“Gosipụtanụ na Unu Bụ Ndị Dị Njikere”
1 N’amụma ukwu ya banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe a, Jizọs dọrọ aka ná ntị megide mmadụ ịdị na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa. (Mat. 24:36-39; Luk 21:34, 35) Ebe ọ bụ na oké mkpagbu ahụ pụrụ itiwapụ mgbe ọ bụla, ọ dị oké mkpa ka anyị ṅaa ntị na ndụmọdụ Jizọs bụ́: “Gosipụtanụ na unu bụ ndị dị njikere, n’ihi na n’awa unu na-echeghị na ọ gaje ịbụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Mat. 24:44) Gịnị pụrụ inyere anyị aka n’akụkụ a?
2 Imeri Nchekasị na Ihe Ndọpụ Uche: “Nchegbu nke ndụ” bụ otu n’ime ihe ize ndụ ime mmụọ ndị anyị na-aghaghị ịnọ na nche megide. (Luk 21:34) N’ala ụfọdụ, ịda ogbenye, enweghị ọrụ, na ịdị oké ọnụ ahịa nke ihe ndị e ji ebi ndụ, na-eme ka o sie ike inweta ihe ndị na-akpa mmadụ. N’ala ndị ọzọ, ịkwakọba ihe onwunwe bụ ihe a na-emekarị. Ọ bụrụ na anyị amalite ichegbubiga onwe anyị ókè banyere ihe onwunwe, anyị ga-anọ n’ihe ize ndụ nke ịghara ilekwasị anya n’ihe ndị Alaeze ahụ ga-eweta. (Mat. 6:19-24, 31-33) Nzukọ Ndị Kraịst na-enyere anyị aka ịnọgide na-elekwasị anya na ha. Ị̀ na-eme ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị ịdị na-aga nzukọ nile?—Hib. 10:24, 25.
3 N’ụwa taa, e nwere ọtụtụ ihe ndọpụ uche ndị pụrụ, n’ụzọ dị mfe, iri oge anyị ndị dị oké mkpa. Kọmputa pụrụ ịghọ ọnyà ma ọ bụrụ na mmadụ na-etinye oge dị nnọọ ukwuu n’ịchọ ihe n’Intanet, n’ịgụ nakwa n’izipụ ozi E-mail, ma ọ bụ n’igwu egwuregwu kọmputa ma ọ bụ egwuregwu ndị ọzọ. Anyị pụrụ itinye oge dị ukwuu n’ime nleta, n’ikiri telivishọn na vidio, n’inwe ntụrụndụ, n’ịgụ akwụkwọ ndị ụwa, nakwa n’igwu egwuregwu, na-eme ka anyị ghara inwe oge ma ọ bụ ike dị ukwuu maka ihe ime mmụọ. Ọ bụ ezie na ntụrụndụ pụrụ ime ka anyị nweta ume ọhụrụ ruo nwa oge, inwe ọmụmụ Bible onwe onye na nke ezinụlọ na-eweta uru na-adịru ebighị ebi. (1 Tim. 4:7, 8) Ị̀ na-azụpụta oge iji na-atụgharị uche n’Okwu Chineke kwa ụbọchị?—Efe. 5:15-17.
4 Lee ekele anyị pụrụ inwe na nzukọ Jehova emewo ndokwa maka usoro ihe omume nke inye ntụziaka ime mmụọ iji nyere anyị aka “[inwe] ihe ịga nke ọma n’ịgbanahụ ihe . . . nile a kara aka na ha ga-ewere ọnọdụ, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ”! (Luk 21:36) Ka anyị jiri ndokwa ndị a na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu ma ‘na-egosipụta na anyị bụ ndị dị njikere,’ ka okwukwe anyị wee nwee ike ịbụ “ihe na-akpata inye otuto na ịdị ebube na nsọpụrụ ná mkpughe nke Jizọs Kraịst.”—1 Pita 1:7.