Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 5/1 p. 5-8
  • Iso Ụzọ Kraịst Oge Mbụ na Ọchịchị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iso Ụzọ Kraịst Oge Mbụ na Ọchịchị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Abụghị Ndị Ụwa ma Ha Adịghị Ebu Iro
  • Nsọpụrụ, Ọ Bụghị Ofufe
  • ‘Nnọpụiche n’Ọha Mmadụ’
  • Ịkwụ Siza “Ụgwọ” Ya
  • Ezi Nguzo Nlezianya n’Etiti Nzọrọ Abụọ Na-asọrịta Mpi
  • Ikwenyere Ọchịchị
  • Ndị Kraịst Mbụ Na Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Chineke na Siza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Enweghị Echiche Ọ Bụla Nke Imebi Okwukwe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Gịnị Na-eme Mmadụ Ezi Nwa Amaala?
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 5/1 p. 5-8

Iso Ụzọ Kraịst Oge Mbụ na Ọchịchị

HOUR ole na ole tupu ọnwụ ya, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu esiteghị n’ụwa, kama Mụ onwe m họpụtara unu n’ime ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.” (Jọn 15:19) Otú ọ dị, nke a ọ̀ pụtara na ndị Kraịst ga na-enwe àgwà ibu iro n’ebe ndị ọchịchị ụwa nke a nọ?

Ha Abụghị Ndị Ụwa ma Ha Adịghị Ebu Iro

Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst bi na Rom, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya.” (Ndị Rom 13:1) N’otu aka ahụ, Pita onyeozi dere, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru ịbụisi ọ bụla mmadụ debere n’ihi Onyenwe anyị; ma ọ bụ eze, dị ka onye nọ n’ike n’elu unu; ma ọ bụ ndị isi, dị ka ndị a na-ezite site n’aka ya ka ha bọọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tookwa ndị na-eme ezi ihe.” (1 Pita 2:13, 14) Ido onwe onye n’okpuru Ọchịchị na ndị nnọchiteanya ya nile a họpụtaziri ahọpụtazi bụ n’ụzọ doro anya ụkpụrụ a nakweere n’etiti ndị Kraịst oge mbụ. Ha gbalịrị ịbụ ụmụ amaala na-edebe iwu na isoro mmadụ nile biri n’udo.—Ndị Rom 12:18.

N’okpuru isiokwu bụ́ “Chọọchị na Ọchịchị,” The Encyclopedia of Religion na-ekwu, sị: “Na narị afọ atọ ndị mbụ AD e kewapụrụ chọọchị ndị Kraịst iche nke ukwuu site n’ọha mmadụ na-achị achị nke Rom . . . Ka o sina dị, ndị ndú ndị Kraịst . . . kụziri irubere iwu Rom isi na iguzosi ike n’ihe nye onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ, n’agafeghị ókè nile nke okwukwe ndị Kraịst kpara.”

Nsọpụrụ, Ọ Bụghị Ofufe

Ndị Kraịst ebughị iro megide onye ọchịchị alaeze ukwu Rom. Ha kwanyeere ikike ya ùgwù ma nye ya nsọpụrụ nke kwesịrị ọkwá ya. N’oge Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu Nero na-achị, Pita onyeozi degaara ndị Kraịst bi n’akụkụ dị iche iche nke Alaeze Ukwu Rom, sị: “Sọpụrụnụ mmadụ nile. . . . Na-asọpụrụnụ eze unu.” (1 Pita 2:17) E ji okwu ahụ bụ́ “eze” mee ihe n’ụwa nke na-asụ asụsụ Grik ọ bụghị nanị banyere eze nke obodo dị iche iche kamakwa banyere onye ọchịchị alaeze ukwu Rom. Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst bi n’isi obodo nke Alaeze Ukwu Rom ọdụ, sị: “Na-akwụghachinụ mmadụ nile ihe nile unu ji ha n’ụgwọ: . . . sọpụrụnụ onye unu ji ụgwọ nsọpụrụ.” (Ndị Rom 13:7) Onye ọchịchị alaeze ukwu Rom chọrọ n’ezie ka e nye ya nsọpụrụ. Ka oge na-aga, ọ chọrọ ọbụna ofufe. Otú ọ dị, n’ebe a ndị Kraịst oge mbụ kpebiri ihe ha na-agaghị eme.

