Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 1/15 p. 8-9
  • Ihe Atụ nke Oriri Agbamakwụkwọ ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Atụ nke Oriri Agbamakwụkwọ ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Atụ nke Oriri Agbamakwụkwọ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Otu Eze Agwa Ohu Ya Ka Ọ Kpọọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Oriri Agbamakwụkwọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Onye Farisii Lere Ya Ọbịa
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Agbamakwụkwọ Ndị Dị Ùgwù n’Anya Chineke Na Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 1/15 p. 8-9

Ndụ na Jisọs Ije Ozi

Ihe Atụ nke Oriri Agbamakwụkwọ ahụ

SITE n’ihe atụ abụọ, Jisọs ekpughewo ndị odeakwụkwọ na ndị isi nchụàjà ahụ, ha na-achọkwa igbu ya. Ma Jisọs agwachabeghị ha ihe nile ọ chọrọ ịgwa ha. Ọ gara n’ihu ịkọrọ ha ihe atụ ọzọ, na-asị:

“E ji alaeze Chineke tụnyere otu nwoke bụ eze, nke siri oriri ọlụlụ nwunye nye nwa ya nwoke, zipụkwa ndị ohu ya ịkpọ ndị a kpọrọrịị ịbịa n’oriri ọlụlụ nwunye ahụ: ma ha achọghị ịbịa.”

Jehova Chineke bụ Eze ahụ onye kwadebere oriri agbamakwụkwọ maka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. N’ikpeazụ, a ga-ejikọta ya na nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ bụ́ 144,000 ndị ahụ na-eso ụzọ ya e tere mmanụ n’eluigwe. Ndị Eze ahụ na-achị bụ ndị Israel, ndị natara ohere nke ịghọ “alaeze ndị nchụàjà,” mgbe e webatara ha n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’afọ 1513 T.O.A. Otú a, n’oge ahụ, e buru ụzọ kpọọ ha òkù ịbịa oriri alụmdi na nwunye ahụ.

Otú ọ dị, ọkpụkpọ òkù mbụ ahụ nye ndị a kpọrọ ịbịa apụghị ruokwa mmalite ọkọchị nke afọ 29 O.A., mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya (ndị ohu nke eze ahụ) malitere ọrụ ha nke nkwusa Alaeze. Ma ndị ahụ bụ́ ndị Israel site n’ọmụmụ, bụ́ ndị natara ọkpụkpọ òkù ndị ohu ahụ kpọrọ ha malite na 29 O.A. ruo 33 O.A. achọghị ịbịa. Ya mere Chineke nyere mba ahụ nke ndị a kpọrọ òkù ohere ọzọ, dị ka Jisọs kọwara:

“Ọzọ, o zipụrụ ndị ohu ọzọ, sị, Gwa ndị a kpọrọrịị, sị, Lee, edozisịwo m oriri m: e gbusịwo oké ehi m nile na anụ m nile a zụrụ azụ, e dozisịwo ihe nile: bịanụ n’oriri ọlụlụ nwunye nke m.” Ọkpụkpọ òkù nke abụọ a, bụ́kwa nke ikpeazụ nye ndị ahụ a kpọrọ ịbịa malitere na Pentikọst nke afọ 33 O.A., mgbe a wụkwasịrị mmụọ nsọ n’isi ndị na-eso ụzọ Jisọs. Ọkpụkpọ òkù a nọgidere na-aga n’ihu ruo 36 O.A.

Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị Israel ahụ, jụkwara ọkpụkpọ òkù nke a. “Ma ha lefuuru ya anya,” ka Jisọs kọwara, “jee ebe nke ha, otu onye n’ubi nke aka ya, nke ọzọ n’ihe ahịa ya: ma ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere, gbuokwa ha.” “Ma,” ka Jisọs gara n’ihu ikwu, “eze ahụ were iwe; o wee ziga usuu ndị agha ya nile, laa ndị ogbu mmadụ ahụ n’iyi, rechapụkwa obodo ha ọkụ.” Nke a mere n’afọ 70 O.A., mgbe e bibisịrị Jerusalem kpam kpam site n’aka ndị Rom, e gbukwara ndị ogbu mmadụ ahụ.

Jisọs gara n’ihu ịkọwa ihe mere n’oge ahụ: “Mgbe ahụ [eze ahụ] sịrị ndị ohu ya, E dozisịwo ọlụlụ nwunye nke m, ma ndị a kpọrọrịị ekwesịghị. Ya mere, gaanụ n’agbata ụzọ nile, ka ha hakwa, bụ́ ndị unu ga-ahụ, kpọọ ha bịa n’oriri ọlụlụ nwunye nke m.” Ndị ohu ahụ mere nke a, “ụlọ a na-alụ nwunye wee jupụta ná ndị nọdụrụ ná nri.”

Ọrụ nke a nke ịchịkọta ndị ọbịa site n’okporo ụzọ nile dị ná mpụga obodo ahụ nke ndị a kpọrọ òkù malitere na 36 O.A. Onye ọchịagha Rom ahụ bụ́ Kọniliọs na ezinụlọ ya bụ ndị mbụ na-abụghị ndị Juu, ndị a na-ebighịkwa úgwù a chịkọtara. Nchịkọta nke ndị a na-abụghị ndị Juu, ndị e jicha ha nile dochie anya ndị ahụ jụburu ịnara ọkpụkpọ òkù ahụ, anọgidewo na-aga n’ihu ruo narị afọ nke iri abụọ nke a.

Ọ bụ n’ime narị afọ nke iri abụọ nke a ka ohere e nwere n’ụlọ agbamakwụkwọ ahụ jupụtara. Jisọs kọrọ ihe meziri mgbe ahụ, na-asị: “Ma mgbe ahụ eze ahụ batara ikiri ndị nọdụrụ ná nri, ọ hụ n’ebe ahụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye: o wee sị ya, Enyi m, ì si aṅaa bata n’ebe a n’eyighị uwe ọlụlụ nwunye? Ma o kpuchiri ọnụ. Mgbe ahụ eze ahụ sịrị ndị na-ejere ya ozi, Keenụ ya ụkwụ na aka tụpụ ya n’ọchịchịrị nke èzí; n’ebe ahụ ka ịkwa ákwá na ịta ikikere eze ahụ ga-adị.”

Nwoke ahụ na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye sere onyinyo ndị Kraịst na-abụghị ezie nke Krisendọm. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla Chineke lere ndị a anya dị ka ndị nwere ezi ihe e ji amata ha dị ka ndị Israel ime mmụọ. Ọ dịghị mgbe ọ bula Chineke jiri mmụọ nsọ tee ha mmanụ dị ka ndị nketa Alaeze ahụ. Ya mere, a na-atụpụ ha n’èzí baa n’ọchịchịrị ebe ha ga-ata ahụhụ mbibi.

Jisọs mechiri ihe atụ ya site n’ịsị: “N’ihi na ndị a kpọworo dị ọtụtụ, ma ndị a họpụtaworo dị ole na ole.” Ee, e nwere ọtụtụ ndị a kpọrọ site ná mba Israel ịghọ ndị òtù nke nwanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ, ma ọ bụ nanị ndị Israel anụ ahụ ole na ole ka a họpụtara. Ihe ka ọtụtụ na 144,000 ndị ọbịa ahụ, ndị natara ụgwọ ọrụ nke eluigwe bụ ndị na-abụghị ndị Israel. Matiu 22:1-14; Ọpụpụ 19:1-6; Mkpughe 14:1-3

◆ Olee ndị bụ ndị mbụ ahụ a kpọrọ ịbịa oriri alụmdi na nwunye ahụ, oleekwa mgbe e nyere ha ọkpụkpọ òkù ahụ?

◆ Olee mgbe ọkpụkpọ òkù ahụ pụrụ nke mbụ ya nye ndị ahụ a kpọrọ ịbịa, oleekwa ndị bụ́ ndị ohu ahụ e jiri mee ihe ịkpọ òkù ahụ?

◆ Olee mgbe ọkpụkpọ òkù nke abụọ ahụ pụrụ, oleekwa ndị e mesịrị kpọọ ịbịa?

◆ Ole ndị ka nwoke ahụ na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye sere onyinyo ha?

◆ Olee ndị bụ́ ọtụtụ ndị a kpọrọ, na ole na ole ndị a họpụtara?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya