Nwee Ihe Ịga Nke Ọma N’izere Ọnyà Nke Anyaukwu
“Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà.”—1 TIMOTI 6:9.
1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee nchegbu banyere ọnyà?
OKWU ahụ bụ́ “ọnyà” pụrụ ichetara mmadụ banyere dinta nke gbara ọnyà aghụghọ iji jide anụ nke na-amaghị na ọnyà dị. Otú ọ dị, Chineke na-eme ka o doo anya na nye anyị ọnyà ndị kasị dịrị ize ndụ abụghị ọnyà nkịtị dị otú ahụ, kama ọ bụ ihe pụrụ ịma anyị n’ọnyà n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụ n’ụzọ omume. Ekwensu bụ onye ọkà n’ịgba ọnyà ndị dị otú ahụ.—2 Ndị Kọrint 2:11; 2 Timoti 2:24-26.
2. (a) Olee ụzọ Jehova si enyere anyị aka izere ọnyà ndị dị ize ndụ? (b) Olee kpọmkwem ụdị ọnyà nke a ga-atụle ugbu a?
2 Jehova na-enyere anyị aka ịmata ụfọdụ n’ime ọtụtụ ọnyà Setan ndị dị n’ụdị dị iche iche. Dị ka ihe atụ, Chineke na-adọ aka ná ntị na ire, ma ọ bụ egbugbere ọnụ anyị, pụrụ ịbụ ọnyà ma ọ bụrụ na anyị ekwuo ihe nzuzu, n’echeghị eche, ma ọ bụ nke anyị na-ekwesighị ikwu. (Ilu 18:7; 20:25) Mpako pụrụ ịbụ ọnyà, dị ka iso ndị na-ewekarị iwe na-akpakọrịta pụrụ ịbụ. (Ilu 22:24, 25; 29:25) Ma ka anyị chee ihu n’ọnyà ọzọ: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpuo n’ime mbibi na ịla n’iyi.” (1 Timoti 6:9) A pụrụ ịchịkọta ihe na-akpata ọnyà ahụ ma ọ bụ ebe ọ gbadoro ụkwụ n’okwu ahụ bụ “anyaukwu.” Ọ bụ ezie na anyaukwu na-apụtakarị ìhè site ná mkpebisi ike ịba ọgaranya, anyaukwu bụ ezie ọnyà nke nwere ọtụtụ akụkụ.
Jehova Na-adọ Anyị Aka ná Ntị Banyere Ihe Ize Ndụ
3, 4. Akụkọ ihe mere eme oge ochie nke mmadụ nwere ihe mmụta dị aṅaa nke anyaukwu?
3 N’ụzọ bụ isi, anyaukwu bụ ọchịchọ ọjọọ ma ọ bụ nke gabigara ókè inwekwu ihe, ma nke ahụ ọ̀ bụ ego, ihe onwunwe, ike, mmekọahụ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. Anyị abụghị ndị mbụ nọworo n’ihe ize ndụ nke ọnyà anyaukwu. Laarị azụ n’ogige Iden, anyaukwu matara Iv nakwa mgbe e mesịrị Adam, n’ọnyà. Di Iv, nke nweworo ahụmahụ ná ndụ karịa ya, abụrụwo onye Jehova nyere ntụziaka n’onwe ya. Chineke enyewo ha ebe obibi bụ́ paradaịs. Ha pụrụ inweta ụba nke ihe oriri dị iche iche dị mma, ndị a kọrọ n’ala a na-emetọghị emetọ. Ha pụrụ ịtụ anya inwe ụmụ zuru okè, bụ́ ndị ha pụrụ isoro dịa ndụ ma jeere Chineke ozi ruo ebighị ebi. (Jenesis 1:27-31; 2:15) Ọ̀ bụ na nke ahụ eyighị ka o zuru ezu iji mee ka afọ ju mmadụ ọ bụla?