N’oge a na-ekpe ya ikpe n’ihu onye ọchịchị Rom na narị afọ nke abụọ O.A., a kọrọ na Polycarp kwuru, sị: “Abụ m onye Kraịst. . . . A na-akụziri anyị inye onye ọ bụla nsọpụrụ ruuru ya . . . nye ndị ọchịchị na ndị nwere ịchịisi bụ́ ndị Chineke nyere ikike.” Otú ọ dị, Polycarp họọrọ ịnwụ kama ife onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ ofufe. Onye nkwado okwukwe narị afọ nke abụọ bụ́ Theophilus nke Antiọk dere, sị: “M ga-asọpụrụ onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ, ọ bụghị n’ezie ife ya ofufe, kama ikpere ya ekpere. Ma Chineke, ezi Chineke ahụ dị ndụ ka m na-efe ofufe.”

Ekpere ndị kwesịrị ekwesị maka onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ enwetụghị ihe jikọtara ya na ife onye ọchịchị alaeze ukwu ofufe ma ọ bụ ịhụ mba n’anya. Pọl onyeozi kọwara nzube ha, sị: “Ya mere ihe mbụ m na-adụsi ọdụ ike bụ, ka a na-arịọ arịrịọ, kpeekwa ekpere, rịọkwa arịrịọ a na-arịọrọ ndị ọzọ, keleekwa ekele, n’ihi mmadụ nile; n’ihi ndị eze na ndị nile nọ n’ọnọdụ dị elu; ka anyị wee biri obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile na ikwesị nsọpụrụ nile.”—1 Timoti 2:1, 2.

‘Nnọpụiche n’Ọha Mmadụ’

Àgwà nkwanye ùgwù a n’akụkụ nke ndị Kraịst oge mbụ ewetaghịrị ha ọbụbụenyi nke ụwa ha biri n’ime ya. Onye France na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ A. Hamman na-akọ na ndị Kraịst oge mbụ “na-anọpụ iche n’ọha mmadụ.” N’ezie ha nọpụrụ iche n’ọha mmadụ abụọ, nke ndị Juu na nke ndị Rom, bụrụ ndị ha abụọ kpọrọ asị ma ghọtahie n’ụzọ dị ukwuu.

Dị ka ihe atụ, mgbe ndị ndú ndị Juu boro ya ebubo ụgha, Pọl onyeozi kwuru iji gọpụ onwe ya n’ihu onye ọchịchị Rom, sị: “Emehieghị m ma ọlị megide iwu ndị Juu, ma ọ bụ imegide ụlọ ukwu Chineke, ma ọ bụ imegide Siza. . . . Ọ bụ Siza ka m na-akpọku.” (Ọrụ 25:8, 11) Ebe ọ ma na ndị Juu na-agba izu igbu ya, Pọl kpọkuru Nero, si otú a na-anakwere ikike nke onye ọchịchị alaeze ukwu Rom ahụ. N’ihi ya, n’ikpe mbụ e kpere ya na Rom, o yiri ka a tọhapụrụ Pọl. Ma e mesịrị tụọ ya mkpọrọ ọzọ, dịkwa ka ọdịnala si kwuo, e gburu ya mgbe Nero nyere iwu ya.

Banyere nguzo siri ike nke ndị Kraịst oge mbụ n’ọha mmadụ Rom, ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze nakwa ọkà mmụta okpukpe bụ́ Ernst Troeltsch dere, sị: “A gụpụrụ ọkwá na ọrụ nile nwere ihe jikọrọ ha na ikpere arụsị, ma ọ bụ ofufe nke Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu ahụ, ma ọ bụ ndị ahụ metụtara mwụfu ọbara ma ọ bụ amamikpe ogbugbu, ma ọ bụ ndị ga-etinye ndị Kraịst n’omume rụrụ arụ nke ndị na-ekpere arụsị.” Ọ̀ bụ na nguzo a enyeghị ohere ọ bụla maka mmekọrịta udo na nkwanye ùgwù n’etiti ndị Kraịst na Ọchịchị?

Ịkwụ Siza “Ụgwọ” Ya

Jisọs nyere ụkpụrụ nke ga-eduzi omume onye Kraịst n’ebe Ọchịchị Rom dị ma ọ bụ, n’ezie, gọọmenti ọ bụla ọzọ, mgbe o kwupụtara, sị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:21) Ndụmọdụ a e nyere ndị na-eso ụzọ Jisọs dị nnọọ iche n’àgwà nke ọtụtụ ndị Juu hụrụ mba ha n’anya, ndị jụrụ ọchịchị ndị Rom ma megide iwu nke ịkwụ ọchịchị mba ọzọ ụtụ isi.

Mgbe e mesịrị, Pọl gwara ndị Kraịst bi na Rom, sị: “N’ihi ya ọ dị mkpa ido onwe unu n’okpuru ya, ọ bụghị nanị n’ihi iwe ahụ, kama ọ bụkwa n’ihi akọ na uche. N’ihi na ọ bụ n’ihi nke a ka unu na-atụkwa ụtụ; n’ihi na ha [“ndị na-achị isi” na gọọmenti] bụ ndị na-efe Chineke ofufe, na-anọgidesi ike n’ọrụ ha ime otu ihe a. Na-akwụghachinụ mmadụ nile ihe nile unu ji ha n’ụgwọ: tụọnụ ụtụ nye onye unu ji ụgwọ ụtụ; tụọnụ ụtụ ahịa nye onye unu ji ụgwọ ụtụ ahịa.” (Ndị Rom 13:5-7) Ọ bụ ezie na ndị Kraịst abụghị akụkụ nke ụwa, iwu ji ha ịbụ ụmụ amaala na-akwụwa aka ha ọtọ, na-atụ ụtụ isi, na-akwụ Ọchịchị ụgwọ maka ozi ndị ha jere.—Jọn 17:16.

Ma okwu Jisọs hà jedebere n’ịtụ ụtụ isi? Ebe ọ bụ na Jisọs akọwaghị kpọmkwem ihe bụ nke Siza na ihe bụ nke Chineke, e nwere ọnọdụ ndị ga-anọ n’agbata ha abụọ nke a na-aghaghị ime mkpebi dị ka ihe gbara ya gburugburu si dị ma ọ bụ dị ka nghọta anyị nke Bible nile si dị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ikpebi ihe ndị onye Kraịst pụrụ inye Siza mgbe ụfọdụ ga-agụnye akọ na uche onye Kraịst ahụ, bụ́ nke ụkpụrụ Bible meworo ka o nwee nghọta.

Ezi Nguzo Nlezianya n’Etiti Nzọrọ Abụọ Na-asọrịta Mpi

Ọtụtụ ndị mmadụ na-echezọ na mgbe o kwusịrị na e kwesịrị inyeghachi Siza ihe ya, Jisọs gbakwụnyere, sị: “Nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” Pita onyeozi gosiri ihe ndị Kraịst ga-ebute ụzọ. Ngwa ngwa o nyesịrị ndụmọdụ ịnọ n’okpuru “eze,” ma ọ bụ onye ọchịchị alaeze ukwu, na “ndị ọchịchị” ya, Pita dere, sị: “Dị ka ndị nweere onwe ha, ma unu enweghị inwe onwe unu ahụ dị ka ihe mkpuchi nke ihe ọjọọ, kama dị ka ndị ohu nke Chineke. Sọpụrụnụ mmadụ nile. Hụnụ òtù ndị bụ ụmụnna n’anya. Na-atụnụ egwu Chineke. Na-asọpụrụnụ eze unu.” (1 Pita 2:16, 17) Onyeozi ahụ gosiri na ndị Kraịst bụ ndị ohu Chineke, ọ bụghị nke onye ọchịchị bụ́ mmadụ. Ọ bụ ezie na ha kwesịrị igosi nsọpụrụ na nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka ndị nnọchiteanya nke Ọchịchị, ha ga-eme otú ahụ n’egwu Chineke, bụ́ onye iwu ya nile kasị elu.

Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ Pita emewo ka ịka elu nke iwu Chineke n’elu nke mmadụ doo anya. Ụlọikpe Sanhedrin nke ndị Juu bụ òtù na-achị achị bụ́ nke ndị Rom nyeworo ma ikike ọchịchị ma nke okpukpe. Mgbe o nyere ndị na-eso ụzọ Jisọs iwu ịkwụsị izi ihe n’aha Kraịst, Pita na ndị ozi ndị ọzọ zaghachiri ná nkwanye ùgwù ma n’ụzọ kwụ kwem, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) N’ụzọ doro anya, ndị Kraịst oge mbụ aghaghị ịnọgide na-enwe ezi nguzo nlezianya n’etiti nrubeisi nye Chineke na ịnọ n’okpuru ndị ọchịchị bụ́ mmadụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Tertullian tinyere ya n’ụzọ dị otú a ná mmalite nke narị afọ nke atọ O.A., sị: “Ọ bụrụ na ihe nile bụ nke Siza, gịnị ga-afọdụrụ Chineke?”

Ikwenyere Ọchịchị

Ka oge na-agafe, nguzo nke ndị Kraịst narị afọ mbụ weere n’ihe metụtara Ọchịchị ji nwayọọ nwayọọ belata. Ndapụ n’ezi ofufe ahụ nke Jisọs na ndị ozi ya buru amụma ya tolitere nke ọma na narị afọ nke abụọ na nke atọ O.A. (Matiu 13:37, 38; Ọrụ 20:29, 30; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:3-12; 2 Pita 2:1-3) Iso Ụzọ Kraịst nke dapụworo n’ezi ofufe kwenyeere ụwa nke Rom, nakwere ememe ọgọ mmụọ ya na nkà ihe ọmụma ya ma nabata ọ bụghị nanị ije ozi obodo kamakwa ije ozi agha.

Prọfesọ Troeltsch dere, sị: “Site na narị afọ nke atọ gaa n’ihu ọnọdụ ahụ takwuru akpụ, n’ihi na ndị Kraịst ghọrọ ndị bara ụba n’Ọha Mmadụ ndị nọ n’ọkwá dị elu na n’ọrụ aka ndị pụtara ìhè karị, n’òtù ndị agha na n’ógbè ndị ọchịchị. N’akụkụ okwu ụfọdụ nke ihe odide ndị Kraịst [na-abụghị Bible] e nwere mkpesa dị ilu megide ikere òkè n’ihe ndị a; n’aka nke ọzọ, anyị na-ahụkwa mgbalị ikwenyere—arụmụka ndị e mere iji dajụọ akọ na uche ndị ọ na-enye nsogbu . . . Site n’oge Constantine ihe isi ike ndị a pụrụ n’anya; esemokwu n’etiti ndị Kraịst na ndị na-ekpere arụsị kwụsịrị, e meghekwara ọkwá nile dị n’Ọchịchị.”

Ka ọ na-aga ná ngwụsị nke narị afọ nke anọ O.A., ụdị Iso Ụzọ Kraịst nke a a gwagburu agwagbu, nke na-ekwenye ekwenye ghọrọ okpukpe Ọchịchị nke Alaeze Ukwu Rom.

N’ime akụkọ ihe mere eme ya nile, Krisendọm—nke Chọọchị Katọlik, Orthodox, na Protestant nọchiri anya ya—anọgidewo na-ekwenyere Ọchịchị, na-emibanye onwe ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya nile ma na-akwado ya n’agha ya nile. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ ndị òtù chọọchị nwere obi eziokwu bụ́ ndị nke a wụworo akpata oyi n’ahụ ga-enwe obi ụtọ ịmara na e nwere ndị Kraịst taa na-ejigide nguzo nke ndị Kraịst narị afọ mbụ ahụ ná mmekọrịta ha na Ọchịchị. Isiokwu abụọ ndị na-esonụ ga-atụle okwu ahụ n’ụzọ sara mbara karị.

[Foto dị na peeji nke 5]

Siza Nero, bụ́ onye Pita dere banyere ya, sị: “Sọpụrụnụ eze unu”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musei Capitolini, Roma

[Foto dị na peeji nke 6]

Polycarp họọrọ ịnwụ kama ife onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ ofufe

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị Kraịst oge mbụ bụ ụmụ amaala na-adị n’udo, na-akwụwa aka ọtọ, na-atụ ụtụ isi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya