Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 20 p. 107-111
  • Ị̀ Na-achọ Ịbụ Onye Mbụ Mgbe Nile?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-achọ Ịbụ Onye Mbụ Mgbe Nile?
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Kpọrọ Ha “Ụmụ Égbè Eluigwe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Onye Farisii Lere Ya Ọbịa
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ole Ndị Chineke Na-akpọ Ka Ha Bịa Oriri?
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Ozizi Ukwu
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 20 p. 107-111

ISI NKE 20

Ị̀ Na-achọ Ịbụ Onye Mbụ Mgbe Nile?

Ọ̀ DỊ onye ọ bụla ị ma nke na-achọ ịbụ onye mbụ mgbe nile?— Ọ pụrụ inupụ mmadụ n’ahịrị ka o wee nwee ike ịbụ onye mbụ. Ị̀ hụtụla ebe o mere?— Onye Ozizi Ukwu ahụ hụrụ ka ọbụna ndị toruworo ogo mmadụ na-agbalị inweta ọkwá mbụ ma ọ bụ ọnọdụ kasị mma. O nweghịkwa mmasị na ya. Ka anyị lee ihe merenụ.

[Foto dị na peeji nke 107]

Ị̀ hụtụla ebe ndị mmadụ na-agbalị ịbụ ndị mbụ?

Bible na-akọrọ anyị na a kpọrọ Jizọs òkù ịbịa otu nnukwute oriri n’ụlọ otu onye Farisii, bụ́ onye ndú okpukpe a na-akwanyere ùgwù. Mgbe Jizọs rutere, ọ malitere ịhụ ka ndị ọzọ a kpọrọ òkù na-abịa ma na-ahọrọ ebe kasị mma. Ya mere, ọ kọọrọ ndị ahụ a kpọrọ òkù otu akụkọ. Ị̀ chọrọ ịnụ akụkọ ahụ?—

Jizọs sịrị: ‘Mgbe mmadụ kpọrọ gị òkù ịbịa oriri agbamakwụkwọ, ahọrọla ebe kasị mma, ma ọ bụ ebe kasị ùgwù.’ Ị̀ ma ihe mere Jizọs ji kwuo otú ahụ?— Ọ kọwara na ọ pụrụ ịbụ na a kpọwo onye a na-akwanyere ùgwù karịa gị òkù. Ya mere, dị ka ị pụrụ ịhụ n’ihe osise a, onye ahụ kpọrọ oriri ga-abịa, sị gị: ‘Ka onye a nọrọ ebe a, gị onwe gị kwa gafee n’ebe ahụ.’ Olee otú obi ga-adị onye ahụ a kpọrọ òkù mgbe ahụ?— Ihere ga-eme ya n’ihi na ndị ọzọ nile a kpọrọ òkù ga na-ele ya anya mgbe ọ ga-agafe n’ebe dị ala karị.

Jizọs na-egosi na o kwesịghị ekwesị ịdị na-achọ ebe kasị mma. Ya mere, ọ sịrị: ‘Mgbe a kpọrọ gị òkù ịbịa oriri agbamakwụkwọ, gaa nọrọ n’ebe kasị ala. Mgbe ahụ, onye kpọrọ gị òkù nwere ike ịbịa, sị, “Enyi m, gbagoo n’ebe ka elu.” Mgbe ahụ ị ga-enwe nsọpụrụ n’anya ndị ọzọ nile a kpọrọ òkù mgbe ị ga-ebili gafee n’ebe ka mma.’—Luk 14:1, 7-11.

[Foto ndị dị na peeji nke 108, 109]

Gịnị ka Jizọs nọ na-akụzi mgbe ọ kọrọ akụkọ banyere ndị na-ahọrọ oche kasị mma?

Ị̀ ghọtara isi ihe dị n’akụkọ Jizọs?— Ka anyị nye otu ihe atụ iji lee ma ị ghọtara ya. Ka e were ya na ị na-abanye n’ime bọs mmadụ juru na ya. Ì kwesịrị ime ngwa ngwa gaa nọrọ n’oche ma hapụ onye mere okenye karị ka o guzoro ọtọ?— Ọ̀ ga-amasị Jizọs ma i mee otú ahụ?—

Mmadụ pụrụ ịsị na ihe anyị mere enweghị ihe ọ bụ nye Jizọs. Ma, ì kwere?— Mgbe Jizọs nọ ná nnukwu oriri ahụ a kpọrọ n’ụlọ onye Farisii ahụ, ọ nọ na-ele ndị mmadụ ka ha na-ahọrọ oche ebe ha ga-anọ. Í cheghị na o nwekwara mmasị n’otu aka ahụ ịhụ ihe anyị na-eme taa?— Ugbu a Jizọs nọ n’eluigwe, n’ezie ọ nọ n’ebe ọ na-ahụ anyị nke ọma.

Mgbe mmadụ na-agbalị ịbụ onye mbụ, ọ pụrụ ịkpata nsogbu. A na-enwekarị esemokwu, ndị mmadụ na-ewekwa iwe. Nke a na-eme mgbe ụfọdụ mgbe ụmụaka ji bọs na-emekọ njem ọnụ. Ozugbo e meghere ọnụ ụzọ bọs, ụmụaka na-ejiri ọsọ nuba ka ha bụrụ ndị mbụ. Ha na-achọ inweta oche n’ebe kasị mma, n’akụkụ windo. Mgbe ahụ gịnị nwere ike ime?— Ee, ha pụrụ iweso ibe ha iwe.

Ịchọ ịbụ onye mbụ pụrụ ịkpata ọtụtụ nsogbu. Ọ kpatara nsogbu ọbụna n’etiti ndịozi Jizọs. Dị ka anyị mụrụ n’Isi nke 6 n’akwụkwọ a, ha rụrụ ụka n’etiti onwe ha banyere onye kasị ukwuu. Gịnị ka Jizọs mere mgbe ahụ?— Ee, ọ gbaziri ha. Ma, ka oge na-aga, ha sere okwu ọzọ. Ka anyị lee otú o si malite.

Ndịozi ahụ, tinyere ndị ọzọ, so Jizọs na-aga Jeruselem na nke ikpeazụ ha. Jizọs anọwo na-agwa ha banyere Alaeze ya, ya mere, Jems na Jọn anọwo na-eche echiche banyere iso ya na-achị dị ka ndị eze. Ọbụna ha gwara nne ha, bụ́ Salomi, banyere ya. (Matiu 27:56; Mak 15:40) Ya mere, mgbe ha nọ na-aga Jeruselem, Salomi bịakwutere Jizọs, kpọọrọ ya isiala, ma rịọ ya ka o meere ya otu ihe ọma.

Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị chọrọ?” Ọ sịrị na ya ga-achọ ka Jizọs kwe ka ụmụ ya nọrọ ya n’akụkụ n’Alaeze ya, otu onye n’aka nri ya, onye nke ọzọ n’aka ekpe ya. Ma, mgbe ndịozi iri ndị nke ọzọ nụrụ ihe Jems na Jọn gwara nne ha ka ọ rịọrọ ha, olee otú i chere obi dị ha?—

[Foto dị na peeji nke 110]

Gịnị ka Salomi rịọrọ Jizọs, gịnịkwa si na ya pụta?

Ee, ha wesoro Jems na Jọn nnukwute iwe. Ya mere, Jizọs nyere ndịozi ya nile ezigbo ndụmọdụ. Jizọs gwara ha na ndị na-achị ndị mba ọzọ na-enwe mmasị ịbụ ndị ukwu na ndị a na-akwanyere ùgwù. Ha na-achọ ọkwá dị elu ka onye ọ bụla wee na-erubere ha isi. Ma, Jizọs gwara ụmụazụ ya na ha ekwesịghị ịdị otú ahụ. Kama nke ahụ, Jizọs sịrị ha: “Onye ọ bụla nke na-achọkwa ịbụ onye mbụ n’etiti unu aghaghị ịbụ ohu unu.” Cheedị echiche banyere nke ahụ!—Matiu 20:20-28.

Ị̀ ma ihe ohu na-eme?— Ọ na-ejere ndị ọzọ ozi, n’atụghị anya ka ndị ọzọ jeere ya ozi. Ọ na-anọ n’ebe kasị ala, ọ bụghị n’ebe kasị elu. Ọ na-eme dị ka onye kasị ala, ọ bụghị onye kasị mkpa. Chetakwa, Jizọs sịrị na onye chọrọ ịbụ onye mbụ kwesịrị ịdị na-eme ka ohu n’ebe ndị ọzọ nọ.

Ugbu a, gịnị ka i chere nke ahụ pụtara nye anyị?— Ohu na nna ya ukwu hà ga na-arụ ụka onye ga-anọ n’oche kasị mma? Ka, hà ga na-arụ ụka onye ga-ebu ụzọ rie ihe? Olee ihe i chere?— Jizọs kọwara na ohu na-ebu ụzọ mee ihe nna ya ukwu chọrọ tupu o mewe nke ya.—Luk 17:7-10.

Ya mere, kama ịdị na-agbalị ịnọ n’ọnọdụ mbụ, olee ihe anyị kwesịrị ime?— Ee, anyị kwesịrị ịdị na-eme ka ohu nye ndị ọzọ. Nke ahụ pụtakwara ibute ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ tupu nke anyị. Ọ pụtara iwere ndị ọzọ dị ka ndị dị mkpa karịa anyị. Ọ̀ dị ụzọ ndị ọzọ i chetara ị pụrụ isi na-ebute ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ tupu nke gị?— Ọ ga-adị mma ma ị laghachi na peeji nke 40 na nke 41 ma lee anya ọzọ n’ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi na-ebute ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ tupu nke anyị site n’ijere ha ozi.

Ị ga-echeta na Onye Ozizi Ukwu ahụ butere ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ tupu nke ya site n’ijere ha ozi. N’uhuruchi ikpeazụ ya na ndịozi ya nọrọ, ọbụna o hulatara ala saa ụkwụ ha. Ọ bụrụkwa na anyị na-ebute ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ tupu nke anyị site n’ijere ha ozi, anyị ga na-eme ihe na-amasị ma Onye Ozizi Ukwu ahụ ma Nna ya, bụ́ Jehova Chineke.

Ka anyị gụkwuo akụkụ Bible ndị ọzọ na-agba anyị ume ibute ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ tupu nke anyị: Luk 9:48; Ndị Rom 12:3; nakwa Ndị Filipaị 2:3, 4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya