ISI NKE IRI
Kere Òkè n’Ime Ka E Nwee Ndụ Ezinụlọ nke Na-amasị Chineke
1. Olee ihe mere Ndịàmà Jehova ji enwekarị ezinụlọ na-enye obi ụtọ?
A MA Ndịàmà Jehova ama na ha na-enweta obi ụtọ n’ezinụlọ ha. Prọfesọ Bryan Wilson nke Mahadum Oxford dere, sị: “Ndịàmà na-enye ndụmọdụ ndị bara uru n’ọtụtụ ihe . . . ná mmekọrịta di na nwunye, n’okwu banyere omume ọma, n’ịzụ ụmụ, nakwa n’ihe ndị ọzọ a na-eme eme. [Ha] pụrụ inye ndụmọdụ dị ukwuu bara uru ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ndị a pụkwara iji mere ụkpụrụ nduzi ndị e ji ebi ndụ.” O doro anya na ị mụtala ọtụtụ ihe n’Okwu Chineke banyere otú ị pụrụ isi nwee ezinụlọ dị mma.
2. (a) Gịnị ka ị chọpụtaworo banyere ezinụlọ dị iche iche dị n’ụwa taa? (b) N’akwụkwọ Baịbụl ndị dị aṅaa ka anyị ga-achọ nduzi banyere ndụ ezinụlọ?
2 Ka ụbọchị Jehova na-eru nso, Setan na-alụso ezinụlọ ọgụ karịsịa. N’ihi ya, ọtụtụ ndị atụkwasịghịzi ndị ezinụlọ ha obi, dịkwa ka ọ dị n’oge Maịka. O dere, sị: “Unu enwela okwukwe n’ebe enyi unu nọ. . . . Kpachara anya n’ihe i ji ọnụ gị na-ekwu ná ntị nwaanyị nke dina gị n’obi. N’ihi na nwata nwoke na-eleda nna ya anya; nwata nwaanyị na-ebili imegide nne ya; nwunye nwa na-ebilikwa imegide nne di ya; ndị ezinụlọ mmadụ bụ ndị iro ya.” (Maịka 7:5, 6) I bi n’ụwa ebe ndụ ezinụlọ dakpọworo adakpọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ị gbalịsiwo ike ịhụ na nke ahụ emetụtaghị gị. N’ụzọ dị otú a, i mewo ka ndụ ezinụlọ gị bụrụ nke na-enye obi ụtọ karị, nke na-amasịkwa Chineke karị. Ikekwe, i meela ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị dị ka Diuterọnọmi 6:5-9; Ndị Efesọs 5:22–6:4; na Ndị Kọlọsi 3:18-21. Ma, ọ̀ dịtụla mgbe i lere akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere anya dị ka ebe ị pụrụ isi nweta ndụmọdụ n’otú e si enwe ndụ ezinụlọ na-enye obi ụtọ? N’Isi nke Iri a, anyị ga-atụle ihe atụ ole na ole ndị na-egosi ndụmọdụ dị otú ahụ bụ́ ndị dị n’akwụkwọ ndị a. Ma, ya abụla naanị ndụmọdụ ndị ahụ a kpọtụrụ aha ka ị ga-atụle. Gbalịa ka i si n’ihe atụ ndị a ghọta ụzọ ị pụrụ isi mụta ihe ndị ọzọ n’akwụkwọ ndị a. Ná ngwụcha isiokwu a, e dere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ndị ga-enyere gị aka ime nke a, ya bụ, ịmụta ihe n’akwụkwọ iri na abụọ ahụ.
“Ọ KPỌRỌ ỊGBA ALỤKWAGHỊM ASỊ”
3, 4. (a) Olee otú ọtụtụ ndị taa si agbalị idozi nsogbu alụmdi na nwunye ha? (b) Olee echiche jọgburu onwe ya e nwere banyere alụmdi na nwunye n’oge Malakaị?
3 Ebe mbụ ezi uche dị na ya anyị chọrọ ilebara anya bụ mmekọrịta dị n’etiti di na nwunye. N’oge mbụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ adịghị ewere ịgba alụkwaghịm dị ka ụzọ dị mfe isi mee ka nsogbu alụmdi na nwunye kwụsị. Ịgba alụkwaghịm na-esikarị ike; na narị afọ nke iri na itoolu, a na-achọ nkwado nke ndị ome iwu iji nweta ikike ịgba alụkwaghịm n’England. Echiche dị otú a mere ka ọtụtụ ezinụlọ ghara itisa. Ma ugbu a, ihe agbanweela. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Kemgbe a lụsịrị Agha Ụwa nke Abụọ, ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm amụbawo n’ọtụtụ mba . . . Otú ndị mmadụ si ele ịgba alụkwaghịm anya agbanwewo kpamkpam . . . o yiri ka ọtụtụ ndị adịghịzi ele ya anya dị ka ihe ọjọọ.” Ịgba alụkwaghịm aghọọla ihe a na-ahụ ebe niile ọbụna ná mba ndị dị ka Korea, bụ́ ebe a na-elebu ịgba alụkwaghịm anya ọjọọ ruo ihe dị ka afọ iri gara aga. Taa, n’ọtụtụ mba, ndị mmadụ na-eche na di na nwunye ndị na-enwe nsogbu n’alụmdi na nwunye ha nwere ike ịgba alụkwaghịm.
4 N’oge Malakaị, na narị afọ nke ise T.O.A., ọtụtụ ndị Juu na-agba alụkwaghịm. Malakaị sịrị ha: “Jehova agbawo akaebe n’etiti gị na nwunye ị lụrụ n’okorobịa, bụ́ onye ị ghọworo aghụghọ.” N’ihi aghụghọ ndị di na-aghọ, “ịkwa ákwá na ịsụ ude” nke ụmụ nwaanyị di ha gbahapụrụ kpuchiri ebe ịchụàjà Jehova. Ndị nchụàjà dị njọ nọkwa na-agbachi omume obi ọjọọ a nkịtị!—Malakaị 2:13, 14.
5. (a) Olee otú Jehova si ele ịgba alụkwaghịm anya? (b) Gịnị mere mmadụ ịghọ di ya ma ọ bụ nwunye ya aghụghọ na-ejighị bụrụ obere okwu?
5 Olee otú Jehova si lee echiche jọgburu onwe ya ndị mmadụ nwere banyere alụmdi na nwunye n’oge Malakaị anya? Malakaị dere, sị: “‘Ọ kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị,’ ka Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru.” O kwusikwara ike na Jehova ‘adịghị agbanwe agbanwe.’ (Malakaị 2:16; 3:6) Ị̀ ghọtara ihe ọ pụtara? Tupu mgbe ahụ, Chineke gosiri na ya kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị. (Jenesis 2:18, 24) O mekwara otú ahụ n’oge Malakaị. Ọ ka kpọkwara ya asị taa. Ụfọdụ ndị pụrụ ikpebi ịhapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha naanị n’ihi na ha enweghịzi mmasị n’ebe ha nọ. Ọ bụ ezie na obi ha dị aghụghọ, Jehova na-enyocha obi. (Jeremaya 17:9, 10) Ọ maara aghụghọ ọ bụla a ghọrọ ma ọ bụ nkata a kpara iji gbaa alụkwaghịm, n’agbanyeghị ihe ọ bụla mmadụ pụrụ ikwu iji gọrọ onwe ya. N’ezie, “ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.”—Ndị Hibru 4:13.
6. (a) Olee otú ile ịgba alụkwaghịm anya otú Jehova si ele ya anya pụrụ isi nyere gị aka? (b) Gịnị bụ isi ihe dị na ndụmọdụ Jizọs nyere banyere ịgba alụkwaghịm?
6 E nwere ike nsogbu ị na-enwe n’alụmdi na nwunye gị erubeghị ịgba alụkwaghịm, ma ọ dị mma ka i buru echiche Jehova n’uche. Ọ dịghị onye zuru okè. N’ihi ya, anyị pụrụ ịtụ anya na a ga-enwe ihe isi ike na nghọtahie n’alụmdi na nwunye. Otú ọ dị, ị̀ ga-echewe echiche ịgba alụkwaghịm dị ka ụzọ dị mfe isi mee ka nsogbu ahụ bie? Mgbe unu na-ese okwu, ị̀ ga-ekwute okwu ịgba alụkwaghịm? Ọtụtụ ndị emewo otú ahụ. Ma otú Chineke si ele njikọ alụmdi na nwunye anya na-egosi na ndị mmadụ kwesịrị imekwu ezigbo mgbalị ka alụmdi na nwunye ha ghara itisa. Ee, Jizọs Kraịst kwuru na e nwere naanị otu ihe Akwụkwọ Nsọ kwadoro nke a pụrụ iji maka ya gbaa alụkwaghịm—ịkwa iko, ya bụ, di ma ọ bụ nwunye na onye ọzọ inwe mmekọahụ. Otú ọ dị, gịnị bụ isi ihe dị na ndụmọdụ Jizọs? Ọ sịrị ndị na-ege ya ntị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” N’ezie, Jizọs kwadoro ụkpụrụ ahụ na-adịghị agbanwe agbanwe nke Jehova nyere, nke Malakaị kwuru banyere ya ihe dị ka narị afọ anọ na afọ iri ise tupu mgbe ahụ.—Matiu 19:3-9.
Ị̀ ga-echewe echiche ịgba alụkwaghịm ma ọ bụrụ na i nwee nsogbu n’alụmdi na nwunye gị?
7. N’ikwekọ na ndụmọdụ ahụ dị n’akwụkwọ Malakaị, olee otú ị pụrụ isi nwee alụmdi na nwunye siri ike?
7 Oleezi otú Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye pụrụ isi mee ka njikọ ha sie ike? Malakaị kwuru isi ihe nke ga-enye aka, sị: “Lezienụ mmụọ unu anya, unu aghọkwala aghụghọ.” (Malakaị 2:16) Nke ahụ pụtara ịnọ na nche banyere ọchịchọ anyị nwere. Ọ bụrụ na anyị ‘na-elezi mmụọ anyị anya,’ anyị ga-ezere ọnwụnwa nke inwe mmasị na-ekwesịghị ekwesị n’ebe onye ọ bụla na-abụghị di anyị ma ọ bụ nwunye anyị nọ. (Matiu 5:28) Dị ka ihe atụ, ọ́ bụrụkwanụ na ọ na-atọ anyị ụtọ n’ime obi anyị ma onye na-abụghị di anyị ma ọ bụ nwunye anyị nwee mmasị n’ebe anyị nọ ma ọ bụkwanụ na-aja anyị mma? Nke a ga-apụta na anyị adịkwaghị elezi mmụọ anyị anya. N’ihi ya, otu ihe dị mkpa anyị mụtara n’aka ndị amụma iri na abụọ ahụ, nke ga-enyere anyị aka ime ka anyị nwee alụmdi na nwunye siri ike, bụ ilezi ‘mmụọ anyị’ anya.
Gịnị ka Hosia ịkpọrọghachi Goma na-akụziri anyị banyere Jehova?
8, 9. Gịnị mere e ji denye ihe mere n’etiti Hosia na Goma n’ime Baịbụl?
8 O doro anya na i kpebisiri ike ịhụ na alụmdi na nwunye gị etisaghị. N’agbanyeghị nke ahụ, gị onwe gị pụrụ inwe nsogbu n’alụmdi na nwunye gị. Olee ụzọ ka mma ị pụrụ isi dozie nsogbu ọ bụla bilitere, karịsịa ma ọ bụrụ na i chere na ọ bụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ka ụta dịịrị? Cheta ihe e kwuru mbụ n’akwụkwọ a banyere Hosia, n’Isi nke Abụọ na nke Anọ. Nwunye ya, bụ́ Goma, ghọrọ ‘nwaanyị na-akwa iko,’ mesịakwa gaa ‘chụwa ndị ya na ha na-eme enyi.’ Mgbe oge na-aga, ha gbahapụrụ ya, o wee nọrọ n’ụkọ ma bụrụ ohu. Hosia kwụrụ ụgwọ wee kpọrọghachi Goma. A gbakwara ya ume ka ọ hụ ya n’anya. N’ihi gịnị? Ọ bụ iji kọwaa n’ụzọ doro anya ihe na-eme n’etiti Jehova na ụmụ Izrel. Jehova bụ “di nwe” ha, ndị ya bụ nwunye ya.—Hosia 1:2-9; 2:5-7; 3:1-5; Jeremaya 3:14; Aịzaya 62:4, 5.
9 Malite n’oge ochie, ndị Izrel na-eme ihe na-ewute Jehova site n’ịgakwuru chi ọzọ. (Ọpụpụ 32:7-10; Ndị Ikpe 8:33; 10:6; Abụ Ọma 78:40, 41; Aịzaya 63:10) Alaeze ebo iri nke dị n’ebe ugwu kwesịrị ịnata ikpe ọmụma karịsịa n’ihi ofufe chi nwa ehi. (1 Ndị Eze 12:28-30) Ọzọkwa, ụmụ Izrel adabereghị n’ebe Jehova bụ́ Di Nwe ha nọ. Kama nke ahụ, ha lekwasịrị anya n’ebe mba ndị ha na ha na-akwa iko nọ. N’otu oge, ha gbasooro ndị Asiria dị ka nne ịnyịnya ọhịa nke na-achọ oké ga-agba ya. (Hosia 8:9) Olee otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị emee otú ahụ?
10, 11. Olee otú ị pụrụ isi ṅomie Jehova ma ọ bụrụ na ị na-enwe nsogbu n’alụmdi na nwunye gị, ya eyiekwa ka ọ̀ bụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ka ụta dịịrị?
10 N’oge Hosia, ọ karịwo narị afọ asaa ndị Izrel na Jehova gbara ndụ. Ka o sina dị, Chineke dị njikere ịgbaghara ha ma ọ bụrụhaala na ha alaghachikwute ya. A na-eche na Hosia malitere ibu amụma tupu afọ 803 T.O.A. Nke a pụtara na Jehova nọgidere na-atachiri Izrel obi ruo ihe dị ka afọ iri isii ọzọ. Ọ tachikwaara Juda obi ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ abụọ! Jehova ji ọnọdụ ahụ dị n’ezinụlọ Hosia mee ihe atụ na ya ka na-akpọ ndị ya na ha gbara ndụ òkù ka ha chegharịa. O nwere ezi ihe mere ọ ga-eji tisaa alụmdi na nwunye ya na Izrel. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọgidere na-ezipụ ndị amụma ka ha nyere nwunye ihe atụ ya aka ka ọ lọghachite, n’agbanyeghị na ọ ga-efu ya ihe.—Hosia 14:1, 2; Emọs 2:11.
11 Ọ bụrụ na i nwee nsogbu n’alụmdi na nwunye gị, ya eyiekwa ka ọ bụ di gị ma ọ̀ bụ nwunye gị ka ụta dịịrị, ị̀ ga-eme otú a Jehova mere? Ị̀ ga-ebu ụzọ mee ihe iji mee ka alụmdi na nwunye gị dịghachi otú ọ dịbu? (Ndị Kọlọsi 3:12, 13) Ime nke a chọrọ ịdị umeala n’obi. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya Jehova setịpụrụ n’otú o si mesoo ndị Izrel! (Abụ Ọma 18:35; 113:5-8) Chineke ‘gwara ndị Izrel okwu ga-eru ha n’obi,’ ọbụna rịọ ha arịrịọ. Ebe anyị bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ọ̀ bụ na anyị enweghị ihe ka ukwuu mere anyị ga-eji gwa di anyị ma ọ bụ nwunye anyị okwu ga-eru ya n’obi, gbalịa idozi nsogbu ahụ ma leghara ebe ndị o mejọrọ anya? Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ihe Jehova mere rụpụtara ihe bara uru. Ndị fọdụrụ ná mba ahụ chegharịrị n’ọzara n’oge ha na-aga Babịlọn bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha laa. Ha mesịkwara lọta n’ala nna ha ma kpọọ Jehova “Di m.”—Hosia 2:14-16.a
Ṅomie Jehova site n’ibu ụzọ malite mkparịta ụka iji dozie nsogbu ọ bụla unu nwere
12. Olee otú ịtụgharị uche n’otú Jehova si mesoo nwunye ihe atụ ya pụrụ isi baara gị uru n’alụmdi na nwunye gị?
12 Ọ bụrụ na e nwee ezigbo nsogbu, mgbalị i ji ezi obi na-eme iji dozie nsogbu nke dị n’etiti gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere ike ịrụpụta ezigbo ihe. Chineke dị njikere ịgbaghara ọbụna mmehie dị oké njọ nwunye ihe atụ ya mere, nke bụ́ ịkwa iko n’ụzọ ime mmụọ. Ihe ka ọtụtụ ná nsogbu a na-enwe n’alụmdi na nwunye ezi Ndị Kraịst erubeghị otú ahụ. Ọ bụ okwu ọjọọ ma ọ bụ okwu na-agbawa obi na-akpata ọtụtụ nsogbu. Ya mere, ọ bụrụ na okwu ọjọọ di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuru gbawara gị obi, chegodị echiche ihe Hosia na Jehova diri. (Ilu 12:18) Nke ahụ ọ́ gaghị enyere gị aka ịgbaghara?
13. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’eziokwu ahụ bụ́ na Jehova chọrọ ka ndị ya mere mmehie chegharịa?
13 O nwere ihe ọzọ e kwesịrị ilebara anya n’akụkọ a. Chineke ọ̀ dị njikere ime ka ya na ndị ya dịghachi ná mma mgbe ahụ ha ka nọ na-akwa iko? Chineke gwara Hosia banyere mba ahụ na-akwa iko, sị: “O kwesịrị iwepụ ịkwa iko ya n’ihu ya, wepụkwa ịkwa iko ya n’agbata ara ya abụọ.” (Hosia 2:2) Ọ dị mkpa ka ha chegharịa ma ‘mịa mkpụrụ kwesịrị nchegharị.’ (Matiu 3:8) A bịa na nke a, lekwasị anya n’ebe gị onwe gị na-emejọ kama ilekwasị anya n’ebe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-emejọ. Ọ bụrụ na i mejọọ di gị ma ọ bụ nwunye gị, ọ́ gaghị adị mma ma ị gbalịa idozi nsogbu ahụ site n’ịrịọ ya mgbaghara nakwa ịgbanwe omume gị? Ọ pụrụ ịgbaghara gị.
“ỤDỌ ỊHỤNANYA” —EBE MGBAKWASỊ ỤKWỤ MAKA INYE MGBAZI
14, 15. (a) N’ihi ihe e kwuru na Malakaị 4:1, gịnị mere ị ga-eji jiri ọrụ ịkụziri ụmụ gị ihe kpọrọ ihe nke ukwuu? (b) Olee otú ị pụrụ isi nyere ụmụ gị aka ịmata Jehova?
14 Anyị pụrụ ịmụtakwu ọtụtụ ihe banyere ndụ ezinụlọ site n’otú Jehova si mesoo ụmụ Izrel dị ka e kwuru n’akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere. N’akwụkwọ ndị ahụ, e kwuru ụzọ ị ga-esi nyere ụmụ gị aka. O doro anya na ịzụ ụmụaka taa adịghị mfe. Ndị nne na nna aghaghị iji ọrụ ha kpọrọ ihe. Anyị na-agụ, sị: “‘Ụbọchị ahụ nke na-abịa ga-erepịakwa [ndị mmadụ],’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘nke na ọ gaghị erefọ mgbọrọgwụ ha ma ọ bụ alaka ha.’” (Malakaị 4:1) N’ụbọchị a ga-aza ajụjụ, a ga-emeso ụmụaka ihe (ya bụ, alaka) dabere n’otú Jehova si ele ndị nne na nna ha anya (ya bụ, mgbọrọgwụ), bụ́ ndị ọ bụ ọrụ ha ilekọta obere ụmụaka. (Aịzaya 37:31) Otú ndị nne na nna si ebi ndụ nwere ike ikpebi ihe ga-eme ụmụ ha n’ọdịnihu, ma ọ̀ ga-abụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Hosia 13:16) Ọ bụrụ na gị onwe gị (bụ́ mgbọrọgwụ) adịghị eme ihe Jehova chọrọ, gịnị nwere ike ime ụmụ gị (bụ́ alaka) n’ụbọchị oké iwe ya? (Zefanaya 1:14-18; Ndị Efesọs 6:4; Ndị Filipaị 2:12) N’aka nke ọzọ, mgbalị i ji ikwesị ntụkwasị obi na-eme iji hụ na i nwetara ihu ọma Chineke pụrụ ịbara ụmụ gị uru.—1 Ndị Kọrịnt 7:14.
15 Mgbe Pọl onyeozi kwusịrị ihe e kwuru n’amụma Joel banyere mkpa ọ dị ịkpọku aha Jehova, o dere, sị: “Olee otú ha ga-esi kpọkuo onye ha na-enwebeghị okwukwe n’ebe ọ nọ? Oleekwa otú ha ga-esi nwee okwukwe n’ebe onye ha na-anụbeghị banyere ya nọ?” (Ndị Rom 10:14-17; Joel 2:32) Pọl na-ekwu banyere izi ọhaneze ozi ọma. Ma ị pụrụ iji ụkpụrụ ahụ mee ihe n’ihe banyere izi ụmụ gị ihe. Olee otú ha pụrụ isi nwee okwukwe n’ebe Jehova nọ ma ọ bụrụ na ha anụghị banyere ya? Ị̀ na-ewepụta oge zuru ezu kwa ụbọchị wee na-akụziri ụmụ gị otú Jehova si dị mma, na-enyekwara ha aka ịhụ Jehova nakwa nduzi ya n’anya n’ụzọ miri emi? O yikarịrị ka ndị na-eto eto hà ga-eme nke ọma ma ọ bụrụ na ha na-anụ ka a na-ekwu banyere Jehova mgbe mgbe n’ezinụlọ ha.—Diuterọnọmi 6:7-9.
16. N’ikwekọ n’ihe e kwuru na Maịka 6:3-5, olee otú ị pụrụ isi ṅomie Jehova mgbe ị na-adọ ụmụ gị aka ná ntị?
16 Mgbe ụmụaka ka dị obere, o nwere ike ịdị mfe karị ịkpọ ha na-abịa nzukọ Ndị Kraịst. Otú ọ dị, ka ha na-etolitekwu, ha na-amalite ichere onwe ha echiche. Olee ihe ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ụmụ gị enupụ isi mgbe ụfọdụ? Ị pụrụ ịmụta ihe n’aka ndị amụma iri na abụọ ahụ, na-eburu n’uche otú Jehova si mesoo Izrel na Juda. (Zekaraya 7:11, 12) Dị ka ihe atụ, ka ị na-agụ Maịka 6:3-5, buru n’obi olu e ji kwuo ihe e kwuru n’ebe ahụ. Ndị Izrel mejọrọ Chineke; n’agbanyeghị nke ahụ, Chineke kpọrọ ha “ndị m.” Ọ rịọrọ ha, sị: “Bikonụ, ndị m, chetanụ.” Kama iji olu ike taa ha ụta, ọ gbalịrị ịgwa ha okwu ga-eru ha n’obi. Ị̀ pụrụ iṅomi Jehova ọbụna mgbe ị na-adọ ụmụ gị aka ná ntị? N’agbanyeghị otú ihe ha mere jọruru njọ, meso ha dị ka ndị ezinụlọ gị, ọ bụghị ịgwa ha okwu nke ga-eweda ha n’ala. Kama ịkatọ ha, jiri nwayọọ rịọ ha arịrịọ. Jụọ ha ajụjụ ga-eme ka ha kwuo ihe dị ha n’obi. Gbalịa iru ha n’obi ka ha wee nwee ike ịgwa gị ihe dị ha n’obi.—Ilu 20:5.
17, 18. (a) Gịnị ga-akpali gị ịdọ ụmụ gị aka ná ntị? (b) Olee otú ị pụrụ isi hụ na “ụdọ ịhụnanya” nọgidere na-adị n’etiti gị na ụmụ gị?
17 Gịnị mere i ji adọ ụmụ gị aka ná ntị? Ụfọdụ ndị nne na nna na-adọ ụmụ ha aka ná ntị n’ihi na ha achọghị ka e mebie aha ọma nke ezinụlọ ha. Jehova gosiri ihe mere o ji na-adọ aka ná ntị, site n’ikwu, sị: “Ọ bụ m kuziiri Ifrem otú e si eje ije, ọ bụkwa m na-eku ha n’aka . . . M ji ụdọ ụmụ mmadụ na-adọ ha, bụ́ ụdọ ịhụnanya.” (Hosia 11:3, 4) N’ebe a, Hosia ji mmekọrịta dị n’etiti Jehova na Izrel tụnyere nke dị n’etiti nna na nwa. Chegodị echiche banyere nne ma ọ bụ nna nke hụrụ nwa ya n’anya, ka o ji otu isi ụdọ aka wee na-akụziri nwa ya ụkwụ na-esichaghị ike n’ala otú e si aga ije. Nwa ahụ na-ejide ụdọ ahụ aka ma ọ dawa. Ọ bụ ihe na-eduzi ya ma ọ zọhie ụkwụ.—Jeremaya 31:1-3.
Dị ka nne ma ọ bụ nna, ị̀ na-eṅomi Jehova site n’igosi ụmụ gị ịhụnanya?
18 Ị̀ ga-eṅomi ụdị ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ụmụ Izrel nọ? Ha hapụrụ ya ugboro ugboro, ma ọ hapụghị ụdọ ịhụnanya ahụ aka ngwa ngwa. Mgbe ụfọdụ, ụmụaka pụrụ iyi ka hà na-achọ ịkpafu, na-emehiekwa ụmụ obere ihe, ma gbalịa hụ na unu nọgidere na-ahụrịta onwe unu n’anya. Buru n’uche na Jehova elegharaghị ihe ọjọọ ndị ya mere anya n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. O mere ihe doro anya banyere ọnọdụ ahụ. O ji ịhụnanya dọọ ha aka ná ntị. O wepụtakwara oge nyere ha aka dị ha mkpa. Ọ bụrụ na ị chọpụta na nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị yiri ka ọ̀ na-adapụ n’eziokwu, elegharala ya anya. Gbalịa duzie ya ka ọ lọta, dị ka à ga-asị na i ji ụdọ e ji eduzi mmadụ. Jiri ịhụnanya na-enyere ya aka n’oge a ọ na-enwe nsogbu. Wepụta oge ka gị na ụmụ gị ndị na-enwe nsogbu na-anọrị. Wepụta oge ka gị na ha na-anọrị—ọ dịghị ugboro ole e kwuru ya karịrị akarị!
19. N’ihi gịnị ka ike na-agaghị eji gwụ gị inyere ụmụ gị aka?
19 Hosia buru amụma na ndị Izrel fọdụrụnụ ga-anabata ịdọ aka ná ntị, sị: “Ụmụ Izrel ga-alọghachi chọọ Jehova bụ́ Chineke ha, chọọkwa Devid bụ́ eze ha; ha ga-amara jijiji bịakwute Jehova na ịdị mma ya n’oge ikpeazụ.” (Hosia 3:5) Ee, ịdọ aka ná ntị Chineke rụpụtara ihe n’ebe ndị ya fọdụrụ nọ. Nwee nchekwube na ọ ga-arụpụtakwa ihe n’ebe ụmụ gị nọ. Gbalịa ịhụ ebe ndị ha na-eme nke ọma. Jiri obiọma na-agwa ha okwu ma na-agbasosi ụkpụrụ Baịbụl ike. Ọ bụrụgodị na nwa na-enupụ isi anabataghị ịdọ aka ná ntị ugbu a, o nwere ike mesịa gbanwee.
KPACHARA ANYA MAKA MKPAKỌRỊTA ỌJỌỌ!
20. Olee ajụjụ metụtara mkpakọrịta nke ndị na-eto eto pụrụ ịhụ azịza ya n’akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere?
20 Gịnị ka unu bụ́ ndị na-eto eto pụrụ ịmụta n’aka ndị amụma iri na abụọ ahụ? Otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ e nwere ike ịdị na-agụkarị ma gị na ndị mụrụ gị na-akparịta ụka bụ 1 Ndị Kọrịnt 15:33, nke na-ekwu banyere izere mkpakọrịta ọjọọ. Ụfọdụ n’ime unu pụrụ ịdị na-eche, sị: ‘Mmadụ imete ndị na-adịghị efe Jehova enyi ọ̀ dị njọ nke otú ahụ?’ Ị ga-ahụ azịza nke ajụjụ a n’akwụkwọ iri na abụọ ndị a.
21-23. (a) Olee ihe ndị na-eto eto pụrụ ịmụta n’ihe ndị Idọm mere? (b) Ole ndị bụ ndị enyi gị n’ezie?
21 Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị Chineke ka e bu n’obi dee akwụkwọ ndị ahụ ndị amụma iri na abụọ dere, ọ bụ ndị Idọm, bụ́ ndị a kpọrọ ụmụnne ndị Izrel, ka akwụkwọ Obedaya gwara okwu.b (Diuterọnọmi 2:4) N’adịghị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị nke ọzọ n’akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere, Obedaya ji nnọchiaha bụ́ “gị” mee ihe mgbe ọ na-ekwu banyere ndị Idọm. Ugbu a, chee echiche banyere ndị Idọm. Ọ bụ n’ihe dị ka n’afọ 607 T.O.A. mgbe ndị agha nọchibidoro Jeruselem. Ọ bụ ezie na ndị Idọm bụ ụmụnne Jekọb, ha dụnyeere ndị Babịlọn úkwù! Ndị Idọm ji obi ụtọ na-ekwu, sị, “Kwatuo ya! Kwaturuo ya ala!” (Abụ Ọma 137:7; Obedaya 10, 12) Ha na-eme atụmatụ iweghara ala Juda. Ha na ndị Babịlọn na-erikọ nri, bụ́ nke na-egosi n’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu na ha abụọ gbara ndụ.
22 Rịba ama ihe Obedaya buru n’amụma banyere ndị Idọm, sị: “Ndị niile [ya bụ, ndị Babịlọn] gị na ha gbara ndụ aghọgbuwo gị. Ndị gị na ha dị n’udo emeriwo gị. Ndị gị na ha na-erikọ nri ga-eji ụgbụ siere gị ọnyà dị ka onye na-enweghị nghọta.” (Obedaya 7) Gịnị n’ezie mere ndị Idọm, bụ́ ndị gbahapụrụ nwanne ha bụ́ Jekọb, ma họrọ ka ndị Babịlọn bụrụ ndị enyi ha? N’ikpeazụ, n’oge Nabonaịdọs na-achị ndị Babịlọn, ha bibiri ndị Idọm. N’oge Malakaị, Chineke mere ka ugwu Idọm bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu, meekwa ka ihe nketa Idọm bụrụ maka nkịta ọhịa.—Malakaị 1:3.
23 Ugbu a, chee echiche banyere ndị enyi gị bụ́ ndị na-adịghị efe Jehova. Ọ̀ bụ na ị chọpụtabeghị na ‘ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị ndị gbara ndụ,’ ma ọ bụ ndị bụ́ enyi, na-aghọkarị ibe ha aghụghọ ma ‘jiri ụgbụ siere’ ndị ha kpọrọ ndị enyi ha ọnyà? Mgbe a chọpụtara aghụghọ ha, gịnị ka ha na-ekwu? Ha pụrụ iwere enyi ha ahụ ha ghọgburu dị ka onye ime ọhịa, onye iberiibe. Lee ka o si yie ihe ndị Babịlọn mere ndị enyi ha, bụ́ ndị Idọm! Ì chere na ụdị ndị “enyi” ahụ ga-echegbuwe onwe ha banyere gị mgbe i nwere nsogbu? (Obedaya 13-16) N’aka nke ọzọ, chegodị echiche banyere Jehova Chineke na ndị ya taa. Jehova dị njikere mgbe niile inyere gị aka. Ọ ga-enyere gị aka n’oge ihe isi ike. Ndị ya bụkwa ‘ezi ndị enyi nwere ịhụnanya mgbe niile,’ dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị “a mụrụ maka oge nsogbu.”—Ilu 17:17.
Ndị na-ekwu na ha bụ ndị enyi gị hà ‘na-eji ụgbụ esiri gị ọnyà’?
JIRI MMEKỌRỊTA KACHASỊ MKPA KPỌRỌ IHE
24, 25. Gịnị kwesịrị ịbụ ihe kasị mkpa ná ndụ anyị?
24 N’eziokwu, mmekọrịta ezinụlọ dị mkpa, o kwesịkwara ka e mee ka o sikwuo ike. Anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe banyere ya site n’aka ndị amụma iri na abụọ ahụ. Ọ́ bụrụkwanụ na ị gụọ akwụkwọ ndị ahụ ma jiri ụzọ a anyị si tụlee ha n’ebe a tụlee ha? Nke a ga-enyere gị aka ọbụna ịmụtakwu ụzọ isi mee ka ndụ ezinụlọ gị ka mma. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ̀ bụ inwe ezinụlọ na-eweta obi ụtọ bụ ihe kasị ndị na-efe Chineke mkpa taa?
25 Ọ dị mma ịmara na Joel buru amụma banyere ọbịbịa nke ụbọchị Jehova, sị: “Kpọkọtanụ mmadụ niile. Doonụ ọgbakọ ahụ nsọ. . . . Ka nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ si n’ọnụ ụlọ ya nke dị n’ime pụta, ka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ sikwa n’ụlọ ndina ya pụta.” (Joel 2:15, 16) A ga-akpọkọta onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ maka ofufe Jehova. A gụpụghị ọbụna ndị ka lụrụ di na nwunye ọhụrụ, bụ́ ndị uche ha na-adịkarị n’ihe ndị ọzọ! Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla ọzọ bute izukọta iji fee Chineke ụzọ. Ebe ọ bụ na ụbọchị Jehova ji ọsọ na-abịa, anyị na ya ịdị ná mma kwesịrị ịbụ ihe kasị mkpa ná ndụ anyị. Ná nkebi ikpeazụ n’akwụkwọ a, anyị ga-atụle ihe anyị kwesịrị iji ọṅụ na-eme taa.
a Mgbe di ma ọ bụ nwunye Onye Kraịst kwara iko, onye nke aka ya dị ọcha aghaghị ikpebi ma ọ̀ ga-agbaghara ma ọ bụ na ọ gaghị agbaghara.—Matiu 19:9.
b Akwụkwọ ọzọ dị iche bụ akwụkwọ Nehọm, nke e bu ndị Ninive n’obi dee.