Puku Afọ Nke Dị Ebube Na-abịaru Nso
“M wee hụ ocheeze, ha wee nọkwasị ha, e wee nye ha ikpe: m wee hụ mkpụrụ obi nke ndị e bipụrụrịị isi n’ihi àmà Jisọs, na n’ihi okwu Chineke, ndị ahụ nọkwa, bụ́ ndị na-akpọghị isiala nye anụ ọhịa ahụ, ma ọ bụ ihe oyiyi ya, ndị na-anataghịkwa akara ya n’egedege ihu ha na n’aka ha; ha wee dị ndụ, sookwa Kraịst bụrụ eze [otu puku afọ].” “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya [ụmụ mmadụ]; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bu ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 20:4; 21:4.
OTÚ a ka Bible si buo amụma banyere puku afọ dị ebube nke na-abịanụ—bụ́ Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs Kraịst na otu ìgwè ndị eze nọ n’eluigwe ya na ha ga-eso chịa. Ma eleghị anya, ọ ga-amasị gị ilefuru amụma nke a anya dị ka nrọ efu, ihe na-apụghị ime eme n’ezie. Otú o sina dị, e nwere ezi ihe mere i kwesịrị iji lee Puku Afọ nke a anya dị ka ihe ga-eme eme n’ezie!
Otu ihe bụ na ọmụmụ Bible ga-ekpughere gị na o lebawo anya n’ime puku afọ isii gaworo aga nke akụkọ ihe mere eme mmadụ n’ụzọ kwesịrị nnọọ ntụkwasị obi. Ọzọkwa, Bible bụ akwụkwọ nke amụma, ihe ka ọtụtụ n’ime ịkọ ọdịnihu, ma ọ bụ amụma ndị dị na ya, emezuworị n’akụkụ ya nile.a Ebe ọ dị otú ahụ, n’ihi gịnị ka Bible na-agaghị eji kwesị ịdabere na ya mgbe ọ na-akọ ihe banyere ọchịchị Puku Afọ na-abịanụ nke Kraịst? Ma, ị pụrụ iche echiche banyere ihe Bible na-agwa anyị banyere oge ahụ. Nzube dị aṅaa ka ọ ga-emezu? Nke ga-akpalịkwa mmasị gị karị, ọ̀ ga-esi aṅaa metụta ndụ gị?
Otu Ihe Nketa nke Furu Efu
Bible na-egosi na Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst bụ ụzọ ọ ga-esi nyefee “ụmụ” ya otu ihe nketa dị oké ọnụ ahịa n’ụzọ na-enweghị atụ. Ma, ihe nketa dị aṅaa ka ọ bụ? Oleekwa “ụmụ” ndị ọ bụ? A pụrụ ịkọwa ihe nketa dị ka ihe mmadụ na-enyefe nwa ya ma ọ nwụọ. Mgbe nna anyị ochie bụ Adam gosipụtara onwe ya ịbụ onye nnupụisi n’ebe Chineke nọ, o mere ka ihe ruuru ya nke bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala funarị ya, funarịkwa ụmụ ya—bụ́ agbụrụ mmadụ nile. Adam si otú a nyefee ndị sitere n’usoro ọmụmụ ya ihe nketa nke mmehie, ọnwụ, na ịta ahụhụ.—Jenesis 3:1-19; Ndị Rom 5:12.
Jisọs bịara n’elu ala n’anụ ahụ iji nwetaghachiri ihe a kpọrọ mmadụ ihe nketa ahụ nke Adam tụfuru. O mere nke a site n’igosipụta onwe ya ịbụ onye kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova Chineke, jiri afọ ofufo chụọ ndụ ya n’àjà n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ. (Jọn 3:16) Site n’ibi ndụ zuru okè nke na-enweghị mmehie ọ bụla, Jisọs nwetara iru eru nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs elu ala—bụ́ kpọmkwem ihe ahụ Adam tụfuru. Otú ọ di, ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs jiri iru eru ahụ mee ihe; o tufughịkwa ya mgbe ọ nwụrụ, e wee kpọlite ya n’ọnwụ gaa ná ndụ n’eluigwe. Ya mere, ọ pụrụ iji ya mee ihe dị ka ihe nketa dị oké ọnụ ahịa ọ ga-enye “ụmụ” ya.—Ndị Rom 5:18, 19.
Ndị Nketa ahụ—”Ụmụ” nke Kraịst
N’Aịsaịa 9:6, a kpọrọ Jịsọs “Nna nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi” n’ụzọ amụma. Ọ na-aghọ Nna nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi nye ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ a gbapụtara agbapụta, wee nọrọ n’ọnọdụ inyefe ndị a a gbapụtara agbapụta, ma ọ bụ ndị ọ nabataworo dị ka ụmụ, ihe nketa. (Matiu 20:28; leekwa Abụ Ọma 37:18, 29.) E gosiri nke a n’ụzọ doro anya ná nkwa ya bụ: “Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa.” Ọ gakwara n’ihu ikwu, sị: “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.”—Matiu 5:5; 25:34.
Otú ọ dị, ka ụwa wee bụrụ ihe kwesịrị nketa, a ghaghị ime oké mgbanwe n’ọnọdụ nile—wee weta ya n’izu okè! Ọ ghaghị ịbụ ụwa ebe e nwere udo na ịdị n’otu zuru okè n’etiti ihe nile Chineke kere. (Aịsaịa 11:6-9) A ghaghị ikpochapụ akụkụ nile nke ezughị okè mmadụ, gụnyere ọnwụ. (1 Ndị Kọrịnt 15: 25, 26) Nke a pụtara na a ghaghị ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, ndị so n’ụmụ mmadụ a gbapụtara agbapụta. Ọ bụ nanị n’ụzọ dị otú a ka ha ga-enwe ohere nke ịghọ ndị nketa nke Kraịst!—Jọn 5:28, 29.
Otú a, Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ oge obi ụtọ, bụ́ mgbe a ga-eji nke nta nke nta ‘mee ka ha pụọ n’ịbụ ohu mmebi’ wee ruo izu okè. (Ndị Rom 8:21) Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na ọbụna ihe odide dị iche iche nke ndị ụwa matara na nke a bụ nzube nke ọchịchị puku afọ. Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary (mbipụta nke 1985) kọwara “puku afọ” dị ka “oge oké obi ụtọ ma ọ bụ nke izu okè mmadụ.”
Ihe Karịrị Ọchịchị Solomọn
A pụrụ iji Puku Afọ nke a dị ebube tụnyere ọchịchị 40 afọ Solomọn chịrị Israel oge ochie n’udo na ihe ịga nke ọma. (1 Ndị Eze 4:24, 25, 29) Mgbe eze nwanyị nke Sheba bịara ileta Eze Solomọn, ọ sịrị: “Eziokwu ka okwu ahụ bụ nke m nụrụ n’ala m banyere okwu gị nile, banyekwara amamihe gị. Ma ekweghị m okwu ahụ, ruo mgbe m bịara, anya m abụọ wee hụ ya: ma, lee, e gosighị m nkera ya: ị tụkwasịwo amamihe na ịdị mma n’akụkọ nke m nụrụ. Ndị [obi ụtọ, NW] ka ndị ikom gị bụ, ndị [obi ụtọ, NW] ka ndị ohu gị ndị a bụ, ndị na-eguzo n’ihu gị mgbe nile, ndị na-anụ amamihe gị.”—1 Ndị Eze 10:6-8.
Ọ bụrụ na udo, ihe ịga nke ọma, na amamihe nke ọchịchị 40 afọ nke Eze elu ala bụ Solomọn karịrị, ee, karịa okpukpu abụọ nke ihe eze nwanyị Sheba ahụ tụrụ anya ya, o doro anya na Ọchịchị Puku Afọ nke Eze Solomọn eluigwe ahụ ka ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-akarị ihe mmadụ pụrụ iche n’echiche! N’okwu Jisọs kwuru n’onwe ya, ọ bụ “onye ka Solomọn.” (Matiu 12:42) Gbalịa iji anya nke uche gị hụ ọnọdụ ndị kasị nwee ahụ ike, ndị kasị nwee ihe ịga nke ọma, ndị kasị dịrị n’udo, ndị kasị nwee ezi omume, ndị kasị nwee obi ụtọ, n’elu ala nke ị pụrụ ichepụta n’echiche, ọ ga-abụkwa na ị ghọtabeghị ọbụna akụkụ dị nta nke ihe Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst kwadebere maka ọdịnihu.
Ọ̀ Ga-adabakọ na Puku Afọ nke Atọ?
Ihe ndị na-eme n’ụwa kemgbe 1914 na-egosi na anyị na-ebi n’ime ‘ọgwụgwụ usoro ihe nke a.’ Jisọs gara n’ihu ikwu na ọgbọ nke e jikọtara ya na ihe omume ndị a e buru n’amụma “agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.” Ya mere, nke a ọ̀ pụtara na Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst ga-adabakọ na puku afọ nke atọ?—Matiu 24: 3-21, 34.
Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ka ha ghara ịdị na-akọ nkọ. Ọ sịrị: “Ọ bụghị ihe dịịrị unu ịma oge ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna m debere n’ike nke aka ya.” (Ọrụ 1:7) N’ihe metụtakwara kpọmkwem “ụbọchị na oge awa” mgbe ihe ndị a ga-eme, Jisọs kwuru na ọ bụ nanị Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, maara. (Matiu 24:36) Otú a, Bible adịghị akwado nke ọ bụla n’ime ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ndị amụma na òtù dị iche iche ndị na-akọ banyere ụbọchị mbibi, bụ́ ndị na-ezo aka na ọgwụgwụ ụwa ga-abịa kpọmkwem n’etiti abalị nke Anyasị ikpeazụ nke 1999 nke Ga-abọ Afọ ọhụrụ.
Otú ọ dị, ihe ndị na-eme n’ụwa n’oge a na-egosi n’ụzọ doro anya na oge ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke a gbara ọchịchịrị ‘adịwo nnọọ nso,’ na Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst “dịkwa nso.” (Ndị Rom 13:12) Kama ịnọ na-akọgharị mgbe ga-abụ kpọmkwem ụbọchị na oge awa nke a ga-eji bịa, ọ bụ oge kwesịrị ekwesị ugbu a ịnara ịhe ọmụma banyere ihe ndị Chineke chọrọ mmadụ n’aka maka nlanarị. (Jọn 17:3) N’ụzọ dị otú a, ị pụrụ ịmụta ụzọ ị ga-esi soro ná ndị ahụ Jisọs ga-asị: “Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa.” (Matiu 25:34) Ndịàmà Jehova dị njikere, ha nwekwara ike inyere gị aka iso n’etiti ndị ahụ ga-enweta ngọzi nile nke Puku Afọ ahụ dị ebube nke na-abịanụ.b
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee akwụkwọ ahụ bụ The Bible—God’s Word or Man’s?, nke ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc, bipụtara.
b Site n’idegara ndị bipụtara magazin nke a akwụkwọ, a pụrụ ime ndokwa maka ọmụmụ Bible ebe obibi nke na-agaghị efu gị ego ọ bụla.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
“Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa”