Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 28 p. 70-p. 71 para. 6
  • Gịnị Mere na Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Ebughị Ọnụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere na Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Ebughị Ọnụ?
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Jụrụ Ya Ajụjụ Banyere Ibu Ọnụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ibu Ọnụ Ọ̀ Na-eme Ka Mmadụ Bịarukwuo Chineke Nso?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ibu Ọnụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ibu Ọnụ Ọ̀ Ghọwo Ihe Oge Ya Gafeworo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 28 p. 70-p. 71 para. 6
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim na-ajụ Jizọs ajụjụ gbasara ibu ọnụ

ISI NKE 28

Gịnị Mere na Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Ebughị Ọnụ?

MATIU 9:14-17 MAK 2:18-22 LUK 5:33-39

  • NDỊ NA-ESO ỤZỌ JỌN AJỤỌ JIZỌS AJỤJỤ GBASARA IBU ỌNỤ

Kemgbe ahụ a tụrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim mkpọrọ obere oge ka Jizọs gachara Ememme Ngabiga nke afọ 30, ọ ka nọ n’ụlọ mkpọrọ. Jọn chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ma, ọ bụghị ha niile mere otú ahụ ozugbo a tụrụ ya mkpọrọ.

Ugbu a, ka Ememme Ngabiga nke afọ 31 na-eru nso, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jọn bịakwutere Jizọs jụọ ya, sị: “Gịnị mere anyị na ndị Farisii ji ebu ọnụ ma ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ?” (Matiu 9:14) Ndị Farisii na-ebu ọnụ n’ihi na o so n’ihe a chọrọ ka onye na-ekpe okpukpe ha na-eme. O nwedịrị mgbe Jizọs mere otu ihe atụ ebe otu onye Farisii bụ́ onye ezi omume n’anya onwe ya nọ na-ekpegara Chineke ekpere. Ọ sịrị: “Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ụmụ mmadụ ndị ọzọ . . . Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ n’izu.” (Luk 18:11, 12) Ọ ga-abụkwa na ndị na-eso ụzọ Jọn na-ebu ọnụ n’ihi na ọ bụ omenala ndị Juu. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha na-ebu ọnụ n’ihi na obi adịghị ha mma maka mkpọrọ a tụrụ Jọn. Ndị ọzọ nọ ya mgbe ha bịara nọkwa na-eche ihe mere ndị na-eso ụzọ Jizọs anaghị ebu ọnụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ha emee ya iji gosi na ihe e mere Jọn na-ewute ha.

Jizọs meere ha ihe atụ iji zaa ha ihe ha jụrụ. Ọ sịrị ha: “Ndị enyi nke nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ enweghị ihe mere ha ga-eji ruo uju mgbe ha na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ, ka hà nwere? Ma ụbọchị na-abịa mgbe a ga-akpọpụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ n’ebe ha nọ, ọ bụ mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.”—Matiu 9:15.

E nwere mgbe Jọn n’onwe ya kpọrọ Jizọs nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ. (Jọn 3:28, 29) N’ihi ya, ebe Jizọs ka nọ ya, ndị na-eso ụzọ ya ekwesịghị ibuwe ọnụ. Ma, mgbe Jizọs ga-anwụ, ndị na-eso ụzọ ya ga na-eru uju, nri agaghịkwa ekwe ha oriri. Mana, nke ahụ ga-agbanwe ma a kpọlite ya n’ọnwụ. Mgbe ahụ, o nweghịzi ihe ga-eme ka ha na-ebu ọnụ ka ndị na-eru uju.

Jizọs mekwaara ha ihe atụ abụọ ọzọ. Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye na-adụnye ibé ákwà ọhụrụ n’uwe elu mere ochie; n’ihi na ike ya dum ga-eme ka uwe elu ahụ dọkaa, ọ ga-adọwa wee ka njọ. Ndị mmadụ adịghịkwa agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya mere ochie; ma ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, karama akpụkpọ mmanya ahụ na-agbawa, mmanya ahụ na-awụfukwa, karama akpụkpọ mmanya ahụ ebibiekwa. Kama ndị mmadụ na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya ọhụrụ.” (Matiu 9:16, 17) Olee ihe Jizọs na-ekwu ebe a?

Jizọs nọ na-agbalị ime ka ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim ghọta na o nweghị onye kwesịrị ịtụ anya ka ndị na-eso ụzọ ya na-eme omenala ochie nke okpukpe ndị Juu, nke ibu ọnụ so na ya. Ọ bịaghị imezi okpukpe merela ochie e kwesịrịla ịhapụ. Ụdị okpukperechi Jizọs na-akwado abụghị ụdị nke ndị Juu e nwere n’oge ya, bụ́ nke hiwere isi n’omenala ụmụ mmadụ chepụtara. Mba, ọ bịaghị iji ibé ákwà ọhụrụ dụchie uwe merela ochie, ma ọ bụkwanụ ịgbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya merela ochie.

IHE ATỤ JIZỌS MERE GBASARA IBU ỌNỤ

Karama akpụkpọ mmanya

Jizọs ji ihe ọtụtụ ndị na-ege ya ntị ma nke ọma mee ihe atụ. O ji ịdụ ákwà mee ihe atụ. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ ewere ibé ákwà dị ọhụrụ dụnye na nke merela ochie? A saa ákwà ahụ, ebe ahụ a dụnyere ákwà ọhụrụ ga-asụkọta, sizie ebe ahụ a dụnyere ya dọkaa.

N’oge ahụkwa, a na-echekwa mmanya na karama e ji akpụkpọ anụ mee. Ka oge na-aga, akpụkpọ anụ ahụ na-abịa sie ike, ọ gaghịzi na-adọtị adọtị. Onye na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ụdị karama a na-achọ nsogbu. Mmanya ọhụrụ ahụ nwere ike ịna-afụ, na-eko karama ahụ. O nwekwara ike imegide otú ahụ gbawaa karama ochie ahụ.

  • Olee ndị nọ na-ebu ọnụ n’oge Jizọs, oleekwa ihe mere ha ji na-ebu ọnụ?

  • Olee ihe mere ndị na-eso ụzọ Jizọs esoghị ha buo ọnụ mgbe ha na Jizọs ka nọ, oleekwa ihe ga-emecha mee ka ha buo ọnụ?

  • Olee ihe ihe atụ ndị ahụ Jizọs ji ibé ákwà ọhụrụ na mmanya ọhụrụ mee pụtara?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya