Ị̀ Na-eme Uche Chineke?
N’OZI ụlọ n’ụlọ ha, abụọ n’ime Ndịàmà Jehova zutere onye ụkọchukwu Chọọchị Episcopal. O yiri ezigbo mmadụ, gbaa afụ ọnụ, gbaa ihe dị ka 60 afọ, yiri uwe T-shirt e ji okpotokpo aka akwụkwọ dekwasị aha chọọchị ya. N’otu nkwupụ okwu, ọ sịrị: “Ọ dị m ka ọ ya bụrụ na ndị chọọchị anyị ga na-anụ ọkụ n’obi dị ka unu n’ịgbasa Okwu ahụ, ma m ga-agwa unu ka unu ghara ịbịakwa n’ụlọ m ọzọ.”
Ee, e nwere ọtụtụ ndị nwere mmasị n’ọrụ Ndịàmà Jehova ma na-aja ha mma maka ịnụ ọkụ n’obi ha. Ma, ha enweghị mmasị ma ọlị n’ihe Ndịàmà na-eme, ha agaghịkwa atụle ịrụ ọrụ ahụ n’onwe ha. Otú ọ dị, ọnọdụ nke a doro anya na ha na-emegiderịta onwe ha abụghị ihe ọhụrụ. Jisọs rịbara ya ama n’ụbọchị ya, o mesikwara isi ihe ahụ ike site n’otu ihe atụ na-akpali iche echiche.
“Ma gịnị bụ uche unu? Otu nwoke nwere ụmụ abụọ; o wee bịakwute nke mbụ, sị, Nwa, jee rụọ ọrụ taa n’ubi vine nke m. Ma ọ zara, sị, Achọghị m ije: ma e mesịa ọ kwaa ụta, wee jee. O wee bịakwute nke abụọ, kwuo otú ahụ. O wee zaa, sị, Mụ onwe m ga-eje, Onyenwe anyị: ma o jeghị. Ònye n’ime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?”—Matiu 21:28-31.
Azịza ya doro anya. Dị ka ìgwè mmadụ ahụ gere Jisọs ntị, anyị ga-aza sị, “Onye mbụ.” Ma e wezụga ihe ahụ doro anya, site n’ihe atụ ahụ, Jisọs na-akpọtụ n’uche anyị na ime ihe nna ahụ chọrọ bụ ihe dị mkpa. Ọ bụ ezie na nwa mbụ ahụ kwuru na ya agaghị aga, o mesịrị gaa, a jakwara ya mma n’ihi ya. Ịrụ ụdị ọrụ nke dị mma dịkwa mkpa n’otu aka ahụ. Nwa nke mbụ ahụ mere ihe site n’ịrụ ọrụ n’ubi vine nna ya; ọ pụghị gaa rụọ ọrụ n’ubi vine nke ya.
Gịnị ka ihe a dum pụtaara anyị? Gịnị ka Chineke chọrọ n’aka ndị na-efe ya taa? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site ná ndụ Jisọs bụ́ nke ga-enyere anyị aka ime uche Nna ya? Ndị a bụ ajụjụ ndị dị mkpa, anyị ịchọta azịza ndị ziri ezi ga-apụtakwa ọdịmma anyị na-adịru ebighị ebi, ebe ọ bụ na “onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17; Ndị Efesọs 5:17.
Gịnị bụ ‘Uche nke Chineke’?
E depụtara mkpọaha ahụ bụ “uche” ihe karịrị 80 ugboro n’akwụkwọ Comprehensive Concordance of the New World Translation of the Holy Scriptures. N’ihe dị ka 60 n’ime ndị a (ma ọ bụ ihe dị ka 75 pasent nke ugboro ndị ahụ) ntụaka ahụ bụ n’ebe uche Chineke dị. Okwu ndị dị ka “uche nke Chineke,” “uche Nna m,” na “uche Chineke” pụtara ihe karịrị 20 ugboro. Site na nke a anyị pụrụ ịhụ na uche Chineke kwesịrị ịbụ ihe dị oké mkpa nye anyị. Ime uche Chineke kwesịrị ịbụ isi nchegbu ná ndụ anyị.
N’Igbo mkpọaha ahụ bụ́ “uche” pụtara ‘ọchịchọ, agụụ, mkpebi siri ike, ihe e nwere mmasị na ya, karịsịa nhọrọ ma ọ bụ mkpebi siri ike nke onye bụ isi ma ọ bụ onye nwere ike.’ Mgbe ahụ, Jehova, Onye Kasị Bụrụ Isi, nwere uche, ọchịchọ, ma ọ bụ mkpebi siri ike. Gịnị ka ọ bụ? Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na n’akụkụ ụfọdụ “[Chineke] na-achọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Jisọs Kraịst na ndị Kraịst oge mbụ ji obi ha dum rụọ ọrụ iji wetara ndị ọzọ ezi ihe ọmụma nke a.—Matiu 9:35; Ọrụ 5:42; Ndị Filipaị 2:19, 22.
Olè ndị na-eme uche Chineke taa? N’etiti ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ abụọ na-asị na ha na-eso ụzọ Jisọs Kraịst, olè ndị dị ka nwa mbụ ahụ dị n’ihe atụ Jisọs, onye pụrụ gaa mee uche nna ya? Azịza ya esighị ike ịchọta. Ezi ndị na-eso nzọụkwụ Jisọs Kraịst ga na-arụ ọrụ ahụ nke o kwuru na ha ga-arụ: “A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke m n’ihu mba nile.” (Mak 13:10) Ndịàmà Jehova, ndị ọnụ ọgụgụ ha karịrị nde anọ na ọkara gburugburu ụwa, na-arụsi ọrụ ike n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke na ịkụziri ndị ọzọ ihe, na-atụ aka n’Alaeze ahụ dị ka nanị olileanya ihe a kpọrọ mmadụ nwere maka udo na ntụkwasị obi. Ị̀ na-ekere òkè zuru ezu n’ime uche Chineke? Ị̀ na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ dị ka Jisọs mere?—Ọrụ 10:42; Ndị Hibru 10:7.
Inweta Ọṅụ n’Ime Uche Chineke
Ọ bụ ezie na ọṅụ dị n’ịmụta ihe bụ uche Nna anyị, e nwere ọṅụ ka ukwuu n’ịkụziri ndị ọzọ uche Chineke. Jisọs nwetara ọṅụ n’ịkụziri ndị mmadụ banyere Nna ya. Ọ dị ka nri nye ya. (Jọn 4:34) Anyị onwe anyị kwa ga-enweta ezi ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị emee dị ka Jisọs mere, ya bụ, ikwusa na ịkụzi ihe ndị ọ kụziri, ihe ndị ọ natara n’aka Nna ya. (Matiu 28:19, 20) Dị ka Jisọs kwere ná nkwa, “Ọ bụrụ na unu matara ihe ndị a, ngọzi na-adịrị unu ma a sị na unu na-eme ha.”—Jọn 13:17.
Iji maa atụ: Otu onye bụ nne nke banyeghachiri n’ozi ịsụ ụzọ oge nile sịrị: “Ịhụ ihu onye a na-eduziri ọmụmụ Bible ka ọ malitere igbukepụ ka eziokwu dị iche iche nke Bible na-emetụ ya n’obi na-akpali akpali nke ukwuu! Ọ bụ oké ihe ọṅụ nye m ịhụ ka kpọmkwem otu onye a na-eduziri ọmụmụ ihe depụtara n’aka akwụkwọ ya akụkụ akwụkwọ nsọ nile tupu ọmụmụ ihe ahụ ma na-edetu ihe n’oge a na-amụ ihe ka o wee zaa ajụjụ ntụleghachi ọ bụla ma e mesịa.” Onye ọzọ ọ na-eduziri ọmụmụ Bible anụtuwo eziokwu ahụ na mbụ n’oge ọ nọ n’afọ ndụ agbata iri na atọ na iri na itoolu. Ugbu a ọ lụwo di, nweekwa nchegbu banyere nsogbu onwe onye ụfọdụ, ọ nọ na-agụsi ya ike ịchọta Ndịàmà. Lee aha obi ụtọ o nwere mgbe nwanna nwanyị ahụ na-asụ ụzọ chọtara ya! Obi ụtọ jupụtara nwa agbọghọ ahụ obi ịmaliteghachi ọmụmụ Bible ya.
Ịnọgide Na-enwe Ọṅụ nke Ime Uche Chineke
Eze Devid nke Israel oge ochie bụ otu onye nke chọrọ ime uche Chineke ná ndụ ya nile. N’agbanyeghị ọtụtụ ihe isi ike na nrụgide e wetaara ya, a kpaliri ya ịsị: “Ime ihe dị Gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke; iwu Gị dịkwa n’ime obi m.” (Abụ Ọma 40:8) Ime uche Jehova dị nnọọ n’ime mkpụrụ obi Devid, n’ime ọkpụkpụ ya. Nke ahụ bụ isi ihe dị n’ọṅụ ya na-adịghị agwụsị agwụsị n’ijere Jehova ozi. Ime uche Chineke abụghịrị Devid ihe isi ike. Kama nke ahụ, ọ bụ ihe na-atọ ụtọ, ihe nke sitere n’obi ya. Ná ndụ ya nile, ọ gbalịsiri ike ime ihe kasị mma ọ pụrụ ime iji jeere Chineke, bụ́ Jehova, ozi, ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ o mere mmehie ma ghara iru ihe a chọrọ.
N’otu oge, ọṅụ anyị pụrụ ịdanyụ. Anyị pụrụ inwe ike ọgwụgwụ ma ọ bụ obi ịda mbà. Ma eleghị anya ihe anyị mere n’oge gara aga na-enye anyị nsogbu n’obi, akọ na uche anyị na-enye anyị nsogbu banyere otu ihe ọjọọ anyị mere n’oge dị anya gara aga. Mgbe mgbe, anyị pụrụ imeri mmetụta ndị a site n’ọmụmụ ihe miri emi karị nke Okwu Chineke. Anyị pụrụ iburu n’uche idekwasị iwu Chineke “n’ime obi” anyị, dị ka Devid mere. Ọ bụrụ na anyị agbalịa iji obi dum mee uche Chineke, ya bụ, jiri ike anyị nile, ọ ga-enyeghachi anyị ụgwọ ọrụ kwesịrị ekwesị n’ihi na o kwesịrị ntụkwasị obi.—Ndị Efesọs 6:6; Ndị Hibru 6:10-12; 1 Pita 4:19.
N’ụzọ na-akpali mmasị, ná Ndị Hibru 10:5-7, Pọl onyeozi hotara okwu Devid ndị dị n’Abụ Ọma 40:6-8 ma jiri ha mee ihe n’ebe Jisọs Kraịst nọ. N’ime nke ahụ, Pọl gosipụtara otú Jisọs si nọrọ Nna ya nso. Okwu Hibru maka “uche” na-enye echiche ndị bụ ‘ihe na-enye obi ụtọ, ọchịchọ, ihu ọma, ma ọ bụ ihe na-atọ ụtọ.’ Ya mere, Abụ Ọma 40:8 pụrụ ịgụ banyere Kraịst ahụ, sị: “Ime ihe na-atọ gị ụtọ, Chineke m, na-enye m obi ụtọ.”a Jisọs chọrọ ime ihe na-atọ Nna ya ụtọ. Jisọs mere ihe gabiga ihe a sịrị ya mee. O mere ihe na-atọ obi Nna ya ụtọ, o nwekwara mmasị n’ime ya.
Ndụ dum nke Jisọs dị gburugburu ịkụziri ndị ọzọ ihe bụ uche Chineke na ihe ha na-aghaghị ime iji nweta ngọzi Chineke. Ọ bụ onye nkwusa na onye nkụzi oge nile, o nwetara ọṅụ dị ukwuu n’ịrụ ọrụ ahụ. Ya mere ọ pụtara na ka anyị na-arụ ọrụ Jehova karị, otú ahụ ka anyị ga-anata ọṅụ karị. Gị onwe gị kwa ị̀ pụrụ ije ozi oge nile n’ọrụ nkwusa ahụ ka ọṅụ gị wee baa ụba?
Ihe enyemaka ọzọ n’ịnọgide na-enwe ọṅụ n’ime uche Chineke bụ ịdị na-elegide ọdịnihu anya nke ọma. Nke ahụ bụ ihe Jisọs mere. “N’ihi ọṅụ e debere ya n’ihu, ọ tachiri obi n’elu osisi ịta ahụhụ, na-elelị ihere.” Nye ya, ọṅụ ahụ bụ ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke ruo ọgwụgwụ na n’imesịa nweta ụgwọ ọrụ nke ịbụ eze n’aka nri nke Nna ya.—Ndị Hibru 12:2, NW.
Cheedị banyere ọṅụ ọdịnihu nke ga-abịara ndị nọgidere na-eme uche Chineke. Ha ga-ahụ mbibi nke ndị siri ọnwụ na-eme uche nke onwe ha nanị ọbụna ma a sị na nke a na-akpatara ndị na-agbalịsi ike ime uche Chineke nhụsianya. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:7, 8) Chee echiche banyere ọṅụ nke ndị a hụrụ n’anya a kpọlitere n’ọnwụ n’inwe ohere ịmụta na ime uche Chineke. Ma ọ bụ tụlee nzube Chineke nke ime ka ụwa ghọọ Paradaịs ọzọ. N’ikpeazụkwa, cheedị banyere nnwere onwe nke ga-esite ná mbibi zuru ezu nke Setan, onye na-emegide uche Jehova.
Ee, ime uche Chineke taa pụrụ iweta ọṅụ dị ukwuu ugbu a na obi ụtọ na-adịghị agwụ agwụ n’ọdịnihu. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ nzaghachi anyị na-anata n’ọrụ nkwusa ahụ, ka anyị ṅomie ihe nlereanya Jisọs n’inwe obi ụtọ n’ime uche Nna ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee ntụaka ala ala peji maka Abụ Ọma 40:8, NW.