4 Ma, mmadụ inwe ihe zuuru ya adịghị eme ka anyaukwu ghara ịghọ ọnyà. A matara Iv n’ọnyà site n’olileanya nke ịdị ka Chineke, inwekwu nnwere onwe na isetịpụ ụkpụrụ nke ya. O yiri ka Adam ọ̀ chọrọ ịnọgide soro ọmarịcha nwunye ya na-akpakọrịta, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu. Ebe ọbụna mmadụ ndị a zuru okè bụ ndị mara n’ọnyà nke anyaukwu, ị pụrụ ịghọta ihe mere anyaukwu pụrụ iji bụrụ ihe ize ndụ nye anyị.
5. Olee otú o si bụrụ ihe dị mkpa nye anyị izere ọnyà nke anyaukwu?
5 Anyị aghaghị ịnọ na nche megide ịbụ ndị mara n’ọnyà anyaukwu n’ihi na Pọl onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ùnu amataghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu . . . agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Pọl gwakwara anyị, sị: “Ma ịkwa iko, na adịghị ọcha nile, ma ọ bụ anyaukwu, ka a ghara ịkpọ ọbụna aha ya n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 5:3) Ya mere anyaukwu ekwesịghị ọbụna ịbụ isiokwu nkwurịta okwu maka nzube nke igbo mkpa anụ ahụ anyị na-ezughị okè.
6, 7. (a) Ihe atụ ndị dị aṅaa dị na Bible na-emesi ike ụzọ anyaukwu pụrụ isi dị ike? (b) N’ihi gịnị ka ihe atụ ndị ahụ kwesịrị iji bụrụ ịdọ aka ná ntị nye anyị?
6 Jehova edekọwo ọtụtụ ihe atụ iji mee ka anyị mụrụ anya banyere ihe ize ndụ nke anyaukwu. Cheta anyaukwu Ekan. Chineke sịrị na a gaje ibibi Jeriko, ma ọlaedo ya, ọlaọcha, ọla, na ígwè gaje ịbụ maka ụlọ akụ Ya. Ekan pụrụ izubeworị na mbụ ịgbaso ntụziaka ahụ, ma anyaukwu mara ya n’ọnyà. Ozugbo o ruru Jeriko, ọ dị ka à ga-asị na ọ gara njem azụmahịa ebe ọ hụrụ ihe ọ ga-azụta n’ọnụ ala nke ukwuu, gụnyere uwe mwụda mara mma nke yiri ka ọ mara ya mma n’ahụ. Ka ọ na-ewelite ọlaedo na ọlaọcha ọnụ ahịa ha ruru ọtụtụ puku dollar, ọ pụrụ icheworị, sị, ‘Lee ihe ndabara nke a bụ! O yiri nnọọ ka e zutere ya n’ohi.’ Ọ bụ ya nnọọ! Inwe ọchịchọ maka ihe e kwesịrị ibibiworị ma ọ bụ wekọta ọnụ, o zuru Chineke ohi, nke ahụ napụkwara Ekan ndụ ya. (Joshua 6:17-19; 7:20-26) Tụleekwa ihe atụ ndị metụtara Gihezi na Judas Iskariọt.—2 Ndị Eze 5:8-27; Jọn 6:64; 12:2-6.
7 Anyị ekwesịghị ichefu eziokwu ahụ bụ na mmadụ atọ ahụ a kpọtụrụ aha n’elu abụghị ndị ọgọ mmụọ na-amaghị banyere ụkpụrụ nile nke Jehova. Kama, ha nọ ná mmekọrịta a raara nye Chineke. Ha nile ahụwo ọrụ ebube ndị kwesịrị ịkụnye n’obi ha ike nke Chineke nwere na ịdị mkpa nke ịnọgide n’amara ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọnyà nke anyaukwu bụ ihe kpatara ọdịda ha. Anyị onwe anyị pụrụ imebi mmekọrịta anyị na Chineke ma ọ bụrụ na anyị ekwere ka anyị ma n’ọnyà nke anyaukwu n’ụdị ọ bụla. Olee ụdị anyaukwu ndị pụrụ ịdị ize ndụ karịsịa nye anyị?
Ịma n’Ọnyà Anyaukwu Maka Akụ na Ụba ma ọ bụ Ihe Onwunwe
8. Bible na-enye ịdọ aka ná ntị dị aṅaa banyere akụ na ụba?
8 Ihe ka ọtụtụ ná ndị Kraịst anụwo ịdọ aka ná ntị doro anya sitere na Bible megide ịzụlite ịhụnanya maka akụ, inwe oké ọchịchọ maka akụ na ụba. Gịnị ma ị tụlee ụfọdụ n’ime ndị a, dị ka a na-achọta na Matiu 6:24-33; Luk 12:13-21; na 1 Timoti 6:9, 10? Ọ bụ ezie na ị pụrụ iche na ị na-anakwere ma na-agbaso ndụmọdụ dị otú ahụ, ò yighị ka Ekan, Gihezi, na Judas ga-ekwu na ha kwetakwara na nke ahụ? N’ụzọ doro anya, anyị aghaghị ime ihe karịrị iji ọgụgụ isi anyị kweta. Anyị ga-elezi anya ka ọnyà nke anyaukwu maka akụ na ụba ma ọ bụ ihe onwunwe ghara imetụta ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị.
9. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nyochaa àgwà anyị nwere n’ebe ịzụ ihe dị?
9 Ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị, anyị na-azụkarị ọtụtụ ihe—ihe oriri, uwe, na ihe ndị na-adị n’ụlọ. (Jenesis 42:1-3; 2 Ndị Eze 12:11, 12; Ilu 31:14, 16; Luk 9:13; 17:28; 22:36) Ma ụwa azụmahịa na-akpali ọchịchọ maka ọtụtụ ihe na ndị dị ọhụrụ karị. Ọtụtụ mkpọsa azụmahịa na-ejupụta n’akwụkwọ akụkọ, magazin, na onyinyo TV bụ ndị a na-eji aghụghọ hazie iji kpalie anyaukwu. Mkpali ndị dị otú ahụ pụrụ ịdịkwa n’ụlọ ahịa ebe a kwasara blaụz, kotu, uwe ụmụ nwayị, na sweta, ebe a kpọsara akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ, ngwa ụlọ ndị na-eji ọkụ eletrik arụ ọrụ, na kamera. Ọ pụrụ ịdị mma ka ndị Kraịst jụọ onwe ha, sị, ‘Ịzụ ahịa ọ̀ ghọwo ihe pụtara ìhè ma ọ bụ ihe ụtọ bụ isi ná ndụ m?’ ‘Ihe ọhụrụ ndị m na-ahụ hà dị m mkpa n’ezie, ụwa azụmahịa ọ̀ na-eme ka mkpụrụ nke anyaukwu too n’ime m?’—1 Jọn 2:16.
10. Ụdị ọnyà dị aṅaa nke anyaukwu bụ ihe ize ndụ karịsịa nye ụmụ mmadụ?
10 Ọ bụrụ na ịzụ ihe yiri ọnyà na-adịkarị n’etiti ndị inyom, inwetakwu ego bụ otu nye ọtụtụ ndị ikom. Jisọs ji otu nwoke bara ọgaranya nke na-akpata ezigbo ego ma kpebisie ike ‘iweda ọba ya, wuokwa nke ka ukwuu iji kpokọta ọka ya nile na ezi ihe ya nile’ mee ihe atụ banyere ọnyà nke a. Jisọs ahapụghị obi abụọ ọ bụla n’ihe banyere ihe ize ndụ dị na ya: “Lezienụ anya, debekwanụ onwe unu ka unu ghara inwe anyaukwu ọ bụla.” (Luk 12:15-21) Ma ànyị bara ọgaranya ma ọ bụ na anyị abaghị, ndụmọdụ ahụ dị anyị mkpa.
11. Olee ụzọ a pụrụ isi mata onye Kraịst n’ọnyà nke anyaukwu maka inwekwu ego?
11 Anyaukwu maka inwetakwu ego, ma ọ bụ ihe ego pụrụ ịzụta, na-abụkarị nke a na-akpali n’ụzọ nzuzo. A pụrụ igosipụta atụmatụ iji baa ọgaranya ngwa ngwa—ma eleghị anya ohere ị na-agaghị enweta ọzọ ná ndụ gị nile maka inweta ezigbo ego site n’azụmahịa dị ize ndụ. Ma ọ bụ a pụrụ ịnwa mmadụ ịkpata ego site n’azụmahịa na-ezighị ezi ma ọ bụ nke megidere iwu. Anyaukwu nke a pụrụ ịbụ nke dị oké ike, nke na-eweta ịma n’ọnyà. (Abụ Ọma 62:10; Ilu 11:1; 20:10) Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst amalitela azụmahịa ndị ha tụrụ anya na ụmụnna ha ndị ha na-atụkwasị obi ga-abụ ndị ahịa ha bụ isi. Ọ bụrụ na nzube ha abụghị nanị iji mepụta ngwá ahịa dị mkpa ma ọ bụ rụpụta ihe site ‘n’ịdọgbu onwe ha n’ọrụ, na-eji aka ha abụọ rụọ ezi ihe,’ kama bụrụ iji kpata ego ngwa ngwa site n’irigbu ndị Kraịst ibe ha, mgbe ahụ ha na-eme ihe n’anyaukwu. (Ndị Efesọs 4:28; Ilu 20:21; 31:17-19, 24; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:8-12) Anyaukwu maka ego edubawo ụfọdụ n’ịgba chaa chaa site n’ịgba puul, ọkụ na-eri ego, ma ọ bụ lọtịrị. Ndị ọzọ, n’ileghara ọmịiko na ezi uche anya, amalitewo okwu ikpe ngwa ngwa n’olileanya maka inweta onyinye ma ọ bụ nkwụghachi ụgwọ dị ukwuu.
12. N’ihi gịnị ka anyị ji mara na a pụrụ imeri anyaukwu maka akụ na ụba?
12 Ihe ndị a tụleworo bụ akụkụ ebe nnyocha onwe onye kwesịrị ekwesị ka anyị wee nwee ike ịhụ n’ezie ma anyaukwu ọ̀ pụrụ ịdị na-arụ ọrụ n’ime anyị. Ọbụna ma à sị na ọ dị otú ahụ, anyị pụrụ ịgbanwe. Cheta na Zakịọs gbanwere. (Luk 19:1-10) Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọpụta na anyaukwu maka akụ na ụba ma ọ bụ ihe onwunwe bụ nsogbu ji ya aka, o kwesịrị ikpebisi ike dị ka Zakịọs ịgbanahụ ọnyà ahụ.—Jeremaịa 17:9.
Anyaukwu n’Akụkụ Ndị Ọzọ nke Ndụ
13. Abụ Ọma 10:18 na-adọrọ uche anyị gaa n’ọnyà ọzọ dị aṅaa nke anyaukwu?
13 Ọ na-adịrị ụfọdụ mfe ịhụ ihe ize ndụ nke anyaukwu n’ihe banyere ego ma ọ bụ ihe onwunwe karịa ụzọ ndị ọzọ ọ na-esi apụta ìhè. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu Grik na-asị na ahịrị okwu ndị a sụgharịrị ịbụ “anyaukwu” ma ọ bụ “ọchịchọ maka ihe onye ọzọ” nwere echiche nke “‘ịchọkwu ọzọ,’ nke na-ezo aka n’ebe ike na ihe ndị ọzọ dị, tinyekwara ihe onwunwe.” Ee, anyị pụrụ ịbụ ndị mara n’ọnyà site n’iji anyaukwu na-achọ inwe ike n’ahụ ndị ọzọ, ma eleghị na-eme ka ha na-atụ egwu n’okpuru ike anyị.—Abụ Ọma 10:18.
14. N’akụkụ ndị dị aǹaa ka ọchịchọ maka ike wetaworo mmerụ ahụ?
14 Kemgbe oge gboo ndị mmadụ na-ezughị okè enwewo obi inwe ike n’ahụ ndị ọzọ. Chineke bu ụzọ hụ na ihe mwute nke ga-esi ná mmehie mmadụ pụta ga-abụ na ọtụtụ ndị di “ga-achị” nwunye ha. (Jenesis 3:16) Otú ọ dị, ọdịda nke a agabigawo gburugburu alụmdi na nwunye. Mgbe ọtụtụ puku afọ gasịrị, otu onye so dee Bible rịbara ama na ‘mmadụ enwewo ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.’ (Eklisiastis 8:9) Eleghị anya ị maara otú nke ahụ siworo bụrụ eziokwu n’ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ibu agha, ma ọ̀ pụrụ ịbụ na n’ebe ike nke anyị ruru, anyị na-agba mbọ inwetakwu ike ma ọ bụ ọchịchị onwe onye?
15, 16. N’akụkụ ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịmata onye Kraịst n’ọnyà nke ọchịchọ maka inwekwu ike? (Ndị Filipaị 2:3)
15 Anyị nile na-adabere n’ebe ụmụ mmadụ ndị ọzọ nọ—n’ime ezinụlọ anyị si pụta ma ọ bụ ndị ikwu anyị, n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ anyị, n’etiti ndị enyi, nakwa n’ọgbakọ. Mgbe ụfọdụ, ma ọ bụ ọtụtụ mgbe, anyị pụrụ ịnọ n’ọnọdụ ime mkpebi ihe a ga-eme, nakwa ụzọ na mgbe a ga-eme ya. Nke ahụ n’onwe ya adịghị njọ. Otú ọ dị, ànyị na-enwe obi ụtọ iji ikike ọ bụla anyị pụrụ inwe na-emebiga ihe ókè? Ọ̀ pụrụ ịbụ na anyị na-enwe mmasị ime mkpebi ikpeazụ a ga-eme ma na-achọsi ya ike? Ndị nlekọta ma ọ bụ ndị isi ọrụ ụwa na-egosikarị àgwà nke a site n’ịkpọju ndị na-ekwetara ha n’akụkụ ha, bụ́ ndị na-adịghị enwe echiche dị iche na ndị na-adịghị emegide ọchịchọ (anyaukwu) nke ụwa nke ndị ka ha n’ọkwá nwere maka ike.
16 Nke a bụ ọnyà a ga-ezere n’imeso ndị Kraịst ndị ọzọ ihe. Jisọs sịrị: “Unu amatawo na ndị bụ isi nke mba nile ọzọ na-eme ha dị ka ndị nwe ha: ndị ukwu ha na-achịkwa ha. Ọ bụghị otú a ka ọ ga-adị n’etiti unu: kama onye ọ bụla nke na-achọ ka e mee ya onye ukwuu n’etiti unu, ọ ga-abụ onye na-ejere unu ozi.” (Matiu 20:25, 26) Obi umeala dị otú ahụ kwesịrị ịpụta ìhè ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-emeso ibe ha, ndị ohu na-eje ozi, nakwa ìgwè atụrụ ahụ ihe. Dị ka ihe atụ, à pụrụ igosipụta ọchịchọ maka ike site n’aka onye isi oche ndị nlekọta nke na-ajụ ndị okenye ibe ya ase nanị n’obere okwu ma na-eme mkpebi ndị bụ isi n’onwe ya? Ọ̀ dị njikere n’ezie ikenye ndị ọzọ ọrụ? Nsogbu pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na ohu na-eje ozi nke na-eduzi nzukọ ije ozi ubi ji echiche na-ezighị ezi na-achọ oké ihe ná ndokwa ya, ọbụna na-eme ụkpụrụ.—1 Ndị Kọrint 4:21; 9:18; 2 Ndị Kọrint 10:8; 13:10; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:6, 7.
17. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ịtụle ihe oriri mgbe a na-ekwu banyere ọnyà nke anyaukwu?
17 Ihe oriri bụ akụkụ ọzọ ebe ọtụtụ na-ama n’ọnyà nke anyaukwu. N’ezie, ọ bụ otú e si kee mmadụ inweta ọṅụ n’iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ; Bible jakwara nke ahụ mma. (Eklisiastis 5:18) Ma, ọ bụghị ihe dị ụkọ ịhụ ka ọchịchọ n’akụkụ nke a mụbara ruo oge ụfọdụ, na-agabiga ihe kwesịrị inye ọṅụ na ihe zuru ezu n’ụzọ ezi uche dị na ya. Ọ bụrụ na nke a abụghị akụkụ ndị ohu Chineke kwesịrị inwe nchegbu, n’ihi gịnị ka Okwu Jehova ga-eji kwuo n’Ilu 23:20, sị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya vine ókè; n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè”? Ma, olee ụzọ anyị ga-esi zere ọnyà nke a?
18. Nnyocha onwe onye dị aṅaa banyere ihe oriri na ihe ọṅụṅụ ka anyị pụrụ ime?
18 Chineke adịghị atụ aro ka ndị ya na-akpị ihe oriri akpị. (Eklisiastis 2:24, 25) Ma ọ dịghịkwa akwado anyị ime ihe oriri na ihe ọṅụṅụ akụkụ bụ isi nke nkwurịta okwu na atụmatụ anyị. Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ana m anụkarị ọkụ n’obi gabiga ókè mgbe m na-akọwa ụdị ihe oriri ụfọdụ m riri ma ọ bụ m na-eme atụmatụ iri?’ ‘Ana m ekwukarị okwu banyere ihe oriri na ihe ọṅụṅụ?’ Ihe àmà ọzọ pụrụ ịbụ ụzọ anyị si eme omume mgbe anyị nwere ihe oriri nke anyị na-akwadebeghị ma ọ bụ kwụọ ụgwọ ya, eleghị anya mgbe a kpọrọ anyị ọbịa n’ụlọ onye ọzọ ma ọ bụ mgbe e nwere ihe oriri ná mgbakọ ndị Kraịst. Ọ̀ pụrụ ịbụ na mgbe ahụ, anyị na-enwe ọchịchọ iri karịa otú anyị na-eme? Anyị na-echeta na Ịsọ kwere ka ihe oriri dịrị mkpa gabiga ókè, na-ewetara ya mmerụ ahụ na-adịgide adịgide.—Ndị Hibru 12:16.
19. Olee ụzọ anyaukwu pụrụ isi bụrụ nsogbu n’ihe banyere ụtọ nke mmekọahụ?
19 Pọl na-enye anyị nghọta banyere ọnyà ọzọ: “Ma ịkwa iko, na adịghị ọcha nile, ma ọ bụ anyaukwu, ka a ghara ịkpọ ọbụna aha ya n’etiti unu, dị ka o kwesịịrị ndị nsọ.” (Ndị Efesọs 4:17-19; 5:3) N’ezie, anyaukwu maka ụtọ mmekọahụ pụrụ ibilite. Otú ọ dị, obi ụtọ nke a nwere ọnọdụ kwesịrị ekwesị n’ime ihe nkekọ alụmdi na nwunye. Ịhụnanya chiri anya nke e jikọtara ya na ụtọ nke a na-ekere òkè n’inyere di na nwunye aka ikwesị ntụkwasị obi nye onwe ha ruo ọtụtụ afọ nke alụmdi na nwunye. Otú ọ dị, mmadụ ole na ole ga-ajụ ikwere na ụwa nke oge a na-atụkwasị oké ịdị mkpa ná mmekọahụ, na-eme ka ihe bụ n’ezie ngosipụta nke anyaukwu nke Pọl hotara dịrị ka akụkụ nke ndụ. Karịsịa ndị na-anakwere echiche ọjọọ dị otú ahụ nke mmekọahụ n’ụzọ dị mfe bụ ndị na-ekpughe onwe ha nye omume rụrụ arụ na ịgba ọtọ a na-ahụkarị taa n’ọtụtụ ihe nkiri, vidio, na magazin, nakwa n’ebe ntụrụndụ.
20. Olee ụzọ ndị Kraịst pụrụ isi gosi na ha mụ anya ịhụ ihe ize ndụ nke anyaukwu n’ihe metụtara mmekọahụ?
20 Ihe ndekọ nke mmehie Devid na Bat-sheba na-egosi na a pụrụ ịmata otu n’ime ndị ohu Chineke n’ọnyà site n’ọnyà nke anyaukwu mmekọahụ. Ọ bụ ezie na o nweere onwe ya inwe obi ụtọ n’ime alụmdi na nwunye ya, Devid kwere ka agụụ mmekọahụ na-ezighị ezi gụọ ya. N’ịrịba ama otú nwunye Uraịa si maa mma, o nyere ohere ka echiche—nakwa omume—nke iso ya nwee obi ụtọ na-ezighị ezi rụọ ọrụ n’ime ya. (2 Samuel 11:2-4; Jemes 1:14, 15) N’ezie anyị aghaghị ịjụ ụdị anyaukwu nke a. Ọbụna n’ime alụmdi na nwunye, o kwesịrị ekwesị ịjụ anyaukwu. Nke a ga-agụnye ịjụ omume mmekọahụ ndị dị njọ. Di nke kpebisiri ike izere anyaukwu n’akụkụ nke a ga-enwe ezi mmasị n’ebe nwunye ya nọ, ka nhọrọ ọ bụla ha abụọ mere banyere atụmatụ ezinụlọ ghara ime ka obi ụtọ ya dịrị mkpa karịa ọnọdụ ahụ ike nwunye ya ugbu a ma ọ bụ n’ọdịnihu.—Ndị Filipaị 2:4.
Nọgide Na-ekpebisi Ike Izere Anyaukwu
21. N’ihi gịnị ka ntụle anyị tụlere anyaukwu na-ekwesịghị iji kụdaa anyị aka?
21 Jehova adịghị enye ịdọ aka ná ntị n’ihi enweghị ntụkwasị obi ọ bụla. Ọ maara na ndị ohu ya raara onwe ha nye ya chọrọ ijere ya ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe, o nwekwara obi ike na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ga-anọgide na-eme nke ahụ. Banyere ndị ya n’ozuzu, ọ pụrụ ikwu ihe yiri ihe ahụ o kwuru banyere Job mgbe ọ na-agwa Setan okwu, sị: “Ị̀ tụkwasịwo obi gị n’ahụ ohu m, bụ́ Job? Na ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” (Job 1:8) Nna anyị bi n’eluigwe nke na-ahụ n’anya ma na-atụkwasị obi na-eme ka anyị mụrụ anya ịhụ ọnyà ndị dị ize ndụ, dị ka ndị metụtara ụdị nile nke anyaukwu, n’ihi na ọ chọrọ ka anyị nọgide n’enweghị ntụpọ ma kwesị ntụkwasị obi nye ya.
22. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọmụmụ ihe anyị ekpughee otu akụkụ ihe ize ndụ ma ọ bụ adịghị ike onwe onye?
22 Onye ọ bụla n’ime anyị eketawo omume nke inwe anyaukwu site n’ọmụmụ, ọ pụkwara ịbụ na anyị agawo n’ihu ịzụlite nke a n’okpuru mmetụta nke ajọ ụwa a. Gịnị ma ọ bụrụ na n’oge anyị na-amụ ihe banyere anyaukwu—dị ka ihe banyere akụ na ụba, ihe onwunwe, ike na ikike, ihe oriri, ma ọ bụ obi ụtọ mmekọahụ—i wee hụ akụkụ ụfọdụ ị na-adịghị ike? Mgbe ahụ jiri obi gị nakwere ndụmọdụ Jisọs: “O nwee mgbe ọ bụla aka gị mere ka ị sụọ ngọngọ, gbujipụ ya; ọ kaara gị mma ibu ọrụsị banye ná ndụ kama iburu aka abụọ gaa na Gehena.” (Mak 9:43, NW) Mee mgbanwe ndị dị mkpa n’àgwà ma ọ bụ n’ihe ndị na-amasị gị. Zere ọnyà anyaukwu ahụ nke na-eweta ọnwụ. Otú a site n’enyemaka Chineke, ị pụrụ ‘ịbanye ná ndụ.’
Gịnị Ka M Mụtaworo?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-enwe nchegbu banyere ọnyà nke anyaukwu?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyaukwu maka akụ na ụba ma ọ bụ ihe onwunwe pụrụ isi mata anyị n’ọnyà?
◻ Olee ụzọ anyaukwu n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ pụrụ isi weta ezi ihe ize ndụ?
◻ Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị banyere adịghị ike ọ bụla anyị nwere n’ihe banyere anyaukwu?