Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 78
  • Ò Nwere Onye Dị́ Adị Bụ́ Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ò Nwere Onye Dị́ Adị Bụ́ Chineke?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Chineke Ọ̀ Dị? Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịma ma Ọ̀ Dị?
    Teta!—2015
  • Isi Iyi Pụrụ Iche nke Amamihe Ka Elu
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Ndụ A M Dị Agwụla M Ike—Okpukpe, Chineke, Ma Ọ Bụ Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri M Aka?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Onye Okike Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Nwee Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 78
Ebe ìhè anyanwụ na-acha n’urukpuru

Ò Nwere Onye Dị́ Adị Bụ́ Chineke?

Ihe Baịbụl kwuru

Ee. Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe gosiri na Chineke dị. Baịbụl gwakwara anyị ka anyị nwee okwukwe na Chineke. Ma, ọ naghị ekwu ka anyị kweta ihe niile ndị chọọchị na-ekwu. Ihe ọ na-ekwu bụ ka anyị jiri ‘ike iche echiche’ na ‘ikike anyị ji aghọta ihe’ mata nke bụ́ eziokwu banyere Chineke. (Ndị Rom 12:1; 1 Jọn 5:​20) Ka anyị lebagodị anya n’ihe ndị a Baịbụl kwuru bụ́ ndị gosiri na Chineke dị:

  • Otú eluigwe na ụwa si dịrị n’usoro, ihe ndị dị́ ndụ adịkwa n’ime ha gosiri na e nwere Onye kere ha. Baịbụl kwuru, sị: “N’ezie, ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị ka ihe a Baịbụl kwuru enweghị oké ihe ọ bụ, ma ọtụtụ ndị gụrụ oké akwụkwọ kwetara na ihe a o kwuru gbara ọkpụrụkpụ.a

  • Ọ na-agụsi anyịnwa bụ́ ụmụ mmadụ agụụ ike ịghọta ihe mere anyị ji dịrị ndụ. Ọ bụrụgodị na anyị enwetachaa ihe niile dị́ anyị mkpa ma anyị aghọtabeghị ihe mere anyị ji dịrị ndụ, obi anaghị eru anyị ala. Ihe a anyị chọrọ ịghọta so n’ihe Baịbụl kpọrọ “mkpa ime mmụọ.” Ịmata onye Chineke bụ na ife ya sokwa ná mkpa ime mmụọ anyị nwere. (Matiu 5:3; Mkpughe 4:​11) Mkpa a anyị nwere so n’ihe gosiri na Chineke dị adị. O gosikwara na onye kere anyị hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị ghọta ihe mere anyị ji dịrị ndụ.​—Matiu 4:4.

  • E nwere ọtụtụ amụma ndị e dere na Baịbụl ọtụtụ narị afọ tupu oge e kwuru na ha ga-emezu. Ha mezukwara otú e kwuru na ha ga-eme. Otú ha si mezuchaa gosiri na e nwere onye karịrị mmadụ amụma ndị ahụ si n’aka ya.​—2 Pita 1:​21.

  • Otú ụwa dị ma e si n’ọnwa lee ya anya

    Ndị so dee Baịbụl ma ọtụtụ ihe banyere sayensị karịa otú ndị ha na ha dịkọrọ ndụ ma. Dị ka ihe atụ, n’oge ochie, ọtụtụ ndị kweere na e nwere anụmanụ a dọkwasara ụwa n’elu ya, dị ka enyí, ézì ọhịa, ma ọ bụ oké ehi. Ma, Baịbụl kwuru na ‘ọ dịghị ihe Chineke kokwasịrị ụwa na ya.’ (Job 26:7) Baịbụl kwukwara na ụwa “dị gburugburu” ma ọ bụ okirikiri. (Aịzaya 40:22) Ọtụtụ ndị kwetara na naanị ihe mere ndị so dee Baịbụl ji mara ihe ndị a bụ na ọ bụ Chineke mere ka ha mata ha.

  • Baịbụl zara ọtụtụ ajụjụ tara akpụ, ndị ọ ga-abụ ma mmadụ amataghị azịza ha, ya ekwerezie na Chineke adịghị. Ụfọdụ ajụjụ ndị ahụ bụ: Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya ma ka ihe niile ike, gịnị mere ahụhụ na ihe ọjọọ ji ju n’ụwa? Gịnị mere okpukpe ji emekarị ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ kama ịna-eme ihe ọma?​—Taịtọs 1:​16.

a Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwoke nwụrụla anwụ aha ya bụ Allan Sandage. Ọ bụ ọkachamara n’ihe banyere mbara igwe. O kwuru banyere eluigwe na ụwa, sị: “O siiri m ike ikweta na eluigwe na ụwa a dị́ n’usoro pụtara n’onwe ya. A ga-enwerịrị ihe haziri ha ahazi. Ọ ka na-agbagwoju m anya ma Chineke ọ̀ dị. Ma, ọ bụ naanị ikweta na ọ dị ga-eme ka mmadụ ghọta otú ihe niile si malite ịdị.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya