Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 10/15 p. 16-21
  • Ị̀ Na-ezi Ihe Dị Ka Jisọs Ziri?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-ezi Ihe Dị Ka Jisọs Ziri?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozizi Ya Ruru n’Obi
  • Jisọs Kwenyere Ekwenye Mgbe Ịhụnanya Chọrọ Ya
  • Ịghọ “Nwa nke Iwu Ahụ”
  • Jisọs Na-ahụ Ụmụaka n’Anya ma Na-aghọta Ha
  • “Oge Awa Abịawo!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Jizọs Kraịst—Onye Ozi Ala Ọzọ Kasịnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Jizọs Ekpughee “Amamihe Sitere na Chineke”
    Bịaruo Jehova Nso
  • “M Na-esetịpụrụ Unu Ụkpụrụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 10/15 p. 16-21

Ị̀ Na-ezi Ihe Dị Ka Jisọs Ziri?

“Ibobo ozizi Ya nwụrụ ìgwè mmadụ nile n’ahụ: n’ihi na Ọ na-ezi ha ihe dị ka O nwere ike ọ bụghịkwa dị ka ndị odeakwụkwọ ha.”​—⁠MATIU 7:​28, 29.

1. Olè ndị soro Jisọs n’azụ mgbe o ziri ihe na Galili, gịnịkwa bụ mmeghachi omume Jisọs?

EBE ọ bụla Jisọs gara, ìgwè mmadụ ahụ na-enuga n’ebe ọ nọ. “Jisọs wee na-ejegharị na Galili dum, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ nile ha, na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ, na-agwọkwa ọrịa nile dị iche iche na nrịarịa nile dị iche iche n’etiti ndị ahụ.” Ka akụkọ ọrụ ya gbasara, “ọtụtụ ìgwè mmadụ wee si na Galili na Dekapọlis na Jerusalem na Judia na n’ofè Jọdan so Ya.” (Matiu 4:​23, 25) Mgbe ọ hụrụ ha, “o nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” Ka ọ na-ezi ihe, ha pụrụ ịhụ ọmịiko ma ọ bụ ịhụnanya dị nro o nwere maka ha; o yiri mmanụ dị nro n’ọnyá ha nke dọtara ha nso n’ebe ọ nọ.​—⁠Matiu 9:​35, 36.

2. Tinyere ọrụ ebube Jisọs, gịnị dọọrọ ìgwè mmadụ dị ukwuu?

2 Lee ọgwụgwọ elu ahụ n’ụzọ ọrụ ebube nke Jisọs rụrụ​—⁠na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri nụ ihe, ndị ìsì hụ ụzọ, ndị ngwụrọ gaa ije, ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na oké ngosipụta nke ike Jehova ndị a na-arụ ọrụ site na Jisọs ga-adọta ìgwè mmadụ n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu! Ma ọrụ ebube ndị ahụ abụghị nanị ihe ndị dọọrọ ha; ìgwè mmadụ dị ukwuu bịakwara maka ọgwụgwọ ime mmụọ nke e nyere mgbe Jisọs na-ezi ihe. Dị ka ihe atụ, rịba ama nzaghachi ha mgbe ha nụsịrị Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama: “Mgbe Jisọs kwubiri okwu ndị a, ibobo ozizi Ya nwụrụ ìgwè mmadụ nile n’ahụ: n’ihi na Ọ na-ezi ha ihe dị ka O nwere ike ọ bụghịkwa dị ka ndị odeakwụkwọ ha.” (Matiu 7:​28, 29) Ndị rabaị ha na-ehota omenala si n’aka fere n’aka nke ndị rabaị oge ochie iji kwadoo ozizi ha. Jisọs ji ikike sitere n’ebe Chineke nọ zie ha ihe: “Mụ onwe m na-ekwu, dị ka Nna m gwaworo m okwu, otú a ka M na-ekwu.”​—⁠Jọn 12:50.

Ozizi Ya Ruru n’Obi

3. Olee otú ụzọ Jisọs si zie ozi ya si dị iche na nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii?

3 Ọdịiche dị n’etiti ozizi Jisọs na nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii abụghị nanị ihe ọ na-ezi​—⁠eziokwu sitere n’aka Chineke nke dị iche n’omenala dị arọ nke ụmụ mmadụ nke si n’aka fere n’aka⁠—​kamakwa ụzọ e si zie ya. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii dị okomoko ma nwee obi ọjọọ, jiri mpako na-achọ utu aha na-ebuli mmadụ elu ma jiri nleda anya na-emeso ìgwè mmadụ ahụ dị ka ‘ndị a bụrụ ọnụ.’ Otú ọ dị, Jisọs dị umeala, nwayọọ n’obi, obi ọma, ọmịiko, ma mgbe mgbe na-ekwenye ekwenye, ọ bụkwa onye ọmịiko o nwere n’ebe ha nọ kpaliri. Jisọs ejighị nanị okwu ndị ziri ezi zie ihe kamakwa o ji okwu ndị na-adọrọ mmasị nke si ya n’obi, nke gara kpọmkwem n’obi ndị na-aṅa ya ntị. Ozi ya na-enye ọṅụ dọtara ndị mmadụ n’ebe ọ nọ, kpọta ha n’oge n’ụlọ nsọ ahụ ịṅa ya ntị, meekwa ka ha rapara n’ebe ọ nọ ma were obi ụtọ nụrụ okwu ya. Ha pụtara n’ụba ịṅa ya ntị, na-ekwupụta, sị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla mmadụ kwuru okwu dị otú a.”​—⁠Jọn 7:​46-⁠49; Mak 12:37; Luk 4:22; 19:48; 21:38.

4. Gịnị ná nkwusa Jisọs karịsịa dọọrọ mmasị nke ọtụtụ ndị mmadụ?

4 N’ezie, otu n’ime ihe mere ndị mmadụ ji nwee mmasị n’ozizi ya bụ ojiji o ji ihe atụ dị iche iche na-eme ihe. Jisọs hụrụ ihe ndị ọzọ hụrụ, ma o chere banyere ihe ndị na-abatatụbeghị ha n’uche ma ọlị. Urodi ndị na-eto n’ubi, nnụnụ ndị na-akpa àkwụ́ ha, ndị mmadụ na-agha mkpụrụ, ndị ọzụzụ atụrụ na-akpọbata atụrụ furu efu, ndị inyom na-adụkwasị iberibe ákwà n’uwe ochie, ụmụaka na-egwuri egwu n’ọma ahịa, ndị na-akụ azụ na-awụnye ụgbụ ha n’ime mmiri​—⁠ihe ndị a na-ahụkarị bụ́ ndị onye ọ bụla hụrụ⁠—​abụghị ihe nkịtị n’anya Jisọs ma ọlị. Ebe ọ bụla o lere anya, ọ hụrụ ihe ọ pụrụ iji mee ihe atụ Chineke na Alaeze Ya ma ọ bụ ikwu otu ọkpụrụkpụ ihe banyere ọha mmadụ gbara ya gburugburu.

5. Na gịnị ka Jisọs dabeere ihe atụ ya dị iche iche, gịnịkwa mere ka ilu ya dị irè?

5 Ihe atụ Jisọs dị iche iche dabeere n’ihe na-adị kwa ụbọchị ndị ndị mmadụ hụworo ọtụtụ ugbo, mgbe e jikwa eziokwu jikọọ ihe ndị a a ma ama, a na-akụnye ha ngwa ngwa na n’ụzọ dị omimi n’ime uche nke ndị na-ege ya ntị. Ụdị eziokwu ndị ahụ abụghị nke a na-anụ nanị ọnụnụ; a na-eji anya nke uche hụ ha ma cheta ha n’ụzọ dị mfe mgbe e mesịrị. E ji ịdị mfe mara ilu dị iche iche nke Jisọs, ọ bụghị ihe e ji ihe ndi na-adịghị mkpa mee ka ọ dị mgbagwoju anya nke pụrụ igbochi na ịdọla nghọta ha nke eziokwu azụ. Dị ka ihe atụ, tụlee ilu nke onye Sameria bụ́ onye agbata obi. Ị na-ahụ n’ụzọ doro anya ihe ezi onye agbata obi bụ. (Luk 10:​29-⁠37) Mgbe ahụ e nwekwara nke banyere ụmụ ndị ikom abụọ​—⁠otu kwuru na ya ga-arụ ọrụ n’ubi vine ma ọ rụghị, nke ọzọ kwuru na ya agaghị arụ ma mesịa rụọ. Ị na-ahụ ngwa ngwa ihe isi ihe nke ezi nrubeisi bụ​—⁠ịrụ ọrụ ahụ e kenyere. (Matiu 21:​28-⁠31) E nweghị uche na-ero ụra ma ọ bụ nke kpafuru akpafu n’oge ozizi na-akpali akpali nke Jisọs. Ha ji ọrụ n’aka nke ukwuu ma n’ige ntị ma n’ịhụ ihe.

Jisọs Kwenyere Ekwenye Mgbe Ịhụnanya Chọrọ Ya

6. Olee mgbe inwe ezi uche, ma ọ bụ ịdị na-ekwenye ekwenye, na-enye aka karịsịa?

6 Ọtụtụ oge mgbe Bible na-ekwu banyere inwe ezi uche, ntụaka ala ala peji na-egosi na ọ pụtara ịdị na-ekwenye ekwenye. Amamihe nke si n’aka Chineke na-ekwenye ekwenye mgbe e nwere ọnọdụ ndị a pụrụ ịgọpụrụ. Anyị kwesịrị inwe ezi uche, ma ọ bụ na-ekwenye ekwenye, mgbe ụfọdụ. Ndị okenye kwesịrị ịdị njikere ịdị na-ekwenye ekwenye mgbe ịhụnanya chọrọ ya, nchegharị enyekwa ihe mgbakwasị ụkwụ maka ya. (1 Timoti 3:3; Jemes 3:17) Jisọs hapụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya nke ikwenye ekwenye, inye ihe ndị a na-agaghị agụrụ iwu nye iwu ndị metụtara ihe nile mgbe ebere ma ọ bụ ọmịiko chọrọ ya.

7. Gịnị bụ ụfọdụ ihe atụ nke Jisọs ịbụ onye na-ekwenye ekwenye?

7 Jisọs kwuru n’otu mgbe, sị: “Onye ọ bụla nke ga-agọnarị m n’ihu mmadụ, ya ka Mụ onwe m ga-agọnarịkwa n’ihu Nna m Nke bi n’eluigwe.” Ma ọ jụghị Pita, ọ bụ ezie na Pita gọnarịrị ya ugboro atọ. E nwere ọnọdụ ndị a pụrụ ịgọpụrụ, ndị o doro anya na Jisọs chebaara echiche. (Matiu 10:33; Luk 22:​54-⁠62) E nwekwara ọnọdụ ndị a pụrụ ịgọpụrụ mgbe nwanyị ahụ na-adịghị ọcha site n’oruru ọbara mebiri Iwu Mosis site n’ịbata n’etiti ìgwè mmadụ ahụ. Jisọs amaghịkwa ya ikpe. Ọ ghọtara oké mkpa o nwere. (Mak 1:40-⁠42; 5:25-⁠34; leekwa Luk 5:​12, 13.) Jisọs agwaworị ndị ozi ya ka ha ghara ime ka a mara ya dị ka Mesaịa ahụ, ma ọ rapagideghị n’ụkpụrụ a n’ụzọ siri oké ike mgbe o mere ka a mata ya onwe ya dị ka Mesaịa ahụ nye otu nwanyị Sameria n’olulu mmiri ahụ. (Matiu 16:20; Jọn 4:​25, 26) N’ọnọdụ ndị a nile, ịhụnanya, ebere, na ọmịiko mere ka ikwenye ekwenye nke a bụrụ ihe kwesịrị ekwesị.​—⁠Jemes 2:13.

8. Olee mgbe ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-agbanwe ụkpụrụ, oleekwa mgbe ha na-agaghị eme otú ahụ?

8 Ọ dị iche n’ebe ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-adịghị nro nọ. Nye ha, ha ga-emebi omenala ha nke Ụbọchị Izu Ike iji duje oké ehi ha na mmiri. Ma ọ bụ ọ bụrụ na oké ehi ha ma ọ bụ nwa ha danyere n’ime olulu mmiri, ha ga-emebi Ụbọchị Izu Ike iji kupụta ya. Ma nye ndị nkịtị, ha agaghị ekwenye ma ọlị! Ha “achọghị iji otu mkpịsị aka ha wezụga [ihe ndị ahụ iwu chọrọ].” (Matiu 23:4; Luk 14:5) Nye Jisọs, ndị mmadụ dị mkpa karịa ihe ka ọtụtụ n’ime ụkpụrụ dị iche iche; nye ndị Farisii, ụkpụrụ dị iche iche dị mkpa karịa ndị mmadụ.

Ịghọ “Nwa nke Iwu Ahụ”

9, 10. Mgbe ha bịaghachiri Jerusalem, ebee ka nne na nna Jisọs chọtara ya, gịnịkwa bụ ihe dị mkpa n’ịjụ ajụjụ nke Jisọs?

9 Ụfọdụ na-akwa arịrị na e nwere nanị otu ihe omume n’oge nwata Jisọs nke e mere ndekọ ya. Ma ọtụtụ anaghị aghọta oké ịdị mkpa nke ihe omume ahụ. A kọọrọ anyị ya na Luk 2:​46, 47, sị: “Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha hụ Ya n’ụlọ Chineke, ka Ọ nọdụrụ n’etiti ndị ozizi, na-anụ okwu ha, na-ajụkwa ha ajụjụ: ibobo nghọta Ya na ọzịza nile Ya wee nwụọ ndị nile nụrụ okwu Ya n’ahụ.” Akwụkwọ Kittel dere bụ́ Theological Dictionary of the New Testament na-ewelite echiche nke bụ na n’ọnọdụ nke a okwu Grik maka ‘ịjụ ajụjụ’ abụghị nanị ọchịchọ ịmata ihe nke nwata. Okwu ahụ pụrụ izo aka n’ịjụ ajụjụ e ji eme ihe ná ntụle okwu ikpe, nchọpụta ihe, ịgba ajụjụ megide, ọbụna “ajụjụ nnyocha na ndị dị aghụghọ nke ndị Farisii na ndị Sadusii,” dị ka ndị ahụ e kwuru okwu ha na Mak 10:2 na 12:​18-⁠23.

10 Otu akwụkwọ ọkọwa okwu ahụ gara n’ihu, sị: “N’ihi otú a e si jiri ya na-eme ihe a pụrụ ịjụ ma . . . [Luk] 2:46 ọ̀ pụtara, ọ bụchaghị ajụjụ ọchịchọ ịmata ihe nke nwa okorobịa ahụ, kama nke arụmụka Ya gara nke ọma. [Amaokwu] nke 47 ga-adaba nnọọ nke ọma n’echiche nke ikpeazụ.”a Nsụgharị Rotherham nke amaokwu nke 47 gosiri ya dị ka nsọrịta isi mere ihe nkiri: “Ugbu a ndị nile nụrụ ihe o kwuru nwere oké mkpali, n’ihi nghọta ya na azịza ya.” Word Pictures in the New Testament nke Robertson sịrị na ijuanya ha nọgidere na-enwe pụtara na “ha nwere oké mkpali dị ka a ga-asị na anya ha na-agbapụta agbapụta.”

11. Gịnị bụ mmeghachi omume Meri na Josef nye ihe ha hụrụ ma nụ, gịnịkwa ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu nke nkà mmụta okpukpe na-atụ aro ya?

11 Mgbe nne na nna Jisọs mesịrị bịa n’ebe ihe ahụ na-akpọtụ, “ibobo wee nwụọ ha n’ahụ.” (Luk 2:48) Robertson sịrị na okwu Grik dị n’okwu a pụtara “ịkụchapụ, iji ọkpọ kụpụta.” Ọ gbakwụnyere na “a kụchapụrụ” Josef na Meri site n’ihe ha hụrụ ma nụ. N’otu echiche, Jisọs abụworị onye ozizi dị ịtụnanya. Nakwa n’ihi ihe a mere n’ime ụlọ nsọ, akwụkwọ ahụ Kittel dere na-eme nzọrọ na “Jisọs amaliteworị nsọrịta mpi ahụ na nwata Ya, bụ́ nke ndị iro Ya ga-achịli aka elu n’ikpeazụ na ya.”

