Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ws isi 6 p. 47-56
  • Ịmụrụ Anya n’Oge “Ọgwụgwụ Oge A”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmụrụ Anya n’Oge “Ọgwụgwụ Oge A”
  • Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmetụta nke Ọkụ Ọwa ahụ n’Etiti Abalị
  • Ndị Enyi Na-enye Aka nke Ndị Ahụ Na-enye Ìhè
  • “E Wee Mechie Ụzọ”
  • Inye Ìhè Maka “Ọgwụgwụ Oge A”
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Ụmụ Agbọghọ Ndị Maara Ihe na Ndị Nzuzu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Jizọs Ejiri Ihe Atụ Ụmụ Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Kụzie Gbasara Ịmụrụ Anya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ị̀ Ga ‘Na-eche Nche’?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
ws isi 6 p. 47-56

Isi 6

Ịmụrụ Anya n’Oge “Ọgwụgwụ Oge A”

1. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nọrọ na nche?

ANYỊ abamiwo na mgbe “ọgwụgwụ oge a,” kama anyị “amataghị ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge hour ahụ” mgbe inye ìhè nke na-echebe ndụ ga-agwụsị. Ọ bụ n’ihi ya ka Jisọs ji kwuo, sị: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amataghị ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge hour ahụ.”​—⁠Matiu 24:3; 25:13.

2. Ahụmahụ dị aṅaa na-emechu ihu ka a ga-ezere?

2 N’ezie ọ ga-abụrụ mmadụ ihe mmechuihu ma ọ bụrụ na ọ bịarute n’ebe e nwere oriri agbamakwụkwọ n’azụ oge wee hụ na a kpọchiwo ụzọ. Ma nke ahụ bụ ihe a kara aka ga-eme ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ukwuu nke ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst n’ọdịnihu dị nso. “Onyeisi Udo” ahụ ji okwu ndị a mee ihe atụ nke a: “E mesịa ụmụ agbọghọ fọdụrụ bịakwa, na-asị, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, megheere anyị ụzọ. Ma ọ zara, sị, N’ezie asị m unu, amataghị m unu.”​—⁠Matiu 25:​11, 12.

3. (a) Oge maka gịnị ka afọ 1919 ghọrọ? (b) Ndị okpukpe Krisendọm hà enwewo ike inye mmanụ ime mmụọ ahụ dị mkpa?

3 Kemgbe 1919 inye ìhè ime mmụọ site n’aka ndị ahụ nwere uche site n’enyemaka nke “mmanụ” nke Okwu Jehova na mmụọ nsọ adịwo, ma ndị ahụ dị nzuzu na-anwa ịzụrụ mmanụ ime mmụọ site n’aka ndị ahụ nọ na Krisendọm bụ́ ndị sị na ha na-ere ya. (Matiu 25:9) Otú ọ dị, ndị okpukpe nke Krisendọm enweghị ụdị mmanụ nke bụ ezie. Ha enwebeghị ike inye ìhè banyere ọnụnọ nke Jisọs Kraịst dị ka Onye eluigwe ahụ nke Na-alụ Nwunye Ọhụrụ. Ha na-atụ anya na mgbe ha nwụrụ na ha ga-eje eluigwe ozugbo ahụ izute ya, mgbe ha na-esoghị kere òkè n’ọrụ inye ìhè ahụ na mgbe “ọgwụgwụ oge a.”

4. Ruo taa, gịnị ka ndị ahụ ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke daworo ada ime, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

4 N’aka nke ọzọ, e nwewo ndị, dị ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke n’ụzọ ime mmụọ, gosipụtara na ha nwere “mmanụ” nke mmụọ nsọ na Okwu Chineke maka ọrụ inye ìhè zuru ụwa ọnụ a ga-arụ banyere ‘alaeze ahụ’ mgbe agha gasịrị. (Matiu 24:14) Ndị ahụ ndị ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke sere onyinyo ha n’ilu Jisọs ahụ adịghị ekere òkè na ya site n’ime ka ìhè ahụ mụkwasị ozi ọma nke a nke ịdị mkpa ya zuru mba nile. Ha enweghị “mmanụ” nke Okwu Chineke na-enye ìhè na mmụọ nsọ ya, Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ nke bụ́ Onyeikpe n’ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ ghọtakwara ọdịda nke a n’akụkụ ha. Obi ha ghọrọ nke na-adịghị n’ọrụ ahụ a ga-arụ mgbe agha gasịrị, bụ́ nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ́ ndị Kraịst ndị nwere uche n’ịghọta ma oge ma ọrụ ahụ, malitere ozugbo ahụ na 1919.

5. N’ihe dị aṅaa ka ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke dara ikere òkè dị mkpa na ya maka ha ịbụ ndị e jikọrọ ha na Eze ahụ bụ́ Onye Na-alụ Nwunye Ọhụrụ?

5 N’ikewapụ onwe ha n’ebe ndị ahụ kwadoro nzukọ Jehova a na-ahụ anya nọ, ndị ahụ dị nzuzu na-ahapụ ikere òkè n’ịgba àmà zuru ụwa ọnụ nke Alaeze ahụ. N’ikpeazụ ha nwetara “mmanụ” nke inye ìhè okpukpe, mana ọ bụghị ụdị mmanụ nke bụ ezie. Ọ gajeghị inye ìhè maka ihe omume kwesịrị ekwesị n’oge kwesịrị ekwesị. Ya mere ha adịghị ekwusa ozi Alaeze ahụ na “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere.” (Aịsaịa 61:​1-⁠3) Ha adịghị anabata Eze ahụ bụ Onye Na-alụ Nwunye Ọhụrụ dị ka ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ nke òtù ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke na-eme.

Mmetụta nke Ọkụ Ọwa ahụ n’Etiti Abalị

6, 7. (a) Gịnị mere n’etiti afọ ndị 1930 nke na-atụ aro na e nwere ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke nke ga-emezu ndị òtù nke òtù nke nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ? (b) Òtù dị aṅaa nke ọ dị mkpa ka a chịkọta ugbu a ka e chere ihu n’ebe ha nọ?

6 N’etiti afọ ndị 1930, otu ihe dị mkpa weere ọnọdụ. Ihe merenụ na-atụ aro na ọnụ ọgụgụ ndị mejupụtara nwanyị ime mmụọ Kraịst na-alụ ọhụrụ ezuwo, na e nwere ọnụ ọgụgụ zuru ezu n’elu ala nke ndị na-eso ụzọ e ji mmụọ nsọ mụọ nke Onye ahụ Na-alụ Nwanyị Ọhụrụ iji mezuo ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke nwunye eluigwe ya ọ na-alụ ọhụrụ.

7 N’oge ahụ, na 1935, a malitere ilebara òtù ọzọ nke ndị yiri atụrụ na-eso ụzọ Jisọs anya. Nke a bụ òtù ahụ e meworo ka ọha mmadụ mara maka ha n’oge Agha Ụwa Mbụ ahụ. Ọ bụ na February 24, 1918, ka a gwara ndị na-ege ntị, bụ́ ndị nwere ọchịchọ ịmata ihe, ndị ọ pụrụ ịbụ na ha nọ n’obi abụọ, okwu ihu ọha ahụ isiokwu ya bụ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Pụrụ Ịbụ Na Ha Agaghị Anwụ Anwụ Ma Ọlị.” Ná mgbakọ ukwu nke Ndịàmà Jehova nwere na Washington, D.C., na 1935, a malitere ime otu ihe nke pụtara ìhè banyere ịchịkọbata ọtụtụ nde ndị a nke “atụrụ ọzọ” Kraịst n’otu “ìgwè atụrụ” e mere ka ọ dị n’otu n’okpuru Jisọs Kraịst dị ka “otu onye ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:16) E mere ka akara e jiri mara akụkụ nke a nke “atụrụ ọzọ” ahụ dị ka e buru ya n’amụma na Mkpughe 7:​9-⁠17 pụta ìhè.

8. N’okpuru ibu ọrụ dị aṅaa ka ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche batara n’ime ya na 1935, bụ́ nke ha na-atụghị anya ya?

8 Ugbu a ihe fọdụrụ nke “ìgwè atụrụ nta” ahụ batara n’okpuru ibu ọrụ nke ịmalite nchịkọta nke “oké ìgwè mmadụ” a nke “atụrụ ọzọ” ahụ. (Luk 12:32) Nke a bụ n’ihi na ọnụ ọgụgụ nke ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ ndị nwere uche, ndị dị mkpa iji mezuo nwunye Jisọs na-alụ ọhụrụ, ezuwo. Ma a kpọrọghị ụmụ agbọghọ dị otú a na-amaghị nwoke gaa eluigwe ozugbo ahụ. Ha ka ga-abụ ndị a kpọbatara n’ebe oriri ahụ nke eluigwe mgbe ha jesịrị ozi elu ala ha dị ka ndị àmà na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke ha, bụ́ Jehova. N’ihi ọrụ inye ìhè ha nke ha rụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi ruo 1935, e webara ha n’ihe ùgwù pụrụ iche nke ha na-atụghị anya ya mgbe ọ bụla tupu etiti afọ ndị 1930.

9. Gaa n’ọnụ ọgụgụ dị aṅaa ka ihe fọdụrụ n’ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche, gbanweworo ka ọ dị taa?

9 Kemgbe 1935, ihe karịrị ọkara nke otu narị afọ agabigawo, n’ime afọ ndị a kwa, ọnụ ọgụgụ nke ndị nwere uche nke òtù ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke anọwo na-ebelata. N’aka nke ọzọ, ọrụ ịgba àmà ahụ agbasawo ruo akụkụ ụwa nile, ee, ịgụnye ihe karịrị 230 ala dị iche iche. Ka ọ dị ugbu a, ọnụ ọgụgụ nke òtù ụmu agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke adawo ruo ihe na-erughị 8,000.

Ndị Enyi Na-enye Aka nke Ndị Ahụ Na-enye Ìhè

10. N’iburu ịdị ukwuu nke ọrụ ahụ n’uche, ihe fọdụrụ n’ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche, hà nwere ike iru ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ a chọrọ?

10 Ọ fọdụrụ nke nta ka ihe karịrị nde ise nke ndị nkwusa Alaeze n’ihe karịrị 75,000 ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa kpuchie ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ nke ụmụ agbọghọ ihe atụ ahụ na-amaghị nwoke. Olee otú ọnụ ọgụgụ ahụ dị nta nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ pụrụ isi lekọta ọrụ ịgba àmà ahụ n’ihe karịrị 230 ala dị iche iche ebe e nwere ọtụtụ puku ọgbakọ ndị ahụ? Ha apụghị.

11. (a) Mmata a matara “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” mere ka gịnị were ọnọdụ n’etiti ndị ahụ kwuru na ha bụ ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke? (b) Gịnị ka ndị so n’òtù “ohu ọjọọ” ahụ n’enweghị ike ịghọta n’ihi ụkọ nke ìhè ime mmụọ zuru ezu?

11 Otú ọ dị, dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, ha na-eje ozi dị ka e buworo ụzọ kwuo, n’ọkwá nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” nke Onyenwenụ ahụ, Onye Na-alụ Nwunye Ọhụrụ, hụrụ na ọ na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe ọ bịara n’ụlọ nsọ ahụ maka ikpe ikpe. Mgbe ahụ ka nkewa ahụ malitere iwere ọnọdụ n’etiti òtù ụmụ agbọghọ ihe atụ ahụ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche na ndị dị nzuzu. Ndị a gụrụ dị ka òtù “ohu ọjọọ ahụ” enweghị mmanụ nke Okwu Chineke nke na-enye ìhè na mmụọ nsọ ya n’arịa mmanụ ha iji mee ka ọwa ha na-enwu ọkụ. Otú a ha enweghị ìhè ime mmụọ zuru ezu iji mata “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke “atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị a maliteworo ịchịkọta kemgbe 1935 dị ka akụkụ nke “otu ìgwè atụrụ” ahụ.​—⁠Matiu 24:​45-⁠51.

12. Olee ndị ghọworo ndị enyi a na-apụghị ikewa ekewa nke ihe fọdụrụ ahụ nke òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ?

12 Kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ, mmezu nke amụma Jisọs maka “ọgwụgwụ oge a” bụ n’ụzọ dị ukwuu n’ihi ọrụ nke “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-arụ. Ìhè nke si n’ọwa a mụnyere ọkụ nke ihe fọdụrụ ahụ emewo ka anya nke obi ha nwee ìhè, e nyewokwara ha aka ime ka ìhè ahụ mụkwasị ndị ọzọ ka nọ n’ọchịchịrị nke ụwa nke a. (Tụlee Ndị Efesọs 1:18.) Ha enyeworo ọtụtụ nde nke ndị bi n’elu ala nke a aka ịghọta ọnụnọ nke Eze ahụ bụ́ Onye Na-alụ Nwunye Ọhụrụ ka ụbọchị ọ ga-alụ òtù zuru ezu nke nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-eru nso. Ha aghọwo ndị enyi a na-apụghị ikewapụ ekewapụ nke ihe fọdụrụ ahụ nke òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ.

13, 14. (a) Ọnọdụ obi ụtọ dị aṅaa banyere ndị enyi nke ihe fọdụrụ ahụ ka a kọwara n’ụzọ ihe atụ ná Mkpughe 7:​9, 10? (b) Mmeghachi omume dị aṅaa weere ọnọdụ ozugbo ahụ a kọwasịrị amụma ahụ?

13 Kemgbe 1935, ihe nketa nke ndị enyi ndị a nke ihe fọdụrụ ahụ nke òtù nke nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ abụrụwo nke ọṅụ. Ha na-aṅụrị ọṅụ, ọ bụghị nanị n’ihi ihe ùgwù dị ukwuu nke ihe ahụ fọdụrụ banyeworo n’ime ya, kamakwa n’ihi ihe ùgwù a gọziri agọzi nke ha onwe ha banyeworo n’ime ya site n’aka ihe fọdụrụ ahụ nke òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ.

14 E kpughere otu akụkụ akwụkwọ nsọ dị ịtụnanya nye nghọta nke ndị Jehova ná mgbakọ e nwere na 1935 na Washington, D.C., o bukwara amụma banyere ọnọdụ na-enye obi ụtọ maka “oké ìgwè mmadụ” ahụ, bụ́ ndị enyi nke ndị ahụ e tere mmanụ. Lee ha n’ebe ahụ, ka ha “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ [nke Jehova Chineke] na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ, e gbokwasịworo ha uwe mwụda dị ọcha, igu nkwụ dịkwa n’aka ha”! Lee ihe ha ji olu dara ụda na-eti ná mkpu ka ọha nụrụ: “Nzọpụta dịịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ”! (Mkpughe 7:​9, 10) Ha egosipụtaworị okwukwe n’ahụ “Nwa Atụrụ Chineke, nke na-ebupụ mmehie nke ụwa,” sitekwa na ya ha ararawo onwe ha nye Jehova Chineke, e mewokwa ha baptism ná ngosipụta nke nraranye ahụ. (Jọn 1:29) Ee, e mere 840 mmadụ n’ime ha baptism n’ụbọchị sochiri nke ha nụrụ nkọwa nke Mkpughe 7:​9-⁠17 na Friday, May 31, 1935.

15. Kemgbe ahụ, mmadụ ole ka e meworo baptism, oleekwa otú e si see onyinyo ha na Mkpughe 7:​14-⁠17?

15 Ihe karịrị nde mmadụ anọ emewo otu ihe ahụ kemgbe e nwesịrị mgbakọ Washington ahụ na 1935. Otú a e sere onyinyo ha dị ka ndị na-eyikwasị uwe mwụda dị ọcha n’ihi ịbụ ndị sara ha n’ọbara nke na-eme ka ihe dị ọcha nke Nwa Atụrụ ahụ. Ha nwekwara olileanya nke isi n’ime mkpagbu ukwu ahụ pụta bụ́ nke na-eche ụwa dum nke ihe a kpọrọ mmadụ ihu, na-enwe nchebe nke Chineke n’oge nile ahụ nke mkpagbu ukwu ahụ. (Matiu 24:​21, 22) N’ihi ya, e gosiri ha dị ka ndị nọ n’ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova, na-efekwa ya n’ebe ahụ ha na ihe fọdụrụ ahụ nke òtù ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke.​—⁠Mkpughe 7:​14-⁠17.

16. Mgbe ahụ, olee ndị ka a na-enye ekele dị ukwuu n’ihi òkè ha na-ekere n’ihe banyere mmezu nke Matiu 24:14?

16 N’ihi ya, ekele dị ukwuu dịrị “oké ìgwè mmadụ” ahụ si mba nile, ndị nwekwara asụsụ dị iche iche, n’ihi òkè dị ukwuu ha kerewooro n’imezu amụma nke Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ na Matiu 24:14!

“E Wee Mechie Ụzọ”

17. (a) Olee mgbe a ga-emechi ọnụ ụzọ ebe oriri agbamakwụkwọ ahụ? (b) Gịnị ka ọ dị mkpa ka ihe fọdụrụ n’òtù nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke na “oké ìgwè mmadụ” nke ndị enyi ha mee ugbu a?

17 Kpọmkwem mgbe ihe fọdụrụ nke ndị òtù ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-abanyeworị n’ememe oriri agbamakwụkwọ ahụ, e wee mechiekwa ụzọ, bụ nke a na-amaghị. Ma n’ụzọ a na-apụghị ịrụ ụka, ọ dị nso karịa otú ọ dịworo ná mgbe ọ bụla ọzọ, oge na-agwụkwa agwụ! Mgbe ahụ, o kwesịrị ekwesị na Jisọs ji okwu ịdọ aka ná ntị bụ́: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amataghị ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge hour ahụ,” mechie ilu nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke.​—⁠Matiu 25:13.

18. (a) Olee ndị ka ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke gosiworo onwe ha ịbụ? (b) Akụkụ dị aṅaa nke ilu Jisọs ka oge ya ruru ha inwe ahụmahụ ya n’isi nso?

18 N’ihi nke a ihe ga-abịakwasị ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke na mberede mgbe ha na-anọghị ná nche. Site na ha ikewara pụọ n’ebe ụmụ aghọghọ ahụ na-amaghị nwoke, bụ́ ndị nwere uche nọ ma gawara onwe ha, ha aghọwo akụkụ nke ụwa nke a mbibi na-eche ihu, wee dịnyere ndị okpukpe ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ n’ime ọchịchịrị na-ejiwanye nji nke zuru ụwa ọnụ. Otú a ọ bụwo ihe a kara aka na ha ga-enwe ahụmahụ nke ihe ahụ Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ bụ Jisọs Kraịst gosipụtara n’okwu ndị a nke ilu ahụ: “E mesịa ụmụ agbọghọ fọdụrụ bịakwa, na-asị, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, megheere anyị ụzọ. Ma ọ zara, sị, N’ezie asị m unu, amataghị m unu.”​—⁠Matiu 25:​10-⁠12.

19. N’ihi ya olee ndị ka ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke sere onyinyo ha, oleekwa ihe mere a ga-eji gụnye ha n’akụkụ nke Babilọn Ukwu ahụ?

19 Ya mere a gajeghị imeghere ụmụ agbọghọ nzuzu ndị ahụ na-amaghị nwoke ọnụ ụzọ e si aba n’oriri ahụ. Ha sere nnọọ onyinyo nke ndị ahụ na-agaghị aba ‘n’alaeze eluigwe’ ‘n’ọgwụgwụ oge a.’ (Matiu 24:3; 25:1) N’ihi ijigide ụdị okpukpe nke ha họọrọ, dị ka e gosiri site na ha ịga n’ahịa ịzụrụ mmanụ ọzọ, ha nọ n’akụkụ nke Babilọn Ukwu ahụ.

20. (a) Mgbe ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ na-amaghị nwoke hụrụ ka “mpì iri” nke “anụ ọhịa” ahụ malitere ịtụgharị megide Babilọn Ukwu ahụ, ònye ka ha ga-arịọ biko, ọ̀ bụkwa ná nzọrọ nke ihe dị aṅaa? (b) N’ihi gịnị ka ha ga-eji zute mbibi n’agbanyeghị nke ahụ?

20 Dị ka ihe ga-esi n’ime ya pụta, mgbe “anụ ọhịa” ihe atụ ahụ, bụ́ nke nwanyị okpukpe ahụ na-akwa iko na-anọkwasị n’elu ya, “ji mpì iri” ya tụgharịa megide ya, ha ga-ekere òkè n’ihe ga-abịakwasị ya. (Mkpughe 17:16) Mgbe ndị okpukpe dị otú ahụ bụ́ ndị ụmụ agbọghọ nzuzu ise ahụ na-amaghị nwoke sere onyinyo ha, hụrụ mmalite nke a nke ọjụjụ nke ikike dị iche iche dị ike nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ga-ajụ okpukpe nke Babilọn, ha ga-echigharịkwuru Eze ahụ bụ Onye Na-alụ Nwunye Ọhụrụ, na-ekwu na ha so n’òtù nke “alaeze eluigwe,” bụrụkwa ndị kwesịrị ka a kpọbata ha n’oriri agbamakwụkwọ ime mmụọ ahụ, ha na ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche. N’ụzọ na-eju anya, onye ahụ ha na-akpọ “Onyenwe anyị,” Onye ahụ Na-alụ Nwunye Ọhụrụ bụ́ Jisọs Kraịst, ga-ajụ ịnabata ha dị ka ndị kwesịrị ka a kpọbata ha n’Alaeze eluigwe. Ọ dịghịkwa mgbe ha sooro “oké ìgwè mmadụ” ahụ nwee olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala. Ya mere, ọ dịghị ihe fọdụụrụ ndị okpukpe ndị a dị nzuzu ma ọ́ bụghị mbibi a ga-ebibi ha na alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ!

21. (a) N’iburu n’uche ọdịnihu ahụ na-atụ egwu, ụzọ dị aṅaa ka ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị nwere uche na ndị enyi ha na-agbaso? (b) Ihe ùgwù ije ozi ndị dị aṅaa ka ndị òtù nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ nwere olileanya inweta?

21 Lee olileanya na-atụ egwu ọ bụ nye ha! N’ịmata nke a, ihe ahụ fọdụrụ na ìgwè ndị enyi ha ga na-aṅa ntị n’okwu ndụmọdụ Jisọs mgbe nile ka ha ‘nọrọ na nche.’ Mgbe nile ha ga-ejupụta na mmụọ nsọ nke Chineke ma na-eme ka ìhè ahụ na-enwu n’atụghị egwu, maka otuto nke Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Dị ka ụgwọ ọrụ, ọṅụ bụ òkè ha e ji n’aka! Ọkwá nke ịbụ ndị isi ‘n’ụwa ọhụrụ’ ahụ na-echere ndị òtù nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ, dị ka Eze ahụ Onye Lụrụ Nwunye Ọhụrụ gosiri.​—⁠Aịsaịa 32:1; tụlee Abụ Ọma 45:16.

22. (a) Mmezu nke ilu nke ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ ihe nkwado nke eziokwu dị aṅaa? (b) Olee ndị ga-enwe ọṅụ n’ihi alụmdi na nwunye nke a nke Eze ahụ bụ́ Onye Na-alụ Nwunye Ọhụrụ na nwa agbọghọ ya na-amaghị nwoke nke ọ na-alụ ọhụrụ?

22 Ya mere mmezu nke a gbatịpụrụ agbatịpụ nke ilu nke ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke na-eje ozi dị ka ihe na-akwado eziokwu ahụ bụ́ na anyị na-ebi ndụ ná mgbe ‘ọgwụgwụ ihe nile.’ Lee ka anyị pụrụ isi nwee ekele na e mewo ka anyị nwee ìhè iji hụta ihe àmà nke a nke ịdị nso nke alụmdi na nwunye nke Jisọs Kraịst na ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke òtù nke nwanyị ya ọ na-alụ ọhụrụ! Ma eluigwe ma “ụwa ọhụrụ” nke ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ a na-apụghị iji ọnụ kọọ n’ihi alụmdi na nwunye nke a ga-ewere ọnọdụ n’eluigwe.​—⁠Mkpughe 19:​6-⁠9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya