Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
“Ụlọ Nche” nke August 15, 1996, kwuru, sị: “N’akụkụ ikpeazụ nke mkpagbu ahụ, a ga-azọpụta ‘mmadụ’ ndị gbalagara n’akụkụ Jehova.” Nke ahụ ọ̀ na-atụ aro na mgbe akụkụ nke mbụ nke mkpagbu ukwu ahụ gasịrị, ọtụtụ ndị ọhụrụ ga-abịafeta n’akụkụ Chineke?
Nke ahụ abụghị isi ihe a na-ewepụta.
Okwu Jisọs ndị dị na Matiu 24:22 ga-emezu n’ụzọ bụ isi n’ọdịnihu site ná nzọpụta gabiga akụkụ nke mbụ nke mkpagbu ukwu ahụ na-abịanụ, mwakpo a ga-awakpo okpukpe. Isiokwu ahụ kwuru, sị: “Cheta na ‘mmadụ,’ ma ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ ma ‘oké ìgwè mmadụ’ ahụ, ga-abụworị ndị a zọpụtara mgbe Babilọn Ukwu ahụ ga-ada ngwa ngwa na kpam kpam n’akụkụ mbụ nke mkpagbu ahụ.”
Ndị dị otú ahụ kwesịrị ntụkwasị obi agaghịkwa anọ n’ihe ize ndụ mgbe Jisọs na usuu ndị agha eluigwe ya mere ihe n’akụkụ ikpeazụ nke mkpagbu ahụ. Ma olee ndị ga-esi otú ahụ lanarị akụkụ ahụ nke mkpagbu ahụ? Mkpughe 7:9, 14 na-egosi na oké ìgwè mmadụ nwere olileanya elu ala ga-alanarị. Gịnị banyere ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ? “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị n’Ụlọ Nche nke August 15, 1990, tụlere ihe mere anyị na-apụghị ikwu kpọmkwem banyere mgbe a ga-akpọrọ ihe fọdụrụnụ n’ime ndị e tere mmanụ gaa n’eluigwe. Ya mere isiokwu ahụ e nwere n’oge na-adịbeghị anya (August 15, 1996) hapụrụ okwu ahụ n’akapịghị ya ọnụ, na-ekwu okwu n’akpọghị otu ihe aha, sị: “N’otu aka ahụ n’akụkụ ikpeazụ nke mkpagbu ahụ, a ga-azọpụta ‘mmadụ’ ndị gbalagara n’akụkụ Jehova.”
Banyere ma è nwere ndị ọhụrụ ọ bụla nwere ike ịmụta eziokwu ahụ ma bịafeta n’akụkụ nke Chineke mgbe mkpagbu ukwu ahụ malitesịrị, rịba ama okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Matiu 24:29-31. Mgbe mkpagbu ahụ tiwapụsịrị, ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụta ìhè. Jisọs sịrị na ebo nile nke ụwa ga-eti onwe ha aka ma kwaa arịrị. O kwughị ihe ọ bụla banyere ndị mmadụ ịghọta ihe na-emenụ, ichegharị, iguzo n’akụkụ Chineke, na ịghọ ezi ndị na-eso ụzọ.
N’otu aka ahụ, n’ilu nke atụrụ na ụmụ ewu, Nwa nke mmadụ na-apụta ìhè ma n’ụzọ ikpe kewaa ndị mmadụ ná ndabere nke ihe ha meworo ma ọ bụ nke ha na-emeghị n’oge gara aga. Jisọs ekwughị ihe ọ bụla banyere ndị gosiworo àgwà yiri nke ewu ogologo oge gara aga ichigharị na mberede ma na-eyi atụrụ. Ọ na-abịa ikpe ikpe ná ndabere nke ihe ndị mmadụ nwapụtawororị na ha bụ.—Matiu 25:31-46.
Ma, ọzọkwa, e nweghị ihe mere a ga-eji kwuo otu ihe kpọmkwem banyere isi ihe a. Ndị Chineke, ma ndị so ná ndị e tere mmanụ ma ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ, maara ihe ha na-aghaghị ime ugbu a—ime nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:19, 20; Mak 13:10) Ugbu a kpọmkwem bụ oge maka anyị iburu n’obi ndụmọdụ ahụ bụ́: “Dị ka ndị anyị na Ya na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọkwa unu ka unu ghara ịnara amara Chineke n’efu, (n’ihi na Ọ na-asị, N’oge a na-anara mmadụ nke ọma ka M nụrụ olu gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka M nyeere gị aka: lee, ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta).”—2 Ndị Kọrint 6:1, 2.