12. Gịnị ka e ji amata mgbanwerịta okwu nke Jisọs na ndị ndú okpukpe?

12 Ha chịlikwara aka elu! Ọtụtụ afọ mgbe nke a gasịrị, ọ bụ site n’ịgba ajụjụ dị otú ahụ ka Jisọs ji merie ndị Farisii ruo mgbe ha na-enweghị “anya ike site n’ụbọchị ahụ ịjụ Ya ajụjụ ọzọ.” (Matiu 22:​41-⁠46) E sikwa otú ahụ mechie ndị Sadusii ọnụ n’ihe banyere mbilite n’ọnwụ, ‘ha enweghịkwa anya ike ọzọ ịjụ Ya ajụjụ ọ bụla.’ (Luk 20:​27-⁠40) Ndị odeakwụkwọ emeghị nke ọma karị. Mgbe otu onye n’ime ha na Jisọs gbanwetarịsịrị okwu, “ọ dịghị onye nwere anya ike site na mgbe ahụ ịjụ Ya ajụjụ.”​—⁠Mak 12:​28-⁠34.

13. Gịnị bụ ihe mere ka ihe omume ahụ weere ọnọdụ n’ụlọ nsọ bụrụ ihe dị mkpa ná ndụ Jisọs, gịnị ọzọkwa ka ọ na-eme ka a mata?

13 N’ihi gịnị ka e ji họrọ ịkọ ihe omume nke a metụtara Jisọs na ndị ozizi nọ n’ụlọ nsọ ahụ site n’oge nwata ya? Ọ bụ oge oké mgbanwe ná ndụ nke Jisọs. Mgbe ọ gbara afọ 12, ọ ghọrọ ihe ndị Juu ga-akpọ “nwa nke iwu ahụ,” onye nwere ibu ọrụ nke imezu ihe nile dị n’ime ya. Mgbe Meri kpesaara Jisọs banyere obi ụfụ ọ kpatawooro ya na Josef, nzaghachi nwa ya nwoke gosiri na o yiri ka Jisọs ghọtara ọdịdị ọrụ ebube nke ọmụmụ ya na ọdịnihu Mesaịa ya. E gosiri nke ahụ site na ya ikwu na kpọmkwem, Chineke bụ Nna ya: “Gịnị mere unu na-achọ m? ùnu amataghị na aghaghị m ịdị n’ihe nke Nna m?” Dị ka ihe ndabara, ndị a bụ okwu ndị mbụ sitere n’ọnụ Jisọs nke anyị nwere nke e mere ihe ndekọ ya n’ime Bible, ha na-egosi na ọ maara nzube Jehova maka ya ịbụ onye e zitere n’ụwa. Otú a, ihe omume a nile bụ nke dị oké ịrịba ama.​—⁠Luk 2:​48, 49.

Jisọs Na-ahụ Ụmụaka n’Anya ma Na-aghọta Ha

14. Isi ihe ndị na-adọrọ mmasị dị aṅaa ka akụkọ nke Jisọs na-eto eto nọ n’ime ụlọ nsọ pụrụ ime ka ndị na-eto eto mara?

14 Akụkọ a kwesịrị ịbụ ihe na-akpali akpali karịsịa nye ndị na-eto eto. Ọ na-egosi otú Jisọs na-aghaghị ijilarị ịdị uchu mụọ ihe ka ọ na-etoru ogo mmadụ. Ndị rabaị nọ n’ụlọ nsọ ahụ tụrụ egwu n’amamihe nke “nwa nke iwu” nke a gbara afọ 12. Ma ọ ka so Josef na-arụkọ ọrụ n’ebe a na-akwa nkà, “nọdụ n’okpuru” ya na Meri, ma na-eto “n’amara n’ebe Chineke na mmadụ nọ.”​—⁠Luk 2:​51, 52.

15. Olee otú Jisọs si kwadoo ndị na-eto eto n’oge ije ozi elu ala ya, gịnịkwa ka nke a pụtara nye ndị na-eto eto taa?

15 Jisọs kwadoro nnọọ ndị na-eto eto n’oge ozi elu ala ya: “Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ hụrụ ọrụ ebube nile Ọ rụrụ, na ụmụaka ndị na-eti mkpu n’ụlọ ukwu Chineke, sị, Hosanna dịrị Nwa Devid; iwe were ha nke ukwuu, ha sị Ya, Ị̀ na-anụ okwu ụmụ ndị a na-ekwu? Jisọs wee sị ha, Ee: Ọ̀ dịghị mgbe ọ bụla unu gụrụ, I si n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara mee ka ọjịja zuo okè?” (Matiu 21:​15, 16; Abụ Ọma 8:2) Otú ahụkwa ka ọ na-akwado ọtụtụ narị puku nke ndị na-eto eto taa, bụ́ ndị na-edebe ikwesị ntụkwasị obi ha ma na-enye otuto, ụfọdụ n’ime ha ọbụna atụfuwo ndụ ha n’ime otú ahụ!

16. (a) Ihe mmụta dị aṅaa ka Jisọs ziri ndị ozi ya site n’iguzobe otu nwatakịrị n’etiti ha? (b) N’oge siri nnọọ ike dị aṅaa ná ndụ Jisọs ka ọ ka nwekwara ohere maka ụmụaka?

16 Mgbe ndị ozi ya rụrịtara ụka banyere onye nke kasị elu, Jisọs gwara mmadụ 12 ahụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-achọ ka ọ bụrụ onye isi, ọ ga-abụ onye ikpeazụ n’etiti unu nile, na onye na-ejere unu nile ozi. O wee kuru nwatakịrị, debe ya n’etiti ha: mgbe O kusịịrị ya n’aka Ya, Ọ sị ha, Onye ọ bụla nke ga-anara otu n’ime ụmụntakịrị dị otú a n’aha m nke ọma, ọ bụ Mụ onwe m ka Ọ na-anara nke ọma: onye ọ bụla nke na-anarakwa Mụ nke ọma, ọ bụghị Mụ ka ọ na-anara nke ọma, kama ọ bụ Onye zitere m.” (Mak 9:​35-⁠37) Ọzọkwa, mgbe ọ na-etinye isi na Jerusalem na nke ikpeazụ ya, iche oké nhụsianya na ọnwụ ihu, o wepụtara oge maka ụmụaka: “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu egbochila ha: n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú a.” Mgbe ahụ O wee “kuru ha n’aka Ya, bikwasị ha aka Ya abụọ, wee gọzie ha nke ọma.”​—⁠Mak 10:​13-⁠16.

17. N’ihi gịnị ka o ji dịrị Jisọs mfe iso ụmụaka kparịta, gịnịkwa ka ụmụaka na-aghaghị icheta banyere ya?

17 Jisọs maara ihe ọ pụtara ịbụ nwata n’ime ụwa ndị bụ okenye. Ya na ndị okenye bikọrọ, soro ha rụkọọ ọrụ, nwee ahụmahụ ịnọ n’okpuru ha, ma nweekwa mmetụta nke ahụ ikpo ọkụ, ịnọ ná ntụkwasị obi nke ịbụ onye ha hụrụ n’anya. Ndị bụ ụmụaka, otu Jisọs nke a bụ enyi unu; ọ nwụrụ n’ihi unu, unu ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ọ bụrụ na unu erubere iwu ya nile isi.​—⁠Jọn 15:​13, 14.

18. Echiche na-akpali akpali dị aṅaa ka anyị kwesịrị iburu n’uche, karịsịa n’oge nke nchekasị ma ọ bụ oké ihe ize ndụ?

18 Ime dị ka Jisọs nyere n’iwu esighị ike dị ka ọ pụrụ iyi. Ndị na-eto eto, ọ dị njikere ịkwado unu nakwa onye ọ bụla ọzọ, dị ka anyị na-agụ na Matiu 11:​28-⁠30, sị: “Bịakutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu [ma ọ bụ “Soronụ m banye n’okpuru yoke m,” ntụaka ala ala peji, NW], mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” Cheedị nnọọ echiche, ka ị na-aga ije ná ndụ na-ejere Jehova ozi, Jisọs na-aga n’akụkụ gị, na-eme ka yoke ahụ ghara ịdị na-egbu mgbu, na-emekwa ka ibu ahụ dị mfe. Nke ahụ bụ echiche na-akpali akpali nye anyị nile!

19. Ajụjụ ndị dị aṅaa banyere ụzọ Jisọs si ezi ihe ka anyị pụrụ ịtụleghachi site n’oge ruo n’oge?

19 Mgbe anyị tụleghachisịrị nanị ụzọ ole na ole Jisọs si zie ihe, ànyị na-achọta na anyị na-ezi ihe dị ka o ziri? Mgbe anyị hụrụ ndị ọrịa n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ ndị a kwụrụ agụụ n’ụzọ ime mmụọ, ànyị na-abụ ndị ọmịiko na-akwali ime ihe anyị pụrụ ime iji nyere ha aka? Mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ ihe, ànyị na-ezi Okwu Chineke, ka ọ bụ, dị ka ndị Farisii, ànyị na-ezi echiche nke onwe anyị? Ànyị na-amụrụ anya ịhụ ihe ndị na-adị kwa ụbọchị dị anyị gburugburu ndị a pụrụ iji mee ka ihe doo mmadụ anya, iji mee ka e jiri anya nke uche hụ ihe, ime ka ihe rapagidesie ike n’obi, na imeziwanye nghọta nke eziokwu ime mmụọ? Ànyị na-ezere ijigidesi ụfọdụ ụkpụrụ ike mgbe, n’ihi ọnọdụ ndị dịnụ, ịhụnanya na ebere kwesịrị ekwesị ka e gosi ha karị site n’iji ikwenye ekwenye tinye ụkpụrụ ndị ahụ n’ọrụ? Gịnịkwa banyere ụmụaka? Ànyị na-egosi ha otu ụdị nchegbu dị nro na obi ọma nke Jisọs gosiri? Ị̀ na-agba ụmụ gị ume ịmụ ihe n’ụzọ Jisọs mere dị ka nwa okoro? Ị̀ ga-eme ihe n’ịkwụrụ chịm dị ka Jisọs mere ma dịrị njikere ịnabata ndị nwere nchegharị n’ụzọ na-ekpo ọkụ, ụzọ nnekwu ọkụkọ na-esi achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya?​—⁠Matiu 23:37.

20. Echiche dị aṅaa na-enye obi ụtọ ka anyị pụrụ iji kasie onwe anyị obi ka anyị na-ejere Chineke anyị ozi?

20 Ọ bụrụ na anyị agbalịa ime ihe kasị mma anyị nwere ike ime iji zie ihe dị ka Jisọs ziri, n’ezie ọ ga-ekwe ka anyị ‘soro ya banye n’okpuru yoke nke ya.’​—⁠Matiu 11:​28-⁠30.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a N’ezie, anyị nwere ihe nile mere anyị ga-eji kwere na Jisọs ga-egosipụta nchebara echiche kwesịrị ekwesị maka ndị tọrọ ya, karịsịa ndị gbara isi awọ́ na ndị nchụàjà.​—⁠Tụlee Levitikọs 19:32; Ọrụ Ndị Ozi 23:​2-⁠5.

Ị̀ Na-echeta?

◻ N’ihi gịnị ka ìgwè mmadụ ji na-enuga n’ebe Jisọs nọ?

◻ N’ihi gịnị ka Jisọs ji ekwenye ekwenye n’ụkpụrụ ụfọdụ mgbe ụfọdụ?

◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ajụjụ ndị Jisọs na-ajụ ndị ozizi ụlọ nsọ ahụ?

◻ Ihe mmụta ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site ná mmekọrịta Jisọs na ụmụaka?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya