nwere ike ime, mere ka obi sighachi Maịka ike. Nke ahụ pụkwara ịkasi gị obi, karịsịa, mgbe ọ bụ naanị gị bụ onye na-efe Jehova ofufe n’etiti ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ma ọ bụkwanụ, mgbe unu na-adịghị ọtụtụ.—Maịka 7:2-9.
16. Gịnị mere ị ga-eji jide n’aka na Chineke na-ahụ nrụrụaka na mmegbu niile nakwa na ọ ga-anapụta ndị ezi omume?
16 Dịkwa ka ọ na-eme ọtụtụ mgbe taa, ndị bara ọgaranya na ndị ọnụ na-eru n’okwu na Juda nakwa n’Izrel ghọrọ ndị anyaukwu na ndị na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi. Ịna ndị mmadụ ụtụ isi dị ukwuu nakwa ịnapụ ha ala ha mere ka e nwee ndị na-agba ohu n’ụzọ iwu na-akwadoghị. Ọ dịghị onye ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ n’ahụ́, e jikwa obi ọjọọ na-emeso ha ihe. (Emọs 2:6; 5:11, 12; Maịka 2:1, 2; 3:9-12; Habakọk 1:4) Site n’ọnụ ndị ozi ya, Chineke mere ka o doo anya na ya adịghị anabata nrụrụaka na mmegbu, nakwa na ya ga-ata ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ ahụhụ. (Habakọk 2:3, 6-16) O kwuru na ya ‘ga-edoziri mba dị iche iche dị ike okwu ha,’ nakwa na onye ọ bụla n’ime ndị ohu ya ihe ya masịrị ya “ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:3, 4) Lee ahụ́ iru ala nke ahụ ga-eweta! Chineke ekwuwo ọtụtụ ihe ndị ọzọ, mezuokwa ha. Ọ̀ bụ na i kwesịghị ijide n’aka na nkwa a ga-emezukwa?
17, 18. (a) Gịnị mere Chineke ji eme ka ndị ya nwee olileanya? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ịdọ aka ná ntị Jehova anya?
17 Jehova adịghị emezu nkwa ya naanị iji gosi na o nwere ikike ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu, dị ka à ga-asị na ọ chọrọ ime ka ndị mmadụ tụwa ya egwu. Ọ bụ ịhụnanya nke ụkpụrụ na-achịkwa na-akpali ya ime ihe, n’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Cheta ihe banyere Hosia, bụ́ onye dịrị ndụ na narị afọ nke asatọ T.O.A. Dị ka nwunye Hosia, bụ́ Goma, hapụrụ di ya ma gakwuru nwoke ọzọ, otú ahụ ka ụmụ Izrel hapụrụ Jehova ma fee chi ọzọ. Ikpere arụsị ha yiri ịkwa iko; ha jikọtara ife Bel na ife Jehova ezi ofufe. Ha na ndị Asiria nakwa ndị Ijipt “kwara iko” n’ụzọ ihe atụ. Olee ihe Jehova ga-eme? Hosia ga-agbalịsi ike gaa chọọ nwunye ya na-akwa iko wee kpọlata ya. Jehova ji ịhụnanya chọọ ndị ya. “M ji ụdọ ụmụ mmadụ na-adọ ha, bụ́ ụdọ ịhụnanya, . . . m jikwa nwayọọ wetara onye nke ọ bụla ihe oriri.” (Hosia 2:5; 11:4) Ọ bụrụ na ha echegharịa n’ezie, Chineke nwere ike ịgbaghara ha, bụ́ nke ga-eme ka ha na ya nwee ike ịdịghachi ná mma. (Hosia 1:3, 4; 2:16, 23; 6:1-3; 14:4) Ọ̀ bụ na ọ dịghị emetụ gị n’obi mgbe ị na-ahụ ịhụnanya Jehova? Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na Jehova gosiri ịhụnanya dị otú ahụ n’oge gara aga, ọ̀ bụ na obi agaghị esi m ike na ọ ga-egosi m ezi ịhụnanya, nke na-adịghị ada ada, nke na-adịghị agbanwe agbanwe, nke na-adịghịkwa anwụ anwụ?’—Hosia 11:8.
18 Akwụkwọ amụma iri na abụọ ahụ pụkwara inyere gị aka ịhụ na ịhụnanya Chineke na-agụnyekwa inye mgbazi. Jehova mesiri ndị ya na-enupụ isi obi ike na ya ‘agaghị ekpochapụ ha kpamkpam.’ (Emọs 9:8) Mgbe ọ dị mkpa inye ntaramahụhụ, Chineke na-eme otú ahụ. Ma lee nnọọ ka o si eme ka obi ruo anyị ala ịmara na ntaramahụhụ ọ ga-enye agaghị adịte aka! Malakaị 1:6 ji Jehova tụnyere nna nwere ịhụnanya. Ị ma na nna pụrụ inye ụmụ ya ọ hụrụ n’anya ahụhụ iji gbazie ha. (Nehọm 1:3; Ndị Hibru 12:6) Ma, ịhụnanya Nna anyị nke eluigwe nwere na-eme ka ọ ghara ịdị na-ewe iwe ọsọ ọsọ. Malakaị 3:10, 16 na-egosikwa na ọ ga-akwụ ndị ohu ya ụgwọ ọrụ n’ụba.
19. Olee ụfọdụ ajụjụ mmadụ kwesịrị ịjụ onwe ya?
19 Malakaị ji okwu a na-emesi obi ike malite akwụkwọ ya: “‘M hụrụ unu n’anya,’ ka Jehova kwuru.” (Malakaị 1:2) Ka ị na-atụgharị uche n’okwu ahụ na-emesi obi ike Chineke gwara ụmụ Izrel, jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ dị ihe ọ bụla m na-eme nke pụrụ ime ka Chineke ghara ịhụ m n’anya? Gịnị ka m chọrọ ịmatakwu banyere ịhụnanya Chineke?’ Site n’ịghọtakwu ịhụnanya Chineke, ị ga-enwekwu obi ike na ọ ga-ahụ gị n’anya ruo mgbe ebighị ebi.
MGBAGHARA NA-EME KA E NWEE IKE INWETA NZỌPỤTA
20. Olee otú mgbaghara Chineke si mee ka e nwee ike inweta nzọpụta?
20 Ka ị na-agụ akwụkwọ amụma ndị a, ị ga-achọpụta na mgbe ụfọdụ, Jehova na-ekwu na a ga-enwe ọdachi. N’ihi gịnị? Ọtụtụ mgbe, ọ bụ iji mee ka ndị ya chegharịa. Iji mezuo nke ahụ, o kwere ka ndị mba ọzọ bibie Sameria n’afọ 740 T.O.A., bibiekwa Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. Ihe Chineke kwuru mezuru. Ma ka oge na-aga, o kwere ka ndị chegharịrị laghachi n’ala ha. N’ezie, akwụkwọ ndị a mesiri ya ike na Chineke na-eji obiọma agbaghara mmehie ma na-anabata ndị kwụsịrị ime mmehie ma bịakwute ya. (Habakọk 3:13; Zefanaya 2:2, 3) A kpaliri Maịka ikwu, sị: “Olee Chi dị ka gị, onye na-agbaghara njehie, nke na-agbaghakwara mmebi iwu nke ndị fọdụrụ n’ihe nketa ya? Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na obiọma na-atọ ya ụtọ.” (Maịka 7:18; Joel 2:13; Zekaraya 1:4) Mmezu amụma na-egosi na nke ahụ bụ eziokwu.
21. (a) Gịnị ka ndị amụma iri na abụọ ahụ kwuru banyere Mesaya? (b) Olee amụma ndị kwuru banyere Mesaya bụ́ ndị i nwere mmasị na ha?
21 N’ihe banyere inwe ihe mgbakwasị ụkwụ nke iwu kwadoro maka ịgbaghara mmehie kpamkpam, Jehova kwuru na Mesaya ga-abịa, bụ́ onye ga-achụ ndụ ya dị ka mmadụ n’àjà ka o wee bụrụ “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ” maka ụmụ mmadụ na-eme mmehie. (1 Timoti 2:6) Emọs kwuru na Mesaya, bụ́ nwa Devid, ga-edozi ihe niile ka ha dị otú ha dị na mbụ. (Emọs 9:11, 12; Ọrụ 15:15-19) Maịka kwuru ọbụna ebe a ga-amụ Jizọs, bụ́ onye ga-abịa ma wetara ndị niile ga-enwe okwukwe n’àjà Ọ chụrụ uru nke ga-eme ka ha nwee ndụ. (Maịka 5:2) Zekaraya kwukwara banyere “Ome,” bụ́ Jizọs, onye “ga-anọdụ n’ocheeze ya wee na-achị.” (Zekaraya 3:8; 6:12, 13; Luk 1:32, 33) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ilebakwu anya n’ụdị amụma ndị ahụ ga-eme ka okwukwe gị siwanye ike.—Lee igbe bụ́ “Amụma Ndị Bụ́ Isi Ndị E Buru Banyere Mesaya.”
22. Olee otú ihe ndị amụma iri na abụọ ahụ kwuru banyere Jehova si eme ka i nwekwuo obi ike n’ebe ọ nọ?
22 Ka ị na-agụ ozi dị n’akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere, ị ga-enwekwu obi ike na Chineke ga-enwe mmeri n’ikpeazụ. Jehova na-alụrụ anyị agha, ọ ga-emekwa ka e nwee ikpe ziri ezi. Okwu Chineke na-adịgide adịgide. Ọ na-echeta ihe ya na ndị ya kwekọrịtara. Ọ na-elekọta ndị na-ejere ya ozi, na-anapụtakwa ha n’aka ndị mmegbu niile. (Maịka 7:8-10; Zefanaya 2:6, 7) Jehova agbanwebeghị. (Malakaị 3:6) Lee ka o si emesi obi ike ịmara na Chineke adịghị enwe ihe isi ike. Ọ dịghịkwa ihe na-egbochi ya imezu nzube ya! Mgbe o kwuru na ụbọchị ikpe ya ga-abịa, ọ ga-abịa. N’ihi ya, nọrọ na nche maka ụbọchị Jehova! “Jehova ga-abụkwa eze na-achị ụwa dum. N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-abụ otu, otu aha ka ọ ga-enwekwa.” (Zekaraya 14:9) Ọ bụ ya kwuru nke ahụ; ọ ga-emezukwa ya.
a Na November nke afọ 2002, tupu a malite ịlụ agha n’Iraq, Prọfesọ Dan Cruickshank gara n’ebe ahụ. O kwuru n’ụlọ ọrụ telivishọn bụ́ BBC, sị: “Obodo Ninive ahụ e bibiri ebibi dị n’akụkụ obodo Mosul—ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie bụ́ ndị Britain gwusiri ala ike n’obodo ahụ . . . nakwa na Nimrud . . . malite n’afọ ndị 1840 gaa n’ihu. . . . Ọ bụ mgbe a na-egwu ala n’obodo ndị a dị n’Asiria ka a bịara chọpụta otú obodo a e chefuworo echefu meperuru emepe. Ọ bụ obodo fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke a na-amatụdịghị ama. A matara ya naanị site n’ihe na-edochaghị anya, dị nkenke, nke Baịbụl kọrọ banyere ya. Ihe ahụ Baịbụl kọrọ banyere ya abụchaghị akụkọ ọma